Ị Pụrụ Inweta Ọbụbụenyi Ndị Na-adịgide Adịgide
ENWERE ihe ndị na-anọchiri ọbụbụenyi ụzọ. N’ezie, Bible buru amụma na na “mgbe ikpeazụ” ndị a a gaje inwe ụkọ ịhụnanya, ịhụnanya maka mmadụ ibe ha, na iguzosi ike n’ihe. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:12) Ọnọdụ ndị a akpatawo ihe otiti a na-enwetụbeghị ihe yiri ya nke owu ọmụma. Otu onye kwuru, sị: “N’agbata obi m o yiri ụgbọ Noa. Ọ bụrụ na unu abụghị di na nwunye unu apụghị ịbata.” Ọ bụghị onye ọ bụla owu na-ama ka o si n’aka. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ihe ndị na-ama ọbụbụenyi ndị na-adịgide adịgide aka gụnyere ihe ndị dị ka ndị mmadụ ịdị na-akwagharị ọtụtụ mgbe karị, ezinụlọ dị iche iche ikewa, obodo ukwu ndị onye ọ bụla na-agara onwe ya na ndị dị ize ndụ, na ndalata pụtara ìhè n’oge e nwere iji zuru ike.
Onye bi n’obodo ukwu n’oge a pụrụ izute ọtụtụ ndị mmadụ n’otu izu karịa ihe onye bi n’ime obodo na narị afọ nke 18 hụrụ n’otu afọ ma ọ bụ ọbụna ná ndụ ya nile! Ma, mmekọrịta ndị a na-enwe taa abamighị ime. Ọtụtụ ndị na-emikpu onwe ha oge nile n’iso ndị mmadụ na-akpakọrịta oge nile na ná mgbalị dị iche iche ikpori ndụ. Otú ọ dị, anyị aghaghị ikweta na iso ndị mkpakọrịta a na-elezighị anya họrọ na-enwe oriri na nkwari na-enweghị isi yiri iji ogwu mere nkụ. Eklisiastis 7:5, 6 na-asị: “Ọ dị mma ịnụ ịbasi mba ike nke onye maara ihe, karịa mgbe mmadụ na-anụ abụ ndị nzuzu. N’ihi na dị ka olu ogwu mgbe ọ na-ere ọkụ n’okpuru ite, otú a ka ịchị ọchị nke onye nzuzu dị: nke a bụkwa ihe efu.” Ogwu na-enwu ọkụ na-achasi ike ma na-eme mkpọtụ ruo nwa oge, ma o nweghị ihe zuru ezu ga-eme ka ahụ kpoo anyị ọkụ. N’otu aka ahụ, ndị enyi na-eme mkpọtụ, ndị na-achị ọchị pụrụ ịdọpụ uche anyị ruo nwa oge, ma ha agaghị ewepụsị owu ọmụma nile ma gboo mkpa anyị nwere maka ezi ndị enyi.
Mmadụ ịnọ nanị ya dị iche n’owu ọmụma. Mmadụ ịnọ nanị ya mgbe ụfọdụ dị mkpa ka anyị wee nwetaghachi ume ọhụrụ wee si otú a nwekwuo ihe anyị ga-enye dị ka enyi. Mgbe e nwere owu ọmụma, ọtụtụ na-echigharịkwuru ụdị ntụrụndụ ụfọdụ nke ígwè electronic ozugbo. Otu ihe ọmụmụ chọpụtara na otu n’ime ụzọ e si emeghachi omume karịsịa n’ebe owu ọmụma dị bụ ikiri telivishọn. Ma, ndị ahụ mere nchọpụta kwubiri na ikiri telivishọn ruo ogologo oge bụ otu n’ime ihe ndị kasị njọ anyị pụrụ ime mgbe anyị na-enwe owu ọmụma. Ọ na-akwalite arụghị ọrụ, ịtụ ọ̀bọ̀, na echiche efu, na-aghọ ihe na-adịghị mma e ji edochi anya iso ndị ọzọ kpakọrịta ihu na ihu.
N’ezie, mmadụ ịnọ nanị ya pụrụ ịba nnọọ uru ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị nọ nanị anyị mee ihe n’ụzọ bara uru. Anyị pụrụ ime nke a site n’ịgụ ihe, ide akwụkwọ ozi, imepụta ihe dị iche iche, na izu ike. Mmadụ ịnọ nanị ya nke bara uru na-agụnye ikpegara Chineke ekpere, ịmụ Bible, na ịtụgharị uche na ya. (Abụ Ọma 63:6) Ndị a bụ ụzọ isi bịadewe Jehova Chineke nso karị, bụ́ onye gaje ịbụ Enyi anyị kachasị ukwuu.
Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Ọbụbụenyi n’Ime Bible
Ọ bụ ezie na ọ dị mma iso ọtụtụ ndị bụrụ enyi, Bible na-echetara anyị na “onye na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Ọ dị anyị nile mkpa inwe ndị enyi ole na ole chiri anya bụ́ ndị na-eche banyere anyị n’ezie, ndị ọbụbụenyi ha na-enye anyị ọṅụ, ume, na udo. Ọ bụ ezie na a dịghị ahụkebe ụdị ezi ọbụbụenyi ndị dị otú ahụ taa, ihe atụ ụfọdụ nke oge ochie bụ ndị a rịbara ama karịsịa n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, e nwere ọbụbụenyi pụrụ iche nke dị n’etiti Devid na Jonatan. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na ya? N’ihi gịnị ka ọbụbụenyi ha ji dịtee anya?
Otu ihe bụ, Devid na Jonatan nwere ihe ndị dị mkpa na-amasịkọta ha. Karịsịa, ha abụọ nwekọrọ nsọpụrụ dị omimi maka Jehova Chineke. Mgbe ọ hụrụ okwukwe Devid nwere n’ebe Chineke nọ na omume ya nile n’ịgbachitere ndị Jehova, “e kekọtara mkpụrụ obi Jonatan na mkpụrụ obi Devid, Jonatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi ya.” (1 Samuel 18:1) Ya mere, inwekọrịta ịhụnanya maka Chineke na-enye aka ikekọta ndị enyi n’ebe ibe ha nọ.
Jonatan na Devid bụ ndị siri ike ndị dịrị ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị. Ya mere ha pụrụ ịkwanyere ibe ha ùgwù. (1 Samuel 19:1-7; 20:9-14; 24:6) N’ezie anyị bụ ndị a gọziri agọzi ma ọ bụrụ na anyị nwere ndị enyi na-atụ egwu Chineke, ndị ụkpụrụ nile nke Akwụkwọ Nsọ na-achịkwa.
Ihe ndị ọzọ tụnyere ụtụ n’ọbụbụenyi nke Devid na Jonatan. Mmekọrịta ha bụ nke ịkwụwa aka ọtọ na ikwu eziokwu, onye nke ọ bụla na-akọkwara ibe ya ihe nzuzo ya. Jonatan ji iguzosi ike n’ihe bute ọdịmma nile nke Devid ụzọ tupu nke ya. O kwoghị ekworo n’ihi na e kwelaarị Devid nkwa inye ya ọbụbụeze; kama nke ahụ, Jonatan kwadoro ya ma n’ụzọ mmetụta uche ma n’ụzọ ime mmụọ. Devid nakwerekwaara enyemaka ya. (1 Samuel 23:16-18) N’ụzọ ndị kwesịrị ekwesị nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro, Devid na Jonatan mere ka ibe ha mara mmetụta ha nwere banyere ibe ha. Ọbụbụenyi ha n’ụzọ Chineke dabeere n’ezi mmasị na mmetụta ịhụnanya. (1 Samuel 20:41; 2 Samuel 1:26) Ọ bụ nke a na-apụghị igbubi egbubi n’ihi na mmadụ abụọ ahụ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Itinye ụkpụrụ ndị dị otú ahụ n’ọrụ pụrụ inyere anyị aka iwulite na ịnọgide na-enwe ezi ndị enyi.
Otú E Si Azụlite Ọbụbụenyi
Ị̀ na-achọ ezi ndị enyi? Ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adị gị mkpa ịchọ ya n’ebe dị anya. Ụfọdụ ndị n’etiti ndị gị na ha na-akpakọrịtachi anya pụrụ ịbụ ndị enyi gị, ọbụbụenyi gị pụkwara ịdị ha mkpa. Banyere ndị Kraịst ibe anyị karịsịa, ọ bụ ihe amamihe dị na ya itinye okwu ndụmọdụ nke Pọl onyeozi n’ọrụ ‘ịdị obodobo.’ (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Otú ọ dị, obi amapụla gị ma ọ bụrụ na mgbalị nile i mere imeta enyi arụpụtaghị nkekọ miri emi. Ọ na-ewekarị oge iji zụlite ọbụbụenyi, ọ bụghịkwa mmekọrịta nile ga-emicha emi n’otu aka ahụ. (Eklisiastis 11:1, 2, 6) N’ezie, iji nweta ezi ọbụbụenyi, anyị ga-abụrịrị ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị, ọ dịkwa anyị mkpa ịgbaso ndụmọdụ Jisọs: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.”—Matiu 7:12.
Ole ndị ka ọbụbụenyi gị dị mkpa? E wezụga ndị ọgbọ gị, olee banyere ndị ị tọrọ ma ọ bụ ndị tọrọ gị? Ọbụbụenyi nke Devid na Jonatan, Rut na Naomi, na nke Pọl na Timoti gụnyechara afọ ndụ dị iche iche. (Rut 1:16, 17; 1 Ndị Kọrint 4:17) Ị̀ pụrụ ịgbasapụ ọbụbụenyi gị ịgụnye ndị inyom di ha nwụrụ na ndị ọzọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye? Cheekwa echiche banyere ndị bịara ọhụrụ n’ógbè unu. Ọ pụrụ ịbụ na ha ahapụwo mkpakọrịta nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ma ọ bụ ndị enyi ha nile site n’ịkwagharị ma ọ bụ ịgbanwe ụzọ ndụ ha. Echela ka ndị ọzọ chọta gị. Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst, meta ọbụbụenyi ndị na-adịgide adịgide site n’itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ: “N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu; n’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.
Anyị pụrụ iwere ọbụbụenyi dị ka otu ụdị nke inye ihe. Jisọs sịrị na ọ bụrụ na anyị na-enye ihe, ndị mmadụ ga-enye anyị. O mekwara ka ọ pụta ìhè na obi ụtọ dị n’inye ihe karịa ka ọ dị n’ịnara ihe. (Luk 6:38; Ọrụ 20:35) Ì zutewo ndị nwere nzụlite dịgasị iche iche? Mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova egosipụtawo na ndị sitere n’ọdịbendị dị iche iche pụrụ ịzụlite ezi ọbụbụenyi ndị na-adịgidekwa adịgide mgbe ha na-efekọ Chineke ọnụ.
Ime Ka Ọbụbụenyi Dịgide
N’ụzọ dị mwute, mgbe ụfọdụ ndị a na-ewere dị ka ndị enyi na-akpatara ibe ha obi mgbu. Asịrị na-emerụ ahụ, ikpughe izu nzuzo, enweghị ekele—ihe ndị a so n’ihe ndị na-egbu mgbu nke ukwuu mgbe ọ bụ onye i weere dị ka ezi enyi malitere ya. Gịnị ka a pụrụ ime n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ?
Setịpụ ezi ihe nlereanya. Mee ihe nile ị pụrụ ime iji zere ịkpata ihe mgbu na-adịghị mkpa. N’ebe ụfọdụ, ọ bụ ihe a na-emekarị bụ ndị enyi iji mmejọ nke ibe ha na-eme ihe ọchị. Ma mmeso obi ọjọọ ma ọ bụ aghụghọ agaghị eme ka ndị enyi chie anya karị, ọ bụrụgodị na ha chee na ha ‘na-egwuri egwu.’—Ilu 26:18, 19.
Rụsie ọrụ ike iji jigide ọbụbụenyi gị. Nghọtahie na-ebilite mgbe ụfọdụ mgbe ndị enyi na-atụ anya ihe gabigara ókè site n’aka ibe ha. Enyi nke na-arịa ọrịa ma ọ bụ nke ji ọrụ n’aka n’ihi otu nsogbu siri ike agaghị enwe ike igosi ikpo ọkụ dị ka ọ na-emebu ma eleghị anya. Ya mere, n’oge ndị dị otú ahụ gbalịa igosi nghọta na inye nkwado.
Dozie nsogbu dị iche iche ngwa ngwa na n’ụzọ obi ọma. Mee otú ahụ n’ebe ọ bụ nanị unu abụọ ma ọ bụrụ na o kwe mee. (Matiu 5:23, 24; 18:15) Jide n’aka na enyi gị maara na ị chọrọ ime ka unu nọgide na-enwe mmekọrịta dị mma. Ndị enyi nwere obi eziokwu na-agbaghara ibe ha. (Ndị Kọlọsi 3:13) Ị̀ ga-abụ ụdị enyi ahụ—nke na-arapara n’ahụ karịa nwanne?
Ịgụ na iche echiche banyere ọbụbụenyi bụ nanị mmalite. Ọ bụrụ na owu na-ama anyị, ka anyị mee ihe kwesịrị ekwesị, anyị agaghị enwekwa owu ọmụma ruo ogologo oge. Ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị, anyị pụrụ imeta ezi ndị enyi. Anyị ga-eso ụfọdụ n’ime ha nwee nkekọ pụrụ iche. Ma ọ dịghị onye pụrụ iweghara ọnọdụ Chineke, bụ́ Enyi kachasị ukwuu. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịmara, ịghọta, na ịkwado anyị n’ụzọ zuru ezu. (Abụ Ọma 139:1-4, 23, 24) Ọzọkwa, Okwu ya na-enye anyị olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu—ụwa ọhụrụ ebe ọ ga-ekwe omume inwe ezi ndị enyi ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 3:13.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Devid na Jonatan nwere ezi ọbụbụenyi, anyị pụkwara