Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
“Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume.”—DEUTERỌNỌMI 32:4.
1. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee mkpa e ketara eketa maka ikpe ziri ezi?
DỊ NNỌỌ ka mkpa ịbụ onye a hụrụ n’anya dị n’ọbara onye ọ bụla, otú ahụ ka ọ na-agụsi anyị nile ike ịbụ ndị a na-emeso ihe n’ikpe ziri ezi. Dị ka onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị America bụ́ Thomas Jefferson dere, “[ikpe ziri ezi] bụ ihe e bu pụta ụwa na ihe dị anyị n’ime, . . . bụrụ n’ụzọ dị ukwuu akụkụ nke ọdịdị anyị dị ka inwe mmetụta, ịhụ ụzọ, ma ọ bụ ịnụ ihe.” Nke a abụghị ihe ijuanya, ebe Jehova kere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26) N’ezie, o nyere anyị àgwà ndị yiri ụdị onye ọ bụ, nke otu n’ime ha bụ ikpe ziri ezi. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee mkpa anyị ketara eketa maka ikpe ziri ezi na ihe mere o ji agụsi anyị ike ibi n’ụwa nke ezi ikpe na ezi omume.
2. Ruo ókè hà aṅaa ka ikpe ziri ezi dị Jehova mkpa, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa ịghọta ihe ikpe ziri ezi nke Chineke pụtara?
2 Banyere Jehova, Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Ma n’ime ụwa nke ikpe na-ezighị ezi jupụtara, ọ dịghị mfe ịghọta ihe ikpe ziri ezi nke Chineke pụtara. Otú ọ dị, site n’Okwu Chineke, anyị pụrụ ịghọta otú Chineke si na-ekpe ikpe ziri ezi, anyị pụkwara ịghọta ụzọ ndị dị ebube nke Chineke ọbụna karị. (Ndị Rom 11:33) Ịghọta ikpe ziri ezi n’echiche nke Bible dị mkpa n’ihi na nghọta mmadụ pụrụ nnọọ imetụta echiche anyị nwere banyere ikpe ziri ezi. Site n’otú mmadụ si ele ihe anya, a pụrụ iwere ikpe ziri ezi dị ka nanị itinye ụkpụrụ iwu n’ọrụ n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ma ọ bụ dị ka ọkà ihe ọmụma bụ́ Francis Bacon dere, “ikpe ziri ezi na-agụnye inye onye ọ bụla ihe kwesịịrị ya.” Otú ọ dị, ikpe ziri ezi nke Jehova na-agụnye ihe dị ukwuu karị.
Ikpe Ziri Ezi nke Jehova Na-enye Obi Ụtọ
3. Olee ihe a pụrụ ịmụta site n’ịtụle okwu mbụ e ji mee ihe na Bible maka ikpe ziri ezi na ezi omume?
3 A pụrụ ịghọta otú ikpe ziri ezi Chineke hà nke ọma site n’ịtụle otú e si jiri asụsụ mbụ mee ihe na Bible.a N’ụzọ na-akpali mmasị, n’Akwụkwọ Nsọ e nwekebeghị ọdịiche dị n’etiti ikpe ziri ezi na ezi omume. N’ezie, mgbe ụfọdụ a na-eji okwu Hibru ndị ahụ eme ihe n’ụzọ yiri ibe ha, dị ka anyị na-ahụ n’Emọs 5:24, ebe Jehova na-agba ndị ya ume, sị: “Ka ikpe ziri ezi na-erudasi ike dị ka mmiri, ezi omume kwa dị ka mmiri iyi nke na-eru mgbe dum.” Ọzọkwa, ọtụtụ mgbe okwu ahụ bụ́ “ikpe ziri ezi na ezi omume” na-apụtakọ ọnụ iji mesie ihe ike.—Abụ Ọma 33:5; Aịsaịa 33:5; Jeremaịa 33:15; Ezikiel 18:21; 45:9.
4. Gịnị ka igosipụta ikpe ziri ezi pụtara, gịnịkwa bụ ụkpụrụ kasị elu nke ikpe ziri ezi?
4 Olee echiche nke okwu Hibru na Grik ndị a na-enye? Igosipụta ikpe ziri ezi n’echiche Akwụkwọ Nsọ pụtara ime ihe ziri ezi ma kwụrụ ọtọ. Ebe Jehova bụ onye na-eguzobe iwu na ụkpụrụ omume, ma ọ bụ ihe ziri ezi na ihe kwụ ọtọ, ụzọ Jehova si eme ihe bụ ụkpụrụ kasị elu nke ikpe ziri ezi. Theological Wordbook of the Old Testament na-akọwa na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ ezi omume (tseʹdheq) “na-ezo aka n’ụkpụrụ àgwà, nke omume nakwa n’A[gba] O[chie] ụkpụrụ ahụ bụ ọdịdị na uche Chineke.” N’ihi ya, ụzọ Chineke si etinye ụkpụrụ ya n’ọrụ, na karịsịa ụzọ o si emeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume, na-ekpughe ezi ịdị mkpa nke ezi ikpe na ezi omume.
5. Olee àgwà ndị e jikọtara ha na ikpe ziri ezi nke Chineke?
5 Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na ikpe ziri ezi nke Chineke na-enye obi ụtọ kama ịbụ nke siri ike na nke na-adịghị nro. Devid bụrụ abụ, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya.” (Abụ Ọma 37:28) Ikpe ziri ezi nke Chineke na-akwali ya igosi ikwesị ntụkwasị obi na ọmịiko n’ebe ndị ohu ya nọ. Ikpe ziri ezi nke Chineke na-aghọta mkpa anyị ma na-enye ohere maka ezughị okè anyị. (Abụ Ọma 103:14) Nke ahụ adịghị apụta na Chineke na-anakwere ajọ omume, n’ihi na ime otú ahụ ga-akwado ikpe na-ezighị ezi. (1 Samuel 3:12, 13; Eklisiastis 8:11) Jehova kọwaara Mosis na Ya bụ onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” Ọ bụ ezie na ọ dị njikere ịgbaghara njehie na mmehie, Chineke agaghị ahapụ inye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ—Ọpụpụ 34:6, 7.
6. Olee otú Jehova si emeso ụmụ ya ndị nọ n’elu ala omume?
6 Mgbe anyị na-atụgharị uche n’otú Jehova si egosipụta ikpe ziri ezi, anyị ekwesịghị iche na ọ bụ ọkaikpe aka ike, onye ihe dị ya mkpa bụ nanị ịma ndị mere ihe ọjọọ ikpe. N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị kwesịrị iche banyere ya dị ka nna na-ahụ n’anya ma na-eguzosi ike bụ́ onye na-emeso ụmụ ya omume mgbe nile n’ụzọ kasị mma. “Jehova, Nna anyị ka Ị bụ,” ka Aịsaịa onye amụma kwuru. (Aịsaịa 64:8) Dị ka Nna na-eme ihe n’ikpe ziri ezi na nke ezi omume, Jehova na-eji ọmịiko ya emejụ nguzosi ike ya maka ezi ihe n’ebe ụmụ elu ala ya nọ, bụ́ ndị nwere mkpa enyemaka ma ọ bụ mgbaghara n’ihi ọnọdụ ndị siri ike ma ọ bụ adịghị ike anụ ahụ.—Abụ Ọma 103:6, 10, 13.
Ime Ka Ihe Ikpe Ziri Ezi Bụ Doo Anya
7. (a) Gịnị ka anyị na-amụta banyere ikpe ziri ezi nke Chineke site n’amụma Aịsaịa? (b) Olee ọrụ Jisọs nwere n’ịkụziri mba nile ikpe ziri ezi?
7 E mere ka ọdịdị ọmịiko nke ikpe ziri ezi Jehova pụta ìhè site n’ọbịbịa nke Mesaịa. Jisọs kụziri ikpe ziri ezi nke Chineke ma bie ndụ kwekọrọ na ya, dị ka Aịsaịa onye amụma buru n’amụma. N’ụzọ doro anya, ikpe ziri ezi nke Chineke na-agụnye imeso ndị a zọdara n’ala ihe n’ụzọ dị nro. N’ụzọ dị otú a, a dịghị akụda ha aka nke na ha agaghị enwetaghachili onwe ha. Jisọs, bụ́ “ohu” Jehova, bịara n’ụwa ‘ịkọrọ mba nile akụkọ’ banyere akụkụ a nke ikpe ziri ezi Chineke. Karịsịa, o mere nke ahụ site n’inye anyị ihe nlereanya doro anya nke ihe ikpe ziri ezi Chineke pụtara. Dị ka ‘ihe opupu nke ezi omume puuru’ Eze Devid, ọ dị Jisọs ọkụ n’obi ‘ịchọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.’—Aịsaịa 16:5; 42:1-4; Matiu 12:18-21; Jeremaịa 33:14, 15.
8. N’ihi gịnị ka ezi ikpe na ezi omume ji ghara ido anya na narị afọ mbụ?
8 Ime ka ọdịdị ikpe ziri ezi nke Jehova doo anya n’ụzọ dị otú ahụ dị mkpa karịsịa na narị afọ mbụ O.A. Ndị okenye na ndị ndú okpukpe ndị Juu—ndị odeakwụkwọ, ndị Farisii, na ndị ọzọ—kpọsara ma mee ihe atụ echiche gbagọrọ agbagọ nke ikpe ziri ezi na ezi omume. N’ihi ya, ndị nkịtị, bụ́ ndị hụrụ ya dị ka ihe na-agaghị ekwe omume ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii chọrọ, chere ma eleghị anya na ezi omume Chineke abụtụdịghị ihe a ga-eru. (Matiu 23:4; Luk 11:46) Jisọs gosiri na nke a adịghị otú ahụ. Ọ họọrọ ndị na-eso ụzọ ya n’etiti ndị nkịtị a, ọ kụzikwaara ha ụkpụrụ ezi omume Chineke.—Matiu 9:36; 11:28-30.
9, 10. (a) Olee otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si chọọ igosipụta ezi omume ha? (b) N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa n’ihi gịnị ka Jisọs ji kpughee na omume ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii enweghị isi?
9 N’aka nke ọzọ, ndị Farisii chọrọ ohere igosipụta “ezi omume” ha site n’ikpe ekpere ma o bụ inye onyinye n’ihu ọha. (Matiu 6:1-6) Ha nwakwara igosipụta ezi omume ha site n’ịraparasi ike n’imerime iwu na ụkpụrụ iwu—nke ọtụtụ n’ime ha bụ nke ha ji aka ha mee. Mgbalị ndị dị otú ahụ dujere ha ‘n’ịgabiga ikpe ziri ezi na ịhụnanya Chineke.’ (Luk 11:42) N’elu ahụ, ha pụrụ iyiworị ndị ezi omume, ma n’ime ahụ ha ‘jupụtara n’ihe na-emebi iwu,’ ma ọ bụ ajọ omume. (Matiu 23:28) N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, n’ezie ha maara ihe dị nta banyere ezi omume Chineke.
10 N’ihi nke ahụ, Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ezi omume unu adịghị akarị ezi omume ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke ukwuu, unu agaghị aba n’alaeze eluigwe ma ọlị.” (Matiu 5:20) Nnukwu ọdịiche dị n’etiti ikpe ziri ezi nke Chineke nke Jisọs mere ihe atụ ya na ezi omume onwe onye nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bụ ihe kpatara esemokwu na-adịkarị n’etiti ha.
Ikpe Ziri Ezi nke Chineke Megide Ikpe Gbagọrọ Agbagọ
11. (a) N’ihi gịnị ka ndị Farisii ji jụọ Jisọs ajụjụ banyere ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike? (b) Gịnị ka azịza Jisọs kpughere?
11 N’oge ozi ya na Galili n’oge opupu ihe ubi nke afọ 31 O.A., Jisọs hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ n’otu ụlọ nsọ. Ebe ọ bụ Ụbọchị Izu Ike, ndị Farisii jụrụ Jisọs: “Ò ziri ezi n’iwu ime ka ahụ mmadụ dị ike n’ụbọchị izu ike?” Kama inwe ezi nchegbu maka ahụhụ nwoke a dara ogbenye na-ata, ha nwere ọchịchọ ịchọta ihe ha ga-eji katọọ Jisọs, dị ka ajụjụ ha kpughere. Ka a sịkwa ihe mere obi ịkpọ nkụ ha ji wute Jisọs! Mgbe ahụ ọ tụhapụụrụ ndị Farisii otu ajụjụ yiri nke ahụ n’ezoghị ọnụ, sị: “Ò ziri ezi n’iwu ime ezi ihe n’ụbọchị izu ike?” Mgbe ha gbachiri nkịtị, Jisọs zara ajụjụ ya onwe ya jụrụ site n’ịjụ ha ma ọ bụ na ha agaghị azọpụta atụrụ nke dabaworo n’olulu n’Ụbọchị Izu Ike.b “Oleekwa ka ọ hà, bụ́ otú ọnụ ahịa mmadụ karịrị nke atụrụ oké ọnụ!” ka Jisọs ji echiche a na-apụghị ịgbagha agbagha rụọ ụka. “Ya mere o ziri ezi n’iwu [ma ọ bụ, dị mma] ime ihe ọma n’ụbọchị izu ike,” ka o kwubiri. Ọ dịghị mgbe e kwesịrị iji ọdịnala mmadụ gbochie ikpe ziri ezi nke Chineke. Ebe o meworo ka isi ihe ahụ doo anya, Jisọs gara n’ihu wee gwọọ aka nwoke ahụ.—Matiu 12:9-13; Mak 3:1-5.
12, 13. (a) N’ụzọ dị iche n’ebe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ, olee otú Jisọs si gosi mmasị ya n’inyere ndị mmehie aka? (b) Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti ikpe ziri ezi nke Chineke na ezi omume onwe onye?
12 Ọ bụrụ na ndị Farisii echebarachaghị ndị nwere nkwarụ echiche, ha echebatụdịghịrị ndị e meworo ogbenye n’ụzọ ime mmụọ echiche. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ha si ele ezi omume anya dujere ha n’ileghara ndị na-ana ụtụ na ndị mmehie anya na ịkpọ ha asị. (Jọn 7:49) Ka o sina dị, ọtụtụ ndị dị otú ahụ ṅara ntị n’ozizi Jisọs, ebe ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha hụtara ọchịchọ ya inye aka kama ịma ikpe. (Matiu 21:31; Luk 15:1) Otú ọ dị, ndị Farisii ledara mgbalị Jisọs mere ịgwọ ndị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ anya. “Nwoke a na-anara ndị mmehie nke ọma, na-esokwa ha eri ihe,” ka ha tamuru n’ụzọ nkọcha. (Luk 15:2) N’ịzaghachi n’ebubo ha, Jisọs jiri ihe atụ metụtara atụrụ mee ihe ọzọ. Dị nnọọ ka onye na-azụ atụrụ na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara atụrụ furu efu, otú ahụ ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị. (Luk 15:3-7) Jisọs n’onwe ya ṅụrịrị ọṅụ mgbe o nwere ike inyere Zakịọs aka ichegharị site n’ụzọ mmehie ya na mbụ. “Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ihe nke furu efu,” ka o kwuru.—Luk 19:8-10.
13 Esemokwu ndị a na-ekpughe n’ụzọ doro anya ọdịiche dị n’etiti ikpe ziri ezi nke Chineke, bụ́ nke na-achọ ịgwọ agwọ na ịzọpụta, na ezi omume onwe onye, bụ́ nke na-achọ ibuli mmadụ ole na ole elu ma maa ọtụtụ ikpe. Ememe okpukpe na-enweghị isi na ọdịnala mmadụ hiwere edujewo ndị odeakwụkwo na ndị Farisii ná mpako na ịbụ ndị dị mkpa n’anya onwe ha, ma Jisọs rụtụrụ aka n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ha “ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe.” (Matiu 23:23) Ka anyị ṅomie Jisọs n’igosipụta ezi ikpe n’ihe nile anyị na-eme ma kpacharakwa anya maka ọnyà nke ịbụ onye ezi omume n’anya onwe anyị.
14. Olee otú otu n’ime ọrụ ebube Jisọs si gosi na ikpe ziri ezi nke Chineke na-atụle ọnọdụ mmadụ?
14 Ọ bụ ezie na Jisọs leghaara iwu aka ike nke ndị Farisii anya, o debere Iwu Mosis. (Matiu 5:17, 18) N’ime otú ahụ, o kweghị ka ihe nile e kwuchara n’Iwu ezi omume ahụ kpuchie ụkpụrụ ya. Mgbe otu nwanyị bụ́ onye rịara oruru ọbara ruo afọ 12 metụrụ uwe ya aka wee bụrụ onye a gwọrọ, Jisọs sịrị ya: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị azọpụtawo gị; laa n’udo.” (Luk 8:43-48) Okwu ọmịiko Jisọs mere ka o doo anya na ikpe ziri ezi nke Chineke atụlewo ọnọdụ ya. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ọcha n’ụzọ iwu chọrọ ma si otú a bụrụ onye a pụrụ ịsị na o mebiwo Iwu Mosis site n’ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ, okwukwe ya kwesịrị ụgwọ ọrụ.—Levitikọs 15:25-27; tụlee Ndị Rom 9:30-33.
Ezi Omume Bụ Maka Mmadụ Nile
15, 16. (a) Gịnị ka ilu Jisọs banyere onye Sameria bụ ezi onye agbata obi na-akụziri anyị banyere ikpe ziri ezi? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ‘ịbụbiga ndị ezi omume ókè’?
15 E wezụga imesi ọdịdị ọmịiko nke ikpe ziri ezi Chineke ike, Jisọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya na o kwesịrị ịgụnye mmadụ nile. Ọ bụ uche Jehova ka Jisọs ‘wepụtara mba nile ikpe.’ (Aịsaịa 42:1) Nke a bụ isi ihe dị n’ilu Jisọs a kasị mara, bụ́ nke onye Sameria bụ ezi onye agbata obi. Ilu ahụ bụ nzaghachi nye ajụjụ nke otu nwoke maara Iwu nke ọma bụ́ onye chọrọ “ịgụ onwe ya n’onye ezi omume” jụrụ. “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” ka ọ jụrụ, ikekwe na-achọ ịbụ onye ọ ga-amasị ime ka ibu ọrụ ya n’ebe ndị agbata obi ya nọ bụrụ nanị n’ebe ndị Juu nọ. Onye Sameria ahụ nọ n’ilu Jisọs gosiri ezi omume Chineke, n’ihi na ọ dị njikere imefu oge na ego ya n’inyere onye ọ na-amaghị si mba ọzọ aka. Jisọs mechiri ilu ya site n’ịdụ onye ahụ jụrụ ya ajụjụ ọdụ, sị: “Gị onwe gị meekwa otú ahụ.” (Luk 10:25-37) N’otu aka ahụ ọ bụrụ na anyị emeere ndị mmadụ ihe ọma n’agbanyeghị ebo ma ọ bụ agbụrụ ha si na ya, anyị ga na-eṅomi ikpe ziri ezi nke Chineke.—Ọrụ 10:34, 35.
16 N’aka nke ọzọ, ihe atụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-echetara anyị na ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke, anyị ekwesịghị ‘ịbụbiga ndị ezi omume ókè.’ (Eklisiastis 7:16) Ịchọ ịdọta mmasị ndị ọzọ site n’oké ngosi nke ezi omume ma ọ bụ iji iwu mmadụ mere kpọrọ ihe gabiga ókè agaghị ewetara anyị nnwapụta Chineke.—Matiu 6:1.
17. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa anyị igosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke?
17 Otu ihe mere Jisọs ji mee ka otú ikpe ziri ezi nke Chineke dị doo mba nile anya bụ ka ndị na-eso ụzọ ya nile nwee ike ịmụta igosipụta àgwà a. N’ihi gịnị ka nke a ji dị oké mkpa? Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke,’ ụzọ nile nke Chineke bụkwa ikpe ziri ezi. (Ndị Efesọs 5:1) N’otu aka ahụ, Maịka 6:8 na-akọwa na otu n’ime ihe Jehova chọrọ anyị n’aka bụ ka anyị ‘mee ihe e kpere n’ikpe’ ka anyị soro Chineke anyị na-eje ije. Ọzọkwa, Zefanaịa 2:2, 3 na-echetara anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka e chebe anyị n’ụbọchị oké iwe Jehova, anyị aghaghị ‘ịchọ ezi omume’ tupu ụbọchị ahụ abịa.
18. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?
18 Ya mere oge ikpeazụ ndị a dị oké egwu bụ ‘oge a na-anara mmadụ nke ọma’ iji gosipụta ikpe ziri ezi. (2 Ndị Kọrint 6:2) Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụ na, dị ka Job, anyị ‘eyiri ezi omume dị ka uwe’ na ‘ezi ikpe dị ka uwe mwụda,’ Jehova ga-agọzi anyị. (Job 29:14) Olee otú okwukwe n’ikpe ziri ezi nke Jehova ga-esi enyere anyị aka ilepụ anya n’ọdịnihu n’obi ike? Ọzọkwa, ka anyị na-echere “ụwa ọhụrụ” ezi omume ahụ, olee otú ikpe ziri ezi nke Chineke si echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ? (2 Pita 3:13) Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e ji okwu atọ bụ́ isi mee ihe. A na-asụgharịkarị otu n’ime ndị a (mish·patʹ) ịbụ “ikpe ziri ezi.” A na-asụgharị abụọ ndị ọzọ (tseʹdheq na nke yiri ya bụ́ tsedha·qahʹ) ịbụ “ezi omume” n’ihe ka ọtụtụ mgbe. A kọwara okwu Grik a sụgharịrị “ezi omume” (di·kai·o·syʹne) ịbụ “àgwà nke izi ezi ma ọ bụ ime ihe n’ikpe ziri ezi.”
b Jisọs họtara ihe atụ dabara adaba n’ihi na iwu a na-edeghị ede nke ndị Juu nyere ha ohere kpọmkwem inyere anụmanụ nọ ná nsogbu n’Ụbọchị Izu Ike aka. N’ọtụtụ oge ndị ọzọ, e nwere esemokwu banyere otu okwu a, ya bụ, ma o ziri ezi n’iwu ịgwọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike.—Luk 13:10-17; 14:1-6; Jọn 9:13-16.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị ka ikpe ziri ezi nke Chineke pụtara?
◻ Olee otú Jisọs si kụziere mba nile ikpe ziri ezi?
◻ N’ihi gịnị ka ezi omume nke ndị Farisii ji gbagọọ agbagọ?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa igosipụta ikpe ziri ezi?
[Foto dị na peeji nke 8]
Jisọs mere ka otú ikpe ziri ezi nke Chineke hà doo anya