Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/15 p. 26-29
  • ‘Ịchọpụta Okwu Ndị Dị Utọ, Okwu Ndị Ziri Ezi’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ịchọpụta Okwu Ndị Dị Utọ, Okwu Ndị Ziri Ezi’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụkpụrụ Echiche Ọhụrụ
  • E Bu Gị n’Uche Wee Kwadebe Index
  • Ụzọ Index ahụ Pụrụ Isi Nyere GỊ Aka
  • Akwụkwọ Na-emegide Akwụkwọ Ndị Ọzọ
    Teta!—2003
  • Ụzọ Isi Mee Nnyocha
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Akwụkwọ Ọhụrụ E Ji Eme Nchọnchọ
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/15 p. 26-29

‘Ịchọpụta Okwu Ndị Dị Utọ, Okwu Ndị Ziri Ezi’

“ONYE mkpọkọta chọrọ ịchọpụta okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.” (Eklisiastis 12:10) Lee ka ‘okwu dị ụtọ ndị e deziri edezi,’ ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ nke e dere n’ike mmụọ nsọ pụrụ isi bụrụ ihe dị oké ọnụ ahịa! E ji ha tụnyere “mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha,” bụ́ ndị a chọrọ mma, dịkwa ùgwù n’oge nile, bụrụkwa ihe oké ọnụ ahịa n’ọnọdụ nchekasị nile.—Ilu 25:11.

N’oge anyị a, Onye Mkpọkọta ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, emewo ndokwa ime mmụọ ndị dị nnọọ ukwuu karịa ihe ndị Chineke nwetara n’okpuru ndị eze Israel oge ochie. (Matiu 12:42) Ruo ihe karịrị otu narị afọ, e wepụtawo okwu nke eziokwu ndị e deziri edezi, ndị na-emetụta akụkụ nile nke ndụ n’ime akwụkwọ ndị Watch Tower Society na-ebipụta, e kesawokwa ha n’ọtụtụ asụsụ. Ọtụtụ ezinụlọ na ndị mmadụ n’otu n’otu esiwo otú a nwee ike ịchịkọta n’ụlọ ha dị iche iche mkpokọba nke akwụkwọ ntụaka ndị a pụrụ ịdabere na ha, ndị na-akọwa Bible. Tụkwasị na nke a, ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nwere ebe ndebe akwụkwọ ndị mara mma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

Ma n’agbanyeghị nke ahụ, inweta okwu dị ụtọ ndị e deziri edezi, ndị dị mkpa maka ọnọdụ nke ọ bụla ka chọrọ ime nchọpụta. N’ịghọta nke a, kemgbe ogologo oge, Watch Tower Society ebipụtawo ndepụta ntụaka dị iche iche maka akwụkwọ ndị o bipụtaworo.—Lee igbe dị na peji 28 na 29.

Ụkpụrụ Echiche Ọhụrụ

N’afọ 1985, a malitere ihe ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme nke akwụkwọ Watch Tower Publications Index dị iche iche. A chịkọtara Index itoolu e nweburu bịa n’otu mpịakọta nke jikọtara 1930 ruo 1985, bụ́ ọrụ nke gaara eweworị otu onye afọ 14. Abamuru nile nke ibipụta akwụkwọ Index nke dị n’otu mpịakọta nke jikọtara ọtụtụ afọ dujere n’ịmalite ụkpụrụ echiche ọhụrụ na 1986, ya bụ nke ibipụta Index ndị a chịkọtara achịkọta malite ugbu a gaa n’ihu. Kwa afọ, ná nsochi afọ anọ, otu akwụkwọ nta Index ga-ejikọta otu afọ, afọ abụọ, afọ atọ, e mesịakwa, afọ anọ. N’afọ ise ọ bụla, otu Index e kwesiri mkpò ya ike ga-achịkọta Index nile malite na 1986 gaa n’ihu, dị ka 1986-90, 1986-95, si otú ahụ gaa n’ihu. Otú a, ọ gaghị adị mkpa ileba anya n’ihe karịrị Index atọ: 1930-1985 Index, Index e kwesiri mkpò ya ike nke e ji n’aka mgbe ahụ, nakwa nke nta dị maka afọ ka gafere agafe.

E Bu Gị n’Uche Wee Kwadebe Index

Akụkụ mbụ dị n’akwụkwọ Index nke ọ bụla bụ ndepụta ntụaka nke isiokwu. N’ịkwadebe ndepụta ntụaka nke isiokwu, a na-eburu ajụjụ abụọ n’uche: (1) Gịnị ka a ga-eme ndepụta ntụaka banyere ya? (2) Olee ebe mmadụ pụrụ ịchọta ihe ọmụma ahụ?

Dị ka onye na-agụ akwụkwọ, ọ bụghị mgbe nile ka ị ga-enwe mmasị n’ịchọta obere okwu ọ bụla e kwuru banyere otu isiokwu. Ebe ọ bụ na ihe bụ isi ị na-achọ bụ ihe ọmụma ndị pụtara ìhè, ndị ga-abakwa uru n’ezie, ọ bụ nke a ka a na-ahọpụta ime ndepụta ntụaka banyere ya. Ma ọ dịghị mkpa na ndepụta ahụ ga-enye nkọwa nile. Ndepụta dị n’akwụkwọ Index pụrụ izo aka n’ihe dị nta dị ka nanị otu ahịrị okwu, dị ka ndepụta nke ụkpụrụ echiche Society n’ihe banyere otu okwu. Ma ọ bụ ọ pụkwara ijikọta otu isiokwu dum, ọbụna otu akwụkwọ dum. Otú ọ dị, ndepụta ahụ na-edujekarị n’ọtụtụ paragraf nke ntụle e mere banyere okwu ahụ.

Ajụjụ banyere ebe ntụaka dị iche iche kwesịrị ịpụta n’ime akwụkwọ Index dịkwa mkpa, n’ihi na ndị na-agụ akwụkwọ na-eche echiche n’ụzọ dị iche iche, ha ga-achọkwa ihe n’okpuru isiokwu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ihe banyere Ụlọ Elu nke Bebel pụtara n’okpuru TOWER OF BABEL (Ụlọ elu Bebel). Ma ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ pụrụ ichọ ya n’okpuru BABYLON (Babilọn), ARCHAEOLOGY (ọkà mmụta ihe mgbe ochie), ma ọ bụ LANGUAGE(S) (asụsụ), na-adabere n’akụkụ isiokwu ahụ nke dị ha mkpa. N’ihi nke a, e mere mgbalị idepụtaghachi ntụaka n’okpuru isiokwu dị iche iche ndị kwesịrị ekwesị, na-eburu n’uche na ndị na-agụ akwụkwọ nọ n’afọ ndụ dị iche iche, nweekwa ụdị ntolite dị iche iche, na ha nwekwara nzube dị iche iche.

Ụzọ Index ahụ Pụrụ Isi Nyere GỊ Aka

Dị ka map, Index ahụ pụrụ inyere gị aka nanị ma ọ bụrụ na i jiri ya mee ihe. Gịnị ka i kwesịrị ịtụ anya ịchọpụta n’ime ndepụta ntụaka nke isiokwu ma ọ bụ n’akụkụ ndepụta ntụaka nke akụkụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche nke na-esochi ya?

Ntụaka ndị dị n’akụkụ ndepụta ntụaka nke akụkụ Akwụkwọ nsọ bụ gaa n’ihe ọmụma ndị na-akọwa amaokwu dị iche iche. Ị pụrụ ịchọta nkọwa nke ọnọdụ okwu dị n’otu ihe odide, ihe mere e ji dee ya, onye ma ọ bụ ndị o metụtara, ma ọ bụ isi ihe dị n’okwu ma ọ bụ ahịrị okwu ndị dị na ya. Otu ihe atụ bụ arịrịọ ahụ dị n’ekpere nlereanya Jisọs: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Matiu 6:13) N’ihi gịnị ka e ji kwuo ya dị otú ahụ? Ndepụta ntụaka nke akụkụ Akwụkwọ nsọ ahụ ga-enyere gị aka ịchọpụta.

Ndepụta ntụaka nke isiokwu, dị ka aha ya si dị, bụ ndepụta ntụaka nke ihe bụ isi dị na ya bụ isi ihe dị iche iche kama ịbụ mkpụrụ okwu ma ọ bụ ahịrị okwu. Ụfọdụ ndị na-agụ akwụkwọ enwewo ihe isi ike ịchọta otu isiokwu mgbe ha na-anwa ịchọta ya site n’isiokwu ya. Ihe isi ike nke a pụrụ ibilite mgbe ọ na-adịghị mkpụrụ okwu ọ bụla dị n’isiokwu ya nke e ji amara isiokwu ahụ n’ezie. Otu ihe atụ pụrụ ịbụ isiokwu ahụ bụ “Olee Mgbe A Ga-asị Na Ọ Gabigawo Ókè?” bụ́ nke tụlere mmetụta nke mmanya. N’icheta ihe dị n’ime isiokwu ahụ, ị pụrụ ile anya n’okpuru isiokwu ndị dị ka ALCOHOLIC BEVERAGES (ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya) ma ọ bụ DRINKING (ịṅụ mmanya) n’ime Index, ị ga-achọtakwa na e depụtara ntụaka ya n’ebe ahụ.

Akwụkwọ Index ahụ pụrụ iweta abamuru pụrụ iche n’ịchọta ihe ọmụma banyere ihe isi ike ndị ị pụrụ iche ihu. Dị ka ihe atụ, dị ka onye nwere ụmụ, ọ̀ dị mgbe ụfọdụ ike na-agwụ gị ná mgbalị ị na-eme inye ụmụ gị ọzụzụ na iduzi ha? N’okpuru isiokwu bụ CHILDREN (ụmụntakịrị) ị ga-ahụ ntụaka gaa n’ihe ndị na-enye aka ileba anya n’ụzọ ha si eche echiche, mmetụta, na mkpa ha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’okpuru isiokwu bụ CHILD TRAINING (ịzụ ụmụntakịrị), ị ga-enweta ntụaka nile metụtara izi ihe na inye ọzụzụ n’akụkụ ha nile.

Mgbe ụfọdụ, Watch Tower Society na-anata akwụkwọ ozi e ji na-arịọ enyemaka ha n’idozi nsogbu alụmdi na nwunye ma ọ bụ ajụjụ ndị metụtara izi ezi nke ụdị mmekọ ụfọdụ n’etiti di na nwunye. Ọ bụ ezie na Society pụrụ inye azịza, a pụkwara inweta otu okwu ndụmọdụ ndị ahụ nwere mmetụta dị omimi, ndị a pụkwara iji mee ihe site n’ile anya n’okpuru isiokwu ahụ bụ MARRIAGE (alụmdi na nwunye), tinyere isiokwu nta ya ndị bụ “problems” (ihe isi ike) na “sex” (mmekọahụ) ma ọ bụ “sexual relations” (inwe mmekọahụ), ma chọpụta ntụaka ndị e depụtara n’ebe ahụ.

A na-anatakwa akwụkwọ ozi site n’aka ndị nọ n’ahụhụ n’ihi obi ịda mbà ma ọ bụ nsogbu nke echiche. Nkasi obi na enyemaka a na-enweta site n’akwụkwọ ozi bụ nke a pụrụ ịchọta ngwa ngwa karị n’ebe ndebe akwụkwọ nke gị onwe gị ma ọ bụ nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu site n’ile anya n’okpuru isiokwu ndị bụ DEPRESSION (obi ịda mbà) na MENTAL ILLNESS (ọrịa uche) n’ime akwụkwọ Index ahụ. E zoro aka n’isiokwu ndị kọwara ụzọ a pụrụ isi nagide ọrịa uche, ụdị ọgwụgwọ ndị e nwere, na ahụmahụ ndị na-emetụ n’ahụ banyere ndị nweworo obi ịda mbà.

Ị̀ bụ onye ntorobịa? I pụrụ inwe nchegbu banyere alụmdi na nwunye, ndụ ezinụlọ, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ mmekọrịta dị n’etiti gị na ndị mụrụ gị, na ihe ndị ọzọ. Isiokwu ahụ bụ YOUTHS (ndị ntorobịa) nwere ntụaka n’okpuru isiokwu nta ndị a nile nakwa ndị ọzọ. Tinyere nke ahụ, isiokwu ndị dị ka RELATIONSHIPS (mmekọrita di iche iche), SCHOOLS (ụlọ akwụkwọ), CAREER (ụdị ọrụ a ga-arụ), na COURTSHIP (mbedo) nwere ọtụtụ ihe enyemaka. Iji nye aka n’ihe omume ụlọ akwụkwọ dị iche iche, Index pụrụ iduje gị n’ihe odide ndị mara mma banyere ihe okike, ọkà mmụta sayensị, ọgwụ, ọkà mmụta akụ na ụba, na ọtụtụ isiokwu ndị ọzọ.

Abamuru nye Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile

Otu nwanyị gbara 81 afọ dere, sị: “Akwụkwọ na magazin ndị ahụ bụ oké isi iyi nke ihe ọmụma na ume ime mmụọ—Index ahụ na-emekwa ka ọ dị mfe inweta ha.” Otu nwanyị onye ụmụ ya abụọ dị afọ asatọ na afọ itoolu kwuru, sị: “Ọ na-atụ m n’anya ugbu a otú m si nwee ike ịnọbu n’enweghị ya. Ọ dujewo m n’azịza nye ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị m cheworo echiche banyere ha ruo ogologo oge, o mewokwa ka ịmụ ihe e ji akwadebe nzukọ ọgbakọ dịkwuo nnọọ mfe. . . . Ọ ga-amasịkwa m ịkọrọ unu otú akwụkwọ nke a siworo nyere ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị aka.... Mgbe di m gwara ụmụ anyị ka ha họrọ ihe ga-amasị ha ime, ha na-ahọrọkarị iji akwụkwọ Index mee nnyocha. Ọ na-enye ha ọṅụ ịhọrọ isiokwu ha nwere mmasị na ya, dị ka anụmanụ ha nwere mmasị na ya ma ọ bụ mba dị iche iche, ha na-enwekwa ike ịchọta ihe ọmụma ahụ n’enweghị enyemaka dị ukwuu site n’aka onye ọzọ. Nke a akụziwokwara ha na ịmụ Bible bụ ihe na-enye obi ụtọ.”

Nchọpụta a na-eme maka okwu dị ụtọ na ndị e deziri edezi nke eziokwu ahụ na-enye nkwụghachi ụgwọ na-enweghị atụ. Mgbalị nile nke Onye Mkpọkọta ahụ wetara abamuru dị ukwuu karịa nzube mbụ ya, n’ihi na okwu ndị ahụ anọwo dị ka ihe agbamume na ihe nduzi nye ndị ohu Jehova ruo taa. Mgbalị yiri nke ahụ anyị na-eme na-ewetakwa ngọzi Jehova, na-arụpụtakwa ihe ndị pụrụ ịdịru mgbe ebighị ebi.—Ilu 3:13-18, 21-26.’

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28, 29]

Akwụkwọ Ndepụta Ntụaka Ndị Mbụ E Nwere

Na 1902, e mepụtaara Watch Tower Society mbipụta pụrụ iche nke Holman Parallel Edition Bible, o nwekwara n’ime ya ihe enyemaka dị ukwuu Society kwadebere. Ihe ntụkwasị ya nwere ma ndepụta ntụaka nke isiokwu ma nke akụkụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche maka usoro akwụkwọ Millennial Dawn ahụ (nke e mesịrị mara dị ka Studies in the Scriptures), akwụkwọ nta abụọ ndị bụ isi, na magazin Zion’s Watch Tower nke 1879-1901.

Bible ndị ahụ a kpọrọ Berean Bible nke 1907 nakwa ndị e bipụtara mgbe nke ahu gasịrị nwekwara ndepụta ntụaka ndị dị otú ahụ. E ji ndepụta ntụaka zuru ezu banyere akwụkwọ nile Society bipụtara dochie anya nke a na 1922. Ndepụta ntụaka ndị a pụtara na nke ikpeazụ ná mpịakọta asaa nke mbipụtaghachi Ụlo Nche (Bekee) (1879-1919). Ruo taa, nke ikpeazụ ahụ bụ ihe bụ isi e ji achọta ihe dị n’akwụkwọ ndị mbụ Watch Tower Society bipụtara.

Otú ọ di, ruo 40 afọ ọzọ, ime nnyocha n’akwụkwọ ndị e bipụtara mgbe 1919 gasịrị bụ nke a na-aghaghị ime site n’iji ndepụta ntụaka ndị na-adịkọghị ọnụ, bụ́ ndị dị n’azụ akwụkwọ dị iche iche nakwa ná mbipụta magazin nke ikpeazụ kwa afọ. Ma, n’afọ 1959, Society malitere nnukwute ọrụ nke iwepụta ndepụta ntụaka nke isiokwu na nke akụkụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche n’otu mpịakọta maka akwụkwọ nile o bipụtaworo n’asụsụ Bekee. A chịkọtara otu ìgwè ndị ọrụ nke gụnyere ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ, ndị ozi ala ọzọ a zụrụ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, na ọbụna ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị si na New York City. Mgbe otu afọ na ọkara nke mmadụ 18 ndị raara onwe ha nye rụsiri ọrụ ike gasịrị, e wepụtara akwụkwọ Watch Tower Publications Index nke mbụ, nke nwere akụkụ dị iche iche maka isiokwu ndị a tụlere na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kọwara, nke jikọtara 31 afọ, malite na 1930 ruo 1960. E bu ụzọ wepụtara ya ìgwè mmadụ ndị nwere obi ụtọ ná Mgbakọ Ndị Dị n’Otu n’Ofufe nke 1961.

Eri mgbe ahụ, e bipụtawo otu Watch Tower Publications Index n’asụsụ Bekee kwa afọ, na-enwe Index a chịkọtara achịkọta, nke e kwesiri mkpò ya ike n’afọ ise ọ bụla.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya