Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 16 p. 19
  • Ọbịbịa Mesaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọbịbịa Mesaya
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 16 p. 19

Nkebi nke 16

Ọbịbịa Mesaya

Jehova kwuru na ọ bụ Jizọs onye Nazaret bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa kemgbe

JEHOVA ọ̀ ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye bụ́ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa? Ee. Tụlee ihe Chineke mere mgbe ihe dị ka narị afọ anọ gachara site na mgbe e dechara Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’otu obodo a na-akpọ Nazaret nke dị n’ebe ugwu Galili, otú otu mmụọ ozi si bịakwute otu nwa agbọghọ aha ya bụ Meri juru ya anya nke ukwuu. Aha mmụọ ozi ahụ bụ Gebriel, ọ gwakwara nwa agbọghọ ahụ na Chineke ga-eme ka ọ tụrụ ime site n’ike mmụọ nsọ ma mụọ otu nwa nwoke ọ bụ ezie na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Nwa nwoke ahụ ọ ga-amụ ga-abụ Eze ahụ e kwere ná nkwa kemgbe, nke ga-achịkwa ruo mgbe ebighị ebi! Ọ ga-abụ Ọkpara Chineke; Chineke ga-esikwa n’eluigwe bufee ndụ ya n’akpa nwa Meri.

Meri ji obi umeala kweta ịrụ ọrụ ahụ dị oké mkpa. Otu ọkwa nkà aha ya bụ Josef, bụ́ onye kwere Meri nkwa ọlụlụ, mechara lụọ ya mgbe Chineke zipụrụ otu mmụọ ozi ka ọ gaa kọwaara ya otú Meri si tụrụ ime. Gịnịkwanụ banyere amụma ahụ kwuru na a ga-amụ Mesaya na Betlehem? (Maịka 5:2) Isi n’obodo nta ahụ ruo Nazaret dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri anọ!

Otu onye ọchịchị Rom nyere iwu ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ. Ọ chọrọ ka onye ọ bụla gaa deba aha ya n’akwụkwọ n’obodo a mụrụ ya. O yiri ka ọ̀ bụ na Betlehem ka a mụrụ Josef na Meri. N’ihi ya, Josef kpọ nwunye ya dị ime gawa Betlehem. (Luk 2:3) Meri mụrụ nwa n’ụlọ anụ ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. Chineke zigara ìgwè ndị mmụọ ozi ka ha gaa kọọrọ ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’akụkụ otu ugwu na nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ bụ Mesaya ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa.

Ka oge na-aga, ndị ọzọ ga-agba akaebe na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya e kwere ná nkwa. Aịzaya onye amụma buru amụma na otu nwoke ga-akwadebe ụzọ maka ọrụ dị mkpa Mesaya ahụ ga-arụ. (Aịzaya 40:3) Onye ahụ ga-ebu ụzọ bịa bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o tiri mkpu, sị: “Lee Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa!” N’egbughị oge, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn sooro Jizọs. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ.”—Jọn 1:29, 36, 41.

E nwere ihe ọzọ na-egosi na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Mgbe Jọn mere Jizọs baptizim, Jehova n’onwe ya si n’eluigwe kwuo okwu. O ji mmụọ nsọ ya họpụta Jizọs ka ọ bụrụ Mesaya ma kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Matiu 3:16, 17) Mesaya ahụ e kwere ná nkwa kemgbe abịala!

Olee mgbe ihe a mere? Ọ bụ n’afọ 29 O.A., nke bụ́ kpọmkwem mgbe narị afọ anọ na iri asatọ na atọ ahụ Daniel buru n’amụma gwụrụ. Nke a bụ otu n’ime ihe ndị na-egosi na Jizọs bụ Mesaya ma ọ bụ Kraịst. Ma, olee ụdị ozi ọ ga-ezisa mgbe ọ ga na-eje ozi n’ụwa?

—O si na Matiu isi nke mbụ ruo nke atọ; Mak isi nke mbụ; Luk isi nke abụọ; Jọn isi nke mbụ.

◼ Olee otú Jehova si jiri ndị mmụọ ozi mee ka a mata na Jizọs bụ Mesaya?

◼ Olee otú Jehova si jiri Jọn Onye Na-eme Baptizim gosi na Jizọs bụ Mesaya?

◼ Olee otú Jehova n’onwe ya si gosi na Ọkpara ya bụ Mesaya?

Igbe dị na peeji nke 19]

OLEE OTÚ JIZỌS SI BỤRỤ ỌKPARA CHINEKE?

Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ bụghị nwaanyị mụrụ ya, kama ọ bụ Chineke kere ya. N’ezie, ọ bụ ya bụ mmụọ ozi mbụ Jehova kere. (Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ebe ọ bụ Jehova kere Jizọs ma nye ya ndụ, e nwere ike ịkpọ Jehova Nna Jizọs. Mgbe Jehova kechara mmụọ ozi a bụ́ Ọkpara ya, o ji ya rụọ ọrụ dị ka “onye ọkà” n’ike ihe ndị ọzọ niile, tinyere eluigwe na ala.—Ilu 8:30.

Chaatị dị na peeji nke 19]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Abụ Ákwá

Ezikiel

Daniel

Hosia

Joel

Emọs

Obedaya

Jona

Maịka

Nehọm

Habakọk

Zefanaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

Matiu ●

Mak ●

Luk ●

Jọn ●

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya