Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ònye Mere Iwu Na-achị Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ala?
    Ụlọ Nche—2011 | Julaị 1
    • 1. Ọ̀ Bụ Eziokwu na Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ụwa Anaghị Agbanwe Agbanwe?

      Aristotle kwuru na ihe ndị dị n’eluigwe anaghị agbanwe agbanwe. O kwuru na kpakpando enweghị ike ibukwu ibu ma ọ bụ kwụsị ịdị adị.

      Baịbụl ò kwuru ihe a Aristotle kwuru? Mba; o nweghị kpọmkwem ihe Baịbụl kwuru na nke a. Ma, o nwere ihe atụ mara mma o ji kọwaa otú eluigwe na ụwa dị. Ọ sịrị: “Ọ dị Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu, nke ndị bi n’ime ya dị ka ụkpara, Onye setịrị eluigwe dị ka ákwà dị fere fere, onye gbasara ya dị ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi.”—Aịzaya 40:22.a

      Ihe Aristotle kwuru na ihe Baịbụl kwuru olee nke bụ́ eziokwu taa? Olee ihe ndị na-amụ banyere mbara igwe n’oge a chọpụtarala banyere eluigwe na ala? N’oge ndị na-adịbeghị anya, o juru ndị na-enyocha mbara igwe anya ịmata na eluigwe na ala na-agbanwe agbanwe. N’eziokwu, o yiri ka ụyọkọ kpakpando ndị e nwere hà na-esi n’ebe ha nọ pụọ ma nyekwuoro ndị ọzọ ohere ịgbasa. O nweghị ọkà mmụta sayensị gaara ekweta n’oge mbụ na ụdị ihe a na-eme eme, e nwegodị, ha ga-adị ole na ole. Taa, ọtụtụ ndị na-amụ banyere mbara igwe kweere na ihe ndị dị n’eluigwe ahaghị otú ha hà ugbu a mgbe ha malitere, kama, ha ji nwayọọ nwayọọ na-agbasa kemgbe ahụ. Nke a pụtara na ndị ọkà mmụta sayensị ekwetaghịzi ihe ahụ Aristotle kụziri.

      Oleekwanụ maka ihe ahụ Baịbụl kwuru? Weregodị ya na ị na-ahụ Aịzaya onye amụma ka ọ nọ na-ele anya n’eluigwe nke kpakpando juru ma hụ nnọọ na ọ dị ka ákwà ụlọikwuu a gbasara agbasa.b O nwedịrị ike ịbụ na ọ hụrụ ụyọkọ kpakpando bụ́ Milky Way, ya achọpụta na ọ dị nnọọ ka “ákwà dị fere fere” e setịrị esetị.

      Ihe ahụ Aịzaya kwuru na-emekwa ka anyị chee echiche banyere otú ihe ndị dị n’eluigwe dị. Anyị nwere ike icheta otú e si ama ụlọikwuu n’oge Baịbụl; a na-ebupụta ákwà a ga-eji maa ụlọikwuu, tọghee ya ma gbasaa ya, werezie osisi bulie ya elu ka ọ ghọọ ụlọ. Ihe ọzọ ọ na-echetara anyị bụ ebe onye na-ere ahịa welitere ákwà dị fere fere ọ na-ere ere ma gbasaa ya ka onye chọrọ ịzụ ya leruo ya anya. Ná nke ọ bụla n’ihe atụ a, a gbasara ihe fụkọtara ọnụ, ya asazie mbara.

      N’eziokwu, anyị anaghị ekwu na ihe a Baịbụl kwuru ebe a na-akụziri anyị otú eluigwe na ala si na-ebuwanye ibu. Ma, ọ̀ bụ na ọ masịghị gị na ihe Baịbụl kọrọ banyere eluigwe na ala dabara nnọọ n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a chọpụtara? Aịzaya dịrị ndụ ihe karịrị narị afọ atọ tupu a mụọ Aristotle nakwa ọtụtụ puku afọ tupu ndị ọkà mmụta sayensị achọpụta otú ihe ndị dị n’eluigwe si arụ ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe onye amụma ahụ na-abụghị ọkà mmụta sayensị dere ka bụkwa eziokwu. O nweghị mgbe a ga-anọkata chọpụta na ọ bụkwaghị eziokwu otú ahụ a chọpụtara na ihe ahụ Aristotle kụziri abụghị eziokwu.

  • Ònye Mere Iwu Na-achị Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ala?
    Ụlọ Nche—2011 | Julaị 1
    • a Ọ dị mma ịmara na Baịbụl sịrị na ụwa dị gburugburu ma ọ bụ okirikiri. Aristotle na ndị Gris ndị ọzọ bụ́ ndị ọkà mmụta n’oge ochie kwuru na ụwa dị okirikiri, ma ihe karịrị puku afọ abụọ gafere tupu ndị ọkà mmụta ndị ọzọ ekweta.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya