Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ba p. 27-29
  • Akwụkwọ Amụma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Amụma
  • Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụghị Nanị Ịkọ Nkọ Ndị Maara Ihe
  • ‘A Ga-ewere Azịza Mkpochapụ Zachapụ Ya’
  • “N’alụghị Ọgụ”
  • Hà Bụ Akụkọ Ihe Mere Eme Yiri Ka Ha Bụ Amụma?
  • “Ọ Gaghị Abụ Ebe Obibi Ọzọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”
  • Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka A Pụrụ Ịdabere N’amụma Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
ba p. 27-29

Akwụkwọ Amụma

Ndị mmadụ nwere mmasị n’ọdịnihu. Ha na-achọ okwu ọdịnihu ndị a pụrụ ịdabere na ha banyere ọtụtụ ihe, malite n’ịkọ nkọ ọnọdụ ihu igwe ruo n’ihe mgbaàmà ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ma, mgbe ha ji ịkọ nkọ ndị dị otú ahụ mee ihe, ha na-enwe mmechuihu ọtụtụ mgbe. Bible nwere ọtụtụ okwu ọdịnihu, ma ọ bụ amụma. Ruo ókè hà aṅaa ka amụma ndị dị otú ahụ ziri ezi? Hà bụ akụkọ ihe mere eme e dere tupu ha emee? Ka hà bụ akụkọ ihe mere eme yiri ka ha bụ amụma?

A KỌRỌ na onye Rom ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Cato (234-149 T.O.A.) kwuru, sị: “Ọ na-eju m anya ihe mere na onye na-akọwa ọdịnihu adịghị achị ọchị mgbe ọ bụla ọ hụrụ onye ọzọ na-akọwa ọdịnihu.”1 N’ezie, ruo taa ọtụtụ ndị na-enyo ndị na-akọ ọdịnihu, ndị na-agụ kpakpando, na ndị ọzọ na-akọwa ọdịnihu enyo. Ọtụtụ mgbe okwu ọdịnihu ha na-adị n’ụdị okwu ndị na-agbagwoju anya, ha na-enyekwa ohere maka ọtụtụ nkọwa dị iche iche.

Ma, gịnị banyere amụma Bible? È nwere ihe a ga-eji na-enyo ha enyo? Ka è nwere ihe ndabere maka obi ike?

Ọ Bụghị Nanị Ịkọ Nkọ Ndị Maara Ihe

Ndị maara ihe pụrụ ịnwa iji ihe ndị a na-ahụ anya na-emenụ maa amụ̀ma ndị ziri ezi banyere ọdịnihu, ma ha anaghị ezi ezi mgbe nile. Akwụkwọ bụ́ Future Shock na-ekwu, sị: “Ọha mmadụ ọ bụla na-eche ihu ọ bụghị nanị n’usoro ọdịnihu a pụrụ inwe, kama ìgwè ọdịnihu kwere omume, na nsọkọ isi banyere ọdịnihu ndị ka mma.” Ọ gbakwụnyere: “Ma, ọ dịghị onye pụrụ ‘ịmara’ ọdịnihu n’echiche nke ịmata ihe nile. Anyị pụrụ nanị ime ka ihe anyị na-eche dịrị n’usoro ma mie emi ma gbalịa ikwubi na ha pụrụ iwere ọnọdụ.”2

Ma ndị dere Bible ‘ekwubighị nanị na ihe ndị a na-eche’ banyere ọdịnihu “pụrụ iwere ọnọdụ.” A pụghịkwa ileghara okwu ọdịnihu ha anya dị ka okwu ndị na-edoghị anya a pụrụ inye ọtụtụ nkọwa dị iche iche. N’ụzọ dị iche, e buru ọtụtụ n’ime amụma ha n’ụzọ doro nnọọ anya, n’ụzọ na-eju anya ha na-akpọkwa okwu aha, ọtụtụ mgbe na-ekwu ihe megidere nnọọ ihe a pụrụ ịtụ anya ya. Were dị ka ihe atụ ihe Bible bu ụzọ kwuo banyere obodo Babilọn oge ochie.

‘A Ga-ewere Azịza Mkpochapụ Zachapụ Ya’

Babilọn oge ochie ghọrọ “ọla alaeze nile.” (Aịsaịa 13:19, The New American Bible) Obodo a gbasapụrụ agbasapụ nọziri anọzi n’ụzọ ahịa sitere Persian Gulf gaa Osimiri Mediterranean, na-eje ozi dị ka ebe ndọba ihe azụmahịa maka ahịa nke ma elu ala ma elu mmiri n’agbata Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ.

Ka ọ na-erule narị afọ nke asaa T.O.A., Babilọn bụ isi obodo yiri ka a pụghị imeri ya emeri nke Alaeze Ukwu Babilọn. Obodo ahụ nọ n’akụkụ abụọ nke Osimiri Yufretis, e jikwa mmiri osimiri ahụ wuo ékpè miri emi na njikọ nke ọwa mmiri. Tụkwasị na nke a, e ji nnukwute usoro mgbidi gbara mkpị, nke a gbakwụnyere ọtụtụ ụlọ elu nchebe, chebe obodo ahụ. Ka a sịkwa ihe mere o ji yie ndị bi na ya ka ha nọ ná nchebe.

Ka o sina dị, na narị afọ nke asatọ T.O.A., tupu Babilọn etoruo ebube ya, Aịsaịa onye amụma buru amụma na ‘a ga-ewere azịza mkpochapụ zachapụ’ Babilọn. (Aịsaịa 13:19; 14:22, 23) Aịsaịa kọwakwara kpọmkwem ụzọ Babilọn ga-esi daa. Ndị mwakpo ya ‘ga-atakọ’ osimiri ya—isi iyi nke ihe nchebe ya yiri ékpè—na-etinye obodo ahụ n’ihe ize ndụ. Ọbụna na Aịsaịa nyere aha onye mmeri ya—“Saịrọs,” eze ukwu nke Peasia, “onye a ga-emeghesị ọnụ ụzọ ámá n’ihu ya, ọ dịghịkwa ụzọ a ga-emechi.”—Aịsaịa 44:27–45:2, The New English Bible.

Ndị a bụ okwu ọdịnihu e ji obi ike kwuo. Ma hà mezuru? Akụkọ ihe mere eme na-aza.

“N’alụghị Ọgụ”

Narị afọ abụọ ka Aịsaịa dekọsịrị amụma ya, n’abalị October 5, 539 T.O.A., usuu ndị agha Medo-Peasia n’okpuru nduzi Saịrọs Onye Ukwu mara ụlọikwuu nso Babilọn. Ma obi siri ndị Babilọn ike. Dị ka onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus (narị afọ nke ise T.O.A.) na-ekwu, ha kwakọbara ihe ga-ezuru ha ọtụtụ afọ.3 Ha nwekwara Osimiri Yufretis na agadaga mgbidi Babilọn ichebe ha. Ka o sina dị, kpọmkwem n’abalị ahụ, dị ka Ihe Ndekọ Nabonidus na-akọ, “usuu ndị agha Saịrọs banyere Babilọn n’alụghị ọgụ.”4 Ò si aṅaa kwe omume?

Herodotus na-akọwa na n’ime obodo ahụ, ndị mmadụ “nọ na-agba egwú na-enwekwa aṅụrị n’otu ememe.”5 Otú ọ dị, n’èzí, Saịrọs akwagharịworo mmiri Yufretis okpo. Ka mmiri ahụ gbadalatara, usuu ndị agha ya wafere okpo osimiri ahụ, mmiri na-eru ha n’apata ụkwụ. Ha zọọrọ ije gafere oké mgbidi ndị ahụ ma si n’ihe Herodotus kpọrọ “ọnụ ụzọ ámá ndị meghepụrụ n’ọnụ osimiri ahụ,” ọnụ ụzọ ámá ndị e ji nleghara anya ghewe oghe banye.6 (Tụlee Daniel 5:1-4; Jeremaịa 50:24; 51:31, 32.) Ndị ọzọ na-akọ akụkọ ihe mere eme, gụnyere Xenophon (c. 431–c. 352 T.O.A.), nakwa mbadamba nkume cuneiform ndị ọkà mmụta ihe ochie chọtara, na-akwado ọdịda mberede nke Babilọn n’aka Saịrọs.7

E si otú a mezuo amụma Aịsaịa banyere Babilọn. Ka ọ̀ bụ ya? Ò kwere omume na nke a abụghị okwu ọdịnihu kama na n’ezie e dere ya mgbe ihe mesịrị? N’ezie, a pụrụ ịjụ otu ihe ahụ banyere amụma Bible ndị ọzọ.

Hà Bụ Akụkọ Ihe Mere Eme Yiri Ka Ha Bụ Amụma?

Ọ bụrụ na ndị amụma Bible—gụnyere Aịsaịa—nanị degharịrị akụkọ ihe mere eme ka ha yie amụma, mgbe ahụ ndị ikom a bụ nnọọ ndị wayo dị akọ. Ma gịnị ga-abụ ihe mkpali ha maka aghụghọ dị otú ahụ? Ezi ndị amụma na-eme ka a mara ozugbo na a pụghị inye ha aka azụ. (1 Samuel 12:3; Daniel 5:17) Anyị atụlewokwarị ihe àmà dị ike nke na ndị dere Bible (ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị amụma) bụ ndị ikom kwesịrị ịtụkwasị obi bụ́ ndị dị njikere ikpughe ọbụna njehie ndị nke ha na-eme ihere. O yighị ka ndị ikom dị otú a hà ga-achọ igwu ajọ wayo, na-arọgharị akụkọ ihe mere eme ka ọ dị ka amụma.

E nwere ihe ọzọ a ga-atụle. Ọtụtụ amụma Bible nwere okwu ọmụma ikpe ndị na-agba agba megide ndị obodo nke ndị amụma ahụ n’onwe ha, bụ́ ndị gụnyere ndị nchụàjà na ndị na-achị isi. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa katọrọ ọnọdụ omume dị imere ebere nke ndị Israel—ma ndị ndú ma ndị nkịtị—n’ụbọchị ya. (Aịsaịa 1:2-10) Ndị amụma ndị ọzọ ji ụzọ dị ike kpughee mmehie ndị nchụàjà. (Zefanaịa 3:4; Malakaị 2:1-9) O siri ike ịhụ ihe mere ha ga-eji chepụta amụma ndị nwere okwu nkatọ dị nnọọ ike a pụrụ ichetụ n’echiche megide ndị nke ha na ihe mere ndị nchụàjà ga-ejiwo kwenyere aghụghọ dị otú ahụ.

Ọzọkwa, olee otú ndị amụma ahụ—ma ọ bụrụ na ha bụ nanị ndị aghụghọ—pụrụ isiwo ghọruo aghụghọ dị otú ahụ n’isi? A na-agba ịma ka e si ede na ka e si agụ ume n’Israel. Bido na nwata, a na-akụziri ụmụaka ka e si agụ na ka e si ede. (Deuterọnọmi 6:6-9) A gbara ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’onwe onye ume. (Abụ Ọma 1:2) E nwere ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’ihu ọha n’ụlọ nzukọ kwa Sabat izu ọ bụla. (Ọrụ 15:21) O yighị ka o kwere omume na a pụrụ ijiwo aghụghọ dị otú ahụ ghọrịa mba dum maara ka e si agụ na ka e si ede, bụ́ ndị maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma.

E wezụga nke ahụ, e nwere ihe ọzọ dị n’amụma Aịsaịa banyere ọdịda Babilọn. E tinyere n’ime ya nkọwa nke ihe a na-apụghị ma ọlị idewo mgbe mmezu ya gasịrị.

“Ọ Gaghị Abụ Ebe Obibi Ọzọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi”

Gịnị ga-eme Babilọn ma ọdịda ya gasịa? Aịsaịa buru amụma, sị: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; a gaghị ebikwa n’ime ya ruo ọgbọ nile: onye Arebia agaghị amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị emekwa ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 13:20) Ọ pụrụ iyiwo ihe ijuanya, ka a ghara ikwuwe oké okwu, ikwu na n’ọdịnihu obodo dị otú a nọ n’ọnọdụ ọma agaghị abụkwa ebe obibi ruo mgbe ebighị ebi. À pụrụ idewo okwu Aịsaịa mgbe o kirisịworo Babilọn tọgbọrọ n’efu?

Mgbe mmeri Saịrọs gasịrị, Babilọn mmadụ bi—ọ bụ ezie na ọ bụ nke na-adịchaghị ike—dịgidere ruo ọtụtụ narị afọ. Cheta na Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ gụnyere otu akwụkwọ Aịsaịa zuru ezu nke e gosiri na ọ dị eri narị afọ nke abụọ T.O.A. N’ihe dị ka n’oge a na-edepụtaghachi akwụkwọ mpịakọta ahụ, ndị Parthia weghaara Babilọn. Na narị afọ mbụ O.A., e nwere ógbè ndị Juu na Babilọn, Pita so dee Bible letakwara ebe ahụ. (1 Pita 5:13) N’oge ahụ, Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa adịworị eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ. Ya mere, ka ọ na-erule narị afọ mbụ O.A., Babilọn atọgbọrọbeghị n’efu kpam kpam, ma e dezuwo akwụkwọ Aịsaịa ogologo oge tupu mgbe ahụ.a

Dị ka e buru n’amụma, Babilọn mesịrị ghọọ “obo ihe obo ihe.” (Jeremaịa 51:37) Dị ka ọkà mmụta bụ́ onye Hibru bụ́ Jerome (narị afọ nke anọ O.A.) kwuru, ka ọ na-erule ụbọchị ya Babilọn bụ ebe ịchụ nta bụ́ ebe “ụdị anụ ọhịa nile” na-awagharị.9 Babilọn ka tọgbọ n’efu ruo taa.

Aịsaịa anọgideghị ndụ ruo ịhụ ka Babilọn na-enweghị onye obibi. Ma mkpọmkpọ ebe nke obodo ahụ dịbu ike, ihe dị ka kilomita 80 n’ebe ndịda Baghdad, n’Iraq nke oge a, na-agba akaebe n’ekwughị okwu nye mmezu nke okwu ya: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.” Mwughachi ọ bụla nke Babilọn dị ka ihe ndọrọ ndị njem nleta pụrụ ịrata ndị ọbịa, ma “ụmụ na ụmụ ụmụ” Babilọn efunyụwo anya.—Aịsaịa 13:20; 14:22, 23.

Ya mere Aịsaịa onye amụma ekwughị okwu ọdịnihu na-edoghị anya a pụrụ ime ka o kwekọọ n’ihe ọ bụla mere n’ọdịnihu. O degharịghịkwanụ akụkọ ihe mere eme iji mee ka o yie amụma. Chee banyere ya: Onye aghụghọ ọ̀ ga-anwa anwa “ibu amụma” ihe ọ na-agaghị enwe nchịkwa ọ bụla na ya—na Babilọn dị ike agaghị enwekwa onye obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi?

Amụma a banyere ọdịda Babilọn bụ nanị otu ihe atụ site na Bible.b Ọtụtụ mmadụ na-ahụ ná mmezu nke amụma ya dị iche iche ihe ngosipụta nke na Bible aghaghị isite n’isi iyi karịrị mmadụ. Ikekwe ị ga-ekwenye na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, akwụkwọ a nke amụma ruru eru inyocha. E ji otu ihe n’aka: E nwere oké ọdịiche n’etiti okwu ọdịnihu dị inyoghị inyoghị ma ọ bụ na-akpali mmetụta uche nke ndị na-akọwa ọdịnihu n’ụbọchị ndị a na amụma ndị doro anya, na-emetụ n’ahụ, na amụma ndị a kapịrị ọnụ na Bible.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E nwere ihe àmà siri ike na e dere akwụkwọ ndị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru—gụnyere Aịsaịa—ogologo oge tupu narị afọ mbụ O.A. Josephus na-akọ akụkọ ihe mere eme (narị afọ mbụ O.A.) gosiri na e guzobewo akwụkwọ ndị a nakweere ịbụ Akwụkwọ Nsọ Hibru ogologo oge tupu ụbọchị ya.8 Ọzọkwa, a malitere Septuagint nke Grik, nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik, na narị afọ nke atọ T.O.A., a sụgharịsịkwara ya ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ T.O.A.

b Maka ịtụlekwu amụma Bible na ihe ndị mere eme n’ezie na-anwapụta mmezu ha, biko lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 117-133.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

Ndị dere Bible hà bụ ndị amụma ziri ezi ka ha bụ ndị wayo dị akọ?

[Foto dị na peeji nke 29]

Mkpọmkpọ ebe nke Babilọn oge ochie

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya