Ọ̀ Bụ Akwụkwọ Dịịrị Gị?
“Ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ,” ka Solomọn kwuru ihe dị ka afọ 3,000 gara aga. (Eklisiastis 12:12) Nchọpụta ahụ kwesịrị ekwesị taa dị ka n’oge ọ bụla ọzọ. Tụkwasị n’ọkpọka akwụkwọ ndị a ma ama, a na-ebi ọtụtụ puku akwụkwọ ọhụrụ kwa afọ. Ebe e nwere ọtụtụ akwụkwọ otú a isi na ha họrọ, n’ihi gịnị ka ị ga-eji agụ Bible?
ỌTỤTỤ mmadụ na-agụ akwụkwọ maka ntụrụndụ ma ọ bụ maka ịma ihe na-aga, ma ọ bụ ikekwe maka ihe abụọ ahụ. Otu ihe ahụ pụrụ ịbụ eziokwu banyere ịgụ Bible. Ọ pụrụ ịbụ ọgụgụ ihe na-ewuli elu, ọbụna nke ntụrụndụ. Ma Bible karịrị nke ahụ. Ọ bụ isi iyi pụrụ iche nke ihe ọmụma.—Eklisiastis 12:9, 10.
Bible na-aza ajụjụ ndị ụmụ mmadụ jụworo eri ogologo oge—ajụjụ banyere oge anyị gara aga, oge anyị ugbu a, na ọdịnihu anyị. Ọtụtụ na-ajụ: Olee ebe anyị si? Gịnị bụ nzube nke ndụ? Ànyị pụrụ isi aṅaa nweta obi ụtọ ná ndụ? À ga-enwe ndụ mgbe nile n’elu ụwa? Gịnị na-echere anyị n’ọdịnihu?
Nchịkọta nke ike ihe àmà dum e wepụtara n’ebe a na-eguzobe n’ụzọ doro anya na Bible ziri ezi ma bụrụ eziokwu. Anyị atụleworị ụzọ ndụmọdụ ya dị irè pụrụ isi nyere anyị aka ibi ndụ nwere nzube na nke obi ụtọ taa. Ebe azịza ya maka oge dị ugbu a na-eju afọ, n’ezie azịza ya banyere oge gara aga na amụma ya banyere ọdịnihu kwesịrị ntụle site ná nlezianya.
Ụzọ Isi Rite Uru Kasịnụ
Ọtụtụ ndị amalitewo ịgụ Bible wee mesịa kwụsị mgbe akụkụ ya ụfọdụ siiri ha ike ịghọta. Ọ bụrụ na nke ahụ abụwo ahụmahụ gị, e nwere ihe ụfọdụ pụrụ inye aka.
Họrọ nsụgharị a pụrụ ịdabere na ya n’asụsụ ọgbara ọhụrụ. Ụfọdụ na-amalite site n’ịgụ akụkọ Oziọma nke ndụ Jisọs, onye nkụzi amamihe ya, dị ka ndị a na-ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, na-egosipụta nghọta dị nkọ nke ọdịdị mmadụ ma na-esetịpụ ụzọ isi mee ka ọnọdụ anyị ná ndụ ka mma.—Lee Matiu isi nke 5 ruo 7.
Tụkwasị n’ịgụcha Bible, ụzọ ọmụmụ ihe n’isiokwu n’isiokwu pụrụ nnọọ inye ihe ọmụma. Nke a gụnyere ịtụle ihe Bible na-ekwu n’otu isiokwu kpọmkwem. Ọ pụrụ iju gị anya ịmụta ihe Bible na-ekwu n’ezie banyere isiokwu ndị dị ka mkpụrụ obi, eluigwe, ụwa, ndụ, na ọnwụ, nakwa Alaeze Chineke—ihe ọ bụ na ihe ọ ga-arụzu.a Ndịàmà Jehova nwere usoro Bible n’isiokwu n’isiokwu, bụ́ nke ha na-enye n’efu. Ị pụrụ ịjụ banyere ya site n’idetara ndị bipụtara akwụkwọ a akwụkwọ, na-eji adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.
Mgbe ha tụlesịrị ihe àmà dịnụ, ọtụtụ mmadụ ekwubiwo na Bible sitere n’aka Chineke, onye Akwụkwọ Nsọ na-eme ka a mara dị ka “Jehova.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ pụrụ ịbụ na i kweghị na Bible sitere n’aka Chineke. Ma gịnị ma i nyochaa ya n’onwe gị? Obi siri anyị ike na mgbe usoro ọmụmụ ihe, ntụgharị uche, na ikekwe inwe ahụmahụ nke uru dị irè nke amamihe ya dịịrị oge nile n’onwe gị gasịrị, ị ga-amalite iche na Bible n’ezie bụ akwụkwọ dịịrị mmadụ nile, karịakwa nke ahụ—akwụkwọ dịịrị gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ nyewooro ọtụtụ aka n’ọmụmụ Bible n’isiokwu n’isiokwu bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.