Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 6 p. 76-92
  • Jehova—“Chineke nke Na-eme Ezi Omume na Onye Nzọpụta”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—“Chineke nke Na-eme Ezi Omume na Onye Nzọpụta”
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwupụta Okwu Jehova Megide Babilọn
  • Ihe Mere Jehova Ga-eji Gosi Saịrọs Ihu Ọma
  • Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Ịnakwere Ọbụbụeze Jehova
  • Ngọzi Maka Mba Ndị Ọzọ
  • N’ike Ihe na ná Mkpughe, Jehova Bụ Onye A Pụrụ Ịdabere n’Ebe Ọ Nọ
  • Jehova Egosi Ebere Ya
  • “Nzọpụta Dịịrị Chineke Anyị”
  • Okwu Amụma Nkasi Obi Ndị Metụtara Gị
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị Chineke Ahapụ Babilọn
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 6 p. 76-92

Isi nke Isii

Jehova—“Chineke nke Na-eme Ezi Omume na Onye Nzọpụta”

Aịsaịa 45:1-25

1, 2. Mmesi obi ike dịgasị aṅaa ka e nyere n’Aịsaịa isi 45, ajụjụ dịgasịkwa aṅaa ka a ga-atụle?

A PỤRỤ ịdabere ná nkwa nile nke Jehova. Ọ bụ Chineke nke mkpughe na Chineke nke okike. O gosipụtawo ugboro ugboro na ya bụ Chineke na-eme ezi omume na Onye Nzọpụta nke ndị nke mba nile. Ndị a bụ ụfọdụ n’ime mmesi obi ike ndị na-enye obi ụtọ dị n’Aịsaịa isi 45.

2 Tụkwasị na nke ahụ, Aịsaịa isi 45 nwere ihe atụ dị ịrịba ama nke ikike Jehova nwere ibu amụma. Mmụọ Chineke mere ka Aịsaịa nwee ike ilekwasị anya ná mba ndị dị ebe dị anya na ịhụ ihe ndị ga-eme n’ọtụtụ narị afọ n’ihu, ọ kpalikwara ya ịkọwa otu ihe omume nke ọ bụ nanị Jehova, bụ́ Chineke nke ezi amụma, pụrụ ibu n’amụma n’ụzọ ziri ezi otú ahụ. Gịnị bụ ihe omume ahụ? Olee otú o si metụta ndị Chineke n’oge Aịsaịa? Gịnị ka ọ pụtara nye anyị taa? Ka anyị nyochaa ihe onye amụma ahụ kwuru.

Nkwupụta Okwu Jehova Megide Babilọn

3. Olee okwu ndị doro anya Aịsaịa 45:1-3a ji kọwaa mmeri Saịrọs?

3 “Otú a ka Jehova sịrị onye Ya e tere mmanụ, bụ́ Saịrọs, onye M jideworo aka nri ya, ịzọda mba dị iche iche n’ihu ya, ọ bụkwa úkwù ndị eze ka M ga-ekepụ; imeghe ụzọ n’ihu ya, a gaghị emechibidokwa ọnụ ụzọ ámá; Mụ onwe m ga-aga n’ihu gị, mee ka mkputamkpu ebe nile guzozie: ibo ọnụ ụzọ ọla nile ka M ga-etiwa, ihe ntụchi ígwè nile ka M ga-egbujipụkwa: M ga-enyekwa gị akụ̀ nke ọchịchịrị, na akụ̀ zoro ezo nke ebe nzuzo dị iche iche.”—Aịsaịa 45:1-3a.

4. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji kpọọ Saịrọs “onye Ya e tere mmanụ”? (b) Olee otú Jehova ga-esi hụ na Saịrọs meriri?

4 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-agwa Saịrọs okwu dị ka a ga-asị na ọ dị ndụ, ọ bụ ezie na n’oge Aịsaịa, a mụbeghị Saịrọs. (Ndị Rom 4:17) Ebe Jehova họpụtara Saịrọs tupu oge eruo ịrụzu otu ọrụ kpọmkwem, a pụrụ ikwu na Saịrọs bụ ‘onye e tere mmanụ’ nke Chineke. Ebe Chineke na-edu ya, ọ ga-emeri mba dị iche iche, na-eme ka ndị eze ghara ịdị ike, gharakwa inwe ike iguzogide ya. Mgbe Saịrọs ga-awakpozi Babilọn, Jehova ga-ahụ na e ghewere ibo ụzọ obodo ahụ oghe, na-eme ka ha ghara ịba uru dị nnọọ ka ọnụ ụzọ ámá nke a kụrisịworo. Ọ ga-aga Saịrọs n’ihu, na-ewepụ ihe mgbochi nile. N’ikpeazụ, ndị agha Saịrọs ga-emeri obodo ahụ ma weghara “akụ̀ [ya ndị] zoro ezo,” akụ̀ na ụba ya a kwakọbara n’ebe ndebe ihe bụ́ ndị gbara ọchịchịrị. Nke a bụ ihe Aịsaịa buru n’amụma. Okwu ya ò mezuru?

5, 6. Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka amụma banyere ọdịda nke Babilọn si mezuo?

5 N’afọ 539 T.O.A—ihe dị ka afọ 200 mgbe Aịsaịa dekọsịrị amụma a—Saịrọs bịarutere n’ezie ná mgbidi Babilọn iji wakpo obodo ahụ. (Jeremaịa 51:11, 12) Otú ọ dị, o nyeghị ndị Babilọn nsogbu n’uche. Ha chere na a pụghị imeri obodo ha emeri. Mgbidi ya ndị dị nnọọ elu dị n’akụkụ okokoro ndị dị omimi, ndị mmiri si n’Osimiri Yufretis jupụtara, bụ́ ndị so n’usoro ihe nchebe nke obodo ahụ. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, ọ dịbeghị onye iro nke nwere ike ịwakpo Babilọn na mberede! N’ezie, onye ọchịchị Babilọn nke bi ebi na ya, bụ́ Belshaza, chere nnọọ na ọ dịghị ihe ga-emenụ nke na ya na òtù ndị ọchịchị ya nọ na-eri oriri. (Daniel 5:1) N’abalị ahụ—n’abalị nke October 5/6—Saịrọs mere ka nkata agha o ji akọ kpaa kụrụ ọnụ.

6 Ná mgbago mgbago osimiri ahụ tupu ọ sọbata Babilọn, ndị injinịa Saịrọs awawo oghere n’ụsọ Osimiri Yufretis, na-eche mmiri ya ihu n’ebe ọzọ nke mere na ọ dịghịkwa asọga na ndịda n’ebe obodo ahụ dị. N’egbughị oge, mmiri nke dị n’ime nakwa na gburugburu Babilọn talatara nke ukwuu nke na ndị agha Saịrọs nwere ike iji ụkwụ si n’ala mmiri ahụ gafere banye n’etiti obodo ahụ. (Aịsaịa 44:27; Jeremaịa 50:38) N’ụzọ na-eju anya, dị nnọọ ka Aịsaịa buru n’amụma, e ghewere ọnụ ụzọ ámá dị n’akụkụ osimiri ahụ oghe. Ndị agha Saịrọs nubatara na Babilọn, weghara obí eze, ma gbuo Eze Belshaza. (Daniel 5:30) Mmeri ahụ kụụrụ ọnụ n’otu abalị. Babilọn adawo, e mezukwara amụma ahụ kpam kpam.

7. Olee otú mmezu dị ịrịba ama nke amụma Aịsaịa banyere Saịrọs si ewusi ndị Kraịst ike?

7 Mmezu e mezuru amụma a kpọmkwem na-ewusi okwukwe ndị Kraịst ike taa. Ọ na-eme ka ha nwee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere ha ga-eji kweta na a pụkwara ịtụkwasị amụma Bible ndị na-emezubeghị obi kpam kpam. (2 Pita 1:20, 21) Ndị na-efe Jehova maara na ihe omume ahụ nke ọdịda Babilọn dara na 539 T.O.A. sere onyinyo ya—ọdịda nke “Babilọn Ukwu” ahụ—ewereworị ọnọdụ laa azụ na 1919. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-atụ anya mbibi nke nzukọ okpukpe ahụ dị n’oge a nakwa mwepụ e kwere nkwa iwepụ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nke Setan na-achịkwa, ịtụba Setan n’abyss, na ọbịbịa nke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. (Mkpughe 18:2, 21; 19:19-21; 20:1-3, 12, 13; 21:1-4) Ha maara na amụma Jehova abụghị nkwa ndị na-agaghị emezu emezu, kama ha bụ nkọwa nke ihe ndị a kapịrị ọnụ, ga-eme n’ọdịnihu. A na-eme ka obi ike nke ezi ndị Kraịst sikwuo ike mgbe ha chetara mmezu nke ihe nile e kwuru n’amụma Aịsaịa banyere ọdịda nke Babilọn. Ha maara na Jehova na-emezu okwu ya mgbe nile.

Ihe Mere Jehova Ga-eji Gosi Saịrọs Ihu Ọma

8. Olee otu ihe mere Jehova ji mee ka Saịrọs merie Babilọn?

8 Mgbe o kwusịrị onye ga-emeri Babilọn na otú a ga-esi mee nke a, Jehova gara n’ihu ịkọwa otu ihe mere a ga-eji mee ka Saịrọs merie. Jehova, n’ịgwa Saịrọs okwu n’ụzọ amụma, na-asị na ọ bụ “ka i wee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye ahụ Nke na-akpọ gị n’aha gị, ọbụna Chineke Israel.” (Aịsaịa 45:3b) O kwesịrị ekwesị na onye ọchịchị nke ike ọchịchị ụwa nke anọ n’akụkọ ihe mere eme nke Bible ghọtara na mmeri kasị ukwu o nwere bụ n’ihi nkwado nke onye ka ya ukwuu—Jehova, bụ́ Eze Eluigwe na Ala. Saịrọs kwesịrị ịghọta na onye kpọrọ ya, ma ọ bụ onye nyere ya ọrụ, bụ Jehova, bụ́ Chineke Israel. Ihe ndekọ Bible na-egosi na Saịrọs ghọtara n’ezie na oké mmeri o nwere sitere n’aka Jehova.—Ezra 1:2, 3.

9. Gịnị bụ ihe nke abụọ mere Jehova ji kpọta Saịrọs ịbịa merie Babilọn?

9 Jehova na-akọwa ihe nke abụọ mere o ji mee ka Saịrọs merie Babilọn: “N’ihi ohu m, bụ́ Jekọb, na Israel nke M họpụtara, ka M na-akpọ gị n’aha gị: ana m etu gị aha, ọ bụ ezie na ị maghị m.” (Aịsaịa 45:4) Mmeri Saịrọs meriri Babilọn dị oké mkpa. Ọ kara ọdịda nke otu ike ọchịchị ụwa na mbilite nke ike ọchịchị ụwa ọzọ akara, o nwekwara mmetụta na-adịte aka n’akụkọ ihe mere eme ruo ọtụtụ ọgbọ ga-abịanụ. Ma, o yiri ka ọ ga-eju ndị nọ ná mba ndị gbara ya gburugburu, bụ́ ndị ji oké mmasị na-ekiri ihe na-emenụ, anya ịmara na ihe ahụ nile na-eme n’ihi puku mmadụ ole na ole “na-adịghị mkpa” bi n’ala ọzọ na Babilọn—ndị Juu, ụmụ Jekọb. Otú ọ dị, n’anya Jehova, ndị a lanarịrịnụ bụ́ ndị so ná mba Israel oge ochie, abụghị ma ọlị, ndị na-adịghị mkpa. Ha bụ “ohu” ya. N’etiti mba nile nke ụwa, ọ bụ ha bụ ‘ndị ọ họpụtara.’ Ọ bụ ezie na Saịrọs amabughị Jehova, Jehova ji ya mee ihe dị ka onye Ya e tere mmanụ iji kwatuo obodo ahụ nke jụrụ ịtọhapụ ndị o ji eji. Ọ bụghị nzube Chineke na ndị ya ọ họpụtara ga-anọ n’ala ọzọ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.

10. Gịnị bụ ihe kasị mkpa mere Jehova ji jiri Saịrọs weta Ike Ọchịchị Ụwa Babilọn ná njedebe?

10 E nwere ihe nke atọ, ọbụna nke ka mkpa mere Jehova ji jiri Saịrọs kwatuo Babilọn. Jehova na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ma e wezụga nanị m ọ dịghị Chineke ọ bụla dị: M na-eke gị ihe okike n’úkwù, ọ bụ ezie na ị maghị m: ka ha wee mara site n’ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’Ọdịda anyanwụ, na ọ dịghị otu Chineke efu dị ma ọlị ma e wezụga nanị m: Mụ onwe m bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.” (Aịsaịa 45:5, 6) Ee, ọdịda nke Ike Ọchịchị Ụwa Babilọn dara bụ ngosipụta nke ọbụbụ Jehova bụ Chineke, bụ́ ihe àmà na-egosi onye ọ bụla na ọ bụ nanị ya ka e kwesịrị ife ofufe. N’ihi na a tọhapụrụ ndị Chineke, ndị sitere n’ọtụtụ mba—malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ—ga-abịa mata na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ.—Malakaị 1:11.

11. Olee otú Jehova si mee ihe atụ iji gosi na ya nwere ike imezu nzube ya banyere Babilọn?

11 Cheta na e dekọrọ amụma a nke Aịsaịa ihe dị ka afọ 200 tupu ihe omume ahụ. Mgbe ụfọdụ ndị nụrụ ya, ha pụrụ icheworị, sị, ‘Jehova ò nwere ike imezu ya n’ezie?’ Dị ka akụkọ ihe mere eme na-enye ihe àmà ya, azịza ya bụ ee. Jehova na-akọwa ihe mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ọ pụrụ imezu ihe o kwuru: “Abụ m Onye na-akpụ ìhè na Onye na-eke ọchịchịrị; abụ m Onye na-eme udo na Onye na-eke ihe ọjọọ: Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-eme ihe ndị a nile.” (Aịsaịa 45:7) Ihe nile e kere eke—malite n’ìhè ruo n’ọchịchịrị—na ihe nile dị n’akụkọ ihe mere eme—malite n’udo ruo n’ọdachi—bụcha ihe Jehova na-achịkwa. Dị nnọọ ka o si kee ìhè ehihie na ọchịchịrị nke abalị, otú ahụ ka ọ ga-eme ka Israel nwee udo ma mee ka ọdachi dakwasị Babilọn. Jehova nwere ike iji kee eluigwe na ala, o nwekwara ike iji mezuo amụma ya. Nke ahụ bụ ihe mmesi obi ike nye ndị Kraịst taa, bụ́ ndị ji ịdị uchu na-amụ okwu amụma ya.

12. (a) Gịnị ka Jehova mere ka eluigwe na ala ihe atụ mepụta? (b) Nkwa dị aṅaa na-akasị obi ka ihe e kwuru n’Aịsaịa 45:8 nwere maka ndị Kraịst taa?

12 N’ụzọ dabara adaba, Jehova jiri ihe ndị na-eme mgbe nile n’okike gosi ihe ndị ga-abịakwasị ndị Juu e ji eji: “Unu eluigwe, na-atasịnụ ezi omume site n’elu, ka mbara igwe nile na-ezodakwa ezi omume dị ka mmiri: ka ala meghee onwe ya, ka ha wee mịa nzọpụta dị ka mkpụrụ, ka o meekwa ezi omume ka o pukọọ n’otu; Mụ onwe m, bụ́ Jehova, ekewo ya.” (Aịsaịa 45:8) Dị nnọọ ka eluigwe nkịtị si eme ka mmiri ozuzo nke na-enye ndụ na-ezo, Jehova ga-eme ka ngọzi na ntụziaka zokwasị ndị ya site n’eluigwe ihe atụ. Dịkwa nnọọ ka ala nkịtị na-emeghe iji mepụta ihe ubi bara ụba, Jehova ga-achọ ka ala ihe atụ mepụta ihe omume dị iche iche n’ikwekọ ná nzube ezi omume ya—karịsịa nzọpụta maka ndị ya e ji eji na Babilọn. Na 1919, Jehova mere ka “eluigwe” na “ala” mepụta ihe omume dị iche iche n’otu aka ahụ iji tọhapụ ndị ya. Ịhụ ụdị ihe ndị ahụ na-eme ka ndị Kraịst taa na-aṅụrị ọṅụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe omume ndị ahụ na-ewusi okwukwe ha ike ka ha na-elepụ anya n’oge mgbe eluigwe ihe atụ, bụ́ Alaeze Chineke, ga-ewetara ụwa ezi omume ngọzi. N’oge ahụ ezi omume na nzọpụta ndị si n’eluigwe na ụwa ihe atụ ahụ na-apụta ga-adị ukwuu karịa mgbe a kwaturu Babilọn oge ochie. Lee mmezu ikpeazụ dị ebube nke ihe ndị Aịsaịa kwuru nke ahụ ga-abụ!—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1.

Ngọzi Ndị Na-abịa Site n’Ịnakwere Ọbụbụeze Jehova

13. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe nzuzu ụmụ mmadụ ịma nzube Jehova aka?

13 Mgbe e nyesịrị nkọwa a banyere ngọzi ndị na-enye ọṅụ a ga-enwe n’ọdịnihu, ụda olu nke amụma ahụ gbanwere n’ike, Aịsaịa kwupụtakwara ahụhụ abụọ, sị: “Ahụhụ ga-adịrị onye na-alụso Onye kpụworo ya ọgụ! otu ejùjù n’etiti ejùjù nile nke ala! Ụrọ, ọ̀ ga-asị onye na-akpụ ya, Gịnị ka ị na-arụ? ma ọ bụ ọrụ gị, ọ̀ ga-asị, Ọ dịghị aka abụọ o nwere? Ahụhụ ga-adịrị onye na-asị nna ya, Gịnị ka ị na-amụ? nke na-asịkwa nwanyị, Ime gịnị na-eme gị?” (Aịsaịa 45:9, 10) N’ụzọ doro anya, ụmụ Israel ekweghị n’ihe Jehova buru n’amụma. Ikekwe ha ekweghị na Jehova ga-ekwe ka ndị ya jee biri n’ala ọzọ. Ma ọ bụ, ikekwe, ha na-akatọ echiche ahụ bụ́ na ọ bụ eze na-achị mba nke na-agọ mmụọ ga-atọhapụ Israel kama ịbụ eze sitere n’ụlọ Devid. Iji gosi nzuzu dị n’okwu mmegide ndị dị otú ahụ, Aịsaịa ji ndị na-ekweghị tụnyere ọkpụrụkpụ ụrọ ndị a tụfuru atụfu na ejùjù ndị ga-enwe obi ike inyowe amamihe nke onye mere ha enyowe. Ihe ọkpụite kpụrụ na-ekwuzi na ọkpụite ahụ enweghị aka ma ọ bụ ike iji kpụọ ihe. Lee ihe nzuzu ọ bụ! Ndị ahụ na-ekwetaghị yiri ụmụaka obi kara ịkatọ ikike nke ndị mụrụ ha.

14, 15. Gịnị ka okwu bụ́ “Onye Nsọ” na “Onye kpụworo ya” na-egosi banyere Jehova?

14 Aịsaịa na-ekwupụta ihe Jehova zaghachiri ndị dị otú ahụ na-ekwetaghị, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye Nsọ nke Israel na Onye kpụworo ya: Jụọnụ m ajụjụ banyere ihe nile na-abịa; nyenụ m iwu banyere ụmụ m, ma ọ bụ banyere ọrụ aka m abụọ. Mụ onwe m emewo ụwa, keekwa mmadụ n’elu ya: Mụ onwe m, aka m abụọ setịrị eluigwe, ọ bụkwa usuu nile nke ihe ha M nyeworo iwu. Mụ onwe m akpọtewo ya n’ezi omume, ọ bụkwa ụzọ ya nile ka M ga-eme ka ha guzozie: onye ahụ ga-ewu obodo m, zilaga ndị m e mererịị ka ha jee biri n’ala ọzọ, ọ bụghị n’ihi ọnụ ahịa, ọ bụghịkwa n’ihi iri ngo, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.”—Aịsaịa 45:11-13.

15 Ịkọwa Jehova dị ka “Onye Nsọ” na-emesi ịdị nsọ ya ike. Ịkpọ ya “Onye kpụworo ya” na-emesi ike ikike o nwere dị ka Onye Okike ikpebi otú ihe ga-esi mee. Jehova nwere ikike ịgwa ụmụ Israel ihe ndị ga-emenụ na ilekọta ọrụ aka ya, ya bụ, ndị ya. Ọzọkwa, e gosiri na ụkpụrụ nke ike ihe na mkpughe nwere njikọ. Dị ka Onye Okike nke eluigwe na ala dum, Jehova nwere ikike ime ka ihe mee dị ka o si kpebie. (1 Ihe E Mere 29:11, 12) N’ihe metụtara ihe a na-atụle, Eze Na-achị Isi ekpebiwo ime ka Saịrọs, onye ọgọ mmụọ, bilie dị ka onye mgbapụta nke Israel. Ọbịbịa Saịrọs, ọ bụ ezie na ọ ka dị n’ihu, bụ ihe e ji nnọọ n’aka dị ka ịdị adị nke eluigwe na ụwa. Mgbe ahụ, olee nwa Israel nke obi ga-aka ịkatọ Nna, bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha”?

16. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova kwesịrị iji doo onwe ha n’okpuru ya?

16 Otu amaokwu ndị a nke Aịsaịa nwekwara ihe ọzọ mere ndị ohu Chineke kwesịrị iji doo onwe ha n’okpuru ya. Mkpebi ya na-abụ mgbe nile maka ọdịmma kasịnụ nke ndị ohu ya. (Job 36:3) O mere iwu iji nyere ndị ya aka ịbara onwe ha uru. (Aịsaịa 48:17) Ndị Juu nọ n’oge Saịrọs, bụ́ ndị nakweere ọbụbụeze Jehova, hụrụ na nke a bụ eziokwu. Saịrọs, n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi omume Jehova, si na Babilọn zilaa ha obodo ha ka ha wee nwee ike iwughachi ụlọukwu ahụ. (Ezra 6:3-5) N’otu aka ahụ taa, ndị na-eji iwu Chineke eme ihe ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị nakwa ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi ya na-enweta ngọzi dị iche iche.—Abụ Ọma 1:1-3; 19:7; 119:105; Jọn 8:31, 32.

Ngọzi Maka Mba Ndị Ọzọ

17. E wezụga Israel, olee ndị ga-erite uru n’ọrụ nzọpụta Jehova, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

17 Israel agaghị abụ nanị mba ga-erite uru n’ọdịda nke Babilọn. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Ihe pụtara ná ndọgbu Ijipt na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na ọzụzụ ahịa nke Etiopia, na ndị Saba, ndị toro ogologo, ga-agabigakwute gị, ndị i nwere ka ha ga-abụkwa; gị ka ha ga-eso n’azụ; na mkpọrọ ka ha ga-agabiga: ọ bụkwa gị ka ha ga-akpọ isiala nye, gị ka ha ga-ekpere, sị, N’ezie n’ime gị ka Chineke nọ; ọ dịghịkwa onye ọzọ dị, ọ dịghị otu Chineke efu dị ma ọlị.” (Aịsaịa 45:14) N’oge Mosis, “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” bụ́ ndị na-abụghị ndị Israel sonyeere ndị Israel n’Ọpụpụ ha site n’Ijipt. (Ọpụpụ 12:37, 38) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị ala ọzọ ga-esonyere ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị si na Babilọn lọta. A gaghị amanye ndị a na-abụghị ndị Juu amanye ịga kama ha ga-eji ọchịchọ obi ha ‘gabigakwute’ ha. Mgbe Jehova na-asị, “ọ bụkwa gị ka ha ga-akpọ isiala nye” nakwa “gị ka ha ga-ekpere,” ọ na-ezo aka n’ido onwe onye n’okpuru nke ndị ala ọzọ a ga-eji ọchịchọ obi ha doo onwe ha n’okpuru Israel nakwa nkwado ha ga-enye ha. Ọ bụrụ na a tụnye ha ịgà, ọ ga-abụ n’afọ ofufo, na-egosi njikere ha dị ijere ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ozi, bụ́ ndị ha ga-agwa, sị: “N’ime gị ka Chineke nọ.” Ha ga-efe Jehova ofufe dị ka ndị ọhụrụ na-eso ụzọ, n’ikwekọ n’ihe ọgbụgba ndụ ya na Israel nyere ohere maka ya.—Aịsaịa 56:6.

18. Olee ndị taa riteworo uru site ná ntọhapụ Jehova tọhapụrụ “Israel nke Chineke,” n’ụzọ dịgasịkwa aṅaa?

18 Kemgbe 1919 mgbe a tọhapụrụ “Israel nke Chineke” n’ịbụ ndị e ji eji n’ụzọ ime mmụọ, okwu Aịsaịa enwewo mmezu dị ukwuu karịa nke o nwere n’oge Saịrọs. Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile na-egosi njikere ha dị ijere Jehova ozi. (Ndị Galetia 6:16; Zekaraịa 8:23) Dị ka ‘ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ’ na ‘ndị ahịa’ ahụ Aịsaịa hotara, ha ji obi ụtọ na-etinye ike ọkpụkpụ aka ha na ego ha iji kwadoo ezi ofufe. (Matiu 25:34-40; Mak 12:30) Ha na-arara onwe ha nye Chineke ma na-eje ije n’ụzọ ya, jiri obi ụtọ na-aghọ ndị ohu ya. (Luk 9:23) Ha na-efe nanị Jehova ofufe, na-erite uru ndị dị n’isonyere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke Jehova, bụ́ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ pụrụ iche. (Matiu 24:45-47; 26:28; Ndị Hibru 8:8-13) Ọ bụ ezie na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ahụ, ‘ndị ahụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ’ na ‘ndị ahịa’ ahụ na-erite uru na ya ma na-erube isi n’iwu ndị e jikọtara ha na ya, jiri nkwuwa okwu na-akpọsa, sị: “Ọ dịghị otu Chineke efu dị ma ọlị.” Lee ka o si enye obi ụtọ ịbụ ndị ji anya ha na-ahụ taa oké mmụba n’ọnụ ọgụgụ nke ndị dị otú ahụ ji obi ha na-akwado ezi ofufe!—Aịsaịa 60:22.

19. Gịnị ga-eme ndị nọgidere na-efe arụsị?

19 Mgbe o kpughesịrị na ndị mba ọzọ ga-esonye n’ife Jehova ofufe, onye amụma ahụ tiri mkpu, sị: “N’ezie Gị onwe gị bụ Chineke Nke na-ezobe Onwe gị, Gị Chineke Israel, bụ́ Onye nzọpụta”! (Aịsaịa 45:15) Ọ bụ ezie na Jehova achọghị igosi ike ya ugbu a, n’ọdịnihu ọ gakwaghị ezobe onwe ya. Ọ ga-egosi na ya bụ Chineke Israel, Onye Nzọpụta nke ndị ya. Otú ọ dị, Jehova agaghị abụ Onye Nzọpụta nke ndị na-atụkwasị arụsị obi. Banyere ndị dị otú ahụ Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ihere emewo ha, ee, e tinyewokwa ha n’ọnọdụ ihere, ha nile: n’otu ka ha lakọworo n’ọnọdụ ihere, bụ ndị ọkà na-egbu arụsị e gburu egbugbu.” (Aịsaịa 45:16) Mweda n’ala ha ga-akarị mmetụta mmechuihu na ihere nke na-adịru nwa oge. Ọ ga-apụta ọnwụ—ihe dị iche n’ihe Jehova kweziri Israel ná nkwa.

20. N’ụzọ dị aṅaa ka Israel ga-esi nweta “nzọpụta ruo mgbe ebighị ebi”?

20 “[Banyere Israel, n’ezie a ga-eji nzọpụta ruo mgbe ebighị ebi zọpụta ya n’ịdị n’otu ha na Jehova, NW]: ihere agaghị eme unu, a gaghị etinyekwa unu n’ọnọdụ ihere ruo mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 45:17) Jehova na-ekwe Israel nkwa nzọpụta ebighị ebi, ma nke a na-adabere n’ihe ụfọdụ. Israel aghaghị ịnọgide ‘na-adị n’otu ha na Jehova.’ Mgbe Israel mebiri ịdị n’otu ahụ site n’ịjụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ, mba ahụ agaghị enweta olileanya “nzọpụta ruo mgbe ebighị ebi” ahụ ha nọ na-atụ anya ya. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị n’Israel ga-egosi okwukwe na Jisọs, ndị a ga-aghọkwa ndị bụ́ isi n’Israel nke Chineke, bụ́ nke ga-eweghara ọnọdụ nke Israel anụ ahụ. (Matiu 21:43; Ndị Galetia 3:28, 29; 1 Pita 2:9) Ọ dịghị mgbe a ga-eweda Israel ime mmụọ ala. A ga-akpọba ya ‘n’ọgbụgba ndụ ebighị ebi.’—Ndị Hibru 13:20.

N’ike Ihe na ná Mkpughe, Jehova Bụ Onye A Pụrụ Ịdabere n’Ebe Ọ Nọ

21. Olee otú Jehova si egosi na a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ kpam kpam ma n’ike ihe ma ná mkpughe?

21 Ndị Juu hà pụrụ ịdabere ná nkwa Jehova nke nzọpụta ebighị ebi nye Israel? Aịsaịa na-aza, sị: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya: Mụ onwe m bụ Jehova; ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị. Ọ bụghị na nzuzo ka M kwuworo okwu, n’otu ebe nke ala ọchịchịrị; asịghị m mkpụrụ Jekọb, Chọọnụ m n’ebe tọgbọrọ n’efu: Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-ekwu ezi omume, Onye na-egosi ihe dị iche iche ziri ezi.” (Aịsaịa 45:18, 19) Na nke ugboro anọ na nke ikpeazụ n’isiakwụkwọ a, Aịsaịa ji nkebi okwu bụ́: ‘Otú a ka Jehova sịrị,’ wee malite ihe odide amụma dị oké mkpa. (Aịsaịa 45:1, 11, 14) Gịnị ka Jehova na-ekwu? Na ma n’ike ihe ma ná mkpughe, a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ. O keghị ụwa ka ọ bụrụ “ihe tọgbọrọ n’efu.” N’otu aka ahụ, ọ dịghị agwa ndị ya, bụ́ Israel, ka ha chọọ ya “n’efu.” Dị nnọọ ka a ga-emezu nzube Chineke maka ụwa, otú ahụ ka a ga-emezu nzube Chineke maka ndị ya ọ họpụtara. N’ụzọ dị iche n’ihe ndị na-edoghị anya ndị na-efe chi ụgha dị iche iche ofufe na-ekwu, Jehova na-ekwu okwu ya n’ihu ọha. Okwu ya ziri ezi, ha ga-emezukwa. Ndị na-ejere ya ozi agaghị ejere ya ozi n’efu.

22. (a) Gịnị ka ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na Babilọn pụrụ ijide n’aka? (b) Mmesi obi ike dị aṅaa ka ndị Kraịst taa nwere?

22 Nye ndị Chineke e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na Babilọn, okwu ndị ahụ bụ mmesi obi ike na Ala Nkwa ahụ agaghị anọgide na-atọgbọ chakoo. A ga-ebirighachi n’ime ya. Nkwa dị iche iche Jehova kwekwara ha mezuru. N’ịgbatị ya, ihe ndị Aịsaịa kwuru bụ mmesi obi ike nye ndị Chineke taa na ụwa agaghị aghọ ihe tọgbọrọ n’efu—nke ọkụ repịara, dị ka ụfọdụ ndị kwenyere, ma ọ bụ bụrụ nke bọmbụ nuklia bibiri, dị ka ndị ọzọ na-atụ egwu ya. Chineke zubere na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi, bụrụ nke e yikwasịrị ịma mma nke paradaịs, bụrụkwa nke ndị ezi omume ga-ebiju. (Abụ Ọma 37:11, 29; 115:16; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4) Ee, dị ka ọ dị n’ihe banyere Israel, okwu Jehova ga-aghọ nke a pụru ịdabere na ya.

Jehova Egosi Ebere Ya

23. Gịnị ka ga-adakwasị ndị na-efe arụsị, oleekwa otú ihe ga-esi gaara ndị na-efe Jehova?

23 E mesiri nzọpụta nke Israel ike n’ihe Jehova kwuziri: “Chịkọtanụ onwe unu, bịa; bịaruonụ nso n’otu, unu ndị mba nile gbapụtara agbapụta: ha amaghị ama, bụ́ ndị ahụ na-ebu osisi arụsị ha a pịrị apị, ndị na-ekpekwara chi na-adịghị azọpụta. Gosinụ, wetakwanụ ha nso; ee, ka ha gbakọọ izu n’otu: ònye mere ka a nụ ihe a site na mgbe gara aga? ònye sitere na mgbe ochie gosi ya? ọ́ bụghị Mụ onwe m, bụ́ Jehova? ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị ma e wezụga nanị Mụ onwe m; Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta adịghị ma e wezụga nanị Mụ onwe m.” (Aịsaịa 45:20, 21) Jehova na-akpọ ndị ahụ ‘gbapụrụ agbapụ’ òkù ka ha jiri nzọpụta ha tụnyere ihe mere ndị na-efe arụsị. (Deuterọnọmi 30:3; Jeremaịa 29:14; 50:28) N’ihi na ndị na-ekpere arụsị na-ekpegara chi ndị na-adịghị ike, ndị na-apụghị ịzọpụta ha, ekpere ma na-ejere ha ozi, ha ‘amaghị ihe.’ Ofufe ha na-efe ha bụ n’efu—o nweghị nnọọ isi. Otú ọ dị, ndị na-efe Jehova na-achọpụta na o nwere ikike ime ka ihe omume ndị o buru n’amụma na “mgbe gara aga” were ọnọdụ, tinyere nzọpụta nke ndị ya e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na Babilọn. Ụdị ike na ilepụ anya n’ihu dị otú ahụ na-eme ka Jehova dị iche n’ebe chi ndị ọzọ nile nọ. N’eziokwu, ọ bụ “Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta.”

“Nzọpụta Dịịrị Chineke Anyị”

24, 25. (a) Òkù dị aṅaa ka Jehova na-akpọ, gịnịkwa mere nkwa ya ga-ejirịrị mezuo? (b) Gịnị ka Jehova na-achọ n’ụzọ ziri ezi?

24 Ebere Jehova kpaliri ya ịkpọ òkù, sị: “Cheenụ m ihu, e wee zọpụta unu, unu nsọtụ nile nke ụwa: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị. Ejiwo m Onwe m ṅụọ iyi, otu okwu esiwo n’ọnụ m pụta n’ezi omume, ọ gaghị alaghachikwa, sị, na Mụ onwe m ka ikpere nile ọ bụla ga-egburu, Mụ ka ire nile ọ bụla ga-aṅụrụ iyi. Nanị na Jehova ka ezi omume nile na ike dị, (mụ ka a gwara okwu a): Ya ka mmadụ ga-abịakwute, ihere ga-emekwa ndị ahụ nile iwe ha dị ọkụ megide Ya. Na Jehova ka a ga-agụ mkpụrụ nile nke Israel ná ndị ezi omume, ọ bụkwa na Ya ka ha ga-anya isi.”—Aịsaịa 45:22-25.

25 Jehova na-ekwe Israel nkwa na ya ga-azọpụta ndị nọ na Babilọn bụ́ ndị chigharịkwuuru ya. Ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume amụma ya ịhapụ imezu n’ihi na Jehova nwere ma ọchịchọ ma ikike iji napụta ndị ya. (Aịsaịa 55:11) Ihe ndị Chineke kwuru bụ n’onwe ha ihe ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ma a pụkwara ịtụkwasị ha obi ọbụna karị mgbe Jehova ṅụkwasịrị ha iyi iji kwadoo ha. (Ndị Hibru 6:13) N’ụzọ ziri ezi ọ na-achọ ido onwe onye n’okpuru (‘ikpere nile ọ bụla ga-egbu n’ala’) nakwa ịrara onwe onye nye (‘ire nile ọ bụla ga-aṅụ iyi’) site n’aka ndị na-achọ ihu ọma ya. A ga-azọpụta ndị Israel nọgidere na-efe Jehova ofufe. Ha ga-enwe ike ịnya isi n’ihi ihe Jehova na-emere ha.—2 Ndị Kọrint 10:17.

26. Olee otú “oké ìgwè mmadụ” ndị sitere ná mba nile si aza òkù Jehova na-akpọ ka e chigharịkwuru ya?

26 Otú ọ dị, òkù Chineke na-akpọ ka e chigharịkwuru ya abụghị nanị maka ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na Babilọn oge ochie. (Ọrụ 14:14, 15; 15:19; 1 Timoti 2:3, 4) A ka na-akpọkwa òkù a, “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla” na-azakwa ma na-akpọsa, sị: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị . . . dịkwara Nwa atụrụ ahụ [Jisọs].” (Mkpughe 7:9, 10; 15:4) Kwa afọ, ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ na-eme ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-amụba site n’ichigharịkwuru Chineke, na-amata ọbụbụeze ya n’ụzọ zuru ezu ma na-ekwusa n’ihu ọha nkwado ha na-akwado ya. Tụkwasị na nke ahụ, ha ji iguzosi ike n’ihe na-akwado Israel ime mmụọ, bụ́ ‘mkpụrụ Abraham.’ (Ndị Galetia 3:29) Ha na-egosipụta ịhụnanya ha maka ọchịchị ezi omume nke Jehova site n’ịkpọsa n’ụwa nile, sị: “Nanị na Jehova ka ezi omume nile na ike dị.”a N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl onyeozi hotara otú Septuagint si sụgharịa Aịsaịa 45:23 iji gosi na n’ikpeazụ onye ọ bụla dị ndụ ga-anakwere ọbụbụeze Chineke ma na-eto aha ya n’akwụsịghị akwụsị.—Ndị Rom 14:11; Ndị Filipaị 2:9-11; Mkpughe 21:22-27.

27. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst taa pụrụ iji tụkwasị nkwa nile nke Jehova obi n’ụzọ zuru ezu?

27 N’ihi gịnị ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ pụrụ iji nwee ntụkwasị obi na ichigharịkwuru Chineke pụtara nzọpụta? N’ihi na a pụrụ ịtụkwasị nkwa Jehova nile obi, dị ka okwu amụma ndị dị n’Aịsaịa isi 45 na-egosi n’ụzọ doro nnọọ anya. Dị nnọọ ka Jehova nwere ike na amamihe iji kee eluigwe na ụwa, otú ahụ ka o nwekwara ike na amamihe iji mee ka amụma ya dị iche iche mezuo. Dịkwa nnọọ ka o si hụ na amụma ahụ banyere Saịrọs mezuru, otú ahụ ka ọ ga-esikwa mezuo amụma ọ bụla ọzọ nke Bible na-emezubeghị. Ya mere, ndị na-efe Jehova pụrụ inwe obi ike na n’isi nso Jehova ga-egosi ọzọ na ya bụ “Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Bible Nsọ nke Union Version ji okwu bụ́ “ezi omume nile” mee ihe n’ihi na ihe odide Hibru ahụ nwere okwu bụ́ “ezi omume” n’ụzọ na-egosi ihe karịrị otu. E ji ụdị na-egosi ihe karịrị otu mee ihe n’ebe a iji gosipụta ọ̀tụ̀tụ̀ bara ụba nke ezi omume Jehova.

[Foto ndị dị na peeji nke 80, 81]

Jehova, bụ́ onye na-eme ìhè ma na-eke ọchịchịrị, pụrụ ime udo ma kee ọdachi

[Foto dị na peeji nke 83]

Jehova ga-eme ka “eluigwe” zoo ngọzi, ka “ụwa” pupụtakwa nzọpụta

[Foto dị na peeji nke 84]

Ejùjù a tụfuru atụfu ò kwesịrị inyowe amamihe nke onye mere ya enyo?

[Foto dị na peeji nke 89]

Jehova ekeghị ụwa ka ọ tọgbọrọ n’efu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya