Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
“Abụ m . . . Onye na-eme ka okwu ohu Ya guzosie ike, Nke na-emezukwa ndụmọdụ ndị ozi Ya.”—AỊSAỊA 44:25, 26.
1. Olee otú Jehova si eme ka a mata ụdị ndị ozi bụ ndị ọma ya, oleekwa otú o si ekpughe ndị nke ụgha?
JEHOVA CHINEKE bụ Onye Ukwu n’Ime Ka A Mata ezi ndị ozi ya. Ọ na-eme ka a mata ha site n’ime ka ozi ndị ọ na-ezi site n’ọnụ ha mezuo. Jehova bụkwa Onye Mkpughe Ukwu nke ndị ozi ụgha. Olee otú o si ekpughe ha? Ọ na-aghasasị ihe ịrịba ama na amụma ha. N’ụzọ dị otú a ọ na-egosi na ha bụ ndị okwube orebe họpụtara onwe ha, ndị ozi ha sitere n’echiche ụgha ha n’ezie—ee, n’echiche nzuzu nke anụ ahụ ha!
2. Esemokwu dị aṅaa dara n’etiti ndị ozi n’oge ndị Israel?
2 Ma Aịsaịa ma Ezikiel zọọrọ na ha bụ ndị ozi nke Jehova Chineke. Hà bụ? Ka anyị hụ. Aịsaịa buru amụma na Jerusalem malite n’ihe dị ka 778 T.O.A. ruo oge ụfọdụ mgbe 732 T.O.A. gasịrị. A dọọrọ Ezikiel n’agha laa Babilọn na 617 T.O.A. O buuru ụmụnna ya bụ́ ndị Juu amụma n’ebe ahụ. Ndị amụma abụọ ahụ jiri obi ike kpọsaa na a ga-ebibi Jerusalem. Ndị amụma ọzọ sịrị na Chineke agaghị ekwe ka nke a mee. Olee ndị mesịrị bụrụ ụdị ndị ozi bụ ndị ọma ya?
Jehova Na-ekpughe Ndị Amụma Ụgha
3, 4. (a) Ozi abụọ dị aṅaa ndị na-emegiderịta onwe ha ka e ziri ndị Israel nọ na Babilọn, oleekwa otú Jehova siri kpughee otu onye ozi ụgha? (b) Gịnị ka Jehova kwuru ga-eme ndị amụma ụgha?
3 Mgbe ọ nọ na Babilọn, e nyere Ezikiel ọhụụ nke ihe na-emenụ n’ụlọ nsọ Jerusalem. Ndị ikom 25 nọ n’ebe mbanye nke ọnụ ụzọ ámá ya nke ihu anyanwụ. Ndị isi abụọ bụ́ Jeazanaịa na Pelataịa nọ n’etiti ha. Olee otú Jehova si lee ha anya? Ezikiel 11:2, 3 na-aza, sị: “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom ahụ ndị na-eche ajọ ihe, ndị na-adụkwa ọdụ ọjọọ n’obodo a: ndị na-asị, [‘Ọ̀ bụ na iwu ụlọ adịghị nso?’ NW].” Ndị ozi nke udo a dị nganga na-asị, ‘Jerusalem anọghị n’ihe ize ndụ. Leenụ, n’oge na-adịghị anya anyị gaje iwu ọtụtụ ụlọ karị n’ime ya!’ Ya mere Chineke gwara Ezikiel ka o buo amụma dị iche megide ndị amụma a na-agha ụgha. N’amaokwu nke 13 nke isi nke 11, Ezikiel na-agwa anyị ihe mere otu n’ime ha: “O ruo, mgbe M buru amụma, na Pelataịa nwa Benaịa nwụrụ.” Eleghị anya nke a mere n’ihi na Pelataịa bụ onye isi a ma ama na onye nwere ike karịsịa, onye na-ebutekwa ụzọ n’ikpere arụsị. Ọnwụ mberede ya gosiri na ọ bụ onye amụma ụgha!
4 Ogbugbu Jehova gburu Pelataịa akwụsịghị ndị amụma ụgha ọzọ ịgha ụgha n’aha Chineke. Ndị nduhie a gara n’ihu n’ụzọ ịwị ara ha nke ibu amụma ihe ndị megidere uche Chineke. Ya mere Jehova Chineke gwara Ezikiel, sị: “Ahụhụ dịrị ndị amụma nzuzu, ndị na-ejeso mmụọ nke ha, na ihe nke ha na-ahụghị!” Dị ka Pelataịa, ha ‘agaghị adị’ n’ihi iji ịgba isi akwara ahụrụ Jerusalem “ọhụụ udo, ma udo adịghị.”—Ezikiel 13:3, 15, 16.
5, 6. N’agbanyeghị ndị ozi ụgha nile, olee otú e siri wepụ Aịsaịa n’ụta dị ka ezi onye amụma?
5 N’ihe banyere Aịsaịa, ozi ya nile sitere n’ọnụ Chineke banyere Jerusalem mezuru. N’oge okpomọkụ nke 607 T.O.A., ndị Babilọn bibiri obodo ahụ ma chịrị ndị Juu fọdụrụnụ laghachi Babilọn dị ka ndị a dọọrọ n’agha. (2 Ihe Emere 36:15-21; Ezikiel 22:28; Daniel 9:2) Ọdachi ndị a hà kwụsịrị ndị amụma ụgha iji ntagheri ọnụ na-enweghị isi na-akọchi ndị Chineke ntị? Ee e, ndị amụma ahụ na-agha ụgha gara n’ihu ime otú ahụ!
6 Dị ka a ga-asị na nke a ezughị, e kpughekwara ndị Israel a dọọrọ n’agha nye ndị dibịa afa na-etu ọnụ, ndị na-ajụ ndị mmụọ ase, na ndị na-agụ kpakpando nke Babilọn. Otú ọ dị, Jehova gosipụtara ndị ozi ụgha a nile ịbụ ndị nzuzu e mechuru ihu, ndị na-akụla ịgba azụ. Ka oge na-aga o gosiri na Ezikiel bụ ezi onye ozi ya, dị ka Aịsaịa bụ. Jehova mezuru okwu nile o kwuru site n’ọnụ ha, dị ka o kweworo nkwa, sị: “Abụ m Onye na-emebi ihe ịrịba ama nile nke ndị ekwukwu, M na-emekwa ka ndị na-ajụ ase wịa ara; abụ m Onye na-eme ka ndị maara ihe laghachi azụ, M na-emekwa ka ihe ọmụma ha ghọọ ihe nzuzu: abụ m Onye na-eme ka okwu ohu Ya guzosie ike, Nke na-emezukwa ndụmọdụ ndị ozi Ya.”—Aịsaịa 44:25, 26.
Ozi Ndị Na-eju Anya Banyere Babilọn na Jerusalem
7, 8. Ozi dị aṅaa sitere n’ike mmụọ nsọ ka Aịsaịa nwere maka Babilọn, gịnịkwa ka okwu ya pụtara?
7 A gaje ime ka Juda na Jerusalem tọgbọrọ n’efu, n’enweghị mmadụ ga-ebi na ha, ruo afọ 70. Otú ọ dị, Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa na Ezikiel na a ga-ewughachi obodo ahụ, a ga-ebikwa n’ala ahụ kpọmkwem n’oge o buworo n’amụma! Nke a bụ amụma dị ịtụnanya. N’ihi gịnị? N’ihi na a ma Babilọn ama dị ka ndị na-adịghị atọhapụ ndị mkpọrọ ya ma ọlị. (Aịsaịa 14:4, 15-17) Ya mere ònye nwere ike ịtọhapụ ndị a a dọọrọ n’agha? Ònye pụrụ imeri Babilọn dị ike, tinyere mgbidi ukwu na usoro nchebe nke osimiri ya nyere? Jehova Pụrụ Ime Ihe Nile pụrụ ime ya! O kwukwara na ya ga-eme ya, sị: “Abụ m . . . Onye ahụ Nke na-asị ogbu mmiri [ya bụ, nchebe nke mmiri na-enye obodo ahụ], Takọọ; osimiri gị nile ka M ga-emekwa ka ha tachasịa: Onye ahụ Nke na-ekwu okwu banyere Saịrọs, sị, Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m, ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka ọ ga-emezukwa: ọbụna n’ikwu okwu banyere Jerusalem, sị, A ga-ewu ya; na n’ịsị ụlọ ukwu Chineke, A ga-atọ ntọala gị.”—Aịsaịa 44:25, 27, 28.
8 Cheedị banyere nke ahụ! Osimiri Yufretis, bụ́ ihe mgbochi siri ike nye ndị mmadụ, yiri otu ntapụ mmiri n’elu ebe dị oké ọkụ nye Jehova. Fịam, ihe mgbochi ahụ ga-apụ n’anya! Babilọn ga-ada. N’agbanyeghị na ọ bụ ihe dị ka afọ 150 tupu ọmụmụ Saịrọs onye Peasia, Jehova mere ka Aịsaịa buo amụma banyere mmeri eze a ga-emeri Babilọn na ntọhapụ nke ndị Juu a dọọrọ n’agha site na ya inye ikike ka ha lọta iji wughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya.
9. Ònye ka Jehova kpọrọ aha dị ka onye ọ ga-eji mee ihe inye Babilọn ahụhụ?
9 Anyị na-ahụ amụma a n’Aịsaịa 45:1-3: “Otú a ka Jehova sịrị onye Ya e tere mmanụ, bụ́ Saịrọs, onye M jideworo aka nri ya, ịzọda mba dị iche iche n’ihu ya, . . . imeghe ụzọ ihu ya, a gaghị emechibidokwa ọnụ ụzọ ámá; Mụ onwe m ga-aga n’ihu gị, mee ka mkputamkpu ebe nile guzozie: ibo ụzọ ọla nile ka M ga-etiwa, ihe ntụchi ígwè nile ka M ga-egbujipụkwa: M ga-enyekwa gị akụ̀ nke ọchịchịrị, na akụ̀ zoro ezo nke ebe nzuzo dị iche iche, ka i wee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye ahụ Nke na-akpọ gị n’aha gị.”
10. Olee otú Saịrọs si bụrụ “onye e tere mmanụ,” oleekwa otú Jehova siri nwee ike ịgwa ya okwu ihe karịrị otu narị afọ tupu ọmụmụ ya?
10 Rịba ama na Jehova na-agwa Saịrọs okwu dị ka a ga-asị na ọ dịrịị ndụ. Nke a na-ekwekọ n’okwu Pọl na Jehova ‘na-akpọ ihe na-adịghị, dị ka a sị na ha dị.’ (Ndị Rom 4:17) Ọzọ, Chineke na-akọwa Saịrọs dị ka “onye Ya e tere mmanụ.” N’ihi gịnị ka o ji mee nke ahụ? E kwuwerị, ọ dịghị mgbe onye isi nchụàjà Jehova wụkwasịrị mmanụ otite dị nsọ n’isi Saịrọs. Ọ bụ eziokwu, ma nke a bụ ite mmanụ n’ụzọ amụma. Ọ na-egosi idu n’iyi ọrụ maka ọkwá pụrụ iche. Ya mere Chineke pụrụ ikwu banyere nhọpụta ọ họpụtara Saịrọs tupu oge eruo dị ka ite mmanụ.—Tụlee 1 Ndị Eze 19:15-17; 2 Ndị Eze 8:13.
Chineke Na-emezu Okwu Ndị Ozi Ya
11. N’ihi gịnị ka ndị bi na Babilọn ji chee na ha nọ ná nchebe?
11 N’oge Saịrọs wakwasịrị Babilọn, ụmụ amaala ya chere na egwu adịghị, na ha nọ nnọọ ná nchebe. Ekpé dị omimi ma saa mbara nke na-enye nchebe, nke Osimiri Yufretis mere, gbara obodo ha gburugburu. N’ebe osimiri ahụ gafere n’obodo ahụ, e nwere ebe ụgbọ mmiri na-akwụsị n’ogologo ụsọ osimiri ahụ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Iji kewapụ ya n’obodo ahụ, Nebukadneza wuru ihe ọ kpọrọ “mgbidi ukwu, nke dị ka ugwu, bụ ihe a [na-apụghị] iwepụ ewepụ . . . Elu ya ka [o] weliri nke ukwuu.”a Mgbidi a nwere ọnụ ụzọ ámá ndị nwere akatamkpo ibo ọnụ ụzọ ọla. Iji banye ha, mmadụ aghaghị ịrịgo site n’isi isi nke osimiri ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na ndị mkpọrọ Babilọn enweghị olileanya nke ịbụ ndị a tọhapụrụ mgbe ọ bụla!
12, 13. Olee otú okwu Jehova kwuru site n’ọnụ onye ozi ya bụ́ Aịsaịa si mezuo mgbe Babilọn dara n’aka Saịrọs?
12 Ma ọ bụghị ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha bụ́ ndị nwere okwukwe na Jehova! Ha nwere olileanya na-egbukepụ egbukepụ. Site ná ndị amụma ya, Chineke ekwewo nkwa ịtọhapụ ha. Olee otú Chineke si mezuo nkwa ya? Saịrọs nyere ndị agha ya iwu ichigharị Osimiri Yufretis ihu gaa n’ebe dị ọtụtụ kilomita n’ebe ugwu nke Babilọn. N’ụzọ dị otú ahụ, a gbanwere isi nchebe nke obodo ahụ ịghọ ala osimiri fọrọ nke nta ka ọ takọọ atakọ. N’abalị oké mgbanwe ahụ, ndị ahụ nọ n’oriri oké mkpọtụ nke aṅụrụma na Babilọn ji akpachapụghị anya hapụ ibo ọnụ ụzọ abụọ ahụ dị n’ọnụ mmiri nke Yufretis ka ha ghere oghe. Jehova etirisighị ibo ọnụ ụzọ ọla ahụ n’ụzọ nkịtị; o gbutughịkwa ihe ntụchi ígwè ndị ahụ nke mechiri ha, ma ụzọ iji nkà eme ihe ya dị ebube ịhapụ ha ka ha ghere oghe ma ghara ịkpọchi ha nwere otu mmetụta ahụ. Mgbidi nile nke Babilọn abaghị uru. Ọ dịghị ndị agha Saịrọs mkpa ịrịfe ha iji banye n’ime. Jehova bu Saịrọs ụzọ jee, na-ewepụ “mkputamkpu ebe nile,” ee, ihe mgbochi nile. A nwapụtara Aịsaịa ịbụ ezi onye ozi Chineke.
13 Mgbe Saịrọs nwetazuru obodo ahụ, akụ̀ ya nile batara n’aka ya, tinyere ndị e zoro n’ime ọnụ ụlọ gbara ọchịchịrị, ndị zoro ezo. N’ihi gịnị ka Jehova Chineke ji meere Saịrọs nke a? Ka o wee mara na Jehova, ‘Onye na-akpọ ya n’aha,’ bụ Chineke nke ezi amụma na Eze Onyenwe eluigwe na ala. Ọ ga-amara na Chineke edokwaworo ya ịnọ n’ike ọchịchị iji tọhapụ ndị Ya, bụ́ Israel.
14, 15. Olee otú anyị si mara na ọ bụ Jehova mere ka Saịrọs merie Babilọn?
14 Gee ntị n’okwu Jehova gwara Saịrọs: “N’ihi ohu m, bụ́ Jekọb, na Israel nke M họpụtara, ka M na-akpọ gị n’aha gị: ana m etu gị aha, ọ bụ ezie na ị maghị m. Mụ onwe m bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ma e wezụga nanị m ọ dịghị Chineke ọ bụla dị: M na-eke gị ihe okike n’úkwù, ọ bụ ezie na ị maghị m: ka ha wee mara site n’ọwụwa anyanwụ, sitekwa n’Ọdịda anyanwụ, na ọ dịghị otu Chineke efu dị ma ọlị ma e wezụga nanị m: Mụ onwe bụ Jehova, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. Abụ m Onye na-akpụ ìhè na Onye na-eke ọchịchịrị; abụ m Onye na-eme udo [ya bụ, maka ndị ya a dọọrọ n’agha] na Onye na-eke ihe ọjọọ [maka Babilọn]; Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-eme ihe ndị a nile.”—Aịsaịa 45:4-7.
15 Ọ bụ Jehova mere ka Saịrọs merie Babilọn, n’ihi na ọ bụ Ya bụ onye nyeworo ya ume ime ihe tọrọ Ya ụtọ megide obodo ọjọọ ahụ ma tọhapụ ndị Ya a dọọrọ n’agha. N’ime nke a, Chineke kpọkuru eluigwe ya izoda mmetụta ma ọ bụ ike ezi omume. Ọ kpọkuru ala ya imeghe ma mepụta ihe omume na nzọpụta ezi omume maka ndị ya a dọọrọ n’agha. Eluigwe na ala ihe atụ ya mekwara ihe a o nyere n’iwu. (Aịsaịa 45:8) Ihe karịrị otu narị afọ mgbe ọ nwụsịrị, e gosipụtara Aịsaịa ịbụ ezi onye ozi nke Jehova!
Ozi Ọma nke Onye Ozi ahụ Maka Zaịọn!
16. Ozi ọma dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọsa n’obodo Jerusalem e mere ka ọ tọgbọrọ n’efu mgbe e meriri Babilọn?
16 Ma e nwere ihe ọzọ. Aịsaịa 52:7 na-akọ banyere ozi ọma maka Jerusalem: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta; onye na-asị Zaịọn, Chineke gị bụ eze!” Chee echiche ihe na-akpali akpali ọ bụ ịhụ ka onye ozi si n’ugwu na-abịarute Jerusalem! Ọ ghaghị inwe ozi. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ozi na-akpali akpali maka Zaịọn. Ozi nke udo, ee, ozi nke ihu ọma Chineke. A ga-ewughachi Jerusalem na ụlọ nsọ ya! Onye ozi ahụ jikwa ịnụ ọkụ n’obi mmeri na-akpọsa, sị: “Chineke gị bụ eze!”
17, 18. Olee otú mmeri Saịrọs meriri Babilọn si metụta aha Jehova n’onwe ya?
17 Mgbe Jehova kwere ka ndị Babilọn kwatuo ocheeze ihe atụ ya nke ndị eze sitere n’eriri Devid nọkwasịrị, ọ pụrụ nnọọ iyiwo ka Ọ bụkwaghị Eze. Marduk, chi bụ isi nke Babilọn, yiri ka ọ bụ eze n’ọnọdụ ya. Ma, mgbe Chineke nke Zaịọn kwaturu Babilọn, o gosipụtara ọbụbụeze eluigwe na ala ya—na ya bụ Eze kasị ukwuu. Ijikwa mesie eziokwu a ike, a gaje iguzobeghachi Jerusalem, bụ́ “obodo nke Eze ukwu ahụ,” ya na ụlọ nsọ ya. (Matiu 5:35) Banyere onye ozi ahụ nke wetara ozi ọma dị otú ahụ, ọ bụ ezie na ụkwụ ya jupụtara n’úzùzù, ruo unyi, ma bụrụ nke e chihịara echihịa, n’anya ndị hụrụ Zaịọn na Chineke ya n’anya, ha mara nnọọ mma nke ukwuu!
18 N’echiche amụma, ọdịda Babilọn pụtara na e guzobere alaeze Chineke, onye na-ekwusa ozi ọma bụkwa onye mkpọsa nke ihe ahụ mere eme. Ọzọkwa, onye obu ozi oge ochie nke a, e buru n’amụma site n’ọnụ Aịsaịa, sere onyinyo onye ozi nke ozi ọma ka dị ebube—ka dị ebube n’ihi ihe magburu onwe ya dị n’ime ya na isiokwu Alaeze ya, nke nwere ihe ndị dị ebube ọ pụtara maka ndị nile nwere okwukwe.
19. Ozi dị aṅaa banyere ala Israel ka Jehova ziri site n’ọnụ Ezikiel?
19 E nyekwara Ezikiel amụma na-egbuke egbuke nke mweghachi. O buru amụma, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị Jehova sịrị: . . . M ga-eme ka mmadụ bie n’obodo nile unu, a ga-ewukwa ebe nile tọgbọrọ n’efu. Ha ga-asịkwa, Ala nke a nke tọgbọrọ n’efu aghọwo ubi dị ka ubi Iden a gbara ogige.”—Ezikiel 36:33, 35.
20. Agbamume dị aṅaa na-ekpo obi ọkụ ka Aịsaịa nyere Jerusalem n’ụzọ amụma?
20 Ná ndọta n’agha na Babilọn, ndị Chineke anọwo na-eru újú n’ihi Zaịọn. (Abụ Ọma 137:1) Ugbu a, ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ. Aịsaịa gbara ume, sị: “Tiwaanụ mkpu ọṅụ, tienụ mkpu ọṅụ n’otu, unu mkpọmkpọ ebe nke Jerusalem: n’ihi na Jehova akasiwo ndị Ya obi, Ọ gbapụtawo Jerusalem. Jehova agbabawo ogwe aka Ya dị nsọ ọtọ n’anya mba nile; nsọtụ nile nke ụwa wee hụ nzọpụta nke Chineke anyị.”—Aịsaịa 52:9, 10.
21. Olee otú okwu ndị dị n’Aịsaịa 52:9, 10 si mezuo mgbe e merisịrị Babilọn?
21 Ee, ndị Jehova họpụtara nwere oké ihe mere ha ga-eji nwee ọṅụ. Ha na-aga ugbu a ibighachi n’ebe ndị ahụ tọgbọrọ n’efu na mbụ, na-eme ka ha yie ubi Iden. Jehova “agbabawo ogwe aka Ya dị nsọ ọtọ” maka ha. Ọ fụkọrọ aka uwe ya, dị ka a pụrụ ikwu ya, iji rụọ ọrụ n’iweghachi ha n’ala nke aka ha ha hụrụ n’anya. Nke a abụghị ihe omume dị nta, nke na-apụtaghị ìhè n’akụkọ ihe mere eme. Ee e, ndị nile dị ndụ mgbe ahụ hụrụ ‘ogwe aka Chineke a gbabara ọtọ’ ka ọ na-akpa ike n’ihe omume ụmụ mmadụ iji mee ka e nwee nzọpụta dị ịtụnanya nke otu mba. E nyere ha ihe àmà ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na Aịsaịa na Ezikiel bụ ezi ndị ozi nke Jehova. Ọ dịghị onye pụrụ inwe obi abụọ na Chineke nke Zaịọn bụ nanị ezi Chineke nke dị ndụ n’ụwa nile. N’Aịsaịa 35:2, anyị na-agụ, sị: “Ndị a ga-ahụ ebube Jehova, bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.” Ndị nakweere ihe àmà a nke ịbụ Chineke nke Jehova chigharịrị ife ya ofufe.
22. (a) Maka gịnị ka anyị pụrụ iji nwee ekele taa? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele karịsịa na Jehova na-ekpughe ndị ozi ụgha?
22 Lee ekele anyị kwesịrị inwe na Jehova na-eme ka a mata ezi ndị ozi ya! Ọ bụ n’ezie “Onye na-eme ka okwu ohu Ya guzosie ike, Nke na-emezukwa ndụmọdụ ndị ozi Ya.” (Aịsaịa 44:26) Amụma mweghachi ndị a o nyere Aịsaịa na Ezikiel na-ebuli oké ịhụnanya ya, ebere na-erughịrị mmadụ, na afọ ọma ya n’ebe ndị ohu ya nọ elu. N’ezie, Jehova kwesịrị otuto anyị nile maka nke a! Anyị onwe anyị kwa taa kwesịrị inwe ekele karịsịa na ọ na-ekpughe ndị ozi ụgha. Nke a bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ n’ime ha ugbu a n’ụwa. Ozi ha buru oké ibu na-eleghara nzube Jehova a kpọsara akpọsa anya. Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịmata ndị ozi ụgha ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ bụ́ The Monuments and the Old Testament, nke Ira Maurice Price dere, 1925.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee otú Jehova si eme ka a mata ezi ndị ozi ya?
◻ Site n’ọnụ Aịsaịa, ònye ka Jehova kpọrọ aha dị ka onye ọ ga-eji merie Babilọn?
◻ Olee otú e si mezuo amụma Aịsaịa ndị na-akọwa mmeri Babilọn?
◻ Ihe ọma dị aṅaa ka mmeri e meriri Babilọn wetaara aha Jehova?
[Foto dị na peeji nke 9]
Babilọn yiri ebe a na-apụghị imeri emeri nye mba ndị dị n’ụbọchị Ezikiel