Mba nke Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe
“Megheenụ ọnụ ụzọ ámá nile, ka mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile wee baa n’ime.”—AỊSAỊA 26:2.
1. N’ihi gịnị ka okwu Aịsaịa banyere “mba nke na-eme ezi omume” pụrụ iji bụrụ ihe na-eju anya?
TAA, e nwere ụdị mba dị iche iche. Ụfọdụ bụ ndị ọchịchị onye kwuo uche ya, ụfọdụ bụ ndị ọchịchị aka ike. Ụfọdụ bara ọgaranya, ụfọdụ dara ogbenye. Otu ihe ka ha nwekọrọ ọnụ: Ha nile bụ akụkụ nke ụwa nke Setan bụ chi ya. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ihi nke a, okwu Aịsaịa pụrụ ịbụ ihe ijuanya nye ụfọdụ mgbe ọ sịrị: “Megheenụ ọnụ ụzọ ámá nile, ka mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile wee baa n’ime.” (Aịsaịa 26:2) Mba nke na-eme ezi omume? Ee, e nwere mba nke na-eme ezi omume, ebe ọ bụ na amụma ahụ rụtụrụ aka gaa n’ịdị adị ya n’oge anyị. Olee ụzọ a pụrụ isi mara mba nke a pụrụ iche?
2. Gịnị bụ “mba nke na-eme ezi omume”? Olee otú anyị si mara?
2 Ná nsụgharị New World Translation nke Aịsaịa 26:2, a sịrị na mba ahụ “na-edebe omume ikwesị ntụkwasị obi.” Nsụgharị King James Version (nkọwa etiti akwụkwọ) na-asụgharị amaokwu ahụ, “mba ezi omume nke na-ejigide eziokwu.” Ha abụọ bụcha nkọwa ndị kwesịrị ekwesị. N’ezie, ọ dị mfe ịmata mba ezi omume ahụ n’ihi na ọ bụ nanị mba nọ n’elu ala nke nọ n’okpuru Kraịst Eze ahụ, si otú a ghara ịbụ akụkụ nke ụwa Setan. (Jọn 17:16) Ebe ọ dị otú ahụ, a maara ndị òtù ya maka ‘ibi obi nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ.’ Ha na-agbaso ụzọ nke na-enye Chineke otuto. (1 Pita 2:12) Ọzọkwa, ebe ọ bụla ha nọ n’ụwa, ha bụ akụkụ nke “nzukọ nke Chineke dị ndụ, bụ́ ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) N’ịkwado eziokwu, ha na-ajụ nkà ihe ọmụma ọgọ mmụọ nile nke Krisendọm na-akụzi, ha na-akwadokwa “mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya”—Okwu Chineke, bụ́ Bible. (1 Pita 2:2) Ọzọkwa, ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) À pụrụ inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na ihe mejupụtara mba nke a bụ ihe ahụ fọdụrụ nke “Israel nke Chineke,” bụ́ ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ? Ọ dịghị ma ọlị!—Ndị Galetia 6:16.
A Mụọ Mba Ahụ
3. Kọwaa otú e si mụpụta “mba nke na-eme ezi omume.”
3 Olee mgbe a mụrụ ‘mba ezi omume ahụ’? E buru amụma mmalite ya n’akwụkwọ Aịsaịa. N’Aịsaịa 66:7, 8, anyị na-agụ, sị: “Tupu ime emee ya [Zaịọn], ọ mụrụ nwa; tupu ihe mgbu nke dịịrị ya abịa, ọ mụpụtara nwa nwoke. . . . Ime mere Zaịọn, ọ mụkwara ụmụ ya.” N’ụzọ kasị pụọ iche, Zaịọn, bụ́ nzukọ eluigwe nke Chineke, gaje ịmụpụta otu “Nwa nwoke” tupu ime emee ya. Na 1914, a mụpụtara Alaeze Mesaịa n’eluigwe. (Mkpughe 12:5) Mgbe nke ahụ gasịrị, Agha Ụwa Mbụ rikpuru ọtụtụ mba karị, ndị Kraịst e tere mmanụ nwetakwara ihe isi ike na mkpagbu. N’ikpeazụ, n’afọ 1919, a mụpụtara mba ime mmụọ ahụ, bụ́ “Nwa nwoke,” n’elu ala. Otú a, Zaịọn ‘mụrụ ụmụ ya’—ndị òtù e tere mmanụ nke ‘mba ezi omume’ ọhụrụ ahụ—a hazikwara ndị a maka ọrụ ịgba àmà na-amụba amụba mgbe nile.—Matiu 24:3, 7, 8, 14; 1 Pita 2:9.
4. N’ihi gịnị ka o jiworo dị mkpa ka mba ezi omume nke Chineke gbalịsie ike ijigide iguzosi ike n’ezi ihe?
4 Kemgbe mmalite ya, mba nke a ezutewo ule ndị tara akpụ banyere iguzosi ike n’ezi ihe ya. N’ihi gịnị? Mgbe a mụpụtara Alaeze eluigwe ahụ, a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe gaa n’elu ala. Otu olu dara ụda kpọsara, sị: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst Ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị. Ndị ahụ wee merie ya n’ihi ọbara Nwa atụrụ ahụ, na n’ihi okwu àmà ha; ha ahụghịkwa ndụ ha n’anya ruo ọnwụ.” Setan meghachiri omume n’oké iwe n’ihi mgbanwe ọnọdụ a “wee pụọ ibu agha megide mkpụrụ fọdụrụ [nke nwanyị ahụ], bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.” N’ịbụ ndị mwakpo Setan chere ihu, ndị Kraịst e tere mmanụ guzosiri ike. Ruokwa ugbu a, ndị òtù na-anụ ọkụ n’obi nke mba ezi omume Chineke na-egosipụta okwukwe n’ọbara mgbapụta Jisọs ma nọgide na-enye Jehova azịza ọ ga-aza onye ụta ukwuu ahụ site n’iguzosi ike n’ezi ihe “ruo ọnwụ.”—Mkpughe 12:1, 5, 9-12, 17; Ilu 27:11.
5. Àgwà ọma dị aṅaa nke Ndịàmà n’oge a nyewooro ha aka iguzosi ike n’ezi ihe?
5 Na 1919, mgbe ịgba àmà nye Alaeze Chineke n’oge a malitere, Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ ma sie ike n’okwukwe. Ha ghọrọ ndị òtù ntọala nke ‘obodo siri ike, nke nwere nzọpụta dị ka mgbidi na ékpè ya.’ Ntụkwasị obi ha bụ na “Ja Jehova [onye] bụ oké nkume nke mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 26:1, 3, 4) Dị ka Mosis oge ochie, ha kpọsara, sị: “Aha Jehova ka m ga-akpọsa: nyenụ Chineke anyị ịdị ukwuu. Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.”—Deuterọnọmi 32:3, 4.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo gọzie ndị ya na mgbe ikpeazụ ndị a?
6 Kemgbe ahụ, ọnụ ụzọ ámá nile nke ndokwa Alaeze Chineke egherewo ọnụ nke ọma ka e buru ụzọ chịkọta ihe ahụ fọdụrụ na 144,000 ndị Kraịst e tere mmanụ, ugbu a kwa oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ” na-esonye n’ikwusa nzube nile nke Alaeze Jehova. (Jọn 10:16) Otú a, a pụrụ iji ọṅụ maa ọkwa, sị: “Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a, Jehova, Ị tụkwasịwo mmadụ ná mba nke a; Ị natawo nsọpụrụ: I mewo ka nsọtụ nile nke ala dị anya.” (Aịsaịa 26:15) Ka anyị na-enyocha ubi ụwa taa, anyị na-ahụ otú okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu! Site n’ike mmụọ nsọ, a gbaworo ọbịbịa nke Alaeze Kraịst àmà “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) A pụrụ ịgbakọ ókè nke mmụba ahụ site n’Akụkọ Afọ Ije Ozi 1994 nke Ndịàmà Jehova n’Ụwa Nile, nke pụtara na peji nke 12 ruo 15.
Ọnụ Ọgụgụ Ọhụrụ Kasị Elu nke Ndị Nkwusa
7, 8. (a) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ndị Chineke ‘emewo ka ụdọ ụlọ ikwuu dị ogologo’? (b) N’ile anya n’Akụkọ Afọ Ije Ozi 1994, akụkụ ndị dị aṅaa ka ị hụrụ ‘na-esetị ókèala ha’ n’ụzọ pụrụ iche?
7 Tụlee isi ihe ụfọdụ dị n’akụkọ ozi a. Ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze n’ubi ruru 4,914,094! Lee ka o si na-akpali akpali ịhụ nchịkọta na-aga n’ihu n’ihu nke “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha”! Ee, ndị a aghọwokwa ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. “Ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ,” na-abụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume n’ihi igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs.—Mkpughe 7:9, 14.
8 Karịsịa kemgbe 1919, a kpọwo nzukọ Jehova òkù, sị: “Mee ka ebe ụlọ ikwuu gị saa mbara, ka ha setịakwa ákwà nkwụba nile nke ebe obibi gị nile; egbochila: mee ka ụdọ gị nile dị ogologo, meekwa ka ntú gị nile dị ike.” (Aịsaịa 54:2) Ná nzaghachi, ọrụ nkwusa ahụ agawo n’ihu n’akwụsịghị akwụsị, ọbụna na Yukon nke ice na-ada, nke dị n’ókèala Alaska, ebe ìgwè ndị ọsụ ụzọ gbasiri ike na-atachi obi n’ọnọdụ ihu igwe nke pụrụ ịgbada ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi 45 ma ọ bụ 50 Celsius ruo ọtụtụ izu n’otu oge. N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ ìgwè mmadụ na-enubata oké ngwa ngwa ná mba Jehova nke na-eguzosi ike n’ezi ihe. Ọnụ ụzọ ámá ya nile eghewo ọnụ nke ọma karị ịnabata ndị a sitere n’ala nile nke Esia na-abụghị Krisendọm, site n’ebe ndị ahụ dị ike nke Kọmunist, site n’ọtụtụ ala Africa, na site n’ọtụtụ ókèala ndị Katọlik, dị ka Itali, Spain, Portugal, na South America. Ndị ọnọdụ ha gbanwere agbanwe emepewo ókèala ọzọ. N’England, dị ka ihe atụ, Ndịàmà na-elekọta mkpa nke ìgwè agbụrụ 13 na-asụ asụsụ ndị mba ọzọ.
“Na-emenụ Nke A”
9. (a) Gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta nke 1994 na-egosi? (b) Olee ụfọdụ n’ime mba ndị nwere ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta dị elu n’ụzọ pụrụ iche?
9 Isi ihe ọzọ dị n’akụkọ mgbaafọ ahụ bụ ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta. Ná mkpirikpi oge tupu ọ nwụọ, Jisọs guzobere Ememe Ncheta nke e ji echeta ọnwụ ya ma gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (1 Ndị Kọrint 11:24) Ọ bụ ihe na-akpali akpali na 1994 ịhụ 12,288,917—nke ji ihe dị ukwuu karịa okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike—ka ha bịakọrọ ọnụ irube isi n’iwu ahụ, ma ọ̀ bụ dị ka ndị na-ekere òkè ma ọ̀ bụ dị ka ndị nkiri. N’ala ụfọdụ nkezi nke ndị bịara Ememe Ncheta maka ndị nkwusa dị elu ọbụna karị. Ndị nkwusa 4,049 nọ n’Estonia, Latvia, na Lithuania nwere ọṅụ inwe 12,876 mmadụ ndị bịara Ememe Ncheta ahụ, ihe karịrị okpukpu atọ nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Na Benin, 16,786 ndị bịara Ememe Ncheta nọchitere anya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu ise nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Otu ọgbakọ nwere ihe dị ka 45 ndị nkwusa nwere 831 ndị bịaranụ!
10. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa ka ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị bịara Ememe Ncheta na-atụkwasị anyị? (b) Kọwaa ihe pụrụ ime mgbe onye bịara Ememe Ncheta natakwuru enyemaka.
10 Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ na ọtụtụ ndị nwere mmasị sonyeere ha n’oge ememe olileanya obi ụtọ ahụ. Ugbu a ha chọrọ inyere ndị a aka inwekwu ọganihu ná nghọta na ịhụnanya ha nke eziokwu. Ụfọdụ pụrụ ịzaghachi otú ahụ Alla bi na Russia mere. Alla so otu nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na-amụ ihe ma nwee ọganihu dị ntakịrị, ya mere a kwụsịrị ọmụmụ ihe ahụ. Otú o sina dị, Alla nakweere ọkpụkpọ òkù ịbịa Ememe Ncheta. Nzukọ ahụ, bụ́ nke nwere ọtụtụ ihe ịrịba ama, bamiri ya n’obi. Mgbe ọ laghachiri ụlọ, ọ tụfuru ihe ọ̀kpụ́kpụ́ ya nile ma kpegara Jehova ekpere maka enyemaka. Ụbọchị abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ ahụ letara Alla ịmata otú Ememe Ncheta ahụ si masị ya. Nkwurịta okwu rụpụtara ihe malitere. A maliteghachiri ọmụmụ ihe Alla. N’oge na-adịghị anya ọ malitere ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà. Ahụmahụ nke a na-egosi abamuru dị n’iji nleta sochie ndị ahụ bịara Ememe Ncheta. O yikarịrị ka ọtụtụ ga-azaghachi dị ka Alla mere.
“Gharakwa Ịhapụ Nzukọ nke Onwe Anyị”
11-13. (a) Gịnị bụ otu akụkụ nke omume ikwesị ntụkwasị obi nke mba ezi omume ahụ? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ezi ndị Kraịst na-aga nzukọ nile?
11 Ememe Ncheta bụ nzukọ kasị dị mkpa na kalenda nke Ndịàmà Jehova, ma ọ bụghị ma ọlị nanị nke e nwere. Kwa izu Ndịàmà Jehova na-ezukọ ná nrubeisi nye okwu Pọl onyeozi: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ha na-esonyere mba ezi omume Jehova nke e ji omume ikwesị ntụkwasị obi ya amata. Omume ikwesị ntụkwasị obi gụnyere iji ikwesị ntụkwasị obi na-aga nzukọ nile.
12 Ihe àmà na-egosi na a ghọtara nke a nke ọma na Philippines, ebe nkezi nke ọnụ ọgụgụ ndị obodo ahụ na-abịa nzukọ Sunday nile bụ 125 pasent nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa. Ìgwè Ndịàmà na ndị nwere mmasị n’Argentina ghọtakwara nke a nke ọma. Ha bi ihe dị ka 20 kilomita n’ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị. Otú o sina dị, onye nlekọta sekit na-akọ na e wezụga n’ọnọdụ ọrịa, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha na-agha nzukọ. Ha na-eme njem ruo hour anọ n’ụgbọ ịnyịnya ma ọ bụ n’azụ ịnyịnya, n’oge oyi ha na-eme njem ụla n’ọchịchịrị nke abalị.
13 Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-abịaru nso, ndụ na-esiwanye ike, nsogbu na-amụba, ịbịachikwa nzukọ anya pụrụ ịbụ ihe ịma aka karị. Ma n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị nwere mkpa maka nri ime mmụọ na mkpakọrịta na-ekpo ọkụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ bụ́ nke a pụrụ ịchọta nanị ná nzukọ ndị dị otú ahụ.
“Tụkwasị Uche n’Ọrụ Gị”
14. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji enwe echiche nke ịdị ngwa banyere ozi ha, ihe ndị dịkwa aṅaa a rụpụtara na-egosipụta nke a?
14 N’afọ gara aga, Chọọchị Katọlik n’Itali zoro aka n’ebe ọrụ Ndịàmà Jehova dị dị ka “ime ntọghata n’obi ọjọọ.” Otú ọ dị, n’ezie ọ dịghị ihe obi ọjọọ ọ bụla dị n’ihe Ndịàmà na-eme. Kama nke ahụ, ozi ha bụ ngosipụta nke ịhụnanya dị omimi maka ndị agbata obi ha. Ọ bụkwa ihe àmà nke nrubeisi nye okwu Pọl: “Kwusaa okwu Ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị.” (2 Timoti 4:2) Echiche nke ịdị ngwa na-akpali Ndịàmà Jehova ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ha, dị ka a hụrụ na ha itinye ngụkọta nke 1,096,065,354 hour na 1994 n’ikwusara ndị agbata obi ha ozi ọma, n’ime nletaghachi, na iduzi ọmụmụ Bible 4,701,357. Ọtụtụ nwere ike ikere òkè n’ozi ọsụ ụzọ, nke na-egosi na mmụọ ọsụ ụzọ dị ndụ ma na-arụsi ọrụ ike. Nkezi nke 636,202 ndị ọsụ ụzọ n’ụwa nile na-anwapụta nke a.
15, 16. (a) Olee ụzọ ma ndị na-eto eto ma ndị agadi siworo gosipụta mmụọ ọsụ ụzọ? (b) N’ile anya ná mba ọ bụla dị n’Akụkọ Afọ Ije Ozi 1994, olee ebe ndị ị hụrụ ọnụ ọgụgụ pụrụ iche nke ndị ọsụ ụzọ?
15 N’etiti ndị ọsụ ụzọ ahụ, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto. Ụfọdụ ndị na United States na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, na-ewere ndị klasị ibe ha dị ka ókèala ha bụ isi. Ndị ntorobịa a achọpụtawo na ịrụ ọsụ ụzọ bụ ụzọ kasị mma isi chebe onwe ha pụọ n’ọgwụ ọjọọ, omume rụrụ arụ, na ime ihe ike nke jupụtara n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ dị n’ala ahụ. Ọtụtụ ndị ọzọ na-eto eto nwere ọrụ ọsụ ụzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ ha mgbe ha hapụrụ ụlọ akwụkwọ. Irina, bi na Ukraine, rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge nile ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu iji kwadebe onwe ya maka ọrụ ọsụ ụzọ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ezinụlọ ya wepụtara onwe ha ịkwado ya n’ihe metụtara ọrụ ego ka o wee nwee ike ịnọchite ha n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. N’ọnọdụ akụ̀ na ụba, ihe adịghị mfe na Ukraine. Ma Irina na-asị: “Amaara m na m na-arụ ọrụ pụtara ndụ ọ bụghị nanị nye m kamakwa nye ndị m na-ekwusara ozi ọma.” Ọ bụ ihe ọṅụ n’ezie ịhụ ka ọtụtụ ndị na-eto eto taa na-eche echiche dị ka Irina. Olee ụzọ ka mma ha nwere ‘isi cheta Onye kere ha n’ụbọchị ha dị n’okorobịa na agbọghọbịa’?—Eklisiastis 12:1.
16 Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị ọsụ ụzọ emewo agadi. Otu onye na-akọ na n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e gburu nna ya na nwanne ya nwoke ka ha na-alụ ọgụ n’agha ahụ, a gbagbukwara nne ya na nwanne ya nwanyị n’ógbè ndị ogbenye. E mesịa nwa ya nwụnahụrụ ya. Ugbu a, ka ọ na-akawanye nká ma na-enwe ahụ esighị ike, Jehova enyewo ya, n’ọgbakọ ndị Kraịst, ezinụlọ buru ibu karịa nke funahụrụ ya. Ọ na-achọtakwa ọṅụ n’inyere ndị ọzọ aka dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.
17, 18. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị, ma ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ma ọ̀ bụghị, pụrụ isi gosi mmụọ ọsụ ụzọ?
17 N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Jehova nwere obi ụtọ ịnakwere otu ụzọ n’ụzọ iri anyị dum, ihe kasị mma anyị pụrụ inye, ihe ọ bụla nke a pụrụ ịbụ n’ọnọdụ anyị kpọmkwem. (Malakaị 3:10) N’ezie, anyị nile pụrụ ịzụlite mmụọ nke ndị ọsụ ụzọ a na-anụ ọkụ n’obi ma mee ihe ọ bụla ọnọdụ anyị pụrụ inye ohere ya iji mee ka nkwusa nke ozi ọma ahụ gaa n’ihu.
18 Dị ka ihe atụ, n’Australia, e setịpụrụ April 16 dị ka ụbọchị pụrụ iche maka ịgba àmà okporo ámá. Ndị nkwusa nakwa ndị ọsụ ụzọ nyere ya nkwado dị mma, dị ka ihe àmà gosiri n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa ọhụrụ kasị elu nke 58,780 maka ọnwa ahụ. N’ịga n’ihu, e kesakwuru 90,000 magazin karịa ka e mere n’otu ọnwa ahụ n’afọ gara aga. N’ụbọchị ahụ pụrụ iche, otu nwanna nwanyị tinyere magazin ụfọdụ n’aka otu nwoke, mgbe ọ na-edetukwa aha na adres ya iji sochie mmasị ya, ọ chọpụtara na ha bụ ụmụnne! O mesịrị bụrụ na ha bụ ndị ikwu ndị na-ahụbeghị onwe ha ruo 30 afọ. N’ezie nke ahụ rụpụtara oge nletaghachi ndị na-enye obi ụtọ!
Guzosie Ike n’Ezi Ihe ruo Ọgwụgwụ
19. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka mba ezi omume Jehova guzosie ike n’ezi ihe ruo kpọmkwem n’ọgwụgwụ?
19 Ọ bụ ihe dị mkpa ka ndị nile nọ ná mba ezi omume Chineke guzosie ike n’ezi ihe ka ụwa Setan na-abanye n’oge ọnwụ ya. N’isi nso, mba dị nsọ nke Jehova ga-anụ òkù ahụ bụ: “Ndị m, bata n’ime ụlọ gị nile, mechibido ụzọ gị nile n’azụ gị: zobe onwe gị nanị otu ntabi anya nta, ruo mgbe oké iwe ga-agabiga.” Ụwa nke a ikpe ọbara mara agaghị agbanahụ ikpe ọmụma Chineke. “N’ihi na, lee, Jehova na-esi n’ọnọdụ Ya apụta iji ajọ omume nke ndị bi n’ụwa leta ha: ọzọ, ala ga-ekpughe ọbara ya, ọ gaghị ekpuchikwa ndị ya e gburu egbu ọzọ.” (Aịsaịa 26:20, 21) Ka onye ọ bụla n’ime anyị guzosie ike dị ka onye Kraịst na-eguzosi ike n’ezi ihe nke na-esonyere mba ezi omume Jehova. Mgbe ahụ anyị ga-aṅụrị ọṅụ inweta ndụ ebighị ebi n’ógbè elu ala ma ọ bụ eluigwe nke Alaeze Kraịst.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee mgbe a mụpụtara ‘mba ezi omume ahụ’?
◻ N’ihi gịnị ka ntachi obi jiworo dị ndị Chineke mkpa na mgbe ikpeazụ ndị a?
◻ Gịnị ka e gosipụtaworo site n’ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị nkwusa na hour e tinyere n’ozi ahụ nke a na-ahụ n’Akụkọ Afọ Ije Ozi 1994?
◻ N’ihi gịnị ka ịbịa nzukọ nile ji dị oké mkpa ka ụwa nke a na-abịaru ọgwụgwụ ya nso karị?
◻ N’ihi gịnị ka ndị nile na-esonyere mba ezi omume Chineke na-aghaghị iji na-eguzosi ike n’ezi ihe?
[Chaatị dị na peeji nke 12-15]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1994 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto dị na peeji nke 18]
Ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ná mba ezi omume Jehova ga-enweta ndụ ebighị ebi n’izu okè