Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/1 p. 9-14
  • Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nna, Onye Nkụzi, Di
  • Nkụzi Jehova Ndị Dị Mkpa
  • Oké Ìgwè Ndị E Ziri Ihe
  • Ụzọ Jehova Si Ezi Ihe
  • Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs
    Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs
  • Onye Ndị Amụma Nile Gbara Àmà Banyere Ya
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Nwanyị Aga Aṅụrịa Ọṅụ
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ndị Nlanarị site ná Mba Nile
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/1 p. 9-14

Jehova—Chineke nke Na-akụzi Ihe

“Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke ziworo ihe.”—JỌN 6:45.

1. Olee ebe Jisọs rụworo ọrụ ebube, gịnịkwa ka ọ na-eme n’ebe ahụ ugbu a?

JISỌS KRAỊST ka rụpụrụ ọrụ ebube ụfọdụ, a na-ahụkwa ya ugbu a ka ọ na-ezi ihe n’otu ụlọ nzukọ dị na Kapanaum, nso Osimiri Galili. (Jọn 6:1-21, 59) Ọtụtụ gosipụtara na ha ekweghị mgbe ọ sịrị: “Esiwo m n’eluigwe rịdata.” Ha tamuru ntamu, sị: “Onye a, Ọ́ bụghị Jisọs, Nwa Josef, Onye anyị onwe anyị maara nna Ya na nne Ya? Ò si aṅaa kwuo ugbu a, Esiwo m n’eluigwe rịdata?” (Jọn 6:38, 42) N’ịbara ha mba, Jisọs kpọsara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya: Mụ onwe m ga-emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 6:44.

2. Olee ihe ndabere e nwere maka ikwere ná nkwa Jisọs banyere mbilite n’ọnwụ?

2 Lee aha nkwa dị ebube nke ahụ bụ—ịbụ onye e mere ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ, mgbe Alaeze Chineke na-achị! Anyị pụrụ ikwere nkwa nke a n’ihi na Nna anyị, Jehova Chineke, bịanyere aka na ya. (Job 14:13-15; Aịsaịa 26:19) N’ezie, Jehova, onye na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ ga-ebili, bụ “onye nkụzi kasị ukwuu.” (Job 36:22, Today’s English Version) N’ilekwasị anya ná nkụzi Nna ya, Jisọs kwuziri, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke ziworo ihe.”—Jọn 6:45.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

3 N’ezie, ọ ga-abụ ihe ùgwù iso n’etiti ndị Aịsaịa onye amụma dere banyere ha, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:13) Ànyị pụrụ ịbụ ha? Olee ndị yiworo ụmụ nye ya ma natawokwa nkụzi ya? Olee nkụzi ndị gbara ọkpụrụkpụ nke Jehova ndị anyị na-aghaghị ịma ma jiri na-eme ihe iji nata ngọzi ya? Olee otú Jehova si kụzie ihe n’oge gara aga, ọ̀ na-akụzikwa ihe n’otu aka ahụ taa? Ndị a bụ ajụjụ ndị anyị ga-atụle.

Nna, Onye Nkụzi, Di

4. Olee ndị bụ ndị mbụ n’ụmụ Jehova ịnata nkụzi ya?

4 Jehova ghọrọ Nna na Onye Nkụzi na nke mbụ ya mgbe o kere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ. A kpọrọ onye nke a “Okwu ahụ” n’ihi na ọ bụ Ọnụ Bụ́ Isi Na-ekwuru Jehova. (Jọn 1:1, 14; 3:16) Okwu ahụ jere ozi “n’akụkụ [Nna ya], dị ka onye ọkà,” ọ mụtakwara ihe nke ọma site ná nkụzi Nna ya. (Ilu 8:22, 30) N’ezie, ọ ghọrọ Onye Ozi, ma ọ bụ ngwá ọrụ, nke Nna ya sitere n’aka ya kee ihe nile ọzọ, gụnyere “ụmụ Chineke” ndị bụ́ mmụọ. Lee ka ha na-aghaghị isiworị nwee ọṅụ n’ịbụ ndị Chineke ziri ihe! (Job 1:6; 2:1; 38:7; Ndị Kọlọsi 1:15-17) E mesịa, e kere mmadụ mbụ, bụ́ Adam. Ya onwe ya kwa bụ “nwa Chineke,” Bible na-ekpughekwa na Jehova ziri ya ihe.—Luk 3:38; Jenesis 2:7, 16, 17.

5. Olee ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke Adam tụfuru, ma ole ndị ka Jehova ziri ihe, n’ihi gịnịkwa?

5 Ọ bụ ihe mwute na Adam, site n’ịma ụma nupụ isi, tụfuru ihe ùgwù nke ịnọgide na-abụ nwa Chineke. Ya mere, ụmụ ya apụghị ịzọrọ mmekọrịta nke ịbụ ụmụ Chineke nanị n’ihe ndabere nke usoro ọmụmụ. Ma, Jehova kụziiri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe bụ́ ndị legaara ya anya maka nduzi. Noa, dị ka ihe atụ, nwapụtara onwe ya ịbụ “onye ezi omume” onye ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị,” n’ihi ya kwa Jehova ziri Noa ihe. (Jenesis 6:9, 13–7:5) Site ná nrubeisi ya, Abraham nwapụtara onwe ya ịbụ “enyi nke Chineke,” n’ihi ya kwa Jehova ziri ya ihe.—Jemes 2:23; Jenesis 12:1-4; 15:1-8; 22:1, 2.

6. Ole ndị ka Jehova bịara lee anya dị ka “nwa,” ụdị onye nkụzi dịkwa aṅaa ka ọ bụụrụ ha?

6 Mgbe ogologo oge gasịrị, n’ụbọchị Mosis, Jehova banyere ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ ya na mba Israel. N’ihi ya, mba ahụ ghọrọ ndị ya ọ họọrọ, e leekwa ya anya dị ka “nwa” ya. Chineke sịrị: “Nwa m . . . ka Israel bụ.” (Ọpụpụ 4:22, 23; 19:3-6; Deuterọnọmi 14:1, 2) Ná ndabere nke mmekọrịta ọgbụgba ndụ ahụ, ndị Israel pụrụ ikwu, dị ka Aịsaịa onye amụma dekọrọ, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị.” (Aịsaịa 63:16) Jehova rụrụ ọrụ ya nke ịbụ nna ma zie ụmụ ya, bụ́ Israel, ihe. (Abụ Ọma 71:17; Aịsaịa 48:17, 18) N’ezie, mgbe ha na-ekwesịghị ntụkwasị obi, o ji obi ebere rịọ ha, sị: “Latanụ, ụmụ nke na-adaghachi azụ.”—Jeremaịa 3:14.

7. Mmekọrịta dị aṅaa ka Israel na Jehova nwere?

7 Dị ka ihe sitere ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ ya na Israel pụta, Jehova ghọkwara Di nke mba ahụ n’ụzọ ihe atụ, mba ahụ ghọkwara nwunye ihe atụ ya. Banyere ya Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Di gị bụ Onye meworo gị; Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya.” (Aịsaịa 54:5; Jeremaịa 31:32) Ọ bụ ezie na Jehova mezuru òkè ya dị ka Di n’ụzọ dị ùgwù, mba Israel ghọrọ nwunye nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi. “Dị ka nwanyị si ewere nghọgbu hapụ di ya,” ka Jehova kwuru, “otú a ka unu ghọgbuworo m, unu ụlọ Israel.” (Jeremaịa 3:20) Jehova nọgidere na-arịọ ụmụ nke nwunye ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi; ọ nọgidere na-abụ “Onye Ozizi Kasị Ukwuu” ha.—Aịsaịa 30:20, NW; 2 Ihe Emere 36:15.

8. Ọ bụ ezie na Jehova jụrụ Israel dị ka otu mba, nwunye ihe atụ dị aṅaa nke e sere onyinyo ya ka ọ ka nwere?

8 Mgbe Israel jụrụ ma gbuo Ọkpara Ya, bụ́ Jisọs Kraịst, Chineke mesịrị jụ mba ahụ. Ya mere mba Juu ahụ abụkwaghị nwunye ihe atụ nye ya, ya onwe ya abụkwaghị Nna na Onye Nkụzi nke ụmụ ya ndị na-enupụ isi. (Matiu 23:37, 38) Otú ọ dị, Israel bụ nanị nwunye ihe atụ, ma ọ bụ nke nnọchiteanya. Pọl onyeozi hotara Aịsaịa 54:1, nke na-ekwu banyere “nwanyị aga” nke dịwagara iche n’ebe “nwanyị nke a lụrụ na nwunye” nọ, bụ́ mba Israel anụ ahụ. Pọl kpughere na ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ụmụ nke “nwanyị aga” ahụ, nke ọ kpọrọ “Jerusalem nke dị n’elu.” Ihe mejupụtara nwanyị ihe atụ a nke e sere onyinyo ya bụ nzukọ eluigwe nke Chineke nke ndị mmụọ e kere eke.—Ndị Galetia 4:26, 27.

9. (a) Ole ndị ka Jisọs na-ezo aka n’ebe ha nọ mgbe o kwuru banyere ‘ụmụ gị ịbụ ndị mmụta Jehova’? (b) N’ihe ndabere dị aṅaa ka ndị mmadụ ga-aghọ ụmụ ime mmụọ Chineke?

9 N’ihi ya, n’ụlọ nzukọ dị na Kapanaum, mgbe Jisọs hotara amụma Aịsaịa: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova,” ọ na-ekwu banyere ndị ga-abụ “ụmụ” nke “Jerusalem nke dị n’elu,” nzukọ eluigwe nke Chineke nke yiri nwunye. Site n’ịnakwere nkụzi nile nke onye nnọchiteanya Chineke nke sitere n’eluigwe, bụ́ Jisọs Kraịst, ndị Juu ahụ na-ege ntị pụrụ ịghọ ụmụ nke nwanyị eluigwe nke Chineke bụ́ nke bụbu nwanyị aga ma mejupụta “mba dị nsọ,” “Israel nke Chineke” nke ime mmụọ. (1 Pita 2:9, 10; Ndị Galetia 6:16) N’ịkọwa ohere dị ebube Jisọs wepụtara maka ịbụ ụmụ ime mmụọ nke Chineke, Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bịakwutere ihe nke aka Ya, ma ndị nke aka Ya akpọbataghị Ya. Ma ka ha hà, bụ ndị naara Ya, ha ka O nyere ike ịghọ ụmụ Chineke, bụ́ ndị kwere n’aha Ya.”—Jọn 1:11, 12.

Nkụzi Jehova Ndị Dị Mkpa

10. Ozugbo nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị, gịnị ka Jehova kụziri banyere “mkpụrụ” ahụ, ònyekwa ka Mkpụrụ ahụ ghọrọ?

10 Jehova, dị ka Nna na-ahụ n’anya, na-eme ka ụmụ ya mara nzube ya. N’ihi ya, mgbe otu mmụọ ozi nnupụisi mere ka mmadụ abụọ mbụ nupụ isi, Jehova mere ozugbo ka a mara ihe ọ ga-eme iji mezuo nzube ya ime ka ụwa bụrụ paradaịs. Ọ sịrị na ya ga-etinye iro n’etiti “agwọ ochie ahụ,” onye bụ́ Setan Ekwensu, “na nwanyị ahụ.” Ọ kọwaziri na “mkpụrụ” nwanyị ahụ ga-echipịa Setan n’ụzọ na-eweta ọnwụ, “n’isi.” (Jenesis 3:1-6, 15; Mkpughe 12:9; 20:9, 10) Dị ka anyị rịbaworo ama, nwanyị ahụ—nke e mesịrị kọwaa dị ka “Jerusalem nke dị n’elu”—bụ nzukọ eluigwe nke Chineke nke ndị mmụọ e kere eke. Ma ònye bụ “mkpụrụ” ya? Ọ bụ Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e si n’eluigwe zite na onye nke ga-emesịa bibie Setan.—Ndị Galetia 4:4; Ndị Hibru 2:14; 1 Jọn 3:8.

11, 12. Olee otú Jehova si gbasawanye nkụzi ya dị mkpa banyere “mkpụrụ” ahụ?

11 Jehova gbasawanyere nkụzi a dị mkpa banyere “mkpụrụ” ahụ mgbe o kwere Abraham nkwa, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe . . . Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:17, 18) Jehova jiri Pọl onyeozi kọwaa na Jisọs Kraịst bụ Mkpụrụ Abraham e kwere ná nkwa ma na ndị ọzọ ga-aghọkwa akụkụ nke “mkpụrụ” ahụ. “Ọ bụrụ na unu onwe unu bụ ihe dị n’ahụ nke Kraịst,” ka Pọl dere, “ya mere unu bụ mkpụrụ Abraham, bụrụ ndị nketa dị ka nkwa si dị.”—Ndị Galetia 3:16, 29.

12 Jehova kpughekwara na Kraịst, bụ́ Mkpụrụ ahụ, ga-esite n’usoro ọmụmụ ndị eze Juda nakwa na ọ bụ ya “ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” (Jenesis 49:10) Banyere Eze Devid nke ebo Juda, Jehova kwere nkwa, sị: “M ga-emekwa ka mkpụrụ ya dịruo mgbe ebighị ebi, meekwa ka ocheeze ya dị ka ụbọchị nile nke eluigwe. Mkpụrụ ya ga-adịru mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịkwa ka anyanwụ n’ihu m.” (Abụ Ọma 89:3, 4, 29, 36) Mgbe mmụọ ozi Gebriel mara ọkwa ọmụmụ Jisọs, ọ kọwara na nwa ahụ bụ Onye Ọchịchị Chineke a họpụtara ahọpụta, Mkpụrụ Devid. “Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa Ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu,” ka Gebriel kwuru, “Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: . . . alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.”—Luk 1:32, 33; Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 7:13, 14.

13. Iji nata ngọzi Jehova, olee ụzọ anyị na-aghaghị isi nakwere nkụzi ya?

13 Iji nweta ngọzi Jehova, anyị aghaghị ịmara ma jiri nkụzi a dị mkpa banyere Alaeze Chineke mee ihe. Anyị aghaghị ikwere na Jisọs sitere n’eluigwe bịa, na ọ bụ Eze Chineke a họpụtara ahọpụta—Mkpụrụ bụ́ eze nke ga-elekọta mweghachi nke Paradaịs n’elu ụwa—nakwa na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Luk 23:42, 43; Jọn 18:33-37) Na Kapanaum mgbe Jisọs kwuru banyere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ, o kwesịrị idoworị ndị Juu ahụ anya na ọ na-ekwu eziokwu. Eenụ, nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ma eleghị anya kpọmkwem n’ebe ahụ na Kapanaum, ọ kpọliteworị nwa nwanyị dị afọ 12 nke onye isi oche ụlọ nzukọ n’ọnwụ! (Luk 8:49-56) N’ezie anyị onwe anyị kwa nwere ihe nile mere anyị ga-eji kwere ma mee ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nkụzi Jehova nke na-akpali olileanya banyere Alaeze ya!

14, 15. Olee otú Alaeze Jehova dịruru ná mkpa nye Jisọs? (b) Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịghọta ma nwee ike ịkọwa banyere Alaeze Jehova?

14 Jisọs tinyere ndụ elu ụwa ya n’ịkụzi banyere Alaeze Jehova. O mere ya isiokwu nke ozi ya, ọbụna na o nyekwara ụmụazụ ya ntụziaka ikpe ekpere maka ya. (Matiu 6:9, 10; Luk 4:43) Ndị Juu anụ ahụ nọ n’ọnọdụ ịghọ “ụmụ alaeze ahụ,” ma n’ihi enweghị okwukwe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha enwetaghị ihe ùgwù ahụ. (Matiu 8:12; 21:43) Jisọs kpughere na nanị “ìgwè atụrụ nta” ga-anata ihe ùgwù nke ịghọ “ụmụ alaeze ahụ.” “Ụmụ” a ga-aghọ “ndị ha na Kraịst na-ekekọ ihe” n’Alaeze eluigwe ya.—Luk 12:32; Matiu 13:38; Ndị Rom 8:14-17; Jemes 2:5.

15 Ndị nkekọ ole nke Alaeze ka Kraịst ga-akpọrọ laa eluigwe iso ya chịa ụwa? Nanị 144,000, dị ka Bible na-ekwu. (Jọn 14:2, 3; 2 Timoti 2:12; Mkpughe 5:10; 14:1-3; 20:4) Ma Jisọs sịrị na ya nwere “atụrụ ọzọ,” ndị ga-abụ ndị Alaeze ahụ ga-achị n’elu ụwa. Ndị a ga-enwe ahụ ike zuru okè na udo ruo ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Jọn 10:16; Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4) Ọ dị anyị mkpa ịghọta na inwe ike ịkọwa nkụzi Jehova banyere Alaeze ahụ.

16. Olee nkụzi dị mkpa nke Jehova nke ọ dị anyị mkpa ịmụta na iji mee ihe?

16 Pọl onyeozi kọwara nkụzi ọzọ dị mkpa nke Jehova. Ọ sịrị: “Unu onwe unu bụ ndị Chineke ziworo ịhụrịta ibe unu n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9) Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, ọ dị anyị mkpa igosipụta ịhụnanya dị otú ahụ. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Bible na-ekwu, anyị aghaghịkwa iṅomi ihe nlereanya ya nke igosi ịhụnanya. (1 Jọn 4:8; Ndị Efesọs 5:1, 2) Ọ bụ ihe mwute na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ adawo ọdịda ọjọọ n’ịmụta ịhụ ụmụ mmadụ ibe ha n’anya dị ka Chineke na-akụziri anyị ime. Gịnị banyere anyị? Ànyị anakwerewo nkụzi nke a nke Jehova?

17. Àgwà ole ndị ka anyị kwesịrị iṅomi?

17 Ọ dị oké mkpa na anyị na-anakwere nkụzi nile nke Jehova. Ka àgwà anyị bụrụ nke ndị ọbụ abụ ahụ nke Bible bụ́ ndị dere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị ziekwa m ihe.” “Zi m ụkpụrụ Gị nile. Zi m ịdị mma nke ezi uche na ihe ọmụma . . . Ziekwa m ikpe Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4, 5; 119:12, 66, 108) Ọ bụrụ na mmetụta gị bụ otu ihe ahụ dị ka nke ndị ọbụ abụ ahụ, ị pụrụ iso n’oké ìgwè mmadụ Jehova na-ezi ihe.

Oké Ìgwè Ndị E Ziri Ihe

18. Gịnị ka Aịsaịa onye amụma kwuru ga-eme n’oge anyị?

18 Aịsaịa onye amụma kwuru ihe ga-eme n’oge anyị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile . . . Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; Ọ ga-ezikwa anyị ụzọ Ya ụfọdụ.” (Aịsaịa 2:2, 3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; Maịka 4:2.) Olee ndị bụ ndị mmụta a nke Jehova?

19. Ole ndị taa ka a gụnyere ná ndị Jehova na-ezi ihe?

19 Ha gụnyere ndị ọzọ ma e wezụga ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Dị ka a rịbaburu ama, Jisọs kwuru na ya nwere “atụrụ ọzọ”—ndị Alaeze ahụ ga-achị n’elu ụwa—tinyere “ìgwè atụrụ nta” ahụ nke ndị nketa Alaeze. (Jọn 10:16; Luk 12:32) “Oké ìgwè mmadụ,” ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu ahụ,’ so n’òtù atụrụ ọzọ ahụ, ha na-enwekwa nguzo a nwapụtara anwapụta n’ihu Jehova ná ndabere nke okwukwe ha n’ọbara Jisọs a wụfuru. (Mkpughe 7:9, 14) Ọ bụ ezie na a gụnyeghị atụrụ ọzọ ahụ kpọmkwem n’etiti “ụmụ” e kwuru okwu ha n’Aịsaịa 54:13, e ji ịbụ ndị Jehova na-ezi ihe gọzie ha. Ya mere, ha ziri ezi n’ịkpọ Chineke “Nna” n’ihi na, n’ụzọ dị otú ahụ, ọ ga-abụrụ ha Nna Ochie site ná “Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi,” bụ́ Jisọs Kraịst.—Matiu 6:9; Aịsaịa 9:6.

Ụzọ Jehova Si Ezi Ihe

20. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova na-ezi ihe?

20 Jehova na-ezi ihe n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme otú ahụ site n’ihe ndị o kere, bụ́ ndị na-agba akaebe nye ma ịdị adị ya ma oké amamihe ya. (Job 12:7-9; Abụ Ọma 19:1, 2; Ndị Rom 1:20) Ọzọkwa, ọ na-ezi ihe site n’ịgwa mmadụ okwu n’onwe ya, dị ka o mere n’inye Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ ntụziaka. N’otu aka ahụ, n’oge atọ e mere ndekọ ha, ọ gwara ndị nọ n’ụwa okwu n’onwe ya site n’eluigwe.—Matiu 3:17; 17:5; Jọn 12:28.

21. Olee mmụọ ozi nke Jehova jikarịrị mee ihe dị ka onye nnọchiteanya ya, ma olee otú anyị si mara na e jikwara ndị ọzọ mee ihe?

21 Jehova na-ejikwa ndị nnọchiteanya bụ́ ndị mmụọ ozi ezi ihe, gụnyere Nwa Mbụ ya, bụ́ “Okwu ahụ.” (Jọn 1:1-3) Ọ bụ ezie na Jehova pụrụ ịgwawo nwa ya nwoke zuru okè nke bụ́ mmadụ, bụ́ Adam, okwu n’onwe ya n’ogige Iden, o yikarịrị ka o jiri Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ mee ihe ikwuchitere Ya. (Jenesis 2:16, 17) Ma eleghị anya onye nke a bụ “mmụọ ozi nke Chineke, nke na-eje n’ihu ọmụma ụlọikwuu nke Israel” nke ọ bụkwa banyere ya ka Jehova nyere iwu, sị: “Geekwa ntị n’olu ya.” (Ọpụpụ 14:19; 23:20, 21) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs ahụ dị adị tupu ọ ghọọ mmadụ bụkwa “onye isi usuu ndị agha Jehova” nke gosiri Joshua onwe ya iji gbaa ya ume. (Joshua 5:14, 15) Jehova na-ejikwa ndị mmụọ ozi ọzọ ezi ihe, dị ka ndị o jiri nye Mosis Iwu ya.—Ọpụpụ 20:1; Ndị Galetia 3:19; Ndị Hibru 2:2, 3.

22, (a) Ole ndị n’elu ụwa ka Jehova jiworo zie ihe? (b) Gịnị bụ ụzọ bụ́ isi Jehova ji ezi ụmụ mmadụ ihe taa?

22 Ọzọkwa, Jehova Chineke na-eji ndị nnọchiteanya bụ́ mmadụ ezi ihe. Ndị nne na nna n’Israel gaje ịkụziri ụmụ ha ihe; ndị amụma, ndị nchụàjà, ndị isi, na ndị Livaị kụziiri mba ahụ Iwu Jehova. (Deuterọnọmi 11:18-21; 1 Samuel 12:20-25; 2 Ihe Emere 17:7-9) Jisọs bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke n’ụzọ bụ isi n’ụwa. (Ndị Hibru 1:1, 2) Ọtụtụ mgbe Jisọs sịrị na ihe ọ na-akụzi bụ kpọmkwem ihe ọ mụtara n’aka Nna ya, ya mere ndị na-ege ya ntị, n’ezie, bụ ndị Jehova na-ezi ihe. (Jọn 7:16; 8:28; 12:49; 14:9, 10) Jehova emewo ka e dekọọ ihe ndị o kwuru, n’ụbọchị anyị kwa ọ na-akụziri ụmụ mmadụ ihe n’ụzọ bụ́ isi site n’Akwụkwọ Nsọ a sitere n’ike mmụọ nsọ.—Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16.

23. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

23 Anyị na-ebi n’oge ndị dị mkpa, ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ na-ekwe nkwa na ‘a ga-ezi ọtụtụ ndị dị iche iche ihe n’ụzọ nile nke Jehova n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a [nke anyị na-ebi n’ime ya].’ (Aịsaịa 2:2, 3) Olee otú e si na-enye ozizi nke a? Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji rite uru site n’oké usoro ihe omume izi ihe Jehova na-aga n’ihu ugbu a ma kere òkè na ya? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị dị otú ahụ n’isiokwu na-esonụ.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú Jehova si ghọọ Nna, Onye Nkụzi, na Di?

◻ Gịnị ka Jehova na-akụzi banyere “mkpụrụ” ahụ?

◻ Olee nkụzi Chineke dị mkpa nke anyị na-aghaghị iji mee ihe?

◻ Olee otú Jehova si ezi ihe?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ịkpọlite ada Jaịrọs n’ọnwụ nyere ihe ndabere maka ikwere ná nkwa mbilite n’ọnwụ nke Jisọs kwere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya