ISI NKE 2
Ịghọta Ọrụ Kraịst Na-arụ Ka Nzube Chineke Mezuo
“NÁ MMALITE, Chineke kere eluigwe na ụwa.” Ihe niile o kere “dị nnọọ mma.” (Jen. 1:1, 31) Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, isi Adam na Iv nupụụrụ Chineke mere ka ụmụ mmadụ ghara ịna-enwe ụdị obi ụtọ ahụ. Ma, Jehova agbanwebeghị ihe o zubere maka ụwa na ụmụ mmadụ. O kwuru na ọ ga-anapụta ụmụ Adam ndị rubeere ya isi. Ụmụ mmadụ ga-amaliteghachi ife Chineke otú ọ chọrọ. Chineke ga-ebibikwa Setan na ọrụ ọjọọ ya niile. (Jen. 3:15) N’oge ahụ, ihe niile ‘ga-adị nnọọ mma.’ Jehova ga-esi n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, mee ihe a o kwuru. (1 Jọn 3:8) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịghọta ọrụ Kraịst na-arụ iji mezuo nzube Chineke.—Ọrụ 4:12; Fil. 2:9, 11.
ỌRỤ KRAỊST NA-ARỤ
2 Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ọrụ Kraịst na-arụ iji mezuo nzube Chineke, anyị ga-achọpụta na ọ na-arụ ọtụtụ ihe. Jizọs bụ Onye Mgbapụta ụmụ mmadụ, Nnukwu Onye Nchụàjà, na Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụkwa Eze nke Alaeze Chineke ugbu a. Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche n’ọrụ ndị a ọ na-arụ, obi ga na-atọkwu anyị ụtọ na Chineke mere Jizọs onyeisi anyị, anyị ga-ahụkwukwa Jizọs Kraịst n’anya. Baịbụl kọwara ụfọdụ ọrụ Jizọs na-arụ.
Ọ bụ Jizọs ka Jehova ga-esi n’aka ya meere ụmụ mmadụ ihe ndị o zubere imere ha
3 Mgbe Kraịst na-eje ozi n’ụwa, o doro anya na ọ bụ ya ka a ga-eji mee ka Chineke na ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi dịghachi ná mma. (Jọn 14:6) Ebe Jizọs bụ Onye Mgbapụta anyị, o ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ọtụtụ mmadụ. (Mat. 20:28) O doro anya na Jizọs bụ onye e ji ama atụ ma a bịa n’ịkpa àgwà otú Chineke chọrọ. Jehova ga-esikwa n’aka ya mezuo ihe o zubere imere ụmụ mmadụ. Ọ bụkwa naanị ya ka Chineke ga-esi n’aka ya mee ka ụmụ mmadụ na Chineke dịghachi ná mma. (Ọrụ 5:31; 2 Kọr. 5:18, 19) Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ na mkpọlite a kpọlitere ya n’ọnwụ emeela ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa.
4 Ebe Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà, o nwere ike “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.” Ọ na-ekpuchikwara ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa mmehie ha. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-apụghị imere anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.” Pọl gwaziri ndị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst ka ha jiri ndokwa a Chineke mere mee ka ha na Chineke dịghachi ná mma. Ọ sịrị: “Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu bịaruo ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ nso, ka e wee meere anyị ebere, nwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.”—Hib. 4:14-16; 1 Jọn 2:2.
5 Jizọs bụkwa Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’oge ndịozi, Ndị Kraịst enweghị mmadụ ọ bụla bụ́ onyeisi ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị taa. Jizọs ji mmụọ nsọ na ndị okenye na-eduzi ọgbakọ ya. Ndị okenye ndị a ga-aza ya na Nna ya ajụjụ maka otú ha si lekọta ìgwè atụrụ Chineke. (Hib. 13:17; 1 Pita 5:2, 3) Jehova buru amụma gbasara Jizọs, sị: “Lee! Emewo m ya onye àmà nke mba dị iche iche, meekwa ya onye ndú na ọchịagha nke mba dị iche iche.” (Aịza. 55:4) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe gosiri na amụma a mezuru n’isi ya. Ọ gwara ha, sị: “Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—Mat. 23:10.
6 Otu n’ime ihe Jizọs kwuru gosiri na o ji obi ya dum chọọ inyere anyị aka. Ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Jizọs Kraịst ji obiọma na-eduzi ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma na-eme ka ahụ́ na-eru anyị ala. O si otú a egosi na ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma” otú Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, bụ.—Jọn 10:11; Aịza. 40:11.
7 N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ gwara ha ọrụ ọzọ Jizọs Kraịst na-arụ. Ọ sịrị: “N’ihi na ọ ghaghị ịchị dị ka eze ruo mgbe Chineke debere ndị iro ya niile n’okpuru ụkwụ ya. Ma mgbe a ga-edoworị ihe niile n’okpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ahụ n’onwe ya ga-edokwa onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe niile n’okpuru ya, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.” (1 Kọr. 15:25, 28) Tupu Jizọs abịa n’ụwa, ọ bụ “onye ọkà ọrụ” Chineke, ọ bụkwa ya bụ onye mbụ Chineke kere. (Ilu 8:22-31) Mgbe Chineke zitere ya n’ụwa, o mere uche Chineke mgbe niile. O diri ọnwụnwa kacha taa akpụ, rubekwara Nna ya isi ruo ọnwụ. (Jọn 4:34; 15:10) Ebe ọ bụ na Ọkpara Chineke rubeere Nna ya isi ruo ọnwụ, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe. O mechakwara chie ya Eze n’Alaeze eluigwe. (Ọrụ 2:32-36) N’ihi ya, Chineke nyere ya ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụ, ya bụ, iduru ọtụtụ ndị mmụọ ozi ya dị ike bịa n’ụwa bibie ma ọchịchị ụmụ mmadụ ma ndị ajọ omume. (Ilu 2:21, 22; 2 Tesa. 1:6-9; Mkpu. 19:11-21; 20:1-3) N’oge ahụ, Alaeze Chineke ga-abụ naanị ọchịchị ga na-achị ụwa niile.—Mkpu. 11:15.
OTÚ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ GHỌTARA ỌRỤ DỊ MKPA KRAỊST NA-ARỤ
8 Jizọs Kraịst, bụ́ Onye Anyị Na-eṅomi, zuru okè. Chineke enyela ya ikike ka ọ na-elekọta anyị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ na-elekọta anyị nke ọma, anyị kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma na-eso nzukọ ya ụkwụ na ụkwụ.
9 Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs ghọtara ihe Kraịst na-arụ ka nzube Chineke mezuo. Otú ha si gosi na ha ghọtara ya bụ na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ, kwerekwa ka Kraịst na-edu ha. Ha mekwara ihe Jizọs si n’ike mmụọ nsọ gwa ha mee. (Ọrụ 15:12-21) Pọl kwuru gbasara otú Ndị Kraịst e tere mmanụ si dịrị n’otu. Ọ sịrị: “N’ikwu eziokwu, ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst. Ọ bụ site n’aka ya ka ahụ́ dum, site n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa, dị ka ịrụ ọrụ nke akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu si dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.”—Efe. 4:15, 16.
10 Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ana-erubere Kraịst isi ma na-emekọ ihe ọnụ, anyị na Chineke ga-adịkwu ná mma, onye ọ bụla ga na-ahụkwa ibe ya n’anya n’ihi na ịhụnanya bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Jọn 10:16; Kọl. 3:14; 1 Kọr. 12:14-26.
11 Ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a na-emezu amụma ndị e buru na Baịbụl. Ha na-eme ka o doo onye ọ bụla anya na kemgbe afọ 1914, Jizọs Kraịst abụrụla Eze n’Alaeze Chineke. Ọ na-achị ugbu a n’etiti ndị iro ya. (Ọma 2:1-12; 110:1, 2) Olee otú nke a si gbasa ndị nọ n’ụwa ugbu a? N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ebibi ndị iro ya niile, si otú ahụ gosi na ọ bụ ya bụ Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile. (Mkpu. 11:15; 12:10; 19:16) N’oge ahụ, Jehova ga-azọpụta ndị nọ n’aka nri Kraịst, si otú ahụ mezuo ihe ahụ o kwuru mgbe Adam na Iv nupụchaara ya isi. (Mat. 25:34) Obi dị anyị ụtọ na anyị aghọtala ọrụ Kraịst na-arụ ka nzube Chineke mezuo. Ka anyị niile gbasie mbọ ike na-adị n’otu ma kwe ka Kraịst na-edu anyị n’ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile n’oge ikpeazụ a.