ISI NKE 57
Gịnị Ka I Kwesịrị Ime ma I Mee Mmehie Dị Oké Njọ?
N’agbanyeghị na ị na-agbasi mbọ ike ka ị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova n’ihi na ị hụrụ ya nnọọ n’anya, ọ ka nwere mgbe ụfọdụ i nwere ike ime ihe na-adịghị ya mma. Ma, mmehie ụfọdụ dị njọ karịa ibe ha. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) I mee mmehie dị oké njọ, cheta na Jehova ka hụrụ gị n’anya. Ọ dị njikere ịgbaghara gị, dịkwa njikere inyere gị aka.
1. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova gbaghara anyị?
Obi na-agbawa ndị hụrụ Jehova n’anya ma ha chọpụta na ha emeela mmehie dị oké njọ. Ma, nkwa Jehova kwere ndị ya na-akasi ha obi. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” (Aịzaya 1:18) Ọ bụrụ na anyị esi n’ala ala obi anyị chegharịa, Jehova ga-agbaghara anyị kpamkpam. Olee otú anyị si egosi na anyị echegharịala? Ihe anyị mere na-ewute anyị nke ukwuu, anyị akwụsị ime ya ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. Anyị na-agbazi mbọ kwụsị ịna-eche ma ọ bụ ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị mee ihe ọjọọ ahụ ọzọ. Anyị na-agbalịkwa na-ebi ndụ dị mma otú Jehova chọrọ.—Gụọ Aịzaya 55:6, 7.
2. Olee otú Jehova si eji ndị okenye enyere anyị aka mgbe anyị mere mmehie?
Ọ bụrụ na anyị eme mmehie dị oké njọ, Jehova na-agwa anyị ka anyị “kpọọ ndị okenye ọgbakọ.” (Gụọ Jems 5:14, 15.) Ndị okenye ọgbakọ hụrụ ma Jehova ma ndị na-efe ya n’anya. A zụọla ha otú ha ga-enwe ike inyere anyị aka ka anyị na Jehova dịghachi ná mma.—Ndị Galeshia 6:1.
Olee otú ndị okenye si enyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ? Okenye abụọ ma ọ bụ atọ ga-eji Baịbụl gosi anyị ihe mere ihe ahụ anyị mere ji dị njọ. Ha ga-atụkwara anyị aro ndị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ime mmehie ahụ ọzọ. Ha nwekwara ike ịgwa anyị ihe ndị anyị na-agaghị na-eme n’ọgbakọ ruo mgbe anyị na Jehova dịghachichara ná mma. Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ ma jụ ichegharị, ndị okenye ga-ekewapụ onye ahụ n’ọgbakọ ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ghara imewe ka ya.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo otú Jehova si enyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ ka i nwee ike na-ekele ya maka ya.
3. Ikwupụta mmehie anyị na-eme ka anyị na Jehova dịghachi ná mma
Mmehie ọ bụla anyị mere na-ewute Jehova, ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ikwupụtara ya mmehie anyị. Gụọnụ Abụ Ọma 32:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere ikwupụtara Jehova mmehie anyị ji dị mma kama izochiwe ya?
E wezụga ikwupụtara Jehova mmehie anyị, ihe ọzọ ga-eme ka ahụ́ ruo anyị ala bụ ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, olee otú ndị okenye si nyere Canon aka ịlọghachikwute Jehova?
Anyị kwesịrị ịgwa ndị okenye ihe niile merenụ. Ha agaghị egbu anyị egbu. Kama, ha ga-enyere anyị aka. Gụọnụ Jems 5:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ịgwa ndị okenye ihe niile merenụ ga-esi mee ka inyere anyị aka dịrị ha mfe?
Kwupụta mmehie gị, gwa ndị okenye eziokwu, nabatakwa aka Jehova na-enyere gị maka na ọ hụrụ gị n’anya
4. Jehova na-emere ndị mere mmehie ebere
Ọ bụrụ na onye mere mmehie dị oké njọ ajụ ichegharị, a ga-ekewapụ ya n’ọgbakọ. Anyị na ya agaghịzi na-akpakọrịta. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 5:6, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
E nwere ike iji onye mere mmehie dị oké njọ nke nọ n’ọgbakọ tụnyere ihe na-eko achịcha nke na-eme ka ntụ ọka koo. Gịnị nwere ike ime ndị nọ n’ọgbakọ ma ha na ya na-akpakọrịta?
Ndị okenye na-eme ebere ka Jehova, bụ́ onye na-emere ndị mmehie na-ezughị okè ebere. Ọ bụ ya mere ha ji agakwuru ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ ka ha nyere ha aka. E nweela ọtụtụ ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ, ha emechaa lọghachi. Ọ bụ eziokwu na ịdọ aka ná ntị ahụ wutere ha, ma o mere ka ha chegharịa.—Abụ Ọma 141:5.
Olee otú otú Jehova si emeso ndị mere mmehie ihe si egosi na ọ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, na-eme ebere, hụkwa anyị n’anya?
5. Jehova na-agbaghara anyị ma anyị chegharịa
Jizọs mere ihe atụ gosiri anyị otú obi na-adị Jehova ma mmadụ chegharịa. Gụọnụ Luk 15:1-7. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka ihe ebe a kwuru na-akụziri gị gbasara Jehova?
Gụọnụ Ezikiel 33:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka mmadụ ga-eme nke ga-egosi na o chegharịala n’eziokwu?
Jehova na-elekọta atụrụ ya otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ na-eme
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ụjọ ha bụ na ndị okenye ga-ekewapụ ha n’ọgbakọ ma ha gwa ha mmehie ha mere.
Gịnị ka ị ga-agwa onye na-atụ ụdị ụjọ a?
NCHỊKỌTA
Anyị mee mmehie dị oké njọ ma si n’ala ala obi anyị chegharịa, kpebiekwa na anyị agaghị eme ihe ahụ ọzọ, Jehova ga-agbaghara anyị.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere o ji dị mma ka anyị kwupụtara Jehova mmehie anyị?
Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị?
Anyị mee mmehie dị oké njọ, gịnị mere anyị ji kwesị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú Jehova si meere otu nwoke ụdị ebere Aịzaya 1:18 kwuru gbasara ya.
Ya Emekwala Gị Obi Abụọ ma Jehova Ọ̀ Ga-emere Gị Ebere (5:02)
Olee otú ndị okenye si agba mbọ ka ha nyere ndị mere mmehie dị oké njọ aka?
Chọpụta otú e si egosi ndị mere mmehie ma jụ ichegharị ịhụnanya ma na-emere ha ebere.
“Otú Ndị Okenye Nwere Ike Isi Enyere Ndị E Kewapụrụ n’Ọgbakọ Aka” (Ụlọ Nche, Ọgọst 2024)
Gụọ isiokwu bụ́ “Achọpụtara M na M Kwesịrị Ịlọghachikwute Jehova” ka ị hụ ihe mere otu nwoke hapụrụ ọgbakọ ji kwuo na ọ bụ Jehova kpọghachiri ya.