Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Nanị Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?
“O nweere onwe ya ịlụ di ọ na-achọ; ma ọ bụ nanị n’ime Onyenwe anyị. Ma ngọzi [“obi ụtọ,” NW] dịkarịrị ya ma a sị na ọ nọgidere otú ọ dị.”—1 NDỊ KỌRINT 7:39, 40.
1. Olee otú Akwụkwọ nsọ si kọwaa Jehova, gịnịkwa ka o meworo maka ihe nile o kere eke?
JEHOVA bụ “Chineke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Dị ka Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” ọ na-eme ka aka ihe nile o kere eke nwere ọgụgụ isi—ndị mmadụ na ndị mmụọ—ruo kpọmkwem n’ihe dị ha mkpa iji na-enwe obi ụtọ n’ozi ya. (Jemes 1:17) Banyere nke ahụ, nnụnụ nke na-abụ abụ n’uju, nwa nkịta nke na-amagharị n’obi ụtọ, ma ọ bụ azụ dolphin nke na-egwukarị egwu, ha nile na-agba àmà na Jehova kere ụmụ anụmanụ n’otu aka ahụ ka ha na-enwe obi ụtọ ná ndụ n’ebe obibi ha dị iche iche. Onye ọbụ abụ ahụ garuru ọbụna n’ókè nke ikwu n’ụzọ ịbụ abụ na “afọ na-eju osisi nile nke Jehova; bụ́ osisi cedar nke Lebanọn, nke ọ kụworo.”—Abụ Ọma 104:16.
2. (a) Gịnị na-egosi na Jisọs nwere obi ụtọ n’ime uche Nna ya? (b) Olee ihe ndị mere ndị na-eso ụzọ Jisọs ji nwee obi ụtọ?
2 Jisọs Kraịst bụ ‘nnwupụ nke ebube na onyinyo nke ụdịdị Chineke.’ (Ndị Hibru 1:3) Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na a kpọrọ Jisọs ‘onye nanị ya bụ onye dị ike, onye bụkwa onye obi ụtọ.’ (1 Timoti 6:15) O guzobeere anyị ihe nlereanya dị ịtụnanya otú ime uche Jehova pụrụ isi na-eweta afọ ojuju karịa ihe oriri, na-akpali ezi ọṅụ. Jisọs gosikwara na a pụrụ inwe ọṅụ mgbe a na-eme omume n’egwu Chineke, ya bụ, site n’oké nsọpụrụ na egwu dị mma nke imejọ Ya. (Abụ Ọma 40:8; Aịsaịa 11:3; Jọn 4:34) Mgbe 70 ndị na-eso ụzọ “weere ọṅụ” lọta mgbe ha mesịrị njem nkwusa Alaeze, Jisọs n’onwe ya ‘nwere obi ụtọ nke ukwuu n’ime mmụọ nsọ.’ Mgbe o kwupụtasịịrị Nna ya ọṅụ ya n’ekpere, o chigharịkwuuru ndị na-eso ụzọ ya ma sị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya na-ahụ ihe unu na-ahụ: n’ihi na asị m unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe unu onwe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha; na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”—Luk 10:17-24.
Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Obi Ụtọ
3. Olee ụfọdụ ihe ndị mere a ga-eji nwee obi ụtọ?
3 Ọ̀ bụ na anya anyị ekwesịghị inwe obi ụtọ ịhụ ihe ndị anyị na-ahụ ugbu a, ná mmezu nke Okwu Jehova na nzube ya n’oge ọgwụgwụ nke a? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe oké ọṅụ n’ịghọta amụma nile ndị amụma na ndị eze oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi, ndị dị ka Aịsaịa, Daniel, na Devid, na-apụghị ịghọta? Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe obi ụtọ i jere Chineke obi ụtọ ahụ, bụ́ Jehova ozi, n’okpuru nduzi dị ike nke Onye Ọchịchị ahụ na-enwe obi ụtọ, bụ́ Eze anyị Jisọs Kraịst? N’ezie anyị nwere!
4, 5. (a) Iji nọgide n’ozi Jehova, gịnị ka anyị na-aghaghị izere? (b) Olee ihe ụfọdụ ndị na-akpata obi ụtọ, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka nke a na-ewelite?
4 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-enwe obi ụtọ n’ozi Jehova, anyị ekwesịghị ime ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke onwe anyị maka inwe obi ụtọ dabere n’echiche nke ụwa. Ndị a pụrụ ikpuchi echiche anyị ngwa ngwa n’ihi na ha gunyere akụ na ụba, ụzọ ndụ nke na-egbukepụ egbukepụ, ụlọ mara oké mma, na ihe ndị yiri ha. “Obi ụtọ” ọ bụla e wukwasịrị n’elu ụdị ihe ndị a agaghị adịgide, n’ihi na ụwa nke a na-agabiga agabiga.—1 Jọn 2:15-17.
5 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ghọtara na inweta ihe mgbaru ọsọ nke ụwa agaghị eweta ezi obi ụtọ. Nanị Nna anyị nke eluigwe na-enye ihe ime mmụọ na nke anụ ahụ ndị na-akpata ezi obi ụtọ nke ndị ohu ya. Lee ka anyị si nwee obi ekele maka nri nke ime mmụọ ọ na-enye anyị site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche”! (Matiu 24:45-47) Anyị nwekwara obi ekele maka nri nke anụ ahụ na ihe ndị ọzọ anyị nwetara site n’aka ịhụnanya Chineke. Mgbe ahụkwa, e nwere onyinye ahụ mara mma nke alụmdi na nwunye na ọṅụ ndị na-eso ná ndụ ezinụlọ. Ka a sịnụ ihe mere e ji kọwaa ọchịchọ sitere n’ala ala obi nke Naomi maka ndị nwunye ụmụ ya ndị di ha nwụworo n’okwu ndị dị otú a: “Jehova mee ka unu chọta izu ike, nwanyị ọ bụla n’ụlọ di ya.” (Rut 1:9) Ya mere alụmdi na nwunye bụ otu ụzọ nke a pụrụ isi nweta obi ụtọ. Ma alụmdi na nwunye ọ̀ bụ nanị ụzọ bụ isi na-emeghepụ ụzọ maka ndụ obi ụtọ? Ọ dị ndị na-eto eto mkpa karịsịa iji nlezi anya nyochaa ma nke a ọ̀ dị otú a.
6. Dị ka Jenesis si kwuo, olee nzube bụ isi nke ndokwa alụmdi na nwunye?
6 Mgbe ọ na-akọ banyere mmalite nke alụmdi na nwunye, Bible kwuru, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, n’onyinyo Chineke ka o kere ya: nwoke na nwanyị ka o kere ha. Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:27, 28) Site na Jehova iguzobe alụmdi na nwunye, e jiri Adam mee ihe ime ka e nwekwuo ụmụ mmadụ e kere eke dị ndụ, ya bụ, ịmụba agbụrụ mmadụ. Ma e nwere ihe ndị ọzọ karịrị nke a banyere alụmdi na nwunye.
“Ọ Bụ Nanị n’Ime Onyenwe Anyị”
7. Otu ihe dị aṅaa a chọrọ maka alụmdi na nwunye ka otu nna ochie na-ekwesị ntụkwasị obi tinyere mgbalị dị ukwuu imezu?
7 Ebe ọ bụ na Jehova bụ onye malitere alụmdi na nwunye, anyị ga-atụ anya na ọ ga-eguzobe ụkpụrụ dị iche iche maka alụmdi na nwunye nke ga-arụpụta obi ụtọ nke ndị ohu ya. N’oge ndị nna ochie ndị Juu, a katọrọ n’ụzọ siri ike omume nke ndị Juu ịlụ ndị na-abụghị ndị na-efe Jehova. Abraham mere ka ohu ya bụ Elieza jiri Chineke ṅụọrọ ya iyi na ya agaghị alụtara nwa ya bụ Aịsak nwunye site na ndị kenean. Elieza gara ogologo njem ma were ezi nlezianya gbasoo ntụziaka nile nke Abraham iji chọta ‘nwanyị Jehova họpụtaworo nye nwa nke onyenwe ya.’ (Jenesis 24:3, 44) Ya mere Aịsak lụrụ Rebeka. Mgbe nwa ha nwoke bụ Ịsọ si n’etiti ndị Het na-ekpere arụsị họrọ ndị nwunye, ndị nwunye ndị a “ghọọrọ Aịsak, ghọọkwara Rebeka, ihe mmụọ ilu.”—Jenesis 26:34, 35; 27:46: 28:1, 8.
8. Ihe mgbochi dị aṅaa ka e tinyere n’alụmdi na nwunye site n’Iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
8 N’okpuru Iwu ọgbụgba ndụ, e gbochiri ịlụ nwoke ma ọ bụ nwanyị sitere ná mba ndị Kenean ndị a kpọtụrụ aha kpọmkwem. Jehova nyere ndị ya iwu, sị: “Gị na ha alụrịtakwala nwunye; enyela nwa ya nwoke nwa gị nwanyị, ekurukwala nwa ya nwanyị nye nwa gị nwoke. N’ihi na ọ ga-ewezuga nwa gị nwoke n’iso m n’azụ, ka ha wee fee chi ọzọ: iwe Jehova ga-adịkwa ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa gị ngwa ngwa.”—Deuterọnọmi 7:3, 4.
9. Ndụmọdụ dị aṅaa banyere alụmdi na nwunye ka Bible nyere ndị Kraịst?
9 Ọ bụghị ihe iju anya na e nwere iwu ndị yiri ndị ahụ megide ịlụ ndị na-adịghị efe Jehova taa n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, n’ihi na unu na ha dị iche: n’ihi na olee nkekọ ezi omume na imebi iwu na-ekekọ? ma ọ bụ olee nnwekọ ìhè na ọchịchịrị na-enwekọ? Ọzọ, olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ? ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe na-ekerita?” (2 Ndị Kọrint 6:14, 15) A pụrụ iji ndụmọdụ ahụ mee ihe n’ụzọ dị iche iche, n’ezie o metụtakwara alụmdi na nwunye. Ntụziaka Pọl nke e nyere ndị ohu Jehova nile raara onwe ha nye pụtara ìhè bụ na ha kwesịrị ịtụle ịlụ mmadụ “nanị ma ọ bụrụ na ya na Onyenwe anyị dị n’otu.”—1 Ndị Kọrint 7:39, NW, ntụaka ala ala peji.
Enweghị Ike Ịlụ “n’Ime Onyenwe Anyị”
10. Gịnị ka ọtụtụ ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-eme, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebili?
10 Ọtụtụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ahọrọwo ịgbaso ihe nleranya nke Jisọs Kraịst site n’ịzụlite onyinye nke ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. Mgbe ahụkwa, n’ihi enweghị ike ịchọta ka ọ dị ugbu a onye na-atụ egwu Chineke dị ka onye a ga-eso baa n’alụmdi ma ọ bụ nwunye, wee si otú a lụọ “n’ime Onyenwe anyị,” ọtụtụ ndị Kraịst na-erube isi n’iwu Chineke etinyewo ntụkwasị obi ha na Jehova ma nọrọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye kama ịlụ onye na-ekweghị ekwe. Mmụọ Chineke na-amịpụta n’ime ha ụdị mkpụrụ ndị dị ka ọṅụ, udo, ikwesị ntụkwasị obi, ogologo ntachị obi, na imeru ihe n’okè, na-enyere ha aka ịnọgide na-adị ọcha na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’etiti ndị na-enwe ihe ịga nke ọma n’izute ule nke nsọpụrụ Chineke bụ ọtụtụ ụmụnna anyị nwanyị ndị Kraịst, bụ́ ndị anyị nwere nkwanye ùgwù miri emi n’ebe ha nọ. N’ala dị iche iche, ọnụ ọgụgụ ha karịrị nke ndị bụ ụmụnna nwoke, wee si otú a nwee òkè ka ukwuu n’ọrụ ikwusa ozi ọma. N’ezie, “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] na-enye okwu: ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ bụ́ usuu bara ụba.” (Abụ Ọma 68:11) N’eziokwu, ọtụtụ ndị ohu Chineke na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ma ndị ikom ma ndị inyom na-anọgide na-ejidesi ikwesị ntụkwasị obi na-ebe Chineke nọ ike n’ihi na ha ‘tụkwasịrị Jehova obi ha dum, ọ na-emekwa ka ụzọ ha nile zie ezie.’ (Ilu 3:5, 6) Ma ndị ahụ na-apụghị ịlụta di ma ọ bụ nwunye ugbu a “n’ime Onyenwe anyị” hà pụrụ inwe obi ụtọ?
11. Gịnị ka ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi nsọpụrụ ha maka ụkpụrụ Bible ga-ejide n’aka?
11 Ka anyị cheta na anyị bụ Ndịàmà nke Chineke obi ụtọ, bụ́ Jehova, na anyị na-ejekwa ozi n’okpuru Onye Ọchịchị na-enwe obi ụtọ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ya mere ọ bụrụ na nsọpụrụ anyị maka iwu ndị ahụ doro anya nke e depụtara na Bible ga-akpali anyị ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi enweghị ike ichọta onye anyị ga-alụ n’ime “Onyenwe anyị,” ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na Chineke na Kraịst ga-ahapụ anyị n’enweghị obi ụtọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ihi ya, anyị aghaghị ikwubi na ọ bụ ihe kwere mee inwe obi ụtọ dị ka onye Kraịst n’ọnọdụ nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. Jehova pụrụ ime ka anyị nwee obi ụtọ n’ezie ma anyị lụrụ di na nwunye ma ọ bụ na anyị alụghị.
Ụzọ Bụ Isi nke Ezi Obi Ụtọ
12. Olee ihe ọnọdụ nke ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi na-egosi banyere alụmdi na nwunye?
12 Alụmdi na nwunye abụghị nanị ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ nye ndị ohu Chineke nile. Were, dị ka ihe atụ, ndị mmụọ ozi. Tupu iju mmiri, ụfọdụ ndị mmụọ ozi zụlitere ọchịchọ ndị na-abụghị ka e si kee ndị bụ mmụọ, wee ghọọ ndị na-enwekwaghị afọ ojuju na ha apụghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma nwoghara ahụ nke mmadụ iji lụrụ ndị inyom dị ka nwunye. N’ihi na ndị mmụọ ozi ndị a si otú a ‘hapụ ebe obibi nke aka ha’ Chineke ‘edebewokwa ha n’agbu ebighị ebi n’okpuru ọchịchịrị nye ikpe nke oké ụbọchị ahụ.’ (Jud 6; Jenesis 6:1, 2) N’ụzọ doro anya, Chineke edokwaghị maka ndị mmụọ ozi ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ya mere alụmdi na nwunye apụghị ịbụ ụzọ bụ isi nke obi ụtọ ha.
13. N’ihi gịnị ka ndị mmụọ ozi dị nsọ ji nwee obi ụtọ, gịnịkwa ka nke a na-egosi nye ndị ohu Chineke nile?
13 Ma, ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nwere obi ụtọ. Jehova tọrọ ntọala nile nke ụwa “maka nnwekọ obi ụtọ n’otu nke kpakpando ụtụtụ nile na itikọ mkpu otuto ọnụ nke ụmụ [ndị mmụọ ozi] Chineke.” (Job 38:7, The New Jerusalem Bible) N’ihi gịnị ka ndị mmụọ ozi dị nsọ ji nwee obi ụtọ? N’ihi na ha nọ na-ejere Jehova Chineke ozi mgbe nile, “na-eme okwu ya” iji mezuo ya ngwa ngwa. Ha na-enwe obi ụtọ “n’ime ihe na-atọ ya ụtọ.” (Abụ Ọma 103:20, 21, NW, ntụaka ala ala peji) Ee, obi ụtọ nke ndị mmụọ ozi dị nsọ na-abịa site n’iji ntụkwasị obi jeere Jehova ozi. Nke ahụ bụ ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ nyekwa ụmụ mmadụ. N’ihi nke ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ lụrụ dị ma ọ bụ nwunye ji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi ugbu a agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye mgbe e siri n’ọnwụ kpọlite ha ịga ná ndụ eluigwe, ma ha ga-enwe obi ụtọ dị ka ndị mmụọ e kere eke na-eme uche Chineke. Mgbe ahụ, ma ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ha alụghị, ndị ohu Jehova nile na-erube isi pụrụ inwe obi ụtọ n’ihi na isi ihe ndabere maka obi ụtọ bụ iji ntụkwasị obi jeere Onye Okike ozi.
“Ihe Ncheta na Aha Dị Mma Karịa Ụmụ Ndị Ikom, Karịakwa Ụmụ Ndị Inyom”
14. Nkwa amụma dị aṅaa ka e nyere ndị ọnozi n’Israel oge ochie, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji yie ihe ọhụrụ?
14 Ọbụnadị ọ bụrụ na onye Kraịst na-eguzosi ike n’ihe alụghị di ma ọ bụ nwunye, Chineke pụrụ inye onye ahụ obi ụtọ. A pụrụ inweta agbamume site n’okwu ndị ahụ Chineke gwara ndị ọnozi nọ n’Israel oge ochie n’ụzọ amụma sị: “N’ihi na otú a ka Jehova sịrị ndị ọnozi ndị na-edebe ụbọchị izu ike m nile, ndi họpụtakwara ihe tọrọ m ụtọ, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike: M ga-enye ha n’ụlọ m na n’ime mgbidi m nile ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom, karịakwa ụmụ ndị inyom; aha ebighị ebi ka m ga-enye ha n’otu n’otu, nke a na-agaghị ebipụ.” (Aịsaịa 56:4, 5) Mmadụ pụrụ ichewori na a ga-ekwe ha nkwa nwunye na ụmụntakịrị iji wee mee ka aha ha dịgide adịgide. Ma e kwere ha nkwa “ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom, karịakwa ụmụ ndị inyom”—aha na-adịgide adịgide n’ime ụlọ Jehova.
15. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mmezu nke Aịsaịa 56:4, 5?
15 Ọ bụrụ na e were ndị ọnozi ndị a dị ka onyinyo amụma nke na-agụnye “Israel nke Chineke,” ha nọchiri anya ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nwetara ọnọdụ na-adịgide adịgide n’ime ụlọ, ma ọ bụ ụlọ ukwu ime mmụọ nke Jehova. (Ndị Galetia 6:l6) Obi abụọ adịghị ya, na amụma nke a ga-emezukwa n’ụzọ efu n’ebe ndị ọnozi nke Israel oge ochie nọ, bụ́ ndị a ga-akpọlite ná mbilite n’ọnwụ. Ọ bụrụ na ha anakwere àjà mgbapụta Kraịst ma nọgide na-ahọrọ ihe na-atọ Jehova ụtọ, ha ga-anata “aha ebighị ebi” n’ụwa ọhụrụ nke Chineke. Nke a pụkwara imezu n’ebe ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ n’oge ọgwụgwụ a nọ, ndị hapụrụ alụmdi na nwunye na ịbụ nna na nne iji rara onwe ha nye n’ije ozi Jehova karị. (Jọn 10:16) Ụfọdụ n’ime ndị a pụrụ ịnwụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, n’amụghị ụmụ. Ma ọ bụru na ha kwesịrị ntụkwasị obi, ná mbilite n’ọnwụ ha ga-anata “aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom, karịakwa ụmụ ndị inyom”—aha nke “a na-agaghị ebipụ” n’usoro ihe ọhụrụ.
Alụmdi na Nwunye Abụghị Nanị Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ
16. N’ihi gịnị ka a pụrụ ikwu na alụmdi na nwunye anaghị ewetakarị obi ụtọ?
16 Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ nanị n’alụmdi na nwunye ka a ga-esi nweta obi ụtọ. Otú ọ dị, a ghaghị ikwenye na ọbụna n’etiti ndị ohu Jehova taa, alụmdi na nwunye adịghị eweta obi ụtọ mgbe nile. Ọ na-agwọta nsogbu ụfọdụ ma ọtụtụ mgbe ọ na-akpata nsogbu ndị ọzọ karịa nke ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe. Pọl sịrị na alụmdi na nwunye na-eweta “mkpagbu n’anụ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 7:28) A na-enwe mgbe ụfọdụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-enwe ‘nchegbu’ na-abụ onye ‘e kewara ekewa.’ Ọ na-esikarịrị ya ike ‘ịnọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.’—1 Ndị Kọrint 7:33-35.
17, 18. (a) Gịnị bụ ihe ụfọdụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kọworo? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere, n’ihi gịnịkwa ka o ji baa uru iji ya mee ihe?
17 Ma ịlụ di ma ọ bụ nwunye na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye bụcha onyinye sitere n’aka Chineke. (Rut 1:9; Matiu 19:10-12) Otú ọ dị, iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ dị mkpa ichezi echiche nke ọma. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-akọ na ọtụtụ Ndịàmà na-alụ di ma ọ bụ nwunye mgbe ha ka bụ nwata, mgbe ụfọdụ na-aghọ ndị mụrụ ụmụ tupu ha adị njikere ibu ibu ọrụ na-esi na ya apụta. Ụfọdụ n’ime alụmdi na nwunye ndị dị otú ahụ na-adakpọ. Ụfọdụ di na nwunye na-anagide nsogbu ha, ma alụmdi na nwunye ha ewetabereghị ha obi ụtọ. Dị ka otu onye England bụ́ onye ọkà n’ime ihe nkiri, bụ́ William Congreve dere, ndị na-eme ngwa ngwa ịlụ di ma ọ bụ nwunye “pụrụ ichegharị mgbe ha tụsaara ahụ.”
18 Ndị nlekọta sekit akọwo na ụfọdụ ụmụnna nwoke ndị na-eto eto na-ala azụ itinye akwụkwọ maka ozi Betel ma ọ bụ iwepụta onwe ha maka Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi n’ihi na a na-achọ ka ha nọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ọbụna ruo afọ ole na ole. Ma Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ ka a ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye tupu mmadụ ‘agafee oge ntoju nke ntorobịa,’ ya bụ, ichere ruo mgbe mmalite agụụ inwe mmekọahụ mbụ dajụsịrị. (1 Ndị Kọrint 7:36-38, NW) Afọ nile a na-adị ndụ dị ka onye meworo okenye nke na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enyere mmadụ aka inwe ahụmahụ dị oké ọnụ ahịa na nghọta, na-eme ka mmadụ nọrọ n’ọnọdụ ka mma ịhọrọ onye ga-abụ di ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụ ime mkpebi a tụlere nke ọma ịnọdụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye.
19. Olee otú anyị pụrụ isi lee ihe anya ma ọ bụrụ na anyị enweghị ezi mkpa nke ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
19 Ọtụtụ n’ime anyị agafewo oge ntoju ntorobịa, ya na agụụ mmekọahụ ya siri ike. Anyị pụrụ ịtụgharị uche mgbe ụfọdụ ná ngọzi nile nke alụmdi na nwunye ma nwee onyinye nke alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ezie. Jehova pụrụ ịhụta na anyị na-efe ya n’ụzọ dị mma n’ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye na ọ dịghị anyị mkpa n’ezie ịbanye n’alụmdi ma ọ bụ nwunye, bụ́ nke pụrụ ịchọ ka anyị hapụ ihe ùgwù ụfọdụ n’ozi ya. Ọ bụrụ na alụmdi na nwunye abụghị mkpa anyị, na anyi enwetaghịkwa n’onwe anyị onye anyị ga-alụ, Chineke pụrụ inwe ihe ọzọ ọ kwadebeere anyị. Ya mere ka anyị nwee okwukwe na ọ ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa. Obi ụtọ kasị ukwuu na-abịa site n’iji obi umeala nakwere ihe ndị yiri ihe bụ uche Chineke maka anyị, ọbụna dị ka ụmụnna ndị Juu “kpuchiri ọnụ ha wee nye Chineke otuto” mgbe ha ghọtara na o nyewo ndị Jentail nchegharị ka ha wee nwee ndụ.—Ọrụ 11:1-18.
20. (a) Okwu ndụmọdụ dị aṅaa banyere alụghị di na nwunye ka e nyere ndị Kraịst na-eto eto? (b) Okwu dị aṅaa bụ isi metụta obi ụtọ nọgidere na-abụ eziokwu?
20 Ya mere, mgbe ahụ, alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ otu ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ, ọ bụ ezie na ọ pụrụ imepe ụzọ maka ọtụtụ nsogbu. Otu ihe doro anya: Alụmdi na nwunye abụghị nanị ụzọ e si enweta obi ụtọ. N’ihi nke a, mgbe a tụlesịrị ihe nile, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya nye ndị Kraịst na-eto eto ịgbalị ime ohere maka ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ruo ọtụtụ afọ. A pụrụ iji afọ ndị ahụ mee ihe nke ọma iji jeere Jehova ozi ma nwee ọganihu n’ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, n’aghanyeghị ihe ịga nke ọma ime mmụọ, okwu nke bụ isi nọgidere na-abụ eziokwu nye ndị nile raara onwe ha kpam kpam nye Chineke: A na-achọta ezi obi ụtọ n’iji ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji bụrụ ndị obi ụtọ?
◻ N’ihi gịnị ka alụmdi na nwunye n’ejighị bụrụ ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ kasị ukwuu?
◻ N’ihe banyere ịhọrọ onye a ga-alụ, gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị n’ime ya ikweta na ndị Kraịst ndị nọgidere n’alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ inwe obi ụtọ?
◻ Gịnị bụ ihe a na-aghaghị ikweta banyere alụmdi na nwunye na obi ụtọ?