Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 7/1 p. 19-24
  • Mmeri nke Ezi Ofufe Na-eru Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmeri nke Ezi Ofufe Na-eru Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ala Ọzọ n’Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Chineke
  • Ebe Nsọ ahụ na Ihe Ndị E Ji Chọọ Ya Mma
  • Mmeri Zuru Ezu nke Ezi Ofufe
  • Mbilite n’Ọnwụ Elu Ala
  • Ememe Ụlọ Ntu Ihe Atụ Ahụ
  • Ememe Ndị Dị Ịrịba Ama n’Akụkọ Israel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Ị Ga-abụkwa Onye Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Oké Ìgwè Mmadụ Bara Ụba
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 7/1 p. 19-24

Mmeri nke Ezi Ofufe Na-eru Nso

“Jehova ga-aghọkwa eze elu ụwa nile.”—ZEKARAỊA 14:9.

1. Gịnị bụ ahụmahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge Agha Ụwa Mbụ, oleekwa otú e si buo nke a n’amụma?

N’OGE Agha Ụwa Mbụ, ndị Kraịst e tere mmanụ nwetara ọtụtụ ihe isi ike na ịtụ mkpọrọ n’aka mba ndị ahụ na-alụ agha. Àjà otuto ndị ha na-achụrụ Jehova bụ́ ndị a kpaara ókè n’ụzọ siri ike, ha dabakwara n’ọnọdụ ndọrọ n’agha n’ụzọ ime mmụọ. E buru ihe ndị a nile n’amụma na Zekaraịa 14:2, bụ́ nke na-akọwa mwakpo nke mba nile ga-awakpo Jerusalem. Obodo nke dị n’amụma a bụ “Jerusalem nke dị n’eluigwe,” Alaeze eluigwe nke Chineke na ebe “ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ” dị. (Ndị Hibru 12:22, 28; 13:14; Mkpughe 22:3) Ndị Chineke e tere mmanụ nọ n’elu ala nọchitere anya obodo ahụ. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi so n’ime ha lanarịrị mwakpo ahụ, na-ajụ ikwe ka a dọrọ ha n’agha pụọ “n’obodo ahụ.”a

2, 3. (a) Olee otú ofufe Jehova siworo nwee mmeri kemgbe 1919? (b) Kemgbe 1935, ihe omume dị aṅaa werewooro ọnọdụ?

2 Na 1919 a tọhapụrụ ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnọdụ ndọrọ n’agha ha, ha jikwa oge udo nke sochiri agha ahụ mee ihe ozugbo. Dị ka ndị nnọchianya nke Jerusalem nke eluigwe, ha jiri ohere ahụ magburu onwe ya mee ihe iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke na iji nye aka n’ịchịkọta ndị ikpeazụ so na 144,000 ahụ. (Matiu 24:14; 2 Ndị Kọrint 5:20) Na 1931 ha nakweere aha ahụ kwesịrị ekwesị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ Ndịàmà Jehova.—Aịsaịa 43:10, 12.

3 Kemgbe ahụ, Ndịàmà Chineke e tere mmanụ adịbeghị mgbe ha leghachiri anya azụ. Ọbụna Hitler na ndị òtù Nazi ya enweghị ike imechi ha ọnụ. N’agbanyeghị mkpagbu zuru ụwa ọnụ, ọrụ ha amịwo mkpụrụ n’ụwa nile. Karịsịa malite n’afọ 1935, “oké ìgwè mmadụ” ahụ sitere ná mba nile nke e buru n’amụma n’akwụkwọ Mkpughe esonyeworo ha. Ndị a bụkwa ndị Kraịst raara onwe ha nye, e mere baptism, ‘ha asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ,’ bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 7:9, 14) Otú ọ dị, ha abụghị ndị e tere mmanụ, ndị nwere olileanya nke ndụ eluigwe. Olileanya ha bụ iketa ihe Adam na Iv tụfuru, nke bụ́, ndụ mmadụ zuru okè n’elu ala paradaịs. (Abụ Ọma 37:29; Matiu 25:34) Taa, oké ìgwè mmadụ ahụ dị ihe karịrị nde mmadụ ise n’ọnụ ọgụgụ. Ezi ofufe nke Jehova na-enwe mmeri, ma mmeri ikpeazụ ya ka dị n’ihu.

Ndị Ala Ọzọ n’Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ Chineke

4, 5. (a) Olee ebe oké ìgwè mmadụ ahụ nọ na-efe Jehova? (b) Ihe ùgwù dịgasị aṅaa ka ha nwere, ọ̀ bụkwa ná mmezu nke amụma dị aṅaa?

4 Dị ka e buru n’amụma, oké ìgwè mmadụ ahụ “na-efe [Chineke] ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya.” (Mkpughe 7:15) Ebe ọ bụ na ha abụghị ndị Israel ime mmụọ bụ́ ndị nchụàjà, o yiri ka Jọn ọ hụrụ ha ka ha na-eguzo n’ụlọ nsọ ahụ n’ogige dị n’èzí nke ndị Jentaịl. (1 Pita 2:5) Lee ka ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova siworo ghọọ nke dị ebube, gburugburu ya nile bụrụ nke jupụtara n’ìgwè mmadụ a bara ụba bụ́ ndị, tinyere ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ, na-eto ya!

5 Oké ìgwè mmadụ ahụ adịghị ejere Chineke ozi n’ọnọdụ ahụ nke ogige dị n’ime nke ndị nchụàjà sere onyinyo ya. A gụghị ha ná ndị ezi omume ná nzube nke ịbụ ụmụ ime mmụọ Chineke ndị o kuchiri. (Ndị Rom 8:1, 15) Ka o sina dị, site n’inwe okwukwe n’ihe mgbapụta nke Jisọs, ha nwere nguzo dị ọcha n’ihu Jehova. A gụrụ ha ná ndị ezi omume ná nzube nke ịbụ ndị enyi ya. (Tụlee Jemes 2:21, 23.) Ha onwe ha kwa nwere ihe ùgwù nke iche àjà a na-anakwere n’elu ebe ịchụàjà ime mmụọ nke Chineke. N’ihi ya, n’ime ìgwè mmadụ a bara ụba, amụma nke Aịsaịa 56:6, 7 na-enwe mmezu dị ebube: “Ụmụ ala ọzọkwa, ndị na-arapara Jehova, ijere Ya ozi, na ịhụ aha Jehova n’anya, na ịbụrụ Ya ndị ohu, . . . M ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m, M ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m; àjà nsure ọkụ nile ha na àjà nile ha ga-abụ ihe na-atọ ụtọ n’elu ebe ịchụàjà m: n’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị nile dị iche iche.”

6. (a) Ụdị àjà ndị dị aṅaa ka ndị ala ọzọ na-achụ? (b) Gịnị ka ite ọsịsa mmiri ahụ dị n’ogige ndị nchụàjà na-echetara ha?

6 Ihe so n’àjà ndị ala ọzọ a na-achụ bụ “mkpụrụ egbugbere ọnụ [nke yiri àjà ịnata ihu ọma a kwadebere nke ọma] nke na-ekwupụta nye aha [Chineke]” na “ime ihe dị mma na ime ka unu na ndị ọzọ nwekọọ ihe unu.” (Ndị Hibru 13:15, 16) Nnukwute ihe ahụ e ji gbanye mmiri nke ndị nchụàjà na-aghaghị iji sachaa onwe ha bụkwa ihe ncheta dị mkpa nye ndị ala ọzọ a. Ha onwe ha kwa aghaghị inyefe onwe ha ná nsacha ime mmụọ na nke omume ka a na-eme ka Okwu Chineke na-edowanye ha anya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu.

Ebe Nsọ ahụ na Ihe Ndị E Ji Chọọ Ya Mma

7. (a) Olee otú oké ìgwè mmadụ si ele ihe ùgwù dị iche iche nke òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ anya? (b) Ihe ùgwù ndị ọzọ dị aṅaa ka ndị ala ọzọ ụfọdụ nwetaworo?

7 Ọ̀ dị ihe ọ bụla Ebe Nsọ ahụ na ihe ndị e ji chọọ ya mma pụtara nye oké ìgwè mmadụ a nke ndị ala ọzọ? Ọ dịghị mgbe ha ga-anọ n’ọnọdụ nke Ebe Nsọ ahụ sere onyinyo ya. A mụghị ha ọzọ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke ndị nwere ebe obibi n’eluigwe. Nke a ọ̀ na-eme ka ha na-enwe anya ụfụ ma ọ bụ anyaukwu? Ee e. Kama nke ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ùgwù ha nke ịkwado ihe fọdụrụ n’ime 144,000 ahụ, ha na-egosikwa ekele dị omimi maka nzube Chineke n’ikuchi ụmụ ime mmụọ a, bụ́ ndị ga-eso Kraịst kere òkè n’ibuli ihe a kpọrọ mmadụ ruo n’izu okè. Ọzọkwa, oké ìgwè nke ndị ala ọzọ ahụ jiri oké obi ọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ n’inye ha olileanya elu ala nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs kpọrọ oké ihe. E nyewo ụfọdụ n’ime ndị ala ọzọ a, dị ka ndị Netinim nke oge ochie, ihe ùgwù nke nlekọta n’inyere òtù ndị nchụàjà ahụ dị nsọ aka.b (Aịsaịa 61:5) Jisọs si n’etiti ndị a họpụta “ndị isi n’ụwa nile.”—Abụ Ọma 45:16.

8, 9. Uru dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-enweta site n’ịtụle ihe ndị e ji chọọ Ebe Nsọ ahụ mma?

8 Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ha ga-abanye n’Ebe Nsọ ihe atụ ahụ, oké ìgwè nke ndị ala ọzọ ahụ na-amụta ihe ndị bara uru site n’ihe ndị e ji chọọ ya mma. Dị nnọọ ka ọ dị mkpa ịdị na-agbanye mmanụ ọkụ mgbe nile n’ihe ndọba oriọna ahụ, otú a ka mmụọ nsọ dị ndị ala ọzọ ahụ mkpa iji nyere ha aka ịghọta eziokwu na-aga n’ihu n’ihu ndị sitere n’Okwu Chineke, bụ́ ndị a na-enweta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ọzọkwa, mmụọ Chineke na-enyere ha aka ịzaghachi n’ọkpụkpọ òkù a bụ́: “Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ [ihe fọdụrụ e tere mmanụ] na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) N’ụzọ dị otú a, ihe ndọba oriọna ahụ bụ ihe ncheta nye oké ìgwè mmadụ ahụ banyere ọrụ dịịrị ha inwu dị ka ndị Kraịst na izere ihe ọ bụla n’àgwà, echiche, okwu, ma ọ bụ omume nke ga-akpasu mmụọ nsọ Chineke iwe.—Ndị Efesọs 4:30.

9 Table nke achịcha ihu Chineke na-echetara oké ìgwè mmadụ ahụ na iji nọgide na-enwe ahụ ike ime mmụọ, ha aghaghị ịdị na-ekerechi òkè anya ná nri ime mmụọ sitere na Bible na site ná mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 4:4) Ebe ịchụàjà ahụ nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-echetara ha ịdị mkpa nke isite n’obi kpegara Jehova ekpere maka enyemaka iji jigide iguzosi ike n’ezi ihe ha. (Luk 21:36) Ekpere ha kwesịrị ịgụnye nkwupụta nke otuto na ekele ndị sitere n’obi. (Abụ Ọma 106:1) Ebe ịchụàjà ahụ nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-echetakwara ha mkpa ọ dị ito Chineke n’ụzọ ndị ọzọ, dị ka site na ha iji obi ha dum na-abụ abụ Alaeze ná nzukọ ndị Kraịst na site na ha ime ezi nkwadebe iji “kwupụta ruo nzọpụta” n’ụzọ dị irè.—Ndị Rom 10:10.

Mmeri Zuru Ezu nke Ezi Ofufe

10. (a) N’olileanya dị aṅaa dị ebube ka anyị pụrụ ilega anya? (b) Olee ihe omume ga-eburiri ụzọ were ọnọdụ?

10 Taa “ọtụtụ ndị” si ná mba nile na-enuga n’ụlọ ofufe nke Jehova. (Aịsaịa 2:2, 3) N’ịkwado nke a, Mkpughe 15:4 na-ekwu, sị: “Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị? n’ihi na nanị Gị dị ọcha n’obi; n’ihi na mba nile ga-abịa kpọọkwa isiala n’ihu Gị; n’ihi na e mere ka ezi omume Gị nile pụta ìhè.” Zekaraịa isi nke 14 na-akọwa ihe ga-esochi. N’ọdịnihu dị nso, àgwà ọjọọ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ nọ n’ụwa ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu ka ha na-ezukọta na nke ikpeazụ ya ibu agha megide Jerusalem—ndị nnọchiteanya nọ n’elu ala nke Jerusalem nke eluigwe. Mgbe ahụ Jehova ga-eme ihe. Dị ka Chineke bụ́ Dike n’Agha, ọ “ga-apụkwa, busoo mba ahụ nile agha” bụ́ ndị nwara anwa ime mwakpo a.—Zekaraịa 14:2, 3.

11, 12. (a) Olee otú Jehova ga-esi zaghachi ná mwakpo ahụ zuru ụwa ọnụ ga-abịakwasị ndị na-efe ofufe n’ụlọ nsọ ya? (b) Gịnị ga-esi n’agha Chineke pụta?

11 “Nke a ga-abụkwa ihe otiti nke Jehova ga-eji tie ndị nile dị iche iche ndị busoworo Jerusalem agha: anụ ahụ ha nile n’otu n’otu ga-atasị ata mgbe ha onwe ha na-eguzo n’ụkwụ ha, anya ha ga-atasịkwa ata n’oghere ha, ire ha ga-atasịkwa ata n’ọnụ ha. Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na oké ọgbụgba aghara nke Jehova ga-adị n’etiti ha; ha ga-ejidekwa, onye ọ bụla o jide ibe ya aka, aka ya ga-ebilikwa imegide aka mmadụ ibe ya.”—Zekaraịa 14:12, 13.

12 Ma ihe otiti a ọ̀ bụ n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’ụzọ ihe atụ, anyị aghaghị ichere hụ ihe ga-eme. Otú ọ dị, otu ihe doro anya. Ka ndị iro Chineke na-aga ime mwakpo ha zuru ụwa ọnụ megide ndị ohu Jehova, oké ngosipụta ndị pụrụ iche nke ike pụrụ ime ihe nile nke Chineke ga-akwụsị ha. A ga-emechi ọnụ ha. Ọ ga-adị dị ka a ga-asị na ire ịma aka ha atasịwo. Ihe mgbaru ọsọ ha jikọrọ aka na-achụso ga-aghọ ihe gbara ọchịchịrị n’anya ha, dị ka a ga-asị na anya ha atasịwo. Ike ọkpụkpụ aka ha, nke nyere ha obi ike ime mwakpo ahụ, ga-agwụsị. N’ọgba aghara, ha ga-echigharịkwuru ibe ha n’oké ogbugbu. N’ụzọ dị otú a a ga-ekpochapụ ndị nile nọ n’ụwa bụ́ ndị na-emegide ofufe Chineke. N’ikpeazụ, a ga-amanyeworị mba nile ịmata ọbụbụeze eluigwe na ala nke Jehova. A ga-emezu amụma ahụ bụ́: “Jehova ga-aghọkwa eze elu ụwa nile.” (Zekaraịa 14:9) Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-eke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agbụ ka Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst jiri ngọzi nile dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ malite.—Mkpughe 20:1, 2; 21:3, 4.

Mbilite n’Ọnwụ Elu Ala

13. Olee ndị bụ ndị “fọdụrụ n’etiti mba nile”?

13 Amụma Zekaraịa gara n’ihu n’isi nke 14, amaokwu 16: “Ọ ga-erukwa, na onye ọ bụla nke fọdụrụ n’etiti mba nile ndị na-abịa imegide Jerusalem ga-arịgo kwa afọ ịkpọ isiala nye Eze, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, na ime ememe ụlọ ntu.” Dị ka Bible si kwuo, ndị nile dị ndụ taa ndị dịgidere ndụ ruo ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, bụrụkwa ndị a gụrụ ná ndị iro nke ezi ofufe ga-ahụ “ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-9; leekwa Matiu 25:31-33, 46.) Ha agaghị enwe mbilite n’ọnwụ. Ya mere, ma eleghị anya, ndị “fọdụrụ” gụnyere ndị òtù nke mba nile ndị nwụrụ tupu agha ikpeazụ nke Chineke, ndị nwekwara olileanya dabeere na Bible nke mbilite n’ọnwụ. “Oge hour na-abịa,” ka Jisọs kwere ná nkwa, “mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.

14. (a) Gịnị ka ndị e si n’ọnwụ kpọlite na-aghaghị ime iji nweta ndụ ebighị ebi? (b) Gịnị ga-eme onye ọ bụla jụrụ ịrara onwe ya nye Jehova ma fee ezi ofufe?

14 Ndị a nile a kpọlitere n’ọnwụ aghaghị ime ihe ka mbilite n’ọnwụ ha ghọọ nke ndụ, gharakwa ịbụ nke ikpe ọmụma. Ha aghaghị ịbịa n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ Jehova ma kpọọ isiala ná nraranye nye Chineke site na Jisọs Kraịst. Onye ọ bụla a kpọlitere n’ọnwụ nke jụrụ ime nke a ga-enweta otu ihe otiti ahụ nke ga-adakwasị mba ndị dị n’oge a. (Zekaraịa 14:18) Ònye makwanụ mmadụ ole a kpọlitere n’ọnwụ ndị ga-eji ọṅụ sonyere oké ìgwè mmadụ ahụ n’ime Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya, a ga-enwe ọtụtụ ndị, ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova ga-adịkwa ebube ọbụna karị n’ihi ya!

Ememe Ụlọ Ntu Ihe Atụ Ahụ

15. (a) Gịnị bụ akụkụ ụfọdụ pụrụ iche n’Ememe Ụlọ Ntu nke ndị Israel oge ochie? (b) N’ihi gịnị ka e ji chụọ oké ehi 70 n’àjà n’oge ememe ahụ?

15 Kwa afọ, a chọrọ ka ndị Israel oge ochie mee Ememe Ụlọ Ntu ahụ. Ọ na-adịru otu izu, na-abịakwa ná ngwụsị nke oge owuwe ihe ubi ha. Ọ bụ oge ọṅụ nke inye ekele. N’ime izu ahụ nile, ha aghaghị ibi n’ụlọ ntu na-adịru nwa oge nke e ji akwụkwọ osisi, karịsịa igu nkwụ, kpuchie. Ememe a chetaara ndị Israel otú Chineke siworo zọpụta ndị nna nna ha n’Ijipt na otú o si lekọta ha ka ha na-ebi n’ụlọ ntu n’oge ha na-ejegharị ruo 40 afọ n’ime ọzara ruo mgbe ha rutere Ala Nkwa ahụ. (Levitikọs 23:39-43) N’oge ememe ahụ, a na-achụ oké ehi 70 n’àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ ahụ. Dị ka ihe àmà na-egosi, akụkụ a nke ememe ahụ bụ ihe atụ amụma banyere ọrụ nzọpụta ndụ nke zuru okè, nke zukwara ezu nke Jisọs Kraịst rụrụ. Uru nile nke àjà mgbapụta ya ga-emesịa rutere ọtụtụ ndị sitere n’ezinụlọ 70 nke ihe a kpọrọ mmadụ ndị sitere na Noa.—Jenesis 10:1-29; Ọnụ Ọgụgụ 29:12-34; Matiu 20:28.

16, 17. (a) Olee mgbe Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ malitere, oleekwa otú o si gaa n’ihu? (b) Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si ekere òkè n’ememe ahụ?

16 Ya mere Ememe Ụlọ Ntu nke oge ochie zoro aka ná nchịkọta na-enye ọṅụ nke ndị mmehie a gbapụtara agbapụta baa n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Ihe ememe a mere ihe atụ ya malitere na Pentikọst na 33 O.A. site ná mmalite nke nchịkọta na-enye ọṅụ nke ndị Israel ime mmụọ bata n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Ọrụ 2:41, 46, 47) Ndị a e tere mmanụ ghọtara na ha bụ ndị “ọbịa” n’ụwa Setan n’ihi na ‘ala ha n’ezie dị n’eluigwe.’ (1 Pita 2:11; Ndị Filipaị 3:20) Ememe ahụ na-enye ọṅụ bụ nke ndapụ n’ezi ofufe ahụ nke kpatara nguzobe nke Krisendọm kpuchiri ruo nwa oge. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3) Otú ọ dị, a maliteghachiri ememe ahụ na 1919 site ná nchịkọta na-enye ọṅụ nke ndị ikpeazụ so na 144,000 Israel ime mmụọ ahụ, nke ihe sochiri ya bụ nke oké ìgwè mmadụ zuru mba nile nke Mkpughe 7:9.

17 E gosiri oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ndị ji igu nkwụ n’aka ha, bụ́ nke na-egosi na ha onwe ha kwa bụ ndị ji ọṅụ na-eme Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ. Dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye, ha ji ọṅụ na-ekere òkè n’ọrụ ịchịkọtakwu ndị na-efe ofufe n’ụlọ nsọ Jehova. Ọzọkwa, dị ka ndị mmehie, ha na-aghọta na ha enweghị ikike ibigide n’elu ala. Ha, tinyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ọdịnihu, aghaghị ịnọgide na-enwe okwukwe n’àjà mgbapụta Kraịst ruo mgbe ha ruru izu okè mmadụ n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst.—Mkpughe 20:5.

18. (a) Gịnị ga-eme ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst? (b) Olee otú ezi ofufe nke Jehova ga-esi nwee mmeri n’ikpeazụ?

18 Mgbe ahụ, ndị na-efe Chineke ofufe n’elu ala ga-eguzo n’ihu ya n’izu okè mmadụ n’enweghị mkpa nke òtù ndị nchụàjà nke eluigwe. Oge ga-eruworị mgbe Jisọs Kraịst “ga-arara alaeze Ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna.” (1 Ndị Kọrint 15:24) A ga-atọhapụ Setan ruo “nwa oge” ịnwale ụmụ mmadụ e mere ka ha zuo okè. A ga-ebibi ndị nile na-ekwesịghị ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi, tinyere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. A ga-enye ndị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ndụ ebighị ebi. Ha ga-aghọ ndị obibi n’ime Paradaịs elu ala n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’ụzọ dị otú ahụ ihe Ememe Ụlọ Ntu ahụ sere onyinyo ya ga-abịaworị ná njedebe dị ebube, nke gara nke ọma. Ezi ofufe ga-enweworị mmeri maka otuto ebighị ebi nke Jehova na obi ụtọ ebighị ebi nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Mkpughe 20:3, 7-10, 14, 15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa amaokwu n’amaokwu nke Zekaraịa isi nke 14, lee akwụkwọ bụ́ Paradise Restored to Mankind—By Theocracy!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1972, isi nke 21 na 22.

b Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere ndị Netinim nke oge a, lee Ụlọ Nche, April 15, 1992, peji nke 16.

Ajụjụ Ntụleghachi

◻ Olee otú e si wakpo “Jerusalem” n’oge Agha Ụwa Mbụ?—Zekaraịa 14:2.

◻ Gịnị meworo ndị Chineke kemgbe 1919?

◻ Olee ndị taa na-ekere òkè n’ime Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ?

◻ Olee otú ezi ofufe ga-esi nwee mmeri n’ụzọ zuru ezu?

[Foto dị na peeji nke 23]

E ji igu nkwụ mee ihe n’ime Ememe Ụlọ Ntu ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya