Isi nke Iri na Asaa
A Chịkọta Ndị Ala Ọzọ n’Ụlọ Ekpere nke Chineke
1, 2. Olee ọkwa na-akpali akpali a mara na 1935, nke a bụkwa akụkụ nke gịnị?
NA Friday, May 31, 1935, Joseph F. Rutherford gwara ìgwè mmadụ bịara mgbakọ e nwere na Washington, D.C., okwu. O kwuru okwu banyere ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ. Mgbe Nwanna Rutherford na-ewepụta isi ihe dị n’okwu ya, o kwuru, sị: “Ndị nile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala biko bilienụ ọtọ.” Dị ka otu onye n’ime ndị garanụ si kwuo, “ihe karịrị ọkara nke ndị na-ege ntị biliri ọtọ.” Mgbe ahụ, ọkà okwu ahụ sịrị: “Lee oké ìgwè mmadụ ahụ!” Onye ọzọ garanụ na-echeta, sị: “Ebe nile buru ụzọ daa jụụ, mgbe ahụ iti mkpu ọṅụ sochiri, iti mkpu ọṅụ ahụ dasikwara ụda ike ma dịtee aka.”—Mkpughe 7:9.
2 Nke a bụ oge dị ịrịba ama ná mmezu nọ na-aga n’ihu nke otu amụma e dekọrọ ihe dị ka afọ 2,700 tupu mgbe ahụ, nke a na-ahụkwa n’ime Bible anyị dị ka Aịsaịa isi 56. Dị ka ọ dị n’ihe banyere amụma ndị ọzọ dị n’Aịsaịa, nke a nwere ma nkwa ndị na-enye nkasi obi ma ịdọ aka ná ntị ndị siri ike. Ná mmezu mbụ ya, ọ bụ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ n’oge Aịsaịa ka a gwara ya, ma mmezu ya dịịrị gawa ruo ọtụtụ narị afọ rute n’oge anyị.
Ihe Nzọpụta Chọrọ
3. Ọ bụrụ na ndị Juu achọọ nzọpụta site n’aka Chineke, gịnị ka ha na-aghaghị ime?
3 Aịsaịa isi 56 ji ndụmọdụ e nyere ndị Juu malite. Otú ọ dị, ndị nile na-efe ezi ofufe kwesịrị ịṅa ntị n’ihe onye amụma ahụ dere. Anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume: n’ihi na nzọpụta m dị nso ịbịa, ezi omume m dịkwa nso ka e kpughee ya. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye na-eme nke a na nwa mmadụ nke na-ejidesi ya ike bụ; onye na-edebe ụbọchị izu ike ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke na-edebekwa aka ya ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla.” (Aịsaịa 56:1, 2) Ndị bi na Juda, bụ́ ndị chọrọ nzọpụta site n’aka Chineke, aghaghị irube isi n’Iwu Mosis, na-edebe ikpe ziri ezi ma na-ebi ndụ ime ezi omume. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova n’onwe ya bụ onye ezi omume. Ndị na-eme ezi omume na-enweta obi ụtọ nke na-abịa site n’inwe ihu ọma Jehova.—Abụ Ọma 144:15b.
4. N’ihi gịnị ka idebe Ụbọchị Izu Ike ji dị mkpa n’Israel?
4 Amụma ahụ na-emesi ndebe nke Ụbọchị Izu Ike ike n’ihi na Ụbọchị Izu Ike bụ akụkụ dị mkpa nke Iwu Mosis. N’ezie, otu n’ime ihe ndị mere ndị bi na Juda ji mesịa jee biri n’ala ọzọ bụ n’ihi nleghara ha leghaara Ụbọchị Izu Ike anya. (Levitikọs 26:34, 35; 2 Ihe E Mere 36:20, 21) Ụbọchị Izu Ike bụ ihe ama nke mmekọrịta pụrụ iche Jehova na ndị Juu nwere, ndị na-edebekwa Ụbọchị Izu Ike na-egosi na ha ji mmekọrịta ahụ kpọrọ ihe. (Ọpụpụ 31:13) Ọzọkwa, idebe Ụbọchị Izu Ike ga-echetara ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ na Jehova bụ Onye Okike. Idebe ya ga-echetakwara ha ebere ya n’ebe ha nọ. (Ọpụpụ 20:8-11; Deuterọnọmi 5:12-15) N’ikpeazụ, idebe Ụbọchị Izu Ike ga-eme ka e nwee usoro chiri anya, nke a haziri ahazi, maka ife Jehova. Izuru ike otu ugboro n’izu n’ọrụ ha na-arụ mgbe nile ga-eme ka ndị bi na Juda nwee ohere maka ekpere, ọmụmụ ihe, na ntụgharị uche.
5. N’ịgbaso ụkpụrụ dị na ya, olee otú ndị Kraịst pụrụ isi tinye ndụmọdụ nke idebe Ụbọchị Izu Ike n’ọrụ?
5 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị Kraịst? Agbamume idebe Ụbọchị Izu Ike ò metụtara ha? O metụtaghị ha kpọmkwem, ebe ọ bụ na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, n’ihi ya kwa, a chọghị idebe Ụbọchị Izu Ike n’aka ha. (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl onyeozi kọwara na e nwere “ụbọchị izu ike” nke dịịrị ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi. “Ụbọchị izu ike” a na-agụnye inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs chụrụ maka nzọpụta nakwa ịkwụsị ịdabere nanị n’ọrụ. (Ndị Hibru 4:6-10) N’ihi ya, ihe ndị e kwuru n’amụma Aịsaịa banyere Ụbọchị Izu Ike na-echetara ndị ohu Jehova taa oké mkpa ọ dị inwe okwukwe ná ndokwa Chineke maka nzọpụta. Ọ bụkwa ezigbo ihe ncheta nke mkpa ọ dị isoro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya na ịdị na-efe ofufe mgbe nile n’otu usoro ahụ.
Nkasi Obi Maka Onye Ala Ọzọ na Ọnaozi
6. Olee ìgwè abụọ e lebaara anya ugbu a?
6 Ugbu a Jehova na-agwa ìgwè abụọ ndị chọrọ ijere ya ozi okwu ma ha bụ ndị na-erughị eru ịbata ná nzukọ ndị Juu n’okpuru Iwu Mosis. Anyị na-agụ, sị: “Ka [onye] ala ọzọ nke raparawooro na Jehova ghara ikwu okwu, sị, Jehova aghaghị ikewapụ m ná ndị Ya: ka ọnaozi gharakwa ịsị, Lee, mụ onwe m bụ osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.” (Aịsaịa 56:3) Ihe na-atụ onye ala ọzọ ụjọ bụ na a ga-ebipụ ya n’Israel. Ihe na-echegbu ọnaozi bụ na ọ dịghị mgbe ọ ga-amụ ụmụ iji mee ka aha ya ghara ifu. Ìgwè abụọ ahụ kwesịrị inwe obi ike. Tupu anyị ahụ ihe kpatara ya, ka anyị tụlee ihe bụ́ ọnọdụ ha n’okpuru Iwu ahụ ná mba Israel.
7. Olee ihe ndị Iwu ahụ kpaara ndị ala ọzo nọ n’Israel ókè ime?
7 A na-agụpụ ndị ala ọzọ a na-ebighị úgwù n’iso Israel fee ofufe. Dị ka ihe atụ, a dịghị ekwe ka ha kere òkè n’Ememe Ngabiga. (Ọpụpụ 12:43) Ndị ala ọzọ, ndị na-adịghị ada iwu ala ahụ n’ụzọ pụtara ìhè, na-enweta ikpe ziri ezi na afọ ọma, ma, ha na mba ahụ adịghị enwe ihe nkekọ na-adịgide adịgide. N’ezie, ụfọdụ nakweere Iwu ahụ n’ụzọ nile, a na-ebikwa ndị ikom ahụ úgwù dị ka ihe ama iji gosi nke a. Mgbe ahụ ha na-aghọ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ndị nwere ihe ùgwù nke ife ofufe n’ogige nke ụlọ Jehova, a na-ewerekwa ha dị ka ndị so ná nzukọ Israel. (Levitikọs 17:10-14; 20:2; 24:22) Otú ọ dị, ọbụna ndị na-eso ụzọ ndị Juu esoghị n’ụzọ zuru ezu n’ọgbụgba ndụ ahụ Jehova na Israel gbara, ha enweghịkwa ihe nketa nke ala n’Ala Nkwa ahụ. Ndị ala ọzọ ndị ọzọ pụrụ iche ihu n’ụlọukwu ahụ mgbe ha na-ekpe ekpere, dịkwa ka ihe àmà gosiri, ha pụrụ ịchụ àjà site n’aka ndị nchụàjà ma ọ bụrụhaala na àjà ndị ahụ kwekọrọ n’ihe Iwu kwuru. (Levitikọs 22:25; 1 Ndị Eze 8:41-43) Ma ndị Israel agaghị eso ha kpachie anya.
Ndị Ọnaozi Enweta Aha Ebighị Ebi
8. (a) N’okpuru Iwu ahụ, olee otú e si ele ndị ọnaozi anya? (b) Olee otú e si jiri ndị ọnaozi mee ihe ná mba ndị na-ekpere arụsị, na gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọnaozi” pụrụ izo aka na ya mgbe ụfọdụ?
8 A dịghị ekwe ka ndị ọnaozi soro ná mba Israel n’ụzọ zuru ezu, ọ bụrụgodị na ọ bụ ndị Juu mụrụ ha.a (Deuterọnọmi 23:1) Ná mba ụfọdụ na-ekpere arụsị n’oge Bible, ndị ọnaozi nwere ọkwá pụrụ iche, ọ bụkwa omenala ha ịpị ụfọdụ n’ime ụmụaka a dọtara n’agha amụ. A na-ahọpụta ndị ọnaozi ịbụ ndị ọrụ n’obí eze. Ọnaozi pụrụ ịbụ “onye na-edebe ndị inyom,” “onye na-edebe ndị iko nwanyị,” ma ọ bụ onye na-ejere eze nwanyị ozi. (Esta 2:3, 12-15; 4:4-6, 9) E nweghị ihe àmà na-egosi na ndị Israel ṅomiri ụdị omume ndị ahụ ma ọ bụ na a chọrọ ndị ọnaozi n’ụzọ pụrụ iche maka ịrụ ọrụ ijere ndị eze Israel ozi.b
9. Olee okwu ngụgụ obi nke Jehova na-agwa ndị bụ́ ọnaozi n’anụ ahụ?
9 Tụkwasị n’inwe ike ikere òkè nanị n’ụzọ a kpaara ókè n’ofufe nke ezi Chineke ahụ, ndị bụ ọnaozi n’anụ ahụ n’Israel na-enweta oké mweda n’ala nke enweghị ike ịmụ ụmụ ga-anọgide na-aza aha ezinụlọ ha. Mgbe ahụ, lee otú ihe ndị sochirinụ e kwuru n’amụma ahụ si na-enye nkasi obi! Anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Jehova sịrị ndị ọnaozi ndị na-edebe ụbọchị izu ike m nile, ndị họpụtawokwara ihe tọrọ m ụtọ, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike: M ga-enye ha n’ụlọ m na n’ime mgbidi m nile ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom, karịakwa ụmụ ndị inyom; aha ebighị ebi ka M ga-enye ha n’otu n’otu, nke a na-agaghị ebipụ.”—Aịsaịa 56:4, 5.
10. Olee mgbe ọnọdụ ndị ọnaozi gbanwere, ihe ùgwù dịkwa aṅaa ka e meghewooro ha kemgbe ahụ?
10 Ee, oge ga-eru mgbe ịbụ ọbụna ọnaozi n’anụ ahụ na-agakwaghị abụ ihe mgbochi n’ịbụ onye a ga-anara n’ụzọ zuru ezu dị ka ohu Jehova. Ọ bụrụ na ha erube isi, ndị ọnaozi ga-enwe “ihe ncheta,” ma ọ bụ ọnọdụ, n’ụlọ Jehova nakwa aha nke dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Olee mgbe nke a mere? O meghị ruo mgbe Jisọs Kraịst nwụsịrị. N’oge ahụ, e ji ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ, e jikwa “Israel nke Chineke” dochie Israel anụ ahụ. (Ndị Galetia 6:16) Kemgbe ahụ, ndị nile na-egosipụta okwukwe enwewo ike ife Chineke ofufe ọ na-anabata. Inwe ọnọdụ pụrụ iche n’anụ ahụ nakwa ihe mmadụ bụ n’anụ ahụ adịkwaghị mkpa. Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ha n’anụ ahụ, ga-enwe “aha ebighị ebi . . . nke a na-agaghị ebipụ.” Jehova agaghị echefu ha. A ga-ede aha ha ‘n’akwụkwọ ncheta’ ya, n’oge nke Chineke kwa, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Malakaị 3:16; Ilu 22:1; 1 Jọn 2:17.
Ndị Ala Ọzọ Esoro Ndị Chineke Fee Ofufe
11. Iji nweta ngọzi, gịnị ka a gbara ndị ala ọzọ ume ime?
11 Otú ọ dị, olee banyere ndị ala ọzọ? Amụma ahụ laghachiri ugbu a n’ebe ndị a nọ, Jehova nwekwara okwu na-enye nkasi obi dị ukwuu ọ ga-agwa ha. Aịsaịa na-ede, sị: “[Ndị] ala ọzọ kwa, ndị na-arapara Jehova, ijere Ya ozi, na ịhụ aha Jehova n’anya, na ịbụrụ Ya ndị ohu, onye ọ bụla nke na-edebe ụbọchị izu ike ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike; M ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m, M ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m; àjà nsure ọkụ nile ha na àjà nile ha ga-abụ ihe na-atọ ụtọ n’elu ebe ịchụàjà m: n’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere dịịrị ndị nile dị iche iche.”—Aịsaịa 56:6, 7.
12. Olee nghọta e nweburu banyere amụma Jisọs metụtara “atụrụ ọzọ” ahụ?
12 N’oge anyị, “ndị ala ọzọ” ejiriwo nwayọọ nwayọọ pụta. Tupu Agha Ụwa Mbụ, a ghọtara na ọnụ ọgụgụ mmadụ karịrị nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị nwere olileanya iso Jisọs chịa n’eluigwe—ndị anyị maara taa dị ka Israel nke Chineke—ga-enweta nzọpụta. Ndị mmụta Bible maara ihe Jisọs kwuru bụ́ ndị e dekọrọ na Jọn 10:16, sị: “Atụrụ ọzọ ka M nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu Onye ọzụzụ atụrụ.” A ghọtara “atụrụ ọzọ” ndị a ịbụ òtù ga-anọ n’elu ala. Ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmụta Bible kwenyere na atụrụ ọzọ ahụ ga-apụta n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Jisọs Kraịst.
13. N’ihi gịnị ka e ji chee na atụrụ ahụ dị na Matiu isi 25 aghaghị ịpụta ná ngwụsị nke usoro ihe a?
13 N’ikpeazụ, e nwere nghọta ka ukwuu banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọzọ e jikọtara ya na ya nke na-ekwu banyere atụrụ. Na Matiu isi 25, e dekọrọ ilu Jisọs banyere atụrụ na ụmụ ewu. Dị ka ilu ahụ si kwuo, atụrụ ahụ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ihi na ha na-akwado ụmụnna Jisọs. N’ihi ya, ha bụ òtù dị nnọọ iche n’ụmụnna Kraịst e tere mmanụ. Na 1923, n’otu mgbakọ e nwere na Los Angeles, California, U.S.A., a kọwara na atụrụ ndị ahụ aghaghị ịpụta, ọ bụghị n’ime Narị Afọ Iri ahụ, kama ná ngwụsị usoro ihe a. N’ihi gịnị? N’ihi na Jisọs tụrụ ilu ahụ dị ka ihe so n’azịza ya nye ajụjụ bụ́: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa Gị, na nke ọgwụgwụ oge a?”—Matiu 24:3.
14, 15. Olee otú e si nwee ọganihu n’ịghọta ọnọdụ nke atụrụ ọzọ ahụ na mgbe ọgwụgwụ?
14 N’afọ ndị 1920, ndị ụfọdụ so ná Ndị Mmụta Bible malitere iche na mmụọ Jehova adịghị agbara ha àmà na ha nwere ọkpụkpọ eluigwe. Ma, ha bụ ndị ohu na-anụ ọkụ n’obi nke Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu. Na 1931, a ghọtara ihe bụ́ ọnọdụ nke ndị a nke ọma karị mgbe e bipụtara akwụkwọ bụ́ Vindication. Dị ka akụkụ nke ntụle amaokwu n’amaokwu nke akwụkwọ Bible bụ́ Ezikiel, Vindication kọwara ọhụụ nke “nwoke” ahụ ji mpi ink nke odeakwụkwọ. (Ezikiel 9:1-11) A hụrụ ka “nwoke” a na-agabiga na Jerusalem na-aka akara n’egedege ihu nke ndị na-eze ume ma na-eti mkpu n’ihi ihe arụ nile a na-eme ebe ahụ. “Nwoke” ahụ na-anọchite anya ụmụnna Jisọs, bụ́ ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nọ ndụ n’ụwa n’oge a ga-ekpe Jerusalem ihe atụ, bụ́ Krisendọm, ikpe. Ndị a kara akara bụ atụrụ ọzọ ahụ ndị dị ndụ n’oge ahụ. N’ọhụụ ahụ, e chebere ha mgbe ndị na-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe bọrọ ọ́bọ̀ n’ahụ obodo ahụ si n’ezi ofufe dapụ.
15 Na 1932, nghọta miri emi karị nke ihe atụ amụma nke Eze Jihu nke Israel na Jehonadab, onye na-abụghị onye Israel nke kwadoro ya, gosiri otú atụrụ ọzọ a si eme ihe iji kwadoo ụmụnna Kraịst e tere mmanụ—dị nnọọ ka Jehonadab si soro Jihu gaa ma kwadoo ya ná mbibi ọ na-ebibi ofufe Beal. N’ikpeazụ, na 1935, a matara na ọ bụ atụrụ ọzọ ahụ nke dị ndụ n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe a bụ oké ìgwè mmadụ ahụ Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ. A kọwara nke a nke mbụ ya ná mgbakọ ahụ e hotara na mbụ nke e nwere na Washington, D.C., mgbe Joseph F. Rutherford zoro aka n’ebe ndị nwere olileanya elu ala nọ dị ka “oké ìgwè mmadụ.”
16. Olee ihe ùgwù na ibu ọrụ “ndị ala ọzọ” ahụ nwere?
16 N’ihi ya, e ji nwayọọ nwayọọ hụ na “ndị ala ọzọ” ahụ nwere òkè buru ibu ha ga-ekere ná nzube Jehova na mgbe ikpeazụ a. Ha na-abịakwute Israel nke Chineke iji fee Jehova ofufe. (Zekaraịa 8:23) Ha so mba ime mmụọ ahụ na-achụrụ Chineke àjà ndị ọ na-anabata ma banye n’ụbọchị izu ike ahụ. (Ndị Hibru 13:15, 16) Ọzọkwa, ha na-efe ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, nke bụ́ “ụlọ ekpere mba nile” dịkwa ka ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem bụ. (Mak 11:17) Ha na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ‘saa uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ Ha na-ejekwara Jehova ozi mgbe nile, “na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị.”—Mkpughe 7:14, 15.
17. Olee otú ndị ala ọzọ nke oge a si ejidesi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike?
17 Ndị ala ọzọ a nke oge a na-ejidesi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike n’echiche nke na site n’isoro Israel nke Chineke na-akpakọrịta, ha na-enweta uru na ngọzi ndị na-abịa site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ọ bụ ezie na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ahụ, ha ji obi ha dum na-edo onwe ha n’okpuru iwu ndị e jikọtara ha na ya. N’ụzọ dị otú a, iwu Jehova dị n’ime obi ha, ha na-abịakwa mara Jehova dị ka Nna ha nke eluigwe na Eze kasị elu.—Jeremaịa 31:33, 34; Matiu 6:9; Jọn 17:3.
18. Ọrụ nchịkọta dị aṅaa ka a na-arụzu na mgbe ọgwụgwụ a?
18 Amụma Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị pụta, bụ́ Jehova Nke na-achịkọta ndị Israel a chụpụrụ achụpụ, Ọ sị, Ndị ọzọ dịkwa M ga-achịkọtara ya, chịkọtara ndị ya a chịkọtara achịkọta.” (Aịsaịa 56:8) N’oge ọgwụgwụ a, Jehova achịkọtawo “ndị Israel a chụpụrụ achụpụ,” ndị so n’ihe fọdụrụ e tere mmanụ. Ọzọkwa, ọ na-achịkọta ndị ọzọ, bụ́ ndị so n’oké ìgwè mmadụ. Ha na-efekọ ofufe ọnụ n’udo na n’ịdị n’otu n’okpuru nlekọta Jehova na Eze ya o mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Kraịst Jisọs. N’ihi iguzosi ike n’ihe ha nye ọchịchị Jehova site n’aka Kraịst, Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ emewo ka ha ghọọ ìgwè atụrụ dị n’otu, nke na-enwe ọṅụ.
Ndị Nche Kpuru Ìsì, Nkịta Ndị Dara Ogbi
19. Olee òkù a na-akpọ anụ ọhịa dị iche iche?
19 Okwu ndị na-emegide ha, ndị dị ịrịba ama, ndị fọrọ nke nta ka ha bụrụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ sochiri okwu ndị ahụ na-enye obi ụtọ, ndị na-ewuli elu e kwuru na mbụ. Jehova dị njikere imere ndị ala ọzọ na ndị ọnaozi ebere. Ma a katọrọ ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha nọ n’ọgbakọ Chineke, a gajekwa ikpe ha ikpe. Nke ka nke ahụ, ha ekwesịdịghị ka e lie ha ezigbo olili, nanị ihe kwesịkwara ha bụ ka anụ ọjọọ ripịa ha. Ya mere, anyị na-agụ, sị: “Unu anụ ọhịa nile, bịanụ iri ihe, unu anụ nile dị n’oké ọhịa.” (Aịsaịa 56:9) Olee ihe anụ ọhịa ndị a ga-eri? Amụma ahụ ga-ekwu. Site n’ime otú ahụ, ọ pụrụ ichetara anyị ọdachi na-echere ndị na-emegide Chineke n’agha Amagedọn na-abịanụ, bụ́ ndị a ga-ahapụ ozu ha ka nnụnụ nke eluigwe rie.—Mkpughe 19:17, 18.
20, 21. Emezighị emezi dịgasị aṅaa mere ka ndị ndú okpukpe bụrụ ndị na-abaghị uru dị ka ndị ndú ime mmụọ?
20 Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nche ya bụ ndị ìsì, ha nile amaghị ama; ha nile bụ nkịta dara ogbi, ha apụghị ịgbọ ụja; ha bụ ndị na-arọ nrọ, na-edina ala, na-ahụ ịtụ oru ụra n’anya. Nkịta ya nile na-eribiga ihe ókè, ha amaghị afọ ojuju; ndị ahụ bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ na-amaghị ịghọta ihe: ha nile echewo ụzọ nke aka ha ihu, onye ọ bụla o chee uru ya ihu site n’akụkụ nile ọ bụla. Ha sị, Bịanụ, ka m weta mmanya vine, ka anyị ṅụbigakwa ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè; echi ga-adịkwa ka taa, ụbọchị dị ukwuu gabiga ókè nke ukwuu.”—Aịsaịa 56:10-12.
21 Ndị ndú okpukpe nke Juda na-ekwu na ha na-efe Jehova ofufe. Ha na-azọrọ na ha bụ “ndị nche ya.” Ma ha kpuru ìsì, daa ogbi, ma na-ero ụra n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụrụ na ha enweghị ike ịdị na-eche nche ma nye ịdọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ, olee uru ha bara? Ụdị ndị nche okpukpe dị otú ahụ enweghị uche, ha agaghị enyeli ndị yiri atụrụ nduzi ime mmụọ. Ọzọkwa, ha rụrụ arụ. Ha nwere ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke a na-apụghị imeju emeju. Kama ịgbaso nduzi Jehova, ha na-achọ ụzọ nke ha, na-achụso uru na-ezighị ezi, na-aṅụbiga mmanya ókè, ma na-agba ndị ọzọ ume ime otú ahụ. Ikpe Chineke nke na-abịanụ adịghị abata ha n’uche ma ọlị nke na ha na-agwa ndị mmadụ na ihe ga-adị mma.
22. Olee otú ndị ndú okpukpe nke oge Jisọs si yie ndị nke Juda oge ochie?
22 Na mbụ n’amụma ya, Aịsaịa ji nkọwa ihe atụ yiri ndị a mee ihe iji kọwaa ndị ndú okpukpe na-ekwesịghị ntụkwasị obi nke Juda—ndị mmanya na-egbu, ndị na-ero ụra, na ndị na-enweghị uche n’ụzọ ime mmụọ. Ha ji ọdịnala ụmụ mmadụ bogbuo ndị mmadụ, na-ekwu okwu ụgha okpukpe, ma tụkwasị Asiria obi maka enyemaka kama ịdabere n’ebe Chinke nọ. (2 Ndị Eze 16:5-9; Aịsaịa 29:1, 9-14) O doro anya na ọ dịghị ihe ha mụtara. N’ụzọ dị mwute, e nwere ụdị ndị ndú dị otú ahụ na narị afọ mbụ. Kama ịnakwere ozi ọma nke Ọkpara Chineke n’onwe ya wetaara ha, ha jụrụ Jisọs ma gbaa izu igbu ya. Jisọs kpọrọ ha n’ezoghị ọnụ “ndị ndú kpuru ìsì,” na-agbakwụnye na ọ bụrụ na “onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”—Matiu 15:14.
Ndị Nche nke Taa
23. Amụma dị aṅaa Pita buru banyere ndị ndú okpukpe ka e mezuworo?
23 Pita onyeozi dọrọ aka ná ntị na ndị ozizi ụgha ga-ebili iduhie ndị Kraịst. O dere, sị: “Ndị amụma ụgha pụtakwara ìhè n’etiti ndị Israel, dị ka ndị ozizi ụgha ga-adịkwa n’etiti unu, bụ́ mmadụ ndị ga-ewere nzuzo webata ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi, na-agọnahụ ọbụna Onyenwe ha Onye gbara ha, ndị na-eweta ịla n’iyi dị ngwa tụkwasị onwe ha n’isi.” (2 Pita 2:1) Gịnị siworo n’ozizi ụgha na ịrọ òtù nke ndị ozizi ụgha dị otú ahụ pụta? Ọ bụ Krisendọm, bụ́ nke ndị ndú okpukpe ya taa na-ekpere ndị enyi ha bụ́ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ekpere maka ngọzi Chineke, mgbe ahụkwa na-ekwe ha nkwa maka ọdịnihu dị mma. Ndị ndú okpukpe nke Krisendọm aghọwo ndị ìsì, ndị ogbi, na ndị na-ero ụra n’ihe banyere ihe ime mmụọ.
24. Ịdị n’otu dị aṅaa dị n’etiti Israel ime mmụọ na ndị ala ọzọ?
24 Otú ọ dị, Jehova na-akpọta ọtụtụ nde ndị ala ọzọ isoro ndị ikpeazụ so n’Israel nke Chineke fee ofufe n’oké ụlọ ekpere ime mmụọ ya. Ndị ala ọzọ a, ọ bụ ezie na ha sitere n’ọtụtụ mba, agbụrụ, na asụsụ, ha na ibe ha nakwa ha na Israel nke Chineke dị n’otu. Ha kwenyesiri ike na nzọpụta ga-abịa nanị site n’ebe Jehova Chineke nọ site n’aka Jisọs Kraịst. N’ịbụ ndị ịhụnanya maka Jehova kpaliri, ha na-esonyere ụmụnna Kraịst e tere mmanụ n’ikwupụta okwukwe ha. Ha na-enwetakwa nkasi obi dị ukwuu site n’ihe onyeozi ahụ e nyere ike mmụọ nsọ kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta Jisọs na Ọ bụ Onyenwe anyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, a ga-azọpụta gị.”—Ndị Rom 10:9.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu bụ́ “ọnaozi” mesịkwara bịa na-ezo aka n’onye na-arụ ọrụ n’obí eze, n’ezoghị aka n’iwepụ ihe e ji enwe mmekọahụ. Ebe ọ bụ na onye Etiopia ahụ Filip mere baptism yiri ka ọ bụrịị onye na-eso ụzọ ndị Juu—e mere ya baptism tupu e megheere ndị na-abụghị ndị Juu, ndị a na-ebighị úgwù, ụzọ—ọ ghaghị ịbụ ọnaozi n’echiche a.—Ọrụ 8:27-39.
b A kpọrọ Ebed-melek, bụ́ onye nyeere Jeremaịa aka nakwa onye pụrụ ịgakwuru Eze Zedekaịa n’onwe ya, ọnaozi. Nke a yiri ka ọ na-ezo aka n’ọbụbụ ọ bụ onye ọrụ n’obí eze kama n’ịbụ onye a pịrị apị.—Jeremaịa 38:7-13.
[Foto dị na peeji nke 250]
Ụbọchị Izu Ike ga-eme ka e nwee ohere maka ekpere, ọmụmụ ihe, na ntụgharị uche
[Foto ndị dị na peeji nke 256]
A kọwara ọnọdụ nke atụrụ ọzọ ahụ n’ụzọ doro anya n’otu mgbakọ e nwere na Washington, D.C. na 1935 (e sepụtara ebe a na-eme baptism n’okpuru, usoro ihe omume dị n’aka nri)
[Foto dị na peeji nke 259]
A na-akpọ anụ ọhịa òkù ịbịa rie ihe
[Foto ndị dị na peeji nke 261]
Ndị ala ọzọ na Israel nke Chineke dị n’otu, ha na ibe ha