Atụrụ Ọzọ ahụ na Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
“Ụmụ ala ọzọ . . . , onye ọ bụla nke na-edebe ụbọchị izu ike ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike; M ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m.”—AỊSAỊA 56:6, 7.
1. (a) Dị ka ọhụụ Jọn si dị, gịnị ka a na-arụzu ka a na-ejighachi ikuku ikpe Jehova azụ? (b) Olee ìgwè mmadụ dị ịrịba ama Jọn hụrụ?
N’ỌHỤỤ nke anọ n’akwụkwọ Mkpughe, Jọn onyeozi hụrụ ka a na-ejighachi ikuku mbibi nke ikpe Jehova azụ ka a na-akazu ndị òtù nile nke “Israel nke Chineke” akara. Ndị a bụ ndị mbụ a gọziri site na Jisọs, akụkụ bụ́ isi nke mkpụrụ Abraham. (Ndị Galetia 6:16; Jenesis 22:18; Mkpughe 7:1-4) N’otu ọhụụ ahụ, Jọn hụrụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile . . . , ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9, 10) N’ikwu, “Nzọpụta dịịrị . . . Nwa atụrụ ahụ,” oké ìgwè mmadụ ahụ na-egosi na a gọzikwara ha site ná Mkpụrụ Abraham.
2. Olee mgbe a hụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ, oleekwa otú e si mata ya?
2 A matara oké ìgwè mmadụ a laa azụ na 1935, taakwa ọ gafewo ihe karịrị nde ise n’ọnụ ọgụgụ. N’ịbụ ndị a kaworo akara ịlanarị oké mkpagbu ahụ, a ga-ekewapụ ndị òtù ya maka ndụ ebighị ebi mgbe Jisọs ga-ekewa “atụrụ” pụọ “n’ụmụ ewu.” Ndị Kraịst nke oké ìgwè mmadụ ahụ so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ n’ilu Jisọs nke ìgwè atụrụ. Ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs.—Matiu 25:31-46; Jọn 10:16; Mkpughe 21:3, 4.
3. Olee otú ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ si dị iche n’ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ?
3 Nye 144,000 ahụ, a na-emezu ngọzi nke ọgbụgba ndụ Abraham site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Dị ka ndị na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ a, ha na-abata “n’okpuru amara” na “n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ.” (Ndị Rom 6:15; 1 Ndị Kọrint 9:21) Ya mere, nanị ndị òtù 144,000 nke Israel nke Chineke kerewooro òkè n’ụzọ ziri ezi n’ihe nnọchianya ndị ahụ n’oge Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs, ọ bụkwa nanị ha ka Jisọs so gbaa ndụ maka Alaeze. (Luk 22:19, 20, 29) Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị ndị na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Otú ọ dị, ha na-esonyere Israel nke Chineke, sorokwa ha biri ‘n’ala’ ha. (Aịsaịa 66:8) Ya mere ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ha batakwara n’okpuru amara Jehova na n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ. Ọ bụ ezie na ha abụghị ndị na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha bụ ndị na-erite uru site na ya.
“Ụmụ Ala Ọzọ” na “Israel nke Chineke”
4, 5. (a) Dị ka Aịsaịa si kwuo, olee ìgwè ga-ejere Jehova ozi? (b) Olee otú e si emezu Aịsaịa 56:6, 7 n’ebe oké ìgwè mmadụ ahụ nọ?
4 Aịsaịa onye amụma dere, sị: “Ụmụ ala ọzọ kwa, ndị na-arapara Jehova, ijere Ya ozi, na ịhụ aha Jehova n’anya, na ịbụrụ Ya ndị ohu, onye ọ bụla nke na-edebe ụbọchị izu ike ghara ime ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nke na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike; M ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m, M ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m; àjà nsure ọkụ nile ha na àjà nile ha ga-abụ ihe na-atọ ụtọ n’elu ebe ịchụàjà m.” (Aịsaịa 56:6, 7) N’Israel, nke a pụtara na “ụmụ ala ọzọ,” ndị na-abụghị ndị Israel, ga-efe Jehova ofufe—na-ahụ aha ya n’anya, na-erubere okwu nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ isi, na-edebe Ụbọchị Izu Ike, na-achụkwa àjà n’ụlọ nsọ, “ụlọ ekpere” Chineke.—Matiu 21:13.
5 N’ụbọchị anyị, “ụmụ ala ọzọ . . . na-arapara Jehova” bụ oké ìgwè mmadụ ahụ. Ndị a so Israel nke Chineke na-ejere Jehova ozi. (Zekaraịa 8:23) Ha na-achụ otu ụdị àjà ahụ a na-anakwere dị ka nke Israel nke Chineke. (Ndị Hibru 13:15, 16) Ha na-efe ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ Chineke, bụ́ “ụlọ ekpere” ya. (Tụlee Mkpughe 7:15.) Hà na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu? E nyeghị ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ iwu ime nke a. (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Otú ọ dị, Pọl gwara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke. N’ihi na onye bataworo n’izu ike ya, ya onwe ya ezuwokwa ike n’ọrụ ya nile, dị ka Chineke zuru ike n’ọrụ nke aka Ya.” (Ndị Hibru 4:9, 10) Ndị Hibru ahụ banyere ‘n’ụbọchị izu ike’ a mgbe ha doro onwe ha n’okpuru “ezi omume Chineke” ma zuru ike site n’ịgbalị ime onwe ha ka ha zie ezi site n’ọrụ nke Iwu ahụ. (Ndị Rom 10:3, 4) Ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ na-anụ ụtọ otu ụdị izu ike ahụ site n’ido onwe ha n’okpuru ezi omume Jehova. Oké ìgwè mmadụ ahụ na-esonyere ha n’izu ike ahụ.
6. Olee otú atụrụ ọzọ si jigidesie ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike taa?
6 Ọzọ, atụrụ ọzọ na-ejisi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ike dị nnọọ ka ụmụ ala ọzọ nke oge ochie jidesiri ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ike. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụghị site n’ịbụ ndị na-ekere òkè na ya kama site n’ido onwe ha n’okpuru iwu ndị metụtara ya na irite uru ná ndokwa ya nile. (Tụlee Jeremaịa 31:33, 34.) Dị ka ndị ibe ha e tere mmanụ, atụrụ ọzọ ahụ bụ ndị e dekwasịrị iwu Jehova ‘n’obi ha.’ Ha nwere ịhụnanya miri emi maka Jehova ma na-edebe iwu na ụkpụrụ ya. (Abụ Ọma 37:31; 119:97) Dị ka ndị Kraịst e tere mmanụ, ha ma Jehova. (Jọn 17:3) Gịnị banyere obibi úgwù? Ihe dị ka afọ 1,500 tupu a gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Mosis gbara ndị Israel ume, sị: “Biekwanụ obi unu úgwù.” (Deuterọnọmi 10:16; Jeremaịa 4:4) Ọ bụ ezie na ibi úgwù anụ ahụ bụ́ iwu so Iwu ahụ gabiga, ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ aghaghị ‘ibi’ obi ha úgwù. (Ndị Kọlọsi 2:11) N’ikpeazụ, Jehova na-agbaghara ndahie nke atụrụ ọzọ ahụ ná ndabere nke ‘ọbara nke ọgbụgba ndụ’ Jisọs a wụsịrị. (Matiu 26:28; 1 Jọn 1:9; 2:2) Chineke adịghị ekuchi ha dị ka ụmụ ime mmụọ, dị ka ọ na-eme 144,000 ahụ. Ma ọ na-agụ atụrụ ọzọ ahụ ná ndị ezi omume, n’echiche ahụ e ji gụọ Abraham n’onye ezi omume dị ka enyi Chineke.—Matiu 25:46; Ndị Rom 4:2, 3; Jemes 2:23.
7. Olee olileanya ndị na-emeghere atụrụ ọzọ ahụ taa, bụ́ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka a gụrụ Abraham?
7 Nye 144,000 ahụ, ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume na-emeghe ụzọ ha inwe olileanya nke iso Jisọs chịa n’Alaeze eluigwe. (Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Galetia 2:16) Nye atụrụ ọzọ ahụ, ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke na-enye ha ohere ịnakwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs—site n’ịbụ ndị lanarịrị Amagedọn dị ka akụkụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ ma ọ bụ site ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume.” (Ọrụ 24:15) Lee ihe ùgwù ọ bụ inwe olileanya dị otú ahụ na ịbụ enyi Eze eluigwe na ala, ịnọ “dị ka ọbịa n’ụlọikwuu [ya]”! (Abụ Ọma 15:1, 2) Ee, a na-agọzi ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ n’ụzọ dị ebube site na Jisọs, bụ́ Mkpụrụ Abraham.
Ụbọchị Mkpuchi Mmehie Ka Ukwuu
8. Gịnị ka àjà Ụbọchị Mkpuchi Mmehie n’okpuru Iwu ahụ bụ ihe atụ ya?
8 Mgbe ọ na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Pọl chetaara ndị na-agụ akwụkwọ ya Ụbọchị Mkpuchi Mmehie kwa afọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. N’ụbọchị ahụ, a na-achụ àjà dị iche iche—otu maka ebo ndị nchụàjà Livaị nakwa ọzọ maka ebo 12 na-abụghị ndị nchụàjà. Ọ dịwo anya a kọwara nke a dị ka ihe na-ese onyinyo àjà ukwu Jisọs nke ga-abara ma 144,000 nwere olileanya eluigwe nakwa ọtụtụ nde ndị nwere olileanya elu ala uru.a Pọl gosiri na ná mmezu ya, a na-eme ka e rite uru àjà Jisọs site n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka ukwuu n’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Dị ka Onyeisi Nchụàjà nke ụbọchị a ka ukwuu, Jisọs nyere ndụ ya zuru okè dị ka àjà mkpuchi mmehie iji nwetara ụmụ mmadụ “mgbapụta ebighị ebi.”—Ndị Hibru 9:11-24.
9. N’ịnọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, gịnị ka ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ inweta?
9 Ọtụtụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ka nọ ‘na-anụkwa ọkụ n’obi nye iwu [Mosis].’ (Ọrụ 21:20) Mgbe ahụ, n’ụzọ dabara adaba, Pọl chetaara ha, sị: “[Jisọs] bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ọ ga-abụ, ebe otu Onye nwụrụ ịgbapụta mmadụ n’aka njehie nile nke dị n’okpuru ọgbụgba ndụ mbụ ahụ, ka ndị a kpọworo wee nata nkwa nke nketa ebighị ebi ahụ.” (Ndị Hibru 9:15) Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ tọhapụrụ ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst pụọ n’ọgbụgba ndụ ochie ahụ, bụ́ nke gbara mmehie ha n’anwụ. N’ihi ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ha pụrụ inweta “nkwa nke nketa [eluigwe] ebighị ebi ahụ.”
10. Gịnị ka ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-ekele Chineke maka ya?
10 “Onye ọ bụla” nke “kwere n’Ọkpara ahụ” ga-erite uru site n’àjà mgbapụta ahụ. (Jọn 3:16, 36) Pọl sịrị: “Kraịst, ebe e chere Ya n’ihu Chineke nanị otu mgbe iburu mmehie nile nke ọtụtụ mmadụ, Ọ ga-emekwa ka ndị na-eche Ya hụ Ya anya nke ugbo abụọ, ma mmehie adịghị ya, ka e wee zọpụta ha.” (Ndị Hibru 9:28) Taa, ndị na-echesi ike ịhụ Jisọs na-agụnye ndị Kraịst e tere mmanụ ka dị ndụ nke Israel nke Chineke na ọtụtụ nde ndị na-emejupụta oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị nwekwara nketa ebighị ebi. Òtù abụọ a na-ekele Chineke maka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa ngọzi na-enye ndụ e jikọtara ha na ya, tinyere Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka ukwuu na ozi Onyeisi Nchụàjà, bụ́ Jisọs, n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile n’eluigwe.
Iji Ọrụ n’Aka n’Ije Ozi Dị Nsọ
11. N’ịbụ ndị e mere ka akọ na uche ha dị ọcha site n’àjà Jisọs, gịnị ka ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ ji obi ụtọ eme?
11 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, Pọl mesiri ike uru ka ukwuu nke àjà Jisọs ná ndokwa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ma e jiri ya tụnyere àjà mmehie ndị a na-achụ n’okpuru ọgbụgba ndụ ochie ahụ. (Ndị Hibru 9:13-15) Àjà Jisọs ka mma nwere ike “ime akọ na uche anyị ka ọ dịkarịa ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ ikpere Chineke dị ndụ.” Nye ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst, “ọrụ nile nwụrụ anwụ” gụnyere “njehie nile nke dị n’okpuru ọgbụgba ndụ mbụ ahụ.” Nye ndị Kraịst taa, ha na-agụnye mmehie ndị e mere n’oge gara aga bụ́ ndị e gosiworo ezi nchegharị na ha bụrụkwa ndị Chineke gbagharawooro. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Site n’akọ na uche ndị e mere ka ha dị ọcha, ndị Kraịst e tere mmanụ ‘na-ekpere Chineke dị ndụ.’ Oké ìgwè mmadụ ahụ na-emekwa otú ahụ. N’ịbụ ndị meworo ka akọ na uche ha dị ọcha site ‘n’ọbara Nwa atụrụ ahụ,’ ha nọ n’ụlọ nsọ ukwu ime mmụọ Chineke, “na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị.”—Mkpughe 7:14, 15.
12. Olee otú anyị si egosi na anyị nwere “nkwezu nke okwukwe”?
12 Ọzọkwa, Pọl sịrị: “Ka anyị were obi eziokwu bịaruo nso n’ime nkwezu nke okwukwe, bụrụkwa ndị e fesaworo ọbara n’obi anyị pụọ n’ajọ akọ na uche, ndị a sachawokwara ahụ anyị na mmiri dị ọcha.” (Ndị Hibru 10:22) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere “nkwezu nke okwukwe”? Pọl gbara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya [eluigwe] anyị ike ka ọ ghara iruda n’ala; n’ihi na Onye ahụ Nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi: ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:23-25) Ọ bụrụ na okwukwe anyị dị ndụ, anyị kwa agaghị ‘ahapụ nzukọ nke onwe anyị.’ Anyị ga-enweta ọṅụ n’ịdụsi ụmụnna anyị ọdụ ike na ha ịdụ anyị ọdụ ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche nakwa ịbụ ndị e wusiri ike maka ọrụ dị mkpa nke ikwusa olileanya anyị, ma ọ bụ nke elu ala ma ọ bụ nke eluigwe n’ihu ọha.—Jọn 13:35.
“Ọgbụgba Ndụ Ebighị Ebi” Ahụ
13, 14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ nke ebighị ebi?
13 Gịnị ga-eme mgbe ndị ikpeazụ so na 144,000 natara olileanya eluigwe ha? Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ọ̀ ga-akwụsị ịdị irè? N’oge ahụ, a gaghị enwe onye òtù nke Israel nke Chineke ga-afọdụ n’elu ala. Ndị nile na-ekere òkè n’ọgbụgba ndụ ahụ ga-esonyere Jisọs “n’alaeze Nna [ya].” (Matiu 26:29) Ma anyị na-echeta okwu Pọl n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru: “Chineke nke udo . . . weere ọbara nke ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ si ná ndị nwụrụ anwụ kughachi oké Onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ Ya.” (Ndị Hibru 13:20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; Aịsaịa 55:3.) N’echiche dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ bụ nke ebighị ebi?
14 Nke mbụ, n’adịghị ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, a gaghị edochi ya ma ọlị. Nke abụọ, ihe ndị si n’ịrụ ọrụ ya pụta na-adịgide adịgide, ọbụna dị ka ọbụbụeze Jisọs. (Jiri Luk 1:33 tụnyere 1 Ndị Kọrint 15:27, 28.) Alaeze eluigwe nwere ọnọdụ ebighị ebi ná nzube Jehova. (Mkpughe 22:5) Nke atọ kwa, atụrụ ọzọ ahụ ga-anọgide na-erite uru site ná ndokwa ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị ga-anọgide “na-efekwa [Jehova] ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya” dị ka ha na-eme ugbu a. Jehova agaghị ewelitekwa ọzọ mmehie ha ndị gara aga bụ́ ndị a gbaghaara ná ndabere nke ‘ọbara ọgbụgba ndụ’ Jisọs. Ha ga-anọgide na-anụ ụtọ nguzo ezi omume dị ka ndị enyi Jehova, iwu ya ka ga-anọgide bụrụ nke e deworo n’obi ha.
15. Kọwaa mmekọrịta Jehova na ndị na-efe ya ofufe n’ụwa ọhụrụ ahụ.
15 Mgbe ahụ Jehova ọ̀ ga-enwe ike ikwu banyere ndị ohu a bụ́ mmadụ: ‘Abụ m Chineke ha, ha bụkwa ndị m’? Ee. “Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha.” (Mkpughe 21:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ha ga-abụ “ọmụma ụlọikwuu ndị nsọ,” ndị nnọchiteanya nke “obodo nsọ ahụ,” bụ́ nwanyị eluigwe a na-alụ ọhụrụ nke Jisọs Kraịst. (Mkpughe 14:1; 20:9; 21:2) Ihe ndị a nile ga-ekwe mee n’ihi okwukwe ha ‘n’ọbara ọgbụgba ndụ’ Jisọs a wụsịrị na ido onwe ha n’okpuru ndị eze na ndị nchụàjà eluigwe, bụ́ ndị mgbe ha nọ n’elu ala bụ Israel nke Chineke.—Mkpughe 5:10.
16. (a) Ohere ndị dị aṅaa na-echere ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’elu ala? (b) Olee ngọzi ndị ga-abịa ná ngwụsị nke puku afọ ahụ?
16 Gịnị banyere ndị nwụrụ anwụ e si n’ọnwụ kpọlite n’elu ala? (Jọn 5:28, 29) A ga-akpọkwa ha ‘ịgọzi onwe ha’ site na Jisọs, bụ́ Mkpụrụ Abraham. (Jenesis 22:18) Ha ga-ahụkwa aha Jehova n’anya, na-ejere ya ozi, na-achụ àjà a na-anakwere, na-ejekwara ya ozi dị nsọ n’ụlọ ekpere ya. Ndị mere otú ahụ ga-aba n’ime izu ike Chineke. (Aịsaịa 56:6, 7) Ná ngwụsị nke puku afọ ahụ, a ga-emeworị ka ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi ruo izu okè mmadụ site n’ije ozi Jisọs Kraịst na 144,000 ndị nchụàjà ibe ya. Ha ga-abụ ndị ezi omume, ọ bụghị nanị ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke. Ha ‘ga-adị ndụ,’ n’ịbụ ndị nweere onwe ha kpam kpam pụọ ná mmehie na ọnwụ e ketara site n’Adam. (Mkpughe 20:5; 22:2) Lee aha ngọzi nke ahụ ga-abụ! Site n’ụzọ anyị si ele ihe anya taa, o yiri ka ọrụ nchụàjà Jisọs na 144,000 ahụ ga-abụworị nke a rụzuru mgbe ahụ. A ga-ewetaworị ngọzi ndị nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ahụ n’ùjù. Ọzọ, Jisọs ‘ga-arara alaeze Ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna.’ (1 Ndị Kọrint 15:24) A ga-ele ihe a kpọrọ mmadụ ule ikpeazụ, e mesịakwa a ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo ebighị ebi.—Mkpughe 20:7, 10.
17. N’ihi ọṅụ na-echere anyị, olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
17 Òkè dị aṅaa, ma ọ bụrụ na e nwere nke dị, ka “ọgbụgba ndụ ebighị ebi” ahụ ga-ekere n’ọgbọ obi ụtọ ahụ ga-amalitezi? Nke ahụ adịghịrị anyị ikwu. Ihe Jehova kpugheworo ka ọ dị ugbu a ezuwo. Ọ na-atụ anyị n’anya. Chee nnọọ echiche—ndụ ebighị ebi dị ka akụkụ nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”! (2 Pita 3:13) Ka ihe ọ bụla ghara ime ka ọchịchọ anyị iketa nkwa ahụ daa mbà. Iguzosi ike nwere ike ọ gaghị adị mfe. Pọl sịrị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 10:36) Otú ọ dị, cheta na nsogbu ọ bụla a ga-emeri, mmegide ọ bụla a ga-anagide, agaghị abụ ihe ọ bụla ma e jiri ha tụnyere ọṅụ na-echere anyị. (2 Ndị Kọrint 4:17) N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara iso “n’etiti ndị wezụgara onwe ha n’ịla n’iyi.” Kama, ka anyị nwapụta onwe anyị iso “n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.” (Ndị Hibru 10:39) Ka anyị nile nwee ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova, bụ́ Chineke nke ọgbụgba ndụ, maka ngọzi ebighị ebi nke onye ọ bụla n’ime anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, isi nke 13, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Ghọtara?
◻ E wezụga ndị Kraịst e tere mmanụ, olee ndị a na-agọzi site ná Mkpụrụ Abraham?
◻ N’ịbụ ndị a gọziri site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, olee otú atụrụ ọzọ ahụ si dị ka ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’okpuru ọgbụgba ndụ ochie ahụ?
◻ Olee otú e si agọzi atụrụ ọzọ ahụ site ná ndokwa Ụbọchị Mkpuchi Mmehie ka ukwuu?
◻ N’ihi gịnị ka Pọl ji kpọọ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi”?
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ije Ozi Dị Nsọ n’Ụlọ Nsọ
Oké ìgwè mmadụ ahụ so ndị Kraịst e tere mmanụ na-efe ofufe n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova. (Mkpughe 7:14, 15; 11:2) Ọ dịghị ihe mere a ga-eji kwubie na ha nọ n’Ogige Ndị Jentaịl dịpụrụ iche. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, e nwere Ogige Ndị Jentaịl n’ụlọ nsọ ahụ. Otú ọ dị, n’ụkpụrụ ụlọ nsọ Solomọn na Ezikiel sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, e nweghị ndokwa maka Ogige Ndị Jentaịl. N’ụlọ nsọ Solomọn, e nwere ogige dị n’èzí ebe ndị Israel na ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ndị ikom na ndị inyom, fekọrọ ofufe ọnụ. Nke a bụ ihe atụ amụma nke ogige elu ala nke ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ, ebe Jọn hụrụ oké ìgwè mmadụ ka ha na-eje ozi dị nsọ.
Otú ọ dị, nanị ndị nchụàjà na ndị Livaị pụrụ ịbanye n’ogige nke dị n’ime, ebe ebe ịchụàjà ukwu ahụ dị; nanị ndị nchụàjà pụrụ ịbanye n’Ebe Nsọ ahụ; nanị onye isi nchụàjà pụkwara ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. A ghọtara ime ime ogige ahụ na Ebe Nsọ ahụ ise onyinyo ọnọdụ ime mmụọ pụrụ iche nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’elu ala. Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile na-esekwa onyinyo eluigwe n’onwe ya, ebe ndị Kraịst e tere mmanụ so Onyeisi Nchụàjà eluigwe ha na-anata ndụ anwụghị anwụ.—Ndị Hibru 10:19, 20.
[Foto dị na peeji nke 23]
N’ihi ọṅụ na-echere anyị, ka anyị “dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha”