Osisi Olive Nwere Akwụkwọ Ndụ n’Ụlọ Chineke
OTU osisi nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ibibi ebibi na-eto n’ala Israel. Ọbụna mgbe e gbuturu ya, mkpọrọgwụ ya na-epulite ome ọhụrụ n’oge na-adịghị anya. Mgbe a ghọkwaara mkpụrụ ya, ọ na-agbara onye nwe ya mmanụ n’ụba bụ́ nke a pụrụ iji sie nri, mụnye ọkụ, sachaa ihe, meekwa ihe ntecha.
Dị ka otu ilu oge ochie e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Ikpe si kwuo, “osisi jere eje ite otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ha.” Olee osisi ọhịa ha bu ụzọ họpụta? Ọ dịghị osisi ọzọ ọ bụ karịa osisi olive siri ike, nke na-amị mkpụrụ n’ụba.—Ndị Ikpe 9:8.
Ihe karịrị afọ 3,500 gara aga, onye amụma bụ́ Mosis kọwara Israel dị ka ‘ezi ala, ala nke osisi olive.’ (Deuterọnọmi 8:7, 8) Ọbụna taa, ubi olive jupụtara n’ala ahụ, site n’ala ala Ugwu Heamọn nke dị n’ebe ugwu ruo ná mpụga Biasheba n’ebe ndịda. Ha ka chọrọ Ala Dị Larịị nke Sherọn bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri, ugwu nkume nkume nke Sameria, na ndagwurugwu ndị na-eme nri nke Galili, mma.
Ndị dere Bible ji osisi olive mee ihe mgbe mgbe n’ụzọ ihe atụ. E ji akụkụ dị iche iche nke osisi a mee ihe iji gosipụta ebere Chineke, nkwa mbilite n’ọnwụ, na ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Ilebatụkwu anya n’osisi olive ga-enyere anyị aka ịghọta ebe ndị a e zoro aka na ya n’Akwụkwọ Nsọ, ọ ga-emekwa ka ekele anyị mikwuo emie maka osisi a pụrụ iche bụ́ nke so ihe ndị ọzọ e kere eke na-eto Onye Mere ha.—Abụ Ọma 148:7, 9.
Osisi Olive Ahụ Ya Na-adịghị Mụrụmụrụ
Osisi olive adịghị adọrọ mmasị karịsịa n’oge mbụ a hụrụ ya. Ọ dịghị etopụ etopụ dị ka ụfọdụ nnukwu osisi cedar nke Lebanọn. Osisi ya adịghị oké ọnụ ahịa dị ka juniper, okooko ya adịghịkwa ama mma ile anya dị ka nke osisi almọnd. (Abụ nke Abụ 1:17; Emọs 2:9) Akụkụ kasị mkpa nke osisi olive dị n’ebe a na-adịghị ahụ anya—n’okpuru ala. Ihe bụ́ isi mere osisi ahụ ji amị mkpụrụ n’ụba ma na-adịte aka bụ ogologo mkpọrọgwụ ya, bụ́ ndị pụrụ iru mita isii n’ime ime ala ma gbatịpụ agbatịpụ ruo ihe karịrị nke ahụ.
Mkpọrọgwụ ndị dị otú ahụ na-eme ka o kwe osisi olive ndị dị n’ugwu nkume jupụtara omume ịlanarị oké ọkọchị mgbe osisi ndị dị na ndagwurugwu nwụrụlarịị n’ihi enwetaghị mmiri. Mkpọrọgwụ ya na-eme ka o nwee ike ịnọgide na-amị mkpụrụ ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ ezie na ogwe gbara akpụ akpụ pụrụ iyi ihe dị mma nanị iji mere nkụ. Nanị ihe osisi a ahụ ya na-adịghị mụrụmụrụ chọrọ bụ ebe ọ ga-anọ too na ájá ikuku na-abanye na ya ka o wee nwee ike iku ume, nakwa nke ahịhịa ma ọ bụ ahịhịa ndụ ndị ọzọ ndị pụrụ ịkpọta ụmụ ahụhụ ndị na-emebi ihe, na-adịghị. Ọ bụrụ na e mezuo ihe ndị a dị mfe ọ chọrọ, otu osisi ga-emepụta mmanụ ruru lita 57 n’otu afọ.
Obi abụọ adịghị ya na ụmụ Israel hụrụ olive n’anya nke ukwuu n’ihi mmanụ ya dị oké ọnụ ahịa. Oriọna ndị nwere owú ndị na-adọta mmanụ olive nyere ìhè n’ebe obibi ha. (Levitikọs 24:2) Mmanụ olive dị oké mkpa n’isi nri. O chebere akpụkpọ ahụ ụmụ Israel pụọ n’anyanwụ, ha sikwa na ya na-enweta ncha ha ji na-asa ihe. Mkpụrụ ọghịgha, mmanya, na olive bụ ihe ndị bụ́ isi a na-emepụta n’ala ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụrụ ezinụlọ ndị Israel ọdachi ma ọ bụrụ na osisi olive amịghị mkpụrụ.—Deuterọnọmi 7:13; Habakuk 3:17.
Otú ọ dị, a na-enwekarị mmanụ olive n’ụba. Mosis zoro aka n’Ala Nkwa ahụ dị ka ‘ala nke osisi olive,’ ikekwe ọ bụ n’ihi na olive bụ osisi a kasị akụ n’ógbè ahụ. Ọkà mmụta ihe ndị si n’okike nke narị afọ nke 19 bụ́ H. B. Tristram kọwara osisi olive dị ka “otu osisi e ji mara mba ahụ.” N’ihi uru ya na ịba ụba ya, mmanụ olive jere ozi ọbụna dị ka ihe bara uru nke mba ndị dị n’ógbè Mediterranean dum ji zụrịta ahịa. Jisọs Kraịst n’onwe ya zoro aka n’ụgwọ e ji nke a gbakọtara ịbụ ‘otu narị mgbé mmanụ olive.’—Luk 16:5, 6.
‘Dị Ka Ome Osisi Olive’
Osisi olive bara uru na-eme ihe atụ nke ngọzi Chineke n’ụzọ dabara adaba. À ga-esi aṅaa kwụghachi onye na-atụ egwu Chineke ụgwọ? “Nwunye gị ga-adị ka osisi vine na-amị mkpụrụ n’ime ime ụlọ nke ụlọ gị,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. “Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi olive gburugburu tebụl gị.” (Abụ Ọma 128:3) Gịnị bụ “ome osisi olive” ndị a, n’ihi gịnịkwa ka ọbụ abụ ahụ ji jiri ha tụnyere ụmụ?
Osisi olive na-agbapụ iche n’ihi na ome ọhụrụ na-esi n’úkwù ya epulite mgbe nile.a Mgbe osisi ahụ, n’ihi ịka nká, na-adịghịzi amị mkpụrụ dị ka ọ na-amịbu, ndị na-elekọta ya pụrụ ịhapụ ya ka ọtụtụ ome ọhụrụ tolite ruo mgbe ha ga-aghọ akụkụ bụ́ isi nke osisi ahụ. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, osisi mbụ ahụ ga-enwe osisi atọ ma ọ bụ anọ kwụ chịm bụ́ ndị gbara ya gburugburu, dịka ụmụaka gbara tebụl gburugburu. Ome ndị a nwere otu usoro mkpọrọgwụ, ha na-ekerekwa òkè n’ịmịpụta mkpụrụ olive ọma.
Njimara nke a nke osisi olive na-egosipụta nke ọma otú ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom pụrụ isi na-eguzosi ike n’okwukwe, n’ihi mkpọrọgwụ ime mmụọ siri ike nke ndị mụrụ ha. Ka ụmụaka na-emekwu okenye, ha na-ekerekwa òkè n’ịmị mkpụrụ na ịkwado ndị mụrụ ha, bụ́ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ịhụ ka ụmụ ha so ha na-ejere Jehova ozi.—Ilu 15:20.
“Olileanya Dịịrị Osisi”
Nna mere okenye nke na-ejere Jehova ozi na-enwe obi ụtọ n’ebe ụmụ ya na-asọpụrụ Chineke nọ. Ma ụmụaka a na-eru újú mgbe nna ha mesịrị ‘jee n’ụzọ ụwa nile.’ (1 Ndị Eze 2:2) Iji nyere anyị aka ịnagide ọdachi ezinụlọ dị otú ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; 11:25.
Job, bụ́ nwoke mụrụ ọtụtụ ụmụ, maara nke ọma banyere ụbọchị ndụ dị mkpụmkpụ nke mmadụ. O ji ya tụnyere okooko osisi nke na-akpọnwụ ngwa ngwa. (Job 1:2; 14:1, 2) Ọnwụ gụrụ Job agụụ dị ka ụzọ isi gbanahụ ihe mgbu ya, o lere ili anya dị ka ebe nzopụ bụ́ nke ọ pụrụ isi na ya lọghachi. “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” ka Job jụrụ. Mgbe ahụ, o ji obi ike zaa, sị: “Ụbọchị nile nke obubu agha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị [Jehova] ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.”—Job 14:13–15.
Olee otú Job si gosipụta nkwenye o kwenyere na Chineke ga-akpọpụta ya n’ili? Ọ bụ site n’osisi, bụ́ nke nkọwa ya na-eme ka o yie ka ọ na-ezo aka n’olive. “Olileanya dịịrị osisi,” ka Job kwuru. “Ọ ga-epute ọzọ, ma e gbutuo ya.” (Job 14:7) A pụrụ igbutu osisi olive, ma nke ahụ apụghị ibibi ya. Ọ gwụla ma e fopụrụ osisi ahụ efopụ bụ ya anwụọ. Ọ bụrụ na mkpọrọgwụ ya ka dị n’ime ala, osisi ahụ ga-epute ọzọ ngwa ngwa.
Ọ bụrụgodị na oké ọkọchị akpọnwụọ nnọọ osisi olive ochie, ogwe osisi ahụ kpọnwụrụnụ pụrụ ịdịghachi ndụ. “Ọ bụrụ na mkpọrọgwụ ya emee ochie n’ala, ogwe ya anwụọkwa n’ájá; site n’ísì mmiri ọ ga-ama akwụkwọ, waakwa alaka dị ka ihe a kụrụ akụ.” (Job 14:8, 9) Job biri n’ala kpọrọ nkụ, nke uzuzu jupụtara bụ́ ebe, ma eleghị anya, o kiriworo ọtụtụ ogwe osisi olive ochie bụ́ ndị yiri ihe kpọrọ nkụ ma nwụọ anwụọ n’ile anya. Otú ọ dị, mgbe mmiri zoro, osisi “nwụrụ anwụ” dị otú ahụ dịghachiri ndụ, ogwe ọhụrụ sikwa na mkpọrọgwụ ya pụlite dị ka a ga-asị na ọ bụ “osisi ọhụrụ.” Ikike mgbake a dị ịrịba ama dugara otu onye Tunisia bụ́ ọkà mmụta banyere ihe ọkụkụ, ikwu, sị: “Mmadụ pụrụ ikwu n’ụzọ dabara adaba na osisi olive adịghị anwụ anwụ.”
Dị nnọọ ka o si agụ onye ọrụ ugbo agụụ ịhụ osisi olive ya ndị kpọnwụrụ akpọnwụ ka ha putere ọzọ, otú ahụ ka ọ na-agụ Jehova agụụ ịkpọlite ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ. Ọ na-atụ anya oge ọ ga-eme ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Abraham na Sera, Aịsak na Rebeka, na ọtụtụ ndị ọzọ, dịghachi ndụ. (Matiu 22:31, 32) Lee ihe dị ebube ọ ga-abụ ịnabata ndị nwụrụ anwụ ma hụ ha ọzọ ka ha na-ebi ndụ zuru okè na nke na-eju afọ!
Osisi Olive Ihe Atụ Ahụ
Ebere Chineke pụtara ìhè n’eleghị mmadụ anya n’ihu ya nakwa ná ndokwa o mere maka mbilite n’ọnwụ. Pọl onyeozi ji osisi olive mee ihe iji gosi otú ebere Jehova si eru ndị mmadụ n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ otú e si zụlite ha. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị Juu akpawo nganga n’ihi ịbụ ndị Chineke họpụtara, bụ́ ‘mkpụrụ Abraham.’—Jọn 8:33; Luk 3:8.
Ịbụ onye a mụrụ ná mba ndị Juu abụghị n’onwe ya ihe a chọrọ iji nweta ihu ọma Chineke. Otú ọ dị, ndị mbụ soro ụzọ Jisọs bụcha ndị Juu, ha nwekwara ihe ùgwù nke ịbụ ụmụ mmadụ mbụ Chineke họọrọ imejupụta mkpụrụ Abraham ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 22:18; Ndị Galetia 3:29) Pọl ji ndị Juu a na-eso ụzọ tụnyere alaka osisi olive ihe atụ.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu anụ ahụ jụrụ Jisọs, na-eme ka ha ghara iru eru dị ka ndị ga-eso ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ, ma ọ bụ “Israel nke Chineke,” n’ọdịnihu. (Luk 12:32; Ndị Galetia 6:16) N’ụzọ dị otú a, ha dị ka alaka olive ihe atụ e gbupụrụ egbupụ. Olee ndị ga-anọchi ha? N’afọ 36 O.A., a họtara ndị Jentaịl ịghọ akụkụ nke mkpụrụ Abraham. Ọ dị ka a ga-asị na Jehova ewerewo alaka olive ọhịa nyakụdo n’ahụ osisi olive ọma. Ndị ga-emejupụta mkpụrụ Abraham ahụ e kwere ná nkwa ga-agụnye ndị mba ọzọ. Ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst pụziri ịghọ ‘ndị na-enwekọ mkpọrọgwụ nke ụmị nke olive ahụ.’—Ndị Rom 11:17.
Nye onye ọrụ ugbo, ịnyakụdo alaka olive ọhịa n’ahụ osisi olive ọma ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya na ihe “na-emegide ka o si pụta ụwa.” (Ndị Rom 11:24) “Nyakụdo osisi ọma n’ahụ nke ọhịa, dịkwa ka ndị Arab si ekwu ya, ọ ga-emeri nke ọhịa ahụ,” ka akwụkwọ bụ́ The Land and the Book na-akọwa, “ma ị pụghị inwe ihe ịga nke ọma n’iji nke ọhịa nyakụdo na nke ọma.” N’otu aka ahụ, o juru ndị Juu bụ́ ndị Kraịst anya mgbe Jehova “buru ụzọ leta ndị mba ọzọ, isi n’etiti ha wepụtara aha Ya otu ndị.” (Ọrụ 10:44–48; 15:14) Otú ọ dị, nke a bụ ihe àmà doro anya na mmezu nke nzube Chineke adịghị adabere n’otu mba ọ bụla. Ee e, n’ihi na “n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:35.
Pọl gosipụtara na ebe ọ bụ na e gbupụwo “alaka” osisi olive nke ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi, otu ihe ahụ pụrụ ime onye ọ bụla ọzọ nke ji nganga na nnupụisi ghara ịnọgide na-enwe ihu ọma Jehova. (Ndị Rom 11:19, 20) Nke a na-egosi n’ezie na e kwesịghị iji obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke gwurie egwú ma ọlị.—2 Ndị Kọrint 6:1.
Ite Mmanụ
Akwụkwọ Nsọ zoro aka na mmanụ olive ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ. N’oge ochie, ‘a na-eji mmanụ eme ka ọnyá na ntirụ ahụ dị nrò’ iji mee ka ha laa ngwa ngwa. (Aịsaịa 1:6) Dị ka otu n’ime ilu Jisọs si kwuo, onye Sameria ahụ bụ́ ezigbo onye agbata obi wụkwasịrị mmanụ olive na mmanya vine n’ọnyá nke nwoke ahụ o zutere n’ụzọ Jeriko.—Luk 10:34.
Mmadụ ite mmanụ olive n’isi ya na-eme ka o nwee ume ọhụrụ, isi ya adịkwa jụụ. (Abụ Ọma 141:5) N’ilebakwara okwu ndị metụtara ọrịa ime mmụọ anya, ndị Kraịst bụ́ okenye pụrụ ‘ite onye òtù ọgbakọ mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị.’ (Jemes 5:14) E ji ndụmọdụ ịhụnanya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na ekpere sitere n’ala ala obi nke ndị okenye kpechiteere ndị kwere ekwe ibe ha na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ tụnyere mmanụ olive na-eme ka ahụ daa jụụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’akpaala okwu Hibru, mgbe ụfọdụ a na-akọwa nwoke bụ́ ezigbo mmadụ dị ka “mmanụ olive dị ọcha.”
“Osisi Olive Nwere Akwụkwọ Ndụ n’Ụlọ Chineke”
N’iburu isi ihe ndị a dị n’elu n’uche, ọ bụghị ihe ijuanya na a pụrụ iji ndị ohu Chineke tụnyere osisi olive. Devid chọrọ ịdị ka “osisi olive nwere akwụkwọ ndụ n’ụlọ Chineke.” (Abụ Ọma 52:8) Dị nnọọ ka ezinụlọ ndị Israel na-enwekarị osisi olive gburugburu ụlọ ha, n’otu aka ahụ, Devid chọrọ ịnọ Jehova nso na ịmị mkpụrụ iji nye Chineke otuto.—Abụ Ọma 52:9.
Mgbe alaeze ebo abụọ nke Juda kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova, ha dị ka “osisi olive dị ndụ, nke mara mma n’ịmị mkpụrụ ọma.” (Jeremaịa 11:15, 16) Ma ndị Juda tụfuru ọnọdụ ihe ùgwù ahụ mgbe ha ‘jụrụ ịnụ okwu Jehova ma jesoo chi ọzọ dị iche iche.’—Jeremaịa 11:10.
Iji ghọọ osisi olive nwere akwụkwọ ndụ n’ụlọ Chineke, anyị aghaghị irubere Jehova isi ma dị njikere ịnakwere ịdọ aka ná ntị bụ́ nke o ji “na-akwa” anyị ka anyị wee nwee ike ịmịkwu mkpụrụ ndị Kraịst. (Ndị Hibru 12:5, 6) Ọzọkwa, dị nnọọ ka mkpọrọgwụ ndị toro ogologo si dị osisi olive nkịtị mkpa iji lanarị oge oké ọkọchị, ọ dị anyị mkpa iwusi mkpọrọgwụ ime mmụọ anyị ike iji nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa na mkpagbu.—Matiu 13:21; Ndị Kọlọsi 2:6, 7.
Osisi olive na-ese nnọọ onyinyo onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ onye pụrụ ịbụ onye ụwa na-amaghị ma Chineke maara ya. Ọ bụrụ na onye dị otú ahụ anwụọ n’usoro ihe a, ọ ga-adị ndụ ọzọ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ.—2 Ndị Kọrint 6:9; 2 Pita 3:13.
Osisi olive nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-apụghị ibibi ebibi bụ́ nke na-anọgide na-amị mkpụrụ site n’afọ ruo n’afọ na-echetara anyị nkwa Chineke bụ́: “Dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:22) A ga-emezu nkwa ahụ e buru n’amụma n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—2 Pita 3:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-akwachakarị ome ọhụrụ ndị a kwa afọ ka ha wee ghara ịmịkọrọ ihe ndị na-enye nne ha ikike.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ogwe osisi ochie nke nwere akpụ bụ́ nke a hụrụ na Jávea, Ógbè Alicante, Spain
[Foto dị na peeji nke 26]
Ubi olive dị n’Ógbè Granada, Spain
[Foto dị na peeji nke 26]
Osisi olive oge ochie nke dị ná mpụga mgbidi Jerusalem
[Foto dị na peeji nke 26]
Bible na-ekwu banyere ịnyakụdo alaka n’ahụ osisi olive
[Foto dị na peeji nke 26]
Alaka ndị na-eto eto gbara osisi olive ochie a gburugburu