Isi nke 27
A Mụwo Alaeze Chineke!
Ọhụụ 7—Mkpughe 12:1-17
Isiokwu: Nwanyị ahụ a hụrụ n’eluigwe amụọ nwa, Maịkael ebuso Setan agha wee tụda ya n’ala
Oge mmezu ya: Malite n’oge Kraịst Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na 1914 ruo oké mkpagbu ahụ
1. N’ụzọ dị aṅaa ka nghọta nke ihe ịrịba ama ndị ahụ a kọwara ná Mkpughe isi nke 12 ruo 14 ga-esi nyere anyị aka?
E KPUGHEWO ihe omimi nke Chineke. (Mkpughe 10:7) Alaeze Chineke nke dị n’aka Mesaịa ya abụrụwo ihe dị adị ugbu a, nke na-arụsi ọrụ ike. Ọ na-achị achị! Ịdị adị ya pụtara mbibi nye Setan na mkpụrụ ya ma bụrụ mmeri dị ebube nye Mkpụrụ nke nzukọ Chineke dị n’eluigwe. Otú ọ dị, mmụọ ozi nke asaa ahụ afụchabeghị opi ya, n’ihi na ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-ekpughere anyị banyere ahụhụ nke atọ ahụ. (Mkpughe 11:14) Ihe àmà ndị ahụ a kọwara ná Mkpughe isi nke 12 ruo 14 ga-enyere anyị aka ịgbasapụ nghọta anyị nwere banyere ihe nile ahụhụ ahụ metụtara nakwa iweta ihe omimi nke Chineke ná mmezu ya.
2. (a) Oké ihe ịrịba ama dị aṅaa ka Jọn hụrụ? (b) Olee mgbe e kpughere ihe oké ihe ịrịba ama ahụ pụtara?
2 Ugbu a, Jọn hụrụ oké ihe ịrịba ama—nke bụ ihe oké mmasị nye ndị Chineke. Ọ na-akọwapụta otu ọhụụ amụma na-akpali akpali, nke e bipụtara ihe ọ pụtara nke mbụ ya ná mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke March 1, 1925, n’ihe odide nke isiokwu ya bụ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ,” e mesịakwa, na 1926, n’akwụkwọ ahụ bụ Deliverance. Oké mgbukepụ nke a nke nghọta Bible ghọrọ oké ihe omume n’ịga n’ihu nke ọrụ Jehova. Ya mere, ka Jọn kọwaa ihe nkiri ahụ ka ọ na-amalite ịsaghe: “E wee hụ oké ihe ịrịba ama n’eluigwe; nwanyị nke e gbokwasịworo ya anyanwụ dị ka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya abụọ, ọ na-ekpukwa okpueze nke kpakpando iri na abụọ n’isi ya; ọ dịkwa ime: o wee tie mkpu, ebe ime na-eme ya, a na-emekpakwa ya ahụ ịmụpụta nwa.”—Mkpughe 12:1, 2.
3. Gịnị bụ nwanyị ahụ nke a hụrụ n’eluigwe?
3 Na nke mbụ ya, Jọn hụrụ nwanyị n’eluigwe. O doro anya na ọ bụghị nwanyị efu. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe ịrịba ama, ma ọ bụ ihe atụ. (Mkpughe 1:1) Gịnị ka nwanyị a sere onyinyo ya? N’amụma ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, mgbe ụfọdụ ụmụ nwanyị na-anọchi anya òtù dị iche iche nke ndị ukwu dị iche iche a maara aha ha “lụrụ.” N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e kwuru okwu banyere Israel dị ka nwunye nke Jehova Chineke. (Jeremaịa 3:14) N’Akwụkwọ Nsọ Grik, a na-ekwu okwu banyere ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka nwunye nke Kraịst. (Mkpughe 21:9-14) Nwanyị ahụ nke Jọn hụrụ n’ebe a nwekwara onye lụrụ ya, ọ dịkwa njikere ịmụ nwa. Ònye bụ di ya? Otú ọ dị, e mesịrị “pụnara ya nwa ya ahụ laa n’ebe Chineke nọ, na n’ebe ocheeze ya dị.” (Mkpughe 12:5) Jehova si otú a na-akpọrọ nwa ahụ dị ka nke ya. Ya mere, nwanyị ahụ nke Jọn hụrụ aghaghị ịbụ nwunye ihe atụ nke Jehova.
4. Olee ndị bụ ụmụ ndị ikom nke nwunye ihe atụ nke Chineke, gịnịkwa ka Pọl onyeozi kpọrọ nwanyị ahụ nke Jọn hụrụ?
4 Ihe dị ka narị afọ asatọ tupu mgbe ahụ, Jehova gwara nwunye ihe atụ nke a okwu, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova.” (Aịsaịa 54:5, 13) Jisọs hotara amụma nke a wee gosi na ụmụ ndị a bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eso ụzọ ya, ndị mesịrị ghọọ ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ. (Jọn 6:44, 45) Ya mere, ndị nọ n’ọgbakọ nke a, ndị e kwuru okwu ha dị ka ụmụ ndị ikom Chineke, bụkwa ụmụ nke nwunye ihe atụ nke Chineke. (Ndị Rom 8:14) Pọl onyeozi nyere ihe ọmụma ikpeazụ metụtara nke a mgbe ọ sịrị: “Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị.” (Ndị Galetia 4:26) N’ihi nke a, “nwanyị” ahụ nke Jọn hụrụ bụ “Jerusalem nke dị n’elu.”
5. Ebe ọ bụ na e ji kpakpando 12 kpukwasị nwunye ihe atụ nke Jehova okpueze, gịnị ka Jerusalem nke dị n’elu bụ n’ezie?
5 Ma gịnị kpọmkwem bụ Jerusalem nke dị n’elu? Ebe Pọl kwuru okwu banyere ya dị ka “nke dị n’elu,” Jọn wee hụkwa ya n’eluigwe, o doro anya na ọ bụghị obodo dị n’elu ala; ọ bụghịkwa otu ihe ahụ ya na “Jerusalem Ọhụrụ,” ebe ọ bụ na nzukọ ahụ bụ nwanyị nke Kraịst na-alụ ọhụrụ, ọ bụghị nwunye nke Jehova. (Mkpughe 21:2) Rịba ama na e jiri kpakpando 12 kpube ya okpueze. Iri na abụọ bụ ọnụ ọgụgụ e jikọtara ya na izu ezu n’ihe banyere usoro nhazi.a N’ihi nke a, kpakpando 12 ndị a yiri ka hà na-egosi usoro nhazi e nwere n’eluigwe, dị nnọọ ka Jerusalem oge ochie dị n’elu ala. Jerusalem nke dị n’elu bụ nzukọ eluigwe na ala nke Jehova nke ndị mmụọ e kere eke, ndị nọ dị ka nwunye ya, ma n’ijere ya ozi ma n’ịmụpụta ụmụ.
6. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ bụ na nwanyị ahụ nke Jọn hụrụ na-eyi anyanwụ dị ka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya, nweekwa okpueze nke e ji kpakpando mee? (b) Gịnị ka ihe mgbu nke ime na-eme nwanyị ahụ dị ime sere onyinyo ya?
6 Jọn hụrụ nwanyị nke a dị ka onye e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe, onye nwekwara ọnwa n’okpuru ụkwụ ya abụọ. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị na nke a okpueze ya nke kpakpando, ọ na-aghọ onye ìhè dị n’eluigwe gbara gburugburu kpam kpam. Ihu ọma Chineke na-enwukwasị ya ehihie na abalị. Lee nnọọ ihe onyinyo kwesịrị ekwesị nke a bụ maka nzukọ eluigwe Jehova nke na-egbukepụ egbukepụ! Nwanyị a dịkwa ime, na-edi ihe mgbu nile nke ime omume. Mkpu ọ na-eti maka enyemaka Chineke gosiri na oge ọ ga-eji amụ nwa eruwo. N’ime Bible, a na-ejikarị ihe mgbu nke ime omume eme ihe atụ nke oké ọrụ iji rụpụta ihe dị mkpa. (Tụlee Abụ Ọma 90:2; Ilu 25:23; Aịsaịa 66:7, 8.) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nzukọ eluigwe nke Jehova nwere ihe mgbu ime omume yiri nke a mgbe ọ na-akwadebe maka ọmụmụ nwa nke a dị mkpa.
Oké Dragọn nke Na-acha Ọkụ Ọkụ
7. Gịnị bụ ihe ịrịba ama ọzọ nke Jọn hụrụ n’eluigwe?
7 Gịnị ọzọ ka Jọn hụrụ? “E wee hụ ihe ịrịba ama ọzọ n’eluigwe; ma lee, oké dragọn nke na-acha ọkụ ọkụ, nke nwere isi asaa na mpi iri, na-ekpukwa okpueze asaa n’isi ya. Ọdụdụ ya na-adọrọkwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nke eluigwe, o wee tụda ha n’ala: dragọn ahụ wee guzo n’ihu nwanyị ahụ onye gaje ịmụpụta nwa, ka o wee ripịa nwa ya mgbe ọ bụla ọ ga-amụpụta ya.”—Mkpughe 12:3, 4.
8. (a) Gịnị bụ oké dragọn ahụ nke na-acha ọkụ ọkụ? (b) Gịnị ka eziokwu ahụ gosiri nke bụ na dragọn ahụ nwere isi asaa, mpi iri, na-ekpukwa okpueze n’isi ya nke ọ bụla?
8 Dragọn nke a bụ Setan, “agwọ ochie ahụ.” (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:15) Ọ bụ onye na-emebisị ihe nke ukwuu—dragọn, ma ọ bụ onye ndọkasị nwere isi asaa, nke pụrụ iloda kpam kpam ihe ọ bụla ọ wakwasịrị. Lee nnọọ ka ọdịdị ya si dị egwu! Isi asaa na mpi iri ndị ahụ na-egosi na ọ bụ ya haziri anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a gaje ịkọwa n’oge na-adịghị anya ná Mkpughe isi nke 13. Anụ ọhịa nke a nwekwara isi asaa na mpi iri. Ebe Setan nwere okpueze n’isi nke ọ bụla—ha nile dị asaa—anyị pụrụ ijide n’aka na alaeze ụwa nile ndị anụ ọhịa ahụ nọchiri anya ha anọgidewo n’okpuru ọchịchị ya. (Jọn 16:11) Mpi iri ndị ahụ bụ ihe onyinyo kwesịrị ekwesị nke ozuzu nke ike o nweworo n’ime ụwa nke a.
9. Gịnị ka eziokwu ahụ gosiri nke bụ na ọdụdụ dragọn ahụ ‘na-adọrọ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nke eluigwe’ rịdata n’elu ala?
9 Dragọn ahụ nwekwara ike n’etiti ndị bụ mmụọ. O ji ọdụdụ ya dọkpụrụ “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nke eluigwe.” Kpakpando pụrụ ịnọchi anya ndị mmụọ ozi. (Job 38:7) Ịkpọtụ “otu ụzọ n’ụzọ atọ” aha ga-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ na Setan eduhiewo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmụọ ozi. Ozugbo ndị a batara n’okpuru nduzi ya, ha enweghị mgbapụ ọ bụla ọzọ. Ha apụghị ịlaghachi ná nzukọ dị nsọ nke Chineke. Ha ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ, ndị Setan na-adọkpụrụ na-aga dị ka eze ha, ma ọ bụ onye ọchịchị ha, dị ka a pụrụ ikwu ya. (Matiu 12:24) Setan tụdakwara ha n’ala. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a na-ezo aka n’oge Noa tupu Iju Mmiri ahụ, mgbe Setan kpaliri ụmụ ndị ikom nke Chineke ndị na-enupụ isi ịgbadata n’ala wee soro ụmụ ndị inyom nke mmadụ nwee mmekọahụ. Dị ka ntaramahụhụ, ‘mmụọ ozi ndị a mehierenụ’ abụrụwokwa ndị Chineke tụdara n’ọnọdụ yiri ụlọ mkpọrọ, nke a kpọrọ Tatarọs.—Jenesis 6:4; 2 Pita 2:4; Jud 6.
10. Nzukọ abụọ dị aṅaa na-emegiderịta onwe ha ka a na-ahụ ugbu a, n’ihi gịnịkwa ka dragọn ahụ ji na-achọ iripịa nwa ahụ mgbe nwanyị ahụ mụpụtara ya?
10 N’ụzọ dị otú a, òtù abụọ na-emegiderịta onwe ha apụtawo ìhè—nzukọ eluigwe nke Jehova dị ka nwanyị ahụ sere onyinyo ya na òtù ndị mmụọ ọjọọ nke Setan nke na-ama ọbụbụeze Chineke aka. A ghaghị idozi oké ihe iseokwu ahụ banyere onye kwesịrị ịbụ eze. Ma, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Setan, ebe ọ ka na-adọkpụgharị ndị mmụọ ọjọọ ahụ, yiri oké anụ ọhịa ndọgbu nke na-enyo anụ ọ na-achọ ịwakwasị. Ọ na-echere ka nwanyị ahụ mụpụta nwa. Ọ chọrọ ịdọgbu nwa ọhụrụ ahụ a na-eche n’ihi na ọ maara na ọ gaje ịbụ oké ihe iyi egwu nye ya na ụwa ahụ nke ọ na-achị.—Jọn 14:30.
Ọkpara, Bụ́ Nwa Nwoke
11. Olee ụzọ Jọn si kọwaa ọmụmụ nke nwa nwanyị ahụ, n’ihi gịnịkwa ka e ji kpọọ nwa ahụ “ọkpara, bụ́ nwa nwoke”?
11 Oge a kara aka ka Chineke ghara itinyere ndị mba ọzọ aka n’ọchịchị ha rutere ọgwụgwụ ya na 1914. (Luk 21:24) Mgbe ahụ, kpọmkwem n’oge ya, nwanyị ahụ mụpụtara nwa ya: “O wee mụpụta ọkpara, bụ́ nwa nwoke, onye ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ: e wee pụnara ya nwa ya ahụ laa n’ebe Chineke nọ, na n’ebe ocheeze ya dị. Nwanyị ahụ wee gbalaga n’ime ọhịa, ebe o nwere ọnọdụ e doziworo site n’aka Chineke, ka ha wee zụọ ya n’ebe ahụ [otu puku na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii].” (Mkpughe 12:5, 6) Nwa ahụ bụ “ọkpara, bụ́ nwa nwoke.” N’ihi gịnị ka Jọn ji jiri okwu nkwughachi nke a mee ihe? O mere nke a iji gosi ikwesị ekwesị nke nwa ahụ, iru eru ya iji ike zuru ezu chịa mba nile. O mesikwara ike ụzọ o si bụrụ oké ihe omume, ụzọ ọmụmụ nwa nke a si bụrụ ihe oké ọṅụ! O mere ihe dị mkpa n’iweta ihe omimi nke Chineke ná mmezu ya. Ee, ọbụna na nwa nwoke nke a “ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ”!
12. (a) N’akwụkwọ Abụ Ọma, gịnị ka Jehova kweworo Jisọs nkwa ya n’ụzọ amụma? (b) Gịnị ka ọmụmụ nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke “onye ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba nile dị ka atụrụ” pụtara?
12 Ugbu a, okwu ahụ ò yiri ihe ị nụtụworo mbụ? Ee, Jehova kwere nkwa n’ụzọ amụma banyere Jisọs, sị: “Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisie ha; dị ka ihe ọkpụ ite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.” (Abụ Ọma 2:9) E bukwara amụma banyere ya, sị: “Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.” (Abụ Ọma 110:2) N’ihi nke a, ọmụmụ nwa ahụ Jọn hụrụ metụtara Jisọs Kraịst nke ukwuu. Ee e, ọ bụghị ọmụmụ nke Jisọs site na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke laa azụ tupu narị afọ mbụ nke Oge Anyị; ọ pụghịkwa izo aka ná mkpọlite a na-akpọlite Jisọs gaa ná ndụ dị ka mmụọ n’afọ 33 O.A. Karịsịa, ọ bụghị nnwogha. Kama nke ahụ, ọ bụ ọmụmụ nke Alaeze Chineke na 1914 dị ka ihe dị adị n’ezie, na-eme ka Jisọs—onye nọworo n’eluigwe ruo ihe karịrị narị afọ 20—nọkwasị n’ocheeze ugbu a dị ka Eze.—Mkpughe 12:10.
13. Gịnị ka e gosiri site na nwa nwoke ahụ ịbụ onye ‘a pụnaara laa n’ebe Chineke nọ, na n’ebe ocheeze ya dị’?
13 Jehova agajeghị ikwe ka Setan dọgbuo nwunye Ya ma ọ bụ ọkpara Ya a mụrụ ọhụrụ! Ozugbo a mụrụ ya, ‘a pụnaara nwa nwoke ahụ laa n’ebe Chineke nọ, na n’ebe ocheeze ya dị.’ O si otú a bata kpam kpam n’okpuru nchebe Jehova, bụ́ onye ga-enye Alaeze nke a a mụrụ ọhụrụ nlekọta kasị zuo ezu, bụ́ ngwá ọrụ Ọ ga-eji mee ihe ido aha Ya nsọ. N’otu oge ahụ, nwanyị ahụ gbapụrụ gaa n’ebe Chineke kwadebewooro ya n’ime ọhịa. A ga-akọ ihe banyere nke ahụ mgbe e mesịrị! Ma n’ihe banyere Setan, ọnọdụ adịwo mma ugbu a maka oké ihe omume nke ga-eme ka ọ gharakwa ikwe ya omume ma ọlị mgbe ọ bụla ọzọ iyi Alaeze ahụ dị n’eluigwe egwu. Gịnị bụ ihe omume ahụ?
Agha n’Eluigwe!
14. (a) Dị ka Jọn si kọọ ya, ihe omume dị aṅaa mere ka ọ gharakwa ikwe Setan omume ọzọ iyi Alaeze ahụ egwu? (b) N’ógbè dị aṅaa ka a kpaara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ókè ịnọ?
14 Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.” (Mkpughe 12:7-9) Ya mere, dị ka oké ihe omume n’iweta ihe omimi nke Chineke ná mmezu, a chụpụrụ Setan, tụpụ ya n’eluigwe, a tụdakwara ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ala. Onye ahụ nke duhieworo ụwa nile mmadụ bi ruo n’ókè nke ịghọ chi ya emesịwo bụrụ onye a kpaara ókè na mbara ala nke a, ebe nnupụisi ya malitere.—2 Ndị Kọrint 4:3, 4.
15, 16. (a) Ònye bụ Maịkael, ànyị sikwa aṅaa mara? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na Maịkael bụ onye tụdara Setan site n’eluigwe?
15 Ònye ga-eji aha Jehova nwee oké mmeri nke a? Bible sịrị na ọ bụ Maịkael na ndị mmụọ ozi ya. Ma, ònye bụ Maịkael? Aha ahụ bụ “Maịkael” pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?” N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na Maịkael nwere mmasị n’iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’ịnwapụta na ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ a pụrụ iji tụnyere Ya. N’akwụkwọ Jud amaokwu 9, a kpọrọ ya “Maịkael onyeisi mmụọ ozi.” Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na e jiri ùtú aha ahụ bụ “onyeisi mmụọ ozi” mee ihe n’ebe ọzọ n’ime Bible iji wee zoo aka n’ebe nanị otu onye nọ: Jisọs Kraịst.b Pọl kwuru banyere ya, sị: “Onyenwe anyị onwe ya ga-ewere oké ịkpọ òkù, were olu isi mmụọ ozi, werekwa opi nke Chineke, si n’eluigwe rịdata.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:16) Ùtú aha ahụ bụ “onyeisi mmụọ ozi” pụtara “onye ndú nke ndị mmụọ ozi.” Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Mkpughe kwuru okwu banyere “Maịkael na ndị mmụọ ozi ya.” Ebe ndị ọzọ Bible kwuru okwu banyere ndị mmụọ ozi ịnọ n’okpuru onye ezi omume nke na-ejere Chineke ozi zoro aka n’ebe Jisọs nọ. Otú a, Pọl kwuru okwu banyere “mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi nke ike ya.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7; leekwa Matiu 24:30, 31; 25:31.
16 Ndị a na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-eduje anyị ná nkwubi okwu anyị na-apụghị izere nke bụ na Maịkael adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’ọnọdụ ya nke eluigwe. Ugbu a, n’ụbọchị Onyenwe anyị, ọ bụghịzị nanị na ọ na-agwa Setan, sị: “Ka [Jehova, NW] baara gị mba.” Ebe ugbu a bụ oge ikpe ikpe, Jisọs, dị ka Maịkael, na-atụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. (Jud 9; Mkpughe 1:10) O kwesịrị nnọọ ekwesị na ọ bụ Ya bụ onye ga-eme nke a, ebe Ọ bụ Onye ahụ e chiri Eze ọhụrụ. Jisọs bụkwa Mkpụrụ ahụ, nke e kwere nkwa ya laa azụ n’Iden, onye ga-emesịa n’ikpeazụ chipịa isi Agwọ ahụ, wee si otú a na-ewepụ ya n’ịdị adị ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 3:15) Site n’ịchụpụ Setan n’eluigwe, Jisọs agawo n’ihu maka nchipịa ikpeazụ ahụ.
“Ka Obi Na-atọ Unu Ụtọ, Unu Eluigwe Nile”
17, 18. (a) Mmeghachi omume dị aṅaa e nwere n’eluigwe ka Jọn kọrọ akụkọ ya banyere nchụda a chụdara Setan site n’eluigwe? (b) N’olee ebe ka ọ na-aghaghị ịbụ na oké olu ahụ nke Jọn nụrụ si daa?
17 Jọn kọrọ akụkọ banyere oké ọṅụ e nwere n’eluigwe maka oké ọdịda nke Setan dara: “M wee nụ oké olu ka ọ na-ada n’eluigwe, sị, Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị. Ndị ahụ wee merie ya n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na n’ihi okwu àmà ha; ha ahụghịkwa ndụ ha n’anya ruo ọnwụ. N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha.”—Mkpughe 12:10-12a.
18 Oké olu nke ònye ka Jọn nụrụ? Bible agwaghị anyị. Ma mkpu dị otú ahụ nke a kọrọ akụkọ ya ná Mkpughe 11:17 sitere n’ọnụ 24 ndị okenye ahụ a kpọliteworo n’ọnwụ n’ọnọdụ ha nke dị n’eluigwe, ebe ha pụrụ ịnọchite anya 144,000 ndị nsọ ahụ ugbu a. (Mkpughe 11:18) Ebe ọ bụkwa na e kwuru okwu banyere ndị ohu Chineke e tere mmanụ ndị ka nọ n’elu ala ebe a dị ka “ụmụnna anyị,” ọ pụkwara ịbụ na okwu a sitere n’otu ebe ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị a kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijikọta olu ha ebe ọ bụ na mbilite n’ọnwụ ha ga-esochi n’oge na-adịghị anya mgbe a tụpụsịrị Setan na usuu ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe.
19. (a) Mmezu nke ihe omimi nke Chineke ahụ meghere ụzọ ka Jisọs wee mee gịnị? (b) Gịnị ka e gosiri site n’ọkpụkpọ a kpọrọ Setan “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo”?
19 Mmezu nke ihe omimi nke Chineke ga-agụnye Jisọs iweghara ike ọchịchị n’Alaeze Jehova. A na-esi otú a meghee ụzọ ka Chineke mezuo nzube ukwu ya nke ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi. Jisọs na-eweta nzọpụta, ọ bụghị nanị nye ndị na-eso ụzọ ya na-atụ egwu Chineke ndị nọ n’elu ala ugbu a, kamakwa nye ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụ anwụ ndị nọ ná ncheta nke Chineke. (Luk 21:27, 28) Ọkpụkpọ a kpọrọ Setan “onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo” gosiri na, ọ bụ ezie na a nwapụtara na ebubo nile e boro Job bụ ụgha, ọ nọgidekwara na-ama ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ohu Chineke nọ n’elu ala aka. Ihe àmà gosiri na o meghachiri ihe ahụ ọtụtụ ugbo nke bụ ikwu na mmadụ ga-enye ihe nile o nwere iji zọpụta mkpụrụ obi ya. Lee nnọọ ka Setan siworo daa ọdịda nke na-eweta ihere!—Job 1:9-11; 2:4, 5.
20. Olee ụzọ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi siworo merie Setan?
20 Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị a gụworo dị ka ndị ezi omume “n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ,” nọgidere na-agbara Chineke na Jisọs Kraịst àmà n’agbanyeghị mkpagbu. Ruo ihe karịrị afọ 120, òtù Jọn nke a anọgidewo na-ezo aka n’oké ihe iseokwu dị iche iche ndị metụtara ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl na 1914. (Luk 21:24, King James Version) Oké ìgwè mmadụ ahụ nọkwa ugbu a na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’akụkụ ha. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a ‘na-atụ egwu ndị na-egbu anụ ahụ ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi,’ dị ka ahụmahụ Ndịàmà Jehova nweworo gosipụtaworo ọtụtụ ugbo n’oge anyị a. Site n’okwu ọnụ nakwa site n’ezi akparamagwa ndị Kraịst, ha emeriwo Setan, nọgide na-anwapụta na ọ bụ onye ụgha. (Matiu 10:28; Ilu 27:11; Mkpughe 7:9) Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ gaa n’eluigwe, lee nnọọ ka ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ na-aghaghị isi nwee obi ụtọ, ebe Setan na-anọkwaghị n’elu ala ebe ahụ ibo ụmụnna ha ebubo ọzọ! Ọ bụ n’ezie oge usuu ndị mmụọ ozi nile ga-eji ọṅụ zaghachi n’òkù ahụ a kpọrọ nke bụ: “Ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha!”
Ahụhụ nke Na-emegide nke Ahụ!
21. N’ụzọ dị aṅaa ka Setan siworo wetara ụwa na oké osimiri ahụhụ?
21 Ebe ọ nọ ná mmekpa ahụ n’ihi ahụhụ nke atọ ahụ, Setan dị njikere ugbu a iji ụdị ahụhụ nke ya onwe ya mekpaa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ. Ọ bụ: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12b) Nchụpụ a chụpụrụ Setan n’eluigwe pụtara ahụhụ n’ezie nye elu ala nkịtị, bụ́ nke ụmụ mmadụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị nọ n’okpuru nduzi ya, na-emebisị. (Deuterọnọmi 32:5) Ọbụna karị nke ahụ, echiche Setan nke ‘ịchị achị ma ọ bụ ibibi ihe’ na-ewetara ụwa ihe atụ ahụ ahụhụ, bụ́ ndokwa òtù ụmụ mmadụ, wetakwara oké osimiri ihe atụ ahụ, ìgwè ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ọgba aghara n’onwe ha. N’ime agha ụwa abụọ ndị ahụ, e gosipụtara oké ọnụma Setan n’oké ọnụma nke mba ndị ahụ nọ n’okpuru ya, ntiwapụ yiri ndị ahụ nke iwe ndị mmụọ ọjọọ nọgidekwara ruo n’oge anyị a—ọ bụ ezie na ọ gaghị anọgide ruo ogologo oge karị! (Mak 13:7, 8) Ma, n’agbanyeghị otú nchepụta nile nke Ekwensu ga-adịru ná njọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla ha ga-eyitụ ajọ mmetụta nke ahụhụ nke atọ ahụ—ihe Alaeze Chineke ga-eme—ga-enwe n’ahụ nzukọ Setan a na-ahụ anya!
22, 23. (a) Gịnị ka Jọn kwuru na o mere mgbe a tụdasịworo dragọn ahụ n’elu ala? (b) Ò si aṅaa kwe omume ka dragọn ahụ kpagbuo ‘nwanyị ahụ nke mụpụtara nwa nwoke ahụ’?
22 Kemgbe oké nchụpụ ahụ a chụpụrụ Setan, ụmụnna Kraịst ndị ka nọ n’elu ala enwewo mmetụta nke ọnụma ya. Jọn kọrọ, sị: “Mgbe dragọn ahụ hụrụ na a chụdara ya rịị n’ụwa, o wee sogbuo nwanyị ahụ, bụ́ nwanyị nke mụpụtara nwa nwoke ahụ. E wee nye nwanyị ahụ nku abụọ ahụ nke oké ugo ahụ, ka o wee feba n’ọhịa laa n’ọnọdụ ya, ebe a na-azụ ya otu oge, na oge abụọ, na nkera otu oge, ka ọ pụọ n’ihu agwọ ahụ.”—Mkpughe 12:13, 14.
23 N’ebe a, ọhụụ ahụ na-ewelite echiche ahụ nke e wepụtaburu n’amaokwu nke 6, nke na-akọrọ anyị na mgbe ọ mụsịrị nwa ya, nwanyị ahụ gbabara n’ọhịa, pụọ n’ebe dragọn ahụ nọ. Anyị pụrụ iche echiche banyere otú dragọn ahụ pụrụ isi sogbuo nwanyị ahụ ebe ọ bụ na nwanyị ahụ nọ n’eluigwe, ma a chụdawo dragọn ahụ n’elu ala ugbu a. Ee, cheta na nwanyị ahụ nwere ụmụ ndị nọ n’elu ala ebe a, bụ́ mkpụrụ ya. Mgbe ọhụụ a na-aga n’ihu, a ga-akọrọ anyị na Setan gosipụtara iwe ya n’ebe nwanyị ahụ nọ site n’ịkpagbu mkpụrụ ya. (Mkpughe 12:17) Ihe mere mkpụrụ nke nwanyị ahụ n’elu ala ebe a ka a pụrụ ile anya dị ka ihe mere nwanyị ahụ n’onwe ya. (Tụlee Matiu 25:40.) Ọnụ ọgụgụ na-abakwa ụba nke ndị na-esonyere mkpụrụ ahụ n’elu ala ebe a ga-eketakwa òkè ná mkpagbu ndị a.
Mba Ọhụrụ
24. Ahụmahụ dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible ahụ nwere nke yiri nnapụta nke ụmụ Israel site n’Ijipt?
24 Mgbe a nọ na-alụ agha ụwa nke mbụ ahụ, ụmụnna Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ịgba àmà ha ruo n’ókè o kwere mee. E mere nke a n’agbanyeghị mkpagbu siwanyere ike site n’aka Setan na ajọ mmadụ ndị na-akwado ya. N’ikpeazụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a kwụsịrị ịgba àmà ihu ọha nke Ndị Mmụta Bible ahụ. (Mkpughe 11:7-10) Ọ bụ mgbe ahụ ka ha nwere ahụmahụ yiri nnọọ nke ndị Israel ahụ nọ n’Ijipt, ndị nwekwara ntachi obi n’okpuru oké mkpagbu. Ọ bụ n’oge ahụ ka Jehova wezụgara ha ngwa ngwa, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’elu nku ugo, gaa ná nchebe n’ọzara nke Saịnaị. (Ọpụpụ 19:1-4) N’otu aka ahụ, mgbe mkpagbu dị ilu nke 1918 ruo 1919 gasịrị, Jehova napụtara ndịàmà ya, dị ka ndị nọchiri anya nwanyị ya, banye n’ọnọdụ ime mmụọ nke nọ ná nchebe dị ka ọzara ahụ dịịrị ndị Israel. Nke a bịara dị ka azịza nye ekpere ha.—Tụlee Abụ Ọma 55:6-9.
25. (a) Gịnị ka Jehova wepụtara na 1919, dị nnọọ ka o si napụta ụmụ Israel dị ka otu mba n’ime ọzara ahụ? (b) Olee ndị mejupụtara mba nke a, ọ̀ bụkwa gịnị ka a kpọbataworo ha n’ime ya?
25 N’ime ọzara ahụ, Jehova wepụtara ndị Israel dị ka otu mba, na-enye ha ihe dị ha mkpa n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ. N’otu aka ahụ, malite na 1919, Jehova mụpụtara mkpụrụ nke nwanyị ahụ dị ka mba ime mmụọ. E kwesịghị inwe mgbagwoju anya ọ bụla n’etiti nke a na Alaeze Mesaịa ahụ nke nọgideworo na-achị achị site n’eluigwe kemgbe 1914. Kama nke ahụ, ihe mejupụtara mba nke a bụ ihe fọdụrụ ná ndịàmà e tere mmanụ ndị nọ n’elu ala, ndị a kpọbatara n’ọnọdụ ime mmụọ dị ebube na 1919. Ebe a nọ ugbu a na-enye ha “òkè nri ha n’oge ya,” e wusiri ndị a ike maka ọrụ chere ha n’ihu.—Luk 12:42; Aịsaịa 66:8.
26. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka oge ahụ a kpọtụrụ uche ná Mkpughe 12:6, 14 dịruru? (b) Gịnị bụ nzube nke ogologo oge ahụ nke oge atọ na ọkara, olee mgbe ọ malitere, oleekwa mgbe ọ gwụsịrị?
26 Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ozuzu ike nke mkpụrụ nke nwanyị Chineke nke a dịruru? Mkpughe 12:6 kwuru na ọ bụ 1,260 ụbọchị. Mkpughe 12:14 kpọrọ ogologo oge ahụ otu oge, na oge abụọ, na nkera otu oge; n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, oge atọ na ọkara. N’eziokwu, ụzọ abụọ ahụ e si kwupụta ya nọchiri anya afọ atọ na ọkara, na-agbatị n’Ebe Ugwu Ụwa site n’oge opupu ihe ubi nke afọ 1919 ruo ná mmalite oge oyi nke 1922. Nke a bụrụ oge ozuzu ike na-enye ume ọhụrụ na nhazigharị nye òtù Jọn ahụ e weghachiri.
27. (a) Dị ka akụkọ Jọn si dị, gịnị ka dragọn ahụ mere mgbe 1922 gasịrị? (b) Gịnị bụ nzube Setan n’ịgbọpụta oké iju mmiri nke mkpagbu megide Ndịàmà ahụ?
27 Ike agwụghị dragọn ahụ! “Agwọ ahụ wee gbụpụta mmiri n’ọnụ ya n’azụ nwanyị ahụ dị ka osimiri, ka o wee mee ka osimiri ahụ bupụ ya.” (Mkpughe 12:15) Gịnị ka okwu ahụ bụ ‘mmiri dị ka osimiri,’ ma ọ bụ “oké iju mmiri” pụtara? (The New English Bible) Eze Devid oge ochie kwuru okwu banyere ndị ajọ mmadụ na-emegide ya dị ka “mmiri iyi nile nke ihe jọgburu onwe ya” [“nnupụta nke ndị na-abaghị n’ihe,” Young]. (Abụ Ọma 18:4, 5, 16, 17) Ihe Setan na-atọhapụ ugbu a bụkwa mkpagbu sitere n’aka mmadụ ndị na-abaghị n’ihe ma ọ bụ ‘ndị jọgburu onwe ha.’ Mgbe 1922 gasịrị, Setan gbụpụtara oké mmiri nke mkpagbu megide Ndịàmà ahụ. (Matiu 24:9-13) Nke a gụnyere imeso ha ihe ike, ‘iji iwu na-ewetara ha nsogbu,’ ịtụ mkpọrọ, ọbụna igbu ha egbu site ná nkwụgbu, mgbagbu ihu ọha, na ibepụ ha isi. (Abụ Ọma 94:20) Setan ahụ e wedaworo n’ala, ebe a na-enwekwaghị mmekọrịta ọ bụla dị n’etiti ya na nwanyị Chineke nke dị n’eluigwe, jiri ọnụma jee ibuso ihe fọdụrụ ná mkpụrụ ya nọ n’elu ala agha na ibibi ha, site n’ime ihe n’onwe ya ma ọ bụ site n’ime ka ha tụfuo ihu ọma Chineke site n’imebi ikwesị ntụkwasị obi ha. Ma mkpebi ha yiri nke Job: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.”—Job 27:5.
28. N’ụzọ dị aṅaa ka iju mmiri nke mkpagbu ahụ si ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ?
28 Ajọ mmiri nke mmegide ahụ ruru ọnọdụ dị oké elu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Na Europe, a tụrụ ihe dị ka Ndịàmà 12,000 mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi, ihe dịkwa ka mmadụ 2,000 n’ime ha nwụkwara. N’okpuru ndị ọchịagha na-achị Itali, Japan, Korea, na Taiwan, Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nwetakwara otu ajọ mmeso omume ahụ. Ọbụna ná mba ndị a sị na ha nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, òtù dị iche iche nke ndị Catholic Action kpasoro Ndịàmà ahụ àgwà ọjọọ, wụọ ha ágbá coal tar ma wụkwasị ha abụba ọkụkụ n’ahụ, chụpụkwa ha n’obodo. E tisasịrị mgbakọ ndị Kraịst, chụpụkwa ụmụ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ.
29. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jọn si kọwaa nnapụta nke sitere n’ebe a na-atụghị anya ya wee bịa? (b) Ò si aṅaa bụrụ na ‘ala nyeere nwanyị ahụ aka’? (ch) Gịnị ka dragọn ahụ nọgideworo na-eme?
29 Nnapụta sitere n’ebe a na-atụghị anya ya wee bịa: “Ala wee nyere nwanyị ahụ aka, ala wee saghee ọnụ ya, loda osimiri ahụ, nke dragọn ahụ gbụpụtara n’ọnụ ya. Dragọn ahụ wee wesa nwanyị ahụ iwe, wee pụọ ibu agha megide mkpụrụ ya fọdụrụ, bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.” (Mkpughe 12:16, 17) “Ala”—ya bụ ihe ndị dị n’etiti usoro ihe nke Setan—malitere iloda “osimiri,” ma ọ bụ “mmiri iyi” ahụ. N’ime afọ ndị 1940, ụlọikpe ukwu United States Supreme Court kpelaara Ndịàmà ahụ ikpe dị iche iche, ha nwetakwara nke a site n’aka ndị na-achị achị n’ụfọdụ mba ndị ọzọ ndị na-akwado na mmadụ nweere onwe ya ife ofufe otú masịrị ya. N’ikpeazụ, mba ndị Allied meriri oké mwakwasị nke ndị ọchịchị aka ike Nazi-Fascist ahụ, na-ewetara Ndịàmà ahụ nnapụta, bụ́ ndị taworo ahụhụ n’okpuru ọchịchị aka ike dị iche iche. Mkpagbu akwụsịchaghị kpam kpam, n’ihi na ọnụma nke dragọn ahụ anọgidewo na-aga n’ihu ruo taa, ọ nọgidekwara na-ebu agha ahụ megide ndị ahụ ‘nwere ọrụ nke ịgbara Jisọs àmà.’ N’ọtụtụ mba, Ndịàmà ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ka nọ n’ụlọ mkpọrọ, ụfọdụ n’ime ha ka na-anwụkwa n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha. Ma n’ụfọdụ n’ime mba ndị a, ndị na-achị achị na-ebelatatụ mkpagbu ha site n’oge ruo n’oge, Ndịàmà ahụ na-enwerekwa onwe ha karị.c Otú a, dị ka mmezu nke amụma ahụ, ala nọgidere na-eloda osimiri ahụ nke mkpagbu.
30. (a) Ala enyewo nnapụta zuru ezu iji nye ohere ka gịnị mee? (b) Gịnị ka ikwesị ntụkwasị obi nke ndị Chineke na-arụpụta?
30 N’ụzọ dị otú a, ala enyewo nnapụta zuru ezu ikwe ka ọrụ Chineke gbasaruo ihe dị ka mba 235, rụpụtakwa ihe karịrị nde ndị nkwusa ozi ọma isii kwesịrị ntụkwasị obi. E wezụga ihe fọdụrụ ná mkpụrụ nwanyị ahụ, e nwere oké ìgwè mmadụ sitere ná mba nile nke ndị ọhụrụ kwere ekwe, ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu n’ihe banyere ịnọpụ iche site n’ụwa, inwe àgwà dị ọcha, na ịhụ ụmụnna ha n’anya, ha na-agbakwa àmà nye Alaeze Mesaịa ahụ. Ikwesị ntụkwasị obi ha na-enye ịma aka Setan azịza, na-agbakwa àmà ọnwụ nye Setan na usoro ihe nke ya.—Ilu 27:11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Tụlee ebo 12 nke Israel anụ ahụ, ndị ozi 12, ebo 12 nke Israel ime mmụọ, na ọnụ ụzọ ámá 12, ndị mmụọ ozi 12, na nkume ntọala 12 nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ.—Mkpughe 21:12-14.
b Otú ọ dị, rịba ama na Mkpughe 12:9 kwuru okwu banyere ‘dragọn ukwu ahụ na ndị mmụọ ozi ya.’ Ya mere, ọ bụghị nanị na Ekwensu na-eme onwe ya ka ọ bụrụ chi ụgha, kama ọ na-anwakwa ịbụ onyeisi ndị mmụọ ozi, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ bụla Bible nyere ya ùtú aha ahụ.
c Ọtụtụ ụlọikpe kachasị elu n’ọtụtụ mba emewo ka Ndịàmà Jehova nwere onwe ha; e zoro aka n’ụfọdụ n’ime mkpebi ikpe ndị a n’igbe ahụ dị na peji nke 92.
Igbe dị na peeji nke 185]
“Ala Wee Saghee Ọnụ Ya”
E zokwasịwo ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha oké iju mmiri nke mkpagbu Setan n’ọtụtụ ala. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ihe ndị na-eme n’ime usoro ihe nke Setan onwe ya emewo ka e loda iju mmiri ahụ.
Iju mmiri nke mwakwasị ihe ike na ịtụ mkpọrọ na United States bụ nke ikpe ndị Ụlọikpe Kasị Elu kpelaara ha n’afọ ndị 1940 lomiri n’ụzọ dị ukwuu.
1945: Mkpagbu dị ilu n’ala ndị Germany na Japan na-achị bụ nke mmeri ndị agha Allied nwere n’Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị.
Mgbe a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na Dominican Republic, a tụrụ Ndịàmà ahụ mkpọrọ, pịa ha ụtarị, jirikwa isi égbè tie ha. Na 1960, esemokwu n’etiti onye ọchịchị aka ike bụ Rafael Trujillo na Chọọchị Roman Katọlik dujere n’iwepụ mmachibido iwu ahụ megide Ndịàmà Jehova.
Ịgba égbè, ịkpọ ọkụ, ndina n’ike, iti ihe, mmekpọ ọnụ, na ogbugbu nke Ndịàmà n’oge agha obodo na Nigeria bịara ná njedebe na 1970 mgbe ndị agha gọọmenti meriri akụkụ ahụ kewapụrụ ekewapụ, bụ́ ebe ihe ndị a na-eme.
Na Spain, a wabara n’ụlọ ndị Kraịst, rie ha nhá, tụọkwa ha mkpọrọ n’ihi “mpụ” nke ikwu banyere Chineke na inwe nzukọ ndị Kraịst. Mkpagbu a mesịrị kwụsị na 1970 mgbe, n’ihi mgbanwe nke gọọmentị gbanwere ụkpụrụ ha n’ebe okpukpe ndị na-abụghị Katọlik dị, e nyere Ndịàmà Jehova ohere ịghọ ndị e debara aha ha n’iwu.
Na Portugal, e nyochara ọtụtụ narị ụlọ n’ejighị akwụkwọ ikike. E merụrụ Ndịàmà ahụ, tụba ha n’ụlọ mkpọrọ, nakọrọkwa ha Bible ha. ‘E lodara’ iyi egwu nke a mgbe, na 1974, ọgba aghara ndị agha kpatara mgbanwe ọchịchị, e wee mee iwu nke nyere ikike inwe nzukọ.
N’Argentina, n’okpuru gọọmenti ndị agha, a chụrụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ, jidekwa Ndịàmà bi gburugburu mba ahụ n’ihi ikwusa ozi ọma. Mkpagbu nke a mesịrị kwụsị na 1984 mgbe gọọmenti na-achị mgbe ahụ nyere Òtù Ndịàmà Jehova nkwado iwu.
[Chaatị dị na peeji nke 183]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
1914 Ọmụmụ nke Alaeze
1919 Ọmụmụ nke mba ọhụrụ
1919-1922 Oge nke ozuzu ike
1922- Oké osimiri nke mkpagbu ▸
[Foto ndị dị na peeji nke 182]
Ahụhụ ga-adịrị ụwa