Chọọchị nke Oge Gboo Ọ̀ Kụziri na Chineke Bụ Atọ N’ime Otu?
Akụkụ nke 3—Ndị Nkwado Okwukwe Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
Ná mbipụta ya nke November 1, 1991, na February 1, 1992, Ụlọ Nche gosiri na Jisọs na ụmụ azụ ya akụzighị ozizi Atọ n’Ime Otu, Ndị Nna Chọọchị nke ngwụsị narị afọ mbụ na mmalite narị afọ nke abụọ O.A. ezighịkwa ya. Ndị chọọchị mgbe e mesịrị na narị afọ nke abụọ hà kụziri ya?
SITE ná nso etiti narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị ruo ngwụsị ya, e nwere ndị chọọchị ndị a na-akpọ taa Ndị Nkwado Okwukwe. Ha dere akwụkwọ ịgọpụrụ Iso Ụzọ Kraịst ha maara megide ajọ nkà ihe ọmụma bụ́ ndị jupụtara n’ụwa ndị Rom nke oge ahụ. Ọrụ ha pụtara n’oge ngwụsị ihe odide dị iche iche nke Ndị Nna Chọọchị, na mgbe ha gasịrị.
N’etiti Ndị Nkwado Okwukwe dere ihe na Grik, e nwere Justin Martyr, Tatian, Athenagoras, Theophilus, na Clement nke Alexandria. Tertullian bụ Onye Nkwado Okwukwe dere ihe na Latin. Hà kụziri Atọ n’Ime Otu ọgbara ọhụrụ nke Krisendọm—ndị atọ hà nhata (Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ) dị n’ime Chiatọ, nke ọ bụla na-abụ ezi Chineke, ma e nweghị Chineke atọ kama otu Chineke?
“Ọkpara Nọ n’Okpuru”
Dr. H. R. Boer, n’akwụkwọ ya bụ́ A Short History of the Early Church, na-ekwu banyere echiche bụ isi dị n’ozizi Ndị Nkwado Okwukwe:
“Justin [Martyr] kụziri na tupu okike ụwa Chineke nọ nanị ya, e nweghịkwa Ọkpara ọ bụla. . . . Mgbe Chineke chọrọ ike ụwa, . . . ọ mụpụtara onye ọzọ bụ chi ikere ya ụwa. A kpọrọ onye nke a bụ chi . . . Ọkpara n’ihi na a mụrụ ya amụ; a kpọrọ ya Logos n’ihi na e wepụtara ya n’Echiche ma ọ bụ Uche Chineke. . . .
“Justin na Ndị Nkwado Okwukwe ndị ọzọ si otú a kụzie na Ọkpara ahụ bụ onye e kere eke. Ọ bụ ihe e kere eke dị elu, onye e kere eke dị ike n’ụzọ zuru ezu ike ụwa ma, ka o sina dị, bụrụ ihe e kere eke. Ná nkà mmụta okpukpe njikọ nke a nke Ọkpara na Nna ka a na-akpọ ozizi ịnọ n’okpuru. Ọkpara ahụ nọ n’okpuru, ya bụ, bụrụ onye nke abụọ, nke dabeere, nke e mere ka ọ dịrị site n’aka Nna ahụ. Ndị Nkwado Okwukwe bụ ndị nkụzi ozizi ịnọ n’okpuru.”1
N’akwụkwọ bụ́ The Formation of Christian Dogma, Dr. Martin Werner na-ekwu banyere nghọta ndị mbụ mbụ nke njikọ Ọkpara ahụ nwere n’ebe Chineke nọ, sị:
“A ghọtara njikọ ahụ n’ụzọ doro anya dị ka nke ‘ịnọ n’okpuru’, ya bụ n’echiche nke ịnọ n’okpuru Kraịst n’ebe Chineke nọ. Ebe ọ bụla n’Agba Ọhụrụ e welitere njikọ dị n’etiti Jisọs na Chineke, bụ́ Nna, ka a tụlee, . . . a na-ekwu ya ma ọ bụ na-egosipụta ya kpọmkwem dị ka nke ịnọ n’okpuru. Onye nkụzi kasịkwa mkpa nke Ozizi Ịnọ n’Okpuru nke Agba Ọhụrụ, dị ka ihe ndekọ Ndị Yiri Ibe Ha na-egosi, bụ Jisọs n’onwe ya . . . Ọnọdụ mbụ nke a, nke siri nnọọ ike ma pụta ìhè dị ka ọ dị, nwere ike ịnọgide n’onwe ya ruo ogologo oge. ‘Oké ndị ọkà mmụta okpukpe nile tupu Nicaea gosipụtara ịnọ n’okpuru Logos ahụ n’ebe Chineke nọ.’”2
N’ikwenye na nke a, R. P. C. Hanson, n’akwụkwọ bụ́ The Search for the Christian Doctrine of God, na-ekwu, sị:
“E nweghị ọkà mmụta okpukpe ọ bụla na Chọọchị Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụ Ebe Ọdịda Anyanwụ tupu ntiwapụ nke Arụmụka Arius [na narị afọ nke anọ], bụ́ onye na-eleghị Ọkpara ahụ anya n’echiche ụfọdụ dị ka onye nọ n’okpuru Nna.”3
Dr. Alvan Lamson, n’akwụkwọ The Church of the First Three Centuries, na-etinye okwu akaebe nke a banyere nkụzi nke ndị isi chọọchị tupu Kansụl Nicaea (325 O.A.) sị:
“Ndị Nna dịrị tupu oge Nicaea n’ozuzu ha, ma ọ bụghị n’otu ụzọ ahụ, na-ekwupụta ịdị ala nke Ọkpara ahụ . . . Na ha na-ele Ọkpara ahụ anya dị ka onye dịpụrụ iche n’ebe Nna ahụ nọ pụtara ìhè site n’ọnọdụ ndị ha kwupụtara ịdị ala ya hoo haa na ha. . . . Ha lere ya anya dị ka onye dịpụrụ iche ma nọrọ n’okpuru.”4
N’otu aka ahụ, n’akwụkwọ bụ́ Gods and the One God, Robert M. Grant na-ekwu ihe na-esonụ banyere Ndị Nkwado Okwukwe:
“Nghọta ndị nkwado okwukwe nwere banyere Kraịst, dị ka nke Agba Ọhụrụ, bụ n’ụzọ bụ isi nke ozizi ịnọ n’okpuru. Mgbe nile Ọkpara ahụ na-anọ n’okpuru Nna ahụ, onye bụ otu Chineke ahụ nke Agba Ochie. . . . Ya mere, ihe anyị na-ahụ n’ebe ndị a dere akwụkwọ ná mbụ, abụghị ozizi Atọ n’Ime Otu . . . Tupu Nicaea, nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ozizi ịnọ n’okpuru n’ebe nile.”5
Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm na-akụzi na Ọkpara ahụ na Chineke Nna hà n’ịdị ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na n’amamihe. Ma Ndị Nkwado Okwukwe sịrị na Ọkpara ahụ na Chineke Nna ahaghị. Ha na-ele Ọkpara ahụ anya dị ka onye nọ n’okpuru. Nke ahụ abụghị nkụzi Atọ n’Ime Otu.
Ngosipụta nke Nkụzi Narị Afọ Mbụ
Ndị Nkwado Okwukwe na Ndị Nna Chọọchị ndị ọzọ nke oge mbụ gosipụtara n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ihe ndị Kraịst narị afọ mbụ kụziri banyere njikọ dị n’etiti Nna na Ọkpara. Rịba ama otú e si kwupụta nke a n’akwụkwọ bụ́ The Formation of Christian Dogma:
“N’ọgbọ Oge Gboo nke ndị Kraịst e nweghị ihe àmà ọ bụla nke ụdị ọ bụla nke nsogbu ma ọ bụ esemokwu Atọ n’Ime Otu, dị ka nke mesịrị weta ajọ nserịta okwu dị iche iche na Chọọchị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe kpatara nke a dabeere n’eziokwu ahụ bụ na, nye Iso Ụzọ Kraịst Oge Gboo, Kraịst bụ . . . onye nke ụwa ndị mmụọ ozi n’eluigwe dị elu, onye Chineke kere ma họpụta maka ọrụ nke iwebata, n’ọgwụgwụ nke ọgbọ nile, . . . Alaeze Chineke.”6
Ọzọkwa banyere nkụzi nke Ndị Nna Chọọchị oge mbụ, The International Standard Bible Encyclopedia na-ekweta, sị:
“N’echiche mbụ nke Chọọchị, ọnọdụ uche a na-enwe mgbe a na-ekwu banyere Chineke Nna bụ ịghọta Ya ná mbụ, ọ bụghị dị ka Nna nke Jisọs Kraịst, kama isi iyi nke ihe nile ọ bụla dị ndụ. Ya mere Chineke Nna bụ, dị ka ọ dị n’ezie, Chineke na-enweghị oyiri. Ọ bụ Ya ka nkọwa ndị dị ka enweghị mmalite, anwụghị anwụ, na-adịghị agbanwe agbanwe, a na-apụghị ịkọwa akọwa, a na-apụghị ịhụ anya na onye a na-ekeghị eke, dịịrị. Ọ bụ Ya mere ihe nile, gụnyere ihe ndị e jiri mee ihe n’okike, site n’ihe na-abụghị ihe. . . .
“Nke a pụrụ iyi ka ọ na-ekwu na nanị Nna ahụ bụ n’ezie Chineke, Ọkpara na Mmụọ nsọ bụkwa otu ihe ahụ n’ọkwá nke abụọ. Ọtụtụ okwu ndị e kwuru n’oge mbụ yiri ka ọ na-akwado nke a.”7
Ọ bụ ezie na akwụkwọ nkà ihe ọmụma nke a gara n’ihu ịgwagbu eziokwu ndị a na ikwu na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ nke a nakweere n’oge mbụ ahụ, ihe ndị mere eme na-egosi okwu ya ịbụ ụgha. Tụlee okwu nke onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik a ma ama bụ́ John Henry Cardinal Newman:
“Ka anyị kwere na ebe ndabere bụ isi nke ozizi nile, nke Onyenwe anyị bụ ihe a na-atụle, bụ nke Chọọchị Oge Gboo na-ekwupụta mgbe nile na n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ . . . Ma ọ bụ n’ezie ihe dị iche n’ozizi Katọlik nke Atọ n’Ime Otu. Ahụghị m n’ụzọ ọ bụla otú a pụrụ isi kwuo na e nwere nkwekọrịta ná nnakwere nke [ndị isi chọọchị] oge gboo nakweere ya . . .
“Ụkpụrụ okwukwe nke oge mbụ ahụ adịghị akpọtụ . . . [Atọ n’Ime Otu] aha ma ọlị. Ha kpọtụrụ aha Ndị Atọ n’ezie; ma na e nwere ihe omimi ọ bụla n’ozizi, nke na Ndị Atọ ahụ bụ Otu, na Ha hà nhata, hara n’ịdị ebighị ebi, a pụghị ike ha eke, ha nile nwere ike a na-akparaghị ókè, ha nile adịghị nke a pụrụ ịghọta aghọta, bụ nke a na-ekwughị, ọ dịghị mgbe a ga-aghọta ya site na ha.”8
Ihe Justin Martyr Kụziri
Otu n’ime Ndị Nkwado Okwukwe oge mbụ bụ Justin Martyr, onye biri ndụ site n’afọ 110 ruo 165 O.A. Ọ dịghị nke n’ihe ndị o dere ka dịnụ kwuru okwu banyere ndị atọ hà nhata n’otu Chineke.
Dị ka ihe atụ, dị ka Jerusalem Bible ndị Katọlik kwuru, Ilu 8:22-30 na-ekwu banyere Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ, sị: “Yahweh kere m mgbe mbụ nzube ya pụtara ìhè, tupu ihe kasị ochie n’ọrụ ya nile. . . . Ogbu mmiri adịbeghị, mgbe a mụrụ m . . . Tupu ugwu nile, a mụwo m . . . M nọ n’akụkụ ya [Chineke], onye isi nkà.” N’ịtụle amaokwu ndị a, Justin na-asị n’akwụkwọ ya bụ́ Dialogue With Trypho:
“Akwụkwọ nsọ ekwupụtawo na Nwa nke a bụ nke Nna ahụ mụrụ tupu ihe nile e kere eke; nakwa na nke ahụ e kere eke dị iche n’usoro ọnụ ọgụgụ n’ebe onye ahụ na-eke eke nọ, bụ ihe onye ọ bụla ga-ekwere.”9
Ebe ọ bụ na Chineke mụrụ Ọkpara ahụ, Justin na-eji okwu ahụ bụ “Chineke” eme ihe banyere Ọkpara ahụ. Ọ na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ First Apology, sị: “Nna nke eluigwe na ala nwere Ọkpara; onye bụkwa, ebe ọ bụ Okwu mbụ Chineke mụrụ, ọbụna Chineke.”10 Bible na-ejikwa utu aha ahụ bụ “Chineke” na-ezo aka n’ebe Ọkpara Chineke nọ. N’Aịsaịa 9:6 a kpọrọ ya “Chineke Nke bụ Dike.” Ma n’ime Bible, a kpọkwara ndị mmụọ ozi, ndị mmadụ, chi ụgha dị iche iche, na Setan “chi.” (Ndị mmụọ ozi: Abụ Ọma 8:5; tụlee Ndị Hibru 2:6, 7. Ụmụ mmadụ: Abụ Ọma 82:6. Chi ụgha: Ọpụpụ 12:12; 1 Ndị Kọrint 8:5. Setan: 2 Ndị Kọrint 4:4.) N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, okwu e nwere maka “Chineke,” ʼEl, pụtara n’ụzọ nkịtị “Onye Bụ Dike” ma ọ bụ “Onye Siri Ike.” Okwu ya na ya bụ otu n’Akwụkwọ Nsọ Grik bụ the·osʹ.
Ọzọ, okwu Hibru e jiri mee ihe n’Aịsaịa 9:6 na-egosi ọdịiche doro anya n’etiti Ọkpara na Chineke ahụ. N’ebe ahụ a kpọrọ Ọkpara ahụ “Chineke Nke bụ Dike,” ’El Gib·bohŕ, ọ bụghị “Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile.” Okwu ahụ na Hibru bụ ’El Shad·dai̇́, ọ dịkwaara nanị Jehova Chineke.
Otú ọ dị, rịba ama na ọ bụ ezie na Justin na-akpọ Ọkpara ahụ “Chineke,” ọ dịghị mgbe o kwuru na Ọkpara ahụ bụ otu n’ime ndị atọ hà nhata, nke nke ọ bụla n’ime ha bụ Chineke ma ha atọ bụrụ nanị otu Chineke. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Dialogue With Trypho, sị:
“E nwere . . . Chineke na Onyenwe anyị ọzọ [Jisọs ahụ tupu ọ ghọọ mmadụ] nke nọ n’okpuru Onye Mere ihe nile [Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile]; onye [Ọkpara] a kpọkwara Mmụọ Ozi, n’ihi na Ọ [Ọkpara ahụ] na-amara ụmụ mmadụ ọkwa ihe ọ bụla Onye Mere ihe nile—onye ọ na-adịghị Chineke ọzọ nọ ya n’elu—chọrọ ịmara ha ọkwa ya. . . .
“[Ọkpara ahụ] dịpụru iche site n’ebe Ọ nọ bụ́ onye mere ihe nile,—n’usoro ọnụ ọgụgụ ka m na-ekwu, ọ bụghị [ịdị iche] n’uche.”11
Otu akụkụ okwu na-adọrọ mmasị pụtara n’akwụkwọ Justin bụ́ First Apology, isiakwụkwọ nke 6, ebe ọ na-eme ngọpụ megide okwu ndị ọgọ mmụọ nke na ndị Kraịst ekweghị na Chineke dị. Ọ na-ede, sị:
“Ma Ya [Chineke], ma Ọkpara ahụ (onye sitere na Ya ma kụziere anyị ihe ndị a, ma ìgwè nke ezi ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ndị na-esonụ na ndị e mere dị ka Ya), ma Mmụọ ahụ na-ebu amụma, ka anyị na-efe ma na-asọpụrụ.”12
Otu onye nsụgharị nke akụkụ okwu a, bụ́ Bernhard Lohse, na-ekwu, sị: “Dị ka a ga-asị na o zughị ezu na ná ngụpụta nke a a kpọtụrụ ndị mmụọ ozi aha dị ka ndị dị adị nke ndị Kraịst na-efe ma na-asọpụrụ, Justin alaghị azụ n’ịkpọtụ ndị mmụọ ozi aha tupu ọ kpọtụ Mmụọ Nsọ aha.”13—Leekwa An Essay on the Development of Christian Doctrine.14
Ya mere, ọ bụ ezie na Justin Martyr pụrụ iyi ka ọ hapụwo ozizi dị ọcha nke Bible n’ihe banyere onye ofufe ndị Kraịst kwesịrị ịgara, o doro anya na o leghị Ọkpara ahụ anya dị ka onye ya na Nna ahụ hà, dịkwa ka a na-eleghị ndị mmụọ ozi anya dị ka ndị ha na Ya hà. Banyere Justin, anyị na-ehota ọzọ site n’akwụkwọ Lamson bụ́ Church of the First Three Centuries, sị:
“Justin lere Ọkpara ahụ anya dị ka onye dị iche n’ebe Chineke nọ, na onye dị ala karịa ya: dị iche, ọ bụghị, n’echiche oge a, dị ka nke na-emejupụta otu n’ime ndị atọ dịkọrọ ọnụ, . . . ma dịrị iche n’ọdịdị na n’ọnọdụ; na-enwe ịdị adị n’ezie nke ọ dịịrị onwe ya, dịrị iche n’ebe Chineke nọ, onye o sitere n’aka ya nweta ikike na utu aha ya nile; bụrụ onye e debere n’okpuru ya, nọrọ n’okpuru n’ihe nile n’ime uche ya. Nna ahụ dị elu karịa; Ọkpara ahụ nọ n’okpuru: Nna ahụ bụ isi iyi nke ike; Ọkpara ahụ bụ onye na-anata ike: Nna ahụ na-amalite; Ọkpara, dị ka onye ozi ma ọ bụ ngwá ọrụ ya, na-emezu ya. Ha dị abụọ n’ọnụ ọgụgụ, ma na-ekwekọ, ma ọ bụ bụrụ otu n’uche; uche Nna ahụ na-emezu mgbe nile n’ebe Ọkpara ahụ nọ.”15
Ọzọkwa, ọ dịghị ebe Justin kwuru na mmụọ nsọ bụ onye nke so Nna na Ọkpara hara. Ya mere ọ dịghị ụzọ a pụrụ isi kwuo n’eziokwu na Justin kụziri Atọ n’Ime Otu ọgbara ọhụrụ nke Krisendọm.
Ihe Clement Kụziri
Clement nke Alexandria (ihe dị ka 150 ruo 215 O.A.) kpọkwara Ọkpara ahụ “Chineke.” Ọbụna na ọ kpọrọ ya “Onye Okike,” okwu ọ na-adịghị mgbe e jiri ya mee ihe na Bible banyere Jisọs. Ọ̀ na-ekwu na Ọkpara ahụ na Onye Okike pụrụ ime ihe nile hà n’ụzọ nile? Ee e. Ihe àmà na-egosi na Clement na-ezo aka na Jọn 1:3, ebe ọ na-ekwu banyere Ọkpara ahụ, sị: “E kere ihe nile site n’aka ya.”16 Chineke jiri Ọkpara ahụ mee ihe dị ka onye e were n’ọrụ n’ọrụ okike Ya nile.—Ndị Kọlọsi 1:15-17.
Clement kpọrọ Chineke Kasị Elu “Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs”17 wee sị na “Onyenwe anyị bụ Ọkpara nke Onye Okike.”18 O kwukwara, sị: “Chineke nke ihe nile bụ nanị Onye Okike nke dị mma, nke ikpe ziri ezi, Ọkpara ahụ [nọ]kwa n’ime Nna.”19 Ya mere o dere na Ọkpara ahụ nwere Chineke nke ka ya elu.
Clement na-ekwu banyere Chineke dị ka “onye mbụ na onye ọ bụ nanị ya na-ekesa ndụ ebighị ebi, nke Ọkpara ahụ, onye natara ya n’aka Ya [Chineke], na-enye anyị.”20 O doro anya na onye mbụ ahụ Na-enye ndụ ebighị ebi dị elu karịa onye, dị ka a pụrụ ikwu ya, na-enye ya ndị ọzọ. Otú a, Clement na-ekwu na Chineke “bụ onye mbụ, na onye kasị elu.”21 Ọzọkwa, ọ na-asị na Ọkpara ahụ “nọ Ya bụ́ onye nanị ya bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nso karịsịa” nakwa na Ọkpara ahụ “na-enye iwu maka ihe nile n’ụzọ kwekọrọ n’uche Nna ahụ.”22 Site n’oge ruo n’oge Clement na-egosi ọkaaka nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile n’ebe Ọkpara ahụ nọ.
Banyere Clement nke Alexandria, anyị na-agụ n’akwụkwọ The Church of the First Three Centuries, sị:
“Anyị pụrụ ihota ọtụtụ akụkụ okwu sitere n’aka Clement bụ́ nke e gosiri nke ọma ịdị ala karị nke Ọkpara ahụ n’ime ha. . . .
“O juru anyị anya na onye ọ bụla pụrụ isite n’itinye uche n’ụzọ nkịtị gụọ ihe Clement dere ma chee n’otu mgbe na o lere Ọkpara ahụ anya iso Nna ahụ bụrụ otu—n’ọnụ ọgụgụ. A na-aghọta ọdịdị ndabere ya na nke ịdị ala ya, dị ka anyị chere, n’ebe nile. Clement kwere na Chineke na Ọkpara ahụ dịgasị iche n’ọnụ ọgụgụ; n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha bụ ndị abụọ dị adị,—otu dị elu karị, nke ọzọ nọ n’okpuru.”23
Ọzọ, a pụrụ ikwukwa, sị: Ọbụna ma a sị na o yiri mgbe ụfọdụ ka Clement gabigara ihe Bible na-ekwu banyere Jisọs, ọ dịghị ebe o kwuru banyere Atọ n’Ime Otu nke ndị atọ hà nhata n’ime otu Chineke mejupụtara. Ndị nkwado okwukwe dị ka Tatian, Theophilus, na Athenagoras, bụ́ ndị biri ndụ n’agbata oge Justin na nke Clement, nwere otu ụdị echiche ndị ahụ. Lamson na-asị na ha “emeghị nke ọma n’ịkwado Atọ n’Ime Otu karịa Justin n’onwe ya; ya bụ, ha ekweghị ná ndị Atọ ọ bụla a na-ekewaghị ekewa, ndị hà nhata, kama ha kụziri ozizi nke a na-apụghị ijikọ n’ozuzu ya ma ọlị na nkwenkwe nke a.”24
Nkà Mmụta Okpukpe Tertullian
Tertullian (ihe dị ka 160 ruo 230 O.A.) bụ onye mbụ jiri okwu Latin ahụ bụ́ trinitas mee ihe. Dị ka Henry Chadwick rịbara ama, Tertullian nyere echiche nke bụ na Chineke bụ ‘otu ihe nke ndị atọ mejupụtara.’25 Otú ọ dị, nke a apụtaghị na o bu n’uche ndị atọ hà nhata na ndị na-adịru ebighị ebi n’ụzọ hà nhata. Otú ọ dị, ndị dere ihe mgbe e mesịrị gbakwasịrị ụkwụ n’echiche ya wee wulite nke ha, bụ́ ndị na-eme ihe iji welite ozizi Atọ n’Ime Otu.
Nghọta Tertullian banyere Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ dị nnọọ iche site n’Atọ n’Ime Otu Krisendọm, n’ihi na ọ bụ onye na-akwado ozizi ịnọ n’okpuru. O lere Ọkpara ahụ anya dị ka onye nọ n’okpuru Nna ahụ. N’akwụkwọ bụ́ Against Hermogenes, o dere, sị:
“Anyị ekwesịghị iche na e nwere onye ọzọ e wezụga nanị Chineke nke a na-amụghị amụ na onye a na-ekeghị eke. . . . Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ na ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga Nna ahụ, kwesịrị ime okenye karị, banyekwara nke a, bụrụ onye a maara aha ya karị n’ezie, karịa Ọkpara Chineke, Okwu ahụ a mụrụ nanị ya na nke mbụ a mụrụ? . . . Na [Chineke] nke ọ na-adịghị mkpa ka e nwee Onye Mere ya ime ka ọ dịrị, ga-abụ nke e buliri elu n’ọkwá karịa [Ọkpara ahụ] nke nwere onye mere ya ime ka ọ dịrị adị.”26
Ọzọ, n’akwụkwọ Against Praxeas o gosiri na Ọkpara ahụ dị iche ma nọrọ n’okpuru Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile site n’ikwu, sị:
“Nna ahụ bụ ihe ahụ dum, ma Ọkpara bụ ihe e sitere n’ihe ahụ nweta na akụkụ nke ozuzu ya, dị ka Ya Onwe Ya kwetara: ‘Nna m karịrị mụ onwe m ukwuu.’ . . . Otú a Nna ahụ dịpụrụ iche n’ebe Ọkpara ahụ nọ, na-adị ukwuu karịa Ọkpara ahụ, ebe ọ bụ na Onye ahụ nke mụrụnụ bụ otu onye, Onye ahụ nke a mụtara abụrụkwa onye ọzọ; Ya onwe ya kwa, nke na-ezite bụ otu onye, Onye nke na-ezigakwa bụ onye ọzọ; ọzọ, Ya onwe ya kwa nke na-eme ihe bụ otu onye, Onye nke e sitekwara na ya mee ihe ahụ bụ onye ọzọ.”27
Tertullian, n’akwụkwọ Against Hermogenes, na-ekwukwa na e nwere oge mgbe Ọkpara ahụ na-adịghị adị dị ka onye, na-egosi na o leghị Ọkpara ahụ anya dị ka onye na-adịru ebighị ebi n’otu echiche ahụ Chineke na-adịru.28 Cardinal Newman sịrị: “A ghaghị ile Tertullian anya dị ka onye mmegide ozizi [na-ekwere ozizi ndị dị iche n’ihe ndị ọzọ kwere] n’ihe banyere ozizi nke mmalite ebighị ebi nke Onyenwe anyị.”29 Banyere Tertullian, Lamson kwupụtara, sị:
“Ihe a kpatara ihe, ma ọ bụ Logos, dị ka ndị Grik si akpọ ya, dị ka Tertullian kwetara, mesịrị bụrụ nke a gbanwere ịbụ Okwu ahụ, ma ọ bụ Ọkpara ahụ, ya bụ, onye dị adị n’ezie, ebe ọ dịworo site na mgbe ebighị ebi dị ka ihe dị ná Nna ahụ. Otú ọ dị, Tertullian kenyere ya ọkwá nke dị n’okpuru Nna ahụ . . .
“A tụlee ya site ná nkọwa ọ bụla e nwetara banyere Atọ n’Ime Otu n’ụbọchi a, mgbalị e mere ịzọpụta Tertullian site n’ọmụma ikpe [dị ka onye na-ekweghị ekwe] ga-akụ afọ n’ala. Ọ pụghị iguzogide ule ahụ otu mgbe.”30
Ọ Dịghị Atọ n’Ime Otu Dịnụ
Ọ bụrụ na ị gụọ okwu nile nke Ndị Nkwado Okwukwe, ị ga-achọpụta na n’agbanyeghị na ha hiere ụzọ n’akụkụ ụfọdụ site n’ihe ndị Bible kụziri, ọ dịghị nke n’ime ha kụziri na Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na mmụọ nsọ hà nhata, n’ịdị ebighị ebi, n’ike, n’ọkwá, na n’amamihe.
Nke a bụkwa eziokwu banyere ndị ọzọ dere ihe na narị afọ nke abụọ na nke atọ, dị ka Irenaeus, Hippolytus, Origen, Cyprian, na Novatian. Ọ bụ ezie na ụfọdụ kwuru na Nna na Ọkpara ahụ hà n’akụkụ ụfọdụ, n’ụzọ ndị ọzọ ha lere Ọkpara ahụ anya dị ka onye nọ n’okpuru Chineke Nna ahụ. Ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha chedịrị ọbụna echiche na mmụọ nsọ na Nna ahụ na Ọkpara ahụ hà. Dị ka ihe atụ, Origen (ihe dị ka 185 ruo 254 O.A.) na-ekwu na Ọkpara Chineke bụ “onye mbụ a mụrụ n’ihe nile e kere” nakwa na Akwụkwọ nsọ “kwuru na Ọ bụ onye kasị ochie n’ọrụ okike nile.”31
Ọgụgụ ọ bụla ziri ezi nke akwụkwọ chọọchị oge mbụ ndị a ga-egosi na ozizi Atọ n’Ime Otu nke ndị Krisendọm adịghị adị n’oge ha. Dị ka akwụkwọ The Church of the First Three Centuries na-ekwu, sị:
“Ozizi ọgbara ọhụrụ na-ewu ewu nke Atọ n’Ime Otu . . . adịghị enweta nkwado ọ bụla site n’okwu nile nke Justin: a pụkwara iji nghọta nke a mee ihe banyere Ndị Nna Chọọchị nile tupu oge Nicaea; ya bụ, banyere ndị Kraịst nile dere akwụkwọ na narị afọ nke atọ mgbe ọmụmụ Kraịst gasịrị. Ọ bụ eziokwu na ha na-ekwu banyere Nna, Ọkpara na Mmụọ ahụ nke na-ebu amụma ma ọ bụ nke dị nsọ, ma ọ bụghị dị ka nke hà nhata, ọ bụghị dị ka nke bụ otu ihe n’ọnụ ọgụgụ, ọ bụghị dị ka Atọ dị n’ime Otu, n’echiche ọ bụla ndị nkwado Atọ n’Ime Otu na-ekweta ugbu a. Nke a abụghị ezie ma ọlị. Ozizi Atọ n’Ime Otu, dị ka Ndị Nna ndị a kọwara ya, dị iche n’ụzọ bụ isi site n’ozizi ọgbara ọhụrụ. Nke a ka anyị na-ekwu dị ka ihe bụ eziokwu nke ga-eguzosi ike n’ihu nnwapụta ọ bụla dị ka ihe ọ bụla bụ ezie n’akụkọ ihe mere eme nke echiche ụmụ mmadụ.”32
N’ezie, tupu Tertullian a kpọtụdịghị Atọ n’Ime Otu aha. “Echiche megidere ihe ọha kwere na ya” nke Tertullian banyere Atọ n’Ime Otu dịkwa iche nke ukwuu site na nke ahụ e kwere na ya taa. Mgbe ahụ, olee otú ozizi Atọ n’Ime Otu, dị ka a ghọtara ya taa, si malite. Ọ̀ bụ na Kansụl nke Nicea n’afọ 325 O.A.? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a n’Akụkụ nke 4 nke usoro isiokwu ndị a ná mbipụta Ụlọ Nche nke na-abịa n’ọdịnihu.
Ntụaka:
1. A Short History of the Early Church, nke Harry R. Boer dere, 1976, peji nke 110.
2. The Formation of Christian Dogma, nke Martin Werner dere, 1957, peji nke 125.
3. The Search for the Christian Doctrine of God, nke R. P. C. Hanson dere, 1988, peji nke 64.
4. The Church of the First Three Centuries, nke Alvan Lamson dere, 1869, peji nke 70-71.
5. Gods and the One God, nke Robert M. Grant dere, 1986, peji nke 109, 156, 160.
6. The Formation of Christian Dogma, peji nke 122, 125.
7. The International Standard Bible Encyclopedia, 1982, Mpịakọta 2, peji nke 513.
8. An Essay on the Development of Christian Doctrine, nke John Henry Cardinal Newman dere, Mbipụta nke Isii, 1989, peji nke 14-18.
9. The Ante-Nicene Fathers, nke Alexander Roberts na James Donaldson bụ editọ ya, Mbipụtaghachi nke America nke Mbipụta Edinburgh, 1885, Mpịakọta nke 1, peji nke 264.
10. Ibid., peji nke 184.
11. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 1, peji nke 223.
12. Ibid., peji nke 164.
13. A Short History of Christian Doctrine, nke Bernhard Lohse dere, nke F. Ernest Stoeffler sụgharịta site n’asụsụ German, 1963, obibi nke abụọ nke mkpo ya siri ike, 1980, peji nke 43.
14. An Essay on the Development of Christian Doctrine, peji nke 20.
15. The Church of the First Three Centuries, peji nke 73-74, 76.
16. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 2, peji nke 234.
17. Ibid., peji nke 227.
18. Ibid., peji nke 228.
19. Ibid.
20. Ibid., peji nke 593.
21. Ibid.
22. Ibid., peji nke 524.
23. The Church of the First Three Centuries, peji nke 124-125.
24. Ibid., peji nke 95.
25. The Early Church, nke Henry Chadwick dere, obibi nke 1980, peji nke 89.
26. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 3, peji nke 487.
27. Ibid., peji nke 603-604.
28. Ibid., peji nke 478.
29. An Essay on the Development of Christian Doctrine, peji nke 19, 20.
30. The Church of the First Three Centuries, peji nke 108-109.
31. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 4, peji nke 560.
32. The Church of the First Three Centuries, peji nke 75-76.
[Foto dị na peeji nke 27]
Clement
[Ebe E Si Nweta Foto]
Historical Pictures Service
[Foto dị na peeji nke 28]
Tertullian
[Ebe E Si Nweta Foto]
Historical Pictures Service