Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 6 p. 50-59
  • Ihe Iseokwu nke Anyị Nile Na-aghaghị Iche Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Iseokwu nke Anyị Nile Na-aghaghị Iche Ihu
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Akụkọ Ihe Mere Eme Gosipụtaworo
  • Ịdị Ndụ Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ Chineke
  • Otú Ha Si Meghachi Omume n’Ihe Iseokwu Ahụ
  • Gịnị Bụ Azịza nke Anyị?
  • Ihe Iseokwu Nke Metụtara Gị
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Jehova Bụ Ọkaakaa Onyenwe Anyị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • N’ihi Gịnị Ka O Jiworo Wee Ogologo Oge Idozi Ihe Iseokwu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 6 p. 50-59

Isi nke Isii

Ihe Iseokwu nke Anyị Nile Na-aghaghị Iche Ihu

1, 2. (a) Ihe iseokwu dị aṅaa ka Setan kpalitere n’Iden? (b) Olee otú e si gosipụta ihe iseokwu ahụ site n’ihe o kwuru?

I SO n’ihe iseokwu kasị mkpa nke chetụworo ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Ebe ị kwụ n’ihe iseokwu a ga-ekpebi ihe ga-abụ ọdịnihu ebighị ebi gị. A kpalitere ihe iseokwu a mgbe e nwere nnupụisi n’Iden. Laa azụ n’oge ahụ, Setan jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Ọ zara ya na Chineke kwuru banyere otu osisi, sị: “Unu erila mkpụrụ sitere na ya . . . ka unu wee ghara ịnwụ.” Setan boziri Jehova ebubo kpọmkwem na ọ ghara ụgha, na-ekwu na ma ndụ Iv ma nke Adam dị enweghị nke dabeere n’irubere Chineke isi. Setan kwuru na Chineke achọghị inye ihe ndị o kere ihe dị mma—ikike isetịpụrụ onwe ha ụkpụrụ ná ndụ. Setan kwusiri ike, sị: “Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.”—Jenesis 3:1-5.

2 Ya bụ, Setan na-ekwu na ọ ga-akara ụmụ mmadụ mma imewere onwe ha mkpebi kama irube isi n’iwu Chineke. O si otú a maa ụzọ Chineke si na-achị achị aka. Nke a kpalitere ihe iseokwu dị oké mkpa banyere ọbụbụeze nke Chineke n’eluigwe na ala, ya bụ, oruru o ruuru ya ịchị achị. A kpalitere ajụjụ bụ́: Olee nke kaara ụmụ mmadụ mma, ụzọ Jehova si na-achị ka ọ bụ ịchịisi n’adabereghị n’ebe ọ nọ? Jehova pụrụ igbuworị Adam na Iv ozugbo ahụ, ma nke ahụ agaraghị edoziworị ihe iseokwu ahụ banyere ọbụbụeze n’ụzọ ga-eju afọ. Site n’ikwe ka ọha mmadụ mụbaa ruo nnọọ ogologo oge, Chineke pụrụ igosi kpọmkwem ihe adabereghị n’ebe ọ nọ na n’ebe iwu ya dị ga-arụpụta.

3. Olee ihe iseokwu nke abụọ Setan kpalitere?

3 Aka Setan mara oruru o ruuru Jehova ịchị achị akwụsịghị n’ihe mere n’Iden. O mere ka a na-enyo iguzosi ike n’ihe nke ndị ọzọ nye Jehova enyo. Nke a ghọrọ ihe ịma aka nke abụọ e jikọtara ya na nke mbụ ahụ n’ụzọ chiri anya. Aka ahụ ọ mara gbasara wee gụnye ma ụmụ Adam na Iv ma ụmụ Chineke nile bụ́ mmụọ, ọbụna Ọkpara Jehova buru ụzọ mụọ, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, n’oge Job, Setan rụrụ ụka na ndị na-ejere Jehova ozi na-ejere ya ozi n’ihi ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị, ọ bụghị n’ihi na ha hụrụ Chineke na ụzọ o si na-achị n’anya. Ọ rụrụ ụka na mgbe ha nwere ihe isi ike na ha nile ga-achọ ọdịmma onwe ha nanị.—Job 2:1-6; Mkpughe 12:10.

Ihe Akụkọ Ihe Mere Eme Gosipụtaworo

4, 5. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme meworo ka o doo anya banyere mmadụ iduzi nzọụkwụ ya?

4 Otu isi ihe dị mkpa n’ihe iseokwu ahụ banyere ọbụbụeze bụ nke a: Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ịdị ndụ n’adabereghị n’ịchịisi ya ma nwee ihe ịga nke ọma. Maka abamuru nke ha, o mere ha ịdị na-adabere n’iwu ya ndị ziri ezi. Jeremaịa onye amụma kwetara, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.” (Jeremaịa 10:23, 24) Ya mere, Okwu Chineke na-agba ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị.” (Ilu 3:5) Dị nnọọ ka Chineke kere ihe a kpọrọ mmadụ ido onwe ha n’okpuru iwu ndị na-achị ihe e kere eke iji nọgide na-adị ndụ, o mekwara iwu ndị na-achịkwa omume, bụ́ ndị ga-eme ka e nwee ọha mmadụ dị n’udo ma ọ bụrụ na e rube isi na ha.

5 N’ụzọ doro anya, Chineke maara na ezinụlọ mmadụ apụghị ịchịkwa onwe ya ma e wezụga ịchịisi ya. Ná mgbalị na-enweghị isi ha na-eme ime ka ịchịisi nke na-adabereghị n’ebe Chineke nọ gaa nke ọma, ụmụ mmadụ eguzobewo ụdị usoro ọchịchị, nke akụ̀ na ụba, na nke okpukpe dị iche iche. Ndịrịta iche ndị a emewo ka ụmụ mmadụ na ibe ha na-ese okwu mgbe nile, na-akpata ime ihe ike, agha, na ọnwụ. ‘Mmadụ enwewo ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe meworonụ n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. Dị ka e buru n’amụma n’ime Okwu Chineke, ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie anọgidewo “na-ajọwanye njọ.” (2 Timoti 3:13) Na narị afọ nke 20 kwa, bụ́ mgbe ihe a kpọrọ mmadụ nwere ọganihu dị ukwuu na nkà mmụta sayensị nakwa ná mmepụta ihe, e nwekwara ọdachi ndị kasị njọ e nwetụrụla. Ihe Jeremaịa 10:23 kwuru edowo anya—e keghị ụmụ mmadụ iduzi nzọụkwụ ha.

6. Olee otú Chineke ga-esi dozie okwu banyere mmadụ adabereghị n’ebe ọ nọ n’isi nso?

6 Ihe ọjọọ ndị na-adịte aka, bụ́ ndị siworo n’adabereghị n’ebe Chineke nọ pụta egosipụtawo n’ụzọ doro anya na ọ dịghị mgbe ịchịisi ụmụ mmadụ ga-aga nke ọma. Ịchịisi Chineke bụ nanị ụzọ a ga-esi nweta obi ụtọ, ịdị n’otu, ahụ́ ike, na ndụ. Okwu Chineke na-egosikwa na nhapụ Jehova hapụrụ ka ịchịisi ụmụ mmadụ dịrị n’adabereghị n’ebe ọ nọ na-eru ná njedebe ya. (Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5) N’isi nso, ọ ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ iji gosipụta ịchịisi ya n’elu ala. Amụma Bible na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [ịchịisi ụmụ mmadụ ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie [n’eluigwe], nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ [ụmụ mmadụ agaghị achịkwa ụwa ọzọ]; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.

Ịdị Ndụ Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ Chineke

7. Mgbe ịchịisi Chineke ga-eme ka ịchịisi ụmụ mmadụ kwụsị, olee ndị ga-alanarị?

7 Mgbe ịchịisi Chineke ga-eme ka ịchịisi ụmụ mmadụ kwụsị, olee ndị ga-alanarị? Bible na-aza, sị: “Ndị ziri ezi [ndị na-akwado oruru o ruuru Chineke ịchị achị] ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu [ndị na-adịghị akwado oruru o ruuru Chineke ịchị achị] ka a ga-ebipụ n’ụwa.” (Ilu 2:21, 22) N’otu aka ahụ, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:10, 29.

8. Olee otú Chineke ga-esi gosipụta n’ụzọ zuru ezu oruru o ruuru ya ịbụ eze?

8 Mgbe e bibisịrị usoro ihe Setan, Chineke ga-eweta ụwa ọhụrụ ya, bụ́ nke ga-ewepụ kpam kpam ime ihe ike, agha, ịda ogbenye, nhụjuanya, ọrịa, na ọnwụ, bụ́ ndị na-eweta oké mbibi, ndị jichiworo ihe a kpọrọ mmadụ eri ọtụtụ puku afọ. Bible kọwara n’ụzọ mara mma ngọzi ndị na-echere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi, sị: “Ọ [Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Site n’ọchịchị Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Kraịst, Chineke ga-egosipụta (nwapụta, ma ọ bụ mee ka o doo anya) n’ụzọ zuru ezu oruru o ruuru Ya ịbụ Eze anyị, ya bụ, Onye Ọchịchị anyị.—Ndị Rom 16:20; 2 Pita 3:10-13; Mkpughe 20:1-6.

Otú Ha Si Meghachi Omume n’Ihe Iseokwu Ahụ

9. (a) Olee otú ndị nọgideworo na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova siworo were okwu ya? (b) Olee otú Noa si gosipụta iguzosi ike n’ihe ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe nlereanya ya?

9 N’akụkọ ihe mere eme nile, e nwewo ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe, bụ́ ndị gosipụtaworo iguzosi ike n’ihe ha nye Jehova dị ka Eze. Ha maara na ndụ ha dabeere n’ịṅa ya ntị na n’irubere ya isi. Noa bụ otu n’ime ha. Ya mere, Chineke gwara Noa, sị: “Ọgwụgwụ anụ ahụ́ nile abịawo n’ihu m . . . Meere onwe gị ụgbọ.” Noa rubekwara isi ná ntụziaka Jehova. N’agbanyeghị na a dọrọ ha aka ná ntị, ndị ọzọ nọ n’oge ahụ nọ na-adị ndụ ha ka a ga-asị na ọ dịghị ihe pụrụ iche gaje ime. Ma Noa wuru otu nnukwute ụgbọ ma nọgide na-ekwusara ndị ọzọ banyere ụzọ ezi omume nke Jehova. Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.”—Jenesis 6:13-22; Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5.

10. (a) Olee otú Ebreham na Sera si kwadoo ọbụbụeze Jehova? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi rite uru n’ihe nlereanya Ebreham na Sera?

10 Ebreham na Sera bụkwa ezi ihe nlereanya n’ịkwado ọbụbụeze Jehova, na-eme ihe ọ bụla o nyere ha iwu ka ha mee. Ha biri na Ua nke Kaldea, bụ́ obodo ego dị na ya. Ma mgbe Jehova gwara Ebreham ka ọ gaa n’ala ọzọ, ala nke ọ na-amabughị, Ebreham “wee jee, dị ka Jehova gwara ya.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ahụ́ ruru Sera ala—o nwere ebe obibi, ndị enyi na ndị ikwu. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro onwe ya n’okpuru Jehova nakwa di ya ma gaa n’ala Kenan, ọ bụ ezie na ọ maghị otú ọnọdụ ga-adịrị ya n’ebe ahụ.—Jenesis 11:31–12:4; Ọrụ 7:2-4.

11. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Mozis kwadoro ọbụbụeze Jehova? (b) Olee otú ihe nlereanya Mozis pụrụ isi baara anyị uru?

11 Mozis bụ onye ọzọ nke kwadoro ọbụbụeze Jehova. O mekwara nke a n’ọnọdụ ndị siri oké ike—na-ezute Fero nke Ijipt ihu na ihu. Mozis atụkwasịghị obi n’ikike nke ya. Kama nke ahụ, obi esichaghị ya ike na ọ pụrụ ikwu okwu nke ọma otú o kwesịrị. Ma o rubeere Jehova isi. Site ná nkwado Jehova nakwa enyemaka nke nwanne ya nwoke, bụ́ Erọn, Mozis gwara Fero ahụ kpọrọ ekwo nkụ okwu Jehova ugboro ugboro. Ọbụna ụfọdụ n’ime ụmụ Izrel katọrọ Mozis ajọ nkatọ. Ma, Mozis ji iguzosi ike n’ihe mee ihe nile Jehova nyere ya n’iwu, sitekwa n’aka ya, a napụtara ndị Izrel n’Ijipt.—Ọpụpụ 7:6; 12:50, 51; Ndị Hibru 11:24-27.

12. (a) Gịnị na-egosi na iguzosi ike n’ihe nye Jehova na-agụnye ihe karịrị nanị ime ihe Chineke kwuru kpọmkwem nke e dere ede? (b) Olee otú ịghọta ụdị iguzosi ike n’ihe a pụrụ isi nyere anyị aka itinye 1 Jọn 2:15 n’ọrụ?

12 Ndị guzosiri ike n’ihe nye Jehova echeghị n’uche ha na ihe a chọrọ ha n’aka agwụla irube isi n’ihe ndị Chineke mere ka e detuo. Mgbe nwunye Pọtịfa nwara ịrata Josef ka o soro ya nwee mmekọahụ, e nweghị iwu e dere ede Chineke nyere nke machibidoro ịkwa iko. Otú ọ dị, Josef maara ndokwa alụmdi na nwunye nke Jehova malitere n’Iden. Ọ maara na isoro nwunye onye ọzọ nwee mmekọahụ agaghị amasị Chineke. Josef achọghị ịnwale otú Chineke ga-ahapụru ya imewe ka ndị Ijipt. Ọ gbasoro ụzọ nke Jehova site n’ịtụgharị uche n’otú Chineke si na-emeso ihe a kpọrọ mmadụ, mgbe ahụ jiri ịdị uchu na-etinye ihe ọ ghọtara bụ́ uche Chineke n’ọrụ.—Jenesis 39:7-12; Abụ Ọma 77:11, 12.

13. Olee otú e si gosi na Ekwensu bụ onye ụgha n’ihe banyere (a) Job? (b) ndị Hibru atọ ahụ?

13 Ọ bụrụgodị na e lee ha ule tara akpụ, ndị maara Jehova n’ezie adịghị agbakụta ya azụ. Setan kwuru na ọ bụrụ na ọtụtụ ihe onwunwe ndị Job nwere ma ọ bụ ahụ́ ike ya efunahụ ya, ọbụna Job n’onwe ya—onye Jehova kwuru nnọọ okwu ọma banyere ya—ga-agbakụta Chineke azụ. Ma Job gosiri na Ekwensu bụ onye ụgha, ọ bụ ezie na Job n’onwe ya amaghị ihe mere ọdachi ji na-ezokwasị ya ka mmiri. (Job 2:9, 10) Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, ka ọ ka nọ na-agbalị ịnwapụta ihe o kwuru, Setan mere ka eze Babilọn, bụ́ onye iwe ji, jiri ịnwụ n’ime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu yie ndị Hibru atọ na-eto eto egwu ma ọ bụrụ na ha akpọghị isiala ma fee ihe oyiyi nke eze ahụ guzobere ofufe. N’ịbụ ndị a manyere ime nhọrọ n’agbata irubere iwu ahụ eze nyere isi na irubere iwu Jehova nyere megide ikpere arụsị isi, ha mere ka a mara n’enweghị obi abụọ ọ bụla na ọ bụ Jehova ka ha na-ejere ozi nakwa na ọ bụ ya bụ Eze Kasị Elu ha nwere. Ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke dị oké ọnụ ahịa nye ha karịa ndụ ha dị n’oge ahụ!—Daniel 3:14-18.

14. Olee otú ọ ga-esi kwe anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume igosi na anyị na-eguzosi ike n’ihe n’ezie nye Jehova?

14 Ànyị ga-ekwubi site n’ihe atụ ndị dị otú ahụ na mmadụ aghaghị ịbụ onye zuru okè iji guzosie ike n’ihe nye Jehova ma ọ bụkwanụ na onye mehiere ihe adawo kpam kpam? Ọ dịghị ma ọlị! Bible na-agwa anyị na Mozis mehiere ihe mgbe ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ọ tọghị Jehova ụtọ, ọ jụghị Mozis. Ndịozi Jizọs Kraịst nwekwara adịghị ike nke ha. N’iburu ezughị okè anyị ketara eketa n’uche, ọ na-atọ Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị adịghị ama ụma na-eleghara uche ya anya n’ụzọ ọ bụla. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọjọọ n’ihi adịghị ike, ọ dị mkpa ka anyị jiri obi eziokwu chegharịa ma ghara ịnọgide na-eme ihe ọjọọ ahụ. N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosipụta na anyị hụrụ ihe Jehova sịrị na ọ dị mma n’anya n’ezie ma na-akpọ ihe o kwuru na ọ dị njọ asị. Dabere n’okwukwe anyị nwere n’ikike mkpuchi mmehie nke àjà Jizọs, anyị pụrụ ịbụ ndị dị ọcha n’anya Chineke.—Emọs 5:15; Ọrụ 3:19; Ndị Hibru 9:14.

15. (a) Ònye n’etiti ihe nile a kpọrọ mmadụ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’ụzọ zuru okè, gịnịkwa ka nke a gosiri? (b) Olee otú ihe Jizọs mere si enyere anyị aka?

15 Ka o sina dị, ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ gaghị nnọọ ekwe ụmụ mmadụ omume irube isi n’ụzọ zuru okè n’ọbụbụeze Jehova? Azịza nke ajụjụ a yiri “ihe nzuzo dị nsọ” ruo ihe dị ka afọ 4,000. (1 Timoti 3:16) Adam, ọ bụ ezie na o zuru okè mgbe e kere ya, esetịpụghị ihe nlereanya zuru okè n’igosi nsọpụrụ Chineke. Ònyezi pụrụ isetịpụ ya? N’ezie ọ dịghị onye ga-esetịpụli ya n’ime ụmụ ya nile na-eme mmehie. Nanị mmadụ meliri ya bụ Jizọs Kraịst. (Ndị Hibru 4:15) Ihe Jizọs rụzuru gosiri na Adam, bụ́ onye nwere ọnọdụ ka mma, gaara anọgidewo na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè ma ọ bụrụ na ọ chọrọ. Nsogbu ahụ esighị n’ihe Chineke kere. Ya mere, Jizọs Kraịst bụ ihe nlereanya anyị na-achọ iṅomi ọ bụghị nanị n’igosipụta nrubeisi nye iwu Chineke kamakwa na mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova, bụ́ Eze Eluigwe na Ala.—Deuterọnọmi 32:4, 5.

Gịnị Bụ Azịza nke Anyị?

16. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nọrọ na nche mgbe nile banyere àgwà anyị n’ebe ọbụbụeze Jehova dị?

16 Onye ọ bụla n’ime anyị taa aghaghị iche ihe iseokwu banyere ọbụbụeze nke eluigwe na ala ihu. Ọ bụrụ na anyị ekwupụtawo n’ihu ọha na anyị nọ n’akụkụ nke Jehova, Setan ga-elekwasị anyị anya. Ọ ga-esi n’akụkụ nile na-eweta nrụgide, ọ ga-anọgidekwa na-eme otú ahụ ruo ná njedebe nke ajọ usoro ihe ya. Anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe nile. (1 Pita 5:8) Àgwà anyị na-egosi ebe anyị kwụ n’ihe iseokwu ahụ kachasịnụ nke metụtara ọbụbụeze Jehova na n’ihe iseokwu nke abụọ banyere iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’agbanyeghị ule. Anyị agaghị anwa anwa were àgwà eguzosighị ike n’ihe dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ nanị n’ihi na o jupụtara n’ụwa. Ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe na-achọ ka anyị gbalịsie ike ịdị na-agbaso ụzọ ezi omume Jehova n’okwu ọ bụla ná ndụ.

17. Olee ebe ịgha ụgha na izu ohi malitere bụ́ nke kwesịrị ime ka anyị zere ha?

17 Dị ka ihe atụ, anyị agaghị eṅomi Setan, bụ́ “nna nke ụgha.” (Jọn 8:44) Anyị aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu n’ihe ọ bụla anyị na-eme. N’usoro ihe Setan, ndị na-eto eto adịghị agwakebe ndị mụrụ ha eziokwu. Ma ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst na-ezere nke a, ha na-esikwa otú a egosipụta na ebubo Setan ahụ, nke bụ́ na ndị Chineke agaghị eguzosi ike n’ezi ihe mgbe ha nọ n’ule, bụ ụgha. (Job 1:9-11; Ilu 6:16-19) E nwekwara omume achụmnta ego ndị pụrụ ime ka a gụnyekọta mmadụ na “nna nke ụgha,” kama ịgụnyekọta ya na Chineke nke eziokwu. Anyị na-ezere ha. (Maịka 6:11, 12) Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe izu ohi ziri ezi, ọ bụrụgodị na mmadụ nọ ná mkpa ma ọ bụ na onye e zuuru ihe ya bụ ọgaranya. (Ilu 6:30, 31; 1 Pita 4:15) Ọ bụrụgodị na ọ bụ ihe a na-emekarị n’ógbè ebe anyị bi ma ọ bụ na ihe e zuuru dị ntakịrị, izu ohi ka bụ imebi iwu Chineke.—Luk 16:10; Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:28.

18. (a) N’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ule dị aṅaa ga-abịara ihe nile a kpọrọ mmadụ? (b) Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịzụlite ugbu a?

18 N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-anọ n’abis, ha agaghị enwe ike inwe mmetụta n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ. Lee ahụ́ efe nke ahụ ga-abụ! Ma mgbe otu puku afọ ahụ gasịrị, a ga-atọpụ ha ruo nwa oge. Setan na ndị na-eso ya ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ e weghachiri eweghachi bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke nrụgide. (Mkpughe 20:7-10) Ọ bụrụ na anyị nwere ihe ùgwù nke ịdị ndụ mgbe ahụ, gịnị ga-abụ mmeghachi omume anyị n’ebe ihe iseokwu ahụ banyere ọbụbụeze eluigwe na ala dị? Ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-ezu okè mgbe ahụ, omume ọ bụla nke eguzosighị ike n’ihe ga-abụ nke e leziri anya mee, ọ ga-akpatakwa mbibi ebighị ebi. Lee ka o si dị oké mkpa na anyị zụlitere ugbu a, àgwà nke iji nrubeisi na-aṅa ntị ná nduzi ọ bụla Jehova na-enye anyị, ma ọ bụ site n’Okwu ya ma ọ bụ site n’ọgbakọ ya! Site n’ime otú ahụ, anyị na-egosi ezi nrara anyị raara onwe anyị nye ya dị ka Eze Eluigwe na Ala.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• Gịnị bụ oké ihe iseokwu anyị nile na-aghaghị iche ihu? Olee otú o si gụnye anyị?

• Olee ihe kwesịrị ịrịba ama banyere ụzọ ndị ikom na ndị inyom oge ochie si gosipụta iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Jehova?

• N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị na-asọpụrụ Jehova kwa ụbọchi site n’omume anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya