Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 11/15 p. 8-9
  • Daniel Fere Chineke Mgbe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Daniel Fere Chineke Mgbe Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Atụmatụ Aghụghọ
  • Daniel Anọgide Na-eguzosi Ike
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Onye A Napụtara n’Ọnụ Ọdụm!
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Daniel Nọ n’Olulu Ọdụm
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 11/15 p. 8-9

Ha Mere Uche Jehova

Daniel Fere Chineke Mgbe Nile

AKỤKỌ ihe mere eme ịgbanwe n’otu ntabi anya bụ ihe a na-adịghị ahụkebe. Ma, nke ahụ mere na 539 T.O.A., mgbe ndị Midia na Peasia kwaturu Alaeze Ukwu Babilọn nanị n’ime hour ole na ole. Ka ọ na-erule n’afọ ahụ, onye amụma Jehova bụ́ Daniel anọwo na-ebi na Babilọn dị ka onye Juu a dọtara n’agha ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 80. Ma eleghị anya n’afọ ndị 90 ya, Daniel na-aga iche otu n’ime ule kasị ukwuu nke iguzosi ike n’ezi ihe ya nye Chineke ihu.

Mgbe Babilọn dasịrị, ná mmalite o yiri ka ihe ọ̀ na-agaziri Daniel. Eze ọhụrụ bụ Daraịọs onye Midia, nwoke dị afọ 62, onye nwere ihu ọma n’ebe Daniel nọ. Otu n’ime ihe ndị mbụ Daraịọs mere dị ka eze bụ ịhọpụta ndị nọchiri anya eze 120 na ibuli ndị ikom atọ gaa n’ọkwá ndị isi.a Daniel bụ otu n’ime ndị ikom atọ ahụ nwetara ihu ọma. N’ịghọta ikike pụrụ iche Daniel nwere, Daraịọs ọbụna zubesiri ike inye ya ọkwá praịm minista! Otú ọ dị, mgbe ahụ kpọmkwem, otu ihe mere nke gbanwere atụmatụ eze na mberede.

Atụmatụ Aghụghọ

Ndị ibe Daniel bụ́ ndị isi, ha na otu ígwè buru ibu nke ndị nọchiri anya eze, ji otu echiche na-akpali akpali bịakwute eze. Ha rịọrọ Daraịọs ka o guzobe iwu nke na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke ga-arịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ ruo [iri ụbọchị atọ], ma ọ bụghị nanị gị, eze, na a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.” (Daniel 6:7) Ọ pụrụ iyiworị Daraịọs ka ndị ikom a ha na-egosipụta iguzosi ike n’ihe ha nye ya. Ọ pụkwara icheworị na iwu a ga-enyere ya aka, dị ka onye si mba ọzọ, ime ka ọkwá ya sikwuo ike dị ka onye isi nke ógbè ahụ.

Otú ọ dị, ndị isi na ndị ahụ nọchiri anya eze emepụtaghị iwu a n’ihi eze. Ha “nọ na-achọ ịchọpụta ihe ebubo iji bo Daniel banyere alaeze; ma ọ dịghị ihe ebubo ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla ha pụrụ ịchọpụta; n’ihi na onye kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ bụ, ọ dịghịkwa mmehie ma ọ bụ omume bibiri ebibi ọ bụla a chọpụtara n’ahụ ya.” Ya mere ndị ikom a dị aghụghọ chere, sị: “Anyị agaghị achọpụta ihe ebubo iji bo Daniel nke a, ma a sị na anyị achọpụtaghị ya n’ahụ ya n’iwu nke Chineke ya.” (Daniel 6:4, 5) Ebe ha maara na Daniel na-ekpegara Jehova ekpere kwa ụbọchị, ha chọrọ ime nke a mmejọ nke ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ.

Ikekwe ndị isi na ndị nọchiri anya eze buuru Daniel iwe n’obi n’ihi na ọ “ghọrọ ọkaaka n’elu [ha], n’ihi na mmụọ nke kachasị dị n’ime ya; eze wee zube ido ya onye isi alaeze ya nile.” (Daniel 6:3) Ọ pụrụ ịbụ na ime ihe n’eziokwu Daniel emewo ka e nwee ihe mgbochi a na-anabataghị megide arụrụala na ịkpa ego wayo. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, ndị ikom a mere ka eze kweta ịbịanye aka n’iwu ahụ, na-eme ka ọ bụrụ akụkụ nke “iwu nke Midia na Peasia . . . , nke na-adịghị agabiga.”—Daniel 6:8, 9.

Daniel Anọgide Na-eguzosi Ike

Mgbe ọ matasịrị banyere ụkpụrụ ọhụrụ ahụ, Daniel ọ̀ kwụsịrị ikpegara Jehova ekpere? Ọ dịghị ma ọlị! N’igbu ikpere n’ala n’ụlọ elu nke ụlọ ya, o kpegaara Chineke ekpere ugboro atọ n’ụbọchị, dị “ka ọ na-emerịị site na mgbe gara aga.” (Daniel 6:10) Ka ọ nọ na-ekpe ekpere, ndị iro ya “weere oké mkpọtụ gbakọta, chọpụta Daniel ka ọ na-arịọ arịrịọ na-arịọkwa arịrịọ amara n’ihu Chineke ya.” (Daniel 6:11) Mgbe ha wetara okwu ahụ n’ihu eze, o wutere Daraịọs na iwu nke ọ bịanyeworo aka na ya ga-etinye Daniel ná nsogbu. “Ruo ọdịda anyanwụ ka ọ nọ na-ejisi ike ịnapụta ya,” ka ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị. Ma ọbụna eze apụghị ịkagbu iwu ahụ o tiworo. N’ihi ya a kpọọrọ Daniel gaa n’olulu ọdụm, nke bụ dị ka ihe àmà na-egosi ebe miri emi ma ọ bụ nke dị n’okpuru ala. Eze mesiri Daniel obi ike, sị: “Chineke gị, Onye gị onwe gị na-efe mgbe nile, Ya onwe ya ga-adọpụta gị.”—Daniel 6:12-16.

Mgbe ehighị ụra abalị na ibu ọnụ gasịrị, Daraịọs weere ọsọ garuo n’olulu ahụ. Daniel dị ndụ, e merụghịkwa ya ahụ! Eze zaghachiri ozugbo. O mere ka a kwụghachi ndị iro Daniel ụgwọ site n’ịtụba ha na ezinụlọ ha n’ime olulu ọdụm ahụ. Daraịọs mekwara ka a mara gburugburu alaeze ahụ na “n’ebe nile ọ bụla a na-achị n’alaeze m, ka mmadụ na-ama jijiji na-atụ egwu n’ihu Chineke nke Daniel.”—Daniel 6:17-27.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Daniel bụ ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi. Ọbụna eze ahụ, onye na-efeghị Jehova, chọpụtara na Daniel jeere Ya ozi “mgbe nile.” (Daniel 6:16, 20) Mkpọrọgwụ okwu Aramaic a sụgharịrị “mgbe nile” pụtara n’ụzọ bụ isi ‘ịga okirikiri.’ Ọ na-atụ aro akwụsịghị akwụsị. Lee ụzọ nke a si na-akọwa nke ọma iguzosi ike n’ezi ihe a na-emebighị emebi nke Daniel nye Jehova!

Daniel zụlitere usoro ime ihe mgbe nile ogologo oge tupu a tụba ya n’ime olulu ọdụm. Dị ka onye na-eto eto a dọtara n’agha gaa na Babilọn, ọ jụrụ iri ihe oriri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ nke Iwu Mosis machibidoro ma ọ bụ nke ememe ikpere arụsị merụrụ. (Daniel 1:8) Mgbe e mesịrị, o ji anya ike kpọsaara eze Babilọn bụ́ Nebukadneza ozi Chineke. (Daniel 4:19-25) Nanị hour ole na ole tupu ọdịda Babilọn, Daniel kpọsaara Eze Belshaza ikpe Chineke n’atụghị egwu. (Daniel 5:22-28) Ya mere mgbe Daniel chere olulu ọdụm ahụ ihu, ọ nọgidere n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke o guzobeworo.

Gị onwe gị kwa pụrụ ife Jehova mgbe nile. Ị̀ bụ onye na-eto eto? Mgbe ahụ mee ihe ugbu a ịzụlite usoro ime ihe mgbe nile site n’ịjụ mkpakọrịta ọjọọ na àgwà na-emerụ emerụ nke ụwa a. Ọ bụrụ na ị nọwo na-efe Chineke ruo oge ụfọdụ, nọgide na-enwe usoro nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi. Ike agwụla gị, n’ihi na ọnwụnwa ọ bụla anyị na-eche ihu na-enye anyị ohere igosi Jehova na anyị kpebisiri ike ife ya ofufe mgbe nile.—Ndị Filipaị 4:11-13.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Okwu ahụ bụ́ “onye nọchiri anya eze” (nke pụtara n’ụzọ nkịtị “onye na-echebe Alaeze”) na-ezo aka n’ebe onye na-achị achị nke eze Peasia họpụtara ije ozi dị ka onye ọchịchị bụ́ isi nke otu ógbè a na-achị achị. Dị ka onye nnọchiteanya eze a nwapụtara, ọ na-ahụ maka ịnakọta ụtụ isi na ịkwụnye ụtụ a nakọtara n’ụlọikpe eze.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya