Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Ọktoba p. 12-17
  • Ndị Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Anya Jehova Na-enwe Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Anya Jehova Na-enwe Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ ANYỊ GA-AMỤTA IHE N’AKA HA
  • “NDỊ ỌCHỊCHỊ”
  • “ONYE KACHA ELU”
  • ỌGỤ IKPEAZỤ
  • ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-AKWỤWA AKA ỌTỌ
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Mere Ị Ga-eji Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Ọktoba p. 12-17

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42

Ndị Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Anya Jehova Na-enwe Obi Ụtọ

“Ndị na-akwụwa aka ọtọ na-enwe obi ụtọ, ya bụ, ndị na-edebe iwu Jehova.”​—ỌMA 119:​1, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

Ndị a bụ ụfọdụ ụmụnna nwere obi ike ndị gatụrụla mkpọrọ ma ọ bụ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere. Ọnụ bụ ha ọchị ọchị.

Ndị a bụ ụfọdụ ụmụnna nwere obi ike ndị gatụrụla mkpọrọ ma ọ bụ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha na-erubere ọchịchị Jehova isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1-2. (a) Olee ihe ndị ọchịchị na-eme ndị Jehova n’obodo ụfọdụ, ma, gịnị ka ndị Jehova na-eme gbasara ya? (b) Gịnị mere anyị ga-eji na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na a na-akpagbu anyị? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

UGBU A, a machiri ozi ọma anyị iwu n’ihe karịrị obodo iri atọ n’ụwa niile. N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị tụrụ ụmụnna anyị mkpọrọ. Olee ihe ọjọọ ha mere? N’anya Jehova, o nweghị. Naanị ihe ha mere bụ na ha na-agụ Baịbụl, na-amụ ya, na-agwa ndị ọzọ ihe ha kweere, ha na ụmụnna ha ana-aga ọmụmụ ihe. Ha ekweghịkwa etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-akpagbu ụmụnna ndị a, ha na-akwụwa aka ọtọ,b ya bụ, ha na-egosi na ọ bụ naanị Jehova ka ha na-efe. Obi dịkwa ha ụtọ na ha na-eme otú ahụ.

2 O nwere ike ịbụ na ị hụla foto ụfọdụ ụmụnna nwere obi ike, hụkwa na ọnụ na-abụ ha ọchị ọchị. Obi na-adị ha ụtọ n’ihi na ha ma na obi dị Jehova ụtọ na ha na-akwụwa aka ọtọ n’anya ya. (1 Ihe 29:17a) Jizọs sịrị: “Ndị a kpagburu n’ihi ezi omume na-enwe obi ụtọ . . . Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ ezigbo obi ụtọ, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu.”​—Mat. 5:​10-12.

NDỊ ANYỊ GA-AMỤTA IHE N’AKA HA

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe ndịozi bụ́ Pita na Jọn na-ekwu okwu n’ihu ndị Sanhedrin. 2. Ebe otu nwanna na-ekwu okwu n’ihu ọkàikpe n’ụlọikpe.

Pita na Jọn mere ihe Ndị Kraịst ga-aga n’ụlọikpe zara ọnụ ha maka ihe ha kweere kwesịrị ịna-eme taa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 4:​19, 20, gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe a na-akpagbu ha, n’ihi gịnịkwa?

3 Ụmụnna anyị na-edi ihe ndịozi Jizọs diri mgbe a na-akpagbu ha maka na ha na-ekwusa gbasara Jizọs. Ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ndị Juu gwara ha ọtụtụ ugboro “ka ha ghara ikwu ihe ọ bụla ma ọ bụ izi ihe ọ bụla n’aha Jizọs.” (Ọrụ 4:18; 5:​27, 28, 40) Gịnị ka ndịozi ahụ mere? (Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:​19, 20.) Ha ma na onye nwere ikike karịa ndị ikpe ahụ gwara ha ka ha “kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma gbaa àmà nke ọma” gbasara Kraịst. (Ọrụ 10:42) N’ihi ya, Pita na Jọn kwuchitere ọnụ ha ma jiri obi ike kwuo na ha ga-erubere Chineke isi karịa ndị ikpe ndị ahụ, kwuokwa na ha agaghị akwụsị ikwu gbasara Jizọs. Ọ dị nnọọ ka ịjụ ndị ọchịchị ahụ, sị: ‘Ihe unu na-ekwu ọ̀ bụ na iwu unu karịrị nke Chineke?’

4. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 5:​27-29, gịnị ka ndịozi Jizọs mere, nke ezigbo Ndị Kraịst niile na-eme, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha?

4 Ndịozi ahụ mere ihe ezigbo Ndị Kraịst niile na-eme kemgbe ahụ, ya bụ, ‘irubere Chineke isi karịa mmadụ.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 5:​27-29.) Mgbe a pịachara ndịozi ahụ ihe n’ihi na ha na-erubere Chineke isi, ha si ebe ahụ ndị Sanhedrin nọ pụọ, “na-aṅụrị ọṅụ maka na Chineke gụrụ ha ná ndị e kwesịrị imenye ihere n’ihi aha Jizọs,” ha akwụsịghịkwa ikwusa ozi ọma.​—Ọrụ 5:​40-42.

5. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịmata azịza ha?

5 Ihe ndịozi ahụ mere mere ka e nwee ajụjụ ụfọdụ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, olee otú ha si rubere Chineke isi karịa mmadụ ma “na-erubere ndị ọchịchị isi” otú ahụ Baịbụl kwuru? (Rom 13:1) Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-erubere ndị ọchịchị na ndị nọ n’isi isi’ ma ka na-erubere Chineke, bụ́ Onye Ọchịchị anyị kachanụ, isi?​—Taị. 3:1.

“NDỊ ỌCHỊCHỊ”

6. (a) Olee ndị bụ́ ndị ọchịchị e kwuru okwu ha ná Ndị Rom 13:​1, oleekwa ihe anyị kwesịrị ịna-emere ha? (b) Olee ihe na-adịghị n’aka ndị ọchịchị niile bụ́ mmadụ?

6 Gụọ Rom 13:1. “Ndị ọchịchị” e kwuru okwu ha n’amaokwu a bụ ndị mmadụ nwere ikike ịgwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme. Ndị Kraịst kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị ndị a isi. Ndị ọchịchị na-eme ka udo dị, na-ahụ na ndị mmadụ na-erubere iwu isi, na-agbachitekwara ndị Chineke mgbe ụfọdụ. (Mkpu. 12:16) N’ihi ya, e nyere anyị iwu ka anyị na-atụ ụtụ isi na ụtụ ahịa, na-atụ ndị e kwesịrị ịtụ egwu egwu, na-asọpụkwara ndị e kwesịrị ịsọpụrụ. (Rom 13:7) Ma, naanị ihe mere ndị ọchịchị ndị ahụ ji nwee ikike bụ na Jehova hapụrụ ha. Jizọs mere ka ihe a doo anya mgbe gọvanọ bụ́ onye Rom aha ya bụ Pọntiọs Paịlet na-agba ya ajụjụ. Mgbe Paịlet kwuru na ya nwere ikike idowe Jizọs ndụ ma ọ bụ gbuo ya, Jizọs sịrị ya: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya.” (Jọn 19:11) Otú ahụ ikike niile na-adịghị Paịlet n’aka ka ikike niile na-adịghịkwa ndị ọchịchị taa n’aka.

7. Olee oge ndị anyị na-ekwesịghị irubere ndị ọchịchị bụ́ mmadụ isi, oleekwa ihe ha kwesịrị ịmara?

7 Ndị Kraịst na-erubere ndị ọchịchị isi mgbe iwu ha na-emegideghị iwu Chineke. Ma, anyị agaghị erubere ha isi ma ha sị anyị mee ihe Chineke sịrị anyị emela ma ọ bụ sị anyị emela ihe Chineke sịrị anyị mee. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa ụmụ okorobịa ka ha sonyere ndị agha obodo ha gaa lụọ agha.c Ha nwekwara ike ịmachi Baịbụl anyị na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl iwu, sịkwa anyị kwụsị izi ozi ọma ma ọ bụ izukọta na-efe Jehova. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị ejiri ikike ha mee ihe ha na-ekwesịghị ime, dị ka ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst, ha ga-aza Chineke ajụjụ ihe ha metere. Jehova na-ahụ ihe ha na-eme.​—Ekli. 5:8.

8. Gịnị dị iche na Jehova na ndị ọchịchị, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji mata ihe dị iche?

8 Ndị ọchịchị nwere ikike. Ha nwere ike ime ihe ndị dị mma, nweekwa ike ịchị ndị ọzọ. Ma, ọ pụtaghị na ha zuru okè ma ọ bụ na ọ bụ ikike ha kacha. E nwere Onye zuru okè. Ọ bụkwa ya kacha ihe niile. Onye ahụ bụ Jehova. Ugboro anọ na Baịbụl, a kpọrọ Jehova “Onye Kacha Elu.”​—Dan. 7:​18, 22, 25, 27.

“ONYE KACHA ELU”

9. Gịnị ka Daniel onye amụma hụrụ n’ọhụụ?

9 Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ gosiri otú Jehova si ka ndị ọchịchị niile elu. Daniel bu ụzọ hụ nnukwu anụ ọhịa anọ ndị nọchiri anya ọchịchị ndị chịrị ụwa niile n’oge ochie nakwa n’oge a. Ha bụ Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, Rom, na nke na-achị ugbu a bụ́ ọchịchị Briten na Amerịka. (Dan. 7:​1-3, 17) Daniel hụkwara Jehova Chineke ka ọ nọ ọdụ n’ocheeze dị n’ụlọikpe dị n’eluigwe. (Dan. 7:​9, 10) Ihe ọzọ onye amụma ahụ hụrụ na-adọ ndị ọchịchị taa aka ná ntị.

10. Dị ka e kwuru na Daniel 7:​13, 14, 27, olee ndị Jehova nyere ikike ịchịwa ụwa, oleekwa ihe ihe ahụ gosiri gbasara Jehova?

10 Gụọ Daniel 7:​13, 14, 27. Chineke napụrụ ndị ọchịchị niile ikike ha, nye ya ndị ọzọ ruru eru karịa ha, kakwa ha ike. Ole ndị ka ha bụ? Ọ bụ “onye yiri nwa nke mmadụ,” ya bụ, Jizọs Kraịst, nakwa “ndị nsọ nke Onye Kacha Elu,” ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ga-eso ya chịa ‘ruo mgbe niile ebighị ebi.’ (Dan. 7:18) O doro anya na ọ bụ Jehova bụ “Onye Kacha Elu” n’ihi na ọ bụ naanị ya nwere ikike ime ụdị ihe ahụ.

11. Olee ihe Daniel dere gosiri na ọ bụ Jehova kacha ihe niile elu?

11 Ihe ahụ Daniel hụrụ n’ọhụụ gosiri na ihe o kwuru tupu mgbe ahụ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Chineke nke eluigwe” “na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.” Ọ sịkwara na “ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ. Ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.” (Dan. 2:​19-21; 4:17) È nweela ndị ụfọdụ Jehova mere ka ha chịwa ma ọ bụ mee ka ha kwụsị ịchị? Ee.

Ebe Eze Belshaza na ndị ọ kpọrọ oriri kporopụrụ anya na-ele ihe e dere n’ahụ́ ájá.

Jehova napụrụ Belshaza ọchịchị, nye ya ndị Midia na ndị Peshia (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Nye ihe atụ otú Jehova si mee ka ndị eze ụfọdụ kwụsị ịchị n’oge ochie. (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Jehova emeela ka o doo anya na ọ bụ ya kacha “ndị ọchịchị” niile elu. Legodị ihe atụ atọ. Fero bụ́ eze Ijipt ji ndị Jehova mere ohu, jụkwa ugboro ugboro ịhapụ ha. Ma, Jehova mere ka ha nwere onwe ha ma tụba Fero n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụ. 14:​26-28; Ọma 136:15) Belshaza bụ́ eze Babịlọn mere oriri, ‘bulie onwe ya elu wee nupụrụ Onyenwe eluigwe isi, tookwa chi ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ,’ kama ito Jehova. (Dan. 5:​22, 23) Ma, Jehova wedara nwoke mpako ahụ ala. “N’abalị ahụ,” e gburu Belshaza, nyefeekwa ndị Midia na ndị Peshia alaeze ya. (Dan. 5:​28, 30, 31) Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ bụ́ eze Palestaịn gburu Jems onyeozi, tụọkwa Pita onyeozi mkpọrọ, buru n’obi imemila ya. Ma Jehova mere ka ọ ghara ime ihe ahụ o bu n’obi. “Mmụọ ozi Jehova mere ka ikpuru gbaa ya, ya anwụọ.”​—Ọrụ 12:​1-5, 21-23.

13. Nye ihe atụ gosiri otú Jehova si merie ndị ọchịchị gbakọrọ aka.

13 Jehova egosikwala na ikike ya karịrị nke ọtụtụ ndị eze gbakọrọ aka bịa ịlụso ndị ya ọgụ. Ọ lụụrụ ndị Izrel ọgụ, mee ka ha bibie ndị eze Kenan iri atọ na otu gbakọrọ aka bịa ịlụso ha ọgụ, nwetakwa ọtụtụ ebe n’Ala Nkwa. (Josh. 11:​4-6, 20; 12:​1, 7, 24) Jehova nyekwaara ndị Izrel aka ha emerie Eze Ben-hedad na ndị eze Siria ndị ọzọ dị iri atọ na abụọ lụsoro ndị Izrel agha.​—1 Eze 20:​1, 26-29.

14-15. (a) Gịnị ka Eze Nebukadneza na Eze Darayọs kwuru gbasara ọchịchị Jehova? (b) Gịnị ka otu ọbụ abụ kwuru gbasara Jehova na ndị ya?

14 Jehova egosila ọtụtụ oge na ọ bụ Onye Kacha Elu. Mgbe Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn turu ọnụ gbasara ‘ihe a ga-eji na-akwanyere ya nnukwu ùgwù’ kama ikwu na ọ bụ Jehova ka e kwesịrị ito maka ihe ndị ahụ, Jehova mere ka isi mebie ya. Mgbe ọ gbakere, o ‘toro Onye Kacha Elu,’ kwuokwa na ọchịchị Jehova “bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi.” Ọ sịkwara: ‘E nweghị onye ga-egbochili ya ime ihe ọ bụla.’ (Dan. 4:​30, 33-35) Mgbe Daniel rubechaara Jehova isi, ya anapụta ya n’olulu ọdụm, Eze Darayọs sịrị: “Ka ndị mmadụ na-atụ egwu Chineke Daniel n’ebe niile n’alaeze m. N’ihi na ọ bụ ya bụ Chineke dị ndụ, ọ na-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. A gaghị ebibi alaeze ya ebibi, ọchịchị ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.”​—Dan. 6:​7-10, 19-22, 26, 27.

15 Otu ọbụ abụ sịrị: “Jehova aghasaala atụmatụ mba dị iche iche. Ọ kụghasịala ihe ndị si n’ebe dị iche iche bu n’obi ime. Mba nke Jehova bụ Chi ya na-enwe obi ụtọ, ya bụ, ndị ọ họọrọ ka ha bụrụ ndị nke ya.” (Ọma 33:​10, 12) Ihe a bụ ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwụwa aka ọtọ n’anya Jehova.

ỌGỤ IKPEAZỤ

Ebe ìgwè ndị agha Jehova si n’eluigwe gbara ịnyịnya ọcha na-abịa ịlụso ndị nọ n’ụwa jicha ngwá agha ọgụ.

Mba niile gbakọrọ aka ọnụ enweghị ebe ha ga-eru ndị agha Jehova nọ n’eluigwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya n’oge “oké mkpagbu,” n’ihi gịnịkwa? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Anyị agụọla gbasara ihe Jehova mere n’oge gara aga. Gịnị ka anyị na-atụ anya ya ga-eme n’oge na-adịghị anya? Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anapụta ezigbo ndị ohu ya n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ. (Mat. 24:21; Dan. 12:1) Ọ ga-eme ya mgbe mba ndị gbakọrọ aka ọnụ, ya bụ, Gọg onye Megọg, ga-alụso ndị na-erubere Chineke isi n’ụwa niile ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ bụrụgodị na mba ndị ahụ ga-agbakọ aka ọnụ bụ otu narị mba na iri itoolu na atọ (193) so n’Òtù Mba Ụwa, ha niile enweghị ebe ha ga-eru Onye Kacha Elu na ndị agha ya nọ n’eluigwe. Jehova kwere anyị nkwa, sị: “M ga-eme onwe m ka m dị ebube, mee ka a mara na m dị nsọ, meekwa ka ọtụtụ mba mara m. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.”​—Ezik. 38:​14-16, 23; Ọma 46:10.

17. Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-eme ndị eze ụwa na ndị na-erubere Jehova isi?

17 Ọgụ ahụ Gọg ga-alụso ndị Jehova ga-eme ka agha Amagedọn bido. Jehova ga-eji ya bibie “ndị eze niile nọ n’ụwa.” (Mkpu. 16:​14, 16; 19:​19-21) Ma, “naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa. Ọ bụkwa ndị kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ ga-anọ na ya.”​—Ilu 2:​21, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-AKWỤWA AKA ỌTỌ

18. Olee ihe ọtụtụ ezigbo Ndị Kraịst mere, n’ihi gịnịkwa? (Daniel 3:28)

18 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ezigbo Ndị Kraịst eruberela Jehova bụ́ Eze Kacha Elu isi n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka a tụọ ha mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ha. Ha mere ya maka na ha hụrụ ya n’anya. Ha kpebisiri ike ịkwụwa aka ọtọ n’anya Jehova otú ahụ ndị Hibru atọ ahụ mere mgbe ha rubeere Onye Kacha Elu isi, ya anapụta ha ná nnukwu ọkụ.​—Gụọ Daniel 3:28.

19. Olee ihe Jehova ga-eji ekpe ndị ya ikpe, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime ugbu a?

19 Otu ọbụ abụ kwuru na ịkwụwa aka ọtọ n’anya Jehova dị mkpa. Ọ sịrị: “Jehova ga-ekwu ihe o kpebiri ime ndị dị iche iche. Jehova, biko, mgbe ị na-ekpe m ikpe, cheta ezi omume m na-eme nakwa otú m si akwụwa aka ọtọ.” (Ọma 7:8) Devid dekwara, sị: “Ka ezi omume m na-eme na aka m na-akwụwa ọtọ chebe m.” (Ọma 25:21) Otú kacha mma anyị ga-esi bie ndụ bụ ịna-erubere Jehova isi, ma ghara inupụrụ ya isi n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, obi ga-adị anyị otú ọ dị otu ọbụ abụ. Ọ sịrị: “Ndị na-akwụwa aka ọtọ na-enwe obi ụtọ, ya bụ, ndị na-edebe iwu Jehova.”​—Ọma 119:​1, ihe e dere n’ala ala peeji ya.

Ì NWERE IKE ỊKỌWA?

  • Gịnị ka ndịozi Jizọs mere anyị kwesịrị ịna-eme?

  • Olee ihe anyị ga-eji ekpebi ma ànyị ga-erubere ndị ọchịchị isi?

  • Olee otú Jehova sirila gosi na ọ bụ “Onye Kacha Elu”?

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

a Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-erubere ndị ọchịchị ụwa a isi. Ma, ụfọdụ ndị ọchịchị na-emegide Jehova na ndị ohu ya. Olee otú anyị nwere ike isi na-erubere ndị ọchịchị isi ma ka na-akwụwa aka ọtọ n’anya Jehova?

b NKỌWAKWU: Ịkwụwa aka ọtọ n’anya Jehova pụtara na anyị ga na-erubere ya na ọchịchị ya isi mgbe niile, ọ bụrụgodị mgbe o siiri anyị ezigbo ike.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Anyị Anaghị Alụ Agha n’Agbanyeghị na Ndị Izrel Oge Ochie Lụrụ Agha?” nke gbara n’Ụlọ Nche a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya