Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/1 p. 13-18
  • Otu Eze Emetọọ Ebe Nsọ Nke Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Eze Emetọọ Ebe Nsọ Nke Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Esemokwu ná Mgbe Ọgwụgwụ
  • E Merie Eze ahụ n’Agha
  • Eze ahụ Emee Ihe n’Ụzọ Dị Irè
  • “Ihe Arụ”
  • Eze ahụ na Ọgbụgba Ndụ Ahụ
  • Ime Ka Ndị Chineke Dị Ọcha
  • Ndị Eze ahụ Na-asọrịta Mpi Abịaruo Nso Ọgwụgwụ Ha
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ndị Eze ahụ Na-amarịta Aka Abata na Narị Afọ nke 20
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ndị Bụ́ “Eze Ugwu” n’Oge Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Mmeri Ikpeazụ Nke Maịkael, Onye Isi Ukwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/1 p. 13-18

Otu Eze Emetọọ Ebe Nsọ Nke Jehova

“Ndị ahụ nke maara Chineke ha ga-adị ike.”—DANIEL 11:32.

1, 2. Oké ndọrọ ndọrọ dị aṅaa kaworo akụkọ ihe mere nke mmadụ akara ruo ihe karịrị 2,000 afọ?

NDỊ eze abụọ na-asọ mpi nọ n’oké ndọrọ ndọrọ maka onye ga-aka n’ike. Nke mbụ rịgoro, e mesịa nke ọzọ arịgota, ka agha ahụ nọworo na-aga n’ihu ruo ihe karịrị puku afọ abụọ. N’ụbọchị anyị ndọrọ ndọrọ ahụ emetụtawo ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ n’elu ụwa ma tinye ịnọgidesi ike n’ihe nke ndị Chineke n’ule. O jedebere n’otu ihe omume nke ike ọchịchị abụọ ahụ na-ebughị ụzọ hụ. E kpugheere Daniel onye amụma oké akụkọ ihe mere eme nke a tupu o mee.—Daniel, isi 10 ruo 12.

2 Amụma ahụ bụ banyere iro ahụ na-aga n’ihu nke dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda, nke a kọwakwara ya n’ụzọ zuru ezu n’akwụkwọ ahụ bụ́ “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa.”a N’akwụkwọ ahụ e gosiri na eze ugwu ná mbụ bụ Siria, nke nọ n’ebe ugwu Israel. Mgbe nke a gasịrị, Rom weghaara ọnọdụ. Iji malite, eze ndịda bụ Ijipt.

Esemokwu ná Mgbe Ọgwụgwụ

3. Dị ka mmụọ ozi ahụ kwuru, olee mgbe a ga-aghọta amụma banyere eze ugwu na eze ndịda ahụ, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

3 Mmụọ ozi ahụ na-ekpughere Daniel ihe ndị a kwuru, sị: “Ma gị onwe gị, Daniel, zobe okwu ndị a, kachitekwa akwụkwọ a akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Daniel 12:4) Ee, amụma ahụ bụ banyere oge ọgwụgwụ—oge nke malitere na 1914. N’oge ahụ a kara akara, ọtụtụ ndị “ga na-ejegharị” n’ime Akwụkwọ Nsọ, sitekwa n’enyemaka mmụọ nsọ, ezi ihe ọmụma, tinyere nghọta nke amụma Bible, ga-aba ụba. (Ilu 4:18) Ka anyị na-abami n’ime oge ahụ, e mewo ka ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke amụma dị iche iche nke Daniel doo anya. Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi ghọta amụma nke eze ugwu na eze ndịda na 1993, 35 afọ ugbu a kemgbe e bipụtasịrị “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa”?

4, 5. (a) Olee ebe afọ 1914 dị n’amụma Daniel banyere eze ugwu na eze ndịda ahụ? (b) Dị ka mmụọ ozi ahụ kwuru, gịnị ga-eme na 1914?

4 Mmalite nke mgbe ọgwụgwụ na 1914 bụ nke Agha Ụwa Mbụ na nsogbu ụwa ndị ọzọ ndị Jisọs buru amụma ha kara akara. (Matiu 24:3, 7, 8) Ànyị pụrụ ịmata afọ ahụ n’amụma Daniel? Ee. Mmalite nke mgbe ọgwụgwụ bụ “mgbe a kara aka” nke e zoro aka na ya na Daniel 11:29. (Lee “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa,” peji nke 264-266.) Ọ bụ oge Jehova kawororị aka n’ụbọchị Daniel, ebe ọ bụ na ọ bịara n’ọgwụgwụ nke 2,520 afọ ndị ahụ e gosipụtara n’ihe omume ndị ahụ dị mkpa n’ụzọ amụma nke Daniel isi 4.

5 A kpọrọ 2,520 afọ ndị ahụ, site ná mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A. n’oge ntorobịa Daniel ruo 1914 O.A., “oge nke mba ọzọ.” (Luk 21:24) Ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị aṅaa ga-aka ọgwụgwụ ha akara? Otu mmụọ ozi kpugheere Daniel nke a. Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ná mgbe a kara aka ka ọ [eze ugwu] ga-abịaghachi, baa na ndịda; ma ọ gaghị adị ná mgbe ikpeazụ otú ọ dịrị na mbụ.”—Daniel 11:29.

E Merie Eze ahụ n’Agha

6. Na 1914, ònye bụ eze ugwu ahụ, ònye bụkwa eze ndịda?

6 Mgbe ọ na-erule 1914 Germany ewegharawo ọnọdụ nke eze ugwu, nke onye ndú ya bụ Kaiser Wilhelm. (“Kaiser,” nke sitere n’ùtú aha Rom ahụ bụ́ “Siza.”) Ntiwapụ nke agha na Europe ka bụkwa ọzọ n’usoro ndọrọ ndọrọ ndị dị n’etiti eze ugwu na eze ndịda. Ọnọdụ nke ikpeazụ a, eze ndịda, bụ nke Britain nọ na ya ugbu a, bụ́ nke weghaara Ijipt ọsọ ọsọ, bụ́ ebe onye bụbu eze ndịda na-achị. Ka agha ahụ na-aga n’ihu, United States of America nke Britain na-achịbu sonyeere ya. Eze ndịda ghọrọ Ike Ọchịchị Ụwa Britain na America, alaeze ukwu kasị ike n’akukọ ihe mere eme.

7, 8. (a) N’Agha Ụwa Mbụ, n’ụzọ dị aṅaa ka ihe dị iche iche na-ejighị dịrị “otú ọ dịrị ná mbụ”? (b) Gịnị si n’ime Agha Ụwa Mbụ pụta, ma dị ka amụma ahụ na-ekwu, olee otú eze ugwu si meghachi omume?

7 N’esemokwu dịbu n’etiti eze abụọ ahụ, Alaeze Ukwu Rom, dị ka eze ugwu, anọgidewo na-enwe mmeri. N’oge nke a, ‘ọ dịghịzi otú ọ dị na mbụ.’ N’ihi gịnị? N’ihi na e meriri eze ugwu n’agha. Otu ihe mere ya bụ na “ụgbọ Kitim” bịakwasịrị eze ugwu. (Daniel 11:30) Gịnị ka ụgbọ mmiri ndị a bụ? N’oge Daniel, Kitim bụ Saịprọs, ná mmalite nke Agha Ụwa Mbụ kwa, Saịprọs batara n’okpuru Britain. Ọzọkwa, dị ka ihe akwụkwọ The Zondervan Pictorial Encyclopedia of the Bible kwuru, aha ahụ bụ Kitim “gbasapụrụ na-agụnye Ebe Ọ[dịda] Anyanwụ n’ozuzu ya, ma ka[rịsịa] Ọ[dịda] Anyanwụ nke ebe ụgbọ mmiri na-aga.” New International Version sụgharịrị okwu ahụ bụ “ụgbọ Kitim” dị ka “ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ.” N’Agha Ụwa Mbụ, ụgbọ mmiri dị iche iche nke Kitim ghọrọ ụgbọ mmiri dị iche iche nke Britain, na-anọ n’ebe mpụga nke ụsọ osimiri nke ọdịda anyanwụ Europe. Mgbe e mesịrị ụgbọ mmiri sitere na kọntinent Ugwu America nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ụwa mere ka Ndị Agha Mmiri nke Britain sie ike.

8 N’okpuru mwakwasị nke a, ‘obi mebiri’ eze ugwu, e wee merie ya na 1918. Ma e bibighị ya kpam kpam. “Ọ [ga-alaghachi], wesa ọgbụgba ndụ nsọ ahụ oké iwe, mee ihe, laghachi, tụgharịa uche ná ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ.” (Daniel 11:30) Otú a ka mmụọ ozi ahụ buru n’amụma, otú ahụkwa ka o mere.

Eze ahụ Emee Ihe n’Ụzọ Dị Irè

9. Gịnị dujere ná mbilite nke Adolf Hitler, oleekwa otú o si “mee ihe”?

9 Mgbe agha ahụ gwụsịrị, na 1918, mba Britain na ndị òtù ya nwere mmeri manyere Germany ịbanye ná nkwekọrịta udo nke ntaramahụhụ, nke doro anya na a haziri ya iji kwụba ndị Germany n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ agụụ ngụgbu ruo n’ọdịnihu a na-amaghị ama. Dị ka ihe si na ya pụta, mgbe ọ dagharịsịrị ruo afọ ụfọdụ n’oké ahụhụ, Germany dịrị njikere maka mbilite nke Adolf Hitler. O ruru n’ike kasị elu na 1933 wee wakwasị “ọgbụgba ndụ nsọ ahụ,” nke ụmụnna Jisọs Kraịst ndị e tere mmanụ nọchiri anya ya ajọ mwakwasị ozugbo ahụ. Ná nke a, o mere ihe dị irè megide ndị Kraịst ndị a na-eguzosi ike n’ihe, na-akpagbu ọtụtụ n’ime ha mkpagbu obi ọjọọ.

10. N’ịchọ nkwado, Hitler chọrọ mmekọrịta ònye, gịnịkwa si na ya pụta?

10 Hitler nwere ihe ịga nke ọma n’ụzọ akụ na ụba na ná mmekọrịta ya na mba ndị ọzọ, na-adị irè n’akụkụ ahụkwa. N’ime afọ ole na ole, o mere ka Germany bụrụ ike ọchịchị a maara amara, na-enweta enyemaka ná mgbalị nke a site n’aka “ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ.” Olee ndị ka ndị a bụ? Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ndị ndú nke Krisendọm, ndị zọọrọ na ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ mmekọrịta ma bụrụ ndị kwụsịrị kemgbe ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Hitler nwere ihe ịga nke ọma n’ịkpọku “ndị na-ahapụ ọgbụgba ndụ nsọ ahụ” maka nkwado ha. Popu nọ na Rom sooro ya banye ná nkwekọrịta, Chọọchị Roman Katọlik kwa, tinyere chọọchị dị iche iche nke Protestant na Germany, kwadoro Hitler n’ime afọ 12 nile ahụ ọ chịrị ọchịchị ime ihe ike.

11. Olee otú eze ugwu si “mee ka ebe nsọ ghara ịdị nsọ,” “wezụgakwa àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum”?

11 Hitler nwere ihe ịga nke ọma nke ukwuu nke na ọ malitere agha, dị ka mmụọ ozi ahụ buru n’amụma n’ụzọ ziri ezi. “Ogwe aka ụfọdụ ga-esitekwa n’akụkụ ya guzo, mee ka ebe nsọ ahụ ghara ịdị nsọ, bụ́ ebe ahụ siri ike, ha ga-ewezụgakwa àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum.” (Daniel 11:31a) N’Israel oge ochie, ebe nsọ bụ akụkụ nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Otú ọ dị, mgbe ndị Juu jụrụ Jisọs, Jehova jụrụ ha na ụlọ nsọ ha. (Matiu 23:37–24:2) Kemgbe narị afọ mbụ, ụlọ nsọ Jehova abụrụwo n’ezie nke ime mmụọ, na-enwe ebe nsọ ya kasị ebe nsọ n’ime eluigwe na ogige ime mmụọ ya n’elu ala nke ọ bụ n’ime ya ka ụmụnna e tere mmanụ nke Jisọs, bụ́ Onye Isi Nchụàjà, na-eje ozi. Malite n’afọ ndị 1930, oké ìgwè mmadụ ahụ esorowo ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ fee ofufe; n’ihi ya, a na-ekwu na ha na-eje ozi ‘n’ụlọ nsọ Chineke.’ (Mkpughe 7:9, 15; 11:1, 2; Ndị Hibru 9:11, 12, 24) E merụrụ ogige elu ala nke ụlọ nsọ ahụ site ná mkpagbu a kpagburu ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na ndị enyi ha n’esepụghị aka n’ala dị iche iche ebe eze ugwu na-achị. Mkpagbu ahụ siri ike nke ukwuu nke na e wepụrụ àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum—àjà ihu ọha nke otuto nye aha Jehova. (Ndị Hibru 13:15) N’agbanyeghị nke ahụ, akụkọ ihe mere eme na-egosi na n’agbanyeghị ajọ nhụjuanya, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, ha na “atụrụ ọzọ” ahụ, nọgidere na-eme nkwusa n’okpuru.—Jọn 10:16.

“Ihe Arụ”

12, 13. Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ, oleekwa—dịkwa ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche si buru ụzọ hụ—mgbe na ụzọ e si guzobeghachi ya?

12 Mgbe ọgwụgwụ nke Agha Ụwa nke Abụọ dị nso, e nwere ihe ọzọ merenụ. “Ha ga-edokwa ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu.” (Daniel 11:31b) “Ihe arụ” nke a, bụ́ nke Jisọs kpọtụkwara uche, abụrụworị nke a matara dị ka òtù League of Nations, anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke banyere n’ime abyss dị ka Mkpughe si kwuo. (Matiu 24:15; Mkpughe 17:8; lee Light, Akwụkwọ nke Abụọ, peji nke 94.) O mere nke a mgbe Agha Ụwa nke Abụọ dara. Otú ọ dị, ná Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Ụwa Ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova na 1942, Nathan H. Knorr, bụ́ onyeisi oche nke atọ nke Watch Tower Bible and Tract Society, tụlere amụma nke Mkpughe 17 ma dọọ aka ná ntị na anụ ọhịa ga-apụta ọzọ site n’abyss.

13 Akụkọ ihe mere eme gosiri ịbụ eziokwu nke okwu ya ndị ahụ. N’agbata August na October 1944, na Dumbarton Oaks dị na United States, a malitere ọrụ n’akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ nke ihe a gaje ịkpọ òtù United Nations. Iri mba ise na otu nabatara akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ahụ, gụnyere ihe bụbu Soviet Union, mgbe ọ malitekwara ịrụ ọrụ na October 24, 1945, òtù League of Nations ahụ nwụrụ anwụ siri n’abyss pụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

14. Olee mgbe na n’ụzọ dị aṅaa ka onye eze ugwu bụ gbanwere?

14 Germany abụwo onye iro bụ isi nke eze ndịda n’ime agha ụwa abụọ ndị ahụ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, akụkụ nke Germany jikọrọ onwe ya ịbụ nke òtù nke eze ndịda. Ma akụkụ nke ọzọ nke Germany sonyeere ugbu a alaeze ukwu ọzọ dị ike. Ìgwè mba ndị Kọmụnist, bụ́ nke gụnyere ugbu a akụkụ nke Germany, biliri ọtọ iguzogide mmekọrịta ọchịchị Britain na America n’ụzọ siri ike, ịsọ mpi ahụ dị n’etiti ndị eze abụọ ahụ ghọrọ Agha Nzuzo.—Lee “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa,” peji nke 261-279.

Eze ahụ na Ọgbụgba Ndụ Ahụ

15. Olee ndị ka “ndị na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ” bụ, mmekọrịta dịkwa aṅaa ka ha na eze ugwu ahụ nweworo?

15 Ugbu a mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ndị na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ ga-emerụ site n’ire ụtọ dị iche iche.” (Daniel 11:32a) Olee ndị bụ ndị a na-emebi iwu megide ọgbụgba ndụ ahụ? Ọzọ, ọ bụ nanị ndị ndú Krisendọm ka ha pụrụ ịbụ, bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst ma site n’omume ha na-emerụ kpọmkwem aha ahụ bụ Iso Ụzọ Kraịst. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, “Gọọmenti mba Soviet mere mgbalị inweta enyemaka ihe onwunwe na nke omume nke Chọọchị dị iche iche maka nchebe nke ala nna ha.” (Religion in the Soviet Union, nke Walter Kolarz dere) Mgbe agha ahụ gasịrị, ndị ndú chọọchị gbalịrị ịhụ na ọbụbụ enyi ahụ dịgidere n’agbanyeghị ụkpụrụ ekweghị na Chineke nke ike ọchịchị bụ eze ugwu ugbu a.b Otú a, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, Krisendọm ghọrọ akụkụ nke ụwa nke a—ndapụ n’ezi ofufe bụ́ ihe arụ n’anya Jehova.—Jọn 17:14; Jemes 4:4.

16, 17. Olee ndị ka “ndị nwere uche” bụ, oleekwa otú ihe siworo gaara ha n’okpuru eze ugwu ahụ?

16 Otú ọ dị, gịnị banyere ezi ndị Kraịst? “Ma ndị ahụ nke maara Chineke ha ga-adị ike, mee ihe. Ọzọ, ndị nwere uche n’etiti ndị Chineke ga-eme ka ọha mmadụ ghọta ihe: ma ha ga-asụ ngọngọ site ná mma agha, sitekwa n’ire ọkụ, sịtekwa ná ndọta n’agha, sitekwa ná nlụta n’agha, ọtụtụ ụbọchị.” (Daniel 11:32b, 33) Ndị Kraịst bi n’okpuru eze ugwu ahụ, ọ bụ ezie na ha ‘doro onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi,’ n’ụzọ kwesịrị ekwesị abụbeghị akụkụ nke ụwa nke a. (Ndị Rom 13:1; Jọn 18:36) N’ilezi anya ịkwụghachi Siza ihe nke Siza, ha nyekwara “Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) N’ihi nke a, a mara ịnọgidesi ike n’ezi ihe ha aka.—2 Timoti 3:12.

17 Gịnị si na ya pụta? Ha ‘dịrị ike’ ma ‘sụọ ngọngọ.’ Ha sụrụ ngọngọ n’ihi na a kpagburu ha, ha ataakwa ahụhụ nke ukwuu, ọbụna na e gburu ụfọdụ. Ma ha dịrị ike n’ihi na n’ụzọ bụ isi ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. Ee, ha meriri ụwa, dị ka Jisọs meriri ụwa. (Jọn 16:33) Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ha kwụsịrị ime nkwusa, ọbụna ma ọ bụrụ na ha ahụ onwe ha n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ogige ịta ahụhụ. N’ime otú ahụ, ha ‘mere ka ọha mmadụ ghọta ihe.’ N’agbanyeghị mkpagbu, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova bara ụba n’ihe ka ọtụtụ n’ala ndị eze ugwu na-achị. N’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke “ndị nwere uche,” akụkụ na-abawanye ụba nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ apụtawo n’ala ndị ahụ.—Mkpughe 7:9-14.

18. ‘Enyemaka nta’ dị aṅaa ka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ bi n’okpuru eze ugwu ahụ nataworo?

18 N’ikwu banyere mkpagbu nke ndị Chineke, mmụọ ozi ahụ buru amụma, sị: “Ma mgbe ha na-asụ ngọngọ a ga-enyere ha aka nke nta.” (Daniel 11:34a) Olee otú nke a si mee? Na nke mbụ, mmeri nke eze ndịda n’Agha Ụwa nke Abụọ rụpụtaara ndị Kraịst ahụ efe, bụ́ ndị bi n’okpuru eze nke na-asọ ya mpi. (Tụlee Mkpughe 12:15, 16.) Mgbe ahụ, ndị ahụ eze nke nọchiri ya kpagburu nwetara ahụ efe site n’oge ruo n’oge, ka Agha Nzuzo ahụ jikwa nke nta nke nta na-ebelata, ọtụtụ ndị ndú bịara ghọta na ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi abụghị ihe iyi egwu wee si otú a nye ha nkwado iwu.c Enyemaka dị ukwuu abịawokwa n’ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke oké ìgwè ahụ, bụ́ ndị zaghachiworo ná nkwusa ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e tere mmanụ wee nyekwara ha aka, dị ka a kọwara na Matiu 25:34-40.

Ime Ka Ndị Chineke Dị Ọcha

19. (a) Olee otú ụfọdụ si “[jiri] ire ụtọ dị iche iche rapara ha n’ahụ”? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ “ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” pụtara? (Lee ntụaka ala ala peji.)

19 Ọ bụghị mmadụ nile ndị gosiri mmasị n’ijere Chineke ozi n’ime oge nke a nwere ezi nzube. Mmụọ ozi ahụ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọtụtụ mmadụ ga-eji ire ụtọ dị iche iche rapara ha n’ahụ. Ọzọ, ụfọdụ n’ime ndị ahụ nwere uche ga-asụ ngọngọ, ịnụcha ha, na ime ka ha dị ọcha, na ime ka ha nwuo ọcha, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: n’ihi na ọ fọdụrụ ịdị na mgbe a kara aka.”d (Daniel 11:34b, 35) Ụfọdụ gosiri mmasị n’eziokwu ahụ ma ha adịghị njikere ime ezi nraranye ijere Chineke ozi. Ndị ọzọ yiri ka ha anarawo ozi ọma ahụ bụ n’ezie ndị nledo maka ndị ọchịchị. Otu akụkọ a natara site n’otu ala na-agụ, sị: “Ụfọdụ n’ime ndị aghụghọ ndị a bụ ezi ndị Kọmụnist bụ́ ndị gbebataworo n’ime nzukọ Onyenwe anyị, mere oké gosipụta nke ịnụ ọkụ n’obi, ọbụna na a họpụtawo ha ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ije ozi ndị dị elu.”

20. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka ụfọdụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ‘sụọ ngọngọ’ n’ihi ndị mgbebata ihu abụọ?

20 Ndị mgbebata ahụ mere ka ụfọdụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi daba n’aka ndị ọchịchị. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwe ka ihe ndị dị otú ahụ mee? Maka nnụcha, ime ka a dị ọcha. Dị ka Jisọs “mụtara ịṅa ntị ya site n’ahụhụ nile ọ hụrụ,” otú a ka mkpụrụ obi ndị a kwesịrị ntụkwasị obi mụtara ịtachi obi site n’ule e lere okwukwe ha. (Ndị Hibru 5:8; Jemes 1:2, 3; tụlee Malakaị 3:3.) Otú a a ‘nụchara ha, mee ka ha dị ọcha, mee ka ha nwuo ọcha.’ Oké ịṅụrị ọṅụ na-echere ụdị ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mgbe mgbe a kara aka ahụ bịarutere maka ịkwụghachi ha ụgwọ maka ntachi obi ha. A ga-ahụ nke a mgbe anyị tụlekwuru amụma Daniel.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ma wepụta n’asụsụ Bekee na 1958 ná Mgbakọ Mba Nile “Uche Chineke” nke Ndịàmà Jehova.

b Akwụkwọ World Press Review nke November 1992 depụtara otu isiokwu sitere na The Toronto Star nke sịrị: “N’ime ọtụtụ afọ ndị gara aga, ndị Russia ahụwo ọtụtụ ihe ndị bụbu ihe nduhie a na-adịghị arụrụ ụka banyere akụkọ ihe mere eme nke mba ha ka ha dara n’ihu ihe ndị bụ eziokwu. Ma ihe ndị e kpughere banyere mmekọrịta ihe nke chọọchị na ọchịchị ndị kọmụnist bụ ihe otiti nke kasị njọ.”

c Lee Ụlọ Nche, July 15, 1991, peji nke 8-11.

d “Ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” pụrụ ịpụta “n’ime mgbe ọgwụgwụ.” Okwu a sụgharịrị ebe a ịbụ “ruo” pụtara n’ihe odide Aramaic nke Daniel 7:25, n’ebe ahụ ọ pụtara “n’ime” ma ọ bụ “maka.” Okwu ahụ pụtara otu ihe ahụ n’ihe odide Hibru nke 2 Ndị Eze 9:22, Job 20:5, na Ndị Ikpe 3:26. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ nsụgharị nke Daniel 11:35, e dere ya “ruo,” ọ bụrụkwa na nke a bụ nghọta ya ziri ezi mgbe ahụ, “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” n’ebe a aghaghị ịbụ mgbe ọgwụgwụ nke ntachi obi ndị Chineke.—Tụlee “Ka Eme Ihe I Nachọ n’Uwa,” peji nke 280-281.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị taa ịtụ anya inwe nghọta ka pụta ìhè nke amụma Daniel?

◻ Olee otú eze ugwu si ‘wee iwe ma mee ihe’?

◻ Olee otú òtù ohu ahụ si buru ụzọ hụ mpụtaghachi nke “ihe arụ ahụ na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”?

◻ Olee otú ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ si ‘sụọ ngọngọ, dị ike, ma nata enyemaka nta’?

[Foto dị na peeji nke 15]

N’okpuru Hitler, eze ugwu nwetaghachiri onwe ya n’ụzọ zuru ezu site ná mmeri e meriri ya na 1918 n’aka eze ndịda

[Foto dị na peeji nke 16]

Ndi ndú Krisendọm nwara isoro eze ugwu wulite mmekọrịta

[Ebe E Si Nweta Foto]

Zoran/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya