Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume’
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Septemba
    • 6. Gịnị ga-eme ma oké ìgwè mmadụ ahụ sichaa n’oké mkpagbu ahụ pụta? Kọwaa. (Kọwaakwa ihe e dere ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ nke gbara n’Ụlọ Nche a gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa.)

      6 Gụọ Daniel 12:2 na ihe e dere n’ala ala peeji ya. Gịnị ga-eme ma oké ìgwè mmadụ ahụ sichaa n’oké mkpagbu ahụ pụta? N’oge gara aga, anyị chere na amaokwu a na-ekwu banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ma ọ bụ otú e si kwusasiwe ozi ọma ike mgbe ndị mmegide gbalịchara ịkwụsị ozi ọma anyị n’afọ 1918.c Ma, anyị aghọtala ugbu a na ọ na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? E kwukwara gbasara ájá na Job 17:16. Okwu a sụgharịrị “ime ala” n’ihe e dere n’ala ala peeji Daniel 12:2 bụkwa otu okwu ahụ a sụgharịrị “ájá” na Job 17:16. Ihe ọ pụtara n’amaokwu ahụ bụ ili. Ihe ọ na-egosi bụ na Daniel 12:2 na-ekwu gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ma oge ikpeazụ a gachaa, mgbe a lụchara agha Amagedọn.

      7. (a) Olee otú ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-esi enweta ndụ ebighị ebi? (b) Olee otú o si bụrụ “mbilite n’ọnwụ ka mma”?

      7 Ma, Daniel 12:2 kwuru na ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ “ga-enweta ndụ ebighị ebi.” Gịnị ka ọ pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na n’ime otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ha bịa mata Jehova na Jizọs, gharakwa ịkwụsị ịmata ha, ma na-erubere ha isi. (Jọn 17:3) Ọ ga-abụ “mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ọ ga-aka nke ụmụ mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ n’oge gara aga mma. (Hib. 11:35) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị ahụ na-ezughị okè a kpọlitere n’ọnwụ mechara nwụọ ọzọ.

      8. Olee otú ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-esi ‘nweta nkọcha, ihere emeekwa ha ruo mgbe ebighị ebi’?

      8 Ma, ọ bụghị ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-achọ ka Jehova kụziere ha ihe. Daniel buru amụma na ụfọdụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ‘ga-enweta nkọcha, ihere emeekwa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ A gaghị ede aha ha n’akwụkwọ nke ndụ, ha agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi, maka na ha ga-enupụ isi. Kama inweta ndụ ebighị ebi, “ihere ga-eme ha ruo mgbe ebighị ebi,” ya bụ, na a ga-ebibi ha. Ọ pụtara na Daniel 12:2 na-ekwu gbasara ihe ga-emecha mee ndị niile a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ihi ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ.d (Mkpu. 20:12) Ụfọdụ ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ụfọdụ agaghị enweta.

  • ‘Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume’
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Septemba
    • a Isiokwu a ga-akọwa ihe a gbanwere n’otú anyị si ghọta ọrụ ịkụzi ihe kachanụ a rụtụrụla kemgbe ụwa, nke e kwuru okwu ya na Daniel 12:2, 3. Anyị ga-amata mgbe a ga-arụ ya na ndị ga-eso rụọ ya. Anyị ga-ahụkwa otú nkụzi a ga-esi mee ka ndị bi n’ụwa jikere maka ule ikpeazụ a ga-enwe mgbe Jizọs chịchara otu puku (1,000) afọ.

  • ‘Inyere Ọtụtụ Ndị Aka Ka Ha Bụrụ Ndị Ezi Omume’
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Septemba
    • c Ihe a a kọwara gbanwere ihe anyị ghọtaburu e dere n’isi nke 17 n’akwụkwọ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! nakwa n’Ụlọ Nche July 1, 1987, peeji nke 21 ruo na nke 25.

      d Ma, “ndị ezi omume” na “ndị ajọ omume” e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 24:15 na “ndị mere ezi ihe” na “ndị mere ajọ omume” e kwuru na Jọn 5:29 (Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ) na-ekwu gbasara ihe ndị a kpọlitere n’ọnwụ mere tupu ha anwụọ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya