Isi nke Iri na Asaa
Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe na Mgbe Ọgwụgwụ
1. Dị ka Daniel isi nke 7 si kwuo, ahụmahụ ndị dị aṅaa pụrụ iche ka otu obere ìgwè mmadụ, na-enweghị nchebe gaje inwe n’oge anyị?
OTU ike ọchịchị ụwa dị ike ejiri obi ịta mmiri na-awakpo obere ìgwè na-enweghị nchebe. Ha alanarị n’enweghị ihe mere ha, ọbụnakwa bụrụ ndị e mere ka ha dịghachi ọhụrụ—ọ bụghị site n’ike nke onwe ha kama n’ihi na Jehova Chineke ji ha kpọrọ ihe. Daniel isi nke 7 buru ihe ndị a n’amụma, bụ́ ndị mere ná mmalite nke narị afọ nke 20. Otú ọ dị, olee ndị bụ ndị a? Otu isi nke 7 nke Daniel ahụ zoro aka n’ebe ha nọ dị ka “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” bụ́ Jehova Chineke. O kpughekwara na n’ikpeazụ ndị a ga-eso chịa n’Alaeze Mesaịa!—Daniel 7:13, 14, 18, 21, 22, 25-27.
2. (a) Gịnị bụ echiche Jehova banyere ndị ohu ya e tere mmanụ? (b) Gịnị ga-abụ ihe amamihe dị na ya ime n’oge ndị a?
2 Dị ka anyị mụtara na Daniel isi 11, eze ugwu ga-abịaru n’ọgwụgwụ ya mgbe o yisịrị ala ime mmụọ nwere nchebe nke ndị a kwesịrị ntụkwasị obi egwu. (Daniel 11:45; tụlee Ezikiel 38:18-23.) Ee, Jehova na-echebe nnọọ ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ. Abụ Ọma 105:14, 15 na-agwa anyị, sị: “[Jehova] wee baara ndị eze mba n’ihi ha; sị, Unu emetụla ndị m e tere mmanụ aka, unu emejọkwala ndị amụma m.” Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na ị kweghị na n’oge ndị a dị oké njọ, ọ ga-abụrụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ na-abawanye ụba ihe amamihe isoro ndị nsọ a na-akpachi anya ruo n’ókè o kwere omume? (Mkpughe 7:9; Zekaraịa 8:23) Jisọs Kraịst tụrụ aro ka ndị yiri atụrụ mee nke ahụ kpọmkwem—soro ụmụnna ime mmụọ ya e tere mmanụ na-akpakọrịta site n’ịkwado ha n’ọrụ ha.—Matiu 25:31-46; Ndị Galetia 3:29.
3. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-adịghị mfe ịchọta ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ ma nọrọ ha nso? (b) Olee otú Daniel isi nke 12 ga-esi enye aka n’akụkụ a?
3 Otú ọ dị, Onye Iro Chineke, bụ́ Setan, anọwo na-ebu agha kpụ ọkụ n’ọnụ megide ndị ahụ e tere mmanụ. Ọ kwalitewo okpukpe ụgha, na-eme nnọọ ka ụwa jupụta ná ndị Kraịst adịgboroja. N’ihi ya, e duhiewo ọtụtụ ndị. Ndị ọzọ adịghị enwekwa olileanya na ha ga-achọtali ndị na-ekpe ezi okpukpe ahụ. (Matiu 7:15, 21-23; Mkpughe 12:9, 17) Ọbụna ndị chọtara “ìgwè atụrụ nta” ahụ ma soro ha na-akpakọ aghaghị ịgba mgba iji nọgide na-enwe okwukwe, n’ihi na ụwa a na-achọ mgbe nile imebi okwukwe. (Luk 12:32) Gị kwanụ? Ị̀ chọtawo “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” ì sokwa ha na-akpakọrịta? Ị̀ maara ọkpụrụkpụ ihe àmà nke na-egosi na ndị ị chọtaworo bụ n’ezie ndị Chineke họrọwooro? Ihe àmà dị otú ahụ pụrụ iwusi okwukwe gị ike. Ọ pụkwara ịkwadebe gị inyere ndị ọzọ aka ịhụ ọgba aghara okpukpe dị n’ụwa taa. Daniel isi nke 12 nwere imerime ihe ọmụma a nke na-azọpụta ndụ.
ONYEISI UKWU AHỤ AMALITE ỌRỤ
4. (a) Daniel 12:1 na-ebu amụma ihe abụọ dị aṅaa dịgasị iche banyere Maịkael? (b) N’akwụkwọ Daniel, gịnị ka ‘nguzo ọtọ’ nke eze na-apụtakarị?
4 Daniel 12:1 na-agụ, sị: “Mgbe ahụ ka Maịkael ga-eguzo ọtọ, bụ́ onyeisi ukwu ahụ nke na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị gị.” Amaokwu a na-ebu amụma ihe abụọ pụrụ iche banyere Maịkael: otu, na ọ “na-eguzo ọtọ,” na-atụ aro ọnọdụ nke na-adịru oge ụfọdụ; nke abụọ, na ọ “ga-eguzo ọtọ,” na-atụ aro ihe omume nke ga-ewere ọnọdụ n’oge ahụ. O kwesịrị ka anyị buru ụzọ mara oge mgbe Maịkael “na-eguzo n’akụkụ ụmụ ndị [Daniel].” Cheta na Maịkael bụ aha e nyere Jisọs n’ọkwá ya dị ka Onye Ọchịchị eluigwe. Aka e zoro ‘n’iguzo ọtọ’ ya na-echetara anyị ụzọ e si jiri okwu a mee ihe n’ebe ọzọ n’akwụkwọ Daniel. Ọ na-ezokarị aka n’ihe eze mere, dị ka ya ịmalite ọchịchị.—Daniel 11:2-4, 7, 20, 21.
5, 6. (a) N’oge dị aṅaa ka Maịkael na-eguzo ọtọ? (b) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Maịkael “ga-eguzo ọtọ,” gịnịkwa ka ọ ga-arụpụta?
5 O doro anya na n’ebe a, mmụọ ozi ahụ na-ezo aka n’oge a kpọrọ aha n’ebe ọzọ n’amụma Bible. Jisọs kpọrọ ya “ọnụnọ” ya (Grik, pa·rou·si’a), bụ́ mgbe ọ ga-achị dị ka Eze n’eluigwe. (Matiu 24:37-39, NW) A kpọkwara oge a “mgbe ikpeazụ” na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (2 Timoti 3:1; Daniel 12:4, 9) Kemgbe oge ahụ malitere na 1914, Maịkael anọwo na-eguzo ọtọ dị ka Eze n’eluigwe.—Tụlee Aịsaịa 11:10; Mkpughe 12:7-9.
6 Otú ọ dị, olee mgbe Maịkael “ga-eguzo ọtọ”? Ọ bụ mgbe o biliri ime ihe pụrụ iche. Jisọs ga-eme nke a n’ọdịnihu. Mkpughe 19:11-16 na-akọwa Jisọs n’ụzọ amụma dị ka Eze Mesaịa dị ike nke nọ n’elu ịnyịnya bụrụ onyeisi nke usuu ndị mmụọ ozi ma na-ebibi ndị iro Chineke. Daniel 12:1 na-aga n’ihu, sị: “Mgbe ahụhụ ga-adịkwa, nke mgbe dị otú ahụ na-adịghị site na mgbe mba ọ bụla malitere ịdị ruo mgbe ahụ.” Dị ka Onye Bụ́ Isi Na-emezu Ihe Jehova Kpere n’Ikpe, Kraịst ga-ebibi ajọ usoro ihe a nile ná “mkpagbu ukwu” ahụ e buru amụma ya.—Matiu 24:21; Jeremaịa 25:33; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8; Mkpughe 7:14; 16:14, 16.
7. (a) Olee olileanya dịịrị ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi na “mgbe ahụhụ” ahụ na-abịanụ? (b) Gịnị bụ akwụkwọ Jehova, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa na a chọtara aha mmadụ n’ime ya?
7 Olee otú ihe ga-esi gaara ndị nwere okwukwe n’oge ọjọọ a? A gwakwuru Daniel, sị: “Na mgbe ahụ ka a ga-eme ka ndị gị wepụga onwe ha, bụ́ onye ọ bụla a ga-ahụ na e deworo aha ya n’akwụkwọ.” (Tụlee Luk 21:34-36.) Gịnị bụ akwụkwọ a? N’ụzọ bụ́ isi, ọ na-anọchite anya ncheta Jehova Chineke ga-echeta ndị na-eme uche ya. (Malakaị 3:16; Ndị Hibru 6:10) Ndị e deturu aha ha n’akwụkwọ nke ndụ a bụ ndị kasị nọrọ ná nchebe n’ụwa, n’ihi na ha na-enweta nchebe Chineke. N’agbanyeghị ọdachi ọ bụla pụrụ ịbịakwasị ha, a pụrụ idozi ya, a ga-edozikwa ya. Ọ bụrụgodị na ha anwụọ tupu “mgbe ahụhụ” a na-abịanụ, ha ka nọ ná nchebe ná ncheta na-enweghị nsọtụ nke Jehova. Ọ ga-echeta ha ma mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst.—Ọrụ 24:15; Mkpughe 20:4-6.
NDỊ NSỌ ‘ETETA’
8. Daniel 12:2 na-enye olileanya dị aṅaa na-eme obi ụtọ?
8 Olileanya mbilite n’ọnwụ na-akasi obi n’ezie. Daniel 12:2 na-ekwu banyere ya, na-asị: “Ọtụtụ mmadụ n’ime ndị na-arahụ ụra n’ala, bụ́ ájá, ga-eteta, ụfọdụ ịba ná ndụ ebighị ebi, ụfọdụ ịba n’ịta ụta hiri nne na oyi a ga-asọ ha nke ukwuu mgbe ebighị ebi.” (Tụlee Aịsaịa 26:19.) Okwu ndị a pụrụ ichetara anyị nkwa na-akpali akpali nke Jisọs Kraịst kwere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nke ụdị ndị dị iche iche a ga-akpọlite ná ndụ n’ụwa. (Jọn 5:28, 29) Lee olileanya na-akpali akpali ọ bụ! Cheedị nnọọ echiche banyere inye ndị enyi na ezinụlọ a hụrụ n’anya—ndị nwụrụ anwụ ugbu a—ohere ịdị ndụ ọzọ n’ọdịnihu! Ma nkwa a dị n’akwụkwọ Daniel na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’ụdị mbilite n’ọnwụ ọzọ—ụdị nke werewooro ọnọdụ. N’ụzọ dị aṅaa?
9. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Daniel 12:2 ga-emezu na mgbe ikpeazụ? (b) Olee ụdị mbilite n’ọnwụ amụma ahụ na-ezo aka na ya, oleekwa otú anyị si mara?
9 Tụlee ihe gbara ya gburugburu. Dị ka anyị hụworo, amaokwu mbụ nke Da isi nke 12 ga-emezu, ọ bụghị nanị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a kamakwa na mgbe ikpeazụ a nile. N’ezie, ihe ka ukwuu n’isi nke 12 ga-emezu, ọ bụghị na paradaịs elu ala na-abịanụ, kama na mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a. È nwewo mbilite n’ọnwụ n’oge a? Pọl onyeozi dere banyere mbilite n’ọnwụ nke “ndị nke Kraịst” dị ka nke ga-ewere ọnọdụ “n’oge ọnụnọ ya.” (NW) Otú ọ dị, ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe bụ ndị a ga-akpọlite dị ka ndị “na-apụghị ire ure.” (1 Ndị Kọrint 15:23, 52) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha a ga-akpọlite “ịba n’ịta ụta hiri nne na oyi a ga-asọ ha nke ukwuu mgbe ebighị ebi,” nke e buru n’amụma na Daniel 12:2. È nwere ụdị mbilite n’ọnwụ ọzọ? Na Bible, mgbe ụfọdụ mbilite n’ọnwụ na-enwe ihe ọ na-apụta n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ma akwụkwọ Ezikiel ma Mkpughe nwechara ozi amụma ndị metụtara ntụte, ma ọ bụ mbilite n’ọnwụ ime mmụọ.—Ezikiel 37:1-14; Mkpughe 11:3, 7, 11.
10. (a) N’echiche dị aṅaa ka a kpọlitere ihe fọdụrụ e tere mmanụ n’ọnwụ na mgbe ọgwụgwụ? (b) Olee otú ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ, ọ bụ ezie na a tụtere ha, si bụrụ ndị tetara baa “n’ịta ụta hiri nne na oyi a ga-asọ ha nke ukwuu mgbe ebighị ebi”?
10 È nwewo ntụte ime mmụọ dị otú ahụ nke ndị ohu Chineke e tere mmanụ na mgbe ọgwụgwụ a? Ee! Ọ bụ akụkọ mere eme n’ezie na na 1918 a wakporo obere ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasi obi n’ụzọ dị ukwuu nke kpaghasịrị ozi ihu ọha ha a haziri ahazi. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ bụ ezie na o yighị ihe pụrụ ime eme, na 1919 ha dịghachiri ndụ n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ndị a merenụ kwekọrọ ná nkọwa nke mbilite n’ọnwụ ahụ e buru n’amụma na Daniel 12:2. Ụfọdụ ‘tetara’ n’ụzọ ime mmụọ n’oge ahụ na mgbe ọ gasịrị. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọ bụghị ha nile dịgidere ndụ n’ụzọ ime mmụọ. Ndị họọrọ ịjụ Eze Mesaịa ahụ mgbe e mesịrị ka ha teta, bụ́ ndị hapụkwara ozi Chineke wetaara onwe ha ‘ịta ụta na ịsọ oyi ebighị ebi’ a kọwara na Daniel 12:2. (Ndị Hibru 6:4-6) Otú ọ dị, ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ, n’iji ọnọdụ ntụte a tụtere ha n’ụzọ ime mmụọ mee ezi ihe, jiri iguzosi ike n’ihe kwadoo Eze Mesaịa ahụ. N’ikpeazụ, ikwesị ntụkwasị obi ha na-eduje, dị ka amụma ahụ na-ekwu, “ná ndụ ebighị ebi.” Taa, ike ime mmụọ ha nwere n’agbanyeghị mmegide na-enyere anyị aka ịmata ha.
HA ‘NA-ENWU DỊ KA KPAKPANDO’
11. Olee ndị bụ “ndị nwere uche” taa, n’echiche dịkwa aṅaa ka ha na-enwu ka kpakpando?
11 Amaokwu abụọ na-esonụ nke Daniel isi nke 12 na-enyekwuru anyị aka ịmata ndị bụ “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.” N’amaokwu nke 3 mmụọ ozi ahụ na-agwa Daniel, sị: “Ndị ahụ ndị nwere uche ga na-enwu ọcha dị ka onwunwu ọcha nke mbara igwe; ndị na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume ga na-amụkwa dị ka kpakpando ruo mgbe nile ebighị ebi.” Olee ndị bụ “ndị nwere uche” taa? Ọzọ, ihe àmà na-arụga aka n’otu ‘ndị nsọ ahụ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.’ E kwuwerị, ole ndị ma e wezụga ihe ahụ fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ nwere nghọta ịmata na Maịkael, Onyeisi Ukwu ahụ, malitere iguzo ọtọ dị ka Eze na 1914? Site n’ikwusa eziokwu ndị dị ka nke a—nakwa site n’ịnọgide na-enwe àgwà ndị Kraịst—ha anọwo “na-enye ìhè” n’ụwa a gbara ọchịchịrị n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Filipaị 2:15; Jọn 8:12) Banyere ha, Jisọs buru amụma, sị: “Mgbe ahụ ka ndị ezi omume ga-enwupụ dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.”—Matiu 13:43.
12. (a) Na mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a, olee otú ndị ahụ e tere mmanụ siworo “na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume”? (b) Olee otú ndị ahụ e tere mmanụ ga-esi mee ka ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume ma ‘nwuo ka kpakpando’ n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst?
12 Ọbụna Daniel 12:3 na-agwa anyị ọrụ ndị Kraịst a e tere mmanụ ga na-arụ na mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a. Ha ga “na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume.” Ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ malitere ịchịkọta ọnụ ọgụgụ fọdụrụ na 144,000 ahụ ha na Kraịst ga-eso chịa. (Ndị Rom 8:16, 17; Mkpughe 7:3, 4) Mgbe a rụchara ọrụ ahụ—n’etiti afọ ndị 1930 dị ka ihe àmà na-egosi—ha malitere ịchịkọta “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ.” (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Ndị a kwa nwere okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. N’ihi ya, ha nwere nguzo dị ọcha n’ihu Jehova. N’ịdị ọtụtụ nde taa, ha weere olileanya nke ịlanarị mbibi nke ajọ ụwa a na-abịanụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, Jisọs na 144,000 ndị eze na ndị nchụàjà ibe ya ga-eji uru nke ihe mgbapụta ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nọ n’elu ala, si otú ahụ na-enyere ndị nile na-egosipụta okwukwe aka iwepụ ihe ọ bụla fọdụrụnụ ná mmehie e ketara n’aka Adam. (2 Pita 3:13; Mkpughe 7:13, 14; 20:5, 6) N’echiche kasị zuo ezuo, ndị ahụ e tere mmanụ ga-ekerezi òkè ‘n’ime ka ọha mmadụ ghọọ ndị ezi omume,’ ha ‘ga-enwukwa ọcha dị ka kpakpando’ n’eluigwe. Ì ji olileanya nke ịdị ndụ n’elu ala n’okpuru ọchịchị eluigwe dị ebube nke Kraịst na ndị ya na ha ga-achị kpọrọ ihe? Lee ihe ùgwù ọ bụ isoro “ndị nsọ” ahụ kere òkè n’ikwusa ozi ọma a nke Alaeze Chineke!—Matiu 24:14.
HA “NA-EJEGHARỊ”
13. N’echiche dị aṅaa ka e zobere ma kachite okwu dị n’akwụkwọ Daniel akara?
13 Ihe ahụ mmụọ ozi ahụ kwupụtara gwa Daniel, bụ́ nke malitere laa azụ na Daniel 10:20, ji okwu ndị a na-akpali akpali mechizie: “Ma gị onwe gị, Daniel, zobe okwu ndị a, kachitekwa akwụkwọ a akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” (Daniel 12:4) Ọtụtụ n’ime ihe e nyere Daniel ike mmụọ nsọ ide bụ n’ezie ihe e zoro ezo na ihe a kachitere akara ka ụmụ mmadụ ghara ịghọta ya. Leenụ, Daniel n’onwe ya mesịrị dee, sị: “Mụ onwe m wee nụ, ma adịghị m aghọta.” (Daniel 12:8) N’echiche a, a kachitere akwụkwọ Daniel akara ruo ọtụtụ narị afọ. Taa kwanụ?
14. (a) Na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” ole ndị ‘jegharịworo,’ n’ebeekwa? (b) Olee ihe àmà na-egosi na Jehova agọziwo ‘njegharị’ a?
14 Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịdị ndụ na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” nke e buru amụma ya n’akwụkwọ Daniel. Dị ka e buru n’amụma, ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘ejegharịwo’ n’ime Okwu Chineke. Gịnị ka ọ rụpụtara? Site na ngọzi Jehova, ezi ihe ọmụma ejupụtawo. E jiriwo nghọta gọzie Ndịàmà Jehova e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ nke mere ka ha nwee ike ịghọta na Nwa nke mmadụ ghọrọ Eze na 1914, ịmata anụ ọhịa ndị dị n’amụma Daniel, ịdọ aka ná ntị megide “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”—ndị a bụkwa nanị ihe atụ ole na ole. (Daniel 11:31) Ya mere, ụba nke ihe ọmụma a bụkwa ihe ọzọ e ji amata “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu.” Ma Daniel nwetara ihe àmà ọzọ.
A ‘GBAJIE HA’
15. Olee ajụjụ otu mmụọ ozi jụrụ ugbu a, ọ̀ bụkwa ole ndị ka ajụjụ a pụrụ ichetara anyị?
15 Dị ka anyị chetara, Daniel nwetara ozi ndị a sitere n’aka mmụọ ozi n’ikperé nke “osimiri ukwu ahụ,” bụ́ Hidekel, nke a makwaara dị ka Taịgris. (Daniel 10:4) Ugbu a ọ hụrụ ihe e kere eke atọ bụ́ mmụọ ozi n’ebe a wee sị: “M wee hụ, mụ onwe m, bụ́ Daniel, ma, lee, abụọ ọzọ na-eguzo, otu onye n’otu ụsọ osimiri ahụ, ibe ya n’ụsọ osimiri nke ọzọ. Otu n’ime ha wee sị onye ahụ nke yiri uwe ọcha, nke nọ n’elu mmiri nke osimiri ahụ, Ruo ole mgbe ka ọgwụgwụ oké ọrụ ndị a ga-adị?” (Daniel 12:5, 6) Ajụjụ mmụọ ozi a jụrụ n’ebe a pụrụ ichetara anyị “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu” ọzọ. Ná mmalite nke “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” na 1914, ha nwere oké nchegbu banyere ogologo oge a ga-anọ tupu e mezuo nkwa Chineke. Na ha bụ ndị amụma a lekwasịrị anya pụtawanyere ìhè n’azịza nke ajụjụ a.
16. Olee amụma mmụọ ozi ahụ buru, oleekwa otú o si mesie ya ike na ọ ga-emezurịrị?
16 Ihe ndekọ Daniel gara n’ihu, na-asị: “M wee nụ onye ahụ nke yiri uwe ọcha, onye nọ n’elu mmiri nke osimiri ahụ, o wee welie aka nri ya na aka ekpe ya n’eluigwe, were Onye ahụ Nke na-adị ndụ mgbe ebighị ebi, sị, na ọ ga-adịru otu mgbe a kara aka, na mgbe abụọ a kara aka, na nkera mgbe a kara aka; ma mgbe a ga-agbajisị aka nke ndị nsọ ahụ, ihe nile ndị a ga-agwụsị.” (Daniel 12:7) Ihe a abụghị ihe egwuregwu. Mmụọ ozi ahụ weliri aka ya abụọ n’ịṅụ iyi, eleghị anya ka ndị mmụọ ozi abụọ ahụ nọ n’akụkụ abụọ ahụ nke osimiri ahụ dị obosara wee hụ aka ahụ o weliri. O si otú a mesie ya ike na amụma a ga-emezurịrị. Ma, olee mgbe bụ oge ndị a a kara aka? Azịza ya esighị ike nchọpụta dị ka ị pụrụ iche na o siri.
17. (a) Olee myirita ndị a pụrụ ịhụ n’amụma ndị e dekọrọ na Daniel 7:25, Daniel 12:7, na Mkpughe 11:3, 7, 9? (b) Olee otú oge atọ na ọkara ahụ haruru n’ogologo?
17 N’ụzọ dị ịrịba ama, amụma a yiri amụma abụọ ndị ọzọ. Otu, bụ́ nke anyị tụlere n’Isi nke 9 nke akwụkwọ a, dị na Daniel 7:25; nke ọzọ, dị ná Mkpughe 11:3, 7, 9. Rịba ama ụfọdụ n’ime ebe ndị ha yiritara. Nke ọ bụla ga-ewere ọnọdụ na mgbe ọgwụgwụ. Amụma abụọ ahụ metụtara ndị ohu Chineke dị nsọ, na-egosi ha dị ka ndị a na-akpagbu ọbụnakwa dị ka ndị na-enweghị ike ime nkwusa ihu ọha ha ruo nwa oge. Amụma nke ọ bụla na-egosi na ndị ohu Chineke dịghachiri ndụ wee maliteghachi ọrụ ha, na-emeri ndị na-akpagbu ha. Amụma nke ọ bụla kwukwara otú oge ihe isi ike a ndị nsọ ga-enwe ga-aharu. Amụma abụọ ahụ dị na Daniel (7:25 na 12:7) na-ezo aka ‘n’otu oge na oge abụọ na nkera oge.’ Ndị ọkà mmụta n’ozuzu ha ghọtara nke a ịpụta oge atọ na ọkara. Mkpughe na-ezo aka n’otu oge ahụ dị ka ọnwa 42, ma ọ bụ ụbọchị 1,260. (Mkpughe 11:2, 3) Nke a na-akwado na oge atọ na ọkara ahụ dị na Daniel na-ezo aka n’afọ atọ na ọkara nke nke ọ bụla dị ụbọchị 360. Ma olee mgbe ụbọchị 1,260 ndị a malitere?
18. (a) Dị ka Daniel 12:7 si kwuo, gịnị ga-aka ọgwụgwụ nke ụbọchị 1,260 ahụ akara? (b) Olee mgbe a gbajiri “aka nke ndị nsọ ahụ” kpam kpam, oleekwa otú nke a si mee? (ch) Olee mgbe ụbọchị 1,260 ahụ malitere, oleekwa otú ndị ahụ e tere mmanụ si ‘buo amụma n’ákwà mkpe’?
18 Amụma ahụ kwuru kpọmkwem mgbe ụbọchị 1,260 ahụ ga-agwụ—mgbe “a ga-agbajisị aka nke ndị nsọ ahụ.” N’etiti afọ 1918, a mara ndị a ma ama so na Watch Tower Bible and Tract Society, tinyere onyeisi oche ya, bụ́ J. F. Rutherford, ikpe n’ihi ebubo ụgha, maa ha ikpe ịga mkpọrọ ruo ogologo oge, ma tụọ ha mkpọrọ. N’ezie ndị nsọ Chineke hụrụ ọrụ ha ka ‘a gbajiri ya,’ bibie ike ha. Ịgụrụ afọ atọ na ọkara laa azụ malite n’etiti afọ 1918 na-eweta anyị ná ngwụsị nke afọ 1914. N’oge ahụ obere ìgwè ndị ahụ e tere mmanụ na-akwadebe onwe ha maka ntiwapụ nke mkpagbu. Agha Ụwa Mbụ etiwapụwo, mmegide a na-emegide ọrụ ha nọkwa na-arị elu. Maka afọ 1915, ọbụna ha mere ka isiokwu dịịrị afọ ha dabere n’ajụjụ a Kraịst jụrụ ụmụazụ ya: “Ùnu pụrụ ịṅụ iko m?” (Matiu 20:22, King James Version) Dị ka e buru amụma ya ná Mkpughe 11:3, oge ahụ dị ụbọchị 1,260 nke maliterenụ bụ oge iru újú nye ndị e tere mmanụ—ọ dị ka a ga-asị na ha na-ebu amụma n’ákwà mkpe. Mkpagbu kara njọ. A tụrụ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ, ìgwè mmadụ wakporo ndị ọzọ, e mekpọkwara ndị ọzọ ọnụ. Ọtụtụ nwere nkụda mmụọ n’ihi ọnwụ nke onyeisi oche mbụ nke Society, bụ́ C. T. Russell, na 1916. Ma, gịnị ga-eme mgbe oge ọjọọ a gwụsịrị bụ́ mgbe e gburu ndị nsọ a dị ka nzukọ na-eme nkwusa?
19. Olee otú amụma ahụ dị na Mkpughe isi nke 11 si mesie anyị obi ike na a gaghị ekpuchi ndị ahụ e tere mmanụ ọnụ ruo ogologo oge?
19 Amụma yiri nke ahụ nke dị ná Mkpughe 11:3, 9, 11 na-egosi na mgbe e gburu “ndị àmà abụọ” ahụ, ozu ha tọgbọrọ ruo nanị nwa oge—ụbọchị atọ na ọkara—ruo mgbe a tụtere ha. N’otu aka ahụ, amụma ahụ dị na Daniel isi nke 12 na-egosi na ndị nsọ ahụ agaghị agbachi nkịtị kama ha nwere ọrụ ka ukwuu na-echere ha.
‘E MEE KA HA DỊ ỌCHA, NWUO ỌCHA, NỤCHAAKWA HA’
20. Dị ka Daniel 12:10 si kwuo, olee ngọzi ndị ga-abịara ndị e tere mmanụ mgbe ahụmahụ ọjọọ ha gasịrị?
20 Dị ka e kwuru na mbụ, Daniel deturu ihe ndị a ma ọ pụghị ịghọta ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghaghị icheworị n’onwe ya ma ndị mkpagbu ahụ hà ga-egbuchapụ ndị nsọ ahụ n’ezie, n’ihi na ọ jụrụ, sị, “Gịnị bụ mgbe ikpeazụ nke ihe ndị a?” Mmụọ ozi ahụ zara, sị: “Laa, Daniel: n’ihi na e zobewo okwu ndị a, kachitekwa ha akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a. Ọtụtụ mmadụ ga-eme onwe ha ka ha dị ọcha, ha ga-eme onwe ha ka ha nwuo ọcha, a ga-anụchakwa ha; ma ndị na-emebi iwu ga-emebi iwu; ndị nile nke na-emebi iwu agaghị aghọtakwa ihe: ma ndị ahụ ndị nwere uche ga-aghọta.” (Daniel 12:8-10) E nwere olileanya e ji n’aka maka ndị nsọ ahụ! Kama ịbụ ndị e bibiri, a ga-eme ka ha nwuo ọcha, were nguzo dị ọcha n’ebe Jehova Chineke nọ gọzie ha. (Malakaị 3:1-3) Nghọta ha nwere n’ihe ime mmụọ ga-eme ka ha nwee ike ịnọgide na-adị ọcha n’anya Chineke. N’ụzọ dị iche, ndị ajọ omume ga-ajụ ịghọta ihe ime mmụọ. Ma olee mgbe ihe ndị a nile ga-eme?
21. (a) Oge ahụ e buru amụma ya na Daniel 12:11 ga-amalite mgbe e nweworo ọnọdụ ndị dị aṅaa? (b) Gịnị bụ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum,” oleekwa mgbe e wezụgara ya? (Lee igbe dị na peji nke 298.)
21 A gwara Daniel, sị: “Site na mgbe a ga-ewezụga àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum, mgbe a ga-edo ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, [otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri itoolu] ga-adị.” Ya mere oge a ga-amalite mgbe e nweworo ọnọdụ ụfọdụ. A ga-ewepụ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum.” (Daniel 12:11) Àjà dị aṅaa ka mmụọ ozi ahụ bu n’uche? Ọ bụghị àjà anụmanụ a na-achụ n’ụlọ nsọ elu ala ọ bụla. Ọbụna ụlọ nsọ ahụ nke dịbu na Jerusalem bụ nanị “ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie”—oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, bụ nke malitere ọrụ mgbe Kraịst ghọrọ Onyeisi Nchụàjà ya na 29 O.A.! N’ụlọ nsọ ime mmụọ a, nke na-anọchite anya ndokwa Chineke maka ofufe dị ọcha, ọ dịghị mkpa ka a nọgide na-achụ àjà mmehie, maka na ‘e chere Kraịst n’ihu Chineke nanị otu mgbe iburu mmehie nile nke ọtụtụ mmadụ.’ (Ndị Hibru 9:24-28) N’agbanyeghị nke ahụ, ezi ndị Kraịst nile na-achụ àjà n’ụlọ nsọ a. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị site n’aka [Kraịst] na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.” (Ndị Hibru 13:15) Ya mere e nwere ọnọdụ mbụ a nke amụma ahụ—iwepụ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum”—n’etiti afọ 1918 mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọrụ nkwusa ahụ kwụsịchaa.
22. (a) Gịnị bụ “ihe arụ” ahụ na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, oleekwa mgbe e guzobere ya? (b) Olee mgbe oge ahụ e buru amụma ya na Daniel 12:11 malitere, oleekwa mgbe ọ gwụrụ?
22 Otú ọ dị, gịnị banyere ọnọdụ nke abụọ—‘ndebe,’ ma ọ bụ nguzobe, nke “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu”? Dị ka anyị hụrụ ná ntụle anyị tụlere Daniel 11:31, ihe arụ a bu ụzọ bụrụ Njikọ Mba Nile ma mesịa pụtaghachi dị ka òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Ha abụọ bụ ihe arụ n’ihi na e towo ha dị ka nanị olileanya e nwere maka udo n’elu ụwa. N’ihi ya, n’obi ọtụtụ ndị, òtù ndị a na-ewere ọnọdụ nke Alaeze Chineke! A tụrụ aro ka e hiwe Njikọ ahụ n’ụzọ pụtara ìhè na January 1919. Mgbe ahụ, n’oge ahụ, e nwezuru ọnọdụ abụọ nke Daniel 12:11. Ya mere ụbọchị 1,290 ahụ bidoro ná mmalite 1919 ma dịrị ruo n’oge mgbụsị akwụkwọ (n’Ebe Ugwu Ụwa) nke 1922.
23. Olee otú ndị nsọ Chineke si gaa n’ihu ịbụ ndị nwere nguzo dị ọcha n’ụbọchị 1,290 ahụ e buru n’amụma na Daniel isi nke 12?
23 N’oge ahụ, ndị nsọ ahụ hà nwere ọganihu n’ịbụ ndị e mere ka ha nwuo ọcha ma dị ọcha n’anya Chineke? Ha nwere n’ezie! Na March 1919 a tọhapụrụ onyeisi oche nke Watch Tower Society na ndị òtù ya ná mkpọrọ. E mesịrị sị na ikpe ebubo ụgha ndị ahụ e boro ha amaghị ha. N’ịmata na ọrụ ha agwụbeghị, ha malitere ọrụ ozugbo, na-ahazi mgbakọ a ga-enwe na September 1919. N’otu afọ ahụ, e bipụtara magazin ya na Ụlọ Nche na-agakọ na nke mbụ ya. N’ịbụ nke a kpọrọ The Golden Age na mbụ (Teta! ugbu a), ọ nọwo mgbe nile na-akwado Ụlọ Nche n’ịgba àgwà na-ezighị ezi nke ụwa a ọtọ n’atụghị egwu nakwa n’inyere ndị Chineke aka ịnọgide na-adị ọcha. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke ụbọchị 1,290 ahụ e buru n’amụma, ndị nsọ ahụ amalitelarị inwe nguzo dị ọcha na ịbụ ndị e weghachiri eweghachi. Na September 1922, kpọmkwem n’ihe dị ka mgbe ụbọchị ndị a gwụrụ, ha nwere mgbakọ dị ịrịba ama na Cedar Point, Ohio, U.S.A. O nyere ọrụ nkwusa ahụ nkwali dị ukwuu. Otú ọ dị, a ka nwere mkpa maka inwekwu ọganihu. Nke ahụ cheere oge ọzọ a kara aka.
OBI ỤTỌ NYE NDỊ NSỌ AHỤ
24, 25. (a) Olee oge e buru n’amụma na Daniel 12:12, oleekwa mgbe ihe àmà gosiri na ọ malitere ma gwụ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ e tere mmanụ ná mmalite nke ụbọchị 1,335 ahụ?
24 Mmụọ ozi Jehova ji okwu ndị a mechie amụma ya banyere ndị nsọ ahụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke na-echere, wee bịarute [n’otu puku narị ụbọchị atọ na iri atọ na ise] ahụ!” (Daniel 12:12) Mmụọ ozi ahụ enyeghị ihe ọ bụla a ga-eji mara mgbe oge a ga-amalite ma ọ bụ gwụsịa. Akụkọ ihe mere eme yiri ka ọ na-egosi na o sochiri oge ahụ bu ụzọ ozugbo. Ya bụrụ otú ahụ ọ ga-amalite n’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1922 ruo ná ngwụsị oge opupu ihe ubi nke 1926 (n’Ebe Ugwu Ụwa). Ndị Nsọ ahụ hà banyere n’ọnọdụ nke inwe obi ụtọ mgbe oge ahụ gwụsịrị? Ee, n’ụzọ ime mmụọ ndị dị mkpa.
25 Ọbụna mgbe e nwesịrị mgbakọ ahụ na 1922 (nke e gosiri na peji nke 302), ụfọdụ n’ime ndị nsọ Chineke ka nọ na-eleghachi anya n’agụụ n’ihe gara aga. Ihe bụ́ isi ha ji amụ ihe ná nzukọ ha ka bụ Bible na mpịakọta Studies in the Scriptures, nke C. T. Russell dere. N’oge ahụ, ọ dị echiche ọtụtụ ndị nwere nke na-arụga aka na 1925 dị ka afọ mbilite n’ọnwụ ga-amalite nakwa mgbe a ga-eweghachi Paradaịs n’elu ala. N’ụzọ dị otú a, ọtụtụ nọ na-eje ozi na-eburu oge a kapịrị ọnụ n’uche. Ụfọdụ ji mpakọ jụ ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa gwa ọha mmadụ. Nke a abụghị ihe na-eme obi ụtọ.
26. Ka ụbọchị 1,335 ahụ na-aga n’ihu, olee otú ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ahụ e tere mmanụ si gbanwee?
26 Otú ọ dị, ka ụbọchị 1,335 ahụ na-aga n’ihu, ihe ndị a nile malitere ịgbanwe. E butere ime nkwusa ụzọ, ka e guzobere ndokwa chiri anya iji mee ka mmadụ nile kere òkè n’ozi ubi. E dokwara nzukọ iji mụọ Ụlọ Nche kwa izu. Mbipụta nke March 1, 1925 (Bekee), bu isiokwu ahụ dị ịrịba ama bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ,” na-eme ka ndị Chineke nwee nghọta zuru ezu banyere ihe mere n’oge 1914-1919 ahụ. Mgbe 1925 gafere, ndị nsọ, ahụ ejekwaraghị Chineke ozi na-eburu oge a kapịrị ọnụ, dị nso n’uche. Kama nke ahụ, ido aha Jehova nsọ butere ụzọ. E mere ka eziokwu a dị mkpa pụta ìhè otú a na-emetụbeghị mbụ, n’isiokwu Ụlọ Nche nke January 1, 1926 (Bekee) bụ́ “Ònye Ga-asọpụrụ Jehova?” Ná mgbakọ ahụ e nwere na May 1926, e wepụtara akwụkwọ bụ́ Deliverance. (Lee peji nke 302.) Nke a bụ otu n’ime usoro akwụkwọ ọhụrụ ndị e zubere iji dochie Studies in the Scriptures. Ndị nsọ ahụ adịkwaghị eleghachi anya azụ n’ihe gara aga. Ha ji obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu na n’ọrụ dị n’ihu. Ya mere, dị ka e buru n’amụma, ụbọchị 1,335 ahụ gwụsịrị ka ndị nsọ ahụ nọ na-enwe obi ụtọ.
27. Olee otú nnyocha nke Daniel isi nke 12 n’ozuzu ya si na-enyere anyị aka ịmata kpọmkwem ndị Jehova e tere mmanụ?
27 Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile tachiri obi n’oge a siri ike. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ya kpatara mmụọ ozi ahụ ji mesie ike mkpa ọ dị ‘ichere.’ A gọziri ndị ahụ tachiri obi ma nọgide na-echere n’ụba. Inyocha Daniel isi nke 12 n’ozuzu ya na-eme ka nke a doo anya. Dị ka e buru n’amụma, a tụtere, ma ọ bụ kpọlite ndị ahụ e tere mmanụ n’ọnwụ n’ụzọ ime mmụọ. E nyere ha nghọta dị ịrịba ama n’Okwu Chineke, ebe e nyere ha ike ‘ijegharị’ n’ime ya nakwa, n’ịbụ ndị mmụọ nsọ na-eduzi, ikpughe ihe ndị bụworo ihe omimi ruo ọtụtụ afọ. Jehova mere ka ha dị ọcha ma mee ka ha nwuo dị ka kpakpando n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ha mere ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume n’ebe Jehova Chineke nọ.
28, 29. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị ka “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” na-abịa ná njedebe ya?
28 Ebe e nwere akara amụma ndị a nile a ga-eji amata “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” olee ihe ngọpụ a pụrụ inwe maka ịghara ịmata ha na isoro ha na-akpakọ? Ngọzi dị ebube na-echere oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị sonyeere òtù ahụ e tere mmanụ na-ebelata n’ọnụ ọgụgụ n’ijere Jehova ozi. Anyị nile aghaghị ịnọgide na-echere mmezu nke nkwa Chineke. (Habakuk 2:3) N’ụbọchị anyị Maịkael, bụ́ Onyeisi Ukwu ahụ, anọwo na-eguzo ọtọ n’ihi ndị Chineke kemgbe ọtụtụ iri afọ. N’oge na-adịghị anya ọ ga-amalite ime ihe dị ka onye Chineke họpụtara ibibi usoro ihe a. Mgbe ọ ga-eme nke ahụ, gịnị ga-abụ ọnọdụ anyị?
29 Azịza nke ajụjụ ahụ ga-adabere na ma anyị họọrọ ibi ndụ ikwesị ntụkwasị obi ugbu a. Iji wusie mkpebi anyị ike ime nke ahụ ka “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a” na-eru nso, ka anyị tụlee amaokwu ikpeazụ nke akwụkwọ Daniel. Anyị ịtụle ya n’isiakwụkwọ nke na-esonụ ga-enyere anyị aka ịhụ otú Daniel si guzo n’ihu Chineke ya na otú ọ ga-esi eguzo n’ihu Ya n’ọdịnihu.
Gịnị Ka Ị Ghọtara?
• N’oge dị aṅaa ka Maịkael “na-eguzo ọtọ,” n’ụzọ dịkwa aṅaa, ọ bụkwa ole mgbe ka ọ “ga-eguzo ọtọ”?
• N’ụdị mbilite n’ọnwụ dị aṅaa ka Daniel 12:2 na-ezo aka?
• Ụbọchị ndị dị aṅaa kara mmalite na ọgwụgwụ nke oge ndị a na-esonụ akara?
oge atọ na ọkara ahụ e kwuru banyere ya na Daniel 12:7.
ụbọchị 1,290 ahụ e buru n’amụma na Daniel 12:11.
ụbọchị 1,335 ahụ e buru n’amụma na Daniel 12:12.
• Olee otú ịṅa ntị na Daniel isi nke 12 si enyere anyị aka ịmata ndị na-efe Jehova ezi ofufe?
Igbe dị na peeji nke 298]
IWEZỤGA ÀJÀ NSURE ỌKỤ AHỤ A NA-ESURE MGBE DUM
N’akwụkwọ Daniel, okwu ahụ bụ́ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum” pụtara ugboro ise. Ọ na-ezo aka n’àjà otuto—“mkpụrụ egbugbere ọnụ”—nke ndị ohu Jehova Chineke na-achụrụ ya mgbe nile. (Ndị Hibru 13:15) E zoro aka ná mwezụga ya e buru n’amụma na Daniel 8:11, 11:31, na 12:11.
N’oge agha ụwa abụọ ahụ, a kpagburu ndị Jehova nke ukwuu n’ógbè nke “eze Ugwu” na “eze Ndịda.” (Daniel 11:14, 15) Mwezụga nke “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum” weere ọnọdụ mgbe Agha Ụwa Mbụ na-aga ibi bụ́ mgbe a kwụsịtụrụ ọrụ nkwusa ahụ n’etiti afọ 1918. (Daniel 12:7) N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America ‘wezụgara’ “àjà nsure ọkụ ahụ a na-esure mgbe dum” n’otu aka ahụ ruo ụbọchị 2,300. (Daniel 8:11-14; lee Isi nke 10 nke akwụkwọ a.) “Ogwe aka” Nazi wezụgakwara ya ruo oge a na-akapịghị ọnụ n’Akwụkwọ Nsọ.—Daniel 11:31; lee Isi nke 15 nke akwụkwọ a.
[Chaati/Foto ndị dị na peeji nke 301]
OGE AMỤMA NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ DANIEL
Oge asaa (afọ 2,520): October 607 T.O.A. ruo
Oge atọ na ọkara December 1914 ruo June 1918
(ụbọchị 1,260): (E nyee ndị Kraịst e tere mmanụ
Daniel 7:25; 12:7 nsogbu. Lee Isi nke 9 nke akwụkwọ a.)
Ụtụtụ na abalị 2,300: June 1 ma ọ bụ 15, 1938, ruo
Daniel 8:14 October 8 ma ọ bụ 22, 1944
(“Oké ìgwè mmadụ” ahụ apụta, mụbaa.
Lee Isi nke 10 nke akwụkwọ a.)
Izu 70 (afọ 490): 455 T.O.A. ruo 36 O.A.
Daniel 9:24-27 (Ọbịbịa Mesaịa na ozi elu ala ya.
Lee Isi nke 11 nke akwụkwọ a.)
Ụbọchị 1,290: January 1919 ruo September 1922
Daniel 12:11 (Ndị Kraịst e tere mmanụ eteta
ma nwee ọganihu ime mmụọ.)
Ụbọchị 1,335: September 1922 ruo May 1926
Daniel 12:12 (Ndị Kraịst e tere mmanụ
enweta ọnọdụ obi ụtọ.)
[Foto ndị dị na peeji nke 287]
A tụrụ ndị ohu Jehova a ma ama mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia, U.S.A. Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: (nọ ọdụ) A. H. Macmillan, J. F. Rutherford, W. E. Van Amburgh (guzo ọtọ), G. H. Fisher, R. J. Martin, G. DeCecca, F. H. Robison, na C. J. Woodworth
[Foto ndị dị na peeji nke 299]
E nwere mgbakọ ndị dị ịrịba ama na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na 1919 (n’elu) nakwa na 1922 (n’okpuru)
[Foto dị na peeji nke nke 302]