Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 7. Gịnị jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ?

      7 Olee ihe jikọrọ isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ na nnukwu ihe oyiyi ahụ? Briten si n’Alaeze Ukwu Rom pụta. Ebe ọ bụ na Amerịka si na Briten pụta, anyị nwere ike ikwu na o sikwa na Rom pụta. Ma, gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ pụtara? Baịbụl kwuru na e ji ígwè na ụrọ kpụọ ya. (Gụọ Daniel 2:41-43.) Ihe a e kwuru banyere ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ bụ ihe mere mgbe isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ pụtara, ya bụ, mgbe Briten na Amerịka gbakọrọ aka chịwa ụwa. Otú ahụ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ na-agaghị esiru ike ka ígwè nkịtị, Briten na Amerịka esirughị ike ka Alaeze Ukwu Rom bụ́ ebe o si pụta. Gịnị mere ka ha ghara isi ike ka Rom?

      8, 9. (a) Olee otú ọchịchị nke asaa ahụ chịrị ụwa si gosi na o siri ike ka ígwè? (b) Gịnị ka ala ala ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya?

      8 Mgbe ụfọdụ, isi nke asaa nke anụ ọhịa ahụ gosiri na ya siri ike ka ígwè. Dị ka ihe atụ, o gosiri ike ya mgbe o meriri n’Agha Ụwa Mbụ. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, o gosikwara ike ya.c Mgbe a lụchara agha ahụ, ọ ka nọkwa na-akpa ike iji gosi na ya siri ike ka ígwè. Ma, a gwakọtara ígwè ahụ na ụrọ kemgbe Briten na Amerịka malitere ịchị ụwa.

      9 Ọ dịla anya ndị Jehova chọwara ịghọta ihe ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya. Daniel 2:41 kpọrọ ígwè ahụ na ụrọ ahụ gwakọtara agwakọta otu “alaeze,” ọ bụghị ọtụtụ alaeze. N’ihi ya, ụrọ ahụ nọchiri anya ihe ndị dị ka òtù na ndị dị iche iche nọ n’ebe Briten na Amerịka na-achị, bụ́ ndị na-eme ka ha ghara isi ike ka Alaeze Ukwu Rom, nke ígwè nọchiri anya ya. Amụma Daniel kpọrọ ụrọ ahụ “ụmụ mmadụ,” ma ọ bụ, ndị nkịtị. (Dan. 2:43) N’ọchịchị Briten na Amerịka, e nweela ọtụtụ ndị na-esi ọnwụ inweta ihe ndị ruuru ha, inwetakwu ihe ha chọrọ n’ụlọ ọrụ ha, nakwa mba ndị na-alụ ọgụ ka ha nwere onwe ha. Ihe a niile ha na-eme anaghị ekwe ka Briten na Amerịka kpaa ike ka ígwè. Ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere ọchịchị. Ọ na-esikwara ọtụtụ ndị ọchịchị a ma ama ike ime ihe ha chọrọ ime n’ihi na ọ bụ naanị obere ihe ka ha ji merie ná ntụliaka, ọtụtụ ndị anaghịkwa akwado ọchịchị ha. Daniel buru amụma, sị: “Alaeze ahụ ga-esi ike n’otu aka, ma n’aka nke ọzọ, ọ gaghị esi ike.”—Dan. 2:42; 2 Tim. 3:1-3.

  • Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 15
    • 11 Ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị ò nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara? Chegodị echiche: N’ọhụụ ndị ọzọ Daniel hụrụ, o kwuru kpọmkwem ole ihe ụfọdụ dị. Dị ka ihe atụ, o kwuru mpi ole dị n’isi anụ ọhịa dị iche iche. Ole ihe ndị ahụ dị nwere ihe ha pụtara. Ma, mgbe Daniel na-akọwa ihe oyiyi ahụ, o kwughị ole mkpịsị ụkwụ ya dị. N’ihi ya, o yiri ka ole mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ dị adịghị mkpa, otú ahụ ọ na-adịghị mkpa ikwuwe na o nwere aka abụọ, mkpịsị aka iri, na ụkwụ abụọ. Ma, Daniel kwuru hoo haa na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ihe oyiyi ahụ. Ihe ọ kọwara mere ka anyị ghọta na Briten na Amerịka bụ ọchịchị ga na-achị ụwa mgbe “nkume” ahụ nke nọchiri anya Alaeze Chineke ga-akụrisị ala ala ụkwụ ihe oyiyi ahụ.—Dan. 2:45.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya