Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke Maka Oge Anyị
“Ghọta, gị nwa nke mmadụ; n’ihi na mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile ka ọhụụ a dịịrị.”—DANIEL 8:17.
1. Gịnị ka Jehova chọrọ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ mara banyere oge anyị?
JEHOVA adịghị ezochi ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Kama nke ahụ, ọ bụ Onye Na-ekpughe ihe nzuzo nile. N’ezie, ọ chọrọ ka anyị nile mara na anyị bi n’ime ime “mgbe nke ọgwụgwụ.” Lee ozi dị mkpa nke ahụ bụụrụ ijeri mmadụ isii bi n’ụwa ugbu a!
2. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji enwe nchegbu banyere ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ?
2 Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ụwa a na-abịaru ọgwụgwụ ya? Mmadụ pụrụ ịga ije n’ọnwa, ma n’ọtụtụ ebe ọ pụghị ịkpagharị n’okporo ámá ndị dị na mbara ụwa a n’atụghị egwu. Ọ pụrụ iji ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ kwajuo ụlọ, ma ọ pụghị ibelata mmụba nke ezinụlọ ndị kewara ekewa. Ọ pụkwara ime ka e nwee ọgbọ ihe ọmụma, ma ọ pụghị ịkụziri ndị mmadụ ibikọta ọnụ n’udo. Emelighị ihe ndị a na-akwado ọtụtụ ihe àmà sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi na anyị na-ebi na mgbe nke ọgwụgwụ.
3. Olee mgbe e ji okwu ndị bụ́ “mgbe nke ọgwụgwụ” mee ihe na nke mbụ ya n’ụwa?
3 Ọ bụ mmụọ ozi Gebriel ji okwu ndị ahụ dị ịrịba ama—“mgbe nke ọgwụgwụ”—mee ihe na nke mbụ ya n’ihe dị ka afọ 2,600 gara aga. Onye amụma Chineke ụjọ ji nụrụ mgbe Gebriel kwuru, sị: “Ghọta, gị nwa nke mmadụ; n’ihi na mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile ka ọhụụ a dịịrị.”—Daniel 8:17.
Ugbu A Bụ “Mgbe nke Ọgwụgwụ”!
4. Olee ụzọ ndị ọzọ Bible si ezo aka na mgbe ọgwụgwụ?
4 Okwu bụ́ “mgbe nke ọgwụgwụ” na “mgbe a kara aka nke ọgwụgwụ ihe nile” pụtara ugboro isii n’akwụkwọ Daniel. (Daniel 8:17, 19; 11:35, 40; 12:4, 9) Ha bụ akụkụ “mgbe ikpeazụ” ahụ Pọl onyeozi buru n’amụma. (2 Timoti 3:1-5) Jisọs Kraịst zoro aka n’oge a dị ka “ọnụnọ” ya dị ka Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe.—Matiu 24:37-39, NW.
5, 6. Ole ndị ‘jegharịworo’ na mgbe ọgwụgwụ, gịnịkwa si na ya pụta?
5 Daniel 12:4 na-ekwu, sị: “Ma gị onwe gị, Daniel, zobe okwu ndị a, kachitekwa akwụkwọ a akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a: ọtụtụ mmadụ ga na-ejegharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.” E zochiri ma kachite ihe dị ukwuu n’ihe Daniel dere akara ruo ọtụtụ narị afọ ka ụmụ mmadụ ghara ịghọta ha. Taakwanụ?
6 Na mgbe ọgwụgwụ a, ọtụtụ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ‘ejegharịwo’ n’ime Okwu Chineke, bụ́ Bible. Gịnị si na ya pụta? Site ná ngọzi Jehova gọziri mgbalị ha, ezi ihe ọmụma abawo ụba. Dị ka ihe atụ, e jiriwo nghọta gọzie Ndịàmà Jehova e tere mmanụ, na-eme ka ha nwee ike ịghọta na Jisọs Kraịst ghọrọ Eze n’eluigwe n’afọ 1914. N’ikwekọ n’ihe ndị onyeozi ahụ kwuru bụ́ ndị e dekọrọ na 2 Pita 1:19-21, ndị dị otú ahụ e tere mmanụ na ndị ibe ha na-eguzosi ike n’ihe ‘na-aṅa ntị n’okwu amụma ahụ,’ ha jikwa nnọọ n’aka na ugbu a bụ mgbe ọgwụgwụ.
7. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndekọ ndị mere ka akwụkwọ Daniel pụọ iche?
7 Akwụkwọ Daniel pụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ. N’ime ya, otu eze yiri egwu igbuchapụ ndị amamihe ya n’ihi na ha ekpughelighị ma kọwaa nrọ dị mgbagwoju anya ọ rọrọ, ma onye amụma Chineke kpughere ma kọwaa nrọ ahụ dị mgbagwoju anya. A tụbara ụmụ okorobịa atọ jụrụ ife ihe oyiyi dị oké elu ofufe n’ime ọkụ e mere ka ọ na-enwu ajọ onwunwu, ma ha dị ndụ n’enweghị ọkụ rere ha. N’otu oge a na-eri oriri, ọtụtụ narị mmadụ hụrụ ka otu aka na-ede okwu bụ́ ihe omimi n’ahụ mgbidi dị n’obí eze. Ndị na-akpa nkata ọjọọ mere ka a tụba otu agadi nwoke n’olulu ọdụm, ma ọ pụtara n’enweghị ọkọ kọrọ ya. A hụrụ anụ ọhịa anọ n’ọhụụ, o nwekwara ihe ha pụtara n’ụzọ amụma, bụ́ nke dịgidere ruo mgbe ọgwụgwụ.
8, 9. Olee otú akwụkwọ Daniel pụrụ isi baara anyị uru, karịsịa ugbu a, bụ́ mgbe ọgwụgwụ?
8 N’ụzọ doro anya, akwụkwọ Daniel nwere usoro ndekọ ihe abụọ dị nnọọ iche. Otu bụ akụkọ, nke ọzọ bụ amụma. Ha abụọ pụrụ iwuli okwukwe anyị elu. Akụkụ ndị bụ́ akụkọ na-egosi anyị na Jehova Chineke na-agọzi ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya. Akụkụ ndị bụ́ amụma na-ewulikwa okwukwe elu site n’igosi na Jehova maara ihe ndị ga-eme ọtụtụ narị afọ—ọbụna ọtụtụ puku afọ—tupu ha emee.
9 Amụma dị iche iche Daniel dekọrọ na-adọrọ uche aga n’Alaeze Chineke. Ka anyị na-ahụ mmezu nke amụma ndị dị otú ahụ, a na-ewusi okwukwe anyị ike, otú a kwa ka a na-ewusi nkweta anyị kwetara na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ ahụ ike. Ma ụfọdụ ndị nkatọ na-akatọ Daniel, na-ekwu na e dere amụma ndị dị n’akwụkwọ ahụ bu aha ya n’ezie mgbe ihe ndị yiri ka ha na-emezu ha mesịworo. Ọ bụrụ na nzọrọ ndị dị otú ahụ bụ eziokwu, nke ahụ ga-akpalite ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere ihe akwụkwọ Daniel buru n’amụma banyere mgbe ọgwụgwụ. Ndị na-arụ ụka na-agbaghakwa akụkọ ndị a kọrọ n’akwụkwọ ahụ. N’ihi ya ka anyị mee nnyocha.
N’ikpe!
10. N’echiche dị aṅaa ka a na-ebo akwụkwọ Daniel ebubo?
10 Weredị ya na ị nọ n’ụlọikpe, na-egere otu okwu ikpe. Ọkàiwu wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe ana-ekwusi ike na ikpe igwu wayo mara onye a gbara akwụkwọ. Akwụkwọ Daniel na-egosi onwe ya ịbụ akwụkwọ ziri ezi, nke onye amụma bụ́ onye Hibru, nke dịrị ndụ na narị afọ nke asaa na nke isii T.O.A., dere. Otú ọ dị, ndị nkatọ na-ekwusi ike na akwụkwọ ahụ na-eduhie eduhie. Ya mere ka anyị buru ụzọ lee ma akụkụ bụ́ akụkọ n’akwụkwọ ahụ ò kwekọrọ n’ihe ndị mere eme.
11, 12. Olee otú ebubo ahụ bụ́ na Belshaza bụ onye e chepụtara nanị n’echiche si gaa?
11 Gịnị ma anyị tụlee ihe a pụrụ ịkpọ okwu banyere eze na-efu efu? Daniel isi nke 5 na-egosi na Belshaza nọ na-achị dị ka eze na Babilọn mgbe a kwaturu obodo ahụ na 539 T.O.A. Ndị nkatọ agbaghawo nke a n’ihi na ọ dịghị ebe ọ bụla a kpọrọ aha Belshaza ma ọ bụghị na Bible. Kama nke ahụ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge ochie kwuru na ọ bụ Nabonidus bụ eze ikpeazụ nke Babilọn.
12 Otú ọ dị, n’afọ 1854, e gwupụtara ụfọdụ ntakịrị mkpọ ájá ụrọ e dekwasịrị ihe n’elu ná mkpọmkpọ ebe nke obodo Babilọn oge ochie bụ́ Ua, n’ebe bụ́ Iraq ugbu a. Otu n’ime ihe ndị a e ji ụdị ihe odide cuneiform dee bụ otu ekpere ebe Eze Nabonidus zoro aka na “Bel-sar-ussur, bụ́ ọkpara m.” Ọbụna ndị nkatọ aghaghị ikweta, sị: Nke a bụ Belshaza ahụ e kwuru maka ya n’akwụkwọ Daniel. Ya mere, eze ahụ na-efu efu, efudịghị efu, ọ bụ nanị na a hụbeghị ya n’akwụkwọ ndị na-abụghị akwụkwọ okpukpe. Nke a bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe ndị na-anwapụta na ihe ndị Daniel dere ziri ezi n’ezie. Ihe àmà dị otú ahụ na-egosi na akwụkwọ Daniel so n’ezie n’Okwu Chineke nke kwesịrị ka anyị jiri nlezianya leba anya n’ime ya ugbu a, na mgbe ọgwụgwụ a.
13, 14. Ònye bụ Nebukadneza, oleekwa chi ụgha ọ kasị fee ofufe?
13 Otu akụkụ bụ́ isi nke akwụkwọ Daniel bụ amụma ndị metụtara mpụta nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche na ihe ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị ha mere. A pụrụ ịkpọ otu n’ime ndị ọchịchị ahụ dike nke wuru otu alaeze ukwu. N’ịbụ nwa eze nke ga-anọkwasị n’ocheeze Babilọn, ya na ndị agha ya gwepịara usuu ndị agha Fero Neko nke Ijipt na Kakemish. Ma otu ozi o nwetara mere ka nwa eze Babilọn ahụ nwere mmeri hapụrụ ndị ọchịagha ya ọrụ ndị fọdụrụ. Mgbe ọ nụrụ na nna ya, bụ́ Nabopolassar, anwụọla, nwa okorobịa a bụ́ Nebukadneza ghọrọ eze na 624 T.O.A. N’oge ọchịchị ya nke dịruru afọ 43, o wuru alaeze ukwu nke gụnyere ókèala dị iche iche bụ́ ndị Asiria na-achịbu, ọ mụbakwara ebe ọ na-achị ịgụnye Siria na Palestine ruo n’ụsọ Ijipt.
14 Nebukadneza fere Marduk ofufe karịsịa, bụ́ chi bụ́ isi nke Babilọn. Eze ahụ nyere Marduk otuto maka mmeri nile o nwere. Na Babilọn, Nebukadneza wuru ma chọọ ụlọ nsọ dị iche iche nke Marduk na nke ọtụtụ chi ndị ọzọ nke Babilọn mma. Onyinyo ọlaedo nke eze Babilọn a guzobere na ndagwurugwu Dura pụrụ ịbụworị nke a raara nye Marduk. (Daniel 3:1, 2) O yikwara ka Nebukadneza ọ dabeere nke ukwuu n’ịjụ ndị mmụọ ase iji mee atụmatụ agha ya.
15, 16. Gịnị ka Nebukadneza meere Babilọn, gịnịkwa mere mgbe o turu ọnụ banyere ịdị ukwuu ya?
15 Site n’iwuchapụ nnukwu mgbidi dị abụọ nke Babilọn, bụ́ nke nna ya malitere iwu, Nebukadneza mere ka isi obodo ahụ yie nke a na-apụghị imeri emeri. Iji mee ka obi dị nwunye ya bụ́ onye Midia mma, bụ́ onye ugwu na ọhịa ndị dị n’ala nna ya gụsiri agụụ ike, a kọrọ na Nebukadneza wuru ubi ndị koro n’elu—otu n’ime ihe ịtụnanya asaa nke ụwa oge ochie. O mere ka Babilọn bụrụ obodo kasị ukwuu nwere mgbidi nke oge ahụ. Leekwa ka o si jiri ebe ahụ ofufe ụgha hiwere isi kpaa nganga!
16 “Ọ́ bụghị nke a bụ Babilọn Ukwu a, nke mụ onwe m wuworo?” ka Nebukadneza turu n’ọnụ otu ụbọchị. Otú ọ dị, dị ka Daniel 4:31-36 si kwuo, “mgbe eze kpụ okwu a n’ọnụ,” isi mgbaka bịara ya. N’enweghị ike ịchị achị ruo afọ asaa, ọ tara ahịhịa, dị nnọọ ka Daniel buru n’amụma. E mesịziri weghachi alaeze ya. Ị̀ maara ihe ihe a nile pụtara n’ụzọ amụma? Ị̀ pụrụ ịkọwa otú mmezu ya bụ́ isi si eweta anyị kpọmkwem na mgbe ọgwụgwụ?
Ịchịkọta Ihe Ndị Mejupụtara Amụma
17. Olee otú ị ga-esi akọwa nrọ amụma ahụ Chineke mere ka Nebukadneza rọọ n’afọ nke abụọ ya dị ka onye ọchịchị ụwa?
17 Ugbu a ka anyị chịkọta ihe ụfọdụ mejupụtara amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel. N’afọ nke abụọ nke Nebukadneza dị ka onye ọchịchị ụwa nke amụma Bible (606/605 T.O.A.), Chineke mere ka ọ rọọ otu nrọ na-atụ ụjọ. Dị ka Daniel isi nke 2 si kwuo, nrọ ahụ bụ banyere nnukwu ihe oyiyi nke nwere isi ọlaedo, obi na ogwe aka ọlaọcha, afọ na apata ụkwụ ọla copper, ogwe ụkwụ ígwè, na elu ụkwụ bụ́ ígwè a gwakọtara ya na ụrọ. Gịnị ka akụkụ dị iche iche nke ihe oyiyi ahụ nọchitere anya ha?
18. Gịnị ka isi ọlaedo, obi na ogwe aka ọlaọcha, afọ na apata ụkwụ ọla copper nke onyinyo ahụ a rọrọ ná nrọ nọchiri anya ha?
18 Onye amụma Chineke gwara Nebukadneza, sị: “Gị onwe gị, eze, . . . bụ isi ọlaedo ahụ.” (Daniel 2:37, 38) Nebukadneza nọ n’isi usoro ndị eze chịrị Alaeze Ukwu Babilọn. Midia na Peasia, nke obi na ogwe aka ọlaọcha nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ya, kwaturu ya. Alaeze Ukwu Gris sochiri, nke afọ na apata ụkwụ ọla copper ahụ sere onyinyo ya. Olee otú ike ọchịchị ụwa ahụ si malite?
19, 20. Ònye bụ́ Alexander Onye Ukwu, oleekwa òkè o keere n’ime ka Gris bụrụ ike ọchịchị ụwa?
19 Na narị afọ nke anọ T.O.A., otu nwa okorobịa rụrụ ọrụ dị mkpa ná mmezu nke amụma Daniel. A mụrụ ya na 356 T.O.A., ụwa mesịkwara kpọwa ya Alexander Onye Ukwu. Mgbe e gburu nna ya, bụ́ Philip, na 336 T.O.A., Alexander dị afọ 20 nọkwasịrị n’ocheeze Masedonia.
20 Ná mmalite May 334 T.O.A., Alexander malitere inwe mmeri. O nwere ndị agha 30,000 ji ụkwụ bụ́ ndị dị nta ma dị ike na ndị ịnyịnya dị 5,000. N’Osimiri Granicus dị n’ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ Asia Minor (nke bụ́ Turkey ugbu a), Alexander meriri n’agha mbụ ya na ndị Peasia lụrụ na 334 T.O.A. Ka ọ na-erule 326 T.O.A., onye mmeri a ike na-adịghị agwụ agwụ emeriela ha kpam kpam, ọ gamiwokwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Osimiri Indus, nke dị n’ebe bụ́ Pakistan ugbu a. Ma e meriri Alexander n’agha ikpeazụ ọ lụrụ n’oge ọ nọ na Babilọn. Na June 13, 323 T.O.A., mgbe ọ dịworo ndụ ruo nanị afọ 32 na ọnwa 8, onye iro kasị ike, bụ́ ọnwụ, meriri ya. (1 Ndị Kọrint 15:55) Otú ọ dị, site ná mmeri ndị o nwere, Gris ghọrọ ike ọchịchị ụwa, dị ka e kwuru n’amụma Daniel.
21. Gụnyere Alaeze Ukwu Rom, olee ike ụwa ọzọ nke ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ a rọrọ ná nrọ na-ese onyinyo ya?
21 Gịnị ka ogwe ụkwụ ígwè nke nnukwu ihe oyiyi ahụ na-anọchi anya ya? Ọ bụ Rom nke yiri ígwè, nke gwepịara ma bibie Alaeze Ukwu Gris. N’akwanyeghịrị Alaeze Chineke nke Jisọs Kraịst kwusara ùgwù, ndị Rom kpọgburu ya n’elu osisi ịta ahụhụ na 33 O.A. Ná mgbalị ya ibibi ezi Iso Ụzọ Kraịst, Rom kpagburu ndị na-eso ụzọ Jisọs. Otú ọ dị, ogwe ụkwụ ígwè nke ihe oyiyi ahụ Nebukadneza rọrọ ná nrọ sere onyinyo ọ bụghị nanị Alaeze Ukwu Rom kamakwa usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị si na ya pụta—Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America.
22. Olee otú ihe oyiyi ahụ a rọrọ ná nrọ si enyere anyị aka ịhụ na anyị agamiwo na mgbe ọgwụgwụ ahụ?
22 Ntụle e ji nlezianya mee na-egosi na anyị agamiwo na mgbe ọgwụgwụ ahụ, n’ihi na anyị eruwo n’ụkwụ ígwè na ụrọ nke ihe oyiyi ahụ a rọrọ ná nrọ. Ọchịchị ụfọdụ nke oge a yiri ígwè ma ọ bụ bụrụ nke aka ike, ebe ndị ọzọ yiri ụrọ. N’agbanyeghị ọdịdị na-esighị ike nke ụrọ, bụ́ nke e ji mee ‘ihe a kpọrọ mmadụ,’ e mewo ka ọchịchị ndị yiri ígwè kwe ka ndị nkịtị nwee ọnụ okwu n’ọchịchị ndị na-achị ha. (Daniel 2:43; Job 10:9) N’ezie, ọchịchị aka ike na ụmụ mmadụ nkịtị apụghị ijikọta ejikọta dị nnọọ ka ígwè na ụrọ na-apụghị ijikọta ejikọta. Ma Alaeze Chineke ga-eweta ụwa a nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kewasịrị ná njedebe n’isi nso.—Daniel 2:44.
23. Olee otú ị ga-esi akọwa nrọ Daniel rọrọ na ọhụụ ọ hụrụ n’afọ mbụ nke ọchịchị Belshaza?
23 Isi nke 7 nke amụma Daniel nke na-adọrọ mmasị na-edurutekwa anyị na mgbe ọgwụgwụ. Ọ na-akọ banyere otu ihe mere n’afọ mbụ nke Eze Belshaza nke Babilọn. N’ịbụ onye dị afọ 70 na ụma mgbe ahụ, Daniel hụrụ “nrọ na ọhụụ dị iche iche nke isi ya n’elu ihe ndina ya.” Lee ka ọhụụ ndị ahụ si menye ya ụjọ! “Lee,” ka ọ na-eti ná mkpu. “Ifufe anọ nke eluigwe na-efekwasị oké osimiri ukwu sie ike. Anụ anọ nke dị ukwuu wee na-esi n’oké osimiri rịgopụta, ha dị iche otu n’ibe ya.” (Daniel 7:1-8, 15) Lee ka anụmanụ ndị ahụ si pụọ iche! Nke mbụ bụ ọdụm nwere nku, nke abụọ yikwara anụ ọhịa bear. Ọzọzi bụ agụ nwere nku anọ na isi anọ! Anụ nke anọ ahụ, nke nwere ike pụrụ iche, nwere ezé ígwè ndị buru ibu na mpi iri. Otu ntakịrị mpi nke nwere “anya dị iche iche, dị ka anya mmadụ” na “otu ọnụ nke na-ekwu oké ihe dị iche iche” si n’etiti mpi iri ya pulite. Lee anụ na-emenye ụjọ ha bụ!
24. Dị ka Daniel 7:9-14 si kwuo, gịnị ka Daniel hụrụ n’eluigwe, gịnịkwa ka ọhụụ a na-ezo aka na ya?
24 Ọhụụ ndị ọzọ nke Daniel lekwasịziri anya n’eluigwe. (Daniel 7:9-14) Ọ hụrụ “Onye ochie ahụ,” bụ́ Jehova Chineke, ka ọ na-anọdụ ala n’ụzọ dị ebube n’ocheeze dị ka Onyeikpe. ‘Otu puku ụzọ otu puku na-ejere Ya ozi, puku iri ụzọ puku iri na-eguzokwa ọtọ n’ihu Ya.’ N’ịma anụ ndị ahụ ikpe, Chineke napụrụ ha ịchịisi ma bibie anụ ọhịa nke anọ ahụ. E nyefere “onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” ikike ịchịisi na-adịgide adịgide n’elu “ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche.” Nke a na-ezo aka na mgbe ọgwụgwụ nakwa ná nnọkwasị Nwa nke mmadụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nọkwasịrị n’ocheeze n’afọ 1914.
25, 26. Olee ajụjụ ndị pụrụ ibilite mgbe anyị gụrụ akwụkwọ Daniel, oleekwa akwụkwọ pụrụ inye aka ịza ha?
25 Ndị na-agụ akwụkwọ Daniel ga-enwerịrị ọtụtụ ajụjụ. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anụ ọhịa anọ ahụ dị na Daniel isi nke 7 na-anọchite anya ha? Gịnị bụ nkọwa nke “izu [iri asaa]” ahụ dị na Daniel 9:24-27? Gịnị banyere Daniel isi nke 11 na ọgụ ahụ e buru n’amụma nke “eze Ugwu” na “eze Ndịda” na-alụ? Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya banyere eze ndị a na mgbe ọgwụgwụ a?
26 Jehova emewo ka ndị ohu ya e tere mmanụ nọ n’elu ala, bụ́ “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu,” dị ka a kpọrọ ha na Daniel 7:18, ghọta okwu ndị a. Ọzọkwa, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” emewo ndokwa ka anyị ghọtakwuo ihe odide sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ndị Daniel onye amụma dere. (Matiu 24:45) E mere nke a ugbu a site ná mwepụta nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, n’oge na-adịbeghị anya. Akwụkwọ a nke nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peji 320, tụlere akụkụ nile nke akwụkwọ Daniel. Ọ na-ekwu okwu banyere amụma nke ọ bụla na-ewuli okwukwe elu na akụkọ ọ bụla onye amụma ahụ a hụrụ n’anya bụ́ Daniel deturu.
E Nwere Ezi Ihe Ọ Pụtara Maka Oge Anyị
27, 28. (a) Gịnị bụ eziokwu banyere mmezu nke amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel? (b) Olee oge anyị bi na ya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime?
27 Tụlee isi ihe a dị mkpa: E wezụga isi ihe ole na ole, e mezuwo amụma nile dị n’akwụkwọ Daniel. Dị ka ihe atụ, anyị ahụwala ọnọdụ ụwa ahụ nke ụkwụ nke ihe oyiyi ahụ a rọrọ ná nrọ na Daniel isi nke 2 sere onyinyo ya. A tọpụrụ ihe e kere n’ogwe osisi ahụ dị na Daniel isi nke 4 site n’ochichi e chiri Eze Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, eze n’afọ 1914. Ee, dị ka e buru n’amụma na Daniel isi nke 7, Onye Ochie ahụ nyeziri Nwa nke mmadụ ọchịchị.—Daniel 7:13, 14; Matiu 16:27–17:9.
28 Ụbọchị 2,300 dị na Daniel isi nke 8 nakwa ụbọchị 1,290 na ụbọchị 1,335 dị n’isi nke 12 agachaala—O teela anyị gafere ha. Ịmụ Daniel isi nke 11 na-egosi na asọmpi dị n’etiti “eze Ugwu” na “eze Ndịda” eruwo n’agba ikpeazụ ya. Ihe a nile na-atụkwasị ihe n’ihe àmà Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na anyị abamiela ugbu a na mgbe ọgwụgwụ. N’iburu ọnọdụ pụrụ iche anyị nọ na ya n’oge a n’uche, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? Obi abụọ adịghị ya na anyị kwesịrị ịṅa ntị n’okwu amụma Jehova Chineke.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Gịnị ka Chineke chọrọ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ mara banyere oge anyị?
• Olee otú akwụkwọ Daniel pụrụ isi wulie okwukwe anyị elu?
• Olee akụkụ ndị ihe oyiyi Nebukadneza rọrọ ná nrọ nwere, gịnịkwa ka ihe ndị a na-ese onyinyo ha?
• Gịnị dị ịrịba ama banyere mmezu nke amụma ndị dị n’akwụkwọ Daniel?