ISI NKE ISE
“Chọọnụ Jehova” Site n’Ife Ya n’Ụzọ Dị Ya Mma
1. Ngọzi dịgasị aṅaa ka i nwere dị ka otu n’ime ndị Chineke?
LEE ihe ùgwù i nwere ịmara Chineke nke na-emezu amụma! Ị pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ahụ Hosia onye amụma dere banyere ya, sị: “M ga-ekwe nkwa ịlụ gị n’ikwesị ntụkwasị obi; ị ga-amarakwa Jehova.” Hosia na-akọwa ọnọdụ inwe ahụ́ iru ala, nke yiri ọnọdụ dị na paradaịs, bụ́ nke ndị Chineke gaje ịnọ na ya mgbe ha si Babịlọn lọta, bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha laa. N’otu aka ahụ, ndị Chineke n’oge a na-enwe ọganihu ime mmụọ nakwa ahụ́ iru ala; ọnọdụ ha yiri ka hà nọ na paradaịs. (Hosia 2:18-20) Ugbu a, a kpọkwasịwo gị aha Chineke dị ka otu n’ime ndị ohu ya raara onwe ha nye—otu n’ime Ndịàmà Jehova—ọ ga-adịkwa gị mma ka a nọgide na-akpọ gị aha ahụ.—Aịzaya 43:10, 12; Ọrụ 15:14.
Emọs
2, 3. (a) Gịnị mere Jehova ji mesịa kpọọ ụzọ ndị ya n’oge ochie si na-efe ya ofufe asị? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chebara ozi ndị amụma iri na abụọ ahụ ziri echiche?
2 Izrel oge ochie bụ mba raara onwe ha nye Jehova, bụ́ onye nyere ha ụkpụrụ nke ọ na-enweghị mba ọ bụla ọzọ nwere ya. (Diuterọnọmi 4:33-35) Otú ọ dị, ná ngwụcha narị afọ nke itoolu T.O.A., ọnọdụ ụmụ Izrel gbanwere nke ukwuu nke na Chineke gwara Emọs onye amụma ka ọ gwa ha, sị: “Akpọwo m ememme niile unu asị, ajụwo m ha . . . Ọ bụrụ na unu achụọrọ m àjà a na-esurecha n’ọkụ, ọbụna nye m onyinye maka inweta ihu ọma, ha agaghị atọ m ụtọ.” (Emọs 5:21, 22) Ọ bụ ezie na Chineke adịghị agwa ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ taa ụdị ihe a, chegodị echiche otú ọ ga-adị gị ma ị nụ ka e si otú ahụ kọwaa ofufe gị? Ọ̀ dị ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-amụta na nke a?
3 N’oge ochie ahụ, ndị Chineke kwuru na ha na-efe Jehova n’ụzọ dị ya mma. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ha nọ na-efe arụsị, dị ka Bel nke ndị Kenan na oyiyi nwa ehi, ma ọ bụkwanụ na-achụ àjà n’ebe ndị dị elu. Ha nọ na-akpọrọ ìgwè ihe ndị dị n’eluigwe isiala ma jiri aha Jehova na-aṅụ iyi n’otu mgbe ahụ. N’ihi ya, ezi Chineke zipụrụ ndị amụma ya ka ha gbaa ha ume ka ha laghachikwute ya ma fee ya ofufe dị ọcha. (2 Ndị Eze 17:7-17; 21:3; Emọs 5:26) N’ihi ya, o doro anya na ọbụna ndị ohu Chineke raara onwe ha nye pụrụ inwe ebe ndị chọrọ ka ha lebara anya—omume ma ọ bụ àgwà ndị e kwesịrị inyocha iji hụ na ha kwekọrọ n’ofufe dị Jehova mma.
“IHE ỌMỤMA BANYERE CHINEKE”
4. Olee ọnọdụ dị n’oge Eze Jeroboam nke Abụọ na-achị?
4 Chee echiche banyere oge onye mbụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ kwuchiteere Chineke ọnụ ya. A na-ebu amụma na ụbọchị Jehova ga-abịakwasị alaeze ebo iri nke Izrel. Otú ọ dị, n’elu elu, o yiri ka ihe ọ̀ na-agaziri mba ahụ. Dị nnọọ ka Jona buru n’amụma, Eze Jeroboam nke Abụọ mere ka Izrel nwetaghachi ókè ala ya malite n’ebe ugwu, n’akụkụ Damaskọs, ruo n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. (2 Ndị Eze 14:24-27) Ọ bụ ezie na Jeroboam mere ihe ọjọọ, Jehova nwere ogologo ntachi obi. Ọ chọghị ikpochapụ Izrel. Chineke nyere ụmụ Izrel oge ka ha chegharịa, ka ha ‘chọọ Jehova, wee dịrị ndụ.’—Emọs 5:6.
5. Olee ihe ụmụ Izrel na-enweghị nke mere ka Jehova jụ ha?
5 Ụmụ Izrel ahụ ihe na-agaziri kwesịrị iji oge ahụ laghachikwuru Jehova site n’ịmatakwu ya nke ọma na ịgbalịsi ike ime ihe dị ya mma. Kama nke ahụ, ha nwere obi ike. Ha nọkwa na-eche na ‘ọdachi ahụ agaghị abịaru ha nso ma ọ bụ rute n’ebe ha nọ.’ (Emọs 9:10) Ị pụrụ ịsị na ha chefuru Jehova n’ihi na “ha rijuru afọ, obi ha wee fụlie ha elu.” (Hosia 13:6) Anyị ekwesịghị iwere nke a dị ka ihe mere n’oge ochie, nke na-agbasaghị anyị. Rịba ama ihe mere Jehova ji nwee okwu ikpe megide ụmụ Izrel: “Ebe ọ bụ na ị jụwo ihe ọmụma, mụ onwe m ga-ajụ gị ka ị ghara ịbụkwa onye nchụàjà m.” Ha bụ ndị raara onwe ha nye Jehova, ọ bụkwa ndị ezinụlọ ha bụ́ ndị raara onwe ha nye gbara ha gburugburu. N’agbanyeghị nke ahụ, n’otu n’otu, ha enweghị ezi “ihe ọmụma banyere Chineke.”—Hosia 4:1, 6.
6. N’echiche dị aṅaa ka ụmụ Izrel na-enweghị ihe ọmụma banyere Chineke?
6 Ọ bụghị na ha anụtụbeghi okwu Chineke, bụ́ nke ndị nne na nna bụ́ ndị Izrel kwesịrị ịdị na-akụziri ụmụ ha. Ọ pụrụ ịbụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha anụwo akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl n’ọnụ ndị nne na nna ha, mgbe ha na ndị ọzọ na-akparịta ụka, ma ọ bụ ná mgbakọ ọha. (Ọpụpụ 20:4, 5; Diuterọnọmi 6:6-9; 31:11-13) Dị ka ihe atụ, ha nụrụ ihe mere mgbe Erọn mere nwa ehi ọlaedo n’oge Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị ka ọ na-anata Iwu Iri ahụ. (Ọpụpụ 31:18–32:9) N’ihi ya, ndị Izrel ndị nọ n’oge ndị amụma ahụ dịrị ndụ maara banyere Iwu ahụ. Ha anụwokwa akụkọ banyere ihe ndị mere. Otú ọ dị, ihe ndị ha maara enweghị isi n’ihi na ha ekweghị ka ọ kpalie ha ife Chineke n’ụzọ ọ chọrọ.
Olee otú mmadụ pụrụ isi malite ichefu Jehova?
7. (a) Olee otú ndị Izrel si ghọọ ndị nnupụisi n’ụzọ dị mfe? (b) Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi ‘malite ichefu Onye kere ya’?
7 Ị pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘Olee nnọọ otú o si dị mfe ịrafu ụmụ Izrel, ha wee nupụ isi?’ Hosia kọwara otú nke ahụ si mee, sị: “Izrel wee chefuo Onye kere ya.” (Hosia 8:14) Ụdị ngwaa e ji mee ihe n’asụsụ Hibru e ji dee ya na-enye echiche bụ́ “malitere ichefu.” Ndị Izrel anọkataghị nnọọ chefuo Jehova n’otu ntabi anya. Kama nke ahụ, ha ji nke nta nke nta chefuo mkpa ọ dị ife ya ofufe n’ụzọ dị ya mma. Ì chere na Onye Kraịst pụrụ ịdaba n’ụdị ọnyà ahụ? Were dị ka ihe atụ, nwoke nke na-ejighị igbo mkpa ezinụlọ ya egwuri egwu. (1 Timoti 5:8) Iji gboo mkpa ahụ, ọ ghaghị iwere ọrụ ya dị ka ihe dị mkpa. Ikekwe, ọ dị ihe dapụtara, o wee chee na ya aghaghị ịhapụ ịga nzukọ Ndị Kraịst ka ya wee rụọ ọrụ. Ka oge na-aga, ọ ga-adịrị ya mfe karị ịhapụ ịga nzukọ, ọ ga na-ahapụkwa ịga nzukọ ọtụtụ ugboro karị. Nke nta nke nta, mmekọrịta ya na Chineke esichakwaghị ike—ọ ‘malitewo ichefu Onye kere ya.’ Ụdị ihe ahụ pụrụ ime Onye Kraịst nke ndị mụrụ ya ma ọ bụ ndị ikwu ya ndị ọzọ bụ ndị na-ekweghị ekwe. E nwere mkpebi ndị na-eche ya ihu: Oge há aṅaa ka ọ ga na-ewepụta iji soro ha nọrọ, olee mgbekwa? (Ọpụpụ 20:12; Matiu 10:37) Gịnịkwanụ banyere ikpebi otú ọ ga-etinyeru oge na uche ya n’ime njem ma ọ bụ ná ntụrụndụ?
8. N’oge Emọs, gịnị ka inwe ‘ezé na-acha ọcha’ pụtara?
8 Anyị amụwo Okwu Chineke ma tinye ihe ndị anyị mụtara n’ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ichebara ihe ahụ e kwuru n’akwụkwọ Emọs echiche: ‘ezé na-acha ọcha.’ Chineke si n’ọnụ Emọs dọọ ndị Ya aka ná ntị, sị: “Mụ onwe m kwa mere ka ezé unu na-acha ọcha n’obodo unu niile, meekwa ka ụkọ ihe oriri dị n’obodo niile unu bi.” (Emọs 4:6) Ezé ha na-acha ọcha, ọ bụghị n’ihi na ha sara ezé ha. Ọ bụ n’ihi na ha enweghị ihe ha ga-eri, ha nọ n’ụnwụ. Ọzọkwa, ọ bụ ịdọ aka ná ntị maka ‘ụnwụ, ọ bụghị ụnwụ nri, na akpịrị ịkpọ nkụ, ọ bụghị nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu Jehova.’—Emọs 8:11.
Onye Kraịst ọ̀ pụrụ ịnọ n’ụkọ nri n’agbanyeghị na ọ nọ n’ebe nri ime mmụọ jupụtara?
9, 10. (a) Olee otú Onye Kraịst pụrụ isi nọrọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mụrụ anya iji zere ịnọ agụụ n’ụzọ ime mmụọ?
9 Ihe Emọs kọwara emezuwo n’ọnọdụ ime mmụọ jọgburu onwe ya nke Krisendọm nọ na ya. N’ụzọ dị iche, e megheworo ndị Chineke n’ụwa niile “ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe.” E jiwo nri ime mmụọ gọzie ha n’ụba. (Malakaị 3:10; Aịzaya 65:13, 14) Otú ọ dị, Onye Kraịst pụrụ ịjụ onwe ya, sị, ‘Ruo ókè há aṅaa ka m na-eri nri ime mmụọ ahụ?’ Ọ dị mma ịmara na ndị ụfọdụ na-eme nnyocha achọpụtawo na ụmụ anụmanụ ndị e ji mee nnyocha, ndị akụkụ ụbụrụ ha nke na-eme ka agụụ na-agụ ha mebiworo, adịghịzi enwe agụụ iri nri ruo n’ókè nke na ha pụrụ ịnọ n’ebe nri jupụtara nwụọ n’ihi agụụ! À pụrụ imebi agụụ Onye Kraịst na-enwe maka ihe ime mmụọ ruo n’ókè nke na ọ ga-amalite ịnọ agụụ n’agbanyeghị na nri ime mmụọ gbara ya gburugburu?
10 Ka i bu otú ị na-eme n’uche, cheedị echiche: Jehova nyere ụmụ Izrel nri ime mmụọ n’ụba. Ha nwere Iwu ahụ, bụ́ nke pụrụ ime ka mmekọrịta ha na ya sikwuo ike; ha nwere usoro izi ihe ha ga-eji na-akụbanye ihe ọmụma banyere Chineke n’obi ụmụ ha; ha nwekwara ndị amụma maka inyere ha aka ịghọta ihe bụ́ uche Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ha malitere ichefu Jehova. Baịbụl na-ekwu na n’oge Hosia, “Ha rijuru afọ [n’ihe onwunwe], obi ha wee fụlie ha elu.” (Hosia 13:6; Diuterọnọmi 8:11; 31:20) Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe onwunwe anyị dị anyị mkpa karịa mmekọrịta anyị na Chineke, anyị kwesịrị iburu n’uche kwa ụbọchị na nke ahụ pụrụ ime.—Zefanaya 2:3.
BURU IHE NDỊ KA MKPA N’UCHE
11, 12. (a) N’oge Eze Ọzaya na-achị, gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị amụma gbaa ndị Juda na Izrel ume ka ha laghachikwuru Jehova? (b) Olee mkpa Joel mere ka ọ pụta ìhè?
11 Mgbe Jeroboam nke Abụọ na-achị n’Izrel, Ọzaya (onye a na-akpọkwa Azaraya) na-achị na Juda. Ọzaya mere ka ókèala ya sakwuo mbara ma wusakwuo Jeruselem. Ọzaya “kpara ike dị nnọọ ukwuu” n’ihi na “ezi Chineke na-enyere ya aka.” O “wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova,” “na-achọ Chineke.” Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nọ na Juda nọgidere na-achụ àjà nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.—2 Ihe E Mere 26:4-9.
12 Site na nke a, ị pụrụ ịghọta na ọ bụ ezie na a kpọkwasịrị ndị Juda na Izrel aha Chineke, ọtụtụ mgbe, ofufe ha gụnyere ihe ndị na-adịghị ya mma. Ndị amụma ahụ gbalịrị inyere ha aka ịhụ ihe dị iche n’ezi ofufe na ofufe na-ezighị ezi. Chineke si n’ọnụ Joel na-arịọ ha, sị: “Jirinụ obi unu dum, na ibu ọnụ na ịkwa ákwá na iti mkpu arịrị lọghachikwute m.” (Joel 2:12) Rịba ama na Chineke chọrọ ka ndị ya ‘jiri obi ha dum’ bịakwute ya. Ee, ebe nsogbu dị bụ n’obi ha. (Diuterọnọmi 6:5) A pụrụ ikwu na ha nọ na-efe Jehova naanị iji mezuo iwu, ma obi ha adịghị n’ebe ọ nọ n’ụzọ zuru ezu. Ọtụtụ mgbe, o si n’ọnụ ndị amụma kwusie okwu ike banyere mkpa obiọma, ikpe ziri ezi, na ịdị umeala n’obi dị, ya bụ, àgwà ndị na-esite n’obi.—Matiu 23:23.
13. Gịnị ka ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa na Babịlọn lọta kwesịrị ichebara echiche?
13 Tụlezie ihe mere mgbe ndị Juu lọtasịrị n’ala ha. Ọ bụ ezie na ha maliteghachiri ife ezi ofufe dị ka Iwu ahụ kwuru, ihe adịchabeghị mma. Ndị Juu buru ọnụ n’ụbọchị ndị a na-echeta ihe ndị mere mgbe e bibiri Jeruselem. Jehova jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ m n’ezie ka unu buuru ya?” E bibiri obodo ahụ n’ihi ikpe ziri ezi nke Chineke kpere ha, nke a na-ekwesịghị inwe mwute n’ihi ya. Kama ileghachi anya azụ ma na-ebu ọnụ n’ihi iru uju, ndị Juu ahụ kwesịrị ịdị na-enwe obi ụtọ, na-aṅụrị ọṅụ n’oge ememme dị iche iche n’ihi ngọzi ndị ha na-enweta maka ife ezi ofufe. (Zekaraya 7:3-7; 8:16, 19) Ọ dịkwa mkpa ka ha chebara ihe ndị ọzọ echiche. Ihe dị ka gịnị? “Na-ekpenụ ikpe ziri ezi; jirikwanụ obiọma na ọmịiko na-emeso ibe unu ihe . . . , unu akpakwala nkata n’obi unu ime ibe unu ihe ọjọọ.” (Zekaraya 7:9, 10) Anyị niile pụrụ irite uru n’ihe ndị amụma ahụ kụziiri ndị Chineke banyere iji obi ha dum na-efe Chineke.
14. (a) Gịnị ka ọ dị mkpa ka ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta tụkwasị n’ofufe ha? (b) Olee otú ndị amụma ahụ si mesie akụkụ ndị ka mkpa n’ofufe ike?
14 Gịnị ka iji obi dum na-efe ofufe gụnyere? Gịnị ka a chọrọ ka ndị Chineke na-eme tupu a dọrọ ha n’agha nakwa mgbe ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta? Ị ma na ha aghaghị ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ Chineke n’ihe banyere omume. E nwekwara ihe ndị Iwu ahụ kwuru kpọmkwem ka a na-eme, gụnyere izukọta iji nụrụ ma mụta ihe bụ́ uche Chineke. Tụkwasị na nke ahụ, Chineke mere ka ndị amụma ya mesie ike mkpa ọ dị ịmụta na igosipụta obiọma, ikpe ziri ezi, ịdị nwayọọ n’obi, ebere, nakwa ịdị obi umeala. Lee otú Jehova si mesie ihe ndị a ike: “Ihe na-atọ m ụtọ bụ obi ebere, ọ bụghị àjà; ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esurecha n’ọkụ.” “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume; jirinụ obi ebere ghọọ mkpụrụ.” (Hosia 6:6; 10:12; 12:6) Maịka kwuru, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:6-8) Zefanaya onye amụma gbakwara ndị Chineke ume, sị: “Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ ịdị umeala n’obi.” (Zefanaya 2:3) Àgwà ndị ahụ dị oké mkpa n’ofufe nke dị Chineke mma.
Ị̀ na-agbalị ime ka ụdị mmadụ dị iche iche nụ ozi ọma ahụ?
15. Dị ka ndụmọdụ ndị amụma ahụ nyere si dị, gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime n’ofufe ha?
15 Olee otú àgwà ndị a si dị mkpa n’ofufe anyị? Ị manụ na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ dị oké mkpa. (Matiu 24:14; Ọrụ 1:8) Ma, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ele ije ozi ọma n’ebe m bi anya dị ka ọrụ siri ike na ibu arọ? Ka m̀ na-ele ya anya dị ka ohere m ga-eji nyere ndị kwesịrị ịnụ ozi Baịbụl nke na-azọ ndụ aka? M̀ na-emere ha ebere?’ Ee, ebere na obiọma kwesịrị ime ka anyị dọọ ndị ọzọ aka ná ntị banyere ụbọchị Jehova. Ikpe ziri ezi na ezi omume na-akpalikwa anyị izi ụdị mmadụ dị iche iche ozi ahụ.—1 Timoti 2:4.
16, 17. N’ihi gịnị ka ịdị nwayọọ n’obi na ịdị obi umeala ji dị oké mkpa n’ofufe anyị?
16 Tụlee ihe atụ ọzọ: Chee echiche banyere ibu ọrụ anyị nke bụ́ ịga nzukọ Ndị Kraịst, nke ị maara na ọ dị mkpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ì chetụwo echiche otú nke ahụ si achọ ịdị nwayọọ n’obi nakwa mmadụ ịdị obi umeala? Ndị dị nwayọọ n’obi na-adị umeala n’obi iji nabata ntụziaka ma tinye ihe ha na-amụta n’ọrụ wee si otú ahụ na-emezu mkpebi ikpe Jehova. Onye dị obi umeala, nke maara ebe ike ya ruru, ga-amata na agbamume na ihe ọmụma a na-enweta ná nzukọ dị ya mkpa.
17 Site n’ihe atụ ndị a, ị pụrụ ịhụ otú anyị ga-esi rite uru n’ihe ndị amụma ahụ kụziri. Ọ́ bụrụkwanụ na ị chọpụta otu ebe ma ọ bụ karịa n’ime ebe ndị a kpọtụrụ aha n’elu bụ́ ebe i kwesịrị ime mgbanwe? Ma ọ bụ, ọ́ bụrụkwanụ na i mewo mmehie ndị na-enye gị nsogbu n’uche ma i cheta ha? Ndị amụma iri na abụọ ahụ kwuru ihe ga-akasi gị obi ma nyere gị aka.
LAGHACHIKWURU JEHOVA
18. (a) Olee ndị ka ozi ndị amụma iri na abụọ ahụ ga-akasi obi karịsịa? (b) Olee ihe i chere banyere Jehova, bụ́ onye na-arịọ ndị mmadụ ka ha laghachikwute ya?
18 Dị ka anyị hụworo, ihe ndị amụma a anyị na-atụle banyere ha mere abụghị naanị ịma ikpe na ime nkatọ. Ha kwuru na Jehova na-agba ndị ya ume ka ha laghachikwute ya. Tụgharịa uche n’otú obi dị Hosia mgbe ọ na-agba ume, sị: “Bịanụ, ka anyị laghachikwuru Jehova, n’ihi na ya onwe ya adọrisịwo anyị, ma ọ ga-agwọ anyị. Ọ nọ na-eti anyị ihe, ma ọ ga-ekechi ọnyá anyị. . . . Anyị ga-amara Jehova, anyị ga-aga n’ihu ịmara ya.” (Hosia 6:1-3) N’eziokwu, dị ka ikpe ya ziri ezi si dị, Jehova Chineke mezuru ihe o kpebiri ime Izrel, na ihe o kpebiri ime Juda mgbe e mesịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ya gaara ele ihe otiti ndị ahụ anya dị ka ihe ndị e mere iji mee ka ha gbakee n’ụzọ ime mmụọ. (Ndị Hibru 12:7-13) Ọ bụrụ na ndị Jehova bụ́ ndị na-enupụ isi alaghachikwuru ya, ‘ọ ga-agwọ ha’ ma ‘kechie ọnyá ha.’ Cheedị echiche banyere nwoke gbusara ikpere n’ala na-ekechi ọnyá onye ọzọ. Ugbu a, chezie echiche ka Jehova na-eme otú ahụ. Lee ka Jehova Chineke si dị ebere, bụ́ onye na-ekechi ọnyá nke ndị dị njikere ịlaghachikwute ya! Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị akpali anyị ịchọ ịlaghachikwuru ya ma anyị mehie ya?—Joel 2:13.
19. Olee otú e si amara Jehova?
19 Olee otú e si alaghachikwuru Chineke? Hosia na-echetara anyị na ọ dị mkpa ọ bụghị naanị ka anyị ‘mara’ Chineke, kamakwa ka anyị ‘gaa n’ihu ịmara ya.’ Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha n’oge a kwuru banyere Hosia 6:3, sị: “E nwere nnukwu ọdịiche dị n’ịma banyere Chineke na ịmara Chineke. A pụrụ iji ya tụnyere ọdịiche dị n’ịgụ ihe banyere ịhụnanya na ịhụ mmadụ n’anya.” Ọ dị mkpa ka anyị maara Jehova nke ọma. Anyị aghaghị iwere ya dị ka onye dị adị n’ezie, Enyi anyị nke anyị tụkwasịrị obi, onye anyị pụrụ ịgakwuru mgbe ọ bụla. (Jeremaya 3:4) Ọ bụrụ na gị na ya enwee ụdị mmekọrịta ahụ, ị pụrụ ịghọta otú ọ na-adị ya ma i mee ihe ụfọdụ. Nke ahụ ga-enyekwara gị aka nke ukwuu n’ife ya ofufe otú dị ya mma.
20, 21. Olee ihe Eze Josaya mere nke gosiri na o ji ihe ọmụma banyere Chineke kpọrọ ihe n’ezie?
20 Eze Josaya bụ ezi ihe nlereanya n’ife ezi ofufe. Tụlekwuo ihe banyere ya. Tupu Josaya aghọọ eze, e jiriwo ikpere arụsị, ime ihe ike, na aghụghọ nke zuru ebe niile n’oge Manase na Emọn na-achị, metọọ mba ahụ. (2 Ndị Eze 21:1-6, 19-21) Ndụmọdụ Zefanaya nyere ka a ‘chọọ Jehova’ aghaghị ịgbaworị Josaya ume ime ihe dị mma, n’ihi na “ọ malitere ịchọ Chineke Devid.” Josaya malitere ikpochapụ ikpere arụsị na Juda. O mere nke ahụ ọbụna n’ógbè ndị dịbu n’ókèala nke alaeze ebe ugwu.—Zefanaya 1:1, 14-18; 2:1-3; 3:1-4; 2 Ihe E Mere 34:3-7.
Josaya achọwaghị ihe ọ ga-eji gọrọ onwe ya mgbe ọ dị mkpa ka e mee ka ebe niile dị ọcha
21 Mgbe ọrụ mkpocha a gasịrị, Josaya nọgidere na-achọ Jehova. O nyere iwu ka a rụzie ụlọ nsọ ahụ. Mgbe a nọ na-arụzi ya, a chọtara “akwụkwọ iwu Jehova, nke o nyere site n’aka Mozis.” O yikarịrị ka ọ̀ bụ akwụkwọ Iwu ahụ kpọmkwem bụ́ nke e bu ụzọ dee. Olee ihe Josaya mere mgbe a gụpụtara ihe e dere n’akwụkwọ ahụ? “Ngwa ngwa eze nụrụ ihe e kwuru n’iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya ozugbo.” Ọ ‘dọwakwara obi ya’ ma mee ihe ndị ahụ a gụpụtara ozugbo. Ọ chọwaghị ihe ọ ga-eji gọrọ onwe ya ma kwuo na ya agbalịala. Ì chetara ihe si ná mgbanwe ndị a o mere pụta? “N’ụbọchị ya niile, [ụmụ Izrel] akwụsịghị iso Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha.”—2 Ihe E Mere 34:8, 14, 19, 21, 30-33; Joel 2:13.
Ị̀ ga-eme mgbanwe ndị dị mkpa iji gbasoo ụkpụrụ Baịbụl?
22. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe nlereanya Josaya?
22 Ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee ihe m gaara eme?’ Dị nnọọ ka Josaya, ị̀ gaara ege ntị n’ihe ndị amụma ahụ kwuru ma mee mgbanwe ndị dị mkpa n’omume gị ma ọ bụ n’otú i si eche echiche? Ọ bụ ezie na anyị ebighị n’oge Zefanaya na Josaya dịrị ndụ, anyị pụrụ ịhụ mkpa ọ dị ịṅa ntị taa n’ozi Chineke nakwa na ndụmọdụ ọ na-enye. Ya mere, ọ bụrụ na obi Onye Kraịst agwa ya na ọ dị mkpa ka o mee mgbanwe n’ụzọ o si ebi ndụ ma ọ bụ n’ụzọ o si efe ofufe, iche echiche banyere ndị amụma iri na abụọ a ga-akpali ya ime ihe.—Ndị Hibru 2:1.
23. Ọ bụrụ na i chee na ọ dị mkpa imeziwanye ihe n’ebe ụfọdụ, gịnị ka ị pụrụ ime?
23 Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe ụdị mmetụta Jona nwere mgbe ọ nọ n’afọ azụ̀ ukwu ahụ: “A chụpụwo m n’ihu gị! Olee otú m ga-esi ahụ ụlọ nsọ gị ọzọ?” (Jona 2:4) Ma, lee nnọọ otú okwu Jehova pụrụ isi mesie anyị obi ike, anyị bụ́ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-eme mmehie! “Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.” (Malakaị 3:7) Ọ bụrụ na ị hụ na ọ dị mkpa ka i mee ka mmekọrịta gị na Jehova sikwuo ike, ndị okenye ọgbakọ gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka. Dị ka onye chọrọ ịnyara ugbọala gawa, ị ga-ebu ụzọ jiri nwayọọ nwayọọ malite. Ọ bụrụ na ị malite, ọ ga-adịziri gị mfe karị ịgbasiwe ike. Jide n’aka na Jehova ga-anabata gị ma nyere gị aka, n’ihi na “ọ na-eme amara, na-emekwa ebere, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma ya dịkwa ukwuu.” (Joel 2:12-14) N’ezie, ozi ndị amụma ahụ ziri na-agba ndị niile na-efe ofufe n’ụzọ dị Chineke mma ume.
Ọ dị ụfọdụ ndị mkpa ‘ịchọ Jehova’ site n’ịlaghachikwuru ya