ISI NKE IRI NA OTU
Jehova Chọrọ Ka Ndị Mmadụ Nweta Ndụ—Ị̀ Chọrọ?
1, 2. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe Jona mere banyere mkpebi Jehova mere banyere Ninive? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụlee ihe banyere ebere Chineke na otú o si ele ndụ anya?
OBI dị Jehova ụtọ. Otú ọ dị, obi adịghị onye amụma ahụ mma. Chineke ji obi ebere ghara ibibi ọtụtụ puku mmadụ. Jona chọrọ ka e bibie ha! Jehova kpebiri ịgbaghara ndị ahụ mmehie ha na idebe ndị ahụ bụ́ ndị iro nke ndị ya ndụ.
Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri ọbụna ndị ohu Chineke ike ịghọtacha obi ebere Chineke
2 Dị ka anyị pụrụ ịhụ n’ihe banyere Jona, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isiri ụmụ mmadụ ike ịghọta otú Chineke na-enweru ndidi, ọ pụkwara isiri ha ike inwe ụdị ọchịchọ O nwere nke bụ́ ka ndị mmadụ nweta ndụ. Mkpebi Jehova mere na ya agaghị ebibi ndị Ninive “wutere Jona nke ukwuu, iwe ya wee dị ọkụ.” Ọ̀ ga-abụ na ihe Jona na-eche n’obi ya dị ya mkpa karịa ime ebere na ịzọpụta ndụ? Ọ pụrụ ịbụ na o chere na ọ bụrụ na a hapụ ibibi ndị Ninive, na ya agaghịzi enwe ùgwù n’anya ha. (Jona 4:1, 10, 11) Gịnị banyere oge anyị, ka ụbọchị ikpe Jehova na-abịa nso? Ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú m pụrụ isi ghọtakwuo ma nwekwuo ekele maka otú Chineke si agbaghara mmehie, oleekwa otú m pụrụ isi nyere ndị mere ihe ọjọọ ma chegharịa aka iritekwu uru n’ịhụnanya ya? N’ezie, olee otú m pụrụ isi nwee ụdị ọchịchọ Chineke nwere nke bụ́ ka ndị mmadụ nweta ndụ?’
IKPE ZIRI EZI NA EBERE IJI ZỌPỤTA NDỤ
3. Ikpe ziri ezi nke Chineke na ebere ya hà na-emegide onwe ha? Kọwaa.
3 Ụfọdụ ndị na-eche na ọtụtụ n’ime akwụkwọ amụma iri na abụọ a na-ekwu banyere iwe Chineke na inye ndị mmadụ ntaramahụhụ nakwa mmezu o mezuru ihe o kpere n’ikpe. Ha pụrụ ịjụ, sị, ‘Oleekwanụ banyere ebere Jehova? Ò nwere mmasị n’ịzọpụta ndụ?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ikpe ziri ezi nke Chineke na ebere ya adịghị emegiderịta onwe ha, kama ha na-agakọ ma na-eme ka a zọpụta ndụ. Ikpe ziri ezi na ebere bụ akụkụ abụọ nke ụdị onye ọ bụ nke zuru okè. (Abụ Ọma 103:6; 112:4; 116:5) Site n’imezi ihe ọjọọ niile ndị ajọ omume mere, Chineke na-emere ndị obi ha ziri ezi ebere. Nke ahụ bụ ihe na-egosi ikpe ziri ezi ya nke zuru okè. N’aka nke ọzọ, ebe Jehova bụ onye ziri ezi n’ụzọ niile, o ji obi ebere na-agbaghara amaghị eme nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ị pụrụ ikwu ya otú a: ọ na-enye ntaramahụhụ mgbe ọ dị mkpa, na-eme ebere n’ebe ọ bụla o kwere omume. N’ihe ndị amụma ahụ dere, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ okwu ndị na-egosi nkwekọrịta a zuru okè, nke na-egosi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ. Ka anyị tụlee ya, sikwa otú ahụ mụta ihe ndị anyị pụrụ itinye n’ọrụ taa.
4. Olee ihe àmà na-egosi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ?
4 Joel onye amụma zisara ozi amamikpe. N’agbanyeghịkwa nke ahụ, o kwuru na Chineke “na-eme amara, na-emekwa ebere, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma ya dịkwa ukwuu.” (Joel 2:13) Mgbe ihe dị ka otu narị afọ gasịrị, na narị afọ nke asatọ T.O.A, Maịka kwusiri okwu ike banyere otú mgbaghara Jehova dịruru anyị mkpa. Mgbe Maịka jụsịrị, “Olee Chi dị ka gị?” ọ kọwara Jehova, sị: “Ọ gaghị na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na obiọma na-atọ ya ụtọ. Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ.” (Maịka 7:18, 19) Dị ka anyị pụrụ ịhụ n’ihe Jona kọrọ banyere ndị Ninive, Chineke dị njikere ịgbanwe mkpebi o mere inye ndị ọ na-eweso iwe ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na ha arụọ ọrụ na-egosi nchegharị.
5. Akụkụ dịgasị aṅaa nke ebere Chineke na mmasị o nwere ịzọpụta ndụ na-eme gị obi ụtọ karịsịa? (Leekwa “Ha Wepụtara Onwe Ha.”)
5 Anyị ebighị n’oge ndị amụma iri na abụọ ahụ dịrị ndụ. Ma, ọ̀ bụ na ihe ndị ahụ e kwuru banyere ebere Jehova na mmasị o nwere ịzọpụta ndụ adịghị emetụ anyị n’ahụ́? Inwe ụdị mmetụta ahụ pụrụ ime ka ị raparasikwuo ike n’ebe Chineke nọ ma mee ka i nwekwuo mmasị inyere ndị ọzọ aka inweta ndụ. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ taa na-ebi ndụ ọjọọ, a na-emesi anyị obi ike na Chineke ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9) E gosipụtara ọchịchọ ahụ Jehova nwere n’ihe Hosia ji ịhụnanya kwuo mgbe ọ kpọọrọ nwunye ya nke na-akwa iko. Jehova gwara ndị ya ‘okwu ga-eru ha n’obi.’ Iwu ejighị Chineke ịgbaghara ha. Ma ọ dị njikere ime otú ahụ site ‘n’obi ya.’ (Hosia 1:2; 2:13, 14; 3:1-5; 14:4) Ị̀ ma ihe mere otú Chineke si ele mgbaghara mmehie anya na ihe ọ na-eme banyere ya ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na o metụtara ndụ. Ị ga-ahụkwu ihe na-egosi ebere Chineke nakwa ọchịchọ ọ chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ ma i lee anya n’ọgbakọ Ndị Kraịst, nke na-eme otu ihe i so na-eme.
INYERE NDỊ MMADỤ AKA INWETA NDỤ
6. Olee ụzọ dị mkpa Chineke si egosi na ọ chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ?
6 Gịnị mere i ji na-ekwusara ọhaneze ozi ọma? Otu isi ihe mere i ji eme otú ahụ bụ ka i nyere ndị ọzọ aka ịmata ezi Chineke. Otu ihe dị mkpa i kwesịrị ịma banyere Jehova bụ: Ọ na-enye ịdọ aka ná ntị doro anya tupu ya enye ntaramahụhụ. Nke a na-egosi na ọ na-emere ndị mmadụ ebere, ebere ka ha ghara ịnwụ, kama, ka ha nweta ndụ. Ndị amụma iri na abụọ ahụ mere ka ndị na-eme ihe ọjọọ mara na Chineke na-enye ha ohere ịgbanwe omume ha na ịgbanahụ iwe ya nke ziri ezi. Anyị na-arụ ọrụ yiri ya taa. Dị ka Onye Kraịst, i nwere ihe ùgwù nke ikwusa ozi ịdọ aka ná ntị banyere ụbọchị ịbọ ọbọ Chineke nke na-abịa. Ka ị na-eme ya, zere inwe mmụọ ịbọ ọbọ, ịchọ ka ndị na-adịghị ege ntị nweta “ihe na-abịakwasị ha.” Cheta na ruo n’ókè dị ukwuu, ihe mere iji na-ekwusa ozi ọma bụ ka ụfọdụ ndị bata n’ụzọ na-eduga ná ndụ.—Joel 3:9-12; Zefanaya 2:3; Matiu 7:13, 14.
7. (a) N’ihi gịnị ka ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà ji dị mkpa? (b) Mgbe ndị mmadụ na-enweghị mmasị n’ozi anyị, olee otú ịtụgharị uche n’ụzọ Jehova si ele ihe anya pụrụ isi nyere anyị aka?
7 Mgbe ọ bụla ị na-akụziri mmadụ eziokwu Baịbụl site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ị na-arụ ọrụ, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ, ị na-enyere onye ebere Chineke na mgbaghara ya dị oké mkpa aka. (Hosia 11:3, 4) N’eziokwu, ndị mmadụ nwere ike ha agaghị enwe mmasị n’ozi gị, ha pụkwara ime ka ọ gbasaghị ha. Ma, site n’ịnọgidesi ike na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nke ahụ, ị na-eṅomi Chineke anyị nwere obi ebere, onye si n’ọnụ Zekaraya gwa ndị Ya na-enupụ isi, sị: “Biko, sinụ n’ụzọ ọjọọ unu nakwa n’omume ọjọọ unu lọghachi.” (Zekaraya 1:4) Ònye ma mmadụ ole ga-aṅa ntị mgbe ị na-agwa ha banyere ebere Chineke ma na-egosi ha ụzọ na-eduga ná ndụ? Burukwa n’uche na ị na-ekwusa ozi ọma n’ihi na Jehova chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ, gị onwe gị chọkwara.
8. Gịnị mere o jiri bụrụ ihe na-agba ume icheta ihe ụfọdụ ndị meworo n’ihi ebere Chineke?
8 Ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe na-agba ume icheta na: Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe niile, a na-enwe ndị na-anabata ozi Chineke. Ya mere, Hosia nwere ike ikwu okwu banyere ndị ghọtara na “ụzọ Jehova ziri ezi.” Onye amụma ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya.” (Hosia 14:9) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a kpaliwo ọtụtụ ndị ịza òkù ahụ Chineke kpọrọ, nke bụ́: ‘Jirinụ obi unu dum lọghachikwute m.’ (Joel 2:12) Ọ bụ ndị maara Jehova ka a gwara okwu ahụ, ma ọ na-egosikwa mmasị Chineke nwere n’ebe ndị ka na-amụ banyere ya nọ. Ee, Chineke ka nwere obi ike n’ikike ụmụ mmadụ nwere inwe mwute maka ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga nakwa n’ikike ha nwere ichegharị ma mewe ihe ziri ezi. Nke a ga-eme ka ha nwee ike ịbụ ndị a zọpụtara.—1 Timoti 4:16.
9. Ihe ndị Ninive mere gosiri na gịnị dị mkpa?
9 Ọ dị ihe ọzọ banyere mgbaghara Jehova gbaghaara ndị Ninive. Anyị na-agụ na ndị Ninive ji ozi banyere ikpe Chineke nke dị nso kpọrọ ihe, ha “wee malite inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ.” (Jona 3:5) Okwukwe, nke na-abụghị naanị ịtụ egwu maka amamikpe, dị mkpa iji dịrị ndụ. Ebe ọ bụ na Jehova chọsiri ike ka ndị mmadụ chegharịa ma mee ihe n’ihi okwukwe ha nwere, o kwere ka anyị bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma wee na-enyere ndị mmadụ aka ime mkpebi. Gịnị ka nke ahụ rụpụtaworo? Banyere ndị Ninive, anyị na-agụ, sị: “Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha, na ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha; ezi Chineke wee gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.” (Jona 3:10) A pụghị iji okwu ọnụ ma ọ bụ omume mmezu iwu megharịa Jehova anya. Ọ ghaghị ịbụ na nchegharị nke ndị Ninive gosipụtara site n’ọrụ ha si ha n’obi. Chineke hụrụ na ha agbanweela n’ezie; ha gosipụtara ezi nchegharị na okwukwe.
10. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Jehova zọpụtara ndị mmadụ?
10 Anyị ekwesịghị ikwubi mgbe ọ bụla na ọ bụ naanị ndị Ninive ka mmasị Jehova nwere ịzọpụta ndụ baara uru. Mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A.—mgbe Obedaya, Nehọm, na Habakọk jesịrị ozi—Jehova meere Jeremaya, bụ́ onye na-erube isi, tinyere ndị enyi ya kwesịrị ntụkwasị obi, ụzọ mgbapụ. (Jeremaya 39:16-18) Ndị amụma Chineke bukwara amụma na ndị fọdụrụ, bụ́ ndị nwere nchegharị, ga-esi Babịlọn lọta ma maliteghachi ofufe dị ọcha. (Maịka 7:8-10; Zefanaya 3:10-20) Amụma ndị ahụ emezuwo n’ụzọ dị ebube n’oge a. Mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị, Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ọtụtụ n’ime ha laworo azụ n’ezi ofufe, maliteghachiri iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ma nweta ihu ọma Jehova wee nwee olileanya inweta ndụ. Taakwa, ndị si ‘n’ọtụtụ mba na-esoro Jehova.’ (Zekaraya 2:11) Ndị a nwere olileanya nke ịdị ndụ gafee ọgwụgwụ usoro ihe a nke na-abịanụ. Ya mere, ozi ị na-ejere ọha abụghị naanị nrubeisi efu ị na-erube n’ihi na e nyere Ndị Kraịst iwu ka ha mee otú ahụ. Ọ bụghịkwa ihe a na-eme naanị iji mezuo amụma. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Isi ihe ị chọrọ ịrụzu n’ozi ị na-ejere ọha bụ inyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Jehova, inwe okwukwe, nakwa inweta ndụ.
NDỊ NA-ALAGHACHIKWUTE JEHOVA GA-ENWETA NDỤ
11, 12. Olee otú ndị na-efebu Chineke ofufe pụrụ isi rite uru n’ebere ya?
11 Jehova nwere mmasị n’ebe ndị ọhụrụ nọ, ọ chọkwara ka ha nweta ndụ, ma ọ dịghị echefu ndị nọ na-ejere ya ozi kemgbe. Anyị kwesịkwara inwe mmasị n’ebe ndị dị otú ahụ nọ. Anyị chọkwara ka ha nọgide n’ụzọ nke ndụ. N’ụzọ ndị pụtara ìhè, olee otú anyị pụrụ isi gosi mmasị anyị nwere n’ebe ha nọ?
12 Ikekwe, ị maara ụfọdụ ndị mụtara onye Jehova bụ, nwee okwukwe n’ebe ọ nọ, na-anụkwa ọkụ n’obi n’ezi ofufe, ma ugbu a, ha adịghịzi ejere ya ozi. Ozi Jehova ziri site n’ọnụ ndị amụma iri na abụọ ahụ na-egosi na ọ dị njikere imere ndị sobu ná ndị ya ebere, bụ́ ndị hapụrụ ezi ofufe. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa, ma hà akpafuwo, ma à rafuwo ha, ma ọ bụ na ha adabawo n’omume ọjọọ, ya adịkwa mkpa ka ha chegharịa. (Ndị Hibru 2:1; 3:12) Ọ bụ ezie na e nwere ike obi adịghị ha mma mgbe ahụ niile ha hapụrụ Jehova, ma ọ pụrụ isiri ha ike ịlọghachi. Chineke na-arịọ ha, site n’ihe onye amụma ya kwuru, sị: “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: ‘Lọghachikwutenụ m,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘m ga-alọghachikwuru unu.’” (Zekaraya 1:3) Lee ka okwu Hosia si emesi obi ike! O kwuru, sị: “Izrel, lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na njehie emewo ka ị sụọ ngọngọ. Jirinụ okwu na-egosi nchegharị lọghachikwute Jehova. Unu niile, sịnụ ya, ‘Gbaghara njehie anyị; nara ihe dị mma.’” Ee, ọbụna ndị mere mmehie dị oké njọ ma chegharịa n’ezie ma lọghachikwute Chineke pụrụ ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha nke ga-emekwa ka ha gbakechaa. (Hosia 6:1; 14:1, 2; Abụ Ọma 103:8-10) Nke a bụ ihe mere n’oge ndị amụma, otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge anyị.
Olee otú ị pụrụ isi nyere Ndị Kraịst na-anụbu ọkụ n’obi aka ịlọghachikwute Jehova?
13. Olee ihe mere anyị ga-eji nwee obi ebere n’ebe ndị Chineke gbaghawooro mmehie ha nọ?
13 Otú ọ dị, olee ihe nke ahụ pụtaara Ndị Kraịst nọgidesiri ike n’ụzọ nke ndụ? Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha anya? Jehova na-atụ anya ka anyị na-emere ndị ọhụrụ na ndị dara mbà n’ofufe Jehova ebere. Chineke si n’ọnụ Hosia kwuo ihe ndị Ọ chọrọ n’aka anyị, sị: “Ihe na-atọ m ụtọ bụ obiọma, ọ bụghị àjà.” N’ikwekọ n’ihe ahụ e kwuru, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Gaanụ mata ihe nke a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’” (Hosia 6:6; Matiu 9:13) Ọ dị oké mkpa igosipụta ụdị ebere ahụ ka anyị na Chineke wee na-enwe mmekọrịta dị mma. Lee otú Pọl onyeozi si jikọta mmadụ ịdị na-agbaghara ndị ọzọ na ịbụ onye na-eṅomi Chineke: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbaghara ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam. Ya mere, ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya.” (Ndị Efesọs 4:32–5:2) Olee otú ị na-eme ma a bịa n’iṅomi Chineke na nke a?
14, 15. N’ụdị ọnọdụ dịgasị aṅaa ka a pụrụ ile echiche anyị banyere otú Jehova si agbaghara mmehie ule?
14 Ọ́ bụrụkwanụ na nwanna nke mere mmehie dị oké njọ echegharịghị, e wee chụọ ya n’ọgbakọ? Ụdị ihe ahụ mere na narị afọ mbụ; a chụpụrụ Ndị Kraịst mere mmehie ma jụ ichegharị. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ mere mgbe ndịozi Jizọs ka dị ndụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ na-eme mgbe ụfọdụ taa. Mgbe ọ dị otú ahụ, ndị nọ n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ihe, na-anabata ntụziaka ahụ Baịbụl nyere nke bụ́ ka ha na onye a chụpụrụ achụpụ ghara ịkpakọrịta. Iguzosi ike n’ihe ha n’ebe Jehova nọ pụrụ inyere onye ahụ mere ihe ọjọọ aka ịhụ otú ihe o mere dịruru njọ, a pụkwara ịkpali ya ichegharị. Anyị na-agụ n’ime Baịbụl na otu nwoke nọ na Kọrịnt, bụ́ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ, mesịrị chegharịa ma gbanwee, a nabatakwara ya. (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13; 2 Ndị Kọrịnt 2:5-8) Mgbe ihe dị otú ahụ mere taa, olee otú ọ na-adị gị, oleekwa otú ị pụrụ isi gosi na i nwere mmasị ka ndị ọzọ nweta ndụ?
15 Ihere pụrụ ịdị na-eme onye mere ihe ọjọọ nke chegharịrị, ọ pụkwara ịdị na-eche na olileanya adịkwaghị. Ọ dịkwa mkpa ka e mesie ya obi ike na Chineke nakwa ụmụnna ya hụrụ ya n’anya ma chọọ ka o nweta ndụ. Lee ka Chineke si jiri obiọma mesie ndị ya n’oge ochie obi ike, bụ́ ndị dị njikere ichegharị, sị: “M ga-ekwe nkwa ịlụ gị n’ikwesị ntụkwasị obi; ị ga-amarakwa Jehova.” (Hosia 2:20) Ebe ọ bụ na nke a bụ echiche Chineke, anyị kwesịrị igosi na anyị nwere ụdị echiche ahụ onye ahụ Zekaraya kọwara dị ka Chineke nke ‘na-eme ebere’ nwere.—Zekaraya 10:6.
16. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe a nabatara mmadụ n’ọgbakọ?
16 Chineke chọrọ ka ndị mmadụ nweta ndụ. Ya mere, obi na-adị ya ụtọ mgbe onye mmehie chegharịrị ma ọ bụ mgbe ohu ya nke kwụsịrị ijere ya ozi maliteghachiri iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi.a (Luk 5:32) Banyere onye Kọrịnt ahụ a nabatara n’ọgbakọ, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’elu, Pọl gbara ọgbakọ ume ka ha gbaghara ya ma gbaa ya ume, mee ka ọ mara na ha hụrụ ya n’anya n’ezie: “Mba a ọtụtụ ndị baara onye dị otú ahụ ezuwo, kama, . . . jirinụ obiọma gbaghara ya ma kasie ya obi, ka onye dị otú ahụ wee ghara ịda mbà n’ụzọ ọ bụla n’ihi inwebiga mwute ókè. Ya mere, ana m agba unu ume ka unu gosi ya na unu hụrụ ya n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 2:6-8) Cheta na Hosia kwuru ihe Jehova kwuru banyere ndị meburu mmehie, sị: “M ga-agwọ ekwesịghị ntụkwasị obi ha. M ga-eji obi m hụ ha n’anya.” (Hosia 14:4) Ànyị ga-eṅomi Jehova, nwee obi ụtọ na anyị so mee ka onye ahụ gbakee, nweekwa obi ụtọ na nke ahụ pụrụ ime ka o nweta ndụ ebighị ebi?
17, 18. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ịhụnanya nyere ndị lọghachikwutere Jehova ma ọ bụ ndị ezinụlọ nke onye a chụpụrụ n’ọgbakọ aka?
17 Jehova na-eme ka o doo anya na ya na-eji nkwanye ùgwù emeso ndị lọghachikwutere ya ihe, ọ na-anabata ha ma na-egosi ha ịhụnanya ya n’ụzọ zuru ezu, dị nnọọ ka Hosia nabatara nwunye ya nke na-ekwesịbughị ntụkwasị obi. Jehova na-akọ otú o si mesoo ndị ohu ya, sị: “M wee dịrị ha ka ndị na-ekopụ yok n’agba ha, m jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.” (Hosia 11:4) Lee nnọọ otú ịhụnanya Jehova ji na-akpọ ndị dị otú ahụ na-alọghachikwute ya si emetụ n’obi! Anyị pụrụ iṅomi ya site n’ịghara ịkpọchi obi anyị n’ebe onye gosiri mwute dị ka Chineke chọrọ ma nwee ezi nchegharị nọ ma ọ bụ ịhapụ igosi ya ịhụnanya. Mgbe a nabatara ya n’ọgbakọ, kama iwewe iwe ma ọ bụ iburu iwe n’obi n’ihi ihe ndị o mere n’oge gara aga, anyị kwesịrị ịdị na-agwa ya okwu na-agụgụ obi mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.
18 Ì nwere ike icheta ụzọ ndị ọzọ ị pụrụ isi ṅomie Jehova n’ihe banyere onye a chụpụrụ n’ọgbakọ? Ọ bụrụ na a chụpụ mmadụ n’ọgbakọ, ànyị nwere ike inyere ndị ezinụlọ ya ndị na-eguzosi ike n’ihe aka, ikekwe, nwunye ya ma ọ bụ di ya nakwa ụmụ ya, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi? Ọ pụrụ isiri ha ike ịdị na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ànyị ga-enye ha nkwado kwesịrị ekwesị, bụ́ nke pụrụ ịdị ha mkpa? Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi gosi obi ebere bụ ikwu “okwu ndị dị mma, ndị na-enye nkasi obi,” iso ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị na-enwe mkparịta ụka na-agba ume. (Zekaraya 1:13) E nwere ọtụtụ ohere a pụrụ iji mee nke ahụ tupu nzukọ amalite nakwa mgbe a gbasara, mgbe gị na ha nọ n’ozi ubi, ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ. Ha bụ ndị ọrụ ibe anyị, ndị anyị hụrụ n’anya anyị na ha nọ n’ọgbakọ, ndị na-ekwesịghị ichewe na anyị na-agbara ha ọsọ ma ọ bụ na-akpapụ ha iche. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ naanị ụmụ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ na-agbalị ijere Jehova ozi. Anyị chọrọ n’ezie ka ha nweta ndụ. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị chọrọ?
“E MEERE NWA NA-ENWEGHỊ NNA EBERE”
19. N’ụzọ ime mmụọ, olee aka Zefanaya nyeere onye a pụrụ iwere dị ka “nwa na-enweghị nna”?
19 Ị pụrụ ịhụ ihe nlereanya nke na-egosi inyere mmadụ aka n’ozi Zefanaya jere, bụ́ onye jere ozi n’etiti narị afọ nke asaa T.O.A. Ọ pụrụ ịbụ na o si n’ezinụlọ ndị eze Juda. Ikekwe, ọ bụ onye ikwu Eze Josaya. E gburu nna eze egbu, nke mere ka Josaya dị afọ asatọ ghọọ eze. Ọrụ siri ike chere ya ihu: Mba ahụ emikpuwo n’ikpere arụsị na omume rụrụ arụ. (Zefanaya 3:1-7) Ezi nduzi na ndụmọdụ a pụrụ ịtụkwasị obi dị Josaya bụ́ obere nwa nke na-enweghị nna mkpa iji na-achị mba ahụ na-enupụ isi. Jehova si n’ọnụ Zefanaya na ndị amụma ndị ọzọ nye nduzi amamihe dị na ya, dị ka e kwuru n’isiokwu ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a. Ọ dị mma ịmara na ọ bụ ezie na Jehova si n’ọnụ onye amụma ya katọọ “ndị isi” nke Juda, Ọ katọghị eze. (Zefanaya 1:8; 3:3) Nke a pụrụ igosi na Eze Josaya ahụ na-eto eto egosipụtaworị na obi ya dị n’ofufe dị ọcha. O doro anya na ndụmọdụ onye amụma ahụ nyere Josaya nyeere ya aka ikpebisikwu ike ikpochapụ ofufe na-adịghị ọcha na Juda.
20. Olee otú inye ndị “na-enweghị nna” nọ n’ọgbakọ nduzi n’ihe ime mmụọ pụrụ isi nyere ha aka?
20 Mmasị Zefanaya nwere n’ebe Josaya nọ bụ ihe atụ nke na-egosi mmasị Jehova nwere n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ, n’ebe ụmụaka na-enweghị onye na-agbachitere ha nọ, dị ka ụmụaka a chụpụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha n’ọgbakọ. Hosia kwuru, sị: “Ọ bụ [Chineke] na-eme ka e meere nwa na-enweghị nna ebere.” (Hosia 14:3) Ọ̀ dị ụmụaka ndị ọzọ “na-enweghị nna” ị ma, bụ́ ndị enyemaka ime mmụọ na nduzi bara uru dị mkpa? Ha pụrụ ịbụ ndị na-enweghị nne na nna n’ụzọ ime mmụọ, ụmụaka ndị nwere naanị nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ndị na-eto eto ndị ọ bụ naanị ha na-efe Jehova n’ezinụlọ ha. Ọtụtụ mgbe, ihe na-ekpebi otú ha ga na-akpachi ọgbakọ anya ma tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ bụ ma è nwere onye ga na-enye ha nduzi n’ihe ime mmụọ ma ọ bụ na e nweghị. Ọtụtụ ụmụaka “na-enweghị nna” etoola ghọọ ndị dimkpa nwere ezi uche, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, mgbe Ndị Kraịst tozuru okè nọ n’ọgbakọ jiworo ịhụnanya lebara ha anya.—Abụ Ọma 82:3.
Ị̀ pụrụ ịbụrụ ndị na-eto eto “na-enweghị nna” onye nduzi nwere ịhụnanya nke ga na-eduzi ha n’ihe ime mmụọ?
21. Olee ụdị aka Ndị Kraịst tozuru okè pụrụ inyere ndị na-eto eto?
21 Dị ka ihe atụ, a pụrụ inyere nne naanị ya na-azụ ụmụ aka ma ọ bụrụ na Ndị Kraịst tozuru okè enwee mmasị n’ebe ụmụ ya nọ. (Jems 1:27) Ka ndị nlekọta na ndị ọzọ na-akwanyere ụkpụrụ ịbụisi ùgwù ma buru mkpa ọ dị ime ihe kwesịrị ekwesị n’uche, ha pụrụ inyere ndị nọ n’ezinụlọ ndị chọrọ enyemaka aka n’ụzọ ime mmụọ. Ikekwe, gị na nwunye gị ma ọ bụ ezinụlọ gị pụrụ isoro nwa na-enweghị nna nọkọọ. Ị̀ pụrụ imeso ndị na-eto eto owu nwere ike ịdị na-ama ihe n’ụzọ na-egosi na ị na-eche banyere ha? Ọ pụrụ ịdị ha mkpa ka e gosi ha ọmịiko nakwa ka ha kwupụta ihe dị ha n’obi, ị pụkwara ige ntị nụrụ ihe ahụ dị ha n’obi mgbe gị na ha nọ n’ozi ubi. O doro anya na i nwere ọtụtụ ihe ị na-eme. Ya mere, ịdị na-enyere onye na-eto eto ụdị aka ahụ mgbe niile pụrụ ịbụ ụzọ ị ga-esi ‘chọpụta ma ịhụnanya gị ọ̀ bụ nke ezigbo ya.’ (2 Ndị Kọrịnt 8:8) Mgbalị ị na-eme ga-egosi na i nwere mmasị ka ndị ọzọ nweta ndụ.
22. Olee ihe i chere banyere mmasị Jehova nwere ka ndị ọzọ nweta ndụ?
22 Lee otú ịtụgharị uche ná mmasị Chineke nwere n’ebe ndị mmadụ nọ nakwa n’ọchịchọ ọ chọrọ ka ha nweta ndụ ebighị ebi si emesi obi ike! Ọ na-enwe mmasị igosi ndị ezi omume, bụ́ ndị hụrụ ya n’anya, ịhụnanya ma nye ha ndụ karịa iweso ndị jụrụ ịgbanwe iwe, bụ́ ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi. Ka anyị na-echeresi ụbọchị Jehova ike, ka anyị ṅomie ya site n’inyere ndị ọzọ aka ịbata n’ụzọ ahụ nke na-eduga ná ndụ.
a E nwere ihe atụ atọ na-emetụ n’obi, ndị na-egosi mmetụta Chineke nwere n’ebe ndị ya kpafuru akpafu nọ, ya bụ, ihe atụ nke atụrụ furu efu, nke mkpụrụ ego furu efu, na nke nwa mmefu.—Luk 15:2-32.