Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 22 p. 142-148
  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Otiti nke Narị Afọ Mbụ
  • Ihe Otiti nke Igurube Taa
  • Igurube Ndị ahụ Na-eweta Ahụhụ!
  • Igurube Ndị A Kwadebere Maka Ije Agha
  • A Maara Ndị Ọchịchị Ụwa Ọkwa
  • Agha Ga-esi n’Ebe Ugwu Bịa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ụbọchị Jehova Dị Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Na-eburu n’Uche Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 22 p. 142-148

Isi nke 22

Ahụhụ nke Mbụ—Igurube

1. Olee ihe ndị na-esochi mgbe ndị mmụọ ozi ahụ fụrụ opi ndị ahụ, gịnịkwa ka ụda opi nke ise mara ọkwa ya?

MMỤỌ ozi nke ise na-ejikere ịfụ opi nke ya. A nụworị ụda opi anọ sitere n’eluigwe, e mewokwa ka ihe otiti anọ bịakwasị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa nke Jehova na-ele anya dị ka akụkụ kasị njọ—Krisendọm. E kpughewo ọnọdụ ọrịa ya na-egbu egbu. Ka ndị mmụọ ozi na-afụ opi ndị ahụ, ụmụ mmadụ na-eme mkpọsa ndị kwekọrọ na ha n’elu ala. Ugbu a opi mmụọ ozi nke ise dị njikere ịma ọkwa ahụhụ nke mbụ, nke dị egwu karị ihe a hụworo na mbụ. E jikọtara ya na ihe otiti igurube na-eyi egwu. Ma, ka anyị buru ụzọ nyochaa akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe otiti nke a nke ọma karị.

2. Olee akwụkwọ Bible nke kọwara ihe otiti nke igurube nke yiri nke ahụ Jọn hụrụ, mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’ahụ Israel oge ochie?

2 Akwụkwọ Bible bụ Joel, nke e dere n’ime narị afọ nke itoolu T.O.A., kọwara otu ihe otiti nke ụdị ahụhụ dị iche iche, gụnyere igurube, nke yiri nke ahụ Jọn hụrụ. (Joel 2:1-11, 25)a Ọ ga-akpatara Israel dapụworo n’ezi ofufe oké mgbakasị ahụ, ma ọ ga-emekwa ka ndị Juu n’otu n’otu chegharịa wee bịaghachi n’ihu ọma Jehova. (Joel 2:6, 12-14) Mgbe oge ahụ ruru, Jehova ga-awụkwasị mmụọ ya n’ahụ “anụ ahụ nile,” ọtụtụ ihe ịrịba ama na-eyi egwu ga-emekwa tupu “ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.”—Joel 2:11, 28-32.

Ihe Otiti nke Narị Afọ Mbụ

3, 4. (a) Olee mgbe e nwere mmezu nke Joel isi nke 2, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e si nwee ihe otiti yiri ìgwè igurube n’ime narị afọ mbụ O.A., ruokwa ogologo oge dị aṅaa ka ihe otiti ahụ nọgidere?

3 E nwere otu mmezu nke Joel isi nke 2 n’ime narị afọ mbụ. Ọ bụ mgbe ahụ, na Pentikọst 33 O.A., ka a wụpụrụ mmụọ nsọ, na-ete ndị Kraịst mbụ mmanụ, nyekwa ha ikike ikwu “banyere oké ọrụ nile nke Chineke” n’ọtụtụ asụsụ. Dị ka ihe si na nke a pụta, oké ìgwè mmadụ gbakọtara. Pita onyeozi gwara ìgwè mmadụ ndị a nọ ná mgbagwoju anya okwu, na-ehota okwu site na Joel 2:28, 29 ma na-akọwa na ihe ha na-ahụ bụ mmezu ya. (Ọrụ 2:1-21) Ma, e nweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere ihe otiti ọ bụla nke ụmụ ahụhụ efu n’oge ahụ, nke wetaara ụfọdụ ndị ahụ erughị ala ma duru ndị ọzọ bịa ná nchegharị.

4 È nwere ihe otiti ihe atụ n’oge ahụ? Ee, e nwere n’ezie! Ọ bịara dị ka ihe si ná nkwusa nke ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ ọhụrụ nọgidere na-ekwusa.b Site n’ọnụ ha, Jehova kpọrọ ndị Juu ahụ gere ntị òkù ichegharị ma nata ngọzi ndị sitere n’aka ya. (Ọrụ 2:38-40; 3:19) Mmadụ ndị chegharịrịnụ natara nkwado ya ruo n’ókè dị ukwuu. Ma nye ndị jụrụ ọkpụkpọ òkù ahụ, ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ahụ ghọrọ ndị dị ka ìgwè igurube na-ebibi ihe. Malite na Jerusalem, ha gbasara gazuo Judia na Sameria nile. N’oge na-adịghị anya ha nọ n’ebe nile, na-enye ndị Juu na-ekweghị ekwe ahụhụ site n’ịkpọsa n’ihu ọha mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, tinyere ihe nile nke a pụtara. (Ọrụ 1:8; 4:18-20; 5:17-21, 28, 29, 40-42; 17:5, 6; 21:27-30) Ihe otiti ahụ nọgidere ruo ‘ụbọchị ahụ dị egwu,’ na 70 O.A., mgbe Jehova wetara usuu ndị agha Rom imegide Jerusalem na ibibi ya. Nanị ndị Kraịst ndị ahụ ji okwukwe kpọkuo aha Jehova ka a zọpụtara.—Joel 2:32; Ọrụ 2:20, 21; Ilu 18:10.

Ihe Otiti nke Igurube Taa

5. N’ụzọ dị aṅaa ka amụma Joel siworo nwee mmezu kemgbe 1919?

5 Ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na anyị ga-atụ anya na amụma Joel ga-enwe mmezu ikpeazụ ya n’ime oge ikpeazụ a. Lee nnọọ ka nke a siworo bụrụ eziokwu! Ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible mere na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na September 1-8, 1919, oké mwụpụ mmụọ Jehova kpaliri ndị ya ịhazi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. N’etiti ndị nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, nanị ha, n’ịghọta na Jisọs anọkwasịwo n’ocheeze dị ka Eze eluigwe, tinyere mgbalị dum ha pụrụ itinye n’ikwusa ozi ọma ahụ. N’imezu amụma, ọrụ ịgba àmà ha nọgidere na-arụ ghọrọ ihe otiti nye Krisendọm ahụ dapụrụ n’ezi ofufe.—Matiu 24:3-8, 14; Ọrụ 1:8.

6. (a) Gịnị ka Jọn hụrụ mgbe mmụọ ozi nke ise fụrụ opi ya? (b) Ònye ka “kpakpando” nke a sere onyinyo ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Mkpughe, nke e dere ihe dị ka 26 afọ mgbe e bibisịrị Jerusalem, kọwakwara ihe otiti ahụ. Gịnị ka ọ tụkwasịrị ná nkọwa nke Joel? Ka anyị were ihe ndekọ ahụ, dị ka Jọn si kọọ ya: “Mmụọ ozi nke ise wee fụọ opi, m wee hụ kpakpando nke sitererịị n’eluigwe daa n’ụwa: e wee nye ya mkpịsị ugodi nke olulu nke abyss ahụ.” (Mkpughe 9:1) “Kpakpando” nke a dị iche na nke ahụ dị ná Mkpughe 8:10 nke Jọn hụrụ mgbe ọ na-ada. Ọ hụrụ “kpakpando nke sitererịị n’eluigwe daa” nke e nyekwara ọrụ ugbu a n’ihe banyere ụwa nke a. Nke a ọ̀ bụ onye ime mmụọ ka ọ bụ nke anụ ahụ? E mesịrị kọwaa onye ji “mkpịsị ugodi nke olulu nke abyss ahụ” dị ka onye tụbara Setan n’ime “abyss ahụ.” (Mkpughe 20:1-3) N’ihi nke a, ọ ghaghị ịbụ onye mmụọ siri oké ike. Ná Mkpughe 9:11, Jọn na-agwa anyị na igurube ndị ahụ nwere “mmụọ ozi ahụ nke abyss ahụ dị ka eze ha.” Ọ ghaghị ịbụ na amaokwu abụọ ndị ahụ na-ekwu banyere otu onye ahụ, ebe ezi uche dị n’ime ya na mmụọ ozi nke na-ejide mkpịsị ugodi abyss ahụ ga-abụkwa mmụọ ozi ahụ nke abyss ahụ. Kpakpando ahụ aghaghịkwa ịbụ Eze Jehova họpụtaworo, ebe ọ bụ na ndị Kraịst e tere mmanụ maara nanị otu onye dị ka Eze bụ mmụọ ozi, Jisọs Kraịst.—Ndị Kọlọsi 1:13; 1 Ndị Kọrint 15:25.

7. (a) Gịnị mere mgbe e meghere “olulu nke abyss ahụ”? (b) Gịnị bụ “abyss ahụ,” ònyekwa nọrọ nwa mgbe nta n’ime ya?

7 Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu, sị: “O wee meghee olulu nke abyss ahụ; anwụrụ ọkụ wee si n’olulu ahụ kwụgoo, dị ka anwụrụ ọkụ nke oké ọkụ; anyanwụ na mbara eluigwe wee site n’anwụrụ ọkụ nke olulu ahụ gbaa ọchịchịrị. Igurube wee si n’anwụrụ ọkụ ahụ pụta jee n’ụwa; e wee nye ha ike, dị ka akpị nke ụwa nwere ike.” (Mkpughe 9:2, 3) Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “abyss ahụ” bụ ebe a na-adịghị arụ ọrụ ọ bụla, ọbụna ebe nke ọnwụ. (Tụlee Ndị Rom 10:7; Mkpughe 17:8; 20:1, 3.) Ìgwè nta nke ụmụnna Jisọs nọrọ oge dị nta n’ime “abyss” dị otú ahụ nke ihe yiri arụghị ọrụ n’ọgwụgwụ nke agha ụwa mbụ ahụ (1918-1919). Ma mgbe Jehova wụkwasịrị ndị ohu ya nwere nchegharị mmụọ ya na 1919, ha nupụtara ije chee ihe ịma aka nke ọrụ ahụ na-echere ha ihu.

8. Olee otú o si bụrụ na “anwụrụ ọkụ” dị ukwuu sochiri ntọhapụ nke igurube ndị ahụ?

8 Dị ka Jọn hụrụ, oké anwụrụ ọkụ na-eso ntọhapụ nke igurube ndị ahụ, dị ka “anwụrụ ọkụ nke oké ọkụ.”c Otú ahụ ka ọ dịrị na 1919. Ọnọdụ gbara ọchịchịrị nye Krisendọm, nyekwa ụwa dum. (Tụlee Joel 2:30, 31.) Ntọhapụ nke igurube ndị ahụ, bụ́ òtù Jọn ahụ, bụ n’ezie mmeri megide ndị ndú okpukpe Krisendọm, ndị meworo atụmatụ igbu ọrụ Alaeze ahụ kpam kpam, ndị jụwokwara Alaeze Chineke ugbu a. Ihe àmà nke aluluu yiri anwụrụ ọkụ malitere ịdakwasị Krisendọm ahụ dapụworo n’ezi ofufe ka e nyere ìgwè igurube ahụ ikike sitere n’aka Chineke, ha wee malitekwa iji ya mee ihe n’ịkpọsa ozi ikpe ọmụma ndị siri ike. “Anyanwụ” nke Krisendọm—oyiyi o yiri ihe na-enye ìhè—danyụrụ, ‘ikuku’ jupụtakwara ná mkpọsa nke ikpe Chineke mgbe e gosipụtara “onyeisi nke ike nke mbara eluigwe” nke ụwa nke a dị ka chi nke Krisendọm.—Ndị Efesọs 2:2; Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19.

Igurube Ndị ahụ Na-eweta Ahụhụ!

9. Ntụziaka dị aṅaa banyere ibu agha ka igurube ndị ahụ natara?

9 Ntụziaka dị aṅaa banyere ibu agha ka igurube ndị ahụ natara? Jọn kọrọ, sị: “E wee gwa ha ka ha ghara imejọ ahịhịa nke ụwa, ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere akwụkwọ ndụ, ma ọ bụ osisi ọ bụla, ma ka ha mejọọ nanị mmadụ, bụ́ ndị ahụ na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha. E wee nye ha ike ka ha ghara igbu ha, kama ka e wee mekpaa ha ahụ ọnwa ise: mmekpa ahụ ha dị ka mmekpa ahụ nke akpị, mgbe ọ bụla ọ na-agba mmadụ. N’ụbọchị ahụ mmadụ ga-achọkwa ọnwụ, ha agaghị ahụkwa ya ma ọlị; agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụkwa ha, ọnwụ wee gbanarị ha.”—Mkpughe 9:4-6.

10. (a) Olee ndị ka ihe otiti ahụ chere ihu n’ụzọ bụ isi, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ahụ ha? (b) Mmekpa ahụ dị aṅaa ka nke a metụtara? (Leekwa nkọwa ala ala peji.)

10 Rịba ama na e bughị ụzọ chee ihe otiti nke a ihu megide ndị mmadụ ma ọ bụ ndị a maara aha ha n’etiti ha—‘ahịhịa na osisi nke ụwa.’ (Tụlee Mkpughe 8:7.) Igurube ndị ahụ gaje imejọ nanị mmadụ ndị ahụ na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha, bụ́ ndị ahụ nọ n’ime Krisendọm ndị na-azọrọ na ha nwere akara ahụ ma, akụkọ ihe ha na-eme gosiri na nke a bụ ụgha. (Ndị Efesọs 1:13, 14) Otú a, okwu na-enye ahụhụ nke igurube nke oge a bu ụzọ chee ihu megide ndị ndú okpukpe nke Krisendọm. Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị wetara ndị nke a kpọrọ onwe ha oké ihe ahụhụ mgbe ha nụrụ ka a na-akpọsa n’ihu ọha, ọ bụghị nanị na ha agajeghị ịkpọje ìgwè atụrụ ha eluigwe, kama na ha onwe ha agajeghịkwa iru ebe ahụ!d N’eziokwu, ọ bụwo nnọọ ‘ndị ìsì idu ndị ìsì’!—Matiu 15:14.

11. (a) Ogologo oge hà aṅaa ka e nyere igurube ndị ahụ ohere imekpa ndị iro Chineke ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke ahụ na-abụghị oge dị nta n’ezie? (b) Olee otú mmekpa ahụ ahụ ga-esiru n’ike?

11 Mmekpa ahụ ahụ ga-adịru ọnwa ise. Nke ahụ ọ̀ bụ oge dị nnọọ nta? Ọ bụghị otú ahụ ma e lee ya anya na-eburu igurube nkịtị n’uche. Ọnwa ise kọwara ogologo ndụ nke otu n’ime igurube ndị a. N’ihi ya, ọ ga-abụ ruo ogologo oge dum ha dị ndụ ka igurube nke oge a ga-anọgide na-agba ndị iro Chineke. Ọzọkwa, mmekpa ahụ ahụ ga-esi ike ruo n’ókè na ndị mmadụ ga-achọ ịnwụ anwụ. N’eziokwu, anyị enweghị ihe àmà ọ bụla nke na-egosi na ndị ahụ igurube ndị ahụ gbara nwara igbu onwe ha n’ezie. Ma okwu ahụ na-enyere anyị aka ịmata ókè mmekpa ahụ ahụ ga-esiru n’ike—dị ka à ga-asị na ọ bụ ọgbụgba na-akwụsịghị akwụsị nke ìgwè akpị. O yiri ahụhụ ahụ nke Jeremaịa buru ụzọ hụ maka ndị Israel ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ndị ndị Babilọn na-emeri emeri ga-achụsasị, ndị ọ ga-akakwara mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.—Jeremaịa 8:3; leekwa Eklisiastis 4:2, 3.

12. N’ihi gịnị ka e ji nye igurube ndị ahụ ike imekpa ndị ndú okpukpe Krisendọm ahụ ma ghara igbu ha egbu, n’ụzọ ime mmụọ?

12 N’ihi gịnị ka e ji nye ya ike, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, imekpa ndị a ahụ kama igbu ha egbu? Nke a bụ ahụhụ nke mbụ n’ikpughe ụgha nile nke Krisendọm na ọdịda ya nile, ma ọ bụ nanị mgbe e mesịrị, ka ụbọchị Onyenwe anyị na-aga n’ihu, ka a ga-ekwupụtazu otú ọnọdụ ya nke yiri ọnwụ dị. Ọ bụ n’oge ahụhụ nke abụọ ka a ga-egbu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ nile.—Mkpughe 1:10; 9:12, 18; 11:14.

Igurube Ndị A Kwadebere Maka Ije Agha

13. Gịnị bụ ọdịdị nke igurube ndị ahụ?

13 Lee nnọọ ọdịdị pụrụ iche igurube ndị ahụ nwere! Jọn kọwara ya, sị: “Oyiyi igurube ahụ yiri ịnyịnya e doziworo ije agha; n’isi ha ka ha na-ekpu ihe dị ka okpueze yiri ọlaedo, ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. Ha nwekwara agịrị isi dị ka agịrị isi ndị inyom, ezé ha dịkwa ka ezé ọdụm. Ha nwekwara ihe agha igbochi obi, dị ka ihe agha igbochi obi nke ígwè; mkpatụ nkù ha dịkwa ka mkpatụ nke ụgbọ ala, nke ọtụtụ ịnyịnya na-agba ọsọ ije agha.”—Mkpughe 9:7-9.

14. N’ihi gịnị ka nkọwa Jọn nyere igurube ndị ahụ ji kwekọọ n’ìgwè ndị Kraịst ahụ a tụteghachiri na 1919?

14 Nke a na-enye ihe atụ dị mma nke ìgwè ndị Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ndị a tụteghachiri na 1919. Dị ka ịnyịnya, ha dị njikere ije agha, dị njikere ịlụ ọgụ maka eziokwu ahụ n’ụzọ ahụ Pọl onyeozi kọwara. (Ndị Efesọs 6:11-13; 2 Ndị Kọrint 10:4) N’isi ha, Jọn hụrụ ihe dị ka okpueze yiri ọlaedo. Ọ gaghị ezi ezi ha inwe okpueze n’ezie n’ihi na ha anaghị amalite ịchị achị mgbe ha ka nọ n’elu ala. (1 Ndị Kọrint 4:8; Mkpughe 20:4) Ma na 1919, ha eyiworị ndị bụ eze. Ha bụ ụmụnne Eze ahụ, a na-edebekwara ha okpueze eluigwe ha ọ bụrụhaala na ha anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ.—2 Timoti 4:8; 1 Pita 5:4.

15. Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’ihe ndị a nke igurube ndị ahụ nwere (a) ihe mgbochi obi e ji ígwè mee? (b) ihu yiri nke mmadụ? (ch) agịrị isi yiri nke nwanyị? (d) ezé yiri nke ọdụm? (e) ime oké mkpatụ?

15 N’ọhụụ ahụ, igurube ndị ahụ nwere ihe mgbochi obi e ji ígwè mee, nke sere onyinyo ezi omume a na-apụghị imebi emebi. (Ndị Efesọs 6:14-18) Ha nwekwara ihu yiri nke mmadụ, nke a na-ezo aka n’àgwà nke ịhụnanya, ebe e mere mmadụ n’oyiyi nke Chineke, onye bụ ịhụnanya. (Jenesis 1:26; 1 Jọn 4:16) Agịrị isi ha dị ogologo dị ka nke nwanyị, nke gosipụtara n’ụzọ ziri ezi na ha na-edo onwe ha n’okpuru Eze ha, bụ́ mmụọ ozi nke abyss ahụ. Ezé ha yikwara ezé ọdụm. Ọdụm na-eji ezé ya adọkasị anụ. Malite na 1919 gaa n’ihu, òtù Jọn ahụ enwewokwa ike ọzọ ịnara nri ime mmụọ siri ike, karịsịa, eziokwu ndị ahụ metụtara Alaeze Chineke nke “Ọdụm ahụ nke si n’ebo Juda pụta,” bụ́ Jisọs Kraịst na-achị. Dị nnọọ ka ọdụm na-ese onyinyo obi ike, otú ahụ ka ọ dịworo mkpa inwe obi ike dị ukwuu iji nara ozi nke a na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ, iji wepụta ya n’akwụkwọ dị iche iche e bipụtara, ijikwa kesaa ya gburugburu ụwa. Igurube ihe atụ ndị ahụ emewo mkpatụ dị ukwuu, dị ka “mkpatụ nke ụgbọ ala, nke ọtụtụ ịnyịnya na-agba ọsọ ije agha.” N’ịgbaso ihe atụ nke ndị Kraịst narị afọ mbụ, ha ezubeghị ịgbachi nkịtị.—1 Ndị Kọrint 11:7-15; Mkpughe 5:5.

16. Gịnị ka igurube ndị ahụ inwe ‘ọdụdụ na-agba agba dị ka akpị’ sere onyinyo ya?

16 Ọrụ nkwusa nke a metụtara ihe karịrị nanị okwu e kwuru ekwu! “Ha nwekwara ọdụdụ yiri ọdụdụ akpị, nweekwa ihe ọgbụgba; n’ime ọdụdụ ha ka ike ha dị imejọ mmadụ ọnwa ise.” (Mkpughe 9:10) Gịnị ka nke a pụrụ ịbụ? Ka ha na-arụ ọrụ Alaeze ha, Ndịàmà Jehova na-eji ọnụ nakwa akwụkwọ ndị e biri ebi agwa ndị mmadụ okwu ndị siri ike dabeere n’Okwu Chineke. Ozi ha na-agbakwa agba dị ka akpị n’ihi na ha na-adọ aka ná ntị banyere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova nke na-abịa nso. (Aịsaịa 61:2) Tupu ọgbọ dị ugbu a nke igurube ime mmụọ ndị a adịchapụ ndụ ha, a gaje ịrụzu ọrụ ahụ Chineke họpụtara ha maka ya, bụ́ ịkpọsa ikpe Jehova—iji mejọọ ndị nkwutọ nile kwesiri olu ha ike.

17. (a) Ọkwa dị aṅaa ka a mara ná mgbakọ 1919 nke Ndị Mmụta Bible nke ga-emesiwanye ọgbụgba nke ịgba àmà ha ike? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo mekpaa ndị ndú okpukpe ahụ, oleekwa otú ha si meghachi omume?

17 Ìgwè igurube ahụ nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe a mara ọkwa maka magazin ọhụrụ, bụ́ The Golden Age, ná mgbakọ ha mere na 1919. Ọ bụ magazin a ga na-ebipụta n’izu abụọ ọ bụla, nke a kwadebere iji mee ka ọgbụgba nke ịgba àmà ha siwanye ike.e Mbipụta ya Nke 27, nke September 29, 1920, kpughere ihu abụọ ndị ndú okpukpe n’ịkpagbu Ndị Mmụta Bible n’ime United States n’oge dị n’agbata 1918 na 1919. N’afọ ndị 1920 na 1930, The Golden Age mekpara ndị ndú okpukpe ahụ site n’isiokwu ndị ọzọ na-agba agba na ihe osise na-atọ ọchị ndị kpughere ụzọ aghụghọ ha si na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, karịsịakwa, nkwekọrịta nke ndị ndú okpukpe Katọlik sooro ndị ọchịchị aka ike nke Fascist na ndị Nazi mee. N’imeghachi omume na nke a, ndị ndú okpukpe ‘ji iwu kpụzie mmegbu’ wee kpalie ìgwè mmadụ imeso ndị Chineke omume aka ike.—Abụ Ọma 94:20.

A Maara Ndị Ọchịchị Ụwa Ọkwa

18. Ọrụ dị aṅaa ka igurube ndị ahụ nwere ịrụ, gịnị sochikwara nke a ná nzaghachi nye ụda opi nke ise ahụ?

18 Igurube ndị nke oge a nwere ọrụ ha gaje ịrụ. Ha aghaghị ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. A ghaghị ikpughe njehie nile. A ghaghị ịchọta atụrụ nile furu efu. Ka igurube ndị ahụ malitere ịrụ ọrụ ndị a, ụwa malitere ịhụta ihe ha na-eme. N’irubere ụda opi mmụọ ozi ndị ahụ isi, òtù Jọn ahụ anọgidewo na-ekpughe Krisendọm dị ka ihe kwesịrị ikpe ọmụma Jehova. Ná nzaghachi nye opi nke ise ahụ, e mesiri otu akụkụ nke ikpe ọmụma ndị a ike ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible nwere na London, England, na May 25 ruo 31, 1926. E wepụtara otu nkwupụta okwu na ya, nke bụ “Àmà A Gbaara Ndị Ọchịchị Ụwa,” nakwa okwu ihu ọha e kwuru n’ụlọ nzukọ Royal Albert Hall n’isiokwu bụ “Ihe Mere Ọchịchị Ụwa Dị Iche Iche Ji Na-adakpọ—Ihe Ngwọta Ya,” nke e bipụtara akụkụ ya nile n’otu akwụkwọ akụkọ bụ isi na London n’ụbọchị na-eso ya. Mgbe e mesịrị, ìgwè igurube ahụ kesara 50 nde nkwupụta okwu ahụ dị ka traktị—nke bụ nnọọ ezigbo mmekpa ahụ nye ndị ndú okpukpe! Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ndị mmadụ bi n’England ka na-ekwu okwu mkpughe ahụ na-agba agba.

19. Ihe agha ọzọ dị aṅaa ka igurube ihe atụ ndị ahụ natara, gịnịkwa ka o kwuru banyere okwu ikwe nkwa ahụ e kwuru na London?

19 Ná mgbakọ nke a, igurube ihe atụ ndị ahụ natara ngwá agha ndị ọhụrụ, nke kasị pụta ìhè bụ akwụkwọ ọhụrụ aha ya bụ Deliverance. Otu n’ihe ndị dị n’ime ya bụ ntụle Akwụkwọ Nsọ nke ihe ịgba àmà ahụ nke na-egosi na a mụpụtara ọchịchị “nwa nwoke” ahụ, bụ́ Alaeze eluigwe nke Kraịst, na 1914. (Matiu 24:3-14; Mkpughe 12:1-10) Mgbe nke ahụ gasịrị, o hotara okwu ikwe nkwa nke e bipụtara na London na 1917, nke ndị ndú okpukpe asatọ bịanyere aka na ya, bụ́ ndị a kọwara dị ka “ụfọdụ n’ime ndị okwuchukwu kasị ukwuu n’ụwa.” Ha nọchiri anya òtù ndị bụ isi nke Protestant—Baptist, Congregational, Presbyterian, Episcopalian, na Methodist. Okwu ikwe nkwa nke a kpọsara na “ọnọdụ ọgba aghara nke oge a na-ezo aka n’ọgwụgwụ nke oge ndị Jentaịl” na “a pụkwara ịtụ anya mkpughe nke Onyenwe anyị ná ntabi anya ọ bụla.” Ee, ndị ndú okpukpe ndị ahụ aghọtawo ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs! Ma ọ̀ dị ihe ọ bụla ha chọrọ ime banyere ya? Akwụkwọ ahụ bụ Deliverance na-akọrọ anyị, sị: “Akụkụ kasị pụta ìhè nke okwu ahụ bụ na ndị ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ ikwe nkwa ahụ n’onwe ha mesịrị katọọ ya jụkwa ihe àmà ndị na-egosi na anyị nọ n’oge ọgwụgwụ ụwa nakwa n’ime oge ọnụnọ nke abụọ nke Onyenwe anyị.”

20. (a) Gịnị ka ndị ụkọchukwu họrọworo n’ihe banyere òtù igurube ahụ na Eze ha? (b) Ònye ka Jọn kwuru na ọ na-elekọta ìgwè igurube ahụ, gịnị bụkwa aha ya?

20 Kama ịma ọkwa Alaeze Chineke nke na-abịanụ, ndị ndú okpukpe Krisendọm ahọrọwo ịnọgide n’ime ụwa nke Setan. Ha achọghị ka e nwee ihe ọ bụla jikọrọ ha na òtù igurube ahụ na Eze ha, ndị Jọn kwuru banyere ha ugbu a, sị: “Ha nwere mmụọ ozi ahụ nke abyss ahụ dị ka eze ha: aha ya n’asụsụ Hibru bụ Abadọn [nke pụtara “Mbibi”], n’asụsụ Grik o nwekwara aha Apoliọn [nke pụtara “Onye Mbibi”].” (Mkpughe 9:11) Dị ka ‘mmụọ ozi nke abyss ahụ’ na “Onye Mbibi,” Jisọs atọhapụwo ihe otiti na-eweta ahụhụ n’isi Krisendọm n’ezie. Ma a ka nwere ihe ndị gaje ịbịa!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Jiri Joel 2:4, 5, 7 (ebe a kọwara ụmụ ahụhụ ndị ahụ dị ka ịnyịnya, ndị mmadụ, na ndị ikom, nakwa dị ka ndị na-eme mkpatụ yiri nke ụgbọ agha) tụnyere Mkpughe 9:7-9; jirikwa Joel 2:6, 10 (nke na-akọwa mmetụta dị ilu nke ihe otiti ụmụ ahụhụ ndị ahụ) tụnyere Mkpughe 9:2, 5.

b Lee isiokwu ahụ bụ “Ịdị n’Otu Megide Mba Nile n’Ime Ndagwurugwu Mkpebi Ikpe” nke dị ná mbipụta November 1, 1962, nke Ụlọ Nche.

c Rịba ama na a pụghị iji akụkụ akwụkwọ nsọ nke a kwado na e nwere ọkụ na-enwu n’ime abyss ahụ, dị ka à ga-asị na abyss ahụ bụ otu ụdị nke ọkụ ala mmụọ. Jọn kwuru na ya hụrụ anwụrụ ọkụ nke “dị ka,” ma ọ bụ nke yiri, anwụrụ ọkụ nke oké ọkụ. (Mkpughe 9:2) Ọ kọghị na ya hụrụ ire ọkụ n’ime abyss ahụ.

d Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a sitere na mkpọrọgwụ okwu ahụ bụ ba·sa·niʹzo, nke e ji eme ihe n’oge ụfọdụ ikwu banyere ntaramahụhụ efu; otú ọ dị, a pụkwara iji ya mee ihe banyere ntaramahụhụ nke echiche. Dị ka ihe atụ, na 2 Pita 2:8 anyị na-agụ na Lọt ‘na-emekpa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ’ n’ihi ihe ọjọọ ọ hụrụ na Sọdọm. Ndị ndú okpukpe nke oge ndị ozi nwere mmekpa ahụ nke echiche, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ihi ihe dị nnọọ iche.

e A kpọgharịrị magazin nke a aha ịbụ Consolation na 1937, e mesịakwa kpọọ ya Awake! (Teta!) na 1946.

[Foto dị na peeji nke 143]

Ọfụfụ opi nke ise ahụ wetara nke mbụ n’ime ahụhụ atọ ndị ahụ

[Foto dị na peeji nke 146]

Akụ gị nile bụ ihe dị nkọ n’obi ndị iro Eze. (Abụ Ọma 45:5) N’ịbụ nke e dere ihe a n’okpuru ya, ihe osise nke a yiri ọtụtụ ndị e nwere n’afọ ndị 1930 ndị gbara “ndị ahụ na-enweghị akara nke Chineke” dị ka akpị

[Foto ndị dị na peeji nke 147]

Ụlọ nzukọ Royal Albert Hall, ebe a nọ wepụta akwụkwọ ahụ bụ Deliverance, nabatakwa nkwupụta okwu ahụ bụ “Àmà A Gbaara Ndị Ọchịchị Ụwa”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya