Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 23 p. 148-154
  • Ahụhụ nke Abụọ—Usuu Ndị Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụhụ nke Abụọ—Usuu Ndị Agha
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Miriad Ụzọ Miriad Abụọ
  • Ịzọ Ije nke Usuu Ndị Agha Ịnyịnya nke Metụtara Gị
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Ahụhụ nke Mbụ—Igurube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Anyị Bụ Ìgwè Ụmụnna
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Ìgwè Ụmụnna Anyị
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 23 p. 148-154

Isi nke 23

Ahụhụ nke Abụọ—Usuu Ndị Agha

1. N’agbanyeghị mgbalị ndị ndú okpukpe ikpochapụ igurube ndị ahụ, gịnị meworo, gịnịkwa ka ọbịbịa nke ahụhụ abụọ ọzọ gosiri?

MALITE na 1919 gaa n’ihu, mwabata ihe atụ nke igurube ndị ahụ na Krisendọm akpataworo ndị ndú okpukpe oké mmekpa ahụ. Ha anwawo ikpochapụ igurube ndị ahụ, ma ndị a anọgidewo na-abịaghachi, na-esikwa ike karị otú ha dị na mbụ. (Mkpughe 9:7) Nke ahụ agwụchabeghịkwa! Jọn dere, sị: “Ahụhụ mbụ agabigawo: lee, ahụhụ abụọ ọzọ fọdụrụ ịbịa, mgbe ihe ndị a gasịrị.” (Mkpughe 9:12) A ka nwere ihe otiti ndị na-emekpa ahụ na-echere Krisendọm.

2. (a) Gịnị mere mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ya? (b) Gịnị ka “otu olu nke si na mpi nke ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo mee pụta” nọchiri anya ya? (ch) N’ihi gịnị ka e ji kpọtụ ndị mmụọ ozi anọ aha?

2 Olee ebe ahụhụ nke abụọ si abịa? Jọn dere, sị: “Mmụọ ozi nke isii wee fụọ opi, m wee nụ otu olu nke si na mpi nke ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo mee pụta, bụ́ nke dị n’ihu Chineke, m wee nụ otu onye, ka ọ na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ okwu, bụ́ onye nwere opi ahụ, sị, Tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ ndị e keworo agbụ n’osimiri ukwu Yufretis.” (Mkpughe 9:13, 14) Ntọhapụ nke ndị mmụọ ozi ahụ bụ ná nzaghachi nye olu ahụ nke si na mpi nke ebe ịchụàjà ahụ e ji ọlaedo mee pụta. Nke a bụ ebe ịchụàjà ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ahụ e ji ọlaedo mee, e jiwokwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke ọkwa ọlaedo ndị sitere n’ebe ịchụàjà nke a mee ihe ugbo abụọ tupu ugbu a n’ihe metụtara ekpere ndị nsọ. (Mkpughe 5:8; 8:3, 4) N’ihi nke a, otu olu nke a nọchiri anya ekpere e jikọtara ọnụ nke ndị nsọ nọ n’elu ala na-ekpe. Ha na-arịọ arịrịọ ka a napụtakwa ha onwe ha maka ịnọgide na-ejesi ozi ike dị ka “ndị ozi” Jehova, ebe nke a bụ isi ihe dị n’okwu Grik ahụ a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ndị mmụọ ozi.” N’ihi gịnị ka e ji nwee ndị mmụọ ozi anọ? Ọnụ ọgụgụ ihe atụ nke a yiri ka ọ̀ na-egosi na a ga-ahazi ha nke ọma nke na ha ga-ejezu ụwa dum n’ozuzu ya.—Mkpughe 7:1; 20:8.

3. Ò si aṅaa bụrụ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ bụ “ndị e keworo agbụ n’osimiri ukwu Yufretis”?

3 N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ na ‘e kere ndị mmụọ ozi ahụ agbụ n’osimiri ukwu Yufretis’? N’oge ochie, osimiri Yufretis bụ ókèala nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke ala ahụ Jehova kwere Abraham ná nkwa. (Jenesis 15:18; Deuterọnọmi 11:24) Ọ pụtara ìhè na e gbochiwo ndị mmụọ ozi ndị ahụ ịgabiga ókèala nke ala ahụ Chineke nyeworo ha, ma ọ bụ ókèala ije ozi ha n’elu ala, bụrụ ndị e gbochiri ịbanye n’ụzọ zuru ezu n’ozi ahụ nke Jehova kwadebewooro ha. E jikwa Yufretis mee ihe n’ụzọ pụtara ìhè n’ihe banyere obodo Babilọn, ọzọkwa, mgbe Jerusalem dasịrị n’afọ 607 T.O.A., ndị Israel anụ ahụ nọrọ 70 afọ ná ndọta n’agha n’ebe ahụ, “ndị e keworo agbụ n’osimiri ukwu Yufretis.” (Abụ Ọma 137:1) N’afọ 1919, ndị Israel ime mmụọ bụ ndị e jiri ihe mgbochi yiri nke ahụ kee agbụ, ndị nọ n’obi ịda mbà, na-arịọkwa Jehova maka nduzi.

4. Ọrụ dị aṅaa ka ndị mmụọ ozi anọ ahụ ga-arụ, n’ụzọ dị aṅaa ka e siwokwara rụzuo ya?

4 Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jọn pụrụ ịkọ, sị: “E wee tọpụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e dozirirịị nye oge hour na ụbọchị na ọnwa na afọ ahụ, ka ha wee gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ.” (Mkpughe 9:15) Jehova bụ Onye Na-edebe Oge kpọmkwem. O nwere ndokwa oge o ji eme ihe, ọ na-agbasokwa ya nke ọma. N’ihi nke a, a na-atọhapụ ndị ozi ndị a kpọmkwem n’oge a kara aka ka ha nweekwa ike imezu ihe dịịrị ha ime. Cheedị nnọọ echiche banyere ụdị ọṅụ ha ga-enwe mgbe ha pụtara n’agbụ na 1919, dị njikere maka ọrụ! Ha nwere ọrụ ọ bụghị nanị inye mmekpa ahụ, kama n’ikpeazụ, ‘igbu otu ụzọ n’ụzọ atọ ndị mmadụ.’ E jikọtara nke a na ihe otiti ndị ụda opi anọ ndị mbụ ahụ kpọsara, ndị metụtara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa, nke osimiri, na nke ihe e kere eke ndị bi n’ime osimiri, isi iyi na mmiri iyi dị iche iche, na ihe ndị dị n’eluigwe na-enye ìhè. (Mkpughe 8:7-12) Ndị mmụọ ozi anọ ahụ ga-eme ihe karịrị nke a. Ha ‘ga-egbu egbu,’ na-ekpughe kpam kpam ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ nke Krisendọm. Oké mkpọsa ndị e mere karịsịa site na 1922 gaa n’ihu emezuwo nke a.

5. N’ihe banyere Krisendọm, olee otú e siri tiwapụta ụda opi nke isii ahụ na 1927?

5 Cheta na ọ dịbeghị anya mmụọ ozi ahụ nọ n’eluigwe fụrụ opi nke isii. N’ikwekọ na nke a, e mere nke isii n’usoro mgbakọ Ndị Mmụta Bible na-eme kwa afọ na Toronto, Ontario, Canada. A gbasara usoro ihe omume nke Sunday, July 24, 1927, n’ụlọ ọrụ redio 53, bụ́ nkekọta mgbasa ozi kasị ukwuu e metụworo mgbe ọ bụla ruo oge ahụ. Ndị nụrụ ozi ahụ a gbasara n’ebe ahụ pụrụ iruworị ọtụtụ nde mmadụ. Nke mbụ, e ji nkwupụta okwu dị oké ike kpughee Krisendọm dị ka ihe nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ, kpọọkwa òkù ahụ bụ́: “N’oge hour nke a nke mgbagwoju anya, Jehova Chineke na-akpọ ndị nile òkù ka ha gbakụta ‘Krisendọm’ ma ọ bụ ‘Iso Ụzọ Kraịst a haziri ahazi’ azụ, jụkwa ya ruo mgbe ebighị ebi, sikwa n’ebe ọ nọ chigharịa kpam kpam . . . ; [ka] ndị nile rara obi ha dum na nrubeisi ha dum nye Jehova Chineke na Eze na alaeze ya.” “Inwe Onwe nye Ndị Nile” bụ isiokwu nke okwu ihu ọha sochiri ya. J. F. Rutherford kwuru okwu a n’ụzọ siri ike ọ na-esi ekwu okwu mgbe nile, bụ́ nke ya na “ọkụ na anwụrụ ọkụ na brimstone” kwekọrọ, bụ́ ihe ọzọ Jọn hụrụ n’ọhụụ.

6. Olee ụzọ Jọn si kọwaa usuu ndị agha ahụ nke ọ hụrụ?

6 “Ọnụ ọgụgụ usuu ndị agha ahụ, nke bụ ndị ịnyịnya, dị [narị nde abụọ]: anụrụ m ọnụ ọgụgụ ha. Otú a ka m hụkwara ịnyịnya ahụ n’ọhụụ ahụ, ha na ndị na-anọkwasị ha, na-enwe ihe agha igbochi obi nke yiri ọkụ na hyacinth na brimstone: isi ịnyịnya ahụ dịkwa ka isi ọdụm; ọkụ na anwụrụ ọkụ na brimstone na-esikwa n’ọnụ ha pụta. E sitere n’ihe otiti atọ ndị a gbuo otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ nile, ya bụ site n’ọkụ ahụ na anwụrụ ọkụ ahụ na brimstone ahụ, nke na-esi n’ọnụ ha pụta.”—Mkpughe 9:16-18.

7, 8. (a) N’okpuru nduzi ònye ka usuu ndị agha nke a na-aga n’ihu? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka usuu ndị agha nke a si yie igurube ndị ahụ bu ha ụzọ?

7 Ọ pụtara ìhè na usuu ndị agha nke a na-agbapụta ná nduzi nke ndị mmụọ ozi anọ ahụ. Lee nnọọ ihe na-eyi egwu nke a bụ ịhụ! Chee nnọọ echiche otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ gị ka usuu ndị agha dị otú ahụ na-awakwasị! Nanị ọdịdị ha ga-atụba obi gị n’oké egwu. Ma, ị̀ hụtara otú usuu ndị agha nke a si yie igurube ndị ahụ bu ha ụzọ? Igurube ndị ahụ yiri ịnyịnya; n’etiti usuu ndị agha ahụ, e nwere ịnyịnya. Ya mere, ha abụọ socha na-ebu agha maka ọchịchị Chineke. (Ilu 21:31) Igurube ndị ahụ nwere ezé yiri nke ọdụm; ịnyịnya ndị ahụ nke usuu ndị agha ahụ nwere isi ndị yiri nke ọdụm. N’ihi nke ahụ, e jikọtara ha abụọ na Ọdụm ebo Juda ahụ nwere obi ike, bụ́ Jisọs Kraịst, onye bụ Onye Ndú ha, Onye na-enye ha iwu, na Onye na-esetịpụrụ ha ihe nlereanya.—Mkpughe 5:5; Ilu 28:1.

8 Ma igurube ndị ahụ na usuu ndị agha ndị ahụ na-ekere òkè n’ọrụ ikpe ikpe nke Jehova. Igurube ndị ahụ si n’anwụrụ ọkụ ndị gbara àmà ahụhụ na ọkụ mbibi nye Krisendọm pụta; n’ọnụ ịnyịnya ndị ahụ ka a na-ahụ ọkụ, anwụrụ ọkụ, na brimstone. Igurube ndị ahụ nwere ihe mgbochi obi nke ígwè, nke na-egosi na e ji nraranye ha a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nye ezi omume chebe obi ha; usuu ndị agha ahụ na-eyi ihe mgbochi obi ndị na-acha uhie uhie, anụnụ anụnụ, na edo edo, na-egosipụta ọkụ, anwụrụ ọkụ, na brimstone nke ozi ikpe ọmụma ndị ahụ na-egbu egbu, ndị si n’ọnụ ịnyịnya ndị ahụ na-apụta. (Tụlee Jenesis 19:24, 28; Luk 17:29, 30.) Igurube ndị ahụ nwere ọdụdụ yiri nke akpị iji mekpaa ndị mmadụ ahụ; usuu ndị agha ahụ nwere ọdụdụ ndị yiri agwọ iji gbuo ndị mmadụ egbu! O yiri ka ọ bụ ihe igurube ndị ahụ malitere ka usuu ndị agha nke a na-emesiwanye ike ruo mmezu ikpeazụ ya.

9. Gịnị ka usuu ndị agha ahụ sere onyinyo ya?

9 Ya mere, gịnị ka usuu ndị agha nke a sere onyinyo ya? Dị nnọọ ka òtù Jọn ahụ e tere mmanụ malitere mkpọsa yiri ọfụfụ opi nke ikpe ịbọ ọ́bọ̀ Jehova megide Krisendọm, na-enwe ikike ‘ịgba na imejọ’ ndị mmadụ, a ga-atụkwa anya ka e jiri otu ìgwè ndị ahụ dị ndụ mee ihe ‘n’igbu,’ ya bụ, n’ime ka a mara na Krisendọm na ndị ndú okpukpe ya nwụrụ anwụ kpam kpam n’ụzọ ime mmụọ, bụrụ ndị Jehova tụpụworo, ndị a kwadebewokwara maka “oké ọkụ ahụ” nke mbibi ebighị ebi. N’eziokwu, Babilọn Ukwu dum aghaghị ịla n’iyi. (Mkpughe 9:5, 10; 18:2, 8; Matiu 13:41-43) Otú ọ dị, dị ka ihe bu mbibi ya ụzọ, òtù Jọn ahụ na-eji “mma agha nke mmụọ nsọ, nke bụ okwu Chineke,” na-eme ihe n’ikpughe ọnọdụ Krisendọm nke yiri ọnwụ. Ndị mmụọ ozi anọ ahụ na ndị ịnyịnya nke usuu ndị agha ahụ na-eduzi ogbugbu ihe atụ nke a nke otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ. (Ndị Efesọs 6:17; Mkpughe 9:15, 18) Nke a na-egosi nhazi ziri ezi na nduzi ọchịchị Chineke n’okpuru nlekọta nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka ìgwè ahụ na-eyi egwu nke ndị nkwusa Alaeze na-azọ ije ịbanye n’ibu agha ahụ.

Miriad Ụzọ Miriad Abụọ

10. N’echiche dị aṅaa ka e nwere miriad ụzọ miriad abụọ nke usuu ndị agha ahụ?

10 Olee ụzọ a pụrụ isi nwee miriad ụzọ miriad abụọ nke usuu ndị agha nke a? Otu miriad pụtara n’ụzọ nkịtị 10,000. N’ihi ya, miriad ụzọ miriad abụọ ga-abụ ngụkọta nke 200 nde.a Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na e nwere ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze ugbu a, ma ọnụ ọgụgụ ha erubeghị nnọọ ọtụtụ narị nde! Ma, cheta okwu Mosis nke dị n’Ọnụ Ọgụgụ 10:36 (NW): “Jehova, laghachikwute ọtụtụ miriad puku nke ndị Israel.” (Tụlee Jenesis 24:60.) N’ụzọ nkịtị, nke ahụ ga-apụta, ‘Laghachikwute ọtụtụ iri nde ndị a nke ndị Israel.’ Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ndị Israel dị ihe dị ka nanị nde mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ n’oge Mosis. Ya mere, gịnị ka Mosis na-ekwu? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe o bu n’uche bụ na ọnụ ọgụgụ ndị Israel ga-ehi nne nke ukwuu dị ka “kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri,” kama ịbụ ndị a gụrụ ọnụ. (Jenesis 22:17; 1 Ihe Emere 27:23) N’ihi nke a, o jiri okwu ahụ dịịrị “miriad” mee ihe igosi ọnụ ọgụgụ buru ibu ma bụrụ nke a na-amaghị ama. N’ihi nke a, The New English Bible sụgharịrị amaokwu nke a otú a: “ONYENWE ANYỊ, nọnyere ọtụtụ puku mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke Israel.” Nke a kwekọrọ ná nkọwa ọzọ nke okwu ahụ bụ “miriad” nke a na-achọta n’akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche nke asụsụ Grik na Hibru: “ìgwè mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ,” “oké ìgwè mmadụ.”—The New Thayer’s Greek-English Lexicon of the New Testament; akwụkwọ Gesenius bụ́ A Hebrew and English Lexicon of the Old Testament, nke Edward Robinson sụgharịrị.

11. Gịnị ga-adị mkpa ka òtù Jọn ahụ wee ghọọ ọtụtụ miriad ọbụna n’ụzọ ihe atụ?

11 Otú ọ dị, ndị òtù Jọn ka fọdụrụ ndụ n’elu ala erughi 10,000—nke dị nta karịa otu miriad efu. À pụrụ isi aṅaa jiri ha tụnyere ọtụtụ puku mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke usuu ndị agha? Iji ghọọ ọtụtụ miriad ọbụna n’ụzọ ihe atụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị ha mkpa ịbụ ndị e nyekwuru nkwado ndị agha? Nke ahụ bụ n’ezie ihe dịworo ha mkpa, sitekwa n’obi ebere Jehova na-erughịrị ha, nke ahụ bụ ihe ha nataworo! Olee ebe ndị a siworo bịa?

12, 13. Ihe ndị dị aṅaa mere malite na 1918 ruo 1935 gosiri ebe agbamume ahụ si bịa?

12 Malite na 1918 ruo 1922, òtù Jọn ahụ malitere isetịpụrụ ụmụ mmadụ nọ ná mkpagbu olileanya obi ụtọ nke bụ na “ọtụtụ nde ndị dị ndụ ugbu a agaghị anwụ anwụ ma ọlị.” Na 1923, e mekwara ka a mara na atụrụ ahụ e kwuru okwu ha na Matiu 25:31-34 ga-eketa ndụ n’elu ala n’okpuru Alaeze Chineke. E setịpụkwara olileanya yiri nke a n’akwụkwọ nta ahụ bụ Freedom for the Peoples, nke e wepụtara ná mgbakọ mba nile e nwere na 1927. Ná mmalite afọ ndị 1930, e gosipụtara na òtù Jehonadab ahụ nke guzoziri eguzozi, na ‘ndị ahụ na-eze ume na-asụkwa ude’ n’ihi ọnọdụ ime mmụọ dị njọ nke Krisendọm, yiri atụrụ ahụ ndị nwere olileanya ndụ n’elu ala. (Ezikiel 9:4; 2 Ndị Eze 10:15, 16) N’iduzi ndị dị otú ahụ gaa ‘n’obodo mgbaba’ nke oge a, mbipụta Ụlọ Nche (Bekee) nke August 15, 1934, kwuru, sị: “Ndị ahụ so n’òtù Jonadab anụwo ụda nke opi Chineke, ha emewokwa ihe kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị ahụ site n’ịgbaba ná nzukọ Chineke na isonyekwara ndị Chineke, ha aghaghịkwa ịnọgide n’ebe ahụ.”—Ọnụ Ọgụgụ 35:6.

13 Na 1935, a kpọrọ ndị nọ n’òtù Jonadab nke a òkù pụrụ iche ịbịa mgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere na Washington, D.C., U.S.A. N’ebe ahụ, na Friday, May 31, J. F. Rutherford kwuru okwu ya ahụ a ma ama bụ “Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ,” nke ọ nọ na ya kọwapụta na ìgwè nke a e kwuru okwu banyere ha ná Mkpughe 7:9 (King James Version) bụ otu ihe ahụ ha na atụrụ e kwuru okwu ha na Matiu 25:33—ìgwè ndị raara onwe ha nye, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala. Dị ka ihe ịgba àmà nke ihe ndị gaje ịbịa, ná mgbakọ ahụ, e mere 840 Ndịàmà ọhụrụ baptism, nke ọtụtụ n’ime ha na-ekwupụta na ha so n’oké ìgwè mmadụ ahụ.b

14. Oké ìgwè mmadụ ahụ hà ga-ekere òkè ná mgbagharị ihe atụ nke usuu ndị agha ahụ, mkpebi dị aṅaa ka e kwupụtakwara na 1963?

14 Oké ìgwè mmadụ nke a hà ekerewo òkè ná mgbagharị usuu ndị agha ahụ nke malitere na 1922, nke e mesiwanyekwara ike ná mgbakọ ahụ e nwere na Toronto na 1927? N’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi anọ ahụ, bụ́ òtù Jọn ahụ e tere mmanụ, ha ekerewo òkè n’ezie! Ná Mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” ahụ zuru ụwa ọnụ e mere na 1963, ha sonyeere òtù Jọn ahụ n’otu nkwupụta na-akpali akpali. Nke a kwupụtara na ụwa “na-eche ala ọma jijiji nke nsogbu ụwa ihu nke ọ na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ, na a gajekwa ịkwatusị òtù ọchịchị ya nile na okpukpe Babilọn ya nke oge a.” E mere nkwupụta ahụ bụ na “anyị ga-anọgide na-ekwusara ndị nile, n’eleghị mmadụ anya n’ihu, ‘ozi ọma ebighị ebi’ ahụ banyere alaeze Mesaịa nke Chineke, banyekwara ihe ndị o kpere n’ikpe, ndị yiri ihe otiti megide ndị iro ya, ma bụrụ ndị a gaje imezu maka ntọhapụ nke ndị nile chọrọ ife Chineke Onye Okike ahụ n’ụzọ ọ na-anara nke ọma n’ime mmụọ na n’eziokwu.” E ji ịnụ ọkụ n’obi nabata nkwupụta okwu nke a na 24 mgbakọ e mere gburugburu ụwa nke ngụkọta ndị bịara ya bụ 454,977 mmadụ, nke ihe karịrị 95 pasentị n’ime ha bụ ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ.

15. (a) Na 2005, oké ìgwè mmadụ ahụ mejupụtara pasentị hà aṅaa nke ndị ọrụ Jehova ji na-eme ihe n’ubi? (b) Olee ụzọ ekpere Jisọs nke e dekọrọ na Jọn 17:20, 21 si gosipụta ịdị n’otu dị n’etiti oké ìgwè mmadụ ahụ na òtù Jọn ahụ?

15 Oké ìgwè mmadụ ahụ anọgidewo na-akpọsa ịdị n’otu na-enweghị atụ nke dị n’etiti ya na òtù Jọn ahụ n’ịwụpụta ihe otiti ahụ megide Krisendọm. Na 2005, oké ìgwè mmadụ nke a mejupụtara ihe karịrị 99.8 pasentị nke ndị ọrụ Jehova ji na-eme ihe n’ubi. Ndị so n’òtù ahụ ji obi ha nile kwekọọ n’ihe òtù Jọn ahụ na-eme, bụ́ ndị Jisọs kpere ekpere banyere ha na Jọn 17:20, 21, sị: “Ọ bụghịkwa nanị ndị a ka m na-ekpe ekpere banyere ha, kama ana m ekpekwa ekpere banyere ndị kwere na mụ site n’okwu ha; ka ha nile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị dị n’ime m, dị ka mụ onwe m dịkwa n’ime gị, Nna, ka ha onwe ha wee dịkwa n’ime anyị: ka ụwa wee kwere na gị onwe gị zitere m.” Ka òtù Jọn ahụ na-ebute ụzọ n’okpuru nduzi Jisọs, oké ìgwè mmadụ ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi soro ha na-ekere òkè ná mgbagharị usuu ndị agha kasị pụta ìhè n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ!c

16. (a) Olee otú Jọn si kọwaa ọnụ na ọdụdụ nke ịnyịnya ihe atụ ndị ahụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo kwadebe ọnụ ndị Jehova maka ije ozi? (ch) Gịnị kwekọrọ n’eziokwu ahụ bụ na “ọdụdụ ha yiri agwọ”?

16 Ọ dị mkpa ka usuu ndị agha ahụ nwee ngwá agha ha ga-eji buo agha. Leekwa nnọọ ụzọ dị ebube Jehova siworo nye nke a! Jọn kọwara ya, sị: “N’ihi na ike ịnyịnya ahụ dị n’ọnụ ha, dịkwa n’ọdụdụ ha: n’ihi na ọdụdụ ha yiri agwọ, nweekwa isi; ha weerekwa ha na-emejọ.” (Mkpughe 9:19) Jehova ahọpụtawo ndị ozi ya raara onwe ha nye, ndị mekwara baptism, maka nke a. O ziwo ha ụzọ e si ekwusa okwu ya site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na nzukọ na ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ ọgbakọ na-enwe, ka ha wee nwee ike iji nkwuwa okwu kwuo okwu, na-enwe ‘ire nke ndị e ziworo ihe.’ O tinyewo okwu ya n’ọnụ ha wee zipụ ha ije kpọsaa ihe ndị o kpere n’ikpe ‘n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ (2 Timoti 4:2; Aịsaịa 50:4; 61:2; Jeremaịa 1:9, 10; Ọrụ 20:20) N’ikwekọ n’ihe “ọdụdụ ha” nọchiri anya ya, òtù Jọn na oké ìgwè mmadụ ahụ ahapụworo ndị mmadụ ozi na-agba agba dị ka akpị ndị dị n’ọtụtụ puku nde Bible, akwụkwọ ukwu, akwụkwọ nta, na magazin ndị e kesaworo n’ọtụtụ afọ ndị gara aga. Nye ndị iro ha, bụ́ ndị na-ahụta ‘mmejọ’ nke si n’aka Jehova na-abịa, usuu ndị agha nke a yiri nnọọ miriad ụzọ miriad abụọ.—Tụlee Joel 2:4-6.

17. Ndịàmà Jehova hà na-ekere òkè ọ bụla ná mgbagharị nke usuu ndị agha ahụ ná mba ebe ndị a na-apụghị ikesa akwụkwọ n’ihi na a machibidoro ọrụ ahụ iwu? Kọwaa.

17 Ihe mejupụtara otu akụkụ nwere oké ịnụ ọkụ n’obi n’ime usuu ndị agha nke a bụ ụmụnna ndị nọ n’ala ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu. Dị ka atụrụ n’etiti agụ, ndị a aghaghị ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ, ndị na-adịghịkwa aghụghọ dị ka nduru.” N’irubere Jehova isi, ha apụghị ịkwụsị ikwu okwu banyere ihe ndị ha hụworo, nụkwa. (Matiu 10:16; Ọrụ 4:19, 20; 5:28, 29, 32) Ebe ọ bụ na ha enweghị ọtụtụ akwụkwọ e biri ebi ha ga-ekesa, ànyị ga-ekpebi na ha adịghị ekere òkè ọ bụla ná mgbagharị nke usuu ndị agha ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ha nwere ọnụ ha na ikike sitere n’aka Jehova iji ha mee ihe ikwupụta eziokwu nke Bible. Ha na-emekwa nke a, n’ụzọ ndị a na-ebughị ụzọ mee ndokwa ha, nakwa n’ụzọ ndị na-eme ka e kwere, na-amalite ọmụmụ Bible dị iche iche, “na-eme ọha mmadụ ka ha ghọọ ndị ezi omume.” (Daniel 12:3) Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị eji ọdụdụ ha gbaa agba n’echiche nke ịhapụrụ ụmụ mmadụ akwụkwọ dị iche iche, n’ụzọ ihe atụ, ọkụ, anwụrụ ọkụ, na brimstone na-esi n’ọnụ ha ekupụta mgbe ha na-eji akọ na ezi uche na-agba àmà banyere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova nke na-abịa nso.

18. N’asụsụ ole nakwa ruo ọnụ ọgụgụ hà aṅaa ka usuu ndị agha nke a kesaworo ozi ahụ na-eweta ihe otiti n’ụdị nke akwụkwọ e biri ebi?

18 N’ebe ndị ọzọ, akwụkwọ Alaeze dị iche iche nọgidere na-ekpughe ozizi na ụzọ ndị Babilọn nile nke Krisendọm, na-ewetara ya mmejọ kwesịịrị ya n’ụzọ ihe atụ. Site n’iji ụzọ obibi akwụkwọ ndị ọgbara ọhụrụ eme ihe, usuu ndị agha nke a bara ụba enwewo ike ikesa n’ime afọ 68 ndị bu afọ 2005 ụzọ, n’ihe karịrị asụsụ 450 ndị dị n’ụwa, ọtụtụ nde Bible, akwụkwọ, magazin, broshuọ—ndị karịrị ọnụ ọgụgụ efu nke miriad ụzọ miriad abụọ. Lee nnọọ oké ọgbụgba ọdụdụ ndị ahụ gbaworo ụmụ mmadụ!

19, 20. (a) Ọ bụ ezie na ebe ozi ihe otiti ahụ lekwasịrị anya kpọmkwem bụ Krisendọm, n’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ n’ime mba ndị na-abụghị Krisendọm siworo meghachi omume? (b) Olee otú Jọn si kọwaa mmeghachi omume nke ndị mmadụ n’ozuzu ha?

19 Nzube Jehova bụ na ozi ihe otiti nke a ‘ga-egbu otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmadụ.’ N’ihi ya, ebe e lekwasịrị anya kpọmkwem bụ na Krisendọm. Ma o ruworo mba ndị gabigara ókèala nke Krisendọm, gụnyere ọtụtụ mba ebe a maara ihu abụọ nke okpukpe Krisendọm nile nke ọma. Ndị bi ná mba ndị a hà abịawo Jehova nso n’ihi ịhụ ihe otiti na-abịakwasị òtù okpukpe nke a rụrụ arụ? Ọtụtụ n’ime ha emewo otú ahụ! E nwewo nzaghachi dị mma n’etiti ndị dị umeala n’obi, ndị nwekwara ịhụnanya, bụ́ ndị bi n’ebe ndị na-anọghị kpọmkwem n’okpuru ikike Krisendọm. Ma n’ihe banyere ndị mmadụ n’ozuzu ha, Jọn kọwara ihe ga-abụ mmeghachi omume ha, sị: “Ma ndị fọdụrụ n’etiti mmadụ, ndị a na-egbughị n’ihe otiti ndị a, echegharịghị isi n’ọrụ nile nke aka ha pụta, ka ha wee ghara ịkpọ isiala nye ndị mmụọ ọjọọ, ha na arụsị ha nke ọlaedo, na nke ọlaọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke na-apụghị ile ihe anya, ma ọ bụ ịnụ ihe, ma ọ bụ ije ije: ha echegharịghịkwa isi n’igbu mmadụ ha, ma ọ bụ n’ịgwọ nsí ha, ma ọ bụ n’ịkwa iko ha, ma ọ bụ n’izu ohi ha, pụta.” (Mkpughe 9:20, 21) A gajeghị inwe ntọghata nke ụwa dum nye ndị dị otú ahụ na-enweghị nchegharị. Ndị nile nọgidere n’ụzọ mmebi iwu ha nile aghaghị iche ikpe ọmụma sitere n’aka Jehova ihu n’oké ụbọchị ahụ nke ịbọ ọ́bọ̀ ya. Ma “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”—Joel 2:32; Abụ Ọma 145:20; Ọrụ 2:20, 21.

20 Ihe anyị ka tụlesịrị ugbu a bụ akụkụ nke ahụhụ nke abụọ ahụ. E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ gaje ịbịa tupu ahụhụ nke a agwụsịa, dị ka anyị ga-ahụ n’isiakwụkwọ ndị na-eso.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ Commentary on Revelation nke Henry Barclay Swete dere, kwuru banyere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ ‘miriad ụzọ miriad abụọ,’ sị: “Ọnụ ọgụgụ ndị a bara ụba nke ukwuu na-egbochi anyị ịchọ mmezu nkịtị, nkọwa sochiri ya na-akwadokwa nkwubi okwu nke a.”

b Lee peji nke 119-126 ndị bu ụzọ; leekwa Vindication, Akwụkwọ nke Atọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1932, peji nke 83-84.

c N’adịghị ka igurube ndị ahụ, usuu ndị agha ahụ nke Jọn hụrụ ekpughị “ihe dị ka okpueze yiri ọlaedo.” (Mkpughe 9:7) Nke a kwekọrọ n’eziokwu ahụ bụ na oké ìgwè mmadụ ahụ, ndị mejupụtara akụkụ ka ukwuu nke usuu ndị agha ahụ taa, enweghị olileanya ịchị achị n’Alaeze eluigwe Chineke.

[Foto dị na peeji nke 149]

Ọfụfụ nke opi nke isii ahụ na-ewebata ihe otiti nke abụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 150, 151]

Ndị mmụọ ozi anọ ahụ na-eduzi mgbagharị usuu ndị agha kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme

[Foto ndị dị na peeji nke 153]

Usuu ndị agha ahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ ekesawo ọtụtụ ijeri akwụkwọ ndị e ji amụ Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 154]

Ihe fọrọ n’ụmụ mmadụ echegharịghị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya