Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • 18, 19. Gịnị mere Jona n’ala ala oké osimiri ahụ, ònye kpatara ihe niile ahụ merenụ, oleekwa ụdị anụ loro ya? (Gụọ ihe e dere n’ala ala.)

      18 Ma, cheregodị! O nwere nnukwu ihe dị ndụ na-abịa ya nso. Ihe ahụ dị oji, o jikwa ike gaa n’ebe Jona nọ, meghee nnukwu ọnụ ya ma kpụrụ ya loo.

      Ebe Jona mikpuru n’ime oké osimiri ka otu nnukwu azụ̀ na-abịa ya nso

      Jehova mere “ka otu nnukwu azụ̀ loo” Jona

      19 Jona chere na ọnwụ ya eruola. Ma, e nwere ihe dị ịtụnanya ọ chọpụtara. Ọ chọpụtara na ya ka dị ndụ. Ihe ahụ loro ya atapịaghị ya ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị iku ume. Jona agbarighịkwa n’ime afọ ya. Kama nke ahụ, Jona ka na-eku ume, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ebe kwesịrị ịbụ ili ya. Akpata oyi bịaziri wụọ Jona n’ahụ́. O doro Jona anya na ọ bụ Chineke ya, bụ́ Jehova, mere “ka otu nnukwu azụ̀ loo” ya.c—Jona 1:17.

      20. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta banyere Jona n’ekpere ahụ ọ nọ n’afọ azụ̀ kpee?

      20 Jona nọrọ ọtụtụ awa n’afọ azụ̀ ahụ. Ọ nọ n’ebe ahụ gbara oké ọchịchịrị chee echiche nke ọma ma kpegara Jehova Chineke ekpere. O nwere ihe ndị anyị ga-amụta banyere Jona n’ekpere ahụ o kpere nke e dere n’isi nke abụọ nke akwụkwọ Jona. Ekpere ahụ gosiri na Jona ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma n’ihi na ọtụtụ ugboro, o kwuru ihe ndị e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma. O gosikwara na Jona nwere otu àgwà mara mma, ya bụ, na ọ naghị echefu ikele Chineke maka ihe ọma o meere ya. Otú Jona si mechie ekpere ya bụ: “Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà. M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa. Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”—Jona 2:9.

      21. Gịnị ka Jona mụtara banyere nzọpụta, oleekwa ihe ndị anyị na-ekwesịghị ichefu?

      21 Jona nọ “n’afọ azụ̀ ahụ” mụta na Jehova nwere ike ịzọpụta onye ọ bụla ọ chọrọ ịzọpụta n’oge ọ bụla ọ chọrọ, n’agbanyeghị ebe onye ahụ nọ. Jehova gbataara ya ọsọ enyemaka ma zọpụta ya n’ebe ahụ ọ nọ. (Jona 1:17) Ọ bụ naanị Jehova nwere ike ime ka mmadụ dịrị ndụ n’afọ azụ̀ ruo ụbọchị atọ, ehihie na abalị, n’enweghị ihe ọ bụla mere ya. Taa, ọ dị mma ka anyị cheta na ọ bụ Jehova bụ ‘Chineke onye ume ndụ anyị dị n’aka.’ (Dan. 5:23) Ọ bụ ya nwe ume anyị na-eku na ndụ anyị dị. Ànyị na-ekele ya maka ihe ndị a? Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime ka anyị na-erubere Jehova isi?

      22, 23. (a) Olee ihe Jehova gwara Jona nke ga-egosi ma obi ọ̀ dị ya ụtọ maka ihe ndị Jehova meere ya? (b) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jona mgbe anyị mejọrọ ihe?

      22 Jona kwanụ? Ò rubeere Jehova isi ma si otú ahụ kelee ya maka ihe ndị o meere ya? O mere otú ahụ. Mgbe ụbọchị atọ, ehihie na abalị, gachara, azụ̀ ahụ buuru Jona pụta n’ikpere mmiri ma ‘gbọpụta ya n’ala akọrọ.’ (Jona 2:10) Ị̀ hụrụ na n’agbanyeghị ihe a niile merenụ, Jona ejighị aka ya gwuru mmiri pụta? Ma, ọ bụ ya ga-eji aka ya si n’ikpere mmiri ahụ gawa ebe ọ chọrọ ịga. O teghị aka, oge ruru ka Jona gosi ma ọ̀ ga-eji obi ya dum kelee Chineke maka ihe ndị o meere ya. Jona 3:1, 2, sịrị: “Okwu Jehova wee ruo Jona ntị nke ugboro abụọ, sị: ‘Bilie, gaa Ninive bụ́ obodo ukwu, kwusaara ya okwu m na-agwa gị.’” Olee ihe Jona ga-eme?

  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ṅomie Okwukwe Ha
    • c N’asụsụ Grik, ihe a na-akpọ okwu Hibru a sụgharịrị “azụ̀” bụ “nnukwu anụ mmiri” ma ọ bụ “azụ̀ buru ibu.” Ọ bụ eziokwu na e nweghị otú a ga-esi amata ụdị anụ mmiri loro Jona, a chọpụtala na n’Oké Osimiri Mediterenian, e nwere azụ̀ shak ndị buru oké ibu nke na ha nwere ike ilo mmadụ. E nwekwara azụ̀ shak ndị ka ndị nke ahụ n’ebe ndị ọzọ. Azụ̀ shak a na-akpọ weel nwere ike iru mita iri na ise n’ogologo ma ọ bụkwanụ karịa.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya