Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jd isi 12 p. 152-164
  • “Na-atụ Anya Ya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-atụ Anya Ya”
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ “NA-ATỤ ANYA YA” MA ‘DỊRỊ NJIKERE’
  • Ị̀ “NA-ATỤ ANYA YA” KA ‘AFỌ Ò JURU GỊ’?
  • NWEE ATỤMANYA NWERE EZI IHE NDABERE KA Ị NA-EBI NDỤ
  • Na-atụ Anya Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ụbọchị Jehova—Okwu Dị Oké Mkpa
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Ndị Amụma Ozi Ha Pụrụ Imetụta Anyị
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • “Cherenụ M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
jd isi 12 p. 152-164

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

“Na-atụ Anya Ya”

1, 2. (a) Olee ajụjụ ndị ị pụrụ ịjụ onwe gị? (b) Olee ọnọdụ dị mgbe ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ dịrị ndụ, oleekwa otú Maịka si lee ihe anya?

AFỌ ole ka ị nọworo na-eche ka ụbọchị Jehova bịa ma wepụ ihe ọjọọ niile dị n’ụwa a? Afọ ole ka ị dị njikere ichere ya? Ka ọ dịgodị, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà gị, oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta otú i si ebi ndụ? O doro anya na ihe ị ga-aza ga-adị iche n’ihe ndị na-aga chọọchị ga-aza, bụ́ ndị na-ebi ndụ otú masịrị ha, na-atụ anya ịga eluigwe.

2 Ka ị na-echere oké ụbọchị ahụ, akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere pụrụ inyere gị aka nke ukwuu. Ọtụtụ n’ime ndị amụma ahụ dịrị ndụ mgbe Chineke na-achọ imezu ihe o kpere n’ikpe. Dị ka ihe atụ, Maịka jere ozi mgbe oge ndị Asiria ga-enye Sameria ntaramahụhụ n’afọ 740 T.O.A. na-eru nso. (Lee igbe dị na peeji nke 20 na nke 21, bụ́ ebe e depụtara oge dị iche iche.) Ka oge na-aga, ụbọchị Jehova bịakwasịrị Juda, ọ dịghị ihe gbochiri ya. Ebe ọ bụ na Maịka amaghị mgbe Chineke ga-eme nke a kpọmkwem, ò kpebiri ịnọrọ na-ele naanị n’anya, na-atụ anya na Chineke ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya? Maịka kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova. M ga-echere Chineke nke nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.” (Maịka 7:7) Ebe obi siri Maịka ike banyere ihe na-abịanụ, ọ nọ dị ka onye nche mụ anya nke nọ n’ụlọ elu.—2 Samuel 18:24-27; Maịka 1:3, 4.

Ihe Osise dị na peeji nke 153

Zefanaya

3. Mgbe mbibi Jeruselem dị nso, olee otú Habakọk na Zefanaya si lee ihe anya?

3 Ugbu a, chọta ebe aha Zefanaya na Habakọk dị n’ebe ahụ e depụtara oge dị iche iche. Buru n’obi na mmadụ abụọ a jere ozi mgbe mbibi Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. dị nso. Ka o sina dị, ha amaghị kpọmkwem ma mgbe Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe ọ̀ dịwo nso ka ọ̀ ka fọrọ ọtụtụ iri afọ. (Habakọk 1:2; Zefanaya 1:7, 14-18) Zefanaya dere, sị: “‘Cherenụ m,’ ka Jehova kwuru, ‘ruo ụbọchị m ga-ebili ịkwakọrọ ihe, n’ihi na mkpebi m bụ . . . [ịwụkwasị] ha ọnụma m, bụ́ oké iwe m niile.’” (Zefanaya 3:8) Olee banyere Habakọk, bụ́ onye dịrị ndụ obere oge ka Zefanaya nwụsịrị? Habakọk dere, sị: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka, o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakọk 2:3.

4. Olee ihe ndị na-eme n’oge Zefanaya na Habakọk buru amụma, oleekwa otú ha si lee ihe anya?

4 Ọnọdụ e nwere n’oge e kwuru ihe ahụ e dere na Zefanaya 3:8 na Habakọk 2:3 na-ekpughere anyị ihe dị ukwuu. N’oge ndị Juu ụfọdụ nọ na-asị, “Jehova agaghị eme ihe ọma, ọ gaghịkwa eme ihe ọjọọ,” Zefanaya kwusara banyere “ụbọchị iwe Jehova.” N’ụbọchị ahụ, Chineke ga-eweso ma mba ndị bụ́ ndị iro ma ndị Juu na-enupụ isi iwe. (Zefanaya 1:4, 12; 2:2, 4, 13; 3:3, 4) Ì chere na Zefanaya tụrụ ikpe ọmụma na iwe Chineke egwu? Kama ịtụ egwu, o kwesịrị ịdị “na-atụ anya ya.” Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Habakọk kwanụ?’ Ya onwe ya kwa kwesịrị ịdị “na-atụ anya ya.” Ihe i kwuru ziri ezi ma ọ bụrụ na i kwubie na Zefanaya na Habakọk ewereghị ihe ahụ na-abịa dị ka obere ihe. Ha ebighịkwa ndụ dị ka à ga-asị na ihe niile ga-adịgide otú ha dị. (Habakọk 3:16; 2 Pita 3:4) Dị ka e kwuru, otu isi ihe ndị amụma abụọ a na-aghaghị ime bụ na ha abụọ ga “na-atụ anya ya.” Ị makwaara na ihe ndị amụma abụọ a tụrụ anya ya mezuru n’afọ 607 T.O.A. Ya mere, otú ha si ‘tụọ anya’ ụbọchị Jehova ghọrọ ihe amamihe dị na ya.

Ihe Osise dị na peeji nke 154

“‘Cherenụ m,’ ka Jehova kwuru.”—Zefanaya 3:8

5, 6. Olee àgwà anyị kwesịrị inwe ebe anyị maara oge anyị nọ na ya ugbu a n’ihe banyere mmezu nke nzube Chineke?

5 Ị pụkwara ijide n’aka na “ụbọchị iwe Jehova,” bụ́ mgbe ọ ga-eweso usoro ihe dị ugbu a iwe, ga-abịa; ọ ga-emezu, ọ ga-abịarịrị ma bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi. O doro anya na ọ dịghị eme gị obi abụọ. Dịkwa ka Zefanaya na Habakọk, ị maghị mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa kpọmkwem. (Mak 13:32) Ma ọ ga-abịarịrị. Mmezu nke amụma dị iche iche nke Baịbụl n’oge anyị a bụ́ ihe àmà siri ike na ọ ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Ya mere, ihe Jehova gwasiri ndị amụma ahụ ike metụtara gị—“Na-atụ anya ya.” Chetakwa eziokwu a na-enweghị mgbagha: Ọ bụ naanị Chineke anyị bụ Chineke “na-emere onye na-atụ anya [ya] ihe.”—Aịzaya 64:4.

6 Ị pụrụ inwe àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ị na-atụ anya ihe, ya bụ, igosi site n’ihe ị na-eme na i nwere obi ike na “ụbọchị iwe Jehova” ga-abịa kpọmkwem n’oge ya. Ikwenyesi ike na ọ ga-abịa na ime ihe kwesịrị ekwesị ndị kwekọrọ na nkwenye ahụ siri ike i nwere kwekọrọ nnọọ n’ihe Jizọs kwuru. Ọ gbara ndịozi na Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ume, sị: “Keenụ ájị̀ n’úkwù, ka oriọna unu na-enwukwa enwu, unu onwe unu, dịrịnụ ka ndị na-echere nna ha ukwu . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị ohu ahụ bụ́ ndị nna ha ukwu lọtara wee hụ na ha na-eche nche! N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-eke onwe ya ihe okike ma mee ka ha nọdụ ala iri ihe na tebụl, ọ ga-abịarukwa nso wee jeere ha ozi.” (Luk 12:35-37) Ee, mmadụ inwe àgwà kwesịrị ekwesị wee na-echere na-egosi na o nwere obi ike na oké ụbọchị Jehova agaghị eji otu ntabi anya gafee oge o zubere na ọ ga-abịa.

NDỊ “NA-ATỤ ANYA YA” MA ‘DỊRỊ NJIKERE’

7, 8. (a) Gịnị ka ndidi Chineke rụpụtaworo? (b) Olee àgwà Pita na-agba anyị ume ka anyị nwee?

7 Ndị ohu Chineke n’oge a nọ na-atụ anya tupu e guzobe Alaeze Chineke n’eluigwe n’afọ 1914, ha anọwokwa na-atụ anya kemgbe ahụ. Ha anọghị nkịtị ka ha nọ na-atụ anya. Kama nke ahụ, ha na-arụsi ọrụ ịgba àmà Chineke nyere ha ike. (Ọrụ 1:8) Cheedị echiche: A sị na oké ụbọchị Jehova bịara n’afọ 1914, gịnị gaara abụ ọnọdụ gị? A sịgodị na ọ bịara afọ iri anọ gara aga, ị̀ bụ onye nwere “àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke” mgbe ahụ? (2 Pita 3:11) Oleekwanụ maka ndị ezinụlọ gị bụ́ Ndịàmà ma ọ bụkwanụ ndị bụ́ ezigbo ndị enyi gị n’ọgbakọ? O doro anya na oge a anyị nọ na-atụ anya ụbọchị Jehova emegheworo gị na ọtụtụ ndị ọzọ dị ka gị ụzọ nzọpụta, dị ka 2 Pita 3:9 gosiri. Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova ebibighị ajọ usoro ihe a niile ozugbo e guzobere Alaeze ahụ enyewo ọtụtụ ndị ohere ichegharị, dịkwa nnọọ ka ndị Ninive chegharịrị, e wee hapụ ibibi ha. Anyị niile nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwuo ihe ahụ Pita onyeozi kwuru: “Na-agụkwanụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.” (2 Pita 3:15) Oge a anyị nọ na ya ugbu a ka na-enyekwa ndị mmadụ ohere ichegharị ma ọ bụ ịgbanwe otú ha si ebi ndụ nakwa otú ha si eche echiche.

8 N’ezie, Onye Kraịst pụrụ icheta ọnọdụ dị n’oge Maịka, Zefanaya, na Habakọk ma were ya na ọ gbasaghị ya. Ọ pụrụ ikwu, sị, “A sị ka e kwuwe, ọ dịla anya ihe ndị a mere!” Ma olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta na ha? Anyị ekwuola ndụmọdụ Pita nyere banyere mkpa ọ dị ka Ndị Kraịst bụrụ ndị nwere “àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.” Ozugbo Pita kwusịrị ihe ndị ahụ, o kwusiri okwu ike banyere ihe ọzọ dị mkpa, ya bụ, mkpa ọ dị ka anyị “na-echere ma na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:11, 12) N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘iburu ụbọchị ahụ n’uche’ ma “na-atụ anya ya.”

9. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị ‘na-ele anya Jehova’?

9 Ma ànyị ejeworo Jehova ozi naanị afọ ole na ole ma ọ bụ ruo ọtụtụ iri afọ, ànyị ka ‘na-ele anya Jehova ma na-echere’ dị ka Maịka mere? (Ndị Rom 13:11) N’ezie, dị ka mmadụ, ọ pụrụ ịdị na-agụ anyị agụụ ịma oge ọgwụgwụ ga-abịa nakwa oge fọdụrụ tupu ya abịa. Ma, ọ dịghị otú anyị ga-esi ama. Cheta ihe Jizọs kwuru: “A sị na onyeisi ezinụlọ maara oge nche nke onye ohi ji abịa, ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka a waba n’ụlọ ya. N’ihi nke a, unu onwe unu kwa, dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:43, 44.

10. Olee ihe ị mụtara n’otú Jọn onyeozi si bie ndụ nakwa n’otú o si lee ihe anya?

10 Ihe Jizọs kwuru yiri ihe Maịka, Zefanaya, na Habakọk dere. Ma, ihe Jizọs kwuru abụghị maka ndị oge ochie, kama ọ bụ maka ndị na-eso ụzọ ya, maka anyị. Ọtụtụ Ndị Kraịst dị uchu etinyewo ndụmọdụ ahụ Jizọs nyere n’ọrụ n’ezie; ha egosiwo na ha ‘dị njikere,’ ha na-atụ anya. Jọn onyeozi setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya. Ọ bụ otu n’ime mmadụ anọ nọ n’elu Ugwu Oliv bụ́ ndị jụrụ Jizọs banyere ọgwụgwụ usoro ihe dị mgbe ahụ. (Matiu 24:3; Mak 13:3, 4) Nke ahụ mere n’afọ 33 O.A., ma e nweghị ihe ọ bụla Jọn pụrụ ile anya wee mata kpọmkwem oge ihe niile ga-eme. Ugbu a, weregodị ya na ihe dị ka afọ iri isii agafeela. Jọn emeela agadi, ma ike agwụbeghị ya. Ọ kwụsịbeghịkwa ịtụ anya. Kama nke ahụ, mgbe Jọn nụrụ ka Jizọs kwuru, sị: “Ee; ana m abịa ọsọ ọsọ,” ọ zara, sị: “Amen! Bịa, Onyenwe anyị Jizọs.” Jọn akwaghị arịrị maka otú o si bie ndụ. O kwenyesiri ike na mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe na Ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị. (Mkpughe 22:12, 20) Mgbe ọ bụla ọ sọkwara ikpe ahụ bịa, Jọn chọrọ ịdị “njikere,” dị ka Onyenwe anyị Jizọs dụrụ n’ọdụ. Gị onwe gị kwa ị̀ chọrọ ịdị njikere otú ahụ?

Ị̀ “NA-ATỤ ANYA YA” KA ‘AFỌ Ò JURU GỊ’?

11. Olee otú ndị dịrị ndụ n’oge Maịka na Hosia si dị iche ná ndị ikom abụọ a?

11 Tụlee ihe ọzọ anyị mụtara n’aka ndị amụma ahụ dịrị ndụ n’oge Jehova na-aga imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi Izrel nakwa n’isi Juda mgbe e mesịrị. Ọ bụ ezie na Maịka ‘na-ele anya Jehova, ma na-echere ya,’ ọtụtụ ndị gbara ya gburugburu adịghị eme otú ahụ. Ha ghọrọ ndị “kpọrọ ihe ọma asị ma hụ ihe ọjọọ n’anya.” Maịka dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ha agbanweghị, ha pụrụ ‘ịkpọku Jehova maka enyemaka, ma ọ gaghị aza ha.’ (Maịka 3:2, 4; 7:7) Hosia, bụ́ onye ya na Maịka dịkọrọ ndụ, ji okwu ndị metụtara ịkọ ugbo gbaa alaeze ebe ugwu Izrel ume, sị: “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume; jirinụ obiọma ghọọ mkpụrụ. Kọọnụ ala ubi unu, mgbe oge ka dị ịchọ Jehova.” N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ egeghị ntị. Ha ‘kọrọ ihe ọjọọ dị ka ubi.’ Ya mere, ọ bụ ajọ omume ka ha ghọọrọ. (Hosia 10:12, 13) Ha gbachiri nkịtị n’omume rụrụ arụ ma ọ bụ soro na-eme ya. Ha ‘tụkwasịrị ụzọ ha obi’ kama ịtụkwasị obi n’ụzọ Jehova. Ụfọdụ ndị taa pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘Olee otú ndị na-efe ezi ofufe bi kpọmkwem n’Ala Nkwa ahụ ga-esi mee otú a?’ Hosia gosiri na isi ihe kpatara nsogbu ha nwere bụ otu àgwà nke yiri àgwà ọ dị mkpa ka anyị zere ma ọ bụrụ na anyị ga na-atụ anya oké ụbọchị Jehova. Ya bụ, ịtụsara ahụ́ n’otú anyị si ebi ndụ na ịbụ ndị “afọ juru.”

12. (a) Olee omume na-ekwesịghị ekwesị ụmụ Izrel mere nke Hosia kwuru banyere ya tupu afọ 740 T.O.A? (b) Olee ụzọ ndị mmadụ si gosi na ha bụ ndị “afọ juru”?

12 Mgbe ndị Chineke banyesịrị n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ihe gaziiri ha nnọọ agazi. Olee ihe ha mere? Hosia kwuru ihe Jehova kwuru: “Mgbe ha tara nri n’ebe ịta nri ha, afọ juru ha. Ha rijuru afọ, obi ha wee fụlie ha elu. Ọ bụ ya mere ha ji chefuo m.” (Hosia 13:6) Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Chineke dọrọ ndị ya aka ná ntị na ihe dị otú ahụ ga-eme. (Diuterọnọmi 8:11-14; 32:15) N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge Hosia na Emọs, ndị Izrel mere omume ọjọọ ahụ—“ha rijuru afọ.” Emọs kọwara kpọmkwem ihe mere. O kwuru na ọtụtụ n’ime ha ji ihe ndị dara oké ọnụ chọọ ụlọ ha mma. Ezinụlọ ụfọdụ nwere ọbụna ụlọ abụọ. Ha na-eri nri kasị mma, jiri iko pụrụ iche na-aṅụ mmanya dị mma, na-etekwa “mmanụ kasị mma,” ikekwe ude na-esi ísì ụtọ. (Emọs 3:12, 15; 6:4-6) Ma eleghị anya, ị maara na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ a na-eme ná ndụ nke dị njọ n’onwe ha. Ma o doro anya na iji ha kpọrọ ihe gabiga ókè ezighị ezi.

13. Olee otu omume ọjọọ ụmụ Izrel na-eme, ma ndị bara ọgaranya ma ndị na-abaghị?

13 N’ezie, ọ bụghị ndị niile nọ n’alaeze ebe ugwu ghọrọ ndị ihe na-agaziri na ndị “afọ juru.” Ụfọdụ dara ogbenye ma na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji kpata ihe e ji ebi ndụ na ihe ha ga-eji zụọ ezinụlọ ha. (Emọs 2:6; 4:1; 8:4-6) Otú ahụ ka ọ dị taa n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ndụmọdụ ahụ Chineke nyere, nke dị na Hosia 13:6, ò metụtara ọbụna ndị ogbenye nọ n’Izrel oge ochie, ò metụtakwara ndị dị ndụ taa? Ee! Jehova na-egosi na ma onye na-efe ya ezi ofufe ọ̀ bara ọgaranya ma ọ bụ na ọ baghị, ọ dị mkpa ka ọ nọrọ na nche ka uche ya niile ghara ịdị n’ihe onwunwe nke ndụ nke na ọ ‘ga-echefu Chineke.’—Luk 12:22-30.

14. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị chebara otú anyị si atụ anya ụbọchị Jehova echiche?

14 Ọ bụrụ na anyị eleghachi anya azụ, ebe ọtụtụ n’ime amụma e buru na Baịbụl mezuwokwara, anyị nwekwuru ihe ndị mere anyị ga-eji nọrọ na nche, dịrị njikere, ma na-atụ anya. Ọ́ bụrụkwanụ na anyị anọwo na-atụ anya ruo oge ụfọdụ, ikekwe ruo ọtụtụ iri afọ? N’oge gara aga, anyị tinyere mgbalị n’ozi ma mee mkpebi ndị gosiri na anyị kwenyesiri ike na ụbọchị Jehova dị nso. Ma, ọ bịabeghị. Ànyị ka nọ na-atụ anya ya? Ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘M̀ ka na-atụsi anya ya ike, ka m̀ jụọla nnọọ oyi?’—Mkpughe 2:4.

15. Olee ihe na-egosi na anyị anaghịzi atụsi anya ike?

15 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta otú anyị si atụ anya ya. Ma, ka anyị chọpụta site n’ịtụle ihe Emọs kwuru mgbe ọ na-akọwa ndị dịrị ndụ n’oge ya, bụ́ ndị “rijuru afọ.” Ka anyị na-enyocha nke ahụ, anyị pụrụ ịtụle ma ọ̀ dị otú anyị si eme ka ndị “rijuru afọ.” Onye Kraịst nke na-egosibu site n’omume ya nakwa n’otú o si eche echiche na ọ na-atụ anya ụbọchị Jehova pụrụ ịgbalịwa ka o nwee ụlọ ma ọ bụ ụgbọala ndị oké ozu, ụdị uwe kasị ọhụrụ, ihe ntecha na ọla dara oké ọnụ, ma ọ bụ mmanya na ihe oriri bụ́ ịgba. Ọ dịghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru ka anyị na-anapụ onwe anyị ihe ndị na-enye obi ụtọ. Onye na-arụsi ọrụ ike kwesịrị ịdị “na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile.” (Eklisiastis 3:13) Otú ọ dị, Onye Kraịst nwere ike ịdaba n’ihe ize ndụ nke itinyekwu uche ná nri, ihe ọṅụṅụ, nakwa n’otú ọ dị. (1 Pita 3:3) Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị e tere mmanụ n’Eshia Maịnọ wepụrụ uche ha n’ebe ọ dịbu. Nke ahụ gosiri na ọ pụrụ ime Ndị Kraịst. (Mkpughe 3:14-17) Ụdị ihe ahụ ò meela anyị? Ànyị aghọọla ndị ‘afọ juru,’ ikekwe, na-etinyebiga uche ókè n’ihe onwunwe? Ànyị akwụsịwo ịtụ anya ya?—Ndị Rom 8:5-8.

16. Gịnị mere na ọ gaghị abara ụmụ anyị uru ịgba ha ume ka ha gbalịa ibi ndụ dị ka ndị “afọ juru”?

16 Anyị pụrụ igosi na anyị anaghịzi atụ anya oké ụbọchị Jehova site n’ụdị ndụmọdụ anyị na-enye ụmụ anyị na ndị ọzọ. Onye Kraịst pụrụ ịdị na-eche, sị: ‘Ekpebiri m ịhapụ ịgụ akwụkwọ ma ọ bụ ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ihi na m chere na ọgwụgwụ dị nso. Ugbu a, achọrọ m ịhụ na ụmụ m nwetara ọzụzụ ga-enyere ha aka ibi ndụ dị mma.’ Ikekwe, ụfọdụ ndị nwere ụdị echiche ahụ n’oge Hosia. Ọ bụrụ otú ahụ, inye ụmụ ha ndụmọdụ nke lekwasịrị anya n’ibi ndụ dị ka ndị ‘afọ juru’ ọ̀ ga-abara ụmụ ha uru? A sị na ụmụaka ndị dịrị ndụ n’oge ahụ gbawara mbọ ka ha bie ndụ ntụsara ahụ́ ma ọ bụ nke ndị “afọ juru,” gịnị gaara eme ha n’afọ 740 T.O.A., mgbe ndị Asiria bibiri Sameria?—Hosia 13:16; Zefanaya 1:12, 13.

Ihe Osise ndị dị na peeji nke 160

Olee ụdị ndụ ị na-agba ụmụ gị ume ka ha chụsoo?

NWEE ATỤMANYA NWERE EZI IHE NDABERE KA Ị NA-EBI NDỤ

17. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị isi ṅomie Maịka?

17 Dị ka ndị fere Jehova ezi ofufe n’oge ochie, anyị kwesịrị inwe obi ike na Chineke ga-emezu nkwa o kwere n’oge ya. (Jọshụa 23:14) Maịka onye amụma gosipụtara amamihe site n’ichere Chineke nke nzọpụta ya. Ebe anyị pụrụ ileghachi anya azụ n’ihe mere eme, anyị pụrụ ile anya n’oge Maịka dịrị ndụ ma hụ otú oge ọ dịrị ndụ si dị nso n’oge e bibiri Sameria. Olee banyere anyị na oge anyị bi na ya? Mgbe anyị leghachiri anya azụ ná ndụ anyị, ọ̀ ga-edo anya na anyị mere mkpebi ndị amamihe dị na ha, dị ka n’ihe banyere ọrụ ego anyị, ụzọ anyị si ebi ndụ nakwa ozi oge niile? N’eziokwu, anyị amaghị “ụbọchị ahụ na oge awa ahụ.” (Matiu 24:36-42) Otú ọ dị, o doro anya na anyị na-eme ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị echiche ahụ Maịka nwere ma na-eme ihe kwekọrọ na ya. Mgbe a ga-eji ndụ n’ime paradaịs elu ala e weghachiri eweghachi kwụọ Maịka ụgwọ, lee obi ụtọ ọ ga-enwe ịmata na ozi amụma ya na ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi o setịpụrụ baara anyị uru! Mgbe ahụ, anyị ga-aghọ ihe àmà nke na-egosi n’ezie na Jehova bụ Chineke nke nzọpụta!

18, 19. (a) Olee ọdachi na-abịa nke Obedaya kwuru maka ya? (b) Olee otú Obedaya si mee ka Izrel nwee olileanya?

18 E nwere ezi ihe mere obi ji sie anyị ike. Dị ka ihe atụ, chegodị echiche banyere akwụkwọ amụma ahụ dị mkpirikpi bụ́ Obedaya. O lekwasịrị anya n’ebe Idọm oge ochie nọ. O kwuru ihe Jehova kpere n’ikpe nke ọ ga-eme ndị ahụ megburu “nwanne” ha, bụ́ Izrel. (Obedaya 12) Mbibi ahụ e buru n’amụma mezuru, dị ka anyị tụlere n’Isi nke Iri n’akwụkwọ a. N’oge Nabonaịdọs, ndị Babịlọn meriri Idọm n’etiti narị afọ nke isii T.O.A., mba Idọm kwụsịkwara ịdị. Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ dị mkpa n’ozi Obedaya, bụ́ nke dị anyị mkpa ka anyị na-atụ anya oké ụbọchị Jehova.

19 Ị ma na mba ahụ bụ́ ndị iro (ya bụ, Babịlọn), bụ́ ndị bibiri Idọm, mezukwara ntaramahụhụ Chineke n’ahụ́ ndị ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi. N’afọ 607 T.O.A., ndị Babịlọn bibiri Jeruselem ma dọrọ ndị Juu n’agha. Ala ahụ wee tọgbọrọ n’efu. Ọ̀ bụ ebe ahụ ka okwu biri? Ee e. Site n’ọnụ Obedaya, Jehova kwuru na ndị Izrel ga-alaghachi biri n’ala ha. Ị pụrụ ịgụ nkwa a na-agba ume n’Obedaya 17: “N’Ugwu Zayọn ka ndị gbapụrụ agbapụ ga-anọ, ọ ga-aghọkwa ihe dị nsọ; ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe dịịrị ha inweta.”

20, 21. N’ihi gịnị ka Obedaya 17 ga-eji kasie anyị obi?

20 Ihe mere eme na-egosi na ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Obedaya mezuru. Chineke kwuru na ọ ga-eme, o mekwara. Ọtụtụ puku ndị e si na Juda na Izrel dọrọ n’agha lọghachitere n’afọ 537 T.O.A. N’ihi ngọzi Jehova, ndị a si ala ọzọ lọta mere ka ala ahụ nke tọgbọrọ n’efu gbanwee wee ghọọ paradaịs mara nnọọ mma. Ị gụwo amụma e buru banyere mgbanwe a dị ebube n’Aịzaya 11:6-9 nakwa 35:1-7. Ihe kasị mkpa bụ na a maliteghachiri ezi ofufe, nke nwere isi ọnọdụ ya n’ụlọ nsọ Jehova ahụ e wughachiri ewughachi. Ya mere, Obedaya 17 pụrụ ịbụrụ anyị ihe àmà ọzọ na-egosi na a pụrụ ịtụkwasị nkwa Jehova obi. Ha na-emezu mgbe niile.

21 Obedaya ji okwu a na-egosi obi ike o nwere mechie amụma ya: “Ọbụbụeze ga-abụkwa nke Jehova.” (Obedaya 21) Ebe ị tụkwasịrị nke a obi, ị na-atụ anya oge ahụ dị ebube mgbe Jehova ga na-achị eluigwe na ụwa site n’aka Jizọs Kraịst, n’enweghị onye ga-ama ya aka. Ma ị̀ nọwo na-atụ anya oké ụbọchị Jehova na ngọzi niile ọ ga-eweta ruo naanị nwa oge ma ọ bụ ruo ọtụtụ iri afọ, ị pụrụ ijide n’aka na atụmanya dị otú ahụ nke dabeere na Baịbụl ga-emezurịrị.

Ihe Osise dị na peeji nke 163

Anyị ji ọṅụ na-ejere Jehova ozi ma na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche

22. Olee ihe mere i ji chọọ ịdị na-ele ihe anya dị ka ihe e dere na Habakọk 2:3 na Maịka 4:5 si dị?

22 Ya mere, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ikwughachi okwu ahụ na-emesi obi ike nke Habakọk kwuru, bụ́ nke metụtara oge anyị a: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka, o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakọk 2:3) Ụbọchị Jehova ga-abịarịrị n’oge ya, ọ bụrụgodị na o yie ka oké ụbọchị Jehova ọ na-egbu oge dị ka mmadụ si ele ihe anya. Jehova kwere anyị nkwa nke ahụ. N’ụzọ dị otú a, ndị jewooro Chineke ozi ruo ọtụtụ afọ nakwa ndị ka malitere ife ya ofufe n’oge na-adịbeghị anya pụrụ iji ụdị obi ike ahụ e kwupụtara na Maịka 4:5 na-aga n’ihu: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.”

IHE NDỊ E KWESỊRỊ ICHEBARA ECHICHE

  • Olee otu ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere otú i si ele ihe anya nke ị mụtara na Maịka 7:7; Habakọk 2:3; na Zefanaya 3:8?

  • N’ihi gịnị ka ndụmọdụ dị na Jems 5:10, 11 ji dị gị mkpa ma baara gị uru?

  • Olee otú ị ga-esi rite uru n’ịtụgharị uche na 2 Pita 3:9, 11, 12, 14?

OLEE OTÚ Ị GA-ESI RITE URU?

  • Ma ị̀ bara ọgaranya ma ị̀ dara ogbenye, olee ihe i kwesịrị ịmụta n’Emọs 3:15; 5:11; nakwa na Hagaị 1:4-7?

  • Gịnị mere ịbụ ndị afọ juru na ịtụ anya ụbọchị Jehova adịghị agakọ?—Habakọk 3:17, 18.

  • Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka ị nọgide na-atụ anya ụbọchị Jehova?—Zefanaya 1:12-15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya