Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 5 p. 18-p. 19 para. 6
  • Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọmụmụ Jisọs—n’Ole Ebe, Ole Mgbekwa?
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ndị Mmụọ Ozi Mere Ka A Mata na A Mụọla Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 5 p. 18-p. 19 para. 6
Mgbe Meri nọ n’elu ịnyịnya ibu, Josef eduru ha na-aga Betlehem

ISI NKE 5

Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?

LUK 2:1-20

  • A MỤRỤ JIZỌS NA BETLEHEM

  • NDỊ ỌZỤZỤ ATỤRỤ ABỊA LETA JIZỌS MGBE A MỤRỤ YA ỌHỤRỤ

Siza Ọgọstọs, eze na-achị Alaeze Ukwu Rom, nyere iwu ka onye ọ bụla gaa deba aha ya n’akwụkwọ. N’ihi ya, Josef na Meri ga-aga deba aha ha n’akwụkwọ n’obodo ha bụ́ Betlehem, nke dị n’ebe ndịda Jeruselem.

Ndị gara Betlehem ideba aha ha n’akwụkwọ hiri nne. Ọ bụ ya mere na naanị ebe Josef na Meri hụrụ ha ga-anọ bụ n’ụlọ anụ, ebe a na-edebe ịnyịnya ibu na anụmanụ ndị ọzọ. Ọ bụkwa ebe ahụ ka a nọ mụọ Jizọs. Mgbe Meri mụchara ya, ọ ji ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.

Ọ ga-abụ Chineke mere ka Siza Ọgọstọs tie iwu a ka onye ọ bụla gaa deba aha ya n’akwụkwọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na iwu a mere ka e nwee ike ịmụ Jizọs na Betlehem, n’obodo nna nna ya bụ́ Eze Devid. Ọ dịla anya Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ n’obodo a ka a ga-amụ Onye Ọchịchị ahụ e kwere ná nkwa.—Maịka 5:2.

Abalị ahụ a mụrụ Jizọs pụrụ nnọọ iche. E nwere ìgwè ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa n’abalị ahụ na-azụ atụrụ ha. Ha hụkwara ka ìhè nwuru gburugburu ebe ha nọ. Ìhè a bụ ebube Jehova. Otu mmụọ ozi Chineke gwara ha, sị: “Unu atụla egwu, n’ihi na, lee! ana m ezisara unu ozi ọma banyere oké ọṅụ nke ndị niile ga-enwe, n’ihi na a mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị, n’obodo Devid. Nke a ga-abụkwara unu ihe ịrịba ama: unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e ji ákwà fụọ, nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” Na mberede, ọtụtụ ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ, na-eto Chineke. Ha sịrị: “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, ka udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.”—Luk 2:10-14.

Ebe Meri, Josef, na ndị ọzụzụ atụrụ na-ele Jizọs mgbe a mụrụ ya ọhụrụ ka o dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri

Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ lawara, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ gwara ibe ha, sị: “Ka anyị garuo Betlehem ozugbo ma hụ ihe a merenụ, dị ka Jehova mere ka anyị mara.” (Luk 2:15) Ha gawara ngwa ngwa ma hụ nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs n’ebe mmụọ ozi gwara ha na ha ga-ahụ ya. Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ nọ na-akọsa ozi ọma a mmụọ ozi ahụ ziri ha, o juru ndị niile nụrụ ya anya. Meri buuru okwu a niile n’obi, na-eche ihe ha pụtara.

Taa, ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ na Disemba 25 ka a mụrụ Jizọs. Ma, na Betlehem, ọnwa Disemba bụ oge udu mmiri na oge oyi. Mgbe ụfọdụ, snoo na-adadị. N’ụdị oge a n’afọ, ndị ọzụzụ atụrụ agaghị akpọrọ atụrụ ha nọrọ n’èzí n’abalị ruo mgbe chi bọrọ. Ihe ọzọkwa bụ na o yighị ka eze na-achị Alaeze Ukwu Rom ọ̀ ga-enye iwu ka ndị na-achọ ihe ha ga-akụdo aka gbaa ọchịchị ya mgba okpuru gaa ije ga-ewe ha ọtụtụ ụbọchị n’oge ezigbo oyi na-atụ iji deba aha ha n’akwụkwọ. E nwere ọtụtụ ihe na-egosi na ọ ga-abụ n’ọnwa Ọktoba ka a mụrụ Jizọs.

  • Olee ihe mere Josef na Meri ji gawa Betlehem?

  • Olee ihe dị ebube merenụ n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs?

  • Olee ihe mere na mmadụ ekwesịghị ichewe na a mụrụ Jizọs na Disemba 25?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya