Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 3/1 p. 13-18
  • “Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ndị E Zobere n’Ụbọchị Iwe Jehova’
  • ‘Aha na Otuto n’Etiti Ndị Nile’
  • “Ụbọchị Onyenwe Anyị Ga-abịa”
  • “Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”
  • Ịlụso Enweghị Mmasị Ọgụ
  • Ịga n’Ihu Ka A Nọ Na-echere Oké Ụbọchị Ahụ!
  • “Cherenụ M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 3/1 p. 13-18

“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”

“Ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta.”—ZEFANAỊA 3:16, 17.

1. Gịnị ka otu onye ọkà mmụta Bible kwuru banyere amụma Zefanaịa?

AMỤMA Zefanaịa zoro aka gabiga mmezu mbụ ya na narị afọ nke asaa na nke isii T.O.A. Ná nkọwa ya nke Zefanaịa, Prọfesọ C. F. Keil dere, sị: “Amụma Zefanaịa . . . abụghị nanị na o ji ịma ọkwa ikpe ọmụma zuru ụwa ọnụ nke ga-abịakwasị ụwa dum malite, bụ́ ebe e si nweta ikpe ọmụma ahụ nke ga-abịakwasị Juda n’ihi mmehie ya nile, nakwa n’ahụ ụwa nke mba nile n’ihi obi ọjọọ ya n’ebe ndị Jehova nọ; kama ọ na-ekwu n’ozuzu ya nile banyere oké ụbọchị nke Jehova nke dịkwa ike.”

2. Myirịta dịgasị aṅaa dị n’agbata ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị Zefanaịa na ọnọdụ dị taa n’ime Krisendọm?

2 Taa, ihe Jehova kpere n’ikpe bụ ịchịkọta mba nile maka mbibi n’ụzọ sara nnọọ mbara karịa ka ọ dị n’ụbọchị Zefanaịa. (Zefanaịa 3:8) Mba ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst bụ ndị ụta dịịrị karịsịa n’anya Chineke. Dị nnọọ ka Jerusalem kwụrụ ụgwọ dị elu n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ya nye Jehova, otú a ka Krisendọm na-aghaghị ịza Chineke ajụjụ maka ụzọ ya nile rụrụ arụ. Ikpe Chineke ndị e kwupụtara megide Juda na Jerusalem n’ụbọchị Zefanaịa na-emetụtakwa chọọchị na ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm ọbụna n’ụzọ ka ukwuu. Ha emetọwokwa ofufe dị ọcha site n’ozizi ha ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, nke ọtụtụ n’ime ha malitere n’aka ndị ọgọ mmụọ. Ha achụwo ọtụtụ nde ụmụ ha ahụ siri ike n’àjà n’ebe ịchụàjà nke oge a nke agha. Ọzọkwa, ndị bi na Jerusalem ihe atụ ahụ na-agwakọta ihe a ha kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst na ịgụ kpakpando, omume mgbaasị, na omume mmekọahụ rụrụ arụ ndị na-eweda n’ala, ihe ndị e ji mara ofufe Beal.—Zefanaịa 1:4, 5.

3. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọtụtụ ndị ndú ọchịchị na gọọmenti ndọrọ ndọrọ ọchịchị taa, gịnịkwa ka Zefanaịa buru n’amụma?

3 Ọtụtụ n’ime ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Krisendọm na-enwe mmasị ịbụ ndị a na-ahụchata na chọọchị. Ma dị ka “ndị isi” nke Juda, ọtụtụ n’ime ha na-erigbu ndị ahụ dị ka “ọdụm na-agbọ ụja” nakwa “anụ ọhịa wolf” agụụ jisi ike. (Zefanaịa 3:1-3) Ndị ohu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ndị dị otú ahụ “na-emeju ụlọ ndị nwe ha n’ihe ike na aghụghọ.” (Zefanaịa 1:9) Iri ngo na omume rụrụ arụ jupụtara ebe nile. Banyere gọọmenti ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị so na ndị na-esoghị na Krisendọm, ọnụ ọgụgụ na-arị elu n’ime ha ‘na-eme onwe ha ukwuu’ megide ndị nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Ndịàmà ya, na-emeso ha dị ka “ịrọ òtù” a na-eleda anya. (Zefanaịa 2:8; Ọrụ 24:5, 14) Banyere ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile dị otú ahụ na ụmụazụ ha, Zefanaịa buru amụma, sị: “Ọlaọcha ha ma ọ bụ ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha anapụta n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova; ma a ga-eji ọkụ nke ekworo Ya ripịa ala ha nile: n’ihi na ngwụsị, nke bụ nanị obi ọlụlọ mmiri, ka Ọ ga-eme ka ndị nile bi n’ala nke a gwụsịa.”—Zefanaịa 1:18.

‘Ndị E Zobere n’Ụbọchị Iwe Jehova’

4. Gịnị na-egosi na a ga-enwe ndị ga-alanarị oké ụbọchị Jehova, ma gịnị ka ha na-aghaghị ime?

4 Ọ bụghị ndị nile bi na Juda ka e bibiri na narị afọ nke asaa T.O.A. N’otu aka ahụ, a ga-enwe ndị ga-alanarị oké ụbọchị Jehova. Jehova gwara ndị dị otú ahụ site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, sị: “Tupu ụkpụrụ amụpụta nwa, (ụbọchị agabigawo dị ka igbogbo ọka), mgbe ọnụma nke iwe Jehova a ka-abịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova a ka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaịa 2:2, 3.

5. N’oge ọgwụgwụ a, olee ndị bụ ndị mbụ ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Zefanaịa, oleekwa otú Jehova siworo jiri ha mee ihe?

5 N’oge ọgwụgwụ nke ụwa a, ndị mbụ ṅara ntị n’ịkpọ òkù amụma ahụ bụ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ. (Ndị Rom 2:28, 29; 9:6; Ndị Galetia 6:16) Ebe ha chọworo ezi omume na umeala n’obi, ebe ha gosiwokwara nkwanye ùgwù maka ihe Jehova kpere n’ikpe, a napụtara ha na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ma weghachi ha n’ihu ọma Chineke na 1919. Kemgbe ahụ, karịsịakwa kemgbe 1922, ihe a fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi anọwo na-akpọsa ikpe Jehova nile megide chọọchị na ịrọ òtù dị iche iche nke Krisendọm na megide mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche n’atụghị egwu.

6. (a) Gịnị ka Zefanaịa buru n’amụma banyere ihe fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi? (b) Olee otú e siworo mezuo amụma a?

6 Banyere ihe a fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi, Zefanaịa buru amụma, sị: “M ga-emekwa ka otu ndị e wedara n’ala nke na-enweghịkwa ike fọdụ n’etiti gị, ha ga-agbabakwa n’aha Jehova. Ndị Israel fọdụrụ agaghị eme ajọ omume, ha agaghị ekwukwa okwu [ụgha]; a gaghị ahụkwa ire aghụghọ n’ọnụ ha: n’ihi na ndị ahụ ga-azụ onwe ha makpukwa amakpu dị ka atụrụ, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Zefanaịa 3:12, 13) Ndị Kraịst a e tere mmanụ ebutewo aha Jehova ụzọ mgbe nile, ma na-eme otú ahụ karịsịa kemgbe 1931, bụ́ mgbe ha nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10-12) Site n’imesi ọbụbụeze Jehova ike, ha asọpụrụwo aha Chineke, nke a aghọwokwara ha ebe mgbaba. (Ilu 18:10) Jehova azụjuwo ha afọ n’ụba n’ụzọ ime mmụọ, ha na-ebikwa n’atụghị egwu n’ime paradaịs ime mmụọ.—Zefanaịa 3:16, 17.

‘Aha na Otuto n’Etiti Ndị Nile’

7, 8. (a) Amụma ọzọ dị aṅaa ka e mezuworo n’ahụ ihe fọdụrụnụ n’Israel ime mmụọ? (b) Gịnị ka ọtụtụ nde mmadụ bịaworo mata, gịnịkwa bụ echiche nke gị n’okwu a?

7 Nrapagidesi ike nke ihe ahụ fọdụrụnụ rapagidere n’aha Jehova na n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Okwu ya abụrụwo nke a rịbara ama. Ndị nwere obi eziokwu abịawo hụ ọdịiche dị n’àgwà nke ihe ahụ fọdụrụnụ na ịrụ arụ na ihu abụọ nke ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe nke ụwa a. Jehova agọziwo “ihe fọdụrụ n’Israel [ime mmụọ].” O jiriwo ihe ùgwù nke ịza aha ya sọpụrụ ha, o mewokwa ka ha nwee aha ọma n’etiti ndị nile nke ụwa. Nke a dị dị ka Zefanaịa si buo ya n’amụma, sị: “Na mgbe ahụ ka M ga-eme ka unu bata, ọ bụkwa na mgbe ahụ ka M ga-achịkọta unu: n’ihi na M ga-eme ka unu ghọọ aha, ghọọkwa otuto n’etiti ndị nile dị iche iche nke ụwa, mgbe M ga-eme ka ndị unu a dọtara n’agha lata n’anya unu, ka Jehova sịrị.”—Zefanaịa 3:20.

8 Kemgbe 1935, n’ụzọ nkịtị, ọtụtụ nde mmadụ abịawo mata na ngọzi Jehova dịkwasịrị ihe ahụ fọdụrụnụ. Ha ji obi ụtọ na-eso ndị Juu, ma ọ bụ ndị Israel ime mmụọ a, na-asị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) “Atụrụ ọzọ” ndị a na-amata ndị ahụ e tere mmanụ dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke Kraịst mere “onye isi ihe nile o nwere [n’elu ala].” Ha ji ekele na-ekere òkè ná nri ime mmụọ nke òtù ohu ahụ na-akwadebe “n’oge ya.”—Jọn 10:16; Matiu 24:45-47.

9. “Asụsụ” dị aṅaa ka ọtụtụ nde mmadụ mụtaworo ịsụ, n’oké ọrụ dịkwa aṅaa ka atụrụ ọzọ ahụ so ihe fọdụrụnụ ahụ e tere mmanụ na-eje ozi na ya “n’otu ubu”?

9 N’isonyere ihe ahụ fọdụrụnụ, ọtụtụ nde atụrụ ọzọ a na-amụta ibi ndụ na ikwu okwu n’ụzọ kwekọrọ ‘n’asụsụ ahụ dị ọcha.’a Jehova buru amụma site n’ọnụ Zefanaịa, sị: “Mgbe ahụ ka M ga-agbanwere ndị nile dị iche iche egbugbere ọnụ [“asụsụ,” NW] dị ọcha, ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife Ya n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Ee, atụrụ ọzọ ahụ ji ịdị n’otu soro ndị e tere mmanụ nke “ìgwè atụrụ nta” na-ejere Jehova ozi “n’otu ubu” n’ọrụ ahụ dị ngwa nke ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze . . . ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Luk 12:32; Matiu 24:14.

“Ụbọchị Onyenwe Anyị Ga-abịa”

10. Gịnị ka ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ nọworo na-ekwenyesi ike na ya mgbe nile, gịnịkwa, dị ka otu òtù, ka ha ga-adị ndụ ịhụ?

10 Ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ anọgidewo buru n’uche okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pita onyeozi, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị. Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi.” (2 Pita 3:9, 10) Ndị so n’òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi enwetụbeghị obi abụọ ọ bụla banyere ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’oge anyị. Oké ụbọchị ahụ ga-eji mmezu nke ihe nile Chineke kpere n’ikpe megide Krisendọm, nke bụ Jerusalem ihe atụ ahụ, ya na ihe fọdụrụ na Babilọn Ukwu ahụ wee malite.—Zefanaịa 1:2-4; Mkpughe 17:1, 5; 19:1, 2.

11, 12. (a) Akụkụ ọzọ dị aṅaa nke amụma Zefanaịa ka e mezuworo n’ahụ ihe ahụ fọdụrunụ? (b) Olee otú ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ siworo ṅaa ntị n’òkù bụ́, “Ekwela ka aka gị abụọ kụdaa”?

11 Ihe ahụ fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi na-aṅụrị ọṅụ n’ịbụ ndị a napụtara na 1919 site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ha ahụwo mmezu nke amụma Zefanaịa: “Tie mkpu ọṅụ, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị Israel; ṅụrịa, were obi nile ṅụrịa ọṅụ agha, gị ada Jerusalem. Jehova ewezụgawo ikpe gị nile, Ọ chụghachiwo onye iro gị: Eze Israel, bụ́ Jehova, nọ n’etiti gị: ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. N’ụbọchị ahụ ka a ga-asị Jerusalem, Atụla egwu: gị Zaịọn, ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta.”—Zefanaịa 3:14-17.

12 N’inwe nkwenyesi ike na ihe àmà bara ụba na Jehova nọ n’etiti ha, ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ agawo n’ihu n’ịrụzu ọrụ Chineke nyere ha n’atụghị egwu. Ha ekwusawo ozi ọma nke Alaeze ahụ, ha emewokwa ka a mara ikpe Jehova nile megide Krisendọm, ihe fọdụrụnụ na Babilọn Ukwu ahụ, na ajọ usoro ihe dum nke Setan. N’agbanyeghị ihe isi ike nile, n’ime ọtụtụ afọ iri gafeworonụ eri 1919, ha erubewo isi n’iwu Chineke ahụ bụ́: “Atụla egwu: gị Zaịọn, ekwela ka aka gị abụọ kụdaa.” Ha ewetulatabeghị aka ha n’ikesa ọtụtụ ijeri traktị, magazin, akwụkwọ, na akwụkwọ nta ndị na-ekwupụta Alaeze Jehova. Ha abụrụwo ihe nlereanya na-akpali okwukwe nye atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị, kemgbe 1935, nuteworo n’akụkụ ha.

“Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Juu ji laa azụ n’ijere Jehova ozi, oleekwa otú nke a si pụta ìhè? (b) Gịnị ka ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya nye anyị ime, n’ọrụ dịkwa aṅaa ka anyị na-ekwesịghị ikwe ka aka anyị kụdaa?

13 Ka anyị nọ ‘na-echere’ oké ụbọchị Jehova, olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka bara uru site n’amụma Zefanaịa? Nke mbụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iyi ndị Juu ahụ n’ụbọchị Zefanaịa bụ́ ndị lara azụ n’iso Jehova n’ihi na ha nwere obi abụọ banyere ịdị nso nke ụbọchị Jehova. Ndị Juu dị otú ahụ abụchaghị na ha kwupụtara obi abụọ ha n’ihu ọha, kama ụzọ ha si mee ihe gosiri na ha ekwetachaghị n’ezie na oké ụbọchị Jehova dị nso. Ha tinyere uche n’ịchịkọba akụ̀ na ụba kama ichere Jehova.—Zefanaịa 1:12, 13; 3:8.

14 Taa abụghị oge ikwe ka obi abụọ gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị. Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịdị na-eyigharị ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’ime uche ma ọ bụ obi anyị. (2 Pita 3:1-4, 10) Anyị kwesịrị izere ịla azụ n’iso Jehova ma ọ bụ ‘ikwe ka aka anyị abụọ kụdaa’ n’ozi ya. Nke a na-agụnye ịghara iji “aka umengwụ arụ ọrụ” n’anyị ikwusa “ozi ọma” ahụ.—Ilu 10:4; Mak 13:10.

Ịlụso Enweghị Mmasị Ọgụ

15. Gịnị pụrụ ime ka anyị wetulata aka n’ozi Jehova, oleekwa otú e si buru ụzọ kwuo banyere nsogbu a n’amụma nke Zefanaịa?

15 Nke abụọ, anyị kwesịrị ịnọ na nche megide mmetụta nile nke enweghị mmasị bụ́ nke na-akpata ike ọgwụgwụ. N’ọtụtụ mba Ọdịda Anyanwụ Ụwa, omume ọ gbasaghị m banyere ihe ime mmụọ pụrụ ịghọ ihe nkụda aka n’etiti ndị ụfọdụ na-ekwusa ozi ọma ahụ. Ụdị enweghị mmasị dị otú ahụ dịrị n’oge Zefanaịa. Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma ya, sị: “M [ga-eleta] ndị na-asị n’obi ha, Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.” (Zefanaịa 1:12) Mgbe ọ na-ede ihe banyere amaokwu a n’akwụkwọ bụ́ Cambridge Bible for Schools and Colleges, A. B. Davidson kwuru na ọ na-ezo aka ná ndị “dabaworo n’enweghị mmasị nke obi ịta mmiri ma ọ bụ ọbụna n’ekweghị ekwe banyere ntinye aka ọ bụla nke ike ka elu n’ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ.”

16. Gịnị bụ ọnọdụ uche nke ndị so na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm nwere, ma agbamume dị aṅaa ka Jehova na-enye anyị?

16 Enweghị mmasị bụ àgwà jupụtara taa n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, karịsịa ná mba ndị ka baa ọgaranya. Ọbụna ndị òtù nke chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ekweghị nnọọ na Jehova Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ n’oge anyị. Ha na-eji ọchị nke ekweghị ekwe ma ọ bụ nzaghachi dị mkpirikpi bụ́ “enweghị m mmasị” ajụ mgbalị nile anyị na-eme iji ozi ọma nke Alaeze ahụ gakwuru ha! N’okpuru ọnọdụ ndị a, nnọgidesi ike n’ọrụ ịgba àmà ahụ pụrụ ịbụ ezi ihe ịma aka. Ọ na-etinye ntachi obi anyị n’ule. Ma site n’amụma Zefanaịa, Jehova na-enye ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ume, na-asị: “Ekwela ka aka gị abụọ kụdaa. Jehova, bụ́ Chineke gị, nọ n’etiti gị, Ọ bụ dike nke na-azọpụta: Ọ ga-eji ọṅụ nwee obi ụtọ n’ahụ gị, Ọ ga-edere duu n’ịhụnanya Ya, Ọ ga-eji iti mkpu ọṅụ tegharịa egwu ọṅụ n’ahụ gị.”—Zefanaịa 3:16, 17.

17. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka ndị dị ọhụrụ karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ kwesịrị ịgbaso, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

17 Ọ bụ eziokwu n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Jehova na ihe ahụ fọdụrụnụ, tinyekwara ndị meworo okenye karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ, arụzuwo ọrụ nchịkọta dị ukwuu na mgbe ikpeazụ ndị a. Ndị Kraịst a nile kwesịrị ntụkwasị obi egosiwo ntachi obi ha n’ime ọtụtụ afọ iri ndị gafeworonụ. Ha ekwebeghị ka enweghị mmasị n’akụkụ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị nọ na Krisendọm kụdaa ha aka. Ya mere ka ndị dị ọhụrụ karị n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ghara ikwe ka enweghị mmasị n’ebe ihe ime mmụọ dị bụ́ nke jupụtara ebe nile taa n’ọtụtụ ala gbuo mmụọ ha. Ka ha ghara ikwe ka ‘aka ha abụọ kụdaa,’ ma ọ bụ daa mbà. Ka ha jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eche Ụlọ Nche, Teta!, na mbipụta ndị ọzọ mara mma ndị a haziri kpọmkwem iji nyere ndị yiri atụrụ aka ịmụta eziokwu banyere ụbọchị Jehova na ngọzi ndị ga-esochi n’ihu ndị mmadụ.

Ịga n’Ihu Ka A Nọ Na-echere Oké Ụbọchị Ahụ!

18, 19. (a) Agbamume dị aṅaa maka ịtachi obi ka anyị na-achọta na Matiu 24:13 na Aịsaịa 35:3, 4? (b) Olee otú a ga-esi gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị jiri ịdị n’otu na-aga n’ihu n’ozi Jehova?

18 Jisọs kwuru, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ya mere, e kwesịghị inwe “aka kụdara akụda” ma ọ bụ “ikpere na-asụ ngọngọ” ka anyị nọ na-echere oké ụbọchị Jehova! (Aịsaịa 35:3, 4) Amụma Zefanaịa na-ekwu banyere Jehova n’ụzọ imesi obi ike, sị: “Ọ bụ dike na-azọpụta.” (Zefanaịa 3:17) Ee, Jehova ga-azọpụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ gabiga akụkụ ikpeazụ nke “oké mkpagbu ahụ,” mgbe ọ ga-enye Ọkpara ya iwu itirisi mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile ndị ‘na-eme onwe ha ukwuu’ megide ndị ya.—Mkpughe 7:9, 14; Zefanaịa 2:10, 11; Abụ Ọma 2:7-9.

19 Ka oké ụbọchị ahụ nke Jehova na-akpụdewe nso, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu, na-ejere ya ozi “n’otu ubu”! (Zefanaịa 3:9) N’ime otú ahụ, a ga-eme ka anyị onwe anyị tinyere ọtụtụ ndị ọzọ nọrọ n’ọnọdụ nke ịbụ ndị ‘a ga-ezobe n’ụbọchị iwe Jehova’ ma hụ mgbe a ga-edo aha nsọ ya nsọ.—Zefanaịa 2:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle zuru ezu nke ‘asụsụ ahụ dị ọcha,’ lee Ụlọ Nche, April 1, 1991, peji nke 20-25, na May 1, 1991, peji nke 10-20.

Ná Ntụleghachi

◻ N’akụkụ dịgasị aṅaa ka ọnọdụ okpukpe nke dị na Krisendọm si kwekọọ na nke dị n’ụbọchị Zefanaịa?

◻ Olee otú ọtụtụ ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke taa si yie “ndị isi” ọchịchị n’oge Zefanaịa?

◻ Nkwa ndị dị aṅaa dị na Zefanaịa ka e mezuworo n’ahụ ihe ahụ fọdụrụnụ?

◻ Gịnị ka ọtụtụ nde mmadụ bịaworo mata?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwe ka aka anyị kụdaa n’ozi Jehova?

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Dị ka Zefanaịa, ihe ahụ fọdụrụnụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke ndị Kraịst e tere mmanụ anọwo na-akpọsa ikpe Jehova nile n’atụghị egwu

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

“Atụrụ ọzọ” ahụ ekwebeghị ka enweghị mmasị nke ndị mmadụ kụdaa ha aka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya