Isi 11
Ọdịiche Dị n’Etiti Jerusalem Elu Ala na Jerusalem nke Eluigwe
1. (a) Mbibi nke Jerusalem ọ̀ ga-abụ ihe ọhụrụ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji bụụrụ ihe nile a kpọrọ mmadụ ihe ọdachi ma ọ bụrụ na e bibie Jerusalem ọzọ?
TAA ndị bụ ndị Juu n’anụ ahụ kpebisiri ike na Jerusalem nke dị n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọbụna ndị nọ na Krisendọm ka na-enye obodo ukwu ahụ nsọpụrụ dị ukwuu, bụ́ ebe Jisọs wetara ozi ya ná njedebe. Ma ihe a nile ọ̀ na-enye ihe mere a ga-eji kwere na obodo ukwu ahụ ga-anọgide na-adị adị? Ọ dịwo mgbe e bibiri ya ná mbụ, na 607 T.O.A. site n’aka ndị Babilọn nakwa na 70 O.A. site n’aka ndị Rom. Ọ̀ ga-abụ ihe ọdachi maka ihe nile a kpọrọ mmadụ ma ọ bụrụ na e bibie ya ọzọ? Ee e, obodo ukwu ahụ adịghị mkpa maka ngọzi dị iche iche nke ọgbụgba ndụ Abraham irutere ihe a kpọrọ mmadụ. Ọbụna banyere Abraham e dere, sị: “Ọ na-ele anya obodo ahụ nke nwere ntọala ahụ, nke Chineke bụ onye ọkà ya na onye rụrụ ya.”—Ndị Hibru 11:10.
2. (a) Olee otú Pọl onyeozi si gosi na e nwere Jerusalem ka elu? (b) Ònye bụ Di Nwe Jerusalem ahụ, olee ndị bụkwa ụmụ nwunye ya mụtaara ya?
2 Pọl onyeozi dere, sị: “Ma Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ya onwe ya bụkwa nne anyị.” (Ndị Galetia 4:26) N’ebe ahụ o gosiri na Jerusalem nke eluigwe, ma ọ bụ nke dị n’elu, kwekọrọ na Sera, ọ bụkwa nzukọ yiri nwunye nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova Chineke. N’ihi ya, ụmụ “Jerusalem nke dị n’elu” bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ, dị ka Pọl.
“Jerusalem nke Dị n’Elu” Aghọọ Obodo Ndị Eze
3. (a) Olee mgbe Jehova Chineke n’onwe ya malitere ịchị achị? (b) N’olee ebe ka e mere ka Jisọs Kraịst nọkwasị n’ocheeze, mmetụta dị aṅaa ka nke a nwekwara n’ọbụbụeze nke Jehova n’onwe ya?
3 “Jerusalem nke dị n’elu” anọwo n’ọnọdụ yiri nke ndị eze kemgbe “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914. (Luk 21:24) Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, Abụ Ọma 97:1 na-emezu: “Jehova bụ eze; ka ụwa tegharịa egwu ọṅụ.” N’otu aka ahụ, Abụ Ọma 99:1, 2 na-emezu: “Jehova bụ eze . . . Jehova dị ukwuu n’ime Zaịọn; onye dị elu ka ọ bụkwa n’elu ndị nile dị iche iche.” Na 1914 oge ruru maka ya ịkwụsị nzọda a na-azọda Alaeze ahụ n’eriri ndị eze nke Devid, dị ka e nwere ihe nnọchianya ya na Jerusalem nke bụbu obodo ndị eze. N’ihi ya, o mere ka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, nọkwasị n’ocheeze, dị ka Eze nke nọ n’aka nri nke onwe Ya na “Jerusalem nke dị n’elu,” Jerusalem nke eluigwe, si n’ụzọ dị otú a na-eme ka ọ bụrụ obodo ndị eze. E mesiwanyere ọbụbụeze Jehova n’onwe ya ike ma ọ bụ mee ka o buwanye ibu site n’ime ka Jisọs Kraịst nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze.
4. Site n’ihe omume ndị dị aṅaa ka “Jerusalem nke dị n’elu” ghọrọ obodo nke ndị eze kemgbe 1914?
4 Ya mere mgbe ọmụmụ nke Alaeze eluigwe ahụ gasịrị na 1914 na mgbe a chụpụsịrị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, o kwesịrị ekwesị ịma ọkwá, sị: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị.” (Mkpughe 12:1-10) “Ịchịisi nke Kraịst ya” bụ maka Onye a ịchị dị ka Eze na “Jerusalem nke dị n’elu.” N’ezie, ọ ghọrọ obodo ndị eze n’afọ 1914 ahụ na-ekwe nkwa ihe ịga nke ọma.
Ada “Jerusalem nke Dị n’Elu”
5, 6. (a) Ná Mkpughe 21:1, 2, obodo ihe atụ dị aṅaa nke dị ọhụrụ ka Jọn hụrụ? (b) Site n’aka ònye ka a gbatịpụrụ nnabata nke eze ahụ dị ka a kọwapụtara na Zekaraịa 9:9, 10, ọ̀ bụkwa n’okwu ndị dị aṅaa?
5 Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu narị afọ mgbe mbibi nke Jerusalem n’aka ìgwè ndị agha Rom gasịrị na 70 O.A., e nyere Jọn onyeozi ọhụụ ndị ahụ dị ebube dị n’akwụkwọ Mkpughe. Ná Mkpughe 21:1, 2, Jọn kwuru okwu banyere otu “Jerusalem Ọhụrụ.” Ọ bụ ndị mejupụtara “Jerusalem Ọhụrụ” nke a jiri obi ụtọ nabata Eze ahụ e chiri ọhụrụ, onye na-abịa n’aha Jehova, dị ka a kpọkuru ha ime na Zekaraịa 9:9, 10, n’okwu ndị a:
6 “Tegharịa egwú ọṅụ nke ukwuu, gị ada Zaịọn; tie mkpu, gị ada Jerusalem: lee, eze gị na-abịakwute gị: onye ezi omume na onye nwere nzọpụta ka ọ bụ; onye e wedara n’ala, nke na-anọkwasịkwa n’ịnyịnya ibu . . . M ga-ebipụkwa ụgbọ ala n’Efraim, bipụkwa ịnyịnya na Jerusalem, a ga-ebipụkwa ụta agha; ọ ga-agwakwa mba nile okwu udo: ọ ga-achịkwa achị site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.”
7. Site n’aka ònye ka e mezuworo amụma ahụ n’oge “ọgwụgwụ oge a,” ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
7 Amụma nke a nwere mmezu n’akụkụ ụfọdụ n’ọgbụgba mmeri ahụ Jisọs Kraịst gbara nwa ịnyịnya ibu banye na Jerusalem na 33 O.A. Kemgbe 1919 o nwewo mmezu ikpeazụ ya n’ahụ ihe fọdụrụnụ nke Israel ime mmụọ. E nweghị nkewa dị n’etiti ndị òtù nke ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, dị ka nke dapụtara n’etiti ebo dị iche iche nke Efraim oge ochie na Jerusalem, isi obodo nke ebo abụọ nke alaeze Juda. Site n’ije ozi n’ịdị n’otu maka ọdịmma nke Alaeze Mesaịa ahụ maka nzube nke imezu amụma Jisọs na Matiu 24:14 na Mak 13:10, ha na-anọgide na-anabata Eze mmerị ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ịdị n’otu a na-apụghị imebi emebi, ha na-eji iguzosi ike n’ihe na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi eze ya ná mgbe “ọgwụgwụ ihe nile” nke a.—Matiu 24:3.
8. (a) Olee ndị na-anabataghị Eze ahụ nwere mmeri? (b) Ọ̀ bụ n’ole ebe na n’ihe dị aṅaa ka ndị dị otú a na-azọ ije aga?
8 N’ihe ihere ha, tinyere Jerusalem nke Republic of Israel, mba ndị ahụ sị na ha bụ nke ndị Kraịst, bụ́ ndị mejupụtara Krisendọm adịghị anabata Eze ahụ nwere mmeri nke na-abịa n’aha Jehova. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ndị bụ ndị àmà nke Onye ahụ ọ na-abịa n’aha ya, ndị ji obi ụtọ na-ejere Ya ozi n’ụlọ nsọ Ya. (Aịsaịa 43:10-12) E meghewo anya ime mmụọ ha ịhụ na Republic of Israel na mba ndị ọzọ nile na-anọghị n’òtù UN na ndị nọ na ya agamiwo ije ugbu a ná njem ahụ a na-azọ ịga “n’ebe ahụ nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha–Magedọn.” (Mkpughe 16:16) Agha nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile dị nso!
9. Olee otú ọdịnihu nke Jerusalem elu ala si dịrị nnọọ iche ma e jiri ya tụnyere nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ?
9 Ọdịnihu nke Jerusalem nke elu ala bụ nke ọdachi, ma nke Jerusalem Ọhụrụ na-egbuke egbuke. Mgbe oge ruru, “mpí iri ahụ” nke “anụ ọhịa” ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, tinyere “anụ ọhịa” ahụ n’onwe ya, ga-atụgharị wee kpọọ usoro ihe ahụ na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, asị. Ha ga-egosipụta ajọ ịkpọasị ha megide Jerusalem elu ala ahụ a na-asọpụrụ n’ụzọ okpukpe, ha ga-ebibikwa ya dị ka à ga-asị na e ji ọkụ. (Mkpughe 17:16) Ma ha agaghị enwe ike ma ọlị imetụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ nke eluigwe aka.
10. Olee otú Jerusalem nke elu ala si na-agbaso ụzọ dị nnọọ iche n’ebe nke ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ na nke ndị enyi ha bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ dị?
10 Ihe fọdụrụnụ ahụ nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ bụ́ ndị na-atụ anya ịghọ akụkụ nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ nke eluigwe na-anọgide na-anabata Eze ahụ bụ Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ha na “oké ìgwè mmadụ” nke ndị àmà ndị ọzọ nke Jehova. N’ụzọ ime ihe nke a nke iguzosi ike n’ezi ihe, ha na-eguzopụ nnọọ iche n’ebe Jerusalem ochie ahụ dị. Kemgbe e guzobesịrị Republic of Israel, obodo Jerusalem ahụ nke ndị ka n’ime ya ugbu a bụ ndị Juu na-agbaso ụzọ nke ndị bi na Jerusalem nke narị afọ mbụ. N’okpuru ikike na-ekpu ìsì nke okpukpe, ọ nọgidewo na-ajụ Jisọs Kraịst, Onye ahụ o ruuru, nke nwekwara ike ịchị n’Alaeze eluigwe ahụ.
11, 12. (a) Mmezu dị ịrịba ama nke amụma Jisọs na Matiu 24:14 abụwo nke olee ndị kpọmkwem rụzuworo? (b) Gịnị ka Society ahụ ha na ya ji arụ ọrụ nwere na Republic of Israel taa?
11 N’eziokwu, kemgbe ọgwụgwụ Oge Ndị Jentaịl na 1914, “Onyeisi Udo” ahụ anọwo na-achị n’eluigwe, bụ́ nke anya mmadụ na-adịghị ahụ. Otú o sina dị, kemgbe ndị Britain merisịrị Jerusalem n’Agha Ụwa Mbụ, e wee nyekwa Britain iwu site n’aka òtù League of Nations ịchị ya, ozi ọma nke Alaeze eluigwe dị n’aka Mesaịa ahụ bụ́ Nwa Eze Devid abụwo nke e ‘kwusara n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile,’ dị nnọọ ka Jisọs Kraịst n’onwe ya buru n’amụma.—Matiu 24:14.
12 N’okpuru nlekọta anya nke Watch Tower Bible and Tract Society, Ndịàmà Jehova arụzuwo mmezu nke a kwesịrị ịrịba ama nke amụma ahụ. Ọbụna Society nke a nwere alaka ụlọ ọrụ na Tel Aviv, bụ́ ebe e si na-eduzi ọrụ Ndịàmà Jehova n’ókèala nile nke Israel. E nwekwara ọgbakọ dị iche iche nke ndị àmà na-arụsi ọrụ ike nke Jehova, bụ́ ndị na-ekwusa ugbu a oziọma nke Alaeze ahụ n’ala ahụ.
13. (a) Gịnị ga-abịa mgbe e kwusasịrị ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụzọ zuru ezu? (b) Ọ̀ dị mgbe ọ bụla a ga-enwe mkpa maka Jerusalem ọzọ nke elu ala, ọbụna iji nabataghachi Devid site ná mbilite n’ọnwụ?
13 Jisọs Kraịst buru n’amụma na mgbe e kwusasịrị “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ụzọ zuru ezu, na “ọgwụgwụ” ga-abịakwasị usoro ihe nke ụwa nke a. (Matiu 24:14) Ya mere ugbu a ọgwụgwụ nke Jerusalem elu ala dị nso. N’oge a, o yiri ka ọ dịghị mkpa ka e wuo Jerusalem ọzọ n’ebe ahụ nke ochie ahụ dịbu, ọbụna ịnabata onye ahụ bụ n’otu mgbe eze nke Jerusalem, bụ́ Devid, site ná mbilite n’ọnwụ n’okpuru Alaeze Narị Afọ Iri nke nwa ya bụ eze, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 5:28, 29) Otú o sina dị, o yiri ka a ga-akpọghachi Devid n’ebe ahụ ọ nọ fee Jehova Chineke ná mbụ.
Oge Maka Ịṅụrị Ọṅụ
14, 15. (a) Olee otú Jọn onyeozi si kọwaa Jerusalem Ọhụrụ ahụ dị ebube na nrịdata ya site n’eluigwe maka ngọzi nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) N’ihi gịnị ka oge nke anyị ji bụrụ oge ịṅụrị ọ̇ṅụ, ihe omume dịkwa aṅaa maka ọṅụ nke eluigwe na ụwa na-eru nso?
14 E jikọrọ Jerusalem Ọhụrụ na usoro ihe ọhụrụ ahụ dị ebube. Jọn onyeozi na-ekwu, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ. M wee hụ obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem ọhụrụ, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ, e doziwo ya dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọworo ya mma nye di ya. M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha.” (Mkpughe 21:1-3) Otú a, Jerusalem Ọhụrụ gaje ịbụ ihe ngọzi nye ihe nile a kpọrọ mmadụ.
15 Nke a na-eme ka oge anyị bụrụ oge ịṅụrị ọṅụ. Iji tụkwasị ihe n’ịṅụrị ọṅụ a dum, ihe omume nke metụtara eluigwe na ụwa na maka ọṅụ nke eluigwe na ụwa na-abịa nso. Ọ bụ alụmdi na nwunye nke Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst na òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ nke ọnụ ọgụgụ ha zuru ezu, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ ahụ. Dị ka e dere ya ná Mkpughe 19:6-9, sị: “M [Jọn onyeozi] wee nụ ihe dị ka olu nke oké ìgwè ndị, dịkwa ka olu ọtụtụ mmiri, dịkwa ka olu égbè eluigwe dị ike, na-asị, Haleluya: n’ihi na Onyenwe anyị Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na-abụ eze. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi na-atọkwa anyị ụtọ nke ukwuu, ka anyị werekwa otuto nile nye ya: n’ihi na ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ [Jisọs Kraịst] abịawo, nwunye ya edoziwokwa onwe ya. E wee kwenyere ya ka o gbokwasị onwe ya ezi ákwà ọcha na-enwu enwu, nke dịkwa ọcha: n’ihi na ezi ákwà ọcha ahụ bụ ezi omume nile nke ndị nsọ. O wee sị m, Dee akwụkwọ, Ngọzi na-adịrị ndị a kpọworo ịbịa ná nri anyasị ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.”
16. (a) Site n’alụmdi na nwunye nke ya na Nwa Atụrụ ahụ n’eluigwe, Jerusalem Ọhụrụ ahụ na-aghọ nne nye ole ndị? (b) Jerusalem Ọhụrụ ahụ gaje ịghọ ihe ngọzi n’ikwekọ n’ụzọ zuru ezu n’ihe dị aṅaa?
16 Njikọ alụmdi na nwunye nke a nke e so Nwa Atụrụ ahụ bụ́ Jisọs Kraịst jikọọ ga-apụta ọṅụ a na-apụghị iji ọnụ kwuo nye Jerusalem Ọhụrụ ihe atụ ahụ n’eluigwe. Site na ya ọ ga-abụ “nne na-aṅụrị ọṅụ nke mụworo ụmụ ndị ikom.” (Abụ Ọma 113:9) Ee, ọ ga-abụ nne eluigwe nye ụmụ mmadụ nile, ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị di ya na-ahụ n’anya jiri àjà nke ndụ mmadụ ya zuru ókè gbapụta narị afọ 19 gara aga. N’ikwekọ n’ụzọ zuru ezu n’ọgbụgba ndụ Abraham nke Jehova gbara ọtụtụ puku afọ gara aga, Jerusalem Ọhụrụ ahụ gaje ịbụ ihe ngọzi nye ezinụlọ nile nke ụwa.
[Foto dị na peeji nke 96]
N’usoro ihe ọhụrụ, Jerusalem Ọhụrụ ga-agọzi ihe nile a kpọrọ mmadụ