Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 19 p. 244-258
  • Jehova Emerụọ Mpako nke Taịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Emerụọ Mpako nke Taịa
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwasienụ Ákwá Ike, Unu Ụgbọ nke Tashish”!
  • Ọ Na-aṅụrị Ọṅụ Site na “Mgbe Ochie”
  • A Ga-emerụ Mpako Ya
  • Ndị Kaldea Ga-ebibi Ya
  • ‘Ọ Ghaghị Ịlaghachi n’Onyinye Ịkwa Iko Ya’
  • ‘Uru Ahịa Ya Aghaghị Ịghọ Ihe Nsọ’
  • Zere Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya na Mpako
  • Amụma E Buru Megide Taya Na-eme Ka Obi Sie Anyị Ike na Okwu Jehova Na-emezu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mba Ndị Gbara Jeruselem Gburugburu
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • Mba Dị Iche Iche ‘Ga-amara na M Bụ Jehova’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 19 p. 244-258

Isi nke Iri na Itoolu

Jehova Emerụọ Mpako nke Taịa

Aịsaịa 23:1-18

1, 2. (a) Obodo dị aṅaa ka Taịa bụ? (b) Gịnị ka Aịsaịa buru n’amụma ga-eme Taịa?

Ọ “MABIGARA mma ókè,” jupụtakwa ‘n’ụdị akụ̀ nile ọ bụla.’ (Ezikiel 27:4, 12, An American Translation) Usuu ụgbọ mmiri ya bara ụba na-aga n’osimiri ruo n’ebe ndị dị anya. Ọ ghọrọ nke a ‘na-asọpụrụ nke ukwuu n’etiti oké osimiri nile,’ o jikwa “ịba ụba nke akụ̀ [ya] na nke ịzụ ahịa [ya] nile mee ndị eze nke ụwa ka ha bụrụ ọgaranya.” (Ezikiel 27:25, 33) Na narị afọ nke asaa T.O.A., ọ bụ otú ahụ ka Taịa dị—obodo Finisia nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke oké osimiri Mediterranean.

2 N’agbanyeghị nke ahụ, mbibi nọ na-echere Taịa. Ihe dị ka 100 afọ tupu Ezikiel akọwaa ya, Aịsaịa onye amụma buru amụma banyere ọdịda nke ebe a e wusiri ike nke Finisia na iru újú nke ndị na-adabere n’ebe ọ nọ ga-enwe. Aịsaịa bukwara amụma na mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Chineke ga-elebara obodo a anya, mee ka ọ baa ọgaranya ọzọ. Olee otú e si mezuo ihe onye amụma ahụ kwuru? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nile mere Taịa? Ịghọta ihe dakwasịrị ya nke ọma na ihe kpatara ụdị ihe ndị ahụ ji mee ga-ewusi okwukwe anyị nwere na Jehova na ná nkwa ya dị iche iche ike.

“Kwasienụ Ákwá Ike, Unu Ụgbọ nke Tashish”!

3, 4. (a) N’ebee ka Tashish dị, gịnịkwa jikọrọ Taịa na Tashish? (b) N’ihi gịnị ka ndị ji ụgbọ mmiri eme njem, bụ́ ndị ha na Tashish na-azụkọrịta ahịa ga-eji nwee ihe mere ha ga-eji ‘kwasie ákwá ike’?

3 N’isiokwu bụ́, “Ibu e boro Taịa,” Aịsaịa na-ekwu, sị: “Kwasienụ ákwá ike, unu ụgbọ nke Tashish; n’ihi na e bibiwo ya, ụlọ wee ghara ịdị ya, ụzọ mbata gharakwa ịdị ya.” (Aịsaịa 23:1a) E kwenyere na Tashish bụbu otu akụkụ nke Spain, bụ́ nke dị anya site na Taịa nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Mediterranean.a N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Finisia bụ ndị ọkà n’ịnya ụgbọ mmiri, ụgbọ mmiri ha na-adịkwa nnukwu ma dị mma ịgba na mmiri. Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwenyere na ndị Finisia bụ ndị mbụ chọpụtara njikọ dị n’etiti ọnwa na ntoju na ntalata nke mmiri, ndị na-adaberekwa na nkà mmụta mbara igwe maka ime njem ụgbọ mmiri. N’ihi ya, ụzọ ahụ dị anya site na Taịa ruo Tashish abụghịrị ha nsogbu.

4 N’oge Aịsaịa, Tashish ahụ dị anya bụ ebe ndị Taịa na-aga azụ ahịa, ikekwe ebe bụ́ isi o si nweta akụ̀ na ụba ya n’otu oge n’akụkọ ihe mere eme ya. Spain nwere ebe ndị a na-egwupụta ihe, ndị jupụtara n’ọlaọcha, ígwè, gbam gbam, na ọla ndị ọzọ. (Tụlee Jeremaịa 10:9; Ezikiel 27:12.) “Ụgbọ nke Tashish,” ndị bụ́ ma eleghị anya ụgbọ ndị si Taịa, ndị ha na Tashish na-azụkọrịta ahịa, ga-enwe ezi ihe mere ha ga-eji ‘kwasie ákwá ike,’ na-eru újú maka mbibi nke ọdụ ụgbọ mmiri ha.

5. Olee ebe ndị na-anya ụgbọ mmiri si Tashish ga-anọ nụ banyere ọdịda Taịa?

5 Olee otú ndị na-anya ụgbọ mmiri, bụ́ ndị nọ n’osimiri, ga-esi nụ banyere ọdịda Taịa? Aịsaịa na-aza, sị: “E siwo n’ala Kitim kpugheere ha ya.” (Aịsaịa 23:1b) ‘Ala Kitim’ ma eleghi anya na-ezo aka n’àgwàetiti Saịprọs, nke dị ihe dị ka 100 kilomita n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri Finisia. Nke a bụ ebe nkwụsị ikpeazụ maka ụgbọ mmiri ndị si Tashish na-aga ebe ọwụwa anyanwụ tupu ha eruo Taịa. N’ihi ya, mgbe ha kwụsịtụrụ na Saịprọs, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ga-anụ akụkọ mweghara nke e weghaara ọdụ ụgbọ mmiri ha ha hụrụ n’anya. Lee ihe ijuanya ọ ga-abụrụ ha! N’ịbụ ndị ọ na-ewute, ha ‘ga-akwasi ákwá ike’ ná mgbagwoju anya.

6. Kọwaa ihe jikọrọ Taịa na Saịdọn.

6 Ndị nọ n’ụsọ oké osimiri Finisia ga-anọkwa ná mgbagwoju anya. Onye amụma ahụ, kwuru, sị: “Derenụ duu, unu ndị bi n’ala dị oké osimiri gburugburu; gị onye ndị ahịa [Saịdọn], bụ́ ndị na-agabiga oké osimiri, mejuworo ihe. N’elu ọtụtụ mmiri ka mkpụrụ ọghịgha Shaịhoa, nke bụ́ owuwe ihe ubi nke Naịl, bụ́ ihe omume ya; o wee ghọọ uru ahịa nke mba dị iche iche.” (Aịsaịa 23:2, 3) “Ndị bi n’ala dị oké osimiri gburugburu”—ndị agbata obi Taịa—ga-edere duu n’oké mgbagwoju anya n’ihi ajọ ọdịda nke Taịa. Olee ndị bụ “ndị ahịa Saịdọn,” bụ́ ndị “mejuworo” ndị bi n’ala a, na-eme ka ha baa ọgaranya? Taịa bụbu otu ógbè nke obodo ahụ nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Saịdọn, nke dị nanị kilomita 35 n’ebe ugwu. Ná mkpụrụ ego ya, Saịdọn kọwara onwe ya dị ka nne Taịa. Ọ bụ ezie na Taịa enwekarịala Saịdọn n’akụ̀ na ụba, ọ ka bụ “ada Saịdọn,” ndị bi n’ime ya ka na-akpọkwa onwe ha ndị Saịdọn. (Aịsaịa 23:12) N’ihi ya, okwu bụ́ “ndị ahịa Saịdọn” ma eleghị anya na-ezo aka n’ebe ndị ahịa bi na Taịa nọ.

7. Olee otú ndị ahịa Saịdọn siworo kesaa akụ̀ na ụba?

7 N’azụmahịa ha, ndị ahịa bara ọgaranya nke Saịdọn na-agafe Oké Osimiri Mediterranean. Ha na-ebuga n’ọtụtụ ebe mkpụrụ osisi, ma ọ bụ mkpụrụ akụ́kụ́ si Shaịhoa, bụ́ alaka Osimiri Naịl kasị dịrị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ n’ógbè Ijipt bụ́ ebe mmiri ahụ wara ọtụtụ alaka wee banye n’osimiri. (Tụlee Jeremaịa 2:18.) “Owuwe ihe ubi nke Naịl” na-agụnyekwa ihe ubi ndị ọzọ si Ijipt. Ịzụta na ire ngwá ahịa dị otú ahụ na iji ha agbanwere ihe ndị ọzọ na-ewetara ndị ahịa a na-eji ụgbọ mmiri aga nakwa mba ndị ha na ha na-azụkọ ahịa oké uru. Ndị ahịa Saịdọn na-enwetara Taịa ego buru ibu. N’ezie, ha ga-eru újú n’ihi mbibi ya!

8. Mmetụta dị aṅaa ka mbibi Taịa ga-enwe n’ahụ Saịdọn?

8 Aịsaịa gwaziri Saịdọn, sị: “Ka ihere mee gị, [Saịdọn]: n’ihi na oké osimiri ekwuwo, bụ́ ebe siri ike nke oké osimiri, sị, Ime emeghị m, amụpụtakwaghị m nwa, emekwaghị m ka ụmụ okorobịa topụta, emekwaghị m ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke tozuo okè.” (Aịsaịa 23:4) Mgbe e bibisịrị Taịa, ụsọ oké osimiri ebe obodo ahụ dịbu ga-atọgbọ chakoo. Oké osimiri ga-adị ka ọ na-eti mkpu n’ihi ihe mgbu, dị ka nne ụmụ ya nwụnahụworo, uche akpaghasịakwa ya nke na ọ na-agọ ugbu a na ọ dịghị mgbe ya mụrụ ụmụ. Ihere ga-eme Saịdọn n’ihi ihe mere ada ya.

9. Mwute ndị mmadụ ga-enwe mgbe Taịa dara ga-eyi obi erughị ala e nwere mgbe ihe ndị ọzọ dị aṅaa mere?

9 Ee, akụkọ banyere mbibi nke Taịa ga-akpata iru újú n’ebe nile. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Dị ka ọ dị n’akụkọ a nụrụ banyere Ijipt, ndị mmadụ ga-anọ n’oké ihe mgbu n’otu aka ahụ n’akụkọ banyere Taịa.” (Aịsaịa 23:5, NW) Ihe mgbu nke ndị ahụ na-eru újú ga-enwe ga-eyi nke e nwere n’ihi akụkọ a nụrụ banyere Ijipt. Olee akụkọ nke onye amụma ahụ bu n’obi? Ikekwe ọ bụ mmezu nke “ibu e boro Ijipt,” nke o kwupụtara tupu mgbe ahụ.b (Aịsaịa 19:1-25) Ma ọ bụ, ikekwe, onye amụma ahụ bu n’obi akụkọ mbibi e bibiri ndị agha Fero n’oge Mosis, nke kpatara obi erughị ala n’ebe nile. (Ọpụpụ 15:4, 5, 14-16; Joshua 2:9-11) Ka o sina dị, ndị nụrụ akụkọ banyere mbibi nke Taịa ga-enwe oké mwute. A kpọrọ ha òkù ịgbaga Tashish dị anya maka nchebe, nyekwa ha iwu ka ha jiri ime ụ̀zụ̀ gosipụta iru újú ha: “Gabiganụ Tashish; kwasienụ ákwá ike, unu ndị bi n’ala dị oké osimiri gburugburu.”—Aịsaịa 23:6.

Ọ Na-aṅụrị Ọṅụ Site na “Mgbe Ochie”

10-12. Kọwaa akụ̀ na ụba, ịdị ochie, na ike nke Taịa.

10 Taịa bụ obodo oge ochie, dị ka Aịsaịa chetaara anyị mgbe ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ nke a ka a na-eme unu, gị obodo na-aṅụrị ọṅụ, nke mgbe gara aga ya sitere n’ụbọchị nile nke mgbe ochie?” (Aịsaịa 23:7a) Ịba ọgaranya nke Taịa malitere laa azụ ma ọ dịghị ihe ọzọ n’oge Joshua. (Joshua 19:29) N’afọ ndị gafeworonụ, Taịa abịawo bụrụ nke a ma ama dị ka ndị na-emepụta arịa ọla, ihe ndị e ji enyo mee, na odo e ji esiji ihe. Uwe ndị e ji odo Taịa sijie na-akasị ada ọnụ, ndị a ma ama na-achọsikwa uwe ndị dị oké ọnụ nke Taịa ike. (Tụlee Ezikiel 27:7, 24.) Taịa bụkwa ebe azụmahịa nye ìgwè ndị njem ji ụkwụ nakwa nnukwute ebe e si ebupụ ma na-ebubata ihe.

11 Ọzọkwa, obodo ahụ dị ike n’ịlụ agha. L. Sprague de Camp na-ede, sị: “Ọ bụ ezie na ha enwekebeghị mmasị n’ịlụ agha—ha bụ ndị ọchụ nta ego, ha abụghị ndị agha—ndị Finisia na-eji obi ike dị ukwuu na ịkpọ ekwo nkụ echebe obodo ha. Àgwà ndị a, tinyere ike ha nwere n’ịlụ agha n’ime mmiri, mere ka ndị Taịa nwee ike iguzogide ndị agha Asiria, bụ́ nke kasị ike n’oge ya.”

12 N’ezie, Taịa nwere mmetụta dị ukwuu n’ógbè Mediterranean. “Ụkwụ ya abụọ na-edu ya rịị jee n’ebe dị anya ịnọ dị ka ọbịa.” (Aịsaịa 23:7b) Ndị Finisia na-aga ebe ndị dị anya, na-emepe ebe azụmahịa na ebe ndị ụgbọ mmiri pụrụ ịkwụsịtụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha mụbara wee ghọọ nnukwu ógbè. Dị ka ihe atụ, Carthage, nke dị n’ụsọ oké osimiri ebe ugwu Africa, bụ ógbè Taịa. Ka oge na-aga, ọ ga-agafe Taịa ma fọ nke nta ka ya na Rom hara n’ike n’ógbè Mediterranean.

A Ga-emerụ Mpako Ya

13. N’ihi gịnị ka e ji jụọ onye ga-anwa anwa maa Taịa ikpe?

13 N’ihi ịdị ochie nke Taịa nakwa akụ̀ na ụba ya, ajụjụ na-esonụ dabara adaba: “Ònye zubeworo nke a megide Taịa, bụ́ obodo nke na-ekpuwe ndị ọzọ okpueze, nke ndị ahịa ya bụ ndị isi, nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị nsọpụrụ nke ụwa?” (Aịsaịa 23:8) Ònye ga-anwa anwa kwuo okwu megide obodo nke họpụtaworo ndị dị ike ịnọ n’ọkwá ndị dị elu n’ógbè ya dị iche iche nakwa n’ebe ndị ọzọ—si otú a ghọọ “obodo nke na-ekpuwe ndị ọzọ okpueze”? Ònye ga-anwa anwa kwuo okwu megide obodo ukwu nke ndị ahịa ya bụ ndị isi, ndị ọzụ ahịa ya bụkwa ndị a na-asọpụrụ? Maurice Chehab, onye bụbu onye nduzi maka ihe ochie na Ebe Ndebe Ihe Ochie Mba nke Beirut, Lebanọn, kwuru, sị: “Malite na narị afọ nke itoolu ruo na nke isii B.C., Taịa nọgidere na-enwe ọnọdụ dị mkpa nke London maara ná mmalite nke narị afọ nke iri abụọ.” Ya mere ònye ga-anwa anwa kwuo okwu megide obodo a?

14. Ònye mara Taịa ikpe, n’ihi gịnịkwa?

14 Nzaghachi sitere n’ike mmụọ nsọ ga-akpata obi erughị ala na Taịa. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ezubewo ya, ime ka mpako nke ịma mma nile ghara ịdị nsọ, ime ka e lelịa ndị nsọpụrụ nile nke ụwa.” (Aịsaịa 23:9) N’ihi gịnị ka Jehova ji maa obodo oge ochie a, nke bara ọgaranya, ikpe? Ọ̀ bụ n’ihi na ndị bi na ya na-efe chi ụgha bụ́ Beal? Ọ̀ bụ n’ihi njikọ dị n’agbata Taịa na Jezebel—ada Eze Etbeal nke Saịdọn nakwa Taịa—onye Eze Ehab nke Israel lụrụ, onye gbukwara ndị amụma Jehova? (1 Ndị Eze 16:29, 31; 18:4, 13, 19) Azịza nye ajụjụ abụọ ahụ bụ ee e. A mara Taịa ikpe n’ihi oké mpako ya—o jiriwo ndị ọzọ maa abụba, tinyere ndị Israel. Na narị afọ nke itoolu T.O.A., site n’ọnụ onye amụma bụ́ Joel, Jehova gwara Taịa na obodo ndị ọzọ, sị: “Ụmụ Juda na ụmụ Jerusalem ka unu na-ere nye ụmụ ndị Jevan, ka unu wee mee ka ha si n’ókèala ha jee n’ebe dị anya.” (Joel 3:6) Chineke ọ̀ pụrụ ileghara mmeso Taịa mesoro ndị Ya na ha nọ n’ọgbụgba ndụ dị ka ngwá ahịa efu anya?

15. Gịnị ka Taịa ga-eme mgbe Nebukadneza meriri Jerusalem?

15 Ngafe nke otu narị afọ agaghị eme ka Taịa gbanwee. Mgbe ndị agha Eze Nebukadneza nke Babilọn ga-ebibi Jerusalem na 607 T.O.A., Taịa ga-eti mkpu ọṅụ, sị: “Ehee, e tipịawo ya [Jerusalem], bụ́ obodo nke bụ́ ọnụ ụzọ ndị nile dị iche iche; o chigharịwo n’ebe m nọ: m ga-eju eju, e mewo ya mkpọmkpọ ebe.” (Ezikiel 26:2) Taịa ga-aṅụrị ọṅụ, na-atụ anya irite uru ná mbibi e bibiri Jerusalem. Ebe isi obodo Juda na-adịkwaghị ama ya aka, ọ ga-atụ anya inwekwu ndị ahịa. Jehova ga-eme ka e lelịa ndị kpọrọ onwe ha “ndị nsọpụrụ,” bụ́ ndị ji nganga na-akwado ndị iro nke ndị ya.

16, 17. Gịnị ga-eme ndị bi na Taịa mgbe obodo ahụ dara? (Lee nkọwa ala ala peji.)

16 Aịsaịa gara n’ihu n’ikpe Jehova mara Taịa, sị: “Rubiga n’etiti ala gị dị ka Naịl, gị ada Tashish; ihe ike n’úkwù adịghịkwa ọzọ. Aka Ya ka O setịworo n’elu oké osimiri, O mewo ka alaeze dị iche iche maa jijiji: Jehova enyewo iwu banyere [Finisia], ikpochapụ ebe siri ike ya nile. O wee sị, Ị gaghị aṅụrịkwa ọṅụ agha ọzọ, gị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emegbu, bụ́ ada [Saịdọn]: bilie, gabiga ruo Kitim; ọbụna n’ebe ahụ ọ dịghị izu ike ị ga-enwe.”—Aịsaịa 23:10-12.

17 N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Taịa “ada Tashish”? Ikekwe n’ihi na mgbe e merisịrị Taịa, Tashish ga-abụ nke ka ike n’ime ha abụọ.c Ndị bi na Taịa ahụ e bibiri ebibi ga-agbasasị dị ka osimiri jubigara ókè, nke gabigara ụsọ ya nile, mmiri ya ana-erubakwa na mbara ala nile dị gburugburu. Ozi Aịsaịa ziri “ada Tashish” na-emesi ịdị njọ nke ihe ga-eme Taịa ike. Jehova n’onwe ya setịrị aka ya ma nye iwu ahụ. Ọ dịghị onye pụrụ ịgbanwe ihe ọ ga-arụpụta.

18. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Taịa ‘nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke Saịdọn,’ oleekwa otú ọnọdụ ya ga-esi gbanwee?

18 Aịsaịa kwukwara banyere Taịa dị ka ‘nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke Saịdọn,’ na-egosi na ndị mmeri si mba ọzọ emeribeghị ya mbụ ma kwakọrọ ihe ndị dị n’ime ya, ọ ka bụkwa nke a na-emeritụbeghị emeri. (Tụlee 2 Ndị Eze 19:21; Aịsaịa 47:1; Jeremaịa 46:11.) Otú ọ dị, ugbu a, a ga-ebibi ya, ụfọdụ n’ime ndị bi n’ime ya ga-agafekwa n’ógbè Finisia bụ́ Kitim dị ka ndị na-agba ọsọ ndụ. Ka o sina dị, ebe ha na-adịkwaghị ike n’ụzọ akụ̀ na ụba, ha agaghị enwe ezumike n’ebe ahụ.

Ndị Kaldea Ga-ebibi Ya

19, 20. Ònye ka e buru n’amụma ga-emeri Taịa, oleekwa otú e si mezuo amụma ahụ?

19 Olee ike ọchịchị ga-emezu ikpe Jehova n’ahụ Taịa? Aịsaịa na-ekwu, sị: “Lee, ala ndị Kaldea; ndị nke a adịghị; Asiria edoziworo ya anụ ọhịa nile nke biri n’ala kpọrọ nkụ: ha mere ka ụlọ nche ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ụlọ elu ya nile; o mere ya ka ọ ghọọ ebe dara ada. Kwasienụ ákwá ike, unu ụgbọ nke Tashish: n’ihi na e bibiwo ebe siri ike unu.” (Aịsaịa 23:13, 14) Ọ bụ ndị Kaldea—ọ bụghị ndị Asiria—ga-emeri Taịa. Ha ga-ewu ụlọ elu nnọchibido, tikpọsịa ebe obibi nile dị na Taịa, meekwa ka ebe e wusiri ike nke ụgbọ mmiri Tashish bụrụ mkpọmkpọ ebe.

20 N’imezu amụma ahụ, oge na-adịghị anya mgbe Jerusalem dasịrị, Taịa nupụụrụ Babilọn isi, Nebukadneza nọchibidokwara obodo ahụ. N’ikwenye na a pụghị imeri ya emeri, Taịa siwere ọnwụ. Ka ha nọchibidoro ya, isi ndị agha Babilọn ‘kwọchara’ n’ihi okpu agha na-echi ha n’isi, ubu ha ‘chihịasịkwara’ n’ihi ibu ngwongwo ndị e ji wuo ihe nnọchibido. (Ezikiel 29:18) Nnọchibido ahụ furu Nebukadneza oké ihe. O bibiri obodo Taịa nke dị n’elu ala, ma ọ kwaraghị ihe nkwata dị n’ime ya. E bufewo ihe ka ukwuu n’akụ̀ Taịa ná ntakịrị àgwàetiti dị ihe dị ka kilomita 0.8 site n’elu ala. Ebe ha na-enweghị usuu ụgbọ mmiri, eze Kaldea emerilighị àgwàetiti ahụ. Mgbe afọ 13 gasịrị, Taịa chịliri aka elu, ma ọ ga-adịgide wee hụ mmezu nke amụma ndị ọzọ.

‘Ọ Ghaghị Ịlaghachi n’Onyinye Ịkwa Iko Ya’

21. N’ụzọ dị aṅaa ka e si ‘chezọọ’ Taịa, ọ bụkwa ruo ogologo oge hà aṅaa?

21 Aịsaịa gara n’ihu ibu amụma, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na a ga-echezọ Taịa [iri afọ asaa], dị ka ụbọchị nile nke otu eze si dị.” (Aịsaịa 23:15a) Mgbe ndị Babilọn bibisịrị obodo ya nke dị n’elu ala, “a ga-echezọ” obodo Taịa nke bụ́ àgwàetiti. N’imezu amụma ahụ, ruo ogologo oge “otu eze” ga-achị—Alaeze Ukwu Babilọn—obodo Taịa nke bụ́ àgwàetiti, agaghị abụ obodo dị ike n’ụzọ ego. Jehova, site n’ọnụ Jeremaịa, gụnyere Taịa ná mba ndị a kpọrọ aha ga-aṅụ iwe nke ọnụma Ya. Ọ na-ekwu, sị: “Mba ndị a ga-efekwa eze Babilọn [iri afọ asaa].” (Jeremaịa 25:8-17, 22, 27) N’eziokwu, obodo Taịa nke bụ́ àgwàetiti, anọrughị afọ 70 n’okpuru Babilọn, ebe Alaeze Ukwu Babilọn dara na 539 T.O.A. Dị ka ihe àmà gosiri, afọ 70 ahụ na-anọchite anya oge Babilọn kasị nwee ike ọchịchị—mgbe usoro ndị eze Babilọn na-etu ọnụ na o buliwo ocheeze ya elu ọbụna karịa “kpakpando nile nke Chineke.” (Aịsaịa 14:13) Ọ chịwo mba dị iche iche n’oge dị iche iche. Ma mgbe afọ 70 ahụ gwụsịrị, ọchịchị ahụ ga-ada. Gịnị ga-eme Taịa mgbe ahụ?

22, 23. Gịnị ga-eme Taịa mgbe o si n’okpuru ọchịchị Babilọn pụta?

22 Aịsaịa gara n’ihu, ikwu, sị: “Mgbe [iri afọ asaa] ahụ gwụsịrị ọ ga-adịrị Taịa dị ka abụ nwanyị na-akwa iko. Were ụbọ akwara, jegharịa n’obodo gburugburu, gị nwanyị na-akwa iko nke e chezọrọ echezọ; kpọọ ya nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ, ka e wee cheta gị. Ọ ga-erukwa, mgbe [iri afọ asaa] ahụ gwụsịrị, na Jehova ga-eleta Taịa, o wee lọta n’onyinye ịkwa iko ya, ya na alaeze nile nke ụwa nke dị n’elu ụwa ewee kwaa iko.”—Aịsaịa 23:15b-17.

23 Mgbe Babilọn dasịrị na 539 T.O.A., Finisia ghọrọ ógbè nọ n’okpuru onye nnọchianya eze Alaeze Ukwu Medo-Peasia. Eze Peasia, bụ́ Saịrọs Onye Ukwu, bụ onye ọchịchị na-anabata echiche ndị ọzọ. N’okpuru ọchịchị ọhụrụ a, Taịa ga-amaliteghachi ọrụ mbụ ya ma gbalịsie ike ịghọghachi ebe a ma ama dị ka ebe bụ́ isi azụmahịa n’ụwa—dị nnọọ ka nwanyị na-akwa iko nke e chezọworo, onye ndị ahịa ya hapụwokwara, na-esi achọ ndị ahịa ọhụrụ site n’ịgagharị n’ime obodo, na-akpọ ụbọ akwara ya, na-abụkwa abụ. Taịa ọ̀ ga-enwe ihe ịga nke ọma? Ee, Jehova ga-eme ka o nwee ihe ịga nke ọma. Ka oge na-aga, obodo ya nke bụ́ àgwàetiti ga-aba nnọọ ọgaranya nke na ka ọ na-eru ná ngwụsị narị afọ nke isii T.O.A., Zekaraịa onye amụma ga-ekwu, sị: “Taịa wee wuoro onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dị ka ájá, na ọlaedo ọma dị ka apịtị nke ámá.”—Zekaraịa 9:3.

‘Uru Ahịa Ya Aghaghị Ịghọ Ihe Nsọ’

24, 25. (a) Olee otú uru ahịa Taịa si ghọọ ihe nsọ nye Jehova? (b) N’agbanyeghị aka Taịa nyeere ndị Chineke, amụma dị aṅaa ka Jehova mere ka e buo banyere ya?

24 Lee ka okwu amụma ndị na-esonụ si kwesị ịrịba ama! “Uru ahịa ya na onyinye ịkwa iko ya ga-aghọkwa ihe nsọ Jehova nwere: a gaghị edebe ya n’ụlọ akụ̀, a gaghị ebukọbakwa ya; n’ihi na ndị bi n’ihu Jehova ga-enwe uru ahịa ya, iriju afọ, na inwe ákwà mgbokwasị na-adịgide adịgide.” (Aịsaịa 23:18) Olee otú uru ihe onwunwe nke Taịa ga-esi ghọọ ihe dị nsọ? Jehova gbanwere ihe ka e wee jiri ya mee ihe dị ka uche ya si dị—ka ndị ya wee rijuo afọ, ka ha nweekwa ákwà mgbokwasị n’ahụ. Nke a mezuru mgbe ndị Israel si n’ije biri na Babilọn lọta. Ndị Taịa nyeere ha aka site n’ibunye ha osisi cedar maka iji wughachi ụlọukwu ahụ. Ha na obodo Jerusalem maliteghachikwara ịzụkọrịta ahịa.—Ezra 3:7; Nehemaịa 13:16.

25 N’agbanyeghị nke a, Jehova kpaliri nkwupụta okwu ọzọ megide Taịa. Zekaraịa buru amụma banyere obodo a bụ́ àgwàetiti, nke bara ọgaranya ugbu a, sị: “Lee, Onyenwe anyị ga-anapụ ya ala ya, [tigbuo ndị agha ya] n’oké osimiri, ọ bụkwa ya [onwe] ya ka ọkụ ga-erepịa.” (Zekaraịa 9:4) Nke a mezuru na July 332 T.O.A., mgbe Alexander Onye Ukwu bibiri eze nwanyị ahụ nke oké osimiri.

Zere Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya na Mpako

26. N’ihi gịnị ka Chineke ji maa Taịa ikpe?

26 Jehova mara Taịa ikpe n’ihi mpako ya, bụ́ àgwà ọ kpọrọ asị. “Anya dị elu” bụ ihe mbụ e depụtara n’ime ihe asaa Jehova kpọrọ asị. (Ilu 6:16-19) Pọl jikọtara mpako na Setan bụ́ Ekwensu, nkọwa Ezikiel nyere Taịa dị mpako nwekwara ihe ndị dị n’ime ya kọwara Setan n’onwe ya. (Ezikiel 28:13-15; 1 Timoti 3:6) Gịnị mere Taịa ji dị mpako? Ezikiel, n’ịgwa Taịa okwu, kwuru, sị: “Obi gị wee dị elu n’ihi akụ̀ gị.” (Ezikiel 28:5) Obodo ahụ mikpuru onwe ya n’azụmahịa na ịkpakọba ego. Ihe ịga nke ọma Taịa nwere na nke a mere ka ọ dịbiga mpako ókè. Site n’ọnụ Ezikiel, Jehova gwara “onye ndú Taịa,” sị: “Obi gị adịwo elu, i wee sị, Chi ka m bụ, n’ọnọdụ Chineke ka m na-anọkwasị.”—Ezikiel 28:2.

27, 28. N’ọnyà dị aṅaa ka ụmụ mmadụ pụrụ ịdaba, oleekwa otú Jisọs si mee ihe atụ nke a?

27 Mba pụrụ ịdaba ná mpako na inwe echiche na-ezighị ezi banyere akụ̀ na ụba—otú a kwa ka ọ dị ndị mmadụ n’otu n’otu. Jisọs tụrụ ilu gosiri otú ọnyà a pụrụ isi dị aghụghọ. O kwuru banyere otu ọgaranya, onye ubi ya mere nri nke ọma. N’obi ụtọ, nwoke ahụ mere atụmatụ iwu ọbá buru ibu karị maka ihe ubi ya ma jiri obi ụtọ na-atụ anya ibi ogologo ndụ ná ntụsara ahụ. Ma nke a emezughị. Chineke sịrị ya: “Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị; ma ihe i doziri, ònye ga-enwe ha?” Ee, nwoke ahụ nwụrụ, akụ̀ na ụba ya abaghịkwara ya uru.—Luk 12:16-20.

28 Jisọs mechiri ilu ahụ site n’ikwu, sị: “Otú a ka ọ dị, bụ́ onye na-akpadoro onwe ya akụ̀, ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:21) Ịba ọgaranya adịghị njọ n’onwe ya, ubi mmadụ ime nke ọma abụghịkwa mmehie. Ebe nwoke ahụ hiere ụzọ bụ omume o mere ka ihe ndị a bụrụ isi ihe ná ndụ ya. Ọ tụkwasịrị obi ya nile n’akụ̀ na ụba ya. Mgbe ọ na-atụ anya ọdịnihu, o chetaghị Jehova Chineke.

29, 30. Olee otú Jemes si dọọ aka ná ntị megide mmadụ ịdabere n’onwe ya?

29 Jemes kwuru otu okwu a n’ụzọ dị ike. Ọ sịrị: “Geenụ ntị, unu ndị na-asị, Taa ma ọ bụ echi ka anyị ga-aga obodo a, nọọkwa n’ebe ahụ otu afọ, zụọkwa ahịa, ritekwa uru: ma unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi. Ndụ unu bụ gịnị? N’ihi na unu bụ alụlụụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya. Ma nke kwesịrị unu ka unu kwuo bụ, A sị na Onyenwe anyị chọrọ, anyị ga-adị ndụ, meekwa ihe a ma ọ bụ ihe ahụ.” (Jemes 4:13-15) Jemes gosiziri njikọ dị n’agbata akụ̀ na ụba na mpako mgbe ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Unu na-anya isi n’oké okwu unu: ịnya isi nile dị otú a bụ ajọ ihe.”—Jemes 4:16.

30 Ọzọkwa, ịchụ nta ego abụghị mmehie. Ihe bụ́ mmehie bụ mpako, nganga, ịtụkwasị onwe onye obi nke inwe akụ̀ na ụba pụrụ ịkpali. N’ụzọ amamihe, ilu oge ochie sịrị: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀.” Ịda ogbenye pụrụ ime ka ndụ taa akpụ. Ma akụ̀ na ụba pụrụ iduba mmadụ ‘n’ịgọnahụ Chineke, sị, Ònye bụ Jehova?’—Ilu 30:8, 9.

31. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka onye Kraịst kwesịrị ịjụ onwe ya?

31 Anyị na-ebi n’ụwa ebe ọtụtụ ndị dabaworo n’anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. N’ihi ọnọdụ achụmnta ego zuru ebe nile, a na-eji akụ̀ na ụba akpọrọ oké ihe. N’ihi ya, onye Kraịst kwesịrị inyocha onwe ya iji jide n’aka na ọ dịghị adaba n’otu ọnyà ahụ nwụdere obodo azụmahịa bụ́ Taịa. Ọ̀ na-etinye ihe dị ukwuu n’oge ya na ume ya n’ịchụso ihe onwunwe nke na ọ bụ, n’ezie, ohu akụ̀ na ụba? (Matiu 6:24) Ọ̀ na-enwere ndị ọ pụrụ ịbụ na ha nwere ọtụtụ ihe onwunwe karịa ya ma ọ bụ ndị ka ndị nke ya mma anyaụfụ? (Ndị Galetia 5:26) Ọ bụrụ na ọ bara ọgaranya, ò ji mpako na-eche na ya kwesịrị inweta nsọpụrụ ma ọ bụ ihe ùgwù karịa ndị ọzọ? (Tụlee Jemes 2:1-9.) Ọ bụrụ na ọ baghị ọgaranya, ọ̀ “na-ezube ịbụ ọgaranya,” n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe? (1 Timoti 6:9, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ̀ na-eji ọrụ achụmnta ego n’aka nke ukwuu nke na ọ hapụrụ nanị akụkụ dị nta ná ndụ ya maka ijere Chineke ozi? (2 Timoti 2:4) Ọ̀ na-emikpu onwe ya nke ukwuu n’ịchụso akụ̀ na ụba nke na ọ na-eleghara ụkpụrụ ndị Kraịst anya n’achụmnta ego ya?—1 Timoti 6:10.

32. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jọn nyere, oleekwa otú anyị pụrụ isi jiri ya mee ihe?

32 N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị n’ụzọ akụ̀ na ụba, Alaeze ahụ kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ anyị. Ọ dị mkpa na anyị elegharaghị ihe ndị Jọn onyeozi kwuru anya mgbe ọ bụla: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya.” (1 Jọn 2:15) N’eziokwu, anyị aghaghị iji ndokwa inweta akụ̀ na ụba nke ụwa mee ihe iji dịrị ndụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) N’ihi ya, anyị ‘na-eji ụwa eme ihe’—ma anyị adịghị ‘ejibiga ya ókè.’ (1 Ndị Kọrint 7:31) Ọ bụrụ na anyị hụrụ ihe onwunwe—ihe ndị dị n’ụwa—n’anya gabiga ókè, anyị ahụkwaghị Jehova n’anya. Ịchụso “agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi” na ime uche Chineke adịghị agakọ.d Ọ bụkwa ime uche Chineke bụ ihe na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:16, 17.

33. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi zere ọnyà matara Taịa?

33 Ọnyà nke ibute nchụso nke ihe onwunwe ụzọ matara Taịa. O nwere ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe, wee dị nnọọ mpako, a taakwa ya ahụhụ maka mpako ya. Ihe atụ ya bụ ịdọ aka ná ntị nye mba dị iche iche na ndị mmadụ n’otu n’otu taa. Lee ka o si ka mma ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi! Ọ na-agba ndị Kraịst ume “ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ihe dị elu, gharakwa ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.”—1 Timoti 6:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà mmụta ụfọdụ ekwuwo na Tashish bụ Sadinia ugbu a, bụ́ àgwàetiti dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ Mediterranean. Sadinia n’onwe ya dị anya site na Taịa.

b Lee Isi nke 15, peji nke 200-207, nke akwụkwọ a.

c N’aka nke ọzọ, “ada Tashish” pụrụ izo aka ná ndị bi na Tashish. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Ndị Tashish nweere onwe ha ugbu a ime njem na ịzụ ahịa dị ka Naịl mgbe ọ na-asọbanye ebe nile.” Ma, ihe a na-emesi ike bụ oké ihe ọjọọ ndị ọdịda Taịa ga-akpata.

d “Oké okwu nke ibi obi” bụ nsụgharị nke okwu Grik bụ́ a·la·zo·niʹa, nke a na-akọwa dị ka “echiche enweghị nsọpụrụ, nke na-enweghịkwa isi, nke ịtụkwasị nguzosi ike nke ihe ndị dị n’ụwa obi.”—The New Thayer’s Greek-English Lexicon.

[[Map dị na peeji 256]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EUROPE

SPAIN (Ebe ọ pụrụ ịbụ na TASHISH dị)

OKÉ OSIMIRI MEDITERRANEAN

SARDINIA

SAỊPRỌS

ESIA

SAỊDỌN

TAỊA

AFRICA

IJIPT

[Foto dị na peeji nke 250]

Ọ bụ Babilọn, ọ bụghị Asiria, ga-emeri Taịa

[Foto dị na peeji nke 256]

Mkpụrụ ego bu onyinyo Melkart, bụ́ chi bụ́ isi nke Taịa

[Foto dị na peeji nke 256]

Ihe atụ nke ụgbọ ndị Finisia

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya