Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”
    Ụlọ Nche—2013 | Julaị 15
    • 13. Gịnị ka Mkpughe 18:7 kwuru na Krisendọm na okpukpe ndị ọzọ so na Babịlọn Ukwu ahụ na-eme ugbu a?

      13 Ihe nke atọ ga-emenụ bụ na ata ahụ ga-akwa ákwá, taakwa ikikere ezé. Ndị mmụọ ozi kekọtachaa ata ahụ, gịnịzi ga-eme? Jizọs kwuru ihe ndị ahụ bụ́ ata ga-eme. Ọ sịrị: “N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.” (Mat. 13:42) Ihe a Jizọs kwuru ọ̀ malitela ime? Mba. Ị manụ na Krisendọm so na nwaanyị akwụna ahụ. Ọ ka na-ekwu, sị: “Anọ m ọdụ dị ka eze nwaanyị, abụghịkwa m nwaanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa mgbe m ga-ahụ iru uju.” (Mkpu. 18:7) Nke bụ́ eziokwu bụ na Krisendọm ka na-akpa ike. Ọ na-ekwudị na ya nọ “ọdụ dị ka eze nwaanyị” ndị ọchịchị. Ka ọ dị ugbu a, ndị bụ́ ata ahụ anaghị eru uju, kama ha na-etu ọnụ. Ma, egwú ga-adagharị n’oge na-adịghị anya.

      Krisendọm na ndị ọchịchị ụwa bụ nnu na mmanụ ugbu a. Ma, egwú ga-adagharị n’oge na-adịghị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

      14. (a) Olee mgbe Ndị Kraịst adịgboroja ‘ga-ata ikikere ezé’? Gịnịkwa mere ha ga-eji ata ya? (b) Olee otú Abụ Ọma 112:10 si kwado otú anyị si ghọta Matiu 13:42 ugbu a? (Gụọ ihe nke ise e dere n’ala ala peeji nke 14.)

      14 Mgbe e bibichara okpukpe ụgha niile n’oké mkpagbu ahụ, ndị na-akwadobu ha ga-agba ọsọ, na-achọ ebe ha ga-ezo, ma ha agaghị ahụ ebe ọ bụla. (Luk 23:30; Mkpu. 6:15-17) Ebe ọ bụ na ha ma na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi ha, ha ga-akwa ákwá arịrị, ‘taakwa ikikere ezé’ n’ihi na iwe jizi ha. Ha ga-eme ihe Jizọs buru amụma na ha ga-eme n’oké mkpagbu ahụ. Ha “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị.”e—Mat. 24:30; Mkpu. 1:7.

      15. Gịnị ka a ga-eme ata ndị ahụ? Olee mgbe ọ ga-abụ?

      15 Ihe nke anọ ga-emenụ bụ na a ga-atụba ata ahụ n’oké ọkụ. Jizọs kwuru na e kekọtachaa ata ndị ahụ n’ùkwù n’ùkwù, ndị mmụọ ozi ‘ga-atụba ha n’oké ọkụ.’ (Mat. 13:42) Ọ pụtara na a ga-ebibi ha. N’ihi ya, ọ bụ n’agha Amagedọn ka a ga-ebibi ndị ahụ na-akwadobu okpukpe ụgha. Agha ahụ bụ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ.—Mal. 4:1.

  • “Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”
    Ụlọ Nche—2013 | Julaị 15
    • e Paragraf nke 14: Ihe a bụ otú anyị si ghọta Matiu 13:42 ugbu a. Akwụkwọ anyị kwuburu na Ndị Kraịst adịgboroja ‘na-akwa ákwá, na-atakwa ikikere ezé’ kemgbe ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-ewute ha na “ụmụ nke alaeze” na-eme ka a mara na ha bụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” (Mat. 13:38) Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ bụ mgbe a ga-ebibi ha ka ha ga-ata ikikere ezé.—Ọma 112:10.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya