Olee Ihe Ị Ga-akwụ Maka Nke A?
Ọ DỊ ihe maara bara oké uru nke na ị ga-adị njikere iji ihe nile i nwere chụọ àjà iji nweta ya? Jisọs maara, ọ gwakwara ụmụ azụ ya banyere ya.
Ọ sịrị: “Alaeze eluigwe yiri onye ahịa na-achọ pearl ọma: ma mgbe ọ hụrụ otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.”—Matiu 13:45, 46.
Onye ahịa ahụ dị njikere ịhapụ ihe nile iji nweta “pearl” ahụ, bụ́ Alaeze Chineke. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ụwa a ga-eji tụnyere ya. Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu nile ndị mmadụ na-enwebeghị ike ịgwọta, dị ka agha, agụụ, mpụ, na mmegbu. (Abụ Ọma 72:4-8, 13, 14) N’okpuru Alaeze ahụ, ọbụna mmehie, ọrịa, na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. (Mkpughe 21:4, 5) Ka a sịkwa ihe mere arịrịọ nke abụọ nke Ekpere Onyenwe Anyị (“Nna Anyị”) ji bụrụ, “Ka alaeze gị bịa”!—Matiu 6:9, 10.
Olee ihe ị ga-akwụ iji kere òkè ná ngọzi nile nke Alaeze ahụ? N’ezie, ngọzi ndị ahụ bụ n’efu. Ma i ji nụ ụtọ ha, ị ghaghị ịmata ihe Alaeze ahụ bụ, kwere na ọ dị adị, nyekwa ya ọnọdụ mbụ ná ndụ gị. Ị̀ pụrụ ime nke ahụ? E nwere ihe ọmụma nke ga-enyere gị aka n’ime Bible. Gịnị mere ị gaghị ekwe ka Ndịàmà Jehova nyere gị aka n’ịmụta banyere Alaeze Chineke na ịchọta otú ọ pụrụ isi wetara gị uru ọbụna ugbu a.