Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!
    Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
    • Ụgbụ Ahụ

      15, 16. (a) Kọọ ihe atụ ụgbụ ahụ ná mkpirikpi. (b) Gịnị ka ụgbụ ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe ihe atụ a na-akọwa banyere uto Alaeze ahụ?

      15 Ihe dị mkpa abụghị mmadụ ole sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kama ọ bụ ụdị ndị na-eso ụzọ ha bụ. Jizọs mere ka ihe a metụtara uto Alaeze ahụ pụta ìhè mgbe o nyere ihe atụ ọzọ banyere ụgbụ. O kwuru, sị: “Ọzọ, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri nke na-ekpokọta ụdị azụ̀ niile.”—Mat. 13:47.

      16 Ụgbụ ahụ, bụ́ nke na-anọchi anya ọrụ nkwusa Alaeze, nwụdere ụdị azụ ọ bụla. Jizọs gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe [ụgbụ ahụ] juru, ha dọgotara ya n’ikpere osimiri, ha wee nọdụ ala, chịkọta ndị dị mma wụnye n’arịa dị iche iche, ma ha tụfuru ndị na-adịghị mma. Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a: ndị mmụọ ozi ga-aga kewapụ ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume, ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ. N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.”—Mat. 13:48-50.

      17. Olee oge nkewa ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke ụgbụ ahụ na-ezo aka na ya?

      17 Nkewa a ọ̀ na-ezo aka n’ikpe ikpeazụ a ga-ekpe ụmụ atụrụ na ụmụ ewu nke Jizọs kwuru ga-eme mgbe ọ bịara n’ebube ya? (Mat. 25:31-33) Mba. A ga-ekpe ikpe ikpeazụ ahụ mgbe Jizọs ga-abịa n’oge oké mkpagbu ahụ. Ma nkewa ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke ụgbụ ahụ ga-abụ ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.’b Nke bụ́ oge anyị bi na ya ugbu a—oge na-eduga n’oké mkpagbu ahụ. Oleezi otú e si na-arụ ọrụ nkewa ugbu a?

      18, 19. (a) Olee otú ọrụ nkewa si na-aga n’ihu ugbu a? (b) Gịnị ka ndị nwere ezi obi kwesịrị ime? (Leekwa ihe e dere n’ala ala peeji nke 21.)

      18 N’ụzọ nkịtị, a na-adọta nnọọ ọtụtụ nde azụ ihe atụ si n’oké osimiri bụ́ ọha mmadụ, n’ọgbakọ Jehova n’oge a. Ụfọdụ n’ime ha na-abịa Ncheta nke ọnwụ Jizọs, ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ ihe anyị, ebe ndị ọzọ na-enwe mmasị ka anyị na-amụrụ ha Baịbụl. Ma ndị a niile hà na-aghọ ezigbo Ndị Kraịst? Ha nwere ike iso ná ndị a “dọgotara n’ikpere osimiri,” ma Jizọs kwuru na ọ bụ naanị “ndị dị mma” ka a wụnyere n’arịa dị iche iche, bụ́ nke ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst na-anọchi anya ha. A tụfuru ndị nke na-adịghị mma, bụ́ ndị a ga-emecha tụba n’oké ọkụ ihe atụ, nke na-anọchi anya mbibi a ga-ebibi ha n’ọdịnihu.

      19 Dị ka ọ dị azụ ndị nke ahụ na-adịghị mma, ọtụtụ ndị ndị Jehova na-amụrụ ihe akwụsịla ịmụ Baịbụl. Ụfọdụ ndị a mụrụ n’ezinụlọ Ndị Kraịst enweghị mmasị iso ụzọ Jizọs. Ha adịbeghị njikere ikpebi ijewere Jehova ozi, ụfọdụ ndị nke metụrụla otú ahụ akwụsịla ijere Jehova ozi.c (Ezik. 33:32, 33) Ma, ọ dị oké mkpa ugbu a ka ndị niile nwere obi eziokwu kwe ka a chịkọta ha n’ọgbakọ dị iche iche nke yiri arịa tupu ụbọchị ikpe ikpeazụ, ọ dịkwa mkpa ka ha nọgide n’ebe ga-echebe ha.

  • Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!
    Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
    • 20, 21. (a) Gịnị ka anyị mụtarala site n’ịtụle ihe atụ ndị Jizọs nyere banyere uto? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

      20 Olee ihe ndị anyị mụtara site ná ntụle a dị mkpirikpi anyị tụlere ihe atụ Jizọs nyere banyere uto? Nke mbụ, dị ka mkpụrụ mọstad si eto, e nweela uto dị ukwuu n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ụwa a. Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-egbochi ọrụ Jehova ịga n’ihu! (Aịza. 54:17) Tụkwasị na nke ahụ, a na-echebe ndị gara ‘biri na ndò nke osisi ahụ’ ka Setan na ụwa ọjọọ ya ghara inweta ha. Nke abụọ, ọ bụ Chineke na-eme ka a na-enwe uto. Dị nnọọ ka ihe iko achịcha zoro ezo na-eko ntụ ọka buru ibu, ọ bụghị mgbe niile ka a na-ahụ ma ọ bụ ghọta uto a nke ọma, ma ọ na-eto n’ezie. Nke atọ, ọ bụghị ndị niile kwere ịmụ ihe na-emecha ghọọ ndị dị mma. Ụfọdụ aghọọla azụ ndị ahụ na-adịghị mma e kwuru okwu ha n’ihe atụ Jizọs.

  • Ị Maghị Ebe Ọ Ga-eme nke Ọma!
    Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
    • b Ọ bụ ezie na Matiu 13:39-43 na-ekwu banyere akụkụ dị iche nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, mmezu ya dabara n’oge ihe atụ ụgbụ ahụ na-emezu, ya bụ, n’oge “ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” Nkewa nke azụ ihe atụ ndị ahụ bụ ọrụ na-aga n’ihu, dị nnọọ ka ọrụ ịkụ mkpụrụ na iwe ihe ubi na-aga n’ihu n’oge a niile.—Ụlọ Nche, October 15, 2000, peeji nke 25-26; Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, peeji nke 178-181, paragraf 8-11.

      c Nke a ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi atụfuola onye ọ bụla kwụsịrịla iso ndị Jehova na-amụ ihe ma ọ bụ onye kwụsịrịla ịbịa ọmụmụ ihe, na-agụnye ya ná ndị na-adịghị mma? Ee e! Ọ bụrụ na e nwee onye ji obi ya niile chọọ ịlọghachikwute Jehova, ọ ga-anabata ya.—Mal. 3:7.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya