Gịnị Ka Oké Ụgbụ na Azụ ahụ Pụtara Nye Gị?
“Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe.”—MATIU 13:11.
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee mmasị n’ilu Jisọs?
Ọ̀NA-AMASỊ gị ịmata ihe nzuzo ma ọ bụ ịkọwa ihe dị mgbagwoju anya? Gịnị ma ọ bụrụ na ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịhụta n’ụzọ doro anya karị òkè gị ná nzube Chineke? N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ị pụrụ inweta nghọta ihe ùgwù dị otú ahụ site n’otu ilu nke Jisọs tụrụ. Ọ gbagwojuru ọtụtụ ndị nụrụ ya anya, ọ gbagwojuwokwa ọtụtụ ndị ọzọ eri mgbe ahụ anya, ma gị onwe gị pụrụ ịghọta ya.
2 Rịba ama ihe Jisọs kwuru na Matiu isi nke 13 banyere ojiji o ji ilu na-eme ihe. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka ị na-agwa ha okwu n’ilu?” (Matiu 13:10) Ee, n’ihi gịnị ka Jisọs ji jiri ilu nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-agaghị aghọta na-eme ihe? Ọ zaghachiri n’amaokwu nke 11 ruo 13, sị: “Ọ bụ unu ka e nyeworo ịmara ihe omimi alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ. . . . N’ihi nke a ka m na-agwa ha okwu n’ilu; n’ihi na ha adịghị ahụ n’ọhụhụ, ha adịghị anụkwa n’ọnụnụ, ha adịghị anụtakwa.”
3. Olee ụzọ ịghọta ilu Jisọs nile pụrụ isi wetara anyị ọtụtụ abamuru?
3 Mgbe ahụ Jisọs webatara Aịsaịa 6:9, 10, bụ́ nke kọwara ndị ntị chiri na ndị kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa anyị ịdị otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị aghọta ma na-eme ihe kwekọrọ n’ilu ya nile, anyị pụrụ inwe obi ụtọ dị ukwuu—ugbu a na n’ọdịnihu n’enweghị ọgwụgwụ. Jisọs na-ekwe anyị nkwa nke a na-ekpo ọkụ: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.” (Matiu 13:16) Nkwa ahụ metụtara ilu nile nke Jisọs, ma ka anyị lekwasị anya n’ihe atụ ahụ dị mkpirikpi nke oké ụgbụ, nke e dekọrọ na Matiu 13:47-50.
Ilu nke Pụtara Ihe Dị Omimi
4. Gịnị ka Jisọs kọrọ n’ụzọ okwu ilu, dị ka e dekọrọ ya na Matiu 13:47-50?
4 “Alaeze eluigwe yiri oké ụgbụ a wụnyere n’ime oké osimiri, nke kpokọtakwara ụfọdụ n’aha azụ nile dị iche iche: nke, mgbe o juru, ha dọgotara ya n’otu; ha wee nọdụ, chịkọta azụ dị mma tinye n’ime ihe, ma ha tụfuru nke na-adịghị mma. Otú a ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ oge a: ndị mmụọ ozi ga-apụta, kewapụta ndị bụ ajọ mmadụ n’etiti ndị ezi omume, ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ ahụ: n’ebe ahụ ka ịkwa ákwá na ịta ikikere eze ahụ ga-adị.”
5. Ụdị ajụjụ dịgasị aṅaa na-ebilite banyere ihe ihe atụ nke oké ụgbụ ahụ pụtara?
5 Ma eleghị anya, ị hụwo ndị ikom ji ụgbụ na-akụ azụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihe nkiri sinima ma ọ bụ na telivishọn, ya mere ihe atụ Jisọs esighị ike iji anya nke uche hụ ya. Ma gịnị banyere ihe ndị o metụtara na ihe ọ pụtara? Dị ka ihe atụ, Jisọs sịrị na ilu nke a bụ banyere “alaeze eluigwe.” Ma, n’ezie o bughị n’uche na ‘aha mmadụ nile,’ ma ndị ọma ma ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ndị ajọ omume, ga-anọ n’Alaeze. Ọzọ, olee ndị na-akụ azụ ahụ? Ịkụ azụ na nkewapụ nke a ò mere n’oge Jisọs, ka a pụrụ idebe ya nanị maka oge anyị, bụ́ “n’ọgwụgwụ oge a”? Ị̀ na-ahụ onwe gị n’ihe atụ nke a? Olee otú ị pụrụ isi zere isonye n’etiti ndị ahụ na-akwa ákwá, na-atakwa ikikere eze ha?
6. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị dị omimi n’ịghọta ihe atụ nke oké ụgbụ ahụ? (b) Gịnị bụ isi ihe dị n’ịghọta ya?
6 Ajụjụ ndị dị otú ahụ na-egosi na ilu nke a adịchaghị mfe. Otú ọ dị, echezọla na: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe.” Ka anyị lee ma anyị pụrụ ịkọwapụta ihe ọ pụtara wee kpughee ihe nzuzo ya ka ntị anyị wee ghara ịbụ nke na-adịghị anụ ihe, ka anya anyị gharakwa ịbụ nke mechiri emechi nye ihe ọ na-egosipụta. N’ezie, anyị enweworị isi ihe dị mkpa iji kpughee ihe ọ pụtara. Isiokwu bu ụzọ kwuru banyere mkpọku Jisọs kpọkuru ndị Galili na-akụ azụ ka ha hapụ ọrụ ahụ ma weghara ọrụ ime mmụọ dị ka “ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” (Mak 1:17) Ọ gwara ha, sị: “Site n’ugbu a [unu] ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.”—Luk 5:10.
7. Gịnị ka Jisọs na-eme ihe atụ ya mgbe o kwuru okwu banyere azụ?
7 N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, azụ nke ihe atụ nke a nọchiri anya ụmụ mmadụ. Ya mere, mgbe amaokwu nke 49 na-ekwu banyere ikewapụ ndị ọjọọ site ná ndị ezi omume, ọ na-ezo aka, ọ bụghị n’anụ ndị bi ná mmiri na-eme ezi omume ma ọ bụ ndị na-eme ajọ omume, kama n’ebe ụmụ mmadụ na-eme ezi omume ma ọ bụ ajọ omume nọ. N’otu aka ahụ, amaokwu nke 50 ekwesịghị ime ka anyị chee echiche banyere anụ ndị bi ná mmiri ndị na-akwa ákwá ma ọ bụ na-ata ikikere eze ha. Ee e. Ihe atụ nke a bụ banyere ịchịkọta ụmụ mmadụ na nkewapụ a ga-emesịa kewapụ ha, bụ́ nke dị oké mkpa, dị ka ihe si na ya pụta na-egosi.
8. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ihe nke ahụ ga-apụtara azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị? (b) N’ihi ihe e kwuru banyere azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere Alaeze ahụ?
8 Rịba ama na azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ya bụ, ndị ajọ omume, bụ ndị a ga-atụba n’oké ọkụ ahụ, bụ́ ebe ha ga-anọ kwaa ákwá, taakwa ikikere eze ha. N’ebe ọzọ, Jisọs jikọrọ ịkwa ákwá na ịta ikikere eze dị otú ahụ n’ịbụ ndị nọ n’èzí Alaeze ahụ. (Matiu 8:12; 13:41, 42) Na Matiu 5:22 na 18:9 (NW), ọ kpọtụrụ ọbụna “Gehena nke na-ere ọkụ” aha, na-ezo aka ná mbibi na-adịgide adịgide. Nke ahụ ọ́ naghị egosi otú o si dị oké mkpa ịghọta isi ilu nke a na ime ihe kwekọrọ na ya? Anyị nile matara na e nweghị ma ọ bụ na a gaghị enwe ndị ajọ omume n’Alaeze Chineke. N’ihi ya, mgbe Jisọs kwuru na “alaeze eluigwe yiri oké ụgbụ,” ihe ọ na-ekwu aghaghị ịbụ na n’ihe banyere Alaeze Chineke, e nwere ihe omume yiri oké ụgbụ nke a tụdara iji kpokọta ụdị azụ dị iche iche.
9. Olee ụzọ ndị mmụọ ozi si sonye n’ilu nke oké ụgbụ ahụ?
9 Mgbe a tụdara ụgbụ ahụ ma kpokọta azụ ahụ, a ga-enwe ọrụ nkewapụ. Olee ndị Jisọs kwuru na ha so n’ọrụ a? Matiu 13:49 na-akọwa ndị ọkụ azụ ndị a na-eme nkewapụ dị ka ndị mmụọ ozi. Jisọs na-agwa anyị banyere nlekọta ndị mmụọ ozi na-elekọta ngwá ọrụ e nwere n’elu ụwa nke e ji amata ndị mmadụ—ụfọdụ dị mma, kwesịkwa ekwesị maka Alaeze eluigwe, ndị ọzọ na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị na-ekwesịghị ekwesị maka ọkpụkpọ ahụ.
Ịkụ Azụ ahụ—Olee Mgbe?
10. Site n’iche echiche dị aṅaa ka anyị pụrụ iji kpebie na ịkụ azụ ahụ gbatịrị ruo ogologo oge buru ibu?
10 Ihe a na-ekwu maka ha n’ebe ahụ na-enyere anyị aka ịmata mgbe nke a mere. Kpọmkwem tupu nke a, Jisọs tụrụ ilu banyere ịgha mkpụrụ ọma, ma e mesịrị jiri ata kụjupụta ubi ahụ, bụ́ nke na-ese onyinyo ụwa. Ọ kọwara na Matiu 13:38 na mkpụrụ ọma ahụ na-anọchite anya “ụmụ alaeze eluigwe; ata ahụ bụ ụmụ ajọ onye ahụ.” Ndị a tokọrọ ọnụ ruo ọtụtụ narị afọ, ruo oge owuwe ihe ubi n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Mgbe ahụ e kewapụrụ, mesịakwa kpọọ ha ọkụ. E jiri nke a tụnyere ilu nke oké ụgbụ ahụ, anyị na-ahụ na iwebata ihe ndị e kere eke n’ime ụgbụ ahụ ga-ewere ọnọdụ ruo ogologo oge.—Matiu 13:36-43.
11. Olee ụzọ ọrụ ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ si malite na narị afo mbụ?
11 Dị ka ihe atụ Jisọs si dị, a ga-ekpokọta azụ n’akpaghị ókè ọ bụla, ya bụ, oké ụgbụ ahụ ga-achịkọta ma azụ ndị ọma ma ndị na-ekwesịghị ekwesị. Mgbe ndị ozi ahụ ka dị ndụ, ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ ịkụ azụ ahụ jiri nzukọ ndị Kraịst nke Chineke mee ihe ịnwụta “azụ” ndị ghọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ. Ị pụrụ ikwu na tupu Pentikọst nke afọ 33 O.A., ọrụ ịkụta ndị mmadụ dị ka azụ nke Jisọs rụrụ nwụtara ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ. (Ọrụ 1:15) Ma ozugbo e guzobesịrị ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ, ọrụ iji oké ụgbụ ahụ na-akụta azụ malitere, a nwụtakwara ọtụtụ puku azụ ndị dị mma. Malite n’afọ 36 O.A. ịkụ azụ ahụ gbasara banye ná mmiri nke ụwa nile, ebe a dọọrọ ndị Jentaịl bịa n’Iso Ụzọ Kraịst, ha wee ghọọ ndị so n’ọgbakọ e tere mmanụ nke Kraịst.—Ọrụ 10:1, 2, 23-48.
12. Gịnị bilitere mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị?
12 Na narị afọ ndị sochiri oge ndị ozi ahụ nwụsịrị, a nọgidere na-enwe ndị Kraịst ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-agbalịsi ike ịchọta na ijigide eziokwu sitere n’aka Chineke. Ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ndị a nwere nkwado Chineke, o jikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Ka o sina dị, ọnwụ nke ndị ozi ahụ wepụrụ mmetụta nke na-akpata mgbochi, na-enye ohere ka ndapụ n’ezi ofufe nke gbasaruru ebe nile bilite. (2 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8) Otu nzukọ bilitere nke na-ekwu n’ụzọ na-ezighị ezi na ya bụ ọgbakọ Chineke. O kwuru n’ụzọ na-ezighị ezi na ya bụ mba ahụ dị nsọ nke e ji mmụọ Chineke tee mmanụ isoro Jisọs chịa achị.
13. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Krisendọm keere òkè n’ọrụ nke oké ụgbụ ahụ?
13 Ì chere na ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-ekwu na ha nọ n’Iso Ụzọ Kraịst nwere akụkụ ọ bụla n’ilu nke oké ụgbụ ahụ? E nwere ihe mere a ga-eji zaa ee, na ha nwere. Oké ụgbụ ihe atụ ahụ gụnyere Krisendọm. N’eziokwu, ruo ọtụtụ ọgbọ, Chọọchị Katọlik nwara ime ka ndị nkịtị ghara ịgụ Bible. Ka o sina dị, ruo ọtụtụ narị afọ, ndị so na Krisendọm keere òkè dị ukwuu n’ịsụgharị, idepụtaghachi, na ikesa Okwu Chineke. Chọọchị dị iche iche mesịrị guzobe ma ọ bụ kwadoo òtù Bible dị iche iche, bụ́ ndị sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ dị iche iche nke mba ndị dị n’ebe dị anya. Ha zipụkwara ndị ozi ala ọzọ na-elekọta ahụ ike na ndị nkụzi bụ́ ndị rụrụ ọrụ n’inweta ndị Kristian osikapa. Nke a chịkọtara ọnụ ọgụgụ bara ụba nke azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, bụ́ ndị na-enweghị nnwapụta Chineke. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, o meghere anya ọtụtụ nde ndị na-abụghị ndị Kristian gaa na Bible nakwa n’otu ụdị nke Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụ ezie na ọ bụ nke a gwagburu agwagbu.
14. Olee ụzọ e si nye aka n’ọrụ ịkụta azụ ọma site n’ọrụ ụfọdụ nke chọọchị nile nke Krisendọm rụrụ?
14 N’oge ahụ nile, ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi gbasasịrị ebe nile bụ́ ndị na-arapagidesi ike n’Okwu Chineke dọgburu onwe ha n’ọrụ ruo otú ha nwere ike. N’oge ọ bụla, ha mejupụtara ezi ọgbakọ e tere mmanụ nke Chineke n’elu ụwa. Anyị pụkwara ijide n’aka na ha onwe ha nwụtakwara azụ, ma ọ bụ ndị mmadụ, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Chineke ga-ele anya dị ka ndị ọma ma were mmụọ ya tee ha mmanụ. (Ndị Rom 8:14-17) Ndị ọma ndị a na-ekwu na ha nọ n’Iso Ụzọ Kraịst nwere ike iweta eziokwu Bible nye ọtụtụ ndị ghọworo ndị Kristian osikapa ma ọ bụ ndị nwetaworo obere ihe ọmụma nke Bible site n’Akwụkwọ nsọ a sụgharịrị n’asụsụ ha site n’aka òtù Bible dị iche iche nke Krisendọm. N’eziokwu, nchịkọta nke azụ ọma ahụ na-aga n’ihu, ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Krisendọm na-achịkọta ekwesịghị ekwesị site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya.
15. N’ụzọ kwụ ọtọ, gịnị ka oké ụgbụ nke ihe atụ ahụ na-anọchite anya ya?
15 Ya mere oké ụgbụ ahụ na-anọchite anya ngwá ọrụ elu ala nke na-ekwupụta na ya bụ ọgbakọ Chineke na nke na-achịkọta azụ. Ọ gụnyewo ma Krisendọm ma ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, ebe nke ikpeazụ nọgideworo na-achịkọta azụ ọma, n’okpuru nduzi a na-adịghị ahụ anya nke ndị mmụọ ozi, n’ụzọ kwekọrọ na Matiu 13:49.
Oge Anyị Pụrụ Iche
16, 17. N’ihi gịnị ka oge anyị na-ebi n’ime ya ji dị oké mkpa ná mmezu nke ilu Jisọs banyere oké ụgbụ ahụ?
16 Ugbu a ka anyị tụlee ihe metụtara oge. Ruo ọtụtụ narị afọ, ngwá ọrụ ahụ bụ́ oké ụgbụ ahụ achịkọtawo azụ ọma nakwa ọtụtụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ndị ajọ omume. Mgbe ahụ oge ruru mgbe ndị mmụọ ozi malitere ikere òkè n’ọrụ ahụ dị mkpa nke nkewapụ. Ọ̀ bụ n’ole mgbe? Ọ dị mma, amaokwu nke 49 kwuru n’ụzọ doro anya na ọ bụ “n’ọgwụgwụ oge a.” Nke a kwekọrọ n’ihe Jisọs kwuru n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu: “Mgbe ọ bụla nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya: ma n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.”—Matiu 25:31, 32.
17 Ya mere, n’ụzọ kwekọrọ na Matiu 13:47-50, ọrụ nkewapụ dị oké mkpa n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi anọwo na-aga n’ihu kemgbe ‘ọgwụgwụ oge a’ malitere na 1914. Nke a pụtara ìhè karịsịa mgbe 1919 gasịrị, bụ́ mgbe a tọhapụrụ ihe ahụ fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ site n’agbụ, ma ọ bụ ndọrọ n’agha na-adịru nwa oge n’ụzọ ime mmụọ, ha wee ghọọ ngwá ọrụ dị irè karị maka ịrụzu ọrụ ịkụ azụ ahụ.
18. Olee ụzọ e siworo chịkọta azụ ọma ahụ n’ihe ndị e ji etinye azụ?
18 Gịnị ga-eme azụ ọma ahụ e kewapụtara? Amaokwu nke 48 na-asị na ndị mmụọ ozi ahụ na-akụ azụ, na-emekwa nkewapụ, ‘chịkọtara azụ ndị dị mma tinye n’ime ihe, ma ha tụfuru ndị na-adịghị mma.’ Ihe ndị ahụ e tinyere azụ na ha bụ igbe ndị e ji echedo ihe bụ́ ndị a na-etinye azụ ọma. Nke a ò mewo n’oge anyị? Ee kpọmkwem. Ka a na-anwụta azụ ọma nke ihe atụ ahụ ná ndụ, a chịkọtawo ha n’ime ọgbakọ dị iche iche nke ezi ndị Kraịst. Ọgbakọ ndị a yiri ihe nchedo enyewo aka ichedo na ichekwa ha maka ije ozi Chineke, ọ̀ bụ na i kweghị otú ahụ? Ma, mmadụ pụrụ iche, sị, ‘Ọ dị nnọọ mma, ma gịnị ka o nwere ime n’ebe ndụ m na-adị ugbu a na n’ọdịnihu m dị?’
19, 20. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa taa ịghọta ihe atụ nke a? (b) Ọrụ ịkụ azụ dị aṅaa dị mkpa ka a rụworo kemgbe 1919?
19 Mmezu nke ihe a tụrụ ilu ya n’ebe a adịghịrị nanị narị afọ ndị ahụ dị n’agbata oge ndị ozi na afọ 1914. N’oge ahụ, ngwá ọrụ aḥu bụ́ oké ụgbụ chịkọtara ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nọ n’Iso Ụzọ Kraịst ma n’ụzọ na-ezighị ezi ma n’ụzọ ziri ezi. Ee, ọ chịkọtara ma azụ na-ekwesịghị ekwesị ma azụ ọma. Ọzọkwa, ọrụ nkewapụ ahụ ndị mmụọ ozi na-arụ agwụsịghị laa azụ n’ihe dị ka 1919. Ee e, ma ọlị. N’akụkụ ụfọdụ, ilu nke a nke oké ụgbụ na-emezu kpọmkwem n’oge anyị. O metụtara anyị, metụtakwa ọdịnihu anyị dị nso. Ọ dị mkpa na anyị ghọtara otú na ihe mere nke ahụ ji dị otú a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwu ndị a kọwaa anyị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị anya unu, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ; na ntị unu, n’ihi na ha na-anụ ihe” site ná nghọta.—Matiu 13:16.
20 Ma eleghị anya ị matara na mgbe 1919 gasịrị, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ mikpuru onwe ha n’ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị mmụọ ozi na-eme, bụ́ ndị nọgidere na-eji oké ụgbụ ihe atụ ahụ na-enukọta azụ bịa n’ụsọ oké osimiri, iji kewapụta ndị ọma site ná ndị ahụ na-ekwesịghị ekwesị. Ihe ngụkọ e nwere site n’oge ahụ na-egosi na nnwụta nke azụ ọma ka e wee jiri mmụọ Chineke tee ha mmanụ nọgidere ka ụgbụ ihe atụ ahụ na-achịkọta ndị ikpeazụ so na 144,000 ahụ. (Mkpughe 7:1-4) Ma mgbe ọ na-erule etiti afọ ndị 1930, nchịkọta nke azụ ọma maka iji mmụọ nsọ tee ha mmanụ kwụsịrị n’ụzọ bụ isi. Ọgbakọ nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ọ̀ gaje ịtụfu ụgbụ ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, wee nọdụ nnọọ nkịtị na-echere ụgwọ ọrụ nke eluigwe? Ọ dịghị ma ọlị!
Òkè Ị Na-ekere n’Ịkụ Azụ Ahụ
21. Ịkụ azụ ndị ọzọ dị aṅaa werewooro ọnọdụ n’oge anyị? (Luk 23:43)
21 Ilu Jisọs nke oké ụgbụ ahụ lekwasịrị anya n’azụ ọma nke a gaje inyeghachi ụgwọ ọrụ site n’inye ya ọnọdụ n’ime Alaeze eluigwe. Ma, e wezụga ilu ahụ, e nwere ịkụ azụ ihe atụ ọzọ nke a na-eme n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ọbụna dị ka a kọwara n’isiokwu bu ụzọ. Ịkụ azụ nke a abụghị maka azụ ọma ahụ e tere mmanụ nke a kpọtụrụ uche n’ilu Jisọs, kama ọ bụ maka azụ ihe atụ a ga-enwụta ná ndụ ma nye olileanya ahụ dị ebube nke ndụ n’elu ụwa e mere ka ọ ghọo paradaịs.—Mkpughe 7:9, 10; tụlee Matiu 25:31-46.
22. Ihe dị aṅaa na-enye obi ụtọ ga-esi na ya pụta ka anyị pụrụ inweta, ihe dị iche dị aṅaa ga-esikwa na ya pụta?
22 Ọ bụrụ na i nwere olileanya ahụ, mgbe ahụ ị pụrụ inwe ọṅụ na Jehova enyewo ohere ka ọrụ ịkụ azụ nke na-azọpụta ndụ nọgide ruo ugbu a. Nke a emewo ka o kwe omume gị onwe gị inweta olileanya dị ebube. Olileanya? Ee, nke ahụ bụ okwu kwesịrị ekwesị iji mee ihe, ebe ọ bụ na ihe ọ ga-arụpụta ga-abụ nke kwekọrọ n’anyị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Onye ahụ nke na-eduzi mgbalị a na-etinye n’ịkụ azụ ahụ nke na-aga n’ihu. (Zefanaịa 2:3) Cheta na site n’ilu ahụ, ọ bụghị azụ nile oké ụgbụ ahụ dọgotara nwetara ọnọdụ dị mma. Jisọs sịrị na a ga-ekewapụta ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ndị ajọ omume site n’ebe ndị ezi omume nọ. Gịnị ga-esi na nke ahụ pụta? Na Matiu 13:50, Jisọs kọwara ajọ ihe ga-esi na ya pụtara azụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, ma ọ bụ ajọ omume. A tụbara ndị a n’ime oké ọkụ ahụ, nke pụtara mbibi ebighị ebi.—Mkpughe 21:8.
23. Gịnị na-eme ka ọrụ ịkụ azụ n’oge a dị oké mkpa?
23 Maka azụ ọma ahụ e tere mmanụ, nakwa maka azụ ihe atụ ahụ ndị pụrụ ibi ndụ ebighị ebi n’elu ụwa, e nwere ọdịnihu dị ebube. Ya mere, ọ bụ ezi ihe mere ndị mmụọ ozi ahụ ji na-ahụ na kpọmkwem ugbu a a na-arụ ọrụ ịkụ azụ na-enwe ihe ịga nke ọma gburugburu ụwa. Leekwa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu a na-anwụta! Ị ga-ezi ezi ikwu na n’ile ya anya n’otu ụzọ, ọ bụ nnọọ ịnwụta azụ n’ụzọ ọrụ ebube dị ka ọ dịkwa n’azụ nkịtị nke ndị ozi ahụ gbutere mgbe ha tụdara ụgbụ ha ná mmiri ná ntụziaka Jisọs.
24. Gịnị ka anyị kwesịrị ịchọ ime banyere ịkụ azụ ime mmụọ?
24 Ị̀ na-ekeresi òkè ike ruo n’ókè o kwere gị mee n’ọrụ ịkụ azụ ime mmụọ nke a nke na-azọpụta ndụ? N’agbanyeghị otú òkè anyị na-ekere n’otu n’otu ruworo n’ịdị ukwuu ruo ugbu a, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ irite uru site n’ile anya n’ihe a na-arụzu gburugburu ụwa n’oké ọrụ ịkụ azụ ahụ na nke na-azọpụta ndụ bụ́ nke na-aga n’ihu ugbu a. Ime otú ahụ kwesịrị ịkpali anyị ọbụna ịnụ ọkụ n’obi karị n’ịtụda ụgbụ anyị iji nwụta azụ n’ụbọchị ndị na-abịa nnọọ n’ihu!—Tụlee Matiu 13:23; 1 Ndị Tesalonaịka 4:1.
Ị̀ Na-echeta Isi Ihe Ndị A?
◻ Gịnị ka ụdị azụ abụọ dị n’ihe atụ Jisọs nke oké ụgbụ ahụ nọchiri anya ha?
◻ N’echiche dị aṅaa ka chọọchị nile nke Krisendọm kerewooro òkè n’ọrụ oké ụgbụ ahụ?
◻ N’ihi gịnị ka ịkụ azụ nke na-ewere ọnọdụ n’oge anyị ji dị oké mkpa?
◻ Ihe atụ nke oké ụgbụ ahụ kwesịrị iduje onye ọ bụla n’ime anyị gaa n’ime ụdị nnyocha onwe onye dị aṅaa?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọrụ ịkụ azụ ewerewo ọnọdụ n’Osimiri Galili ruo ọtụtụ narị afọ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.