Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 13 p. 36-p. 37 para. 6
  • Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmụta Ihe Site n’Ọnwụnwa Ndị Jisọs Zutere
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 13 p. 36-p. 37 para. 6
Mgbe Jizọs na-ekweghị ka Ekwensu nwata ya

ISI NKE 13

Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa

MATIU 4:1-11 MAK 1:12, 13 LUK 4:1-13

  • SETAN ANWAA JIZỌS ỌNWỤNWA

Ozugbo Jọn mechara Jizọs baptizim, mmụọ nsọ Chineke duuru Jizọs gaa n’ala ịkpa dị na Judia. O nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche. Mgbe e mere Jizọs baptizim, “eluigwe meghere.” (Matiu 3:16) Ọ bụ ya mere o ji nwee ike icheta ihe ndị ọ mụtara na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’eluigwe. N’eziokwu, Jizọs nwere ọtụtụ ihe ọ ga-atụgharị n’uche.

Jizọs nọrọ ụbọchị iri anọ n’ala ịkpa ahụ, ehihie na abalị. N’oge ahụ niile, o righị ihe ọ bụla. Mgbe ezigbo agụụ jidere ya, Setan bụ́ Ekwensu bịara ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” (Matiu 4:3) Ma, Jizọs ekweghị ka Ekwensu nwata ya n’ihi na ọ ma na ọ dịghị mma ya iji ike ọrụ ebube o nwere meere onwe ya ihe ndị na-agụ ya.

Ma, Ekwensu akwụsịghị ịnwa ya. Ọ gbalịrị isi ụzọ ọzọ nwata Jizọs. Ọ gwara Jizọs ka o si n’elu ụlọ nsọ wụda. Ma, Jizọs ekweghịkwa ka ọ nwata ya ka ya gosi na ya nwere ikike pụrụ iche. Jizọs gwara ya ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke gosiri na ọ dị njọ isi otú a nwalee Chineke.

N’ọnwụnwa nke atọ, Ekwensu nwere otú o si gosi Jizọs “alaeze niile nke ụwa na ebube ha” ma gwa ya, sị: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.” Ọzọkwa, Jizọs ekweghị ka a nwata ya. Ọ sịrị ya: “Si ebe a pụọ, Setan!” (Matiu 4:8-10) Jizọs ekweghị ka a nwata ya ife Setan ofufe n’ihi na ọ ma na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe. N’eziokwu, o kpebiri ịnọsi ike na-erubere Chineke isi.

E nwere ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ọnwụnwa ndị a a nwara Jizọs nakwa n’ihe o mere mgbe a nwara ya. A nwara Jizọs ọnwụnwa n’eziokwu. Ọnwụnwa a a nwara ya na-egosikwa na Ekwensu abụghị ihe ọjọọ nkịtị, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu. Ọ bụ onye dị adị a na-adịghị ahụ anya. Ihe a Baịbụl kwuru na-egosikwa na ọ bụ Ekwensu nwe ọchịchị niile nke ụwa a. Ọ bụkwa ya na-achị ụwa a. Á sị na ọ bụghị ya, olee otú nkwa ahụ o kwere inye Kraịst alaeze niile nke ụwa ga-esi bụrụ ọnwụnwa?

Ihe ọzọ bụ na Ekwensu kwuru na o nwere ihe ya ga-enye Jizọs ma o fee ya ofufe naanị otu ugboro. Ọ gwadịrị ya na ya ga-enye ya alaeze niile nke ụwa. Ekwensu nwekwara ike ịgbalị iji ihe yiri ihe a nwaa anyị. O nwere ike iji ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ baa ọgaranya n’ụwa a, ma ọ bụ nweta ọkwá, chọọ ịnwata anyị. Anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma anyị mee ka Jizọs ma rubere Chineke isi n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. Ma, cheta na ihe Ekwensu mere bụ naanị ịhapụ Jizọs “ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) O nwekwara ike ime anyị otú ahụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịnọ na nche mgbe ọ bụla.

  • Olee ihe ndị ọ ga-abụ na Jizọs nọ na-atụgharị n’uche n’ụbọchị iri anọ ahụ ọ nọrọ n’ala ịkpa?

  • Olee ụzọ dị iche iche Ekwensu si gbalịa ịnwata Jizọs?

  • Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ọnwụnwa ndị ahụ a nwara Jizọs nakwa n’ihe o mere mgbe a nwara ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya