Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/1 p. 20-24
  • Nkwurịta Okwu n’Ime Ezinụlọ na n’Ime Ọgbakọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwurịta Okwu n’Ime Ezinụlọ na n’Ime Ọgbakọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ile Anya, Ikwu Okwu, na Ige Ntị
  • Nkwurịta Okwu n’Etiti Ndị Mụrụ Ụmụ na Ụmụ Ha
  • Nkwurịta Okwu n’Ime Ọgbakọ
  • Ndụmọdụ na Agbamume
  • Nkwurịta Okwu n’Ije Ozi Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova na Kraịst Ndị Na-enweghị Atụ ná Nkwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nkwurịta Okwu Dị Mma—Isi Ihe Na-eduga n’Ezi Alụmdi na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/1 p. 20-24

Nkwurịta Okwu n’Ime Ezinụlọ na n’Ime Ọgbakọ

“Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ.” —NDỊ KỌLỌSI 4:6.

1. Gịnị ka Adam kwuru mgbe Chineke mere ka o zute Iv?

“ỌDỊGHỊ onye ọ bụla ihe nile zuuru n’onwe ya . . . Onye ọ bụla bụ akụkụ nke ọha mmadụ.” Otú a ka otu nwoke gụrụ akwụkwọ, onye na-ahụ ihe na-aganụ dere ọtụtụ narị afọ gara aga. N’ikwu nke ahụ, ihe ọ na-eme bụ nanị ikwenye n’ihe Onye Okike ahụ kwuru banyere Adam: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya.” Adam nwere onyinye nke ikwu okwu na ịsụ asụsụ, n’ihi na ọ gụworị ụmụ anụmanụ nile aha. Ma Adam enweghị onye ọzọ bụ mmadụ e kere eke ya na ya pụrụ ikwurịta okwu. Ka a sịkwa ihe mere na mgbe Chineke kpọtaara ya ọmarịcha onye ahụ bụ Iv dị ka nwunye, o tiri mkpu, sị: “Ehee! Nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ si n’anụ ahụ m pụta”! Otú a, ka ezinụlọ mbụ nke mmadụ na-enwe mmalite ya, Adam malitere isoro onye bụ mmadụ ibe ya na-ekwurịta okwu.—Jenesis 2:18, 23.

2. Olee nsogbu ikiri telivishọn n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ ịkpata?

2 N’ime ezinụlọ bụ ebe kwesịrị ekwesị maka inwe nkwurịta okwu. N’ezie, ihe ịga nke ọma nke ezinụlọ dabeere na ya. Otú ọ dị, inwe nkwurịta okwu na-ewe oge na mgbalị. Taa, otu n’ime ihe kachasị ezu ohi oge bụ telivishọn. Ọ pụrụ ịbụ ngwá ọrụ e ji emebi ihe ma ọ dịkarịa ala n’ụzọ abụọ. N’otu akụkụ, ọ pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ mmasị nke ukwuu na ndị òtù ezinụlọ ga-aghọ ndị o riri ahụ, na-akpata ụkọ nke nkwurịta okwu. N’aka nke ọzọ, telivishọn pụrụ ije ozi dị ka ụzọ nke e si ezere ihe mgbe e nwere nghọtahie ma ọ bụ mmejọ nke mmetụta. Kama ime ihe banyere nsogbu ndị ahụ, di na nwunye ụfọdụ ahọrọwo imechi ọnụ ma kirie telivishọn. Ya mere TV pụrụ ikere òkè ná ndakpọ nke nkwurịta okwu, nke a sịrị na ọ bụ ihe bụ isi na-ebibi alụmdi na nwunye. Ndị ọ na-esiri ike ime ka ikiri telivishọn ghara ịnọ n’ọnọdụ nke mbụ pụrụ ọbụna ịtụle ibupụ ya kpam kpam.—Matiu 5:29; 18:9.

3. Olee otú ụfọdụ ndị siworo rite uru n’ibelata ikiri TV?

3 N’ezie, a natawo akụkọ ndị na-akpali akpali, ndị na-akọ banyere ngọzi ndị na-abịa mgbe a kwụsịrị ikiri TV ma ọ bụ ọbụna mee ka ikiri ya dị nta. Otu ezinụlọ dere, sị: “Anyị na-enwekwu nkwurịta okwu . . . , na-enyocha Bible karị . . . Anyị na-egwurịkọ egwu . . . Akụkụ nile nke ozi ubi anyị amụbawo.” Ezinụlọ ọzọ kwukwara mgbe ha bupụsịrị TV ha, sị: “Ọ bụghị nanị na anyị na-echebe ego [ha tụburu ụtụ maka cable TV] kama anyị adịwo n’otu karị dị ka ezinụlọ ma chọta ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị iji oge anyị mee. Anyị adịghị enwe ike ọgwụgwụ mgbe ọ bụla.”

Ile Anya, Ikwu Okwu, na Ige Ntị

4. Olee otú ndị bụ di na nwunye pụrụ isi kwupụta ekele ha nwere maka ibe ha?

4 E nwere ụdị dị iche iche nke nkwurịta okwu n’ime ezinụlọ. Ụfọdụ na-abụ ndị a na-ekwughị n’ọnụ. Mgbe mmadụ abụọ lerịtara onwe ha anya, ọ bụ ụzọ nke nkwurịta okwu. Ịnọkọ ọnụ pụrụ ime ka a ghọta echiche nke inwe mmasị. Di na nwunye kwesịrị izere ịnọpụ iche n’ebe ibe ha nọ ruo ogologo oge, ọ gwụla ma ọ̀ dị ihe a na-apụghị izere nke kpatara ya. Di na nwunye pụrụ ịkwalite obi ụtọ n’ebe ibe ha nọ site n’ịṅụrị n’ime mkpakọrịta chiri anya ha nwere n’ime nkekọ alụmdi na nwunye. Site n’ụzọ na-egosi mmetụta ịhụnanya ma nwee ùgwù ha si emeso ibe ha omume, ma ọ bụ n’ọha mmadụ ma ọ bụ n’ime ụlọ, na-egosi ezi ùgwù n’ejiji na n’akparamàgwà, ha pụrụ ime ka a ghọta ekele dị omimi ha nwere maka ibe ha n’ekwughị okwu. Eze onye amamihe bụ Solomọn kwupụtara ya n’okwu ndị a, na-asị: “Ka isi iyi gị bụrụ ihe a gọziri agọzi; ṅụrịakwa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa.”—Ilu 5:18.

5, 6. Gịnị mere ndị bụ di kwesịrị iji mara mkpa ọ dị isoro ndị bụ nwunye ha kwurịta okwu?

5 Inwe nkwurịta okwu chọkwara ịkparịta ụka, ịnọkọ ọnụ iji leba anya n’okwu—isorịta ibe ha na-ekwu okwu, ọ bụghị ịgwarịta ibe ha okwu n’achọghị ịma ma onye nke ọzọ ò nwere ihe ọ ga-ekwu ma ọ bụ na o nweghị. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị inyom dị mma karịa ndị ikom n’ikwupụta ihe bụ mmetụta ha, nke ahụ abụghị ihe mere ndị bụ di ga-eji bụrụ ndị òtù na-adịghị etinye ọnụ n’okwu. Ndị Kraịst bụ di kwesịrị ịma na enweghị nkwurịta okwu bụ nsogbu bụ isi n’ọtụtụ alụmdi na nwunye, ya mere ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ịhụ na ohere nkwurịta okwu ghere ọnụ mgbe nile. N’ezie, ha ga-eme nke a ma ọ bụrụ na ha, tinyere nwunye ha, egee ntị n’ezi ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere ná Ndị Efesọs 5:25-33. Ka onye bụ di wee hụ nwunye ya n’anya dị ka ahụ nke onwe ya, ọ ghaghị inwe nchegbu n’ebe ọdịmma na obi ụtọ ya dị, ọ bụghị nanị nke onwe ya. N’akụkụ nke ahụ, inwe nkwurịta okwu bụ ihe a na-apụghị ilefuru anya ma ọlị.

6 Onye bụ di ekwesịghị inwe echiche nke bụ na nwunye ya kwesịrị ịmara na ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ dị ya mkpa ka e mesie ya obi ike banyere ịhụnanya onye ahụ bụ di nwere n’ebe ọ nọ. Onye bụ di pụrụ igosi ekele ya n’ọtụtụ ụzọ—site n’okwu ịhụnanya na onyinye ndị a na-atụghị anya ha, na ime ka ọ mara ihe nile ndị pụrụ imetụta ya. O nwekwara ihe ịma aka nke ikwupụta ekele maka mgbalị ndị nwunye ya na-eme, ma ọ bụ n’ihe gbasara ejiji ya, n’ọrụ ọ na-arụsi ike n’ezinụlọ, ma ọ bụ ná nkwado o ji obi ya nile na-akwado ọrụ ime mmụọ. Tụkwasịkwa, ka onye bụ di wee mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pita onyeozi na 1 Pita 3:7, ‘isoro nwunye ya bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma,’ ọ ghaghị itinye onwe ya n’ọnọdụ nwunye ya, bụ́ nke a na-egosipụta site n’ịgwa ya okwu n’ihe nile metụtara ha abụọ, na-akwanyere ya ùgwù dị ka onye na-adịghị ike.—Ilu 31:28, 29.

7. Olee ibu ọrụ onye bụ nwunye nwere n’isoro di ya kwurịta okwu?

7 N’otu aka ahụ, ka onye bụ nwunye wee gbasoo ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 5:22-24, ido onwe ya n’okpuru, ọ dị ya mkpa ichegbu onwe ya banyere ịnọgide na-eme ka ohere nke ya na di ya inwe nkwurịta okwu ghere oghe. Ọ dị ya mkpa igosi di ya “nsọpụrụ dị omimi,” ma site n’okwu ọnụ ma site n’omume ya. O kwesịghị ime ihe n’onwe ya ma ọ bụ leghara ihe ndị na-amasị di ya anya ma ọlị. (Ndị Efesọs 5:33) N’oge nile, e kwesịrị inwe okwu nzuzo n’etiti ya na di ya.—Tụlee Ilu 15:22.

8. Iji mee ka ohere nke nkwurịta okwu ghere oghe, olee ihe ndị bụ nwunye na-aghaghị ịdị njikere ime?

8 Ọzọkwa, onye bụ nwunye kwesịrị ịnọ na nche megide ịnọ na-ahụsi anya n’ime onwe ya n’ekwupụtaghị ya dị ka ụzọ nke isi gosipụta mmadụ imere onwe ya ebere. Ọ bụrụ na e nwere nghọtahie, ya chọọ oge kwesịrị ekwesị iji welite okwu ahụ. Ee, mụta ihe site n’aka Eze Nwanyị Esta. O nwere okwu metụtara ndụ na ọnwụ ime ka di ya mara. Ya ime ihe ngwa ngwa site n’amamihe na ịdị akọ pụtaara ndị Juu nzọpụta. Ọ bụ ihe anyị ji ụgwọ ya nye di ma ọ bụ nwunye anyị na nye onwe anyị ikwu okwu ma ọ bụrụ na e mejọwo anyị ma ọ bụ na a na-emejọ anyị. Ịdị akọ na ịbụ onye na-eme ihe ọchị n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke pụrụ inye aka mee ka nkwurịta okwu dị mfe karịa.—Esta 4:15–5:8.

9. Ọrụ dị aṅaa ka ịṅa ntị na-arụ ná nkwurịta okwu?

9 Iji ikwu okwu mee ka ohere nke nkwurịta okwu ghere oghe mgbe nile gụnyere ibu ọrụ onye nke ọ bụla ige ntị n’ihe onye nke ọzọ nwere ikwu—na ime mgbalị iji rịba ama ihe ndị a na-ekwughị ekwu. Nke ahụ na-achọ ige onye ahụ na-ekwu okwu ntị. Ọ bụghị nanị na ọ dị mkpa ka mmadụ ghọta echiche nke dị n’okwu, kama ọ dịkwa mkpa ka o tinye uche ná mmetụta dị n’okwu ahụ, ụzọ e si kwuo ihe. Ọtụtụ mgbe, onye bụ di anaghị eru eru n’akụkụ nke a. Ndị bụ nwunye pụrụ ịta ahụhụ n’ihi na ndị bụ di egeghị ntị. N’aka nke ọzọkwa, ọ dị ndị bụ nwunye mkpa ige ntị nke ọma ka ha wee zere ịdị ngwa iru ná nkwubi okwu. “Onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.”—Ilu 1:5.

Nkwurịta Okwu n’Etiti Ndị Mụrụ Ụmụ na Ụmụ Ha

10. Iji mezuo ibu ọrụ nke isoro ụmụ ha na-ekwurịta okwu, gịnị ka ndị mụrụ ụmụ na-aghaghị ịdị njikere ime?

10 E nwekwara ọnọdụ ebe ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-enwe ihe isi ike ikwurịta okwu. Iji “zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị,” ọ chọrọ iguzobe ohere maka inwe nkwurịta okwu. Ime otú ahụ ga-eme ka e jide n’aka na “ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Na ụmụ nke ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-efunahụ ha ma banye n’ụwa na-abụ mgbe ụfọdụ n’ihi ihe metụtara enweghị nkwurịta okwu nke malitere mgbe ha nọ n’oge uto. Ibu ọrụ ndị mụrụ ụmụ nwere n’isoro ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe nile bụ nke e mere ka ọ pụta ìhè na Deuterọnọmi 6:6, 7: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” Ee, ndị mụrụ ụmụ aghaghị iwepụta oge ịnọnyere ụmụ ha! Ha aghaghị ịdị njikere ịchụ àjà ụfọdụ n’ihi ụmụ ha.

11. Olee ihe ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịgwa ụmụ ha?

11 Ndị mụrụ ụmụ, gwanụ ụmụ unu na Jehova hụrụ ha n’anya, na unu onwe unu hụkwara ha n’anya. (Ilu 4:1-4) Meenụ ka ha hụ njikere unu dị iji ntụsara ahụ na ihe ụtọ unu chụọ àjà maka ito uto nke echiche, mmetụta anụ ahụ na ime mmụọ ha. Ihe dị mkpa n’akụkụ nke a bụ itinye onwe unu n’ọnọdụ ha, ya bụ, ikike ndị mụrụ ụmụ nwere ile ihe anya dị ka ụmụ ha si ele ya anya. Site n’igosipụta ịhụnanya ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị na ya, unu bụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ iwulite ihe nkekọ nke ịdị n’otu siri ike n’ebe ụmụ unu nọ ma gbaa ha ume ịkọrọ unu izu nzuzo ha kama iwere ndị ọgbọ ha dị ka ndị ha na-akọrọ izu nzuzo ha.—Ndị Kọlọsi 3:14.

12. N’ihi gịnị ka ndị ntorobịa ji kwesị isoro ndị mụrụ ha nwee nkwurịta okwu n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla?

12 N’aka nke ọzọ, ndị na-eto eto, unu nwere ibu ọrụ nke isoro ndị mụrụ unu kwurịta okwu. Inwe ekele n’ihi ihe ndị ha mewooro unu ga-enyere unu aka ịkọrọ ha ihe nzuzo unu. Enyemaka na nkwado ha dị unu mkpa, ọ ga-adịkwara ha mfe karị inye ya ma ọ bụrụ na unu esoro ha nwee nkwurịta okwu n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. Ee, n’ihi gịnị ka ị ga-eji mee ka ndị ọgbọ gị bụrụ ebe bụ isi i si enweta ndụmọdụ? O yiri ka ọ bụ na ndị a emeworo gị ihe dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere ndị mụrụ gị. Ha enweghị ahụmahụ ná ndụ karịa otú i nwere, ọ bụrụkwa na ha abụghị ndị nọ n’ọgbakọ, ha enweghị mmasị n’ezie n’ọdịmma gị na-adịgide adịgide.

Nkwurịta Okwu n’Ime Ọgbakọ

13, 14. Ụkpụrụ Bible ndị dị aṅaa na-ekwu banyere inwe nkwurịta okwu n’etiti ndị Kraịst?

13 Ihe ịma aka ọzọ bụ ịhụ na ohere nkwurịta okwu n’ebe gị na ụmụnna gị n’ọgbakọ nọ ghere oghe. A dụsiri anyị ọdụ ike ka anyị ghara “ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.” N’ihi nzube dị aṅaa ka anyị ji ezukọ? “Ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche.” Nke a chọrọ nkwurịta okwu. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ gị, nke ahụ abụghị ma ọlị ihe a ga-eji zere ịga nzukọ dị iche iche. Mee ka ohere nkwurịta okwu ghere oghe site n’ịgbaso ụkpụrụ nke ndụmọdụ Jisọs nyere anyị dị ka e dekọrọ ya na Matiu 18:15-17. Gwa onye ahụ i chere na ọ na-anapụ gị obi ụtọ okwu.

14 Mgbe gị na otu n’ime ụmụnna gị na-enwe nsogbu ndị dị otú ahụ, gbasoo ụdị ndụmọdụ Akwụkwọ nsọ ahụ dị ka nke ahụ a na-ahụ ná Ndị Kọlọsi 3:13: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” Nke ahụ na-apụta ikwurịta okwu kama ịjụ ikwusara onye ọzọ okwu. Ọ bụrụkwa na ị chọpụtara na mmadụ adịghị egosi gị ihu enyi, gbasoo ndụmọdụ ahụ dị na Matiu 5:23, 24. Kwurịta okwu, ma gbalịa ime udo n’ebe nwanna gị nọ. Nke a na-achọ ịhụnanya na ịdị umeala n’obi n’akụkụ nke gị, ma i ji onwe gị na nwanna gị ụgwọ ịgbaso ndụmọdụ Jisọs.

Ndụmọdụ na Agbamume

15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-ekwesịghị iji daa mbà n’inye ndụmọdụ mgbe ha nọ n’ọnọdụ ime otú ahụ?

15 Ibu ọrụ nke ikwurịta okwu sokwa n’ịgbaso ndụmọdụ Pọl ná Ndị Galetia 6:1: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” Imara otú ikike anyị hà n’ezie. kwesịrị ime ka anyị nabata ya mgbe mmadụ na-egosi anyị ebe anyị na-agazighị agazi n’okwu ma ọ bụ n’omume anyị. N’ezie, anyị nile kwesịrị inwe omume nke onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid nwere mgbe o dere, sị: “Ka onye ezi omume tigbuo m, ọ ga-abụ ebere; ya bakwaara m mba, ọ ga-abụ mmanụ isi; ekwela ka isi m sị, ee e.” (Abụ Ọma 141:5) Ndị okenye karịsịa kwesịrị ịbụ ihe nlereanya pụrụ iche nke ịdị umeala n’obi, ọ bụghị ijigidesi echiche onwe onye ike, kama ịdị njikere ịnabata mgbanwe, na-eburu n’uche na ‘ihe kwesịrị ntụkwasị obi ka ogbugbu mma nke enyi na-ahụ gị n’anya bụ.’—Ilu 27:6.

16. Nkwurịta okwu dị aṅaa ka ndị ntorobịa bụ ndị ọkà okwu kwesịrị ịnabata?

16 Ọ bụ ụzọ nke amamihe na ịmara otú ikike mmadụ hà n’ezie nye ndị na-eto eto ịchọ ndụmọdụ na nduzi site n’aka ndị Kraịst tozuru okè, bụ́ ndị o yikarịrị ka ọ bụ na ha aghaghị inwe ihe bara uru ha ga-enye. Ọbụna ndị okenye pụrụ irite uru n’ụzọ dị otú a. Dị ka ihe atụ, otu onye okenye kwuru n’okwu ya na ngọzi ndị ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:16, 17, banyere enweghị agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ ọzọ, bụ ihe ndị atụrụ ọzọ ahụ pụrụ ilepụ anya ya n’ọdịnihu n’ụwa ọhụrụ. Otú ọ dị, e mewo ka o pụta ìhè na akụkụ akwụkwọ nsọ nke a metụtara oge dị ugbu a karịsịa. (Lee Revelation—Its Grand Climax At Hand!, peji 126-128.) Otu okenye nọ n’ìgwè mmadụ na-ege ntị chere na ya kwesịrị ịgwa onye ọkà okwu ahụ okwu banyere nke a, ma tupu o nwee ohere ime otú ahụ, onye ọkà okwu ahụ n’onwe ya kpọrọ na telifonu ma jụọ ma ọ dị aro ọ bụla ọ pụrụ ịtụrụ ya n’imeziwanye nkà ya n’ikwu okwu. Ee, ka anyị mee ka ọ dịrị ndị ọ ga-amasị inyere anyị aka mfe karị site n’ikwupụta ọchịchọ anyị ịnara ndụmọdụ. Ka anyị ghara ịbụ ndị a na-akpasukarị iwe oké ngwa ngwa ma ọ bụ ndị ihe dị nnọọ nta na-eme ka ha malite iwe iwe.

17. Olee otú nkwurịta okwu pụrụ isi jee ozi n’iwulite ụmụnna anyị elu?

17 Eze Solomọn nyere ụkpụrụ nke a pụrụ iji mee ihe ná mkparịta ụka anyị. Ọ sịrị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịrị, mgbe ọ dịrị ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Anyị ji ụmụnna anyị ụgwọ ịhụnanya. Pọl sịrị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya: n’ihi na onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu.” (Ndị Rom 13:8) Ya mere jiri ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke okwu agbamume na-eme ihe. Ohu na-eje ozi nke ka na-eto eto ọ̀ na-aga inye okwu ihu ọha mbụ ya? Kelee ya. Nwanna nwanyị ò mewo mgbalị nke ukwuu ma ọ bụ mee nnọọ nke ọma n’ihe omume ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Gwa ya na mgbalị ndị o mere masịrị gị. Otú o sina dị, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-agbalịsi ike ime ihe kasị mma ha pụrụ ime, ha ga-abụkwa ndị a gbara ume site n’okwu ịhụnanya na ekele.

18. Ebe e gosipụtara ịtụkwasị onwe onye obi gabiga ókè, olee ihe ọ ga-abụ obi ọma ime?

18 N’aka nke ọzọ, onye ọkà okwu ka na-eto eto pụrụ inwe ikike dị ukwu, ma n’ihi ịbụ onye ka na-eto eto, ọ pụrụ igosipụta ịtụkwasị onwe onye obi karịa otú ọnọdụ ahụ chọrọ. Ụdị nkwurịta okwu dị aṅaa ka a ga-achọ n’ebe a? Ọ́ gaghị abụ ihe obi ọma dị na ya ma ọ bụrụ na onye okenye tozuru okè ekelee ya maka ihe ndị dị mma n’okwu ya, ma n’otu oge ahụkwa, jiri ụzọ dị nro tụọ aro banyere ụzọ ndị ọ pụrụ isi zụlite ịdị umeala n’obi n’ọdịnihu? Ụdị nkwurịta okwu dị otú ahụ ga-egosi ịhụnanya ndị bụ ụmụnna ma nyere ndị ka na-eto eto aka ịhapụsị àgwà ndị na-ezighị ezi ngwa ngwa, tupu ọ gbanye mkpọrọgwụ n’ime ha.

19. N’ihi gịnị ka ndị okenye na ndị isi ezinụlọ ji kwesị ịbụ ndị na-enwe nkwurịta okwu?

19 Ndị okenye na-esoro ibe ha na ọgbakọ na-ekwurịta okwu banyere ihe ndị bara uru—na-ezere ikpughe okwu nzuzo, dị ka ndị metụtara okwu ikpe. Otú ọ dị, ịdị na-ekpuchikarị ihe nile ekpuchi na-akpata atụkwasịghị mmadụ obi na nkụda mmụọ, ọ pụkwara ibibi mmụọ enyi nke dị n’ọgbakọ—ma ọ bụ n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-amasị onye ọ bụla ịnụ akụkọ nke na-ewuli elu. Dị nnọọ ka Pọl onyeozi chọsiri ike ikwurịta okwu banyere onyinye ime mmụọ dị iche iche, otú ahụ ka ndị okenye kwesịrị inwe ọchịchọ inyefe ndị ọzọ ihe ọmụma na-ewuli elu.—Ilu 15:30; 25:25; Ndị Rom 1:11, 12.

20. Akụkụ dị aṅaa nke nkwurịta okwu ka isiokwu na-eso ga-elebara anya?

20 Ee, nkwurịta okwu dị mkpa ma n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ma n’ezinụlọ ndị Kraịst. Tụkwasịkwa, ọ bụ ihe dị nnọọ oké mkpa n’akụkụ ọzọkwa. N’ebee? N’ozi ndị Kraịst. N’isiokwu nke na-eso, anyị ga-atụle ụzọ ndị a pụrụ isi meziwanye nkà nkwurịta okwu n’ọrụ nke a dị nnọọ oké mkpa.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Olee otú a pụrụ isi merie ihe mgbochi a na-enwe mgbe mgbe ná nkwurịta okwu ezinụlọ?

◻ Olee otú ndị bụ di na nwunye pụrụ isi merie ihe ịma aka nke inwe nkwurịta okwu?

◻ Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi zere enweghị nkwurịta okwu n’etiti ndị meworo okenye na ndị ka na-eto eto?

◻ Olee otú nkwurịta okwu n’ime ọgbakọ na n’ime ezinụlọ dị iche iche pụrụ isi bụrụ ihe na-ewuli elu?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ezi nkwurịta okwu na-akwalite ọdịmma na obi ụtọ ezinụlọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya