Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 8-9
  • Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Lezienụ Anya Maka Ihe Iko Achịcha Ndị Farisii”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • ‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 8-9

Ndụ na IjeOzi Jisọs

Jisọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

JISỌS kwuru okwu n’ụzọ riri ndị okpukpe na-emegide ya ọnụ nke ukwuu nke na egwu tụrụ ha ịjụ ya ihe ọ bụla ọzọ. O wee gaa n’ihu ikpughe amaghị ihe ha. “Gịnị bụ uche unu banyere Kraịst ahụ?” ka ọ jụrụ ha. “Nwa ònye ka ọ bụ?”

“Nwa Devid,” ka ndị Farisii ahụ zaghachiri.

Ọ bụ ezie na Jisọs agọpụghị na Devid bụ nna ochie nke Kraịst ma ọ bụ Mesaịa ahụ n’anụ ahụ, ọ jụrụ, sị: “Devid sikwa aṅaa kpọọ ya Onyenwe ya n’ime mmụọ nsọ [n’Abụ Ọma 110], sị, [Jehova, NW] sịrị Onyenwe m, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m ga-etinye ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị abụọ? Ya mere, ọ bụrụ na Devid akpọọ ya Onyenwe ya, ò si aṅaa bụrụ nwa ya?”

Ndị Farisii ahụ kpuchiri ọnụ ha, n’ihi na ha amaghị n’ezie ihe e ji amata Kraịst ahụ, ma ọ bụ onye e tere mmanụ. Mesaia ahụ abụghị onye nkịtị sitere n’usoro ọmụmụ Devid, dị ka ọ pụtara ìhè na ndị Farisii ahụ chere, ma ọ dịrị adi n’eluigwe dị ka onye dị elu karịa Devid, ma ọ bụ Onyenwe ya.

N’ichigharịkwuru ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ugbu a, Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii. Ebe ọ bụ na ndị a na-akụzi Iwu Chineke, ‘ebe ha nọdụworo n’oche Moses,’ Jisos gbara ume, kwuo, sị: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha.” Ma o kwụkwara, sị: “Ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.”

Ha bụ ndị ihu abụọ, Jisọs katọkwara ha n’otu ụzọ ahụ o si katọọ ha mgbe o̱ na-eri nri n’ụlọ otu onye Farisii n’ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ. Ọ sịrị, “Ọrụ ha nile ka ha na-arụ ka mmadụ wee kirie ha.” O nyekwara ha ihe atụ dị iche iche, na-asị:

“Ha na-eme ka phylactery nile ha dị obosara.” Ihe okike ndị a dị nnọọ nta ndị a na-ekekwasị n’egedege ihu ma ọ bụ n’ógwè aka, na-enwe akụkụ anọ nke Iwu ahụ n’ime ya: Ọpụpụ 13:1-10, 11-16; na Deuterọnọmi 6:4-9; 11:13-21. Ma ndị Farisii na-eme ka ihe okike ndị a buwanye ibu iji mee ka ọ dị ka à ga-asị na ha na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi.

Jisọs gara n’ihu ikwu na ha ‘na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha dị ukwuu.’ N’Ọnụ Ọgụgụ 15:38-40, e nyere ndị Israel iwu ka ha na-adụnye ihe n’ọnụ ọnụ ala uwe ha, ma ndị Farisii na-eme ka nke ha buo ibu karịa otú onye ọ bụla ọzọ na-eme. Ha ne-eme ihe nile iji mee ngosi! ‘Ha na-ahụ isi ọnọdụ nile n’anya,’ ka Jisọs kwara arịrị kwuo.

Ọ bụ ihe mwute ịhụ na ọchịchọ nke a nke inwe ọnọdụ pụtara ìhè emetụtawokwa ndị na-eso ụzọ ya. Ya mere, o nyere ndụmọdụ, sị: “Ma ka a ghara ịkpọ ụnụ onwe ụnụ, Rabaị: n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ndị ndú, n’ihi na otu onye bụ onyendú unu, ya bụ Kraịst ahụ.” Ndị ahụ na-eso ụzọ aghaghị iwepụ n’ime onwe ha ọchịchọ nile nke ịbụ onye mbụ! “Onye dịkarịrị ukwu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi,” ka Jisọs kwuru n’ụzọ inye ndụmọdụ.

Ihe ọzọ o mere bụ ikwupụta ọtụtụ ahụhụ n’isi ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, na-akpọ ha ndị ihu abụọ ọtụtụ ugbo. Ha “na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ,” ka ọ sịrị, ọ bụkwa ha “na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ, na-ekpekwa ogologo ekpere ka mmadụ wee hụ.”

“Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị ndú ìsì” ka Jisọs sịrị. Ọ katọrọ ojiji ndị Farisii ahụ na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, dị ka ọ pụtara ìhè n’ịkpa ókè ndị na-enweghị isi ndị ha na-eguzobe. Dị ka ihe atụ, ha na-asị, “Onye ọ bụla nke ga-eji ụlọ nsọ Chineke ṅụọ iyi, ọ bụghị ihe; ma onye ọ bụla nke ga-eji ọlaedo nke ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi, o ji ụgwo.” Site na ha ime ka ọlaedo nke ụlọ nsọ ahụ bụrụ ihe dị mkpa karịa abamuru ime mmụọ nke ebe ahụ a na-anọ efe ofufe, ha na-egosipụta ọnọdụ ha nke ịbụ ndị kpuru ìsì n’ụzọ omume.

Ya mere, dị ka o mere tupu mgbe ahụ, Jisọs katọrọ ndị Farisii ahụ n’ihi ịhapụ “ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe” ma na-elekwasịkarị anya n’ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ahịhịa ísì ụtọ ndị na-abaghị uru.

Jisọs kpọrọ ndị Farisii ahụ “ndị ndú ìsì, ndị na-azapụ anwụnta ma . . . na-eloda kamel.” Ha na-azapụ anwụnta site ná mmanya ha, ọ bụghị nanị n’ihi na ọ bụ ahụhụ, kama n’ihi na ọ bụ ihe na-adịghị ọcha dị ka ụkpụrụ omenala ha si dị. Ma, nhapụ ha hapụrụ ihe ndị ka arọ n’lwu ahụ bụ ihe a pụrụ iji tụnyere iloda kamel, bụkwa anụ na-adịghị ọcha dị ka ụkpụrụ omenala ha si dị. Matiu 22:41-23:24; Mak 12:35-40; Luk 20:41-47; Levitikọs 11:4, 21-24.

◆ N’ihi gịnị ka ndị Farisii ahụ ji kpuchie ọnụ mgbe Jisọs juru ha ajụjụ banyere ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 110?

◆ N’ihi gịnị ka ndị Farisii ji mee ka ihe okike ha nke akụkụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche na ọnụ ọnụ uwe ha bukarịa nke ndị ọzọ n’ibu?

◆ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

◆ Ịkpa ókè dịgasị aṅaa ndị na-enweghị isi ka ndị Farisii ahụ na-eme, oleekwa ụzọ Jisọs si katọọ ha maka ịhapụ ihe ndị dị mkpa karị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya