Ị̀ Na-echeta?
Ị̀ hụwo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche dị ka ihe bara ezigbo uru nye gị? Mgbe ahụ gịnị ma i jiri ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ikike ncheta gị:
◻ Olee ajụjụ abụọ ndị nyewooro ọtụtụ ndị Kraịst na-eche mkpebi ndị metụtara ọrụ ihu aka ime mkpebi onwe onye?
Ajụjụ mbụ gbara ọkpụrụkpụ bụ nke a: Bible ọ̀ katọrọ ọrụ ego ahụ n’onwe ya? Ajụjụ nke abụọ bụ: Ịrụ ọrụ a ọ̀ ga-eme ka mmadụ bụrụ onye na-etinye aka n’omume a katọrọ akatọ?—4/15, peji nke 28.
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka e si ‘doo ihe e kere eke bụ́ mmadụ n’okpuru ihe efu’? (Ndị Rom 8:20)
‘E doro anyị n’okpuru ihe efu’ n’ihi omume nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. “Ọ bụghị na [anyị] chọrọ ya” ma ọ bụ n’ihi nhọrọ mmadụ meere onwe ya ka nke a ji mee. Anyị ketara ya eketa. N’ụzọ obi ebere, Jehova kwere ka nne na nna mbụ anyị mụọ ụmụ, ọ bụ ezie na ha pụrụ nanị ibufere ha ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. Ọnwụ gabigara ruo mmadụ nile, ya mere n’echiche ahụ, Chineke “doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu.”—5/1, peji nke 5.
◻ Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na “ihe arụ” ahụ ‘ga-eguzo n’ebe nsọ’ n’ọdịnihu? (Matiu 24:15)
N’ihe atụ oge ochie ahụ, e jikọtara ‘ihe arụ ahụ nke na-eguzo n’ebe nsọ’ na mwakpo ndị Rom mere n’okpuru Ọchịagha Gallus na 66 O.A. Ihe yiri mwakpo ahụ n’oge a—ntiwapụ nke “mkpagbu ukwu” ahụ—ka dị n’ihu. (Matiu 24:21) Ya mere, “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu,” ka ga-eguzo n’ebe nsọ.—5/1, peji nke 16, 17.
◻ Olee otú nne na nna na-arụ ọrụ pụrụ isi chọta oge ha na ụmụ ha ga-eji nọkọọ?
Nne ike na-agwụ mgbe ọ rụsịrị ọrụ ụbọchị pụrụ ịgwa ụmụ ya ka ha soro ya sie nri. Nna nke nwere ọtụtụ ihe ime ná ngwụsị izu pụrụ isoro ụmụ ya rụọ ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ahụ.—5/15, peji nke 6.
◻ Gịnị ka ndị ‘na-eje ije n’ụzọ Jehova’ na-aghaghị ime? (Jeremaịa 7:23)
Ije ije n’ụzọ Jehova chọrọ iguzosi ike n’ihe—mkpebisi ike ijere nanị ya ozi. Ọ chọrọ ntụkwasị obi—okwukwe zuru ezu na nkwa nile nke Jehova bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha nakwa na ha ga-emezu. Ije ije n’ụzọ Jehova chọrọ nrubeisi—ịgbasochi iwu ya anya n’ahapụghị ya na idebe ụkpụrụ ya ndị dị elu. (Abụ Ọma 11:7)—5/15, peji nke 14.
◻ Ọrụ anọ dị aṅaa dị mkpa ka “onyinye n’ụdị mmadụ” pụrụ ịrụzu? (Ndị Efesọs 4:8, NW)
Ha pụrụ ịgbazigharị anyị n’ụzọ dị nro, jiri ịhụnanya na-ewuli anyị elu, na-atụnye ụtụ n’ime ka anyị na ọgbakọ dị n’otu, jirikwa obi ike na-echebe anyị. (Ndị Efesọs 4:12-14)—6/1, peji nke 14.
◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná mkpakọrịta Pọl so ihe dị ka otu narị mmadụ a kpọtụrụ aha n’Ọrụ Ndị Ozi nakwa n’ime akwụkwọ ozi ya nwee?
Anyị kwesịrị iso nzukọ Chineke, ọgbakọ anyị, na ndị kwere ekwe ibe anyị na-arụkọ ọrụ mgbe nile. Enyemaka, nkwado, na nkasi obi ha dị anyị mkpa n’oge dị mma nakwa n’oge nsogbu.—6/1, peji nke 31.
◻ Ụzọ ntụgharị uche atọ dị aṅaa ka a pụrụ iji mee ihe n’inyere ndị ọzọ aka iche banyere Onye Okike?
Nkwekọ nke a na-ahụ n’eluigwe na ala buru ibu, mmalite nke ndụ n’elu ala, na ịpụ iche nke a na-apụghị ịgọnahụ agọnahụ nke ụbụrụ mmadụ, ya na ikike ya dịgasị iche.—6/15, peji nke 18.
◻ Gịnị mere ịghọta ihe aha aka Onye Okike pụtara ji dị oké mkpa?
Aha Chineke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ,” ọ na-emesikwa ya ike na ọ na-ezube ezube, na-emekwa eme. Site n’anyị ịmara na iji aha ya na-eme ihe, anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ ka mma na ọ na-emezu nkwa ya, na-emezukwa nzube ya n’ụzọ dị irè.—6/15, peji nke 21.
◻ Olee otú a pụrụ isi mee ka ụmụaka kere òkè n’ọmụmụ Bible ezinụlọ?
N’ebe o kwere mee, meenụ ndokwa ka nwata nke ọ bụla nwee Bible nke ya na magazin a na-amụ. A pụrụ ịgwa onye na-eto eto ka ọ kọwaa ihe osise dị n’ihe ọmụmụ ahụ, tupu oge eruo, a pụrụ ikenye obere nwa ịgụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ. A pụrụ ikenye onye nke katụ mee okenye ikwu ohere ndị a pụrụ iji tinye ihe ahụ a na-amụ n’ọrụ n’ụzọ dị irè.—7/1, peji nke 15.
◻ Olee ụfọdụ ihe mgbaru ọsọ ezinụlọ pụrụ ịgụnye n’ịkwadebe maka nzukọ ọgbakọ?
(1) Onye ọ bụla n’ime ezinụlọ ịdị njikere ịza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ; (2) onye nke ọ bụla ịgbalị ịza ajụjụ n’okwu nke aka ya; (3) itinye akụkụ akwụkwọ nsọ n’azịza ya; na (4) ịkọwa ihe ọmụmụ ahụ na-eburu n’uche itinye ya n’ọrụ n’onwe ya.—7/1, peji nke 20.
◻ Gịnị bụ isi ihe na-eduga n’ezi alụmdi na nwunye?
Iji kpọghee ma nweta ọṅụ dị oké ọnụ ahịa nke ezi alụmdi na nwunye, otu ihe dị oké mkpa bụ ezi nkwurịta okwu. Nke a gụnyere ikerịta mmetụta na echiche. Nkwurịta okwu dị mma gụnyekwara ihe ndị na-ewuli elu, na-enye ume ọhụrụ, ziri ezi, kwesịrị otuto, na ihe ndị na-akasị obi. (Ndị Efesọs 4:29-32; Ndị Filipaị 4:8)—7/15, peji nke 21.
◻ Gịnị bụ ‘ụzọ Jehova’? (Abụ Ọma 25:8, 9, 12)
Ụzọ ahụ bụ ụzọ ịhụnanya. Ọ dabeere n’ime ihe ziri ezi dị ka ụkpụrụ Chineke si dị. Bible na-akpọ ntinye n’ọrụ nke ịhụnanya a ụkpụrụ na-eduzi “ụzọ nke kachasị mma.” (1 Ndị Kọrint 12:31)—8/1, peji nke 12.