Ị̀ Na-echeta?
Ì jiriwo nlezianya chebara mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche echiche? Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe ndị na-esonụ:
◻ Olee otú mmadụ na-esi ‘abịakwute Jisọs’ n’ikwekọ n’ọkpụkpọ òkù ya dị na Matiu 11:28?
Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya, na-esokwa m.” (Matiu 16:24) N’ihi ya, ịbịakwute Jisọs pụtara mmadụ ime ka uche nke ya dịrị n’okpuru nke Chineke na nke Kraịst, ịnakwere otu ụdị ibu ọrụ, na-emekwa otú ahụ mgbe nile.—8/15, peji nke 17.
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị mmadụ “ole na ole” na-achọta ‘ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ’ nke Jisọs hotara na Matiu 7:13, 14?
Iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke na-etinye ihe mgbochi n’ụzọ ahụ dị warara. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe na-adọrọ adọrọ nanị nye onye na-achọ ime ka ndụ ya na ụkpụrụ nile nke Chineke kwekọọ. Ọ bụ ezie na o yiri ihe na-egbochi mmadụ, ‘ụzọ ahụ dị mkpagide’ na-eme ka mmadụ nwere onwe ya n’akụkụ nile dị mkpa. Ihe ndị e ji mee ókèala ya nile bụ “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe.”(Jemes 1:25)—9/1, peji nke 5.
◻ Olee otú a pụrụ isi zụlite nghọta?
Nghọta adịghị abịa n’ụzọ dị mfe ma ọ bụ dị ka ihe ebumpụta ụwa. Ma site n’iji ndidi, ekpere, ezi mgbalị, mkpakọrịta amamihe, ọmụmụ Bible na ịtụgharị uche n’elu ya, na ịdabere na mmụọ nsọ Jehova, a pụrụ ịzụlite nghọta.—9/1, peji nke 21.
◻ Olee otú ekworo ụmụ mmadụ pụrụ isi rụzuo ihe dị mma?
Ọ pụrụ ịkwali mmadụ ichebe onye a hụrụ n’anya pụọ ná mmetụta ọjọọ. Ọzọkwa, ụmụ mmadụ pụrụ igosi ekworo maka Jehova na ofufe ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Ndị Eze 19:10)—9/15, peji nke 8, 9.
◻ Gịnị ka okwu ahụ dị na Jenesis 50:23 banyere ụmụ ụmụ Josef pụtara: “A mụkwara [ha] n’ikpere abụọ nke Josef”?
Nke a pụrụ ịpụta nanị na Josef nakweere ụmụaka ahụ dị ka ndị si n’eriri ya. Ọ pụkwara igosi na o ji mmetụta ịhụnanya soro ụmụaka ahụ gwurie egwu, na-ekukwasị ha n’ikpere ya abụọ. Ndị bụ nna taa ga-eme nke ọma igosi ụmụaka ha ụdị mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ.—9/15, peji nke 20, 21.
◻ Gịnị dị oké mkpa maka alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma?
Iji rụpụta ihe ọma ndị dị otú ahụ, ndị òtù ọlụlụ aghaghị ịdị na-ebute Chineke ụzọ mgbe nile. N’ime otú ahụ, ndị òtù ọlụlụ na-agbalị ịrapara n’ahụ ibe ha ma dozie nsogbu ha site n’itinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ. Ha na-esi otú a ezere ụdị nile nke obi mgbu na-apụta mgbe e leghaara ihe Chineke na-achọ anya. (Abụ Ọma 19:7-11)—10/1, peji nke 11.
◻ Ruo n’ókè ha aṅaa ka echiche Chineke nke ịdị ngwa dịruru ná mkpa taa?
Echiche Chineke nke ịdị ngwa bụ akụkụ nke ozi e ji obi dum na-ejere Jehova. Ọ na-egbochi ma na-enye aka imebi mgbalị nile nke Ekwensu ime ka ndị ohu Chineke “daa mbà ná mkpụrụ obi [ha].” (Ndị Hibru 12:3) Ọ na-echebe ha pụọ ná ntinye aka na-adịghị mkpa n’ụwa na ịhụ ihe onwunwe n’anya ya, na-eme ka uche ha dịkwasị n’ihe ndị dị n’elu—“ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19)—10/1, peji nke 28.
◻ N’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ, olee mgbe Jisọs na-anọdụ ala n’elu ocheeze ya, n’ihi gịnịkwa? (Matiu 25:31-33)
Ilu ahụ adịghị egosi ya ka ọ na-anọdụ ala n’echiche nke ịghọ Eze. Kama nke ahụ, ọ na-anọdụ ala dị ka Onye Ikpe. Ikpe ikpe ahụ abụghị ihe ga-aga n’ihu ruo ogologo oge nke ọtụtụ afọ. Kama nke ahụ, ilu ahụ na-ezo aka n’ọdịnihu mgbe Jisọs ga-ekwupụta mkpebi ikpe ma mezuo ihe e kpere n’ikpe n’ahụ mba nile n’ime mkpirikpi oge.—10/15, peji nke 22, 23.
◻ Gịnị bụ “ọgbọ” ahụ nke Jisọs zoro aka na ya ugboro ugboro?
Jisọs ji okwu bụ “ọgbọ a” mee ihe n’ebe ìgwè mmadụ ndị biri ndụ n’otu oge ha na ‘ndị ndú ha kpuru ìsì’ ndị mejupụtara mba ndị Juu nọ. (Matiu 11:16; 15:14; 24:34)—11/1, peji nke 14.
◻ Ná mmezu ikpeazụ nke amụma Jisọs na Matiu 24:34-39, na gịnị ka okwu bụ́ “ọgbọ a” na-ezo aka?
N’ụzọ doro anya Jisọs na-ezo aka n’ebe ndị nọ n’ụwa nọ bụ́ ndị ga-ahụ ihe àmà nke ọnụnọ Kraịst ma ghara imezi ụzọ ha.—11/1, peji nke 19, 31.
◻ Olee otú ndokwa nke obodo mgbaba na ihe mgbochi ha si baara ndị nọ n’Israel oge ochie uru?
O mere ka ọ bamie n’obi ndị Israel na ha ekwesịghị ịdị aghara ma ọ bụ nwee omume ọ gbasara m banyere ndụ mmadụ. O mesikwara ike mkpa ọ dị igosi obi ebere mgbe ọ dị mkpa ime otú ahụ. (Jemes 2:13)—11/15, peji nke 14.
◻ Gịnị bụ obodo mgbaba ihe atụ ahụ?
Nke a bụ ndokwa Chineke maka ichebe anyị pụọ n’ọnwụ maka imebi iwu ya banyere ịdị nsọ nke ọbara. (Jenesis 9:6)—11/15, peji nke 17.
◻ Olee otú òtù ụmụnna ndị Kraịst pụrụ isi nyere anyị aka “inwetaghachi ike”? (Aịsaịa 40:31, NW)
N’etiti ụmụnna nwoke na nwanyị anyị bụ́ ndị Kraịst, e nwere ụfọdụ ndị pụrụ ịdị na-eche nrụgide na ule ndị yiri nke anyị ihu na ndị pụrụ ịdị na-enwe mmetụta ndị yiri nnọọ ndị nke anyị. (1 Pita 5:9) Ọ bụ ihe na-emesi obi ike na ihe na-ewusi okwukwe ike ịmara na ihe na-eme anyị abụghị nanị anyị ka ọ na-eme nakwa na mmetụta anyị apụghị iche.—12/1, peji nke 15, 16.