OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Izi Ozi Ọma na Ịkụzi Ihe Dị Mkpa Maka Ime Ndị Na-eso Ụzọ
Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ka ha gaa mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19) Iji mee ya, ha ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma, kụziekwara ha ihe. Si n’oge ruo n’oge, anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m ga-esi na-emekwu nke ọma n’ihe abụọ a dị ezigbo mkpa maka ime ndị na-eso ụzọ?’
IKWUSA OZI ỌMA
Kama ịnọ na-eche ka ndị mmadụ bịakwute anyị, anyị kwesịrị ịga na-achọ ndị “kwesịrị ekwesị.” (Mat. 10:11) Anyị nọrọ n’ozi ọma, ànyị na-agbalịsi ike izi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma? (Ọrụ 17:17) Ọ bụ otú Pọl si dịrị uchu n’ozi ọma mere Lidia ji ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst.—Ọrụ 16:13-15.
“Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị” (Ekli. 11:6)
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-EZI OZI ỌMA “N’AKWỤSỊGHỊ AKWỤSỊ”—MGBE Ị NA-ANỌGHỊ N’OZI NAKWA N’OZI ỤLỌ N’ỤLỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Ka Samuel na-eme ihe ndị dịịrị ya n’ụbọchị, olee otú o si gosi na ọ na-achọ ụzọ ndị ọ ga-esi kụnye mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’obi ndị mmadụ?
Olee ihe mere anyị kwesịrị iji nọgide na-esi n’ụzọ dị iche iche ezi ndị mmadụ ozi ọma?
Ole ndị ka i nwere ike izi ozi ọma Alaeze ahụ ka ị na-eme ihe ndị dịịrị gị n’ụbọchị?
ỊKỤZI IHE
Ọ bụghị naanị akwụkwọ ka anyị ga-enye ndị mmadụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị ga na-agaghachi na nke ha, ma na-amụkwara ha Baịbụl. (1 Kọr. 3:6-9) Ma, ọ bụrụkwanụ na mbọ niile anyị gbara amịtachaghị mkpụrụ? (Mat. 13:19-22) Anyị kwesịkwara ịnọgide na-achọ ndị obi ha dị ka “ala dị mma.”—Mat. 13:23; Ọrụ 13:48.
“Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri, ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too” (1 Kọr. 3:6)
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-EZI OZI ỌMA “N’AKWỤSỊGHỊ AKWỤSỊ”—N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ NAKWA MGBE Ị NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA ỊGHỌ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:
Olee otú Solomon na Mary si gbaa mkpụrụ nke eziokwu ha kụnyere n’obi Ezikiel na Abigail mmiri?
Gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị mgbe ọ bụla anyị si n’ụzọ ọ bụla na-agba àmà, ma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị?
Olee otú anyị ga-esi lekwasịkwuo anya n’ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl?