Baptism “Banye n’Aha Nke”
IHE ọmụmụ nke ọtụtụ puku ihe ndekọ papyrus obodo ndị oge ochie, bụ́ ndị a chọtara n’ájá uzuzu nke Ijipt ná mmalite nke narị afọ nke a na-enyekarị nghọta n’ụzọ na-akpali mmasị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịtụle ụzọ e si jiri okwu ụfọdụ mee ihe, a na-eduzi anyị inwe nghọta ka doo anya banyere otu ụdị okwu ndị ahụ n’ọnọdụ nke e ji jiri ha mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ.
Otu ihe atụ bụ ojiji Jisọs ji “baa n’aha nke” mee ihe mgbe o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu tupu ọ rịgoo n’eluigwe, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ.” Gịnị ka Jisọs bu n’uche?—Matiu 28:19.
Ndị mmụta achọpụtawo na n’ihe odide ndị na-abụghị nke Bible, e ji okwu ahụ bụ “baa n’aha nke,” ma ọ bụ “banye n’aha nke” (Kingdom Interlinear), eme ihe n’izo aka n’ịkwụnye ụgwọ “n’akpa nke onye ọ bụla.” Onye prọfesọ n’ọkà mmụta okpukpe, bụ́ Dr. G. Adolf Deissmann kwetara na n’ihi ihe àmà e nwetara n’ihe odide papyrus ahụ, “echiche dị . . . n’okwu ndị ahụ bụ ime baptism banye n’aha nke Onyenwe anyị, ma ọ bụ ikwere banye n’aha nke Ọkpara Chineke, bụ na baptism ma ọ bụ okwukwe bụ ihe mejupụtara mmadụ ịbụ nke Chineke ma ọ bụ nke Ọkpara Chineke.”—Ọ bụ Deissmann dere okwu ụfọdụ n’ụzọ dị iche.
N’ụzọ na-akpali mmasị, ndị Juu nke oge Jisọs ji okwu yiri nke ahụ mee ihe, dị ka a kọwara na Theological Dictionary of the New Testament, sị: “A na-ebi onye na-eso ụzọ okpukpe ndị Juu úgwù . . . ‘baa n’aha nke onye ahụ na-eso ụzọ,’ iji nabata ya n’ime okpukpe ndị Juu. Ibi úgwù nke a na-ewere ọnọdụ . . . ‘baa n’aha nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ iji nabata ya n’ime ọgbụgba ndụ ahụ.” N’ụzọ dị otú a, a na-eguzobe mmekọrịta, onye ahụ na-abụghị onye Juu na-aghọkwa onye na-eso ụzọ okpukpe ndị Juu n’okpuru ikike nke ọgbụgba ndụ ahụ.
Ya mere nye onye Kraịst, baptism nke na-esochi nraranye na-eguzobe mmekọrịta chiri anya n’etiti mmadụ na Jehova Chineke, Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na mmụọ nsọ. Onye ahụ a tọghatara na-aghọta ikike ndị ha nwegasịrị n’ụzọ ndụ ọhụrụ ya. Tụlee otú nke a si bụrụ eziokwu maka nke ọ bụla n’ime atọ ndị ahụ a kpọrọ aha.
Site n’ịmata ike Chineke nwere, anyị na-abịa ya nso ma banye ná mmekọrịta anyị na ya. (Ndị Hibru 12:9; Jemes 4:7, 8) Anyị na-aghọ ndị Chineke nwe dị ka ndị ohu ya, ndị e ji ọnụ ahịa nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst zụta. (1 Ndị Kọrint 3:23; 6:20) Pọl onyeozi gwakwara ndị Kraịst narị afọ mbụ na ha bụ nke Jisọs Kraịst, ha abụghị nke mmadụ ọ bụla onye ọ pụrụ ịbụworịị ya wetaara ha eziokwu ahụ. (1 Ndị Kọrint 1:12, 13; 7:23; tụlee Matiu 16:24.) Baptism baa n’aha nke Ọkpara na-egosi ịghọta eziokwu nke a, ịnakwere Jisọs dị ka “ụzọ, na eziokwu, na ndụ.”—Jọn 14:6.
Mmụọ nsọ dịkwa mkpa ná mmekọrịta ziri ezi nke anyị na Jehova na Jisọs Kraịst. Baptism baa n’aha nke mmụọ nsọ na-egosi na anyị matara ihe bụ ọrụ nke mmụọ ahụ ná mmeso Chineke n’ebe anyị nọ. Anyị na-ezube ịgbaso nduzi ya, ọ bụghị ileghara ya anya ma ọ bụ ime omume n’ụzọ na-eguzogide ya, na-egbochi ya ịrụ ọrụ n’ime anyị. (Ndị Efesọs 4:30; 1 Tesalọnaịka 5:19) Enweghị ụdịdị onye nke mmụọ ahụ adịghị eme ka e nwee ihe isiike n’iji ya mee ihe ma ọ bụ n’ihe ọ pụtara dịkwa ka iji “baa n’aha nke ọgbụgba ndụ” mee ihe na-adịghị eme ka e nwee ihe isiike n’okpukpe ndị Juu.
Ya mere, n’oge nraranye na ime baptism, ọ dị anyị mkpa iji ekpere tụgharịa uche n’ihe mmekọrịta ọhụrụ anyị ahụ gụnyere. Ọ chọrọ ido onwe onye n’okpuru uche Chineke, bụ́ nke e gosipụtara n’ihe nlereanya na onyinye mgbapụta nke Jisọs Kraịst, bụ́ nke a ga-emezu site n’aka mmụọ nsọ ahụ, ka ọ na-eduzi ndị na-ejere Chineke ozi n’ịhụnanya na n’ịdị n’otu n’ụwa nile.