Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 6/15 p. 22-27
  • Ịkụta Mmadụ ná Mmiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkụta Mmadụ ná Mmiri Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkụta Ndị Mmadụ, Ihe Ịma Aka Zuru Ụwa Ọnụ
  • Ọganihu E Nwere n’Ọrụ Ịkụ Azụ Zuru Ụwa Ọnụ
  • Mmadụ Nile Keere Òkè
  • Ihe Ndị So Kere Òkè n’Inwe Mmụba
  • Ànyị Pụrụ Imeziwanye?
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Gịnị Ka Oké Ụgbụ na Azụ ahụ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 6/15 p. 22-27

Ịkụta Mmadụ ná Mmiri Ụwa

“A sị na ana m ezisa ozi ọma, enweghị m ihe ịnya isi; n’ihi na mkpa na-akpa m; n’ihi na ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.”—1 NDỊ KỌRINT 9:16.

1, 2. (a) Olee ndị meriworo ihe ịma aka ahụ pụtara ná 1 Ndị Kọrint 9:16, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ? (b) Ibu ọrụ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nakwereworo?

OLEE ndị na narị afọ nke 20 a meriworo n’ezie ihe ịma aka ahụ nke dị n’okwu Pọl kwuru n’elu? Olee ndị pụworo baa n’ime ụwa n’ọnụ ọgụgụ ruru ọtụtụ nde ịkụta ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị “maara mkpa ime mmụọ ha”? (Matiu 5:3, NW) Olee ndị nọworo n’ihe ize ndụ nke ịga mkpọrọ na ọnwụ, oleekwa ndị taworo ahụhụ dị otú ahụ n’ọtụtụ ala n’ihi imezu iwu nke Kraịst nyere na Matiu 24:14?

2 Ihe ndekọ na-aza, sị: Ndịàmà Jehova. Nanị n’afọ gara aga, ihe karịrị nde Ndịàmà anọ gara site n’ụlọ ruo n’ụlọ ‘na-ezisa ozi ọma’ na 211 mba na ókèala nakwa n’ihe karịrị 200 asụsụ. Ndị a abụghị nnọọ otu ìgwè a họpụtara ahọpụta nke ndị ozi ala ọzọ e nyere ọzụzụ. Ee e, Ndịàmà Jehova nile na-enwe mmetụta nke ibu ọrụ ha nwere ikwusa na izi ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’oge ọ bụla. N’ihi gịnị ka ha ji enwe mmetụta nke mkpa isoro ndị ọzọ kerịta nkwenkwe ha? N’ihi na ha na-amata na ihe ọmụma na-eweta ibu ọrụ.—Ezikiel 33:8, 9; Ndị Rom 10:14, 15; 1 Ndị Kọrint 9:16, 17.

Ịkụta Ndị Mmadụ, Ihe Ịma Aka Zuru Ụwa Ọnụ

3. Ruo ókè hà aṅaa ka ọrụ ịkụ ahụ azụ na-aghaghị iru n’ịdị ukwuu?

3 Oké ọrụ ịkụta azụ nke a abụghị nke a na-eme, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nanị n’otu osimiri ma ọ bụ ọdọ mmiri ma ọ bụ ọbụna n’otu oké osimiri. Ee e, dị ka Jisọs nyere n’iwu, a gaje ịrụzu ya “n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Tupu ọ rịgokwuru Nna ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu: ma lee, mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 28:19, 20.

4. (a) Gịnị bụ ihe na-aghaghị ijuworị ndị Juu oge gboo na-eso ụzọ Jisọs anya? (b) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si ele ókè nke ọrụ nkwusa ha anya?

4 Nye ndị Juu na-eso ụzọ Jisọs, nke ahụ aghaghị ịbụ ọrụ na-eju anya. Ọ gwara ndị Juu na-eso ụzọ ya na ha ga-aga ugbu a ná mba nile nke ndị Jentaịl “na-adịghị ọcha” ma zie ha ihe. Ha mere mgbanwe ụfọdụ iji ghọta ịdị mkpa nke ihe omume ahụ ma mee ihe banyere ya. (Ọrụ 10:9-35) Ma ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime banyere ya; Jisọs agwawo ha n’otu ihe atụ na “ubi ahụ bụ ụwa.” Ya mere, Ndịàmà Jehova taa na-ele ụwa dum anya dị ka ọgbọ ebe ha nwere ikike ịkụ azụ. A pụghị inwe “mmiri ókèala” nke na-egbochi ha ịrụ ọrụ Chineke nyere ha. Mgbe ụfọdụ iji nghọta mee ihe dị mkpa n’ebe a na-enweghị nnwere onwe nke okpukpe. Otú o sina dị, ha na-akụ azụ site n’inwe echiche nke ịdị ngwa. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? N’ihi na ihe ndị na-eme n’ụwa na mmezu amụma Bible na-egosi na anyị nọ n’akụkụ ikpeazụ nke ọrụ ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ.—Matiu 13:38; Luk 21:28-33.

Ọganihu E Nwere n’Ọrụ Ịkụ Azụ Zuru Ụwa Ọnụ

5. Ụdị ndị dị aṅaa na-azaghachi n’ọrụ ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ?

5 A “kụtara” ihe ka ọtụtụ ná ndị nketa Alaeze ahụ e tere mmanụ site ná mba dị iche iche tupu 1935, n’ihi ya, n’ụzọ bụ isi ọnụ ọgụgụ ha zuru ezu ezuwo. Ya mere, karịsịa kemgbe 1935, Ndịàmà Jehova anọwo na-achọ ndị ahụ dị umeala bụ́ ndị a pụrụ ịkọwa dị ka “ndị dị umeala n’obi” bụ́ ndị “ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:11, 29) Ndị a bụ ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme.” Ha na-ewere nzọụkwụ n’akụkụ nke ọchịchị Alaeze Chineke tupu “mkpagbu ukwu” ahụ abịakwasị usoro ihe Setan nke rụrụ arụ, e wee tụba ndị na-efe ya ofufe “n’oké ọkụ ahụ” nke mbibi ikpeazụ.—Ezikiel 9:4; Matiu 13:47-50; 24:21.

6, 7. (a) Ihe ndị dị aṅaa ka e mere na 1943 n’ihe banyere ọrụ ime nkwusa? (b) Gịnị bụworo ihe ndị si na ya pụta?

6 È nwewo ihe ịga nke ọma n’ọrụ ịkụ azụ ahụ zuru ụwa ọnụ ruo ugbu a? Tụlee ihe ndị mere eme. Laa azụ na 1943, Agha Ụwa nke Abụọ ka na-aga n’ihu, ụmụnna anyị ndị e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, bu ụzọ hụ na a ga-arụ ọrụ ịkụ azụ dị ukwuu nke zuru ụwa ọnụ. Ya mere, ihe ndị dị aṅaa ka e mere?a—Mkpughe 12:16, 17.

7 Na 1943, Watchtower Society guzobere otu ụlọ akwụkwọ ije ozi ala ọzọ a kpọrọ Gilead (Hibru, “Obo Ihe Àmà”; Jenesis 31:47, 48) nke malitere inye otu narị ndị ozi ala ọzọ ọzụzụ kwa ọnwa isii ka e wee nwee ike izipụ ha dị ka ndị ọkụ azụ ihe atụ n’elu ụwa dum. Laa azụ n’oge ahụ, e nwere nanị 126,329 Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike n’ịkụta ndị mmadụ na 54 ala. N’ime afọ iri ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo nnọọ elu ruo 519,982 Ndịàmà na 143 ala! N’ezie, Ụlọ Akwụkwọ Gilead na-azụpụta ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ọkụ azụ egwu na-adịghị atụ, na-adị njikere ịga n’ọdịnala mba ọzọ ma gbanwee ikwekọ ná mmiri ịkụ azụ ọhụrụ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ọtụtụ puku ndị obi ha ziri ezi zaghachiri. Ndị ozi ala ọzọ ahụ, na Ndịàmà nke ala ebe ha nọ, bụ́ ndị ha na-eso arụkọ ọrụ, tọrọ ntọala maka mmụba dị ebube nke na-ewere ọnọdụ ugbu a.

8, 9. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịkpọtụ uche banyere ọrụ ije ozi ala ọzọ pụrụ iche? (b) Olee ụzọ ndị ozi ala ọzọ siworo hụta mmụba dị ukwuu n’ubi ha? (Leekwa 1992 Yearbook of Jehovah’s Witnesses.)

8 Ọtụtụ ndị aka ochie na-ekwesị ntụkwasị obi sitere na klasị ndị mbụ nke Gilead ka nọkwa na-eje ozi ná mba ọzọ ebe e kenyere ha ọrụ, ọ bụ ezie na ugbu a ha akarịwo 70 ma ọ bụ ọbụna 80 n’afọ ndụ. Otu ihe atụ nke na-egosi ọtụtụ n’ime ndị a bụ nke onye ahụ dị 82 afọ bụ́ Eric Britten na nwunye ya, bụ́ Christina, bụ́ ndị gụsịrị akwụkwọ na klasị nke 15 nke Gilead na 1950 ma ka na-eje ozi na Brazil. Mgbe ha gara ije ozi na Brazil, e nwere ihe na-erughị 3,000 Ndịàmà ná mba ahụ. Ugbu a e nwere ihe karịrị 300,000! N’ezie, ‘onye nta ahụ aghọwo mba nwere ume’ na Brazil n’ihi na ọrụ ịkụ azụ ahụ abụwokwa nke na-amịpụta mkpụrụ.—Aịsaịa 60:22.

9 Gịnịkwa ka anyị pụrụ ikwu banyere ndị ozi ala ọzọ nọ n’Africa? Ihe ka ọtụtụ agbanwewo ikwekọ n’ọdịnala dị iche, ha azụlitewokwa ịhụnanya maka ndị Africa. Ihe na-egosi nke a bụ ụmụnna anyị bụ́ John na Eric Cooke na nwunye ha, Kathleen na Myrtle, bụ́ ndị na-eje ozi ugbu a na South Africa. John na Eric gụsịrị akwụkwọ na klasị nke asatọ na 1947. N’etiti ha, ha ejewo ozi n’Angola, Zimbabwe, Mozambique, na South Africa. Ndị ozi ala ọzọ ụfọdụ nwụrụ n’Africa n’ihi ọrịa, ndị ọzọ nwụkwara n’ihi agha na mkpagbu, dị ka Alan Battey na Arthur Lawson, bụ́ ndị nwụrụ n’oge agha obodo a lụrụ n’oge na-adịghị anya na Liberia. N’agbanyeghị nke ahụ, mmiri Africa abụwo ebe na-amịpụta mkpụrụ. Ugbu a e nwere ihe karịrị 400,000 Ndịàmà nọ na gburugburu kọntinent ahụ buru ibu.

Mmadụ Nile Keere Òkè

10. N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ndị ọsụ ụzọ na-arụ ọrụ e kwesịrị ịja mma?

10 Otú ọ dị, a ghaghị ịghọta na ọ bụ ezie na ndị ozi ala ọzọ sitere ná mba ọzọ eruwo ọtụtụ puku n’ọnụ ọgụgụ, ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọb nke mba dị iche iche eruwo ọtụtụ nde. Ha na-arụ ókè dị ukwuu nke ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa nile. Na 1991 e nwere nkezi nke ihe karịrị 550,000 ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi na-ejegharị ejegharị. Lee nnọọ ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ahụ bụ mgbe anyị chere echiche banyere Ndịàmà ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi ime mgbalị pụrụ iche iji kere òkè n’oké ọrụ ịkụ azụ ahụ, na-enye nkezi nke malite 60 ruo 140 hour nke ime nkwusa n’ọnwa ọ bụla. Ọtụtụ na-eme nke a site n’ịchụ àjà onwe onye dị ukwuu na imefu ọtụtụ ihe. Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha hụrụ Jehova Chineke ha n’anya site n’obi, uche, mkpụrụ obi, na ike ha dum, ha hụkwara ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha.—Matiu 22:37-39.

11. Ihe àmà dị aṅaa e ji aka ka e nwere na mmụọ Jehova na-arụ ọrụ n’etiti ndị ya?

11 Gịnị ka anyị pụrụ ikwu banyere ihe karịrị nde atọ na ọkara Ndịàmà ndị ọzọ, bụ́ ndị na-anọghị n’ozi oge nile, ma otú o sina dị bụrụ ndị mere ike ha nile n’ozi Jehova, dị ka ọnọdụ ha si dị? Ụfọdụ bụ ndị nwunye, ọbụna ndị nne na-elekọta obere ụmụ ha, bụ́ ndị n’agbanyeghị ihe ha nwere ime, na-etinye ụfọdụ n’ime oge ha dị oké ọnụ ahịa n’ọrụ ịkụ azụ nke zuru ụwa ọnụ. Ọtụtụ bụ ndị di ma ọ bụ nna ndị na-arụ ọrụ ego na-ewe oge dị ukwuu; n’agbanyeghị nke ahụ, ha setịpụrụ oge ná ngwụcha izu nakwa n’oge mgbede ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ. Mgbe ahụ e nwere oké ìgwè nke ndị ikom na ndị inyom na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nakwa ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-ekere òkè n’ime nkwusa na ndị na-ekwu ihe dị mma banyere eziokwu ahụ site n’omume ha. Olee òtù okpukpe ọzọ nwere ihe karịrị nde ndị ọrụ afọ ofufo anọ a na-adịghị akwụ ụgwọ, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma banyere ọchịchị Alaeze Chineke kwa ọnwa? N’ezie nke a na-egosipụta na mmụọ Jehova na-arụ ọrụ!—Abụ Ọma 68:11; Ọrụ 2:16-18; tụlee Zekaraịa 4:6.

Ihe Ndị So Kere Òkè n’Inwe Mmụba

12. N’ihi gịnị, n’ọnụ ọgụgụ dịkwa aṅaa ka ndị mmadụ ji na-azaghachi n’eziokwu ahụ?

12 Ọrụ nkwusa nke a dị ukwuu na-arụpụta ihe ndị dị ịrịba ama kwa afọ. Na 1991 e mere ihe karịrị 300,000 Ndịàmà ọhụrụ baptism site n’imikpu ha kpam kpam n’ime mmiri. Nke ahụ bụ ihe hà ka ihe karịrị 3,000 ọgbakọ nke 100 Ndịàmà nọ na nke ọ bụla n’ime ha! Olee ụzọ e si rụzuo ihe ndị a nile? Ka anyị cheta ihe Jisọs kwuru: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna nke zitere m adọghị ya . . . E dewo ya n’akwụkwọ Ndị Amụma, sị, Ha nile ga-abụkwa ndị Chineke [“Jehova,” NW] ziworo ihe. Onye ọ bụla nke nụworo site n’ọnụ Nna m, nke mụtawokwara ihe, ọ na-abịakwute m.” Ya mere, ọ bụghị nnọọ site ná mgbalị mmadụ ka mmadụ ji azaghachi n’ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ. Jehova na-achọpụta ihe bụ ọnọdụ obi ma na-adọtara onwe ya ndị ahụ kwesịrị ekwesị.—Jọn 6:44, 45; Matiu 10:11-13; Ọrụ 13:48.

13, 14. Àgwà ọma dị aṅaa ka ọtụtụ Ndịàmà gosipụtaworo?

13 Otú ọ dị, ndị ọkụ bụ́ mmadụ bụ ngwá ọrụ Jehova ji eme ihe ịdọtara onwe ya ndị mmadụ. Ya mere, àgwà ha nwere n’ebe ndị mmadụ na ókèala ebe ha na-akụ azụ dị dị mkpa. Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịhụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ etinyewo okwu Pọl kwuru ná Ndị Galetia n’obi: “Ma ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma ànyị adaghị mbà.”—Ndị Galetia 6:9.

14 Ọtụtụ Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi anọwo na-eme nkwusa ruo ọtụtụ iri afọ, ọ bụ ezie na ha ji nlezianya na-ekiri ihe ndị na-eme n’ụwa. Ha ahụwo mbilite na ọdịda nke usoro ọchịchị Nazism, Fascism, na usoro ọchịchị aka ike ndị ọzọ. Ụfọdụ ahụwo ọtụtụ agha ndị a lụworo kemgbe 1914. Ha ahụwo ka ndị ndú ụwa tụkwasịrị olileanya ha n’òtù League of Nations, mesịakwa n’òtù United Nations. Ha ahụwo ka a machibidoro ọrụ Jehova ma mesịa kwadoo ya n’iwu n’ọtụtụ ala. N’ime ihe ndị a nile, ike agwụbeghị Ndịàmà Jehova n’ime ihe ọma, tinyere ije ozi dị ka ndị na-akụta ndị mmadụ. Lee aha ihe ndekọ pụrụ iche nke iguzosi ike n’ezi ihe!—Matiu 24:13.

15. (a) Enyemaka dị aṅaa ka anyị nweworo iji mee mgbanwe ikwekọ ná mkpa ndị e nwere ókèala anyị zuru ụwa ọnụ? (b) Olee ụzọ akwụkwọ dị iche iche siworo nye aka n’ihe omume gị?

15 E nwere ihe ndị ọzọ so kere òkè n’inwe mmụba nke a n’ụwa nile. Otu bụ àgwà nke ịdị njikere ime mgbanwe nke ndị ahụ na-akụta ndị mmadụ nwere n’ebe mkpa ndị dị ókèala ha dị. Site ná mpụta nke ọtụtụ ndị nwere ọdịnala, okpukpe, na asụsụ dị iche iche, Ndịàmà Jehova emewo ka nghọta nke echiche ndị a dị iche iche saa mbara. Ọgbakọ ahụ zuru ụwa ọnụ enyewokwa aka n’ụzọ dị ukwuu site n’ịkwadebe Bible na akwụkwọ Bible n’ihe karịrị 200 asụsụ. Nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures, ma ò zuru ezu ma ọ bụ n’akụkụ ya, dị ugbu a na 13 asụsụ, tinyere asụsụ Czech na Slovak. Akwụkwọ ahụ bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! dị ugbu a na 198 asụsụ, na-amalite n’asụsụ Albanian ruo Zulu, na-enwe mbipụta nke 72 nde. A sụgharịworị akwụkwọ ahụ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ gaa na 69 asụsụ. Mankind’s Search for God, bụ́ nke a sụgharịrị gaa na 29 asụsụ, na-eme ka e nwee nghọta banyere mmalite na nkwenkwe nke usoro okpukpe ndị bụ isi nke ụwa, ọ na-aghọkwa ihe inyeaka pụrụ iche n’ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ.

16. Olee ụzọ ụfọdụ siworo zaghachi ná mkpa ndị e nwere n’ala ndị ọzọ?

16 Gịnị ọzọ meworo ka ọrụ ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ gaa n’ihu? Ọtụtụ puku adịwo njikere ịza ‘òkù nke onye Masedonia’ ahụ. Dịkwa ka Pọl dị njikere isi n’Asia Minor gaa Masedonia nke dị na Europe, n’ọkpụkpọ nke Chineke, ọtụtụ Ndịàmà agawo n’ala na n’ókèala ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, nakwa maka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ha adịwo ka ndị ọkụ azụ nkịtị bụ́ ndị chọpụtara na a kụwo azụ ndị dị ná mmiri obodo ha nke ọma wee gaa ná mmiri ebe e nwere ụgbọ epeepe ole na ole na ọtụtụ azụ.—Ọrụ 16:9-12; Luk 5:4-10.

17. Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere banyere ndị zaghachiworo ‘n’òkù Masedonia’ ahụ?

17 Klasị ndị e nwere n’isi nso a nke ụlọ akwụkwọ ije ozi ala ọzọ nke Gilead agụnyewo ụmụ akwụkwọ sitere ná mba Europe dị iche iche bụ́ ndị mụtaworo Bekee ma nyefeekwa onwe ha maka ije ozi n’ala na ọdịnala ndị ọzọ. N’otu aka ahụ, site n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, a na-enye ọtụtụ ụmụnna na-alụbeghị nwunye ọzụzụ ọnwa abụọ siri oké ike, mgbe ahụ a na-ezipụkwa ha gaa ná mba ndị ọzọ ime ka ọtụtụ ọgbakọ na sekit dịwanye ike. Ebe ndị ọzọ pụrụ iche a na-akụ azụ bụ n’ókèala na-emepe ugbu a n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe nakwa ná mba ndị ahụ nọbu na Soviet.—Tụlee Ndị Rom 15:20, 21.

18. (a) N’ihi gịnị ka ndị ọsụ ụzọ ji abụkarị ndị dị irè n’ije ozi? (b) Olee ụzọ ha pụrụ isi nyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka?

18 Ihe ọzọkwa nyeworo aka n’ọrụ ịkụ azụ zuru ụwa ọnụ bụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ nke ndị ọsụ ụzọ oge nile na-aga. Site n’izu abụọ nke ntụle siri oké ike a na-atụle akwụkwọ ahụ bụ́ Shining as Illuminators in the World, bụ́ nke a kwadebere kpam kpam maka ndị ọsụ ụzọ, ha na-emeziwanye ikike ije ozi ha ka ha na-atụle isiokwu ndị dị ka “Ịgbaso Ụzọ nke Ịhụnanya,” “Na-eso Ụzọ Jisọs dị ka Ihe Nlereanya,” nakwa “Ịzụlite Nkà nke Izi Ihe.” Lee aha obi ekele ọgbakọ nile nwere inwe ìgwè ndị a ruru eru na-akụ azụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, bụ́ ndị pụrụ inye ọtụtụ ndị ọzụzụ n’oké ọrụ ịkụ azụ nke a!—Matiu 5:14-16; Ndị Filipaị 2:15; 2 Timoti 2:1, 2.

Ànyị Pụrụ Imeziwanye?

19. Dị ka Pọl onyeozi, olee ụzọ anyị pụrụ isi meziwanye n’ije ozi anyị?

19 Dị ka Pọl, anyị chọrọ inwe àgwà ziri ezi, nke na-enwe olileanya. (Ndị Filipaị 3:13, 14) O mere mgbanwe ikwekọ n’ụdị mmadụ nile nakwa n’ọnọdụ nile. Ọ maara ụzọ e si achọta ihe ya na onye ọzọ kwekọrịtara na ya na ụzọ e si atụgharị uche n’ihe ndabere nke àgwà na ọdịnala ndị ọ nọ n’ala ha. Anyị pụrụ ịmalite ọmụmụ Bible site n’ịdị ngwa ịmata mmeghachi omume nke onye nwe ụlọ n’ihe banyere ozi Alaeze, mgbe ahụ meekwa mgbanwe ka ihe anyị ga-ekwu kwekọọ ná mkpa nke onye ahụ. Site n’ụdị dị iche iche nke ihe ndị anyị nwere na-enye aka iji mụọ Bible, anyị pụrụ inyefe nke kwesịịrị otú onye ahụ si ele ihe anya. Anyị inwe echiche ziri ezi na ịdị ngwa bụkwa ihe ndị dị mkpa n’ịkụ azụ na-amipụta mkpụrụ.—Ọrụ 17:1-4, 22-28, 34; 1 Ndị Kọrint 9:19-23.

20. (a) N’ihi gịnị ka ọrụ ịkụ azụ ji dị oké mkpa ugbu a? (b) Gịnị bụ ibu ọrụ anyị nwere n’otu n’otu ugbu a?

20 N’ihi gịnị ka ọrụ ịkụ azụ nke a pụrụ iche nke zuru ụwa ọnụ ji dị oké mkpa ugbu a? N’ihi na site n’amụma Bible ndị pụtara ìhè n’ihe ndị meworo eme nakwa n’ihe ndị na-eme eme, ihe àmà na-egosi na usoro ụwa nke Setan na-etinye isi n’ọdachi ikpeazụ. Ya mere, gịnị ka anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, kwesịrị ịdị na-eme? Isiokwu atọ ndị ahụ dịirị ọmụmụ ndị pụtara na magazin a emewo ka ibu ọrụ anyị nwere pụta ìhè nke ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike na ndị na-anụ ọkụ n’obi n’ihe omume anyị nke ịkụ azụ n’ókèala anyị nke mmiri ụwa. Anyị nwere nkwa ahụ siri ike dị na Bible na Jehova agaghị echezọ ịdị uchu anyị n’ọrụ ịkụ azụ. Pọl kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi. Ma ọ na-agụ anyị agụụ ka unu nile n’otu n’otu wee na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ ka unu wee nwezuo olileanya anyị ruo ọgwụgwụ ihe nile.”—Ndị Hibru 6:10-12.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Leekwa akwụkwọ bụ́ Revelation—Its Grand Climax At Hand!, peji nke 185 na 186, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b “Onye ọsụ ụzọ bụ́ onye nkwusa . . . Onye ọrụ oge nile nke Ndịàmà Jehova.”—Webster’s Third New International Dictionary.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji ele ụwa dum anya dị ka ebe ha na-arụ ọrụ ịkụ azụ ha?

◻ Ngọzi ndị dị aṅaa ka ụlọ akwụkwọ ije ozi ala ọzọ nke Gilead wetawooro ọrụ ịkụ azụ?

◻ Gịnị bụ ihe ụfọdụ ndị soworo kere òkè n’inwe ihe ịga nke ọma nke Ndịàmà Jehova?

◻ Olee ụzọ anyị n’otu n’otu pụrụ isi meziwanye ije ozi ndị Kraịst anyị?

[Chaatị dị na peeji nke 24]

IHE NDỊ SI N’ỊKỤ AZỤ ỤWA NILE PỤTA

Afọ Ala Ndịàmà

1939 61 71,509

1943 54 126,329

1953 143 519,982

1973 208 1,758,429

1983 205 2,652,323

1991 211 4,278,820

[Foto dị na peeji nke 25]

A ka na-arụ ọrụ ịgba àmà n’etiti ndị Galili na-akụ azụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya